Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌKTOBA 2014

Jiri Ọrụ Gị na Jehova Na-arụkọ Kpọrọ Ihe

Jiri Ọrụ Gị na Jehova Na-arụkọ Kpọrọ Ihe

“Anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.”—1 KỌR. 3:9.

1. Olee otú ọrụ na-eme ka obi dị Jehova? Gịnị ka o mere n’ihi ya?

ỌRỤ Jehova na-arụ na-atọ ya ụtọ. (Ọma 135:6; Jọn 5:17) Ọ chọrọ ka ọrụ ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ na-arụ na-atọkwa ha ụtọ. Ọ bụ ya mere o ji nye ha ọrụ ga na-eme ha obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, o kwere ka Ọkpara ya soro ya kee ihe. (Gụọ Ndị Kọlọsi 1:15, 16.) Baịbụl gwara anyị na tupu Jizọs abịa n’ụwa, ọ nọ n’akụkụ Jehova n’eluigwe “dị ka onye ọkà ọrụ.”—Ilu 8:30.

2. Gịnị gosiri na ndị mmụọ ozi na-arụ ọrụ dị mkpa na nke na-eme obi ụtọ?

2 Malite na Jenesis ruo ná Mkpughe, Baịbụl kwuru na Jehova na-enye ndị mmụọ ozi ọrụ. Mgbe Adam na Iv mehiechara, a chụpụkwa ha na Paradaịs, Chineke mere ka “ndị cherọb nọrọ n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ogige Iden, debekwa mma agha nke ihu ya na-egbukepụ ọkụ, nke nọ na-echigharị onwe ya iji na-eche ụzọ e si abanye n’ebe osisi nke ndụ ahụ dị nche.” (Jen. 3:24) Mkpughe 22:6 kwukwara na Jehova “zigara mmụọ ozi ya igosi ndị ohu ya ihe ndị na-aghaghị ime n’oge na-adịghị anya.”

ỌRỤ CHINEKE NYERE ỤMỤ MMADỤ

3. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, olee otú o si mee ka Nna ya?

3 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o ji obi ụtọ rụọ ọrụ Jehova nyere ya.  O nyekwara ndị na-eso ụzọ ya ọrụ dị mkpa ha ga-arụ. Ihe a o mere gosiri na ọ na-eme ka Nna ya. Ọ gwara ha ihe ga-eme ka ha tụsiwe anya ike ịrụ ọrụ ahụ. Ọ sịrị ha: “N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, onye nwere okwukwe n’ebe m nọ, onye ahụ ga-arụkwa ọrụ m na-arụ; ọ ga-arụkwa ọrụ karịrị ọrụ ndị a, n’ihi na m na-alakwuru Nna m.” (Jọn 14:12) Ọ chọrọ ka ha mata na ha kwesịrị ịrụ ọrụ ahụ ngwa ngwa. Ọ bụ ya mere o ji sị ha: “Anyị aghaghị ịrụ ọrụ nke onye zitere m mgbe ìhè ka dị; abalị na-abịa, mgbe mmadụ ọ bụla na-apụghị ịrụ ọrụ.”—Jọn 9:4.

4-6. (a) Gịnị mere obi ji dị anyị ụtọ na Noa na Mozis rụrụ ọrụ Jehova nyere ha? (b) Olee uru abụọ ọrụ ọ bụla Chineke nyere ụmụ mmadụ na-aba?

4 Ọtụtụ afọ tupu Jizọs abịa n’ụwa, Jehova nyere ụmụ mmadụ ọrụ na-eme obi ụtọ. N’agbanyeghị na Adam na Iv arụchaghị ọrụ Chineke nyere ha, e nwere ndị rụchara nke ha. (Jen. 1:28) Jehova gwara Noa otú ọ ga-esi arụ ụgbọ ka e chebe ya na ezinụlọ ya mgbe Iju Mmiri ga-abịa. O leziri anya mee ihe niile Jehova gwara ya. Ihe mere anyị ji dị ndụ taa bụ na o mere ihe Jehova gwara ya.—Jen. 6:14-16, 22; 2 Pita 2:5.

5 Jehova gwara Mozis otú ọ ga-esi arụ ụlọikwuu na otú ọ ga-esi ahazi ndị nchụàjà. O mere ya otú ahụ Jehova si gwa ya. (Ọpụ. 39:32; 40:12-16) Ihe ahụ o mere baara anyị uru taa. Olee uru ọ baara anyị? Pọl onyeozi kwuru na e ji ụlọikwuu ahụ na ndị nchụàjà ahụ mee ihe atụ “ihe ọma ndị gaje ịbịa.”—Hib. 9:1-5, 9; 10:1.

6 Ka Jehova ji nwayọọ nwayọọ na-emezu nzube ya, ọrụ ọ na-enye ndị ohu ya na-adị iche iche. Ma, ọrụ ahụ na-eme ka e too Jehova, na-abakwara ụmụ mmadụ uru. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dịkwa ihe ndị Jizọs rụrụ tupu ya abịa n’ụwa nakwa mgbe ọ bịara n’ụwa. (Jọn 4:34; 17:4) Ọrụ Jehova nyere anyị taa na-eme ka e too ya. (Mat. 5:16; gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:58.) N’ihi gịnị?

OTÚ ANYỊ KWESỊRỊ ISI WERE ỌRỤ Ọ BỤLA CHINEKE NYERE ANYỊ

7, 8. (a) Kọwaa ọrụ Ndị Kraịst na-arụ taa nke bụ́ ihe ùgwù. (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na a gwa anyị ihe Jehova chọrọ ka anyị mee?

7 Ọ bụ ihe ùgwù na Jehova gwara ụmụ mmadụ na-ezughị okè ka ha na ya rụkọọ ọrụ. (1 Kọr. 3:9) Ndị so na-arụ Ụlọ Mgbakọ, Ụlọ Nzukọ Alaeze, na alaka ụlọ ọrụ na-arụ ụdị ọrụ ahụ Noa na Mozis rụrụ. Ma ì so na-arụzi Ụlọ Nzukọ Alaeze n’obodo unu ma ì so na-arụ isi ụlọ ọrụ anyị a na-arụ na Wọwik dị na Niu Yọk, jiri ihe ùgwù ahụ i nwere kpọrọ ihe. (Lee ebe e sere otú isi ụlọ ọrụ ahụ ga-adị ná mmalite isiokwu a.) Ihe ndị a bụ ozi a na-ejere Jehova. Ma, e nwere ụdị ọrụ ọzọ Ndị Kraịst niile na-arụ, nke e nwere ike iji tụnyere ịrụ ụlọ. Ọ bụ ikwusa ozi ọma. E ji ya enye Jehova otuto. Ọ na-abakwara ndị mmadụ uru. (Ọrụ 13:47-49) Nzukọ Chineke na-agwa anyị otú kacha mma anyị ga-esi rụọ ọrụ ahụ. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịpụta na a ga-agbanwere anyị ọrụ.

8 Kemgbe ụwa, ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi na-eji obi ha niile eme ihe ọ gwara ha. (Gụọ Ndị Hibru 13:7, 17.) Ọ bụrụ na a gbanweere anyị ọrụ, o nwere ike anyị agaghị aghọtacha ihe kpatara ya. Ma, anyị ma na ọ ga-aba ezigbo uru ma ọ bụrụ na anyị anabata mgbanwe ọ bụla Jehova mere.

9. Olee ihe ọma ndị okenye na-eme ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ kwesịrị ịmụta?

9 Otú ndị okenye si ahazi ihe a na-eme n’ọgbakọ gosiri na ha ji obi ha niile na-agbalị ime ihe Jehova chọrọ. (2 Kọr. 1:24; 1 Tesa. 5:12, 13) Ha na-arụsi ọrụ ike, sorokwa nzukọ Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ. Ha na-ejisi ike amụta ụzọ ọhụrụ  ọ bụla e kwuru ka e si na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Mgbe mbụ nzukọ Jehova kwuru ka a hazie otú a ga-esi jiri telefon na-ezi ozi ọma, otú a ga-esi na-ezi ọma n’ọdụ ụgbọ mmiri ma ọ bụ n’ebe ọhaneze na-anọ, o nwere ike ịbụ na ụfọdụ ndị nọ na-eche ma ọ̀ ga-adabakwa. Ma n’oge na-adịghị anya, ha hụrụ uru ọ bara. Dị ka ihe atụ, na Jamanị, ndị ọsụ ụzọ anọ kpebiri ịga kwusaa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọ achụ nta ego, nke bụ́ ókèala e leghaara anya. Aha otu n’ime ha bụ Michael. O kwuru, sị: “Anyị agabeghị ụdị ebe ahụ zie ozi ọma kemgbe ọtụtụ afọ. N’ihi ya, mgbe anyị chọrọ ịga, ahụ́ erughị anyị ala. Ọ ga-abụrịrị na Jehova ma otú ọ dị anyị. N’ihi ya, o mere ka ozi ọma anyị gara n’ụtụtụ ahụ tọọ anyị ụtọ. Obi dị anyị ụtọ na anyị mere ihe e kwuru n’Ozi Alaeze Anyị ma tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enyere anyị aka.” Ị̀ ga-agba mbọ ka ị mụta ụzọ ọhụrụ e si na-ekwusa ozi ọma n’ókèala unu?

10. Olee mgbanwe e mere ná nzukọ Jehova n’oge na-adịbeghị anya?

10 Mgbe ụfọdụ, a na-agbanwetụ ihe ná nzukọ Jehova. Dị ka ihe atụ, n’oge na-adịbeghị anya, e mechiri ụfọdụ alaka ụlọ ọrụ anyị ndị obere, alaka ụlọ ọrụ ndị buru ibu ana-arụzi ọrụ ha na-arụ. Mgbanwe ahụ mere ka a gbanweere ụmụnna ndị na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ ndị ahụ ọrụ. Ma, n’oge na-adịghị anya, uru ọ bara doro mmadụ niile anya. (Ekli. 7:8) Obi dị ụmụnna ndị ahụ ụtọ na ha so na-arụ ọrụ dị mkpa ná nzukọ Jehova n’oge anyị a.

11-13. Olee ihe nwere ike isiri ụfọdụ ndị ike n’ihi ihe a gbanwere ná nzukọ Jehova?

11 Anyị nwere ike ịmụta ihe bara uru n’aka ụmụnna ndị ahụ na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ ndị ahụ e mechiri. Ụfọdụ n’ime ha jere ozi ọtụtụ afọ n’alaka ụlọ ọrụ ndị ahụ. E nwere otu nwanna aha ya bụ Rogelio. Ya na nwunye ya nọ na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Kosta Rika. Ma, a gwara ha ka ha gafee na Betel dị na Meksiko. Ndị na-eje ozi n’ebe ahụ ka ndị na-eje ozi n’ebe ha nọbu okpukpu iri atọ. Nwanna ahụ kwuru, sị: “Ịhapụ ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị adịrịghị anyị mfe.” A gwakwara nwanna ọzọ aha ya bụ Juan ka ọ gafee Meksiko. O kwuru, sị: “Ọ dị m ka m̀ malitere ụwa n’isi. Ọ pụtara na mmadụ ga-emete ndị enyi ọhụrụ, mụwakwa otú ndị obodo ahụ si eme ihe nakwa otú ha si eche echiche.”

12 Mgbe e mechiri alaka ụlọ ọrụ ụfọdụ dị na Yurop, a gwara ọtụtụ ndị na-eje ozi n’ebe ndị ahụ ka ha gafee n’alaka ụlọ ọrụ dị na Jamanị. Ọ dịghịkwara ha mfe n’ihi na mmadụ ịhapụ obodo ya anaghị adị mfe. Ndị si Swizaland gafee n’alaka ụlọ ọrụ dị na Jamanị ga na-echeta ọmarịcha ugwu ndị dị n’obodo ahụ. Ndị nke si Ọstria agaghị echefu otú ahụ́ si ruo ha ala mgbe ha na-eje ozi n’ezinụlọ Betel na-ebughị ibu.

13 Ọ naghị adịrị ụmụnna ndị gafere n’alaka ụlọ ọrụ dị ná mba ọzọ mfe. Ha ga-agbawa mbọ ka ebe ahụ mara ha ahụ́. Ha na ụmụnna ha na-amaghị ga na-arụkọ ọrụ. E nwekwara ike inye ha ọrụ ha na-arụtụbeghị. Ha ga-eso ọgbakọ ọhụrụ na-amụ ihe, na-ezikwa ozi ọma n’ókèala ọhụrụ. Ha nwekwara ike ịmụwa asụsụ ọzọ. Ime ihe ndị a nwere ike isiri ha ike. Ma, ọtụtụ ndị na-eje ozi na Betel na-eme ha. N’ihi gịnị?

14, 15. (a) Olee otú ọtụtụ ndị sirila gosi na ha anaghị eji ọrụ ha na Jehova na-arụkọ egwu egwu, ụdị ọrụ ọ sọkwara ya bụrụ? (b) Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-eme ka ha?

14 Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Grethel kwuru, sị: “Ihe mere m ji kweta ịgafe n’alaka ụlọ ọrụ ọzọ bụ na ọ bụ otú m ga-esi gosi Jehova na ihe mere m ji hụ ya n’anya abụghị obodo m, ụlọ ebe m nọ na-ejere ya ozi, ma ọ bụ ihe ùgwù e nyere m.” Nwanna nwaanyị ọzọ aha ya bụ  Dayska kwuru, sị: “Mgbe m chetara na ọ bụ Jehova sị m gawa, eji m obi ụtọ kweta ịga.” Otu nwanna aha ya bụ André na Gabriela nwunye ya kwetara ihe a o kwuru. Ha sịrị: “Anyị ghọtara na ihe a bụ ohere ọzọ anyị ga-eji gosi na ihe dị anyị mkpa bụ ijere Jehova ozi, ọ bụghị ime ihe anyị chọrọ.” Anyị gwara onwe anyị, sị, ‘E nwee ihe ọ bụla a gbanwere ná nzukọ Jehova, anyị kwesịrị iji obi ụtọ nabata ya, ọ bụghị ịgbawa ya ụkwụ.’”

Ihe ùgwù kachanụ anyị nwere bụ ịrụ ọrụ Jehova nyere anyị

15 Ọ bụrụ na e mechie alaka ụlọ ọrụ, a na-agwa ụfọdụ ndị na-eje ozi n’ebe ahụ ka ha gaa sụwa ụzọ. Ọ bụ ihe e mere ụfọdụ ndị na-eje ozi na Betel mgbe e kpokọtara alaka ụlọ ọrụ dị na Denmak, Nọọwee, na Swidin, ha ana-azazi alaka ụlọ ọrụ Skandinevia. Otu nwanna aha ya bụ Florian na Anja nwunye ya so ná ndị a gwara ka ha gaa sụwa ụzọ. Ha kwuru, sị: “Anyị ji obi ụtọ kweta ịrụ ọrụ ọhụrụ a e nyere anyị n’agbanyeghị na ọ dịghị mfe. Anyị ghọtara na o nweghị ihe karịrị ijere Jehova ozi, ebe ọ sọkwara ya bụrụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na otú o sirila gọzie anyị enweghị atụ.” Ọ bụ eziokwu na e nwere ike ụdị ihe a agaghị eme ọtụtụ n’ime anyị, anyị kwesịrị ikweta ịrụ ọrụ ọ bụla e nyere anyị otú a ụmụnna ndị a mere ma buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. (Aịza. 6:8) Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-agọzi ndị niile na-anaghị eji ọrụ ha na ya na-arụkọ egwu egwu, ebe ọ sọkwara ha na-eje ozi.

KA OBI NA-ADỊ GỊ ỤTỌ NA GỊ NA JEHOVA NA-ARỤKỌ ỌRỤ

16. (a) Gịnị ka Ndị Galeshia 6:4 gwara anyị ka anyị mee? (b) Olee ihe ùgwù kachanụ mmadụ ọ bụla nwere?

16 Anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-ejikarị onwe anyị atụnyere ndị ọzọ. Ma, Baịbụl gwara anyị ka anyị lekwasị anya n’ihe anyị ga-emeli. (Gụọ Ndị Galeshia 6:4.) Ọtụtụ n’ime anyị esoghị ná ndị na-ahazi ihe a na-eme ná nzukọ Jehova. Ọ bụghị anyị niile ga-abụ ndị okenye, ndị ọsụ ụzọ, ndị ozi ala ọzọ, ma ọ bụ ndị na-eje ozi na Betel. Ihe ùgwù ndị a mara mma. Ma, anyị ekwesịghị ichefu na ihe  ùgwù kachanụ bụ ihe ùgwù anyị niile nwere, ya bụ, na anyị na-ekwusa ozi ọma, bụrụ ndị ha na Jehova na-arụkọ ọrụ. Anyị ekwesịghị iji ihe ùgwù a gwuo egwu.

17. Ebe ọ bụ na anyị bi n’ụwa Setan, gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi? Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịda mbà?

17 Ebe ọ bụ na anyị ka bi n’ụwa Setan, e nwere ihe ụfọdụ anyị na-agaghị emeli n’ozi Jehova n’ihi otú ihe si dịrị anyị. E nwere ike inwe ihe ụfọdụ anyị na-agaghị agbanweli, dị ka ọrụ anyị na-arụ n’ezinụlọ ma ọ bụ ihe gbasara ahụ́ ike anyị. Ma, o kwesịghị ime ka anyị daa mbà. Echela na gị na Jehova agaghị arụkọli ọrụ. I nwere ike iji ohere ọ bụla na-ekwusa gbasara aha ya na Alaeze ya. Ihe kacha mkpa bụ iji ike gị niile na-ejere Jehova ozi ma na-arịọ ya ka ọ gọzie ụmụnna gị ndị na-eme ihe ị na-agaghị emeli n’ozi ya. Cheta na Jehova ji ndị niile na-eto aha ya kpọrọ ihe.

18. Olee ihe anyị kwesịrị ịdị njikere ịhapụgodị? N’ihi gịnị?

18 N’agbanyeghị na anyị ezughị okè, obi dị Jehova ụtọ na anyị na ya na-arụkọ ọrụ. Anyị anaghị eji ihe ùgwù a anyị nwere n’oge ikpeazụ a egwu egwu. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịdị njikere ịhapụgodị ịna-achụ ọtụtụ n’ime ihe ndị na-amasị anyị ebe ọ bụ na anyị ma na n’ụwa ọhụrụ, Jehova ga-eme ka anyị nweta “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,” ya bụ, ndụ ebighị ebi. Mgbe ahụ, a ga-enwe udo na obi ụtọ.—1 Tim. 6:18, 19.

Ì ji ozi ị na-ejere Chineke kpọrọ ihe? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 ruo nke 18)

19. Olee ihe ọma Jehova kwere nkwa imere anyị n’ọdịnihu?

19 Ebe ọ bụ na ụwa ọhụrụ adịla ezigbo nso, cheta ihe Mozis gwara ụmụ Izrel mgbe ọ fọrọ obere ka ha banye n’Ala Nkwa ahụ. Ọ gwara ha, sị: “Jehova bụ́ Chineke gị ga-emekwa ka i nwee ọbụna karịa ihe ga-ezuru gị n’ihe niile aka gị na-arụ.” (Diut. 30:9) Amagedọn gachaa, Chineke ga-ewere ụwa nye ndị ha na ya nọ na-arụkọ ọrụ kemgbe. Anyị ga-enwezi ọrụ ọhụrụ anyị ga-arụwa mgbe ahụ, ya bụ, ime ka ụwa ghọọ paradaịs mara mma.