Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌGỌST 2014

Na-anụ Olu Jehova n’Ebe Ọ Bụla Ị Nọ

Na-anụ Olu Jehova n’Ebe Ọ Bụla Ị Nọ

“Ntị gị ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị: ‘Lekwa ụzọ.’”—AỊZA. 30:21.

1, 2. Olee otú Jehova si agwa ndị na-efe ya okwu?

KEMGBE ụwa, Jehova na-esi n’ụzọ dị iche iche eduzi ndị na-efe ya. N’oge ochie, o ji ndị mmụọ ozi, ọhụụ, na nrọ gwa ndị mmadụ ihe ga-eme n’ọdịnihu ma ọ bụ ihe ọ chọrọ ka ha mee. (Ọnụ Ọgụ. 7:89; Ezik. 1:1; Dan. 2:19) Mgbe ụfọdụ, ọ họọrọ ndị mmadụ ka ha nọchite anya ya ma gwa ndị ya ihe ọ chọrọ ka ha mee. N’agbanyeghị ụzọ Jehova si gwa ndị ya okwu, ọ gọziri ndị mere ihe ọ gwara ha.

2 Taa, Jehova na-eji Baịbụl, mmụọ nsọ ya, na ọgbakọ ya agwa anyị ihe anyị kwesịrị ime. (Ọrụ 9:31; 15:28; 2 Tim. 3:16, 17) Ihe ọ na-agwa anyị doro ezigbo anya nke na ọ dị ka ànyị na-anụ olu na-asị anyị: “Lekwa ụzọ. Jeenụ ije na ya.” (Aịza. 30:21) Jehova na-esikwa n’aka Jizọs agwa anyị okwu. Ọ họpụtara Jizọs ka o si n’aka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-edu ọgbakọ ya. (Mat. 24:45) Anyị kwesịrị ime ihe Jehova na-agwa anyị taa n’ihi na anyị ga-enweta ndụ ebighị ebi ma ọ bụrụ na anyị erubere ya isi.—Hib. 5:9.

3. Gịnị nwere ike ime ka anyị ghara ime ihe Jehova na-agwa anyị? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

3 Setan ma na ihe Jehova na-agwa anyị ga-eme ka anyị dị ndụ. Ọ bụ ya mere o ji agba mbọ ka o megharịa anyị anya ka anyị ghara ịnụ ihe Jehova na-agwa anyị. Nsogbu ọzọ anyị nwere bụ na obi anyị “dị aghụghọ.” O nwere ike ime ka anyị ghara ịchọ ime ihe Jehova na-agwa anyị. (Jere. 17:9) N’ihi ya, ka anyị leba anya n’otú anyị nwere ike isi merie nsogbu ndị na-eme ka  o siere mmadụ ike ige Jehova ntị. Ihe ọzọ anyị ga-eleba anya na ya bụ otú ige Jehova ntị na ikpegara ya ekpere ga-esi mee ka anyị na ya na-adị ná mma n’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị.

EKWELA KA SETAN GHỌGBUO GỊ

4. Olee otú Setan si agbalị ka o megharịa ndị mmadụ anya?

4 Setan na-eji aghụghọ na ihe ndị na-abụghị eziokwu agbalị ka o megharịa ndị mmadụ anya. (Gụọ 1 Jọn 5:19.) Taa, e nwere ọtụtụ ihe e ji atụrụ ndụ na ihe e ji agbasa ozi n’ụwa niile, ya bụ, akwụkwọ akụkọ, akwụkwọ ndị ọzọ, redio, tiivi, na Ịntanet. Mgbe ụfọdụ, a na-amụta ihe bara uru na ha. Ma, ọtụtụ mgbe, a na-eji ha akwado ụdị omume Jehova kwuru na ọ dịghị mma. (Jere. 2:13) Dị ka ihe atụ, e nwere ike isi na ha na-ekwu na nwoke ịlụ nwoke ibe ya ma ọ bụ nwaanyị ịlụ nwaanyị ibe ya abụghị ihe ọjọọ. O meela ka ọtụtụ ndị chewe na ihe Baịbụl kwuru banyere nwoke idina nwoke na nwaanyị idina nwaanyị anaghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́.—1 Kọr. 6:9, 10.

5. Gịnị ka anyị ga-eme ka Setan ghara iji aghụghọ ya juru n’ụwa taa nweta anyị?

5 Gịnị ka ndị hụrụ Jehova n’anya ga-eme ka Setan ghara iji aghụghọ ya juru n’ụwa taa nweta ha? Olee otú ha ga-esi mata ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ? Baịbụl kwuru na ọ bụ ‘ịkpachara anya na-eme ihe Chineke kwuru.’ (Ọma 119:9) Ihe Chineke kwuru na Baịbụl na-enyere anyị aka ịghọta ihe bụ́ eziokwu na ihe bụ́ ụgha. (Ilu 23:23) Jizọs kwuru na ihe ga-eme ka mmadụ dị ndụ bụ ‘okwu niile na-esi n’ọnụ Jehova apụta.’ (Mat. 4:4) Anyị kwesịrị ịmụta otú anyị ga-esi na-eme ihe Baịbụl kwuru. Dị ka ihe atụ, tupu Mozis edee iwu Jehova nke kwuru na ịkwa iko adịghị mma, Josef ma na ụdị omume ahụ bụ mmehie n’anya Chineke. O chetụdịghị echiche inupụrụ Jehova isi mgbe nwunye Pọtịfa na-anwa ya ka o mee ihe ọjọọ. (Gụọ Jenesis 39:7-9.) N’agbanyeghị na nwaanyị ahụ nọ na-enye ya nsogbu kwa ụbọchị, o kweghị ka olu nwaanyị ahụ mee ka ọ ghara ige Chineke ntị. Ihe ga-enyere anyị aka ịma ihe dị iche n’ihe dị mma na ihe na-adịghị mma bụ ige Jehova ntị ma jụ ụgha Setan na-akụzi ebe niile.

6, 7. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka anyị nwee ike izere ndụmọdụ ọjọọ Setan na-enye?

6 Ihe juru n’ụwa taa bụ ozizi ụgha ndị na-agbagwoju ndị mmadụ anya. O meela ka ọtụtụ ndị chee na ọ baghị uru ka mmadụ chọwa nke bụ́ ezigbo okpukpe. Ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ige Jehova ntị, ọ ga-eme ka ọ dịrị anyị mfe ịmata nke bụ́ eziokwu. Ọ bụ anyị ga-ekpebi onye anyị ga-ege ntị. Ọ bụrụ na mmadụ abụọ na-agwa anyị okwu otu mgbe, ọ ga-esiri anyị ezigbo ike ịghọta ihe ha abụọ na-ekwu. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịmata nke bụ́ ‘olu Jizọs’ ma gee ya ntị. Ọ bụ ya ka Jehova họpụtara ka o lekọtawa atụrụ ya.—Gụọ Jọn 10:3-5.

7 Jizọs kwuru, sị: “Geenụ ntị n’ihe unu na-anụ.” (Mak 4:24) Ndụmọdụ Jehova na-enye anyị doro anya. O zikwara ezi. Ma,  anyị kwesịrị ịkwadebe obi anyị ka anyị nwee ike ige ntị na ya. Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike ịna-ege ntị na ndụmọdụ ọjọọ Setan na-enye kama ige ntị n’ezigbo ndụmọdụ Chineke na-enye anyị. E nwere egwú ndị ụwa, fim ha, ihe ndị ha na-egosi na tiivi, akwụkwọ ndị ụwa, ndị nkụzi, ma ọ bụ ndị a sị na ha bụ ndị ọkachamara. Ekwela ka ọ bụrụ ha ma ọ bụ ndị ụwa gị na ha na-emekọ ihe ga na-agwa gị ihe ị ga na-eme.—Kọl. 2:8.

8. (a) Olee otú obi anyị nwere ike isi mee ka ọ dịrị Setan mfe inweta anyị? (b) Gịnị nwere ike ime anyị ma ọ bụrụ na anyị eleghara ihe ndị gosiri na anyị nwere nsogbu anya?

8 Setan ma na mmehie dị anyị n’ọbara. N’ihi ya, ọ na-agba mbọ ka anyị na-eme ihe ọjọọ na-agụ anyị agụụ. Ihe a ọ na-eme nwere ike ime ka o siere anyị ezigbo ike ịna-erubere Jehova isi. (Jọn 8:44-47) Gịnị ga-enyere anyị aka imeri nsogbu a? Chegodị banyere onye ji ihe gbasara ikpori ndụ ugbu a kpọrọ mkpa ma mechaa mee ihe ọjọọ ọ na-atụghị anya na ọ ga-eme. (Rom 7:15) Gịnị mere o ji baa ná nsogbu? O nwere ike ịbụ na o ji nwayọọ nwayọọ kwụsị ịnụ ihe Jehova na-ekwu. Ma eleghị anya, ọ hụghị ihe ndị gosiri na obi ya enweela nsogbu ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ọ kpachaara anya leghara ihe ndị ahụ anya. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ọ kwụsịrị ikpe ekpere, na-ala azụ n’ozi ọma, ma ọ bụ ya abụrụ na ọ naghịzi agachi ọmụmụ ihe anya. Ihe ndị a emechaa mee ka o mee ihe na-agụ ya, nke ọ ma na ọ bụ ihe ọjọọ. Ụdị ihe a agaghị eme anyị ma ọ bụrụ na anyị ahụ ihe ndị gosiri na anyị nwere nsogbu ma mee ihe anyị kwesịrị ime ozugbo. Ọ bụrụkwa na anyị na-ege Jehova ntị, anyị agaghị egewe ndị si n’ezi ofufe dapụ ntị.—Ilu 11:9.

9. Ọ bụrụ na e nwere ihe ọjọọ na-agụ mmadụ agụụ, gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa ka onye ahụ chọpụta ya n’oge?

9 Ọ bụrụ na mmadụ na-arịa ọrịa, e nwere ike ịgwọta ya ma a chọpụta ya n’oge. Otú ahụkwa ka ọ dị n’ihe gbasara mmehie. Ọ bụrụ na anyị achọpụta na e nwere ihe ọjọọ ndị na-agụ anyị agụụ, anyị nwere ike ịgbara nsogbu ọsọ ma ọ bụrụ na anyị ajụ ihe ahụ ozugbo tupu Setan enweta anyị, meekwa ka anyị ‘mewe uche ya.’ (2 Tim. 2:26) Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị achọpụta na ihe anyị na-eche na ihe na-agụ anyị agụụ adịla iche n’ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme? Anyị kwesịrị ịlaghachikwute Jehova ozugbo, chọsie ndụmọdụ ya ike, jirikwa obi anyị niile mee ihe ọ gwara anyị. (Aịza. 44:22) Anyị kwesịrị ịghọta na e nwere ihe ọ ga-abụ anyị mejọọ, ya akpatara anyị nsogbu na-agaghị ahapụ anyị aka ruo mgbe Alaeze Chineke ga-abịa. Ọ kacha mma ka anyị gbaara ụdị nsogbu ahụ ọsọ  ozugbo. Ọ ga-eme ka anyị ghara ịhapụ Jehova.

Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ndị ga-eme ka okwukwe anyị sie ike, olee otú ọ ga-esi chebe anyị ka Setan ghara inweta anyị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4 ruo nke 9)

GBAARA MPAKO NA ANYAUKWU ỌSỌ

10, 11. (a) Gịnị nwere ike igosi na mmadụ dị mpako? (b) Gịnị ka ihe ọjọọ Kora, Detan, na Abaịram mere na-akụziri anyị?

10 Anyị kwesịrị ịmata na obi anyị nwere ike iduhie anyị. Ezughị okè na-akpa ike n’ahụ́ anyị. Dị ka ihe atụ, chegodị otú mpako na anyaukwu nwere ike isi mee ka anyị ghara ige Jehova ntị, meekwa ka anyị mee ihe nwere ike ịkpatara anyị nsogbu. Ọ bụrụ na mmadụ dị mpako, onwe ya ga na-ebu ya isi. O nwere ike iche na ya nwere ikike ime otú masịrị ya nakwa na o nweghị onye kwesịrị ịgwa ya ihe ọ ga-eme. Ọ bụrụ na ndị okenye ma ọ bụ ụmụnna ndị ọzọ ma ọ bụkwanụ nzukọ Jehova adụọ ya ọdụ, o nwere ike iche na ya etofeela ndụmọdụ ahụ. Ihe Jehova na-ekwu ga na-ada ụdị onye ahụ ka ihe a na-ekwu n’ebe dị ezigbo anya.

11 Mgbe ụmụ Izrel nọ n’ala ịkpa, Kora, Detan, na Abaịram nupụụrụ Mozis na Erọn isi. Mpako mere ka ha jiri aka ha kpebie otú ha ga-esi na-efe Jehova. Gịnị ka Jehova mere? O gburu ha. (Ọnụ Ọgụ. 26:8-10) Ihe dị ezigbo mkpa akụkọ a na-akụziri anyị bụ na inupụrụ Jehova isi na-akpata nsogbu. Ka anyị ghara ichefu na “nganga na-abịa tupu nkụpịa.”—Ilu 16:18; Aịza. 13:11.

12, 13. (a) Nye ihe atụ nke gosiri otú anyaukwu nwere ike isi kpata nsogbu. (b) Kọwaa ihe anyaukwu nwere ike iji nwayọọ nwayọọ mee mmadụ ma ọ bụrụ na onye ahụ akwụsịghị ya.

12 Ihe ọzọ na-akpata nsogbu bụ anyaukwu. Onye dị anyaukwu na-eme ihe ọ bụla masịrị ya. Ọ na-akpachara anya eme ihe ọjọọ. Dị ka ihe atụ, e nwere otu ọchịagha ndị Siria aha ya bụ Neaman. Mgbe Ịlaịsha onye amụma gwọchara ya ekpenta ya, o wepụtara onyinye ọ chọrọ inye Ịlaịsha, ma o kweghị anara ya. Ma, Gehezaị bụ́ onye na-ejere Ịlaịsha ozi chọrọ inweta onyinye ahụ n’ihi na ọ dị anyaukwu. Ọ gwara onwe ya, sị: “Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ, m ga-achụwa ya [ya bụ, Neaman] wee nata ya ihe.” Gehezaị mịpụrụ ma chụrụ Neaman gawa. Ọ ghaara Neaman ụgha ka o nwee ike ịnata ya “otu talent ọlaọcha na uwe mgbanwe abụọ.” Gịnị mere Gehezaị n’ihi ihe a o mere nakwa n’ihi ụgha ọ ghaara onye amụma Jehova? Ekpenta zuru ya ahụ́.—2 Eze 5:20-27.

13 Mmadụ nwere ike inwewe anyaukwu nwayọọ nwayọọ, ma ọ bụrụ na ọ kwụsịghị ya, o nwere ike ịla ya n’iyi. Ihe Baịbụl kọrọ gbasara Ekan na-eme ka anyị mata ihe anyaukwu na-eme mmadụ. Ekan kwuru, sị: “Mgbe m hụrụ uwe pụrụ iche, nke mara mma, bụ́ nke si Shaịna, n’etiti ihe nkwata ahụ, hụkwa narị shekel ọlaọcha abụọ na otu mkpirisi ọlaedo, nke ịdị arọ ya dị iri shekel ise, ha gụrụ m agụụ, m wee chịrị ha.” Ekan kwesịrị ịjụ ihe ọjọọ ahụ gụrụ ya agụụ. Kama ime otú ahụ, o zuuru ihe ndị ahụ gaa zoo ha n’ụlọikwuu ya. Mgbe Jehova mere ka a mata ihe o mere, Jọshụa gwara ya na Jehova ga-ewetara ya nsogbu. E ji nkume tụgbuo Ekan na ndị ezinụlọ ya n’ụbọchị ahụ. (Jọsh. 7:11, 21, 24, 25) Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyaukwu nwere ike ime anyị ihe ahụ o mere Ekan. N’ihi ya, ka anyị ‘lezie anya ka anyị ghara inwe ụdị anyaukwu ọ bụla.’ (Luk 12:15) Ọ bụ eziokwu na ihe ọjọọ ma ọ bụ omume rụrụ arụ nwere ike ịbata anyị n’obi mgbe ụfọdụ, anyị kwesịrị ịgba mbọ ka anyị wepụ ya ozugbo ka ọ ghara ime ka anyị mee mmehie.—Gụọ Jems 1:14, 15.

14. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na obi anyị na-agwa anyị mee ihe na-adịghị mma n’ihi mpako na anyaukwu?

14 O doro anya na mpako na anyaukwu na-akpata nsogbu. Ọ bụrụ na anyị echee echiche banyere nsogbu ime ihe ọjọọ ga-akpatara  anyị, ọ ga-eme ka anyị ghara ikwe ka o mee ka anyị ghara ịna-anụ olu Jehova. (Diut. 32:29) Na Baịbụl, ezi Chineke na-agwa anyị ihe anyị kwesịrị ime na uru anyị ga-erite ma anyị mee ya nakwa nsogbu ime ihe ọjọọ ga-akpatara anyị. Ọ bụrụ na obi anyị na-agwa anyị ka anyị mee ihe n’ihi mpako ma ọ bụ anyaukwu, anyị kwesịrị iji ire anyị gụọ ezé anyị ọnụ. Anyị kwesịrị iche nsogbu ihe ahụ ga-akpatara anyị na ndị anyị hụrụ n’anya nakwa otú ọ ga-esi mee ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma.

KA GỊ NA JEHOVA NA-EKWURỊTA OKWU MGBE NIILE

15. Gịnị ka ihe Jizọs mere kwesịrị ịkụziri anyị?

15 Jehova chọrọ ka ihe gaziere anyị. (Ọma 1:1-3) Ọ na-agwa anyị ihe anyị kwesịrị ime n’oge ọ dị anyị mkpa. (Gụọ Ndị Hibru 4:16.) N’agbanyeghị na Jizọs zuru okè, ọ ghọtara na ya na Jehova kwesịrị ịna-ekwurịta okwu. Ọ bụ ya mere o ji na-ekpegara Jehova ekpere mgbe niile. Jehova sikwa n’ụzọ dị iche iche kwado ya ma gwa ya ihe o kwesịrị ime. O zigara ndị mmụọ ozi ka ha jeere Jizọs ozi. O nyere ya mmụọ nsọ, nyekwara ya aka ịhọrọ ndịozi iri na abụọ. O si n’eluigwe kwuo okwu ugboro ugboro iji gosi na ya kwadoro Jizọs nakwa na ihe ya masịrị ya. (Mat. 3:17; 17:5; Mak 1:12, 13; Luk 6:12, 13; Jọn 12:28) Anyị kwesịrị ime otú ahụ Jizọs mere, ya bụ, iji obi anyị niile na-ekpegara Chineke ekpere. (Ọma 62:7, 8; Hib. 5:7) Ekpere ga-enyere anyị aka ka anyị na Jehova dị ná mma mgbe niile, meekwa ka otú anyị si ebi ndụ na-ewetara ya otuto.

16. Olee otú Jehova si enyere anyị aka ka anyị nwee ike ịna-anụ olu ya?

16 Jehova anaghị amanye anyị ka anyị mee ihe ọ gwara anyị. Ma, o mere ka ọ dịrị anyị mfe ịmata ihe ọ chọrọ ka anyị mee. Anyị kwesịrị ịrịọ ya ka o nye anyị mmụọ nsọ ya. Ọ ga-enye anyị ya n’ụba. (Gụọ Luk 11:10-13.) Ma, anyị kwesịrị ‘ilezi anya otú anyị si aṅa ntị.’ (Luk 8:18) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị na-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka ka anyị ghara ime omume rụrụ arụ, ma anyị ana-ele ndị gba ọtọ ma ọ bụ fim na-egosi ebe a na-eme omume rụrụ arụ, ọ pụtara na anyị bụ ndị ihu abụọ. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova nyere anyị aka, anyị kwesịrị ịna-aga n’ebe Jehova ga-enye anyị mmụọ nsọ ya, na-emekwa ihe ga-eme ka ọ ghara ịnapụ anyị mmụọ nsọ ya. Anyị ma na mmụọ nsọ ya na-adị n’ọmụmụ ihe anyị. E nweela ọtụtụ ndị ohu Jehova gbaara nsogbu ọsọ n’ihi na ha gere ntị mgbe ha nọ n’ọmụmụ ihe. Ihe ha nụrụ mere ka ha mata na ihe ọjọọ ejirila nwayọọ nwayọọ na-abata ha n’obi. N’ihi ya, ha gbanwere.—Ọma 73:12-17; 143:10.

NA-EGE JEHOVA NTỊ NKE ỌMA

17. Gịnị mere o ji dị njọ ịtụkwasị onwe anyị obi?

17 Chegodị banyere Eze Devid nke chịrị Izrel n’oge ochie. Mgbe ọ dị obere, o meriri Golayat, bụ́ dike ndị Filistia. Devid mechara ghọọ onye agha na eze, ọrụ ya abụrụzie ịna-echebe mba Izrel ma na-ekpebi ihe ga-abara ha uru. Ma, mgbe Devid tụkwasịrị onwe ya obi, obi ya ghọgburu ya, ya na Bat-shiba akwaa iko. Devid mekwara ka e gbuo Yuraya bụ́ di nwaanyị ahụ. Mgbe Jehova dọrọ ya aka ná ntị, o weturu obi kweta na ya mere ihe ọjọọ, meekwa ka ya na Jehova dịkwa ná mma.—Ọma 51:4, 6, 10, 11.

18. Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-ege Jehova ntị?

18 Ka anyị gee ntị na ndụmọdụ dị ná 1 Ndị Kọrịnt 10:12 ma ghara ịtụkwasị onwe anyị obi. Ebe ọ bụ na anyị agaghị ‘eduzili nzọụkwụ anyị,’ ọ bụrụ na anyị egeghị Jehova ntị, ọ pụtara na ọ bụ Setan ka anyị ga-ege ntị. (Jere. 10:23) Ka anyị na-ekpe ekpere mgbe niile, kwe ka mmụọ nsọ na-eduzi anyị, na-egekwa Jehova ntị mgbe niile.