Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌKTOBA 2014

 AKỤKỌ NDỤ

Ihe Ndị Dị Mkpa Merenụ n’Ozi M Na-ejere Jehova

Ihe Ndị Dị Mkpa Merenụ n’Ozi M Na-ejere Jehova

N’afọ 1947, ndị ụkọchukwu Katọlik nọ na Santa Ana dị n’El Salvadọ malitere inye Ndịàmà Jehova nsogbu. Ka ụmụnna nọ na-enwe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche n’ebe ndị ozi ala ọzọ bi, ụmụ okorobịa si n’ọnụ ụzọ na-atụbata nnukwu okwute. N’oge na-adịghị anya, ndị ụkọchukwu du ndị ọzọ bịa. Ụfọdụ n’ime ha ji ọkụ, ndị ọzọ ejiri ihe a kpụrụ akpụ. Ruo awa abụọ, ha nọ na-atụ okwute n’ụlọ ahụ ma na-eti mkpu, sị: “Ka Meri dị ogologo ndụ, ka Jehova nwụọ.” Ha chọrọ imenye ndị ozi ala ọzọ ahụ ụjọ ka ha si n’obodo ahụ pụọ. Ihe mere m ji mara bụ na m so ná ndị ozi ala ọzọ ahụ. M gakwara ọmụmụ ihe ahụ e nwere iri afọ isii na asaa gara aga. *

AFỌ abụọ tupu ihe a emee, mụ na onye ozi ala ọzọ ibe m aha ya bụ Evelyn Trabert gụchara akwụkwọ na klas nke anọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ebe ụlọ akwụkwọ ahụ dị n’oge ahụ dị nso n’Ịtaka dị na Niu Yọk. A gwara anyị ka anyị gaa jewe ozi na Santa Ana. M jere ozi n’ebe ahụ ihe fọrọ obere ka o ruo afọ iri abụọ na itoolu. Ma, tupu mụ akọọ otú m si jee ozi ala ọzọ, ka m kọọ ihe mere m ji kpebie ije ozi ala ọzọ.

OTÚ EZINỤLỌ ANYỊ SI MỤTA EZIOKWU

A mụrụ m n’afọ 1923 n’otu obodo a na-akpọ Spokan, nke dị na Wọshịntịn dị n’Amerịka. Aha papa m bụ John Olson, aha mama m abụrụ Eva Olson. Ha na-aga chọọchị Luta, ma ha ekwetaghị ozizi ọkụ ala mmụọ chọọchị ahụ na-akụzi. Ha ekwetaghị na Chineke ga-ata ndị mmadụ ahụhụ ebe ọ bụ na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. (1 Jọn 4:8) N’oge ahụ, papa m na-arụ n’ebe a na-eme bred. N’otu abalị, onye ya na ya na-arụ ọrụ gwara ya na Baịbụl anaghị akụzi na Chineke na-ata ndị mmadụ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ. N’oge na-adịghị anya, Ndịàmà Jehova malitere ịmụrụ papa m na mama m Baịbụl. Ha mụtara ihe Baịbụl kwuru na-eme mmadụ ma ọ nwụọ.

M dị naanị afọ itoolu mgbe ahụ. Ma, m ka na-echeta ụdị obi ụtọ papa m na mama m nwere n’ihi eziokwu ndị ha na-amụta. Obi tọrọ ha ezigbo ụtọ mgbe ha mụtara na aha Chineke bụ Jehova nakwa na Baịbụl anaghị akụzi na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu. Ha kụziiri m ihe ha na-amụta. Eji m nwayọọ nwayọọ na-amụta ‘eziokwu Baịbụl nke na-eme ka  mmadụ nwere onwe ya.’ (Jọn 8:32) N’ihi ya, ịgụ Baịbụl na-atọ m ụtọ. O nwetụbeghị mgbe m chere na ịmụ ya na-agwụ ike. N’agbanyeghị na m bụ onye ihere, m na-eso papa m na mama m aga ozi ọma. E mere ha baptizim n’afọ 1934, meekwa mụnwa n’afọ 1939, mgbe m dị afọ iri na isii.

Foto mụ na papa m na mama m sere ná mgbakọ anyị nwere n’afọ 1941 na Sent Luwis dị na Mizuri

N’ọnwa asaa n’afọ 1940, papa m na mama m rere ụlọ anyị, anyị akwaga n’obodo Kọdilen dị n’Aịdaho. Anyị atọ bidoro ịsụ ụzọ n’ebe ahụ. Anyị nwetara ụlọ n’otu ụlọ elu. Anyị bi n’elu, ala ya abụrụ ebe a na-anọ arụzi ụgbọala. Ọgbakọ anyị na-anọ n’ụlọ anyị enwe ọmụmụ ihe. N’oge ahụ, ọ bụ naanị ọgbakọ ole na ole nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ihi ya, ọtụtụ ọgbakọ na-anọ n’ụlọ ndị mmadụ ma ọ bụ n’ụlọ ha na-akwụ ụgwọ ya enwe ọmụmụ ihe.

N’afọ 1941, mụ na papa m na mama m gara mgbakọ e nwere na Sent Luwis dị na Mizuri. Ihe a kpọrọ ụbọchị ikpeazụ ná mgbakọ ahụ bụ “Ụbọchị Ụmụaka.” A gwara ndị dị n’agbata afọ ise na iri na asatọ ka ha nọrọ n’oche ihu. Mgbe ọ fọrọ obere ka Nwanna Joseph F. Rutherford kwuchaa okwu ya, ọ gwara anyị bụ́ ụmụaka, sị: “Unu niile . . . bụ́ ụmụaka . . . ndị kwetara irubere Chineke na Eze ya isi, biko bilienụ ọtọ.” Anyị niile biliri. O kwuziri, sị: “Leenụ ihe karịrị puku ndị ọhụrụ iri na ise na-ekwusa gbasara Alaeze Chineke.” Ọ bụ mgbe ahụ ka m kpebiri na m ga-eji ndụ m niile sụọ ụzọ.

EBE A GWARA EZINỤLỌ ANYỊ KA ANYỊ GAA JEWE OZI

Ọnwa ole na ole e nwechara mgbakọ ahụ, a gwara ezinụlọ anyị ka anyị kwaga n’obodo Ọksnad, nke dị n’ebe ndịda Kalịfọnịa. A gwara anyị ka anyị gaa malite ọgbakọ n’ebe ahụ. Anyị bi n’ụgbọala e ji mere ụlọ, nke nwere naanị otu àkwà. N’abalị ọ bụla, a na-edoziri m elu tebụl anyị na-anọ eri nri, mụ ehie na ya. Ọ dịghị ka mgbe ahụ m nwere ọnụ ụlọ nke m.

Tupu anyị akwaga Kalịfọnịa, ndị Japan tụrụ bọmbụ n’otu ọdụ ụgbọ mmiri a na-akpọ Pel Habọ, dị na Hawaị, n’abalị asaa n’ọnwa iri na abụọ n’afọ 1941. N’echi ya, Amerịka sooro lụwa Agha Ụwa nke Abụọ. Ndị ọchịchị nyere iwu ka a na-agbanyụsị ọkụ n’abalị. N’ihi ya, mgbe anyị rutere ebe ahụ, anyị na-agbanyụ ọkụ anyị niile n’abalị. N’oge ahụ, ndị Japan ji ụgbọ mmiri ha ndị na-agba n’okpuru mmiri na-agagharị n’osimiri dị n’akụkụ obodo Kalịfọnịa. Ihe mere ndị ọchịchị ji nye iwu ahụ ha nyere bụ ka ebe niile gbaa ọchịchịrị, ka ndị agha Japan ghara ịhụ ebe ha ga-atụ bọmbụ ha n’abalị.

Mgbe ọnwa ole na ole gara, ya bụ, n’ọnwa itoolu n’afọ 1942, anyị gara Mgbakọ Ọchịchị Chineke nke Ụwa Ọhụrụ na Klivland dị n’Ohayo. Ná mgbakọ ahụ, Nwanna Nathan H. Knorr kwuru okwu isiokwu ya bụ “Udo—Ọ̀ Ga-adịgide?” Ọ kọwara ihe e kwuru ná Mkpughe isi iri na asaa. Ebe ahụ kwuru gbasara “anụ ọhịa” nke “dịbu adị, ma ọ dịkwaghị, ma ọ ga-esikwa n’abis rịgota.” (Mkpu. 17:8, 11) Nwanna Knorr kwuru na “anụ ọhịa ahụ” bụ Njikọ Mba Niile nke kwụsịrị ịrụ ọrụ n’afọ 1939. Baịbụl kwuru na a ga-eji òtù ọzọ dochie anya ya, nke ga-eme ka e nwee obere oge udo. Ọ bụ ihe mere n’afọ 1945 mgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri. “Anụ ọhịa” ahụ mechara si n’abis rịgota, a kpọọ ya Òtù Mba Ụwa. Ndịàmà Jehova bidoziri ikwusa ozi ọma n’ọtụtụ mba ndị ọzọ n’ụwa. Kemgbe ahụ, ọtụtụ ndị abatala n’ọgbakọ.

Asambodo e nyere m mgbe m gụchara akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied

Amụma ahụ mere ka m ghọta na a ka nwere nnukwu ọrụ a ga-arụ. N’ihi ya, mgbe a mara ọkwa na Ụlọ Akwụkwọ Gilied ga-amalite n’afọ na-eso ya, m chọsiri ike ịga ya ma bụrụ onye ozi ala ọzọ. N’afọ 1943, a gwara m ka m gaa sụwa ụzọ na Pọtland dị n’Oregọn. N’oge ahụ, ọ na-abụ anyị gaa n’ụlọ ndị mmadụ, anyị ejiri gramafon kpọnyere ha okwu si na Baịbụl. Ha gechaa ya, anyị enye ha akwụkwọ e ji  amụ Baịbụl nke kwuru gbasara Alaeze Chineke. N’afọ ahụ niile, m nọ na-eche gbasara ozi ala ọzọ.

N’afọ 1944, obi tọrọ m ụtọ mgbe m natara akwụkwọ ozi e ji kpọọ m ka m bịa Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ezigbo enyi m bụ́ Evelyn Trabert ga-esokwa aga. Ruo ọnwa ise, ndị nkụzi anyị gosiri anyị otú anyị ga-esi na-amụ Baịbụl, ya ana-atọ anyị ụtọ. Otú ha si dị umeala n’obi masịrị anyị. Mgbe ụfọdụ, ọ na-abụ anyị na-eri nri, ha ana-ejere anyị ozi. Anyị gụchara akwụkwọ n’abalị iri abụọ na abụọ n’ọnwa mbụ n’afọ 1945.

MGBE M BỤ ONYE OZI ALA ỌZỌ

N’ọnwa isii n’afọ 1946, mụ na Evelyn nakwa Nwanna Leo Mahan na Esther nwunye ya gara n’ebe e zigara anyị n’El Salvadọ. Anyị hụrụ na ókèala ebe ahụ “achaala maka owuwe ihe ubi.” (Jọn 4:35) Ihe ahụ m kọrọ ná mmalite gosiri otú iwe si ju ndị ụkọchukwu obi mgbe ahụ. Naanị otu izu tupu mgbe ahụ, anyị ka nwechara mgbakọ sekit mbụ anyị nwere na Santa Ana. Anyị gara ọtụtụ ebe gwa ndị mmadụ ka ha bịa gere okwu ihu ọha a ga-ekwu. Obi dịkwa anyị ezigbo ụtọ na ndị bịara ya fọrọ obere ka ha ruo narị mmadụ ise. Kama isi n’obodo ahụ pụọ, anyị kpebisikwuru ike ịnọrọ ma nyere ndị chọrọ ịmụta eziokwu aka. Ndị ụkọchukwu gwara ndị mmadụ ka ha ghara ịgụ Baịbụl. Ọ bụkwa mmadụ ole na ole ga-azụli Baịbụl. Ma, ọtụtụ ndị chọrọ ka a kụziere ha eziokwu. Obi dị ha ụtọ na anyị na-amụ asụsụ Spanish ka anyị nwee ike ịkụziri ha gbasara Jehova na nkwa o kwere ime ka ụwa bụrụ Paradaịs.

Ihe a bụ mụ na ụfọdụ ụmụ klas anyị n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. E zigara anyị ise n’El Salvadọ. Si n’aka ekpe gaa n’aka nri: Evelyn Trabert, Millie Brashier, Esther Mahan, mụnwa, na Leo Mahan

Otu nwaanyị aha ya bụ Rosa Ascencio so ná ndị mbụ m mụụrụ Baịbụl. N’oge ahụ, ya na otu nwoke bi. Ma, onye ahụ alụghị ya alụ. Mgbe ọ malitere ịmụ Baịbụl, ọ hapụrụ nwoke ahụ. Nwoke ahụ malitekwara ịmụ Baịbụl. Ha abụọ mechara lụọ, e mee ha baptizim, ha ejirikwa obi ha niile na-ejere Jehova ozi. Rosa bụ ọsụ ụzọ mbụ bụ́ onye Santa Ana. *

Rosa nwere obere ebe ọ na-anọ ere ihe a na-eri eri. Ọ na-abụ, ya gawa ozi ọma, ya agbachie ụlọ ahịa ya ma tụkwasị Jehova obi na ọ ga-egboro ya mkpa ya. Ya lọta ozi ọma meghee ụlọ ahịa ya, ọtụtụ ndị na-abịa azụ ya ihe. Ihe a mere ka ọ ghọta na ihe ahụ Jizọs kwuru na Matiu 6:33 bụ eziokwu. O ji obi ya niile jeere Jehova ozi ruo mgbe ọ nwụrụ.

Anyị bụ́ ndị ozi ala ọzọ dị mmadụ isii. Onye nwe ụlọ ebe anyị bi bụ otu nwoke bụ́ ọchụnta ego a ma ama. Otu ụbọchị, otu ụkọchukwu bịara gwa ya na ọ bụrụ na ọ chụpụghị anyị, a ga-achụpụ ya na nwunye ya na chọọchị. Nwoke ahụ atụghị ụkọchukwu ahụ ụjọ. Kama, ọ gwara ya na ya achọghị ịma ma à ga-achụpụ ya ma ọ bụ na a gaghị achụpụ ya. Ihe ndị ụkọchukwu na-eme agwụla ya ike. Ọ gwara anyị biri n’ebe ahụ ruo mgbe anyị chọrọ ịpụ.

OTÚ OTU ONYE A NA-AKWANYERE ÙGWÙ N’OBODO AHỤ SI GHỌỌ ONYEÀMÀ JEHOVA

Ihe a bụ alaka ụlọ ọrụ a rụrụ n’afọ 1955

Na San Salvadọ bụ́ isi obodo ahụ, e nwere otu nwoke bụ́ injinịa aha ya bụ Baltasar Perla. Otu nwanna nwaanyị bụ́ onye ozi ala ọzọ malitere ịmụrụ nwunye  nwoke ahụ Baịbụl. Nwoke ahụ ekweghịzi na Chineke n’ihi na ọ chọpụtara na ndị ndú okpukpe bụ ndị ihu abụọ. Ma, o nwere obiọma. Mgbe a chọrọ ịrụ alaka ụlọ ọrụ dị n’El Salvadọ, ọ bụ ya sere ụkpụrụ ụlọ ahụ a chọrọ ịrụ ma nye aka rụọ ya n’anaghị ego ọ bụla. N’oge ahụ, ọ ghọbeghị Onyeàmà Jehova.

Ya na ọtụtụ ụmụnna rụkọrọ ọrụ mgbe a na-arụ alaka ụlọ ọrụ ahụ, ya emezie ka ọ ghọta na ya achọtala nke bụ́ ezigbo okpukpe. E mere ya baptizim n’abalị iri abụọ na abụọ n’ọnwa asaa n’afọ 1955. N’oge na-adịghị anya, e mekwara Paulina nwunye ya baptizim. Ụmụ abụọ ha mụtara ji obi ha niile na-ejere Jehova ozi. Nwa ha nwoke aha ya bụ Baltasar, Jr. ejeela ozi afọ iri anọ na itoolu na Betel dị na Bruklin. Ọrụ ọ na-arụ ebe ahụ na-akwado ozi ọma anyị na-ekwusa n’ụwa niile. Ugbu a, o so na Kọmitii Alaka Ụlọ Ọrụ anyị dị n’Amerịka. *

Mgbe anyị malitere inwe mgbakọ distrikti na San Salvadọ, Nwanna Perla nyeere anyị aka inweta otu nnukwu ebe ndị mmadụ na-anọ emega ahụ́. Mgbe mbụ anyị nwere mgbakọ n’ebe ahụ, e nwere ọtụtụ oche ndị mmadụ na-anọghị. Ma, ka oge na-aga, Jehova gọziri mbọ anyị na-agba. Ọtụtụ ndị na-abịakwu ya kwa afọ. N’oge na-adịghị anya, ebe ahụ abaghịzi anyị. Ná mgbakọ ndị ahụ, ahụrụ m ụfọdụ ndị m mụụrụ Baịbụl. Anyị gaa mgbakọ, ndị m mụụrụ Baịbụl na-abịa gosi m ndị ọhụrụ hanwa mụụrụ ihe, e mee ha baptizim. Obi na-adị m ezigbo ụtọ ma m hụ ha. Ọ na-adị m ka hà bụ ụmụ ụmụ m.

Ebe Nwanna F. W. Franz na-agwa ndị ozi ala ọzọ okwu ná mgbakọ distrikti

N’otu mgbakọ, otu nwanna nwoke bịakwutere m gwa m na ya chọrọ ịrịọ m mgbaghara. Amataghịzi m ya. M nọ na-eche ihe mere o ji chọọ ịrịọ m mgbaghara. Ọ gwara m, sị, “Eso m n’ụmụ okorobịa ndị ahụ na-atụ unu okwute na Santa Ana.” Obi dị m ezigbo ụtọ na o sozi m na-efe Jehova. Ihe a mere ka o doo m anya na ozi oge niile bụ ihe kacha baa uru mmadụ ga-eji ndụ ya mee.

Ihe a bụ mgbakọ sekit mbụ anyị gara n’El Salvadọ

EKPEBIRI M IME IHE NDỊ BAARA M URU

M jere ozi ala ọzọ n’El Salvadọ ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri abụọ na itoolu. M bu ụzọ jee ozi na Santa Ana, si ebe ahụ gaa Sọnsonate. E mechaa mụ agaa Santa Tekla. Ebe ikpeazụ m jere ozi bụ na San Salvadọ. N’oge ahụ, papa m na mama m emeela  agadi, chọọkwa ka m na-enyere ha aka. N’ihi ya, mgbe m kpechara ekpere ugboro ugboro, ekpebiri m ịhapụ ozi ala ọzọ m na-eje ma laghachi Spokan n’afọ 1975.

Papa m nwụrụ n’afọ 1979. M nọzi na-elekọta mama m ruo afọ asatọ. Ike adịghịzi ya mgbe ahụ. N’ihi ya, o nweghị ihe ọ na-emeli ma ọ bụrụ na mụ enyereghị ya aka. Ọ nwụrụ mgbe ọ dị afọ iri itoolu na anọ. Oge ahụ adịghịrị m mfe. Ike gwụchara m n’ihi na anaghị m ezu ike, obi anaghịkwa adị m mma. E nwere ọkọ ọjọọ ghara m n’ahụ́ nke na-afụ m ezigbo ụfụ. Ma, Jehova nọ na-akwado m. Ọ dị m nnọọ ka ò ku m n’aka ma na-elekọta m. Ọ zara ekpere m ma nyere m aka idi nsogbu ahụ niile. N’Aịzaya 46:4, Jehova kwuru, sị, ‘Ruo mgbe mmadụ nwere isi awọ́, mụ onwe m ga na-eku ya, na-ebu ya, meekwara ya ụzọ mgbapụ.’ Ọ bụ ihe a ka Jehova meere m.

N’afọ 1990, m gara biri n’Omak dị na Wọshịntịn. N’ebe ahụ, m malitere ikwusa ozi ọma n’ebe a na-asụ asụsụ Spanish. O mere ka m ghọta na m ka bara uru. E mere ọtụtụ ndị m na-amụrụ Baịbụl baptizim. Ka oge na-aga, enweghịzi m ike ilekọta ụlọ m dị n’Omak. N’ihi ya, n’ọnwa Nọvemba afọ 2007, m gara biri na Chilan dị na Wọshịntịn. Ebe ahụ dị nso n’Omak. Ọgbakọ Spanish m so na-amụ ihe n’ebe a na-elekọta m nke ọma kemgbe ahụ. Obi dị m ezigbo ụtọ. Ebe ọ bụ naanị m bụ nwanna mere agadi n’ọgbakọ ahụ, ha hụrụ m n’anya ma were m ka nne nne ha.

Ekpebiri m na agaghị m alụ di nakwa na m gaghị amụ ụmụ ka m nwee ike ijekwuru Jehova ozi “n’enweghị ndọpụ uche.” (1 Kọr. 7:34, 35) Ma, m nwere ọtụtụ ndị m ji mere ụmụ n’ọgbakọ. Ama m na ihe niile agaghị ezuru m n’ụwa a. N’ihi ya, ebu m ụzọ na-eme ihe ka mkpa, ya bụ, iji obi m niile na-ejere Jehova ozi. N’ụwa ọhụrụ, m ga-enwe oge ga-ezuru m ime ihe niile m chọrọ ime. Amaokwu Baịbụl kacha atọ m ụtọ bụ Abụ Ọma 145:16, bụ́ ebe Jehova kwere nkwa na ya ga-ewere “ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ.”

Ịsụ ụzọ emeela ka m dị gara gara

M dị afọ iri itoolu na otu ugbu a, ahụ́ ka dịtụkwa m mma. N’ihi ya, m ka na-asụ ụzọ. Ịsụ ụzọ emeela ka m dị gara gara, meekwa ka ndụ m baa ezigbo uru. Mgbe m gara ọhụrụ n’El Salvadọ, a ka malitere ikwusa ozi ọma n’obodo ahụ amalite. N’agbanyeghị mbọ niile Setan na-agba ka ọ kwụsị ozi anyị, e nweziri ihe karịrị puku ndị nkwusa iri atọ na itoolu n’obodo ahụ. Ihe a niile emeela ka okwukwe m sikwuo ike. O doro anya na mmụọ nsọ Jehova na-akwado mbọ ndị na-efe Chineke na-agba.

^ para. 4 Gụọ Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 1981, peeji nke 45 ruo nke 46. Ọ dị n’asụsụ Bekee.

^ para. 19 Gụọ Akwụkwọ Mgbaafọ 1981, peeji nke 41 ruo nke 42. Ọ dị n’asụsụ Bekee.

^ para. 24 Gụọ Akwụkwọ Mgbaafọ 1981, peeji nke 66-67, 74-75. Ọ dị n’asụsụ Bekee.