Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌGỌST 2014

Okwu Chineke Dị Ndụ, Jiri Ya Na-akụzi Ihe

Okwu Chineke Dị Ndụ, Jiri Ya Na-akụzi Ihe

“Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.”—HIB. 4:12.

1, 2. Gịnị ka Jehova gwara Mozis mee? Olee otú Jehova si mee ka obi sie ya ike?

OLEE otú obi ga-adị gị ma ọ bụrụ na a gwara gị ka ị gaa n’ihu onye na-achị ụwa niile ma kwuchitere ndị Jehova ọnụ ha? Obi nwere ike ịwụnye gị n’afọ, ụjọ ejide gị, gị echewe na ị gaghị emeli ya. Olee otú ị ga-esi hazie ihe ị ga-ekwu? Gịnị ka ị ga-eme ka otú i si ekwu okwu gosi na ị na-anọchite anya Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile?

2 Ụdị ihe a bụ ihe mere Mozis. Baịbụl kwuru na ọ dị “umeala n’obi karịa mmadụ niile nọ n’elu ala.” (Ọnụ Ọgụ. 12:3) Jehova gwara Mozis na ya ga-eziga ya ka ọ gakwuru Fero ma napụta ndị Izrel n’ohu ha na-agba n’Ijipt. Ihe ndị mechara mee gosiri na Fero dị mpako nakwa na e nweghị onye ọ na-akwanyere ùgwù. (Ọpụ. 5:1, 2) Ma, Jehova chọrọ ka Mozis gaa nye Fero iwu ka ọ hapụ ihe dị ka nde mmadụ atọ na-agbara ya ohu ka ha laa. Mozis jụrụ Jehova, sị: “Ònye ka m bụ nke na m ga-agakwuru Fero, nke na m ga-akpọpụtakwa ụmụ Izrel n’Ijipt?” O kwesịghị iju anyị anya na ọ jụrụ Jehova ajụjụ a. Ọ ga-abụrịrị na o chere na ya erughị eru nakwa na ya agaghị emeli ihe a Jehova gwara ya. Ma, Chineke mere ka obi sie ya ike na ya agaghị ahapụ ya. Ọ gwara Mozis, sị: “M ga-anọnyere gị.”—Ọpụ. 3:9-12.

3, 4. (a) Gịnị na gịnị mere ka ụjọ tụọ Mozis? (b) Olee otú ụdị ụjọ ahụ nwere ike isi tụọ gị?

3 Gịnị na gịnị mere ka ụjọ tụọ Mozis? Ụjọ tụrụ ya na Fero  agaghị anabata onye na-anọchite anya Jehova Chineke ma ọ bụ gee ya ntị. Ihe ọzọ bụ na obi esighị ya ike na ndị Izrel ibe ya ga-ekweta na ọ bụ Jehova họpụtara ya ka ọ kpọpụta ha n’Ijipt. N’ihi ya, Mozis gwara Jehova, sị: “Ọ bụrụkwanụ na ha ekwetaghị ihe m kwuru wee ghara ige ntị n’olu m, n’ihi na ha gaje ịsị, ‘Jehova apụtaghị ìhè n’ihu gị.’”—Ọpụ. 3:15-18; 4:1.

4 O nwere ihe dị mkpa onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịmụta n’ihe Jehova zara Mozis nakwa n’ihe ndị mechara mee. O nwere ike a gaghị agwa gị ka ị gaa gwa onye na-achị achị okwu. Ma, è nwetụla mgbe o siiri gị ike ịgwa ndị ị na-ahụ kwa ụbọchị gbasara Chineke na Alaeze ya? Ọ bụrụ otú ahụ, chegodị ihe i nwere ike ịmụta n’ihe Mozis mere.

“GỊNỊ BỤ IHE AHỤ I JI N’AKA?”

5. Gịnị ka Jehova nyere Mozis? Olee otú o si mee ka obi kaa ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

5 Mgbe Mozis gwara Jehova na obi esighị ya ike na ndị mmadụ ga-ekweta ihe ọ gwara ha, Jehova nyeere ya aka ka o nwee ike ịrụ ọrụ ahụ o nyere ya. Baịbụl kwuru, sị: “Jehova wee sị ya: ‘Gịnị bụ ihe ahụ i ji n’aka?’ o wee sị: ‘Ọ bụ mkpara.’ Ọzọ, ọ sịrị: ‘Tụpụ ya n’ala.’ O wee tụpụ ya n’ala, o wee ghọọ agwọ; Mozis wee malite ịgbara ya ọsọ. Jehova wee sị Mozis: ‘Setịpụ aka gị jide ya n’ọdụ.’ O wee setịpụ aka ya jide ya, o wee ghọọ mkpara n’ọbụ aka ya. Dị ka o si kwuo, ‘Ka ha wee kwere na Jehova . . . apụtawo ìhè n’ihu gị.’” (Ọpụ. 4:2-5) N’eziokwu, Chineke nyere Mozis ihe ọ ga-eji gosi na ọ bụ ya ziri ya ozi ahụ ọ bịara izi. O mere ka mkpara Mozis ji n’aka ghọọ agwọ dị ndụ. Ọrụ ebube a ga-eme ka a ghọta na ọ bụ Jehova zitere Mozis. Ọ bụ ya mere Jehova ji gwa Mozis, sị: “Ị ga-eji mkpara a n’aka gị ka i were ya mee ihe ịrịba ama ndị ahụ.” (Ọpụ. 4:17) Ọrụ ebube ahụ ga-eme ka Mozis jiri obi ike gwa ma Fero ma ndị Izrel okwu.—Ọpụ. 4:29-31; 7:8-13.

6. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị iji na-ezi ndị mmadụ ozi ọma? Ọ̀ bụ maka gịnị? (b) Olee otú o si bụrụ na “okwu Chineke dị ndụ”? Olee otú o si “akpa ike”?

6 Mgbe anyị gara izi ndị mmadụ ozi ọma, gịnị ka anyị na-eji aga? Anyị na-ejikarị Baịbụl. Ọ bụ ihe anyị ji ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ụfọdụ ndị chere na Baịbụl bụ akwụkwọ nkịtị, ma anyị ma na ihe dị na ya bụ okwu Chineke. (2 Pita 1:21) Baịbụl na-agwa anyị ihe Chineke kwere ná nkwa nakwa ihe Alaeze ya ga-emere anyị. Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji kwuo, sị: “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.” (Gụọ Ndị Hibru 4:12.) Nkwa niile Jehova kwere ji nwayọọ nwayọọ na-emezu. Ha niile ga-emezucha. (Aịza. 46:10; 55:11) Ọ bụrụ na mmadụ aghọta na nkwa ọ bụla Jehova kwere na Baịbụl ga-emezu, ihe ọ na-agụ n’Okwu Chineke ga na-akpa ike ná ndụ ya.

7. Olee otú anyị nwere ike isi ‘na-ejizi okwu nke eziokwu ejizi’?

7 Jehova enyela anyị Okwu ya bụ́ Baịbụl. Anyị na-eji ya egosi ndị mmadụ na ihe anyị na-akụziri ha bụ eziokwu nakwa na o si n’aka Jehova. Ọ bụ ya mere na mgbe Pọl na-azụ Timoti, ọ gwara ya ka ọ ‘na-ejizi okwu nke eziokwu ejizi.’ (2 Tim. 2:15) Olee otú anyịnwa nwere ike isi mee ihe a ọ gwara Timoti? Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịhọrọ amaokwu Baịbụl ọ ga-abụ anyị gụọrọ ya ndị mmadụ, ya eruo ha n’obi. Traktị ndị e bipụtaara anyị n’afọ 2013 ga-enyere anyị aka ime otú ahụ.

GỤỌ AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ GA-ERU NDỊ MMADỤ N’OBI

8. Gịnị ka otu onye nlekọta ije ozi kwuru gbasara traktị ndị ahụ e wepụtara ọhụrụ?

8 Otú e si hazie traktị ọhụrụ ahụ niile bụ otu. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị mụta otú ị ga-esi jiri otu n’ime ha kụziere mmadụ  Baịbụl, ị ga-ejili ndị nke ọzọ meekwa otú ahụ. Gịnị mere iji ha akụziri mmadụ Baịbụl ji adị mfe? Na Hawaị dị n’Amerịka, otu onye nlekọta ije ozi kwuru, sị: ‘Mgbe e wepụtara traktị ọhụrụ ndị a, anyị amachaghị na ha ga-aba ezigbo uru mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma ma n’ụlọ n’ụlọ ma n’ebe ọhaneze na-anọ.’ Nwanna a chọpụtara na otú e si hazie traktị ndị ahụ na-eme ka ndị mmadụ kwuo ihe ha bu n’obi ozugbo, meekwa ka ihe ha na ya na-ekwurịta baa ezigbo uru. O kwuru na ihe kpatara ya bụ ajụjụ a jụrụ n’ihu traktị ndị ahụ na ihe ndị e dere mmadụ nwere ike ịza. N’ihi ya, ụjọ agaghị atụwa onye ahụ ma ọ̀ ga-azatakwa ajụjụ ahụ a jụrụ.

9, 10. (a) Olee otú traktị si enyere anyị aka iji Baịbụl zie mmadụ ozi ọma? (b) Olee traktị ndị i jirila zie ndị mmadụ ozi ọma, ha egee ntị nke ọma? Gịnị mere o ji adịrị gị mfe iji ha ezi ozi ọma?

9 Na traktị nke ọ bụla, e dere amaokwu Baịbụl anyị nwere ike ịgụrụ mmadụ. Dị ka ihe atụ, legodị traktị bụ́ Ò Nwere Mgbe Nsogbu Ụwa A Ga-akwụsị? Gosi mmadụ traktị ahụ ma jụọ ya ajụjụ ahụ e dere n’ihu ya. O nwere ike ịza “ee,” “ee e,” ma ọ bụkwanụ “o nwere ike.” Ihe ọ bụla ọ zara, mepee traktị ahụ ma kwuo, sị, “Lee ihe Baịbụl kwuru.” Gụọrọ ya Mkpughe 21:3, 4.

10 Ọ bụrụ na i nyere mmadụ traktị bụ́ Olee Ihe I Chere na Baịbụl Bụ? o nweghị ihe o mere ma ọ họrọ otu n’ime azịza atọ dị n’ihu traktị ahụ. Mepee traktị ahụ ma kwuo, sị, “Baịbụl kwuru na ‘Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke.’” I nwekwara ike ịsị ya, “E nwere ihe ndị ọzọ ebe ahụ kwuru.” Mepee Baịbụl gị ma gụọrọ ya 2 Timoti 3:16, 17.

11, 12. (a) Olee otú i nwere ike isi jiri traktị mee ka ozi ọma na-atọkwu gị ụtọ? (b) Olee otú traktị ga-esi nyere gị aka ịkwado maka nletaghachi?

11 Ọ bụ ihe onye ị gara na nke ya mere ga-enyere gị aka ikpebi ma ị̀ ga-agụkwuru ya traktị ahụ ka gị na ya tụlekwuo ya. Ma onye ahụ ọ̀ chọrọ ka unu tụlekwuo ihe dị na ya ma ọ bụ na ọ chọghị, ọ nụla ozi ọma e dere na ya, gị agụọkwara ya amaokwu Baịbụl ụfọdụ dị na ya. Ọ bụrụgodị otu amaokwu Baịbụl ma ọ bụ abụọ ka ị gụụrụ ya n’ụbọchị mbụ i ziri ya ozi ọma, i nwere ike ịgaghachi ka unu tụlekwuo traktị ahụ.

12 N’azụ traktị nke ọ bụla, e nwere isiokwu nta bụ́ “Ihe Ị Ga-echebara Echiche.” N’okpuru ya, ị ga-ahụ ajụjụ na amaokwu  Baịbụl gị na mmadụ nwere ike ịtụle ma ị gaa nletaghachi. I nye mmadụ traktị bụ́ Olee Otú I Chere Ihe Ga-adị n’Ọdịnihu? ajụjụ i nwere ike ịjụ ya ma ị gaa nletaghachi bụ “Olee otú Chineke ga-esi eme ka ụwa anyị a ka mma?” E dere Matiu 6:9, 10 na Daniel 2:44 n’ebe ahụ. Ọ bụrụ na ihe i nyere mmadụ bụ traktị bụ́ Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ? ajụjụ i nwere ike ịjụ ya ma ị gaa nletaghachi bụ: “Gịnị mere anyị ji aka nká, na-anwụkwa anwụ?” N’ebe ahụ, ị ga-ahụ Jenesis 3:17-19 na Ndị Rom 5:12.

13. Olee otú e nwere ike isi jiri traktị malite ọmụmụ Baịbụl?

13 Otú e si hazie traktị ndị a ga-enyere anyị aka ịmalite ịmụrụ mmadụ Baịbụl. E nwere ihe e sere n’azụ traktị nke ọ bụla, nke nwere ike ibuga mmadụ n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet. Na traktị nke ọ bụla, e kwuru gbasara broshọ bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! kwuokwa ebe i nwere ike ịga na ya gụkwuo gbasara ihe a na-ekwu. Dị ka ihe atụ, traktị bụ́ Ònyedị Na-achị Ụwa A? kwuru ka a gụọ isi nke ise na broshọ ahụ. Traktị bụ́ Gịnị Ga-eme Ka Unu Na-enwe Obi Ụtọ n’Ụlọ Unu? kwukwara ka a gụọ isi nke itoolu. E bipụtara traktị ndị a ka ha nyere anyị aka iji Baịbụl na-akụziri mmadụ ihe ma n’ụbọchị mbụ anyị ziri ya ozi ọma ma mgbe anyị gaara ya nletaghachi. Ọ ga-eme ka anyị nwekwuo ndị anyị na-amụrụ Baịbụl. Olee ihe ọzọ i nwere ike ime ka i nwee ike iji Okwu Chineke na-akụziri ndị mmadụ ihe nke ọma?

JIRI IHE NA-ECHU NDỊ MMADỤ ỤRA ZIE HA OZI ỌMA

14, 15. Olee otú i nwere ike isi mee ka Pọl mgbe ị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma?

14 Mgbe Pọl na-ezi ozi ọma, ọ gbara mbọ ka ọ mata ihe “ọtụtụ mmadụ” na-eche. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 9:19-23.) Ihe mere o ji mee ya bụ ka o rite ha n’uru, ma ‘ndị Juu ma ndị nọ n’okpuru iwu ma ndị na-enweghị iwu ma ndị na-adịghị ike.’ Ọ chọrọ ikwusara ‘ụdị mmadụ niile ozi ọma ka o nwee ike isi n’ụzọ ọ bụla zọpụta ụfọdụ ndị.’ (Ọrụ 20:21) Olee otú anyị nwere ike isi mee ka Pọl mgbe anyị na-akwadebe ihe anyị ga-eji zie “ụdị mmadụ niile” ozi ọma?—1 Tim. 2:3, 4.

15 Kwa ọnwa, Ozi Alaeze Anyị na-agwa anyị otú anyị nwere ike isi zie mmadụ ozi ọma. Gbalịa na-eme ya. Ma, ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọzọ na-echu ndị bi n’ókèala unu ụra, jiri ihe ahụ kwadebe otú ị ga-esi zie ha ozi ọma ka o ruo ha n’obi. Chee echiche banyere ókèala unu, ụdị ndị bi na ya, na ihe bụ́ mkpa ha. Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịchọta amaokwu Baịbụl kwuru gbasara ihe ahụ bụ́ mkpa ha. Otu onye nlekọta sekit kọwara otú ya na nwunye ya si eji Baịbụl ezi ndị mmadụ ozi ọma. O kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị na-ekwe ka anyị gụọrọ ha otu amaokwu Baịbụl ma ọ bụrụ na anyị egbuo okwu anyị nkenke ma kapịa ya ọnụ. Anyị na-asapeta ebe anyị chọrọ ịgụrụ mmadụ na Baịbụl. Ozugbo anyị kelechara onye ahụ, anyị agụọrọ ya ebe ahụ.” Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ, ajụjụ, na amaokwu Baịbụl ụfọdụ ọtụtụ ụmụnna jirila zie ndị mmadụ ozi ọma, ya eruo ha n’obi. I nwere ike iji ha zie ndị mmadụ ozi ọma n’ókèala unu.

Ị̀ na-eji Baịbụl na traktị akụzi ihe nke ọma ma ị gaa ozi ọma? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 ruo nke 13)

16. Olee otú e nwere ike isi jiri Aịzaya 14:7 zie mmadụ ozi ọma?

16 Ọ bụrụ na i bi n’ebe a na-enwekarị ọgba aghara, i nwere ike ịjụ mmadụ, sị: “Ì chere na i nwere ike ile anya n’ihu akwụkwọ akụkọ otu ụbọchị hụ ebe e dere, sị: ‘Ụwa dum ezuruwo ike, dịkwa jụụ. Ndị mmadụ na-etikwa mkpu ọṅụ’? Ọ bụ ihe Baịbụl kwuru n’Aịzaya 14:7. E nwere ọtụtụ ebe Baịbụl kwuru gbasara nkwa Chineke kwere na a ga-enwe udo n’ụwa n’oge na-adịghị anya.” Gụziere ya otu ebe Baịbụl kwuru gbasara nkwa ahụ Chineke kwere.

17. Ị chọọ iji Matiu 5:3 zie mmadụ ozi ọma, gịnị ka i nwere ike ibu ụzọ gwa onye ahụ?

 17 Ọ bụrụ na ndị nọ n’ebe i bi na-achụ ego ọnwụ ọnwụ ma ọ bụkwanụ na ọ na-esiri ha ike ịkpata ego ga-ezuru ha, i nwere ike ịjụ onye ị gara na nke ya, sị: “Ì chere na ọ bụ ego ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ?” Ihe ọ bụla ọ zara, gị asị ya: “Ọtụtụ ndị nwere ego anaghị enwe obi ụtọ. Gịnịzi ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ?” Gụọ Matiu 5:3 ma gwa ya otú anyị si amụrụ ndị mmadụ Baịbụl.

18. Olee otú i nwere ike isi jiri Jeremaya 29:11 kasie mmadụ obi?

18 Ọ bụrụ na ọdachi mere n’ebe i bi n’oge na-adịbeghị anya, i nwere ike ịgwa onye ị gara na nke ya, sị: “Abịara m ka m kasie gị obi. (Gụọ Jeremaya 29:11.) Ị̀ hụrụ ihe atọ Chineke chọrọ ka anyị nwee? Ọ chọrọ ka anyị nwee ‘udo,’ ‘ọdịnihu,’ na ‘olileanya.’ Obi ọ́ dịghị gị ụtọ na Chineke chọrọ ka ihe dịrị anyị ná mma? Ma, olee otú ọ ga-esi eme ya?” Sapetazie ebe kwuru gbasara ya na broshọ bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!

19. Kọwaa otú e nwere ike isi jiri Mkpughe 14:6, 7 zie ndị na-aga chọọchị ozi ọma.

19 Ọ bụrụ na i bi n’ebe ọtụtụ ndị na-aga chọọchị, i nwere ike ịjụ mmadụ, sị: “Ọ bụrụ na mmụọ ozi agwa gị okwu, ị̀ ga-ege ya ntị? (Gụọ Mkpughe 14:6, 7.) Ebe ọ bụ na mmụọ ozi a sịrị ka a ‘tụọ egwu Chineke,’ ọ́ gaghị adị mma ka anyị mata onye bụ́ Chineke ahụ? Ọ gwara anyị ihe ga-enyere anyị aka ịmata onye Chineke ahụ bụ. Ọ kpọrọ ya ‘Onye kere eluigwe na ụwa.’ Ònye ka ọ bụ?” Gụọrọ ya Abụ Ọma 124:8, bụ́ ebe sịrị: “Enyemaka anyị dị n’aha Jehova, Onye kere eluigwe na ụwa.” Gwazie ya na ị ga-achọ ịkọwakwuru ya gbasara Jehova Chineke.

20. (a) Olee otú e nwere ike isi jiri Ilu 30:4 mee ka mmadụ mata aha Chineke? (b) Olee amaokwu Baịbụl ị na-eji ezi ndị mmadụ ozi ọma, ya eruo ha n’obi?

20 Ọ bụrụ na ọ bụ onye na-eto eto ka ị chọrọ izi ozi ọma, i nwere ike ịgwa ya, sị: “O nwere otu ebe m chọrọ ịgụrụ gị na Baịbụl. Ebe ahụ jụrụ otu ajụjụ dị mkpa. (Gụọ Ilu 30:4.) E nweghị mmadụ ọ bụla ga-emeli ihe ndị e kwuru n’ebe a. N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na ọ na-ekwu gbasara Onye kere anyị. * Olee otú anyị ga-esi amata aha ya? Ka m gosi gị ya na Baịbụl.”

JIRI OKWU CHINEKE NKE NA-AKPA IKE NA AKỤZI IHE N’OZI ỌMA

21, 22. (a) Ọ bụrụ na anyị agụọrọ mmadụ amaokwu Baịbụl ga-eru ya n’obi, olee otú o nwere ike isi gbanwee ndụ ya? (b) Gịnị ka i kpebisiri ike ịna-eme ma ị gaa ozi ọma?

21 Ị maghị ihe ndị mmadụ ga-eme ma ị gụọrọ ha amaokwu Baịbụl ga-eru ha n’obi. Dị ka ihe atụ, n’Ọstrelia, ụmụnna abụọ gara ozi ọma n’ụlọ otu nwaanyị. Otu onye n’ime ha ajụọ ya, “Ị̀ ma aha Chineke?” ma gụọrọ ya Abụ Ọma 83:18. Nwaanyị ahụ kwuru, sị: “O juru m anya. Mgbe ha lawara, m ji ụgbọala gbaa kilomita iri ise na isii gaa n’ebe a na-ere akwụkwọ ka m mara ma m̀ ga-ahụ aha ahụ na Baịbụl ndị ọzọ. M chọkwara ya n’akwụkwọ ọkọwa okwu. Mgbe m matara na aha Chineke bụ Jehova, echewere m na ọ ga-abụ na e nwere ihe ndị ọzọ m na-amaghị.” N’oge na-adịghị anya, a mụwaara ya na onye mechara lụọ ya Baịbụl, mechaakwa mee ha baptizim.

22 Okwu Chineke na-akpa ike. Ọ bụrụ na mmadụ agụọ ya ma nwee okwukwe ná nkwa Jehova kwere na ya, o nwere ike ịgbanwe ndụ onye ahụ. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 2:13.) Ihe Baịbụl kwuru ga-akpa ike karịa ihe ọ bụla anyị nwere ike ikwu n’ozi ọma ka o ruo ndị mmadụ n’obi. N’ihi ya, anyị gaa ozi ọma, anyị kwesịrị iji Okwu Chineke na-akụzi ihe. Okwu Chineke dị ndụ n’eziokwu.

^ para. 20 Gụọ Ụlọ Nche May 15, 2002, peeji nke 5.