Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌGỌST 2014

‘Laghachi ma Mee Ka Ụmụnna Gị Dị Ike’

‘Laghachi ma Mee Ka Ụmụnna Gị Dị Ike’

PITA bere ezigbo ákwá mgbe ọ gọnahụrụ Jizọs. Ọ bụ eziokwu na o kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka ya na Chineke dị ná mma, Jizọs chọrọ iji ya nyere ndị ọzọ aka. N’ihi ya, Jizọs gwara ya, sị: “Ozugbo ị laghachiri, mee ka ụmụnna gị dị ike.” (Luk 22:32, 54-62) Pita mechara soro ná ndị bụ́ ogidi n’ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ. (Gal. 2:9) Otú ahụ ka ọ dị taa. Ọ bụrụ na mmadụ abụghịzi okenye, o nwere ike imecha bụrụ okenye ọzọ ma jiri obi ụtọ na-eme ka okwukwe ụmụnna ya sie ike.

E nweela ụfọdụ ụmụnna bụ́bu ndị okenye ma e mechaa gwa ha na ha abụghịzi okenye. O nwere ike ime ka ha chewe na mbọ niile ha gbara kụrụ afọ n’ala. E nwere otu nwanna aha ya bụ Julio. * Ọ bụbu okenye na Bolivia ruo ihe karịrị iri afọ abụọ. O kwuru, sị: “Ihe m na-ejikarị oge m eme bụ ịkwado ihe omume m ga-eme, ileta ụmụnna, na ịga nleta ọzụzụ atụrụ. Ma, ihe a niile kwụsịrị n’otu ntabi anya, ya adịzie m ka m̀ gba aka. Nke bụ́ eziokwu bụ na obi gbawara m.” Julio abụrụkwala okenye ugbu a.

‘GỤỌ YA N’IHE ỌṄỤ’

Jems bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs kwuru, sị: “Gụọnụ ya n’ihe ọṅụ, ụmụnna m, mgbe unu zutere ọnwụnwa dị iche iche.” (Jems 1:2) Ọnwụnwa Jems kwuru banyere ya bụ ọnwụnwa na-abịara anyị n’ihi mkpagbu a na-akpagbu anyị nakwa n’ihi ezughị okè anyị. O kwuru gbasara oké ọchịchọ, ile mmadụ anya n’ihu, na ihe ndị ọzọ. (Jems 1:14; 2:1; 4:1, 2, 11) Ọ bụrụ na Jehova adọọ anyị aka ná ntị, o nwere ike iwute anyị. (Hib. 12:11) Ma, o kwesịghị ime ka anyị kwụsị iji obi ụtọ na-ejere ya ozi.

Ọ bụrụgodị na anyị abụghịzi okenye, anyị ka nwere ike ichebara onwe anyị echiche, mara ma  okwukwe anyị ọ̀ ka siri ike nakwa ma ànyị ka hụrụ Jehova n’anya. Anyị nwekwara ike ichebara ihe mere anyị ji bụrụ okenye n’oge ahụ echiche. Ọ̀ bụ n’ihi uru anyị ga-erite, ka ọ̀ bụ n’ihi na anyị hụrụ Chineke n’anya ma kwetasie ike na ọ bụ ya nwe ọgbakọ nakwa na e kwesịrị iji obiọma na-elekọta ụmụnna? (Ọrụ 20:28-30) Ọ bụrụ na nwanna na-abụghịzi okenye ejiri obi ụtọ na-ejere Jehova ozi, ọ ga-eme ka Setan na mmadụ niile ghọta na ọ hụrụ Jehova n’anya n’eziokwu.

Mgbe Jehova dọrọ Eze Devid aka ná ntị maka na o mere mmehie ndị dị oké njọ, Devid nabatara ya, Jehova agbaghara ya. Ọ bụrụ abụ, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye a gbaghaara nnupụisi ya, onye e kpuchiri mmehie ya. Obi ụtọ na-adịrị onye Jehova na-adịghị agụkọrọ njehie, onye aghụghọ na-adịghịkwa na mmụọ ya.” (Ọma 32:1, 2) Aka ná ntị ahụ Jehova dọrọ Devid baara ya ezigbo uru. O doro anya na o mere ka ọ na-elekọtakwu ndị Chineke nke ọma.

Ọ bụrụ na mmadụ abụghịzi okenye ma mechaa bụrụkwa okenye, ọtụtụ mgbe, onye ahụ na-amụtakwu otú ọ ga-esi na-elekọta atụrụ Chineke. Otu okenye ụdị ihe ahụ mere kwuru, sị: “Amụtala m otú m ga-esi na-elekọta ndị mejọrọ ihe.” Okenye ọzọ kwuru, sị: “Aghọtakwuola m na ijere ụmụnna m ozi bụ ezigbo ihe ùgwù.”

Ì NWERE IKE ỊLAGHACHI?

Otu ọbụ abụ dere banyere Jehova, sị: “Ọ gaghị na-ahụta mmejọ mgbe niile.” (Ọma 103:9) N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ emee mmehie dị oké njọ, anyị ekwesịghị iche na Chineke agaghị atụkwasị ya obi ọzọ. E nwere otu nwanna aha ya bụ Ricardo. Ọ bụ okenye ruo ọtụtụ afọ. Ma, e mechara napụ ya ihe ùgwù ahụ. O kwuru, sị: “Obi gbawara m n’ihi ihe m mejọrọ. Ruo ọtụtụ afọ, m chere na abaghịzi m uru, ya emezie ka m ghara ịgba mbọ ka m bụrụkwa okenye ma jewere ụmụnna ozi. Obi akaghị m na m ga-emecha bụrụkwa onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. Ebe ọ bụ na inyere ndị ọzọ aka na-atọ m ụtọ, m na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl, na-agba ụmụnna ume n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, mụ na ha ana-arụkwa n’ozi ọma. Ihe ndị a mere ka obi sie m ike. Abụrụkwala m okenye.”

Jehova emeela ka obi dịghachi ọtụtụ ụmụnna nwoke ụtọ, ha achọọkwa ịbụ okenye ọzọ

Ọ bụrụ na nwanna na-ebu iwe n’obi, o nwere ike ime ka ọ ghara ịbụ okenye ọzọ. Ọ ga-aka mma ka  onye ahụ mee ka Devid bụ́ ohu Jehova. Ọ gbara ọsọ mgbe Eze Sọl na-enwere ya anyaụfụ ma chọọ igbu ya. O kweghị emegwara Sọl n’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ ugboro ọ gaara eme otú ahụ ma a sị na ọ chọrọ. (1 Sam. 24:4-7; 26:8-12) Mgbe Sọl nwụrụ n’agha, Devid ruuru ya uju. O kwuru na Sọl na Jọnatan nwa ya bụ ‘ndị a hụrụ n’anya na ndị ọma.’ (2 Sam. 1:21-23) Devid eburughị Sọl iwe n’obi.

Ọ bụrụ na i chere na a ghọtahiere gị ma ọ bụ na e mere gị ihe na-adịghị mma, ekwela ka ọsụkọsụ na-asụgbu gị. Dị ka ihe atụ, na Briten, e nwere otu nwanna aha ya bụ William. Mgbe ọ bụ okenye ruo ihe dị ka afọ iri atọ, a napụrụ ya ihe ùgwù ahụ. Ọ malitere iwesa ụfọdụ ndị okenye iwe. Gịnị nyeere ya aka ịkwụsị iwe ahụ ọ na-ewe? O kwuru, sị: “Ịgụ akwụkwọ Job gbara m ume. Ebe ọ bụ na Jehova nyeere ya aka ka ya na ndị enyi ya atọ kpezie, ọ ga-enyekwara m aka ka mụ na ndị okenye kpezie.”—Job 42:7-9.

CHINEKE NA-AGỌZI NDỊ MECHARA BỤRỤ OKENYE ỌZỌ

Ọ bụrụ na i ji aka gị kpebie na ị ga-akwụsịtụ ịzụ atụrụ Chineke, ọ ga-adị mma ka i chebara ihe mere i ji mee otú ahụ echiche. Ọ̀ bụ n’ihi na nsogbu i nwere karịrị akarị, ka ọ̀ bụ na i chere na e nwere ihe ndị ọzọ ka mkpa? Ọ̀ bụ ihe ndị ọzọ mejọrọ mere ka ị daa mbà? Ihe ọ sọkwara ya bụrụ ya kpatara ya, cheta na mgbe ị bụ okenye, e nwere ọtụtụ ụzọ ị na-esi enyere ndị ọzọ aka. Ihe omume ndị ị na-eme na otú i si eme ihe gbara ha ume. Nleta ọzụzụ atụrụ ị gaara ha nyekwaara ha aka idi ọnwụnwa ndị na-abịara ha. Otú i si jiri obi gị niile rụọ ọrụ mgbe ahụ ị bụ okenye mere ka obi dị Jehova ụtọ, obi adịkwa gịnwa ụtọ.—Ilu 27:11.

Jiri obi ụtọ na-ejere Jehova ozi ma si otú ahụ gosi na ị hụrụ ya n’anya

Jehova emeela ka obi dịghachi ọtụtụ ụmụnna nwoke ụtọ, ha achọọkwa iso na-ahazi ihe a na-eme n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na i ji aka gị kpebie na ị chọghịzi ịbụ okenye ma ọ bụkwanụ na a napụrụ gị ihe ùgwù ahụ, ị ka nwere ike ‘ịgbalị ka i ruo eru ịbụ onye nlekọta’ ọzọ. (1 Tim. 3:1) Pọl ‘akwụsịghị ikpe ekpere’ ka Ndị Kraịst nọ na Kọlọsi mata ihe bụ́ uche Chineke ‘ka ha wee na-eje ije n’ụzọ kwesịrị Jehova iji na-eme ihe na-amasị ya n’ụzọ zuru ezu.’ (Kọl. 1:9, 10) Ọ bụrụ na i mechaa bụrụkwa okenye, rịọ Jehova ka o mee ka i nwee ume, ndidi, na ọṅụ. N’oge ikpeazụ a, e kwesịrị inwe ndị okenye ga-eji obiọma na-elekọta ndị Chineke. Ị̀ ga-emeli ka okwukwe ụmụnna gị sikwuo ike? Ị̀ dị njikere ime otú ahụ?

^ para. 3 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.