Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) SEPTEMBA 2014

Ị̀ ‘Na-agbalị Ka I Ruo Eruo’?

Ị̀ ‘Na-agbalị Ka I Ruo Eruo’?

E NWERE otu nwanna aha ya bụ Fernando. * Mgbe ndị okenye abụọ gwara ya na ha chọrọ ịhụ ya, ọ chịịrị obi n’aka. Ugboro ole na ole onye nlekọta sekit bịara leta ọgbakọ ha, ndị okenye gwara ya ihe ndị ọ ga-eme ka o nwee ike iru eru ka e nyekwuo ya ihe ùgwù n’ọgbakọ. Ka oge na-aga, Fernando malitere iche ma à ga-emecha họpụta ya ka ọ bụrụ okenye. Ma, ọ dịbeghị anya onye nlekọta sekit bịara ọzọ leta ọgbakọ ha. Gịnị ka ndị okenye ga-agwa Fernando na nke ugbu a?

Fernando nọ na-ege ntị ka otu n’ime ndị okenye ahụ na-agwa ya okwu. Ọ gwara ya ihe e kwuru na 1 Timoti 3:1, kwuokwa na ndị okenye natara akwụkwọ ozi gosiri na a họpụtala ya ka ọ bụrụ okenye. O juru Fernando anya, ya ajụọ ya, sị, “Ị̀ sị gịnị?” Okenye ahụ kwuru ihe ahụ ọzọ, Fernando achịtụ ọchị. Mgbe e mechara maa ọkwa n’ọgbakọ na a họpụtala ya ka ọ bụrụ okenye, obi tọrọ mmadụ niile ụtọ.

Ọ̀ bụ ihe ọjọọ ma mmadụ chọọ ka e nyekwuo ya ihe ùgwù n’ọgbakọ? Mba. Timoti nke Mbụ isi atọ amaokwu mbụ kwuru na “ọ bụrụ na onye ọ bụla na-agbalị ka o ruo eru ịbụ onye nlekọta, agụụ ezi ọrụ na-agụ ya.” Ọtụtụ ụmụnna nwoke na-eme ihe a Baịbụl kwuru. Ha na-agbalị na-eme nke ọma n’ọgbakọ ka e nwee ike inyekwu ha ihe ùgwù n’ọgbakọ. Ọ bụ ya mere e ji nwee ọtụtụ puku ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ná nzukọ Chineke. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị na-abata n’ọgbakọ, a chọkwuru ụmụnna nwoke na-agba mbọ ka ha ruo eruo ịbụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi. Olee otú ụmụnna nwoke kwesịrị isi na-agbalị ka ha ruo eruo? Ò kwesịrị ịna-echu ha ụra, otú ahụ o churu Fernando?

GỊNỊ KA MMADỤ ‘ỊGBALỊ KA O RUO ERUO’ PỤTARA?

Na Baịbụl, okwu Grik e si na ya sụgharịta mmadụ ‘ịgbalị ka o ruo eruo’ pụtara ịchọsi ihe ike, mmadụ ịmatị aka ka o were ihe. Ihe nwere ike ịbata mmadụ n’obi bụ onye na-amatị aka ka ọ ghọrọ mkpụrụ osisi chara acha. Ma, ọ bụrụ na mmadụ “na-agbalị ka o ruo eru,” ọ pụtaghị na onye ahụ ji anyaukwu na-azọ ka ọ bụrụ “onye nlekọta.” Ọ̀ bụ maka gịnị?  Ọ bụ maka na mkpa ndị ji obi ha niile chọọ ịbụ ndị okenye kwesịrị ịbụ ka ha rụọ “ezi ọrụ,” ọ bụghị ka ha nweta ọkwá.

Na 1 Timoti 3:2-7 nakwa na Taịtọs 1:5-9, e kwuru ọtụtụ ihe mmadụ kwesịrị ime ka o ruo eruo ịrụ ezi ọrụ a. E nwere otu nwanna aha ya bụ Raymond. Ọ bụ okenye kemgbe ọtụtụ afọ. O kwuru gbasara ihe ndị ahụ Baịbụl kwuru ụmụnna na-agbalị ka ha ruo eruo ịrụ ezi ọrụ kwesịrị ime. Ọ sịrị: “Ihe m chere kacha mkpa bụ àgwà anyị. Ikwu okwu na ịkụzi ihe dị mkpa. Ma, ha adịghị mkpa karịa mmadụ ịbụ onye a na-apụghị ikwujọ ekwujọ, onye na-emeru ihe n’ókè, onye uche ya zuru okè, onye na-eme ihe n’usoro, onye na-ele ọbịa, na onye nwere ezi uche.”

‘Gbalịa ka i ruo eruo.’ Otú ị ga-esi eme ya bụ iso na-eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ

Nwanna nwoke nke na-agbalị ka o ruo eruo anaghị etinye aka n’ihe ọ bụla bụ́ aghụghọ ma ọ bụ omume rụrụ arụ. Ọ na-esi otú ahụ egosi na ọ naghị eme ihe ọ bụla ga-eme ka e kwujọwa ya. Ọ bụ onye na-emeru ihe n’ókè, onye uche ya zuru okè, onye na-eme ihe n’usoro, na onye nwere ezi uche. N’ihi ya, obi na-esi ụmụnna ike na ọ ga-agwa ha ihe ha kwesịrị ime nakwa na ọ ga-enyere ha aka ma ha nwee nsogbu. Ọ na-ele ndị mmadụ ọbịa. Ọ bụ ya mere o ji agba ma ndị na-eto eto ma ndị batara ọhụrụ n’ọgbakọ ume. Ọ na-akasi ma ndị na-arịa ọrịa ma ndị agadi obi, na-enyekwara ha aka, n’ihi na ọ hụrụ ezi ihe n’anya. Ọ na-eme ihe a niile ka ha baara ndị ọzọ uru, ọ bụghị ka a hụ ya ma họpụta ya. *

Obi na-adị ndị okenye ụtọ ịdụ mmadụ ọdụ ma gbaa ya ume. Ma, ọ bụ onye ahụ na-agbalị ka o ruo eruo ga-ahụ na ya mere ihe ndị ahụ Akwụkwọ Nsọ kwuru mmadụ ga-eme tupu a họpụta ya. E nwere otu nwanna nwoke aha ya bụ Henry. Ọ bụ okenye kemgbe ọtụtụ afọ. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị na-agbalị ka i ruo eruo ịbụ okenye, gbasie mbọ ike ka a ghọta na i ruru eru ka a họpụta gị.” O kwuru ihe ahụ e kwuru n’Ekliziastis 9:10 ma sị: “‘Ihe niile ruru gị aka ime, jiri ike gị dum mee ha.’ Jiri obi gị niile mee ihe ọ bụla ndị okenye gwara gị. Jiri obi ụtọ na-arụ ọrụ ọ bụla e nyere gị n’ọgbakọ, ọ bụrụgodị na ọ bụ ịza Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ka oge na-aga, ndị okenye ga-eme ihe gosiri na ha na-ahụ ihe ị na-eme na mbọ ị na-agba.” Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ okenye, na-arụsi ọrụ ike  ma kwesị ntụkwasị obi n’ihe niile a na-eme n’ozi Jehova. Àgwà gị kwesịrị igosi na ị dị umeala n’obi, ọ bụghị na i nwere oké ọchịchọ.—Mat. 23:8-12.

JỤ ECHICHE NA-EZIGHỊ EZI NA OMUME NA-ADỊGHỊ MMA

O nwere ike ịdị ụfọdụ ndị chọrọ ka e nye ha ihe ùgwù n’ọgbakọ ka ọ̀ bụ ha kwuo na ha chọrọ ụdị ihe ahụ, ma ọ bụkwanụ ha achọwa otú ha ga-esi mee ka ndị okenye tụọ aro ka a họpụta ha. E nwere ndị obi na-anaghị adị mma ma ndị okenye dụọ ha ọdụ. Ha kwesịrị ịjụ onwe ha, sị, ‘Ihe mere m ji chọọ ịbụ okenye ọ̀ bụ maka uru m ga-erite, ka ọ̀ bụ maka na m chọrọ iji obi umeala na-elekọta atụrụ Jehova?’

Ndị chọrọ ịbụ ndị okenye ekwesịghị ichefu ihe ọzọ Baịbụl kwuru na ndị okenye kwesịrị ime, ya bụ, na ha ‘ga-aghọrọ ìgwè atụrụ ahụ ihe nlereanya.’ (1 Pita 5:1-3) Onye ọ bụla bụụrụ ọgbakọ ihe nlereanya anaghị aghọ aghụghọ. Ọ na-enwe ndidi ma à họpụtara ya ugbu a ma ọ bụ na a họpụtaghị ya. Mmadụ ịbụ okenye anaghị eme ka onye ahụ ghara ịna-emejọ ihe. (Ọnụ Ọgụ. 12:3; Ọma 106:32, 33) Ihe ọzọ bụ na nwanna nwoke nwere ike ịna-eche na ‘ọ dịghị ihe ọjọọ ọ bụla ya mere,’ ma ya abụrụ na e nwere ihe nwere ike ime ka ụfọdụ ndị na-ele ya anya ọjọọ. (1 Kọr. 4:4) N’ihi ya, ọ bụrụ na ndị okenye ejiri Baịbụl dụọ gị ọdụ, wetuo obi gee ha ntị, gbalịakwa mee ihe ha kwuru.

GỊNỊ KA I KWESỊRỊ IME MA Ọ BỤRỤ NA Ọ DỊ GỊ KA Ì CHEELA OGOLOGO OGE?

Ọ na-adị ụfọdụ ụmụnna ka hà cheere ogologo oge tupu a họpụta ha. Ọ bụrụ na ọ dịla anya ‘ị na-agbalị ka i ruo eruo ịbụ onye nlekọta,’ ọ̀ na-echu gị ụra mgbe ụfọdụ? Ọ bụrụ otú ahụ, cheta na Baịbụl kwuru, sị: “Ihe a na-atụ anya ya nke e yigharịrị oge ya na-eme ka obi daa ọrịa, ma ihe a na-achọsi ike bụ osisi nke ndụ mgbe ọ bịara.”—Ilu 13:12.

Obi nwere ike ịjọ mmadụ njọ ma ọ bụrụ na o yiri ka ihe ọ na-atụ anya inweta erughị ya aka. E nwere mgbe ọ dị Ebreham otú ahụ. Jehova kwere ya nkwa na ọ ga-amụta nwa nwoke. Ma, mgbe ọtụtụ afọ gara, ya na Sera nwunye ya amụtabeghị nwa. (Jen. 12:1-3, 7) Ọ bụ ya mere na mgbe ọ kawara nká, o kwuru, sị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, gịnị ka ị ga-enye m, ebe ọ bụ na amụtaghị m nwa . . . Ọ dịghị mkpụrụ i nyere m.” Jehova mere ka ọ ghọta na ya ga-emezu nkwa ahụ ya kwere. Ma, ihe ruru afọ iri na anọ gara tupu Jehova emee ihe ahụ o kwuru.—Jen. 15:2-4; 16:16; 21:5.

N’oge ahụ Ebreham nọ na-eche, ò ji obi ọjọọ na-ejere Jehova ozi? Mba. Obi siri ya ike na Chineke ga-emezu nkwa ya. Ọ nọ na-atụ anya na ihe ga-emecha dị mma. Pọl onyeozi dere, sị: “Mgbe Ebreham nwesịrị ndidi, ọ natara nkwa a.” (Hib. 6:15) Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile mechara gọzie Ebreham karịa otú ọ tụrụ anya ya. Gịnị ka i nwere ike ịmụta n’ihe a a kọrọ banyere Ebreham?

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ okenye ma a họpụtabeghị gị n’agbanyeghị na ọtụtụ afọ agaala, akwụsịla ịtụkwasị Jehova obi. Ekwela ka o mee ka i jiri obi ọjọọ na-ejere Jehova ozi. E nwere otu nwanna nwoke aha ya bụ Warren. O nyerela ọtụtụ ụmụnna nwoke aka ka ha mekwuo nke ọma n’ọgbakọ. O kwuru, sị: “E kwesịghị ịhọpụta nwanna ọkụ ọkụ. Tupu a họpụta ya, o kwesịrị ido anya na o ruru eru. Ka oge  na-aga, otú o si akpa àgwà na otú o si arụ ọrụ e nyere ya ga-eme ka e jiri nwayọọ nwayọọ mata ihe ndị ọ ga-emeli na otú o si ele ihe anya. Ụfọdụ ndị chere na naanị ihe ga-egosi na ha na-eme nke ọma bụ ma ọ bụrụ na e nyere ha ihe ùgwù ma ọ bụ họpụta ha ka ha bụrụ nke a ma ọ bụ nke ọzọ. Ụdị echiche a adịghị mma. O nwere ike ime ka ihe gbasara ihe ùgwù na-echu mmadụ ụra. Ọ bụrụ na i ji obi gị niile na-ejere Jehova ozi n’ebe ọ bụla ị nọ nakwa n’ihe ọ bụla ị na-eme, ị na-eme nke ọma.”

Otu nwanna nwoke cheere ruo ihe karịrị afọ iri tupu a họpụta ya ka ọ bụrụ okenye. O ji ihe a kọwara n’Ezikiel isi mbụ mee ka a mata ihe ọ mụtara. O kwuru, sị: “Jehova na-anya ụgbọ ịnyịnya ya, ya bụ, nzukọ ya, ka ọ na-agba otú ọ chọrọ. Ọ bụ oge Jehova ka mkpa, ọ bụghị nke anyị. A bịa n’ihe gbasara ịbụ okenye, ihe ka m mkpa abụghị onwe m, ya bụ, ihe m chọrọ ma ọ bụ ihe m chọrọ ịbụ. Ihe m chọrọ nwere ike ọ gaghị abụ ihe Jehova ma na ọ dị m mkpa.”

Ọ bụrụ na ị na-atụ anya na otu ụbọchị, ị ga-arụ ezi ọrụ ndị okenye na-arụ, gbaa mbọ ka i ruo eruo. Otú ị ga-esi eme ya bụ ime ihe ndị ga-eme ka obi dị ndị nọ n’ọgbakọ ụtọ. Ọ bụrụ na ọ dị gị ka à na-egbu oge, nwee ndidi, echegbula onwe gị. N’isiokwu a, anyị kwuru gbasara nwanna nwoke aha ya bụ Raymond. O kwuru, sị: “Oké ọchịchọ na-eme ka obi ghara ịdị mmadụ mma. Ozi Jehova na-eme obi ụtọ. Ma, ọ bụrụ na mmadụ na-echegbukarị onwe ya, ọ gaghị eji obi ụtọ na-ejere Jehova ozi.” Gbalịa na-akpakwu àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke, nke ka nke, gbalịa na-enwe ndidi. Gbalịa na-amụ Baịbụl n’ihi na ọ ga-eme ka gị na Jehova dịkwuo ná mma. Na-agakwu ozi ọma, na-amụkwara ndị nwere mmasị Baịbụl. Hụ na ezinụlọ gị ji ofufe Jehova kpọrọ ihe nakwa na unu na-enwe ofufe ezinụlọ. Ka obi dị gị ụtọ mgbe ọ bụla gị na ụmụnna gị nọ. Ka ị na-agba mbọ ka i ruo eruo, ị ga-eji obi ụtọ na-ejere Jehova ozi ugbu a.

Jehova chọrọ ka anyị na-agba mbọ ka anyị ruo eruo inweta ihe ùgwù n’ọgbakọ. O so n’ihe ọma o meere anyị. Ya na nzukọ ya achọghị ka obi na-ajọ ndị na-agba mbọ ka ha ruo eruo njọ ma ọ bụkwanụ ka ha ghara inwe obi ụtọ n’ozi ha na-eje. Chineke na-akwado ndị niile bu ezigbo ihe n’obi na-ejere ya ozi, ọ na-agọzikwa ha. Dịkwa ka ngọzi ya ndị ọzọ, ‘ọ dịghị atụkwasị ihe mgbu na ya.’—Ilu 10:22.

Ọ bụrụgodị na ọ dịtụla anya ị gbawara mbọ ka i ruo eruo, e nwere ihe ndị ị ka nwere ike ịna-eme ka gị na Jehova dịkwuo ná mma. Ka ị na-agba mbọ ịna-akpa àgwà ọma, na-arụsi ọrụ ike n’ọgbakọ ma na-enyere ezinụlọ gị aka, Jehova agaghị echefu ihe ndị i mere n’ozi ya. Ka ijere Jehova ozi na-atọ gị ụtọ mgbe niile n’agbanyeghị ihe a sị gị rụọ.

^ para. 2 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ para. 8 Ihe e kwuru n’isiokwu a gbasakwara ndị na-agbalị ka ha ruo eruo ịbụ ohu na-eje ozi. Na 1 Timoti 3:8-10, 12, 13, e kwuru ihe ha ga-eme tupu a họpụta ha.