Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) SEPTEMBA 2014

Na-echeta Ndị Nọ n’Ozi Oge Niile

Na-echeta Ndị Nọ n’Ozi Oge Niile

“Anyị na-eburu n’uche mgbe niile ọrụ unu ji ikwesị ntụkwasị obi na-arụ na ndọgbu unu ji ịhụnanya na-adọgbu onwe unu n’ọrụ.”—1 TESA. 1:3.

1. Olee otú obi dị Pọl maka ndị ji obi ha niile fee Jehova?

PỌL onyeozi chetara ndị ji obi ha niile kwado ozi ọma Alaeze Chineke. O kwuru, sị: “Anyị na-eburu n’uche mgbe niile ọrụ unu ji ikwesị ntụkwasị obi na-arụ na ndọgbu unu ji ịhụnanya na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ntachi obi unu n’ihi olileanya unu nwere n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst n’ihu Chineke bụ́ Nna anyị.” (1 Tesa. 1:3) Jehova na-echeta mbọ niile ndị ji obi ha niile na-ejere ya ozi na-agba, ma ihe ha ga-emeli ò hiri nne ma ọ̀ dị obere.—Hib. 6:10.

2. Gịnị na gịnị ka anyị ga-eleba anya n’isiokwu a?

2 Ọtụtụ ndị ohu Jehova, ma n’oge ochie ma n’oge anyị a, ahapụla ọtụtụ ihe ka ha nwee ike ijekwuru Jehova ozi. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú ụfọdụ ndị si jeere Jehova ozi n’oge ndịozi Jizọs. Anyị ga-elebakwa anya n’ụfọdụ ozi oge niile e nwere taa nakwa otú anyị ga-esi na-echeta ụmụnna anyị ndị a wepụtara onwe ha ije ụdị ozi a.

NDỊ KRAỊST OGE MBỤ

3, 4. (a) N’oge ndịozi Jizọs, olee ụzọ dị iche iche ụfọdụ ndị si jeere Jehova ozi? (b) Olee otú e si gbooro ha mkpa ha?

3 N’oge na-adịghị anya e mechara Jizọs baptizim, ọ malitere ikwusa ozi ọma ga-ezu ụwa niile. (Luk 3:21-23; 4:14, 15, 43)  Mgbe ọ nwụchara, ọ bụ ndịozi ya haziri ozi ọma a a na-ekwusa. (Ọrụ 5:42; 6:7) Ụfọdụ Ndị Kraịst hapụrụ ụlọ ha gaa na-eje ozi ná mba ọzọ. Dị ka ihe atụ, Filip kwusara ozi ọma n’obodo dị iche iche dị na Palestaịn. (Ọrụ 8:5, 40; 21:8) Pọl na ndị ọzọ kwusakwara ozi ọma n’ọtụtụ mba dị anya n’ebe ha bi. (Ọrụ 13:2-4; 14:26; 2 Kọr. 1:19) E nwere ụfọdụ Ndị Kraịst so dee Baịbụl nakwa ndị bụ́ ndị odeakwụkwọ ha. Ụfọdụ n’ime ha bụ Mak, Luk, na Silvenọs (ya bụ, Saịlas). (1 Pita 5:12) Ọtụtụ ụmụnna nwaanyị so ụmụnna ndị a rụọ ọrụ. (Ọrụ 18:26; Rom 16:1, 2) Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst kọrọ ihe ndị na-eme obi ụtọ gbasara ụmụnna ndị a. Ihe ndị ahụ na-egosi na Jehova ji ozi ndị ohu ya na-eje kpọrọ ihe, na-egbokwara ha mkpa ha.

4 N’oge ndịozi Jizọs, olee otú ndị ozi oge niile si nweta ego ha ji gboo mkpa ha? Mgbe ụfọdụ, Ndị Kraịst ibe ha na-enye ha onyinye ma ọ bụ lee ha ọbịa. Ma, ha anaghị agwa ụmụnna ka ha mee otú ahụ. (1 Kọr. 9:11-15) Ụfọdụ ụmụnna na ụfọdụ ọgbakọ ji aka ha kpebie ịkwado ha. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 16:14, 15; Ndị Filipaị 4:15-18.) Pọl na ndị ha na ya so rụkwara ọrụ mgbe ụfọdụ ka ha nwee ike inweta ego ha ga-eji na-egbo mkpa ha.

NDỊ NA-EJE OZI OGE NIILE TAA

5. Gịnị ka otu nwanna na nwunye ya kwuru banyere otú ha si jiri ndụ ha jee ozi oge niile?

5 Taa, ọtụtụ ụmụnna na-agbasi mbọ ike ka ha nwee ike ịna-eje ụdị ozi oge niile dị iche iche. (Gụọ igbe bụ́ “ Ụdị Ozi Oge Niile Dị Iche Iche E Nwere.”) Olee otú obi na-adị ha ma ha cheta ụdị ozi a ha na-eje? Ọ bụrụ na ị jụọ ụfọdụ n’ime ha ajụjụ a, ihe ha ga-agwa gị ga-agba gị ume. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna nwoke nke jerela ụdị ozi oge niile dị iche iche, ya bụ, ịsụ ụzọ oge niile, ịsụ ụzọ pụrụ iche, ije ozi ala ọzọ, na ije ozi na Betel ná mba ọzọ. O kwuru, sị: “Ije ozi oge niile bụ otu n’ime mkpebi kacha mma m merela ná ndụ. Mgbe m dị afọ iri na asatọ, amaghị m ihe m ga-eme eme, ma m̀ ga-aga mahadum, jiri oge m niile na-arụ ọrụ ego, ka ọ̀ bụ ịmalite ozi oge niile. Ihe ndị m hụrụla ná ndụ emeela ka m ghọta na Jehova anaghị echefu ihe ọ bụla anyị hapụrụ ka anyị nwee ike ije ozi oge niile. Ejirila m nkà ọ bụla Jehova nyere m mee ihe ndị m na-agaraghị emeli ma a sị na m chụụrụ ihe nke ụwa gawa.” Nwunye ya kwuru, sị: “Ọrụ ọ bụla e nyere anyị emeela ka m na-emekwu nke ọma n’ozi Jehova. Ọtụtụ mgbe, anyị na-ahụ otú Jehova si na-eduzi anyị ma na-echebe anyị. Ọ garaghị adị otú ahụ ma a sị na anyị agbaghị mbọ jekwuoro Jehova ozi. Ana m ekele Jehova kwa ụbọchị na anyị ji ndụ anyị jee ozi oge niile.” Ị̀ chọrọ ka obi dị gị ụtọ otú ahụ ma i cheta ihe i ji ndụ gị na-eme?

6. Olee otú obi dị Jehova maka ozi anyị na-ejere ya?

6 O doro anya na otú ihe si dịrị ụfọdụ ndị agaghị ekwe ha banye n’ozi oge niile ugbu a. Ma, obi siri anyị ike na Jehova ji ozi ha ji obi ha niile na-ejere ya kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, na Faịlimọn 1-3, Pọl kelere ụmụnna niile nọ n’ọgbakọ dị na Kọlọsi, kpọọkwa aha ụfọdụ n’ime ha. (Gụọ ya.) Ma Jehova ma Pọl ji ha kpọrọ ihe. Jehova anaghịkwa eji ozi gịnwa na-ejere ya egwu egwu. Ma, olee otú i nwere ike isi na-akwado ndị na-eje ozi oge niile taa?

OTÚ ANYỊ NWERE IKE ISI NYERE NDỊ ỌSỤ ỤZỌ AKA

7, 8. Gịnị ka ndị ọsụ ụzọ na-eme? Olee otú ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ nwere ike isi nyere ha aka?

7 Ndị kwusara ozi ọma n’oge ndịozi gbara ọgbakọ ume. Taa, ozi ndị ọsụ ụzọ na-eje na-agba ọgbakọ ume. Kwa ọnwa, ọtụtụ n’ime ha na-eji iri awa asaa aga ozi ọma. Olee otú i nwere ike isi nyere ha aka?

8 Otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ aha ya bụ Shari kwuru, sị: “E nwere ike iche na ndị ọsụ ụzọ siri ike n’ihi na ha na-aga ozi ọma kwa ụbọchị. Ma, e kwesịrị ịna-agba ha ume.” (Rom 1:11, 12) Nwanna nwaanyị  ọzọ sụrụla ụzọ ọtụtụ afọ kwuru na ndị ọsụ ụzọ nọ n’ọgbakọ ha na-arụsi ọrụ ike. O kwukwara na ọ bụrụ na ndị ọzọ akpọọ ha ka ha bịa soro ha rie nri, nye ha ego ha ga-eji gbaa ụgbọ ma ọ bụ mee ihe ndị ọzọ dị ha mkpa, obi na-adị ha ụtọ. Ọ na-emekwa ka ha ghọta na ndị ọzọ hụrụ ha n’anya.

9, 10. Olee otú ụfọdụ ndị sirila nyere ndị ọsụ ụzọ nọ n’ọgbakọ ha aka?

9 Ụzọ ọzọ anyị nwere ike isi nyere ndị ọsụ ụzọ aka bụ iso ha na-aga ozi ọma. Otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ aha ya bụ Bobbi kwuru, sị: “Anyị chọkwuru ndị anyị na ha ga na-eso aga ozi ọma n’etiti izu.” Ọsụ ụzọ ọzọ ya na ya nọ n’ọgbakọ kwuru, sị: “Ịhụ ndị anyị na ha ga-eso aga ozi ọma n’ehihie na-esi ezigbo ike.” Otu nwanna nwaanyị na-eje ozi ugbu a na Betel dị na Bruklin kwuru otú e si nyere ya aka mgbe ọ na-asụ ụzọ. O kwuru, sị: “Otu nwanna nwaanyị nwere ụgbọala gwara m, sị: ‘Mgbe ọ bụla ị na-ahụghị onye gị na ya ga-aga ozi ọma, kpọọ m, m ga-eso gị gaa.’ Ihe ahụ o mere mere ka m ghara ịkwụsị ịsụ ụzọ.” Ọsụ ụzọ ahụ aha ya bụ Shari kwuru, sị: “A gachaa ozi ọma lọta, ndị ọsụ ụzọ na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-anọkarị naanị ha. I nwere ike ịkpọ ha ka ha bịa soro unu nwee ofufe ezinụlọ mgbe ụfọdụ ma ọ bụ soro unu mee ihe ndị ọzọ. Ọ ga-eme ka obi dị ha ụtọ.”

10 E nwere otu nwanna nwaanyị sụrụla ụzọ ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ iri afọ ise. Tupu ya alụọ di, e nyeere ya na ụmụnna nwaanyị ndị ọzọ bụ́ ndị ọsụ ụzọ na-alụbeghị di aka. O kwuru otú e si nyere ha aka, sị: “Ọ na-abụ ọnwa ole na ole gaa, ndị okenye agaa leta ndị ọsụ ụzọ. Ha na-ajụ anyị gbasara ahụ́ ike anyị na ọrụ anyị, na-achọkwa ịma ma ò nwere ihe na-echu anyị ụra. Ihe a ha na-ajụ anyị na-esi ha n’obi. Ha na-abịa ebe anyị bi ka ha mara ma ò nwere aka ha ga-enyere anyị.” Ihe ndị okenye a na ụmụnna ndị ọzọ na-eme na-echetara anyị otú Onesịfọrọs si nyere Pọl aka n’agbanyeghị na o nwere ezinụlọ ọ na-elekọta.—2 Tim. 1:18.

11. Gịnị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na-arụ?

11 N’ọgbakọ ụfọdụ, e nwere ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Kwa ọnwa, ọtụtụ n’ime ha na-eji otu narị awa na iri atọ aga ozi ọma. Ha anaghị enwe oge ha ga-eji arụ ọrụ ego n’ihi  na ha na-ejikarị oge ha aga ozi ọma, na-arụkwa ọrụ ndị ọzọ a na-arụ n’ọgbakọ. Alaka ụlọ ọrụ na-enye ha ego mmachi akpa kwa ọnwa ka ha nwee ike iji oge ha niile na-eje ozi ha.

12. Olee otú ndị okenye na ụmụnna ndị ọzọ nwere ike isi nyere ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche aka?

12 Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche aka? E nwere otu okenye na-eje ozi n’otu alaka ụlọ ọrụ. Ya na ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche akparịtala ụka. O kwuru, sị: “Ndị okenye na ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche kwesịrị ịna-akparịta ụka. Ndị okenye kwesịrị ịchọpụta otú ihe si dịrị ha ma kpebie otú ha ga-esi enyere ha aka. Ụfọdụ ụmụnna chere na a na-egboro ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche mkpa ha niile ebe ọ bụ na a na-enye ha ego mmachi akpa. Ma, e nwere ọtụtụ ụzọ ụmụnna nọ n’ọgbakọ ha nwere ike isi na-enyere ha aka.” Otú ahụ obi na-adị ndị ọsụ ụzọ oge niile ụtọ ma ụmụnna pụta soro ha rụọ n’ozi ọma ka ọ na-adị ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ì nwere ike iso ha rụọ n’ozi ọma?

OTÚ ANYỊ NWERE IKE ISI NYERE NDỊ NLEKỌTA SEKIT AKA

13, 14. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi gbasara ndị nlekọta sekit na ndị nwunye ha? (b) Olee otú i nwere ike isi nyere ndị nlekọta sekit aka?

13 Ndị nlekọta sekit na ndị nwunye ha ma nke a na-akọ n’ọgbakọ. Okwukwe ha siri ezigbo ike. Ha na-agbakwa anyị ume. Ma, anyị ekwesịghị ichefu na anyị kwesịkwara ịna-agba ha ume, soro ha na-arụ n’ozi ọma, kpọọ ha ka ha soro anyị tụrụ ndụ. Ọ bụrụ na onye nlekọta sekit ma ọ bụ nwunye ya nọ n’ụlọ ọgwụ ma ọ bụkwanụ na ọ na-agbake n’ọrịa, obi ga-adị ya ụtọ ma anyị gaa leta ya, nyekwa aka na-egboro ya mkpa ya. Ì chetara Luk bụ́ onye dere akwụkwọ Ọrụ Ndịozi? Baịbụl kpọrọ ya “ọgwọ ọrịa, onye a hụrụ n’anya.” Chegodị otú o si lekọta Pọl na ndị ha na ya so mgbe ha na-eleta ọgbakọ dị iche iche.—Kọl. 4:14; Ọrụ 20:5–21:18.

14 Obi na-adị ndị nlekọta sekit na ndị nwunye ha ụtọ ma ọ bụrụ na anyị egosi ha na anyị hụrụ ha n’anya ma na-agba ha ume. Otu onye nlekọta sekit dere, sị: “O yiri ka ndị enyi m hà na-ama mgbe e kwesịrị ịgba m ume. Ha na-ajụ m ụdị ajụjụ na-enyere m aka ikwu ihe na-echegbu m. Otú ha si ege m ntị nke ọma na-enyere m ezigbo aka.” Obi na-adị ndị nlekọta sekit na ndị nwunye ha ezigbo ụtọ ma ọ bụrụ na ụmụnna egosi na ihe gbasara ha na-emetụ ha n’obi.

OTÚ I NWERE IKE ISI NA-AKWADO NDỊ NA-EJE OZI NA BETEL

15, 16. Olee ọrụ ndị na-eje ozi na Betel na ndị na-elekọta Ụlọ Mgbakọ na-arụ? Olee otú anyị nwere ike isi na-akwado ha?

15 Ndị na-eje ozi na Betel na ndị na-elekọta Ụlọ Mgbakọ na-arụ ọrụ dị mkpa e ji na-akwado ozi ọma a na-ekwusa. Ọ bụrụ na ndị Betel nọ n’ọgbakọ unu ma ọ bụ na sekit unu, olee otú i nwere ike isi gosi na ị na-echeta ha?

16 Mgbe ha bịara ọhụrụ na Betel, agụụ ịga hụ ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha nwere ike ịna-agụsi ha ike. Obi na-adị ha ezigbo ụtọ ma ọ bụrụ na ndị ọzọ na-eje ozi na Betel na ụmụnna nọ n’ọgbakọ ha emete ha enyi. (Mak 10:29, 30) Ọrụ ndị nọ na Betel na-arụ na-enye ha ohere ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma n’izu ọ bụla. Ma mgbe ụfọdụ, a na-enye ha ọrụ ha ga-arụ mgbe a gbasara ọrụ. Ọ bụrụ na ụmụnna aghọta ihe ndị a ma gosi na obi dị ha ụtọ maka ọrụ ndị Betel na-arụ, ọ ga-abara mmadụ niile uru.—Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 2:9.

OTÚ ANYỊ NWERE IKE ISI NYERE NDỊ OZI OGE NIILE NA-EJE OZI NÁ MBA ỌZỌ AKA

17, 18. Olee ọrụ ndị ozi oge niile na-eje ozi ná mba ọzọ na-arụ?

17 E nwere ụfọdụ ndị ozi oge niile na-eje ozi ná mba ọzọ. Nri ndị ebe ahụ, asụsụ ha,  omenala ha, na otú ihe si dị n’ebe ahụ nwere ike ịdị iche. Gịnị mere ha ji kpebie ịga jewe ozi n’ebe ahụ?

18 Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ozi ala ọzọ. Ha na-ejikarị oge ha ekwusa ozi ọma. N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-erite uru n’ọzụzụ pụrụ iche e nyere ha. Alaka ụlọ ọrụ na-enye ha ebe ha ga-ebi na ego mmachi akpa ha ga-eji na-egbo mkpa ha. E nwere ndị na-eje ozi ná mba ọzọ a na-agwa ka ha gaa jewe ozi n’alaka ụlọ ọrụ, nweekwa ndị nke na-aga enye aka arụ alaka ụlọ ọrụ, ọfis ndị nsụgharị, Ụlọ Mgbakọ, ma ọ bụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. A na-enye ha nri, ụlọ, na ihe ndị ọzọ dị ha mkpa. Ha na-agachi ọmụmụ ihe na ozi ọma anya otú ahụ ndị Betel na-eme. N’ihi ya, ha na-abara ọgbakọ ezigbo uru.

19. Olee otú i nwere ike isi nyere ndị ozi oge niile bịara ije ozi n’obodo unu aka?

19 Olee otú i nwere ike isi gosi na ị na-echeta ndị ozi oge niile bịara ije ozi n’obodo unu? Cheta na mgbe ha bịara ọhụrụ, iri nri ụfọdụ a na-eri n’obodo unu nwere ike ịna-esiri ha ike. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị kpọọ ha ka ha bịa rie nri n’ụlọ gị, i nwere ike ịjụ ha ihe ha ga-achọ iri nakwa ma hà chọrọ iri nri ha na-eritụbeghị. Nweere ha ndidi ka ha na-agbalị ịmụta asụsụ unu na otú e si eme ihe n’ebe unu. O nwere ike iwetụ oge tupu ha aghọta ihe niile ị na-ekwu. Ma, i kwesịrị iji obiọma nyere ha aka ịmụta otú e si akpọ okwu. Ha chọrọ ịmụta ya.

20. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị na-echeta ndị nọ n’ozi oge niile na ndị mụrụ ha?

20 Ndị nọ n’ozi oge niile nwere ike mewe agadi. Otú ahụ ka ọ dịkwa papa ha na mama ha. Ọ bụrụ na papa ha na mama ha bụ Ndịàmà Jehova, ha nwere ike ịchọsi ike ka ụmụ ha ka nọrọ na-eje ozi ha. (3 Jọn 4) Ndị nọ n’ozi oge niile ga-eme ihe niile ha nwere ike ime ka ha nwee ike ilekọta papa ha na mama ha. Ha ga-agbakwa mbọ na-aga eleta ha ugboro ugboro. Ma, ụmụnna ndị bi nso nwere ike inyere ndị nọ n’ozi oge niile aka na-elekọta papa ha na mama ha mere agadi ma ọ bụrụ na ha chọrọ enyemaka. Anyị kwesịrị icheta na ndị nọ n’ozi oge niile na-arụsi ọrụ ike. Ha na-akwado ozi ọma Alaeze Chineke, nke bụ́ ọrụ kacha mkpa a na-arụ n’ụwa taa. (Mat. 28:19, 20) Ọ bụrụ na e nwere onye nọ n’ozi oge niile papa ya na mama ya chọrọ enyemaka, gịnwa ma ọ bụ ọgbakọ unu ò nwere ike inye aka?

21. Olee otú obi na-adị ndị nọ n’ozi oge niile ma ọ bụrụ na ndị ọzọ na-enyere ha aka ma na-agba ha ume?

21 Ihe mere ụmụnna ji abanye n’ozi oge niile abụghị maka na ha chọrọ ịba ọgaranya. Kama ọ bụ maka na ha chọrọ inye Jehova ihe kacha mma ha nwere ma nyere ndị ọzọ aka. Obi ga-adị ha ezigbo ụtọ maka aka ọ bụla i nyeere ha. Otu nwanna nwaanyị na-eje ozi oge niile ná mba ọzọ kwuru, sị: “E nye mmadụ kaadị iji kelee ya, ọ ga-eme ka ọ ghọta na ndị ọzọ bu ya n’obi nakwa na obi dị ha ụtọ maka ihe ọ na-arụ.”

22. Olee otú obi dị gị gbasara ozi oge niile?

22 Ije ozi oge niile bụ ihe kacha mma mmadụ ga-eji ndụ ya mee. O nweghị ihe na-eme obi ụtọ karịa ya. Ndị nọ n’ozi oge niile nwere ike ịmụta àgwà na ihe ndị ọzọ ga-abara ha uru ma ugbu a ma n’ụwa ọhụrụ. Ka anyị niile na-echeta mgbe niile ọrụ ndị nọ n’ozi oge niile ‘ji ikwesị ntụkwasị obi na-arụ na ndọgbu ha ji ịhụnanya na-adọgbu onwe ha n’ọrụ.’—1 Tesa. 1:3.