Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌGỌST 2014

Otú Jehova Si Abịaru Anyị Nso

Otú Jehova Si Abịaru Anyị Nso

“Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—JEMS 4:8.

1. Olee mkpa anyị niile nwere? Olee ndị nwere ike igboro anyị ya?

O NWEGHỊ onye na-anaghị achọ ka ndị ọzọ na-akpa ya nso. Obi na-adị anyị ụtọ ma ọ bụrụ na ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị hụrụ anyị n’anya n’eziokwu, jiri anyị kpọrọ ihe ma mara anyị nke ọma. Ma, ọ bụ Jehova bụ́ Onye kere anyị ka anyị na ya kwesịrị ịkacha dịrị ná mma.—Ekli. 12:1.

2. Olee nkwa Jehova kwere anyị? Gịnị mere ọtụtụ ndị ji chee na ọ gaghị enwe isi?

2 Na Baịbụl, Jehova gwara anyị ka anyị ‘bịaruo ya nso.’ O kwere anyị nkwa na ya “ga-abịarukwa” anyị nso ma anyị mee otú ahụ. (Jems 4:8) Ihe a ọ gwara anyị na-eme anyị obi ụtọ. Ma, ọtụtụ ndị chere na Chineke agaghị abịali ha nso. Ha chere na ha erughị eru ịbụ enyi ya ma ọ bụkwanụ na ihe gbasara mmadụ anaghị emetụ ya n’obi. Ma, ànyị ga-abịaruli Jehova nso?

3. Gịnị ka anyị kwesịrị ịghọta banyere Jehova?

3 Anyị ga-amali onye Jehova bụ n’ihi na “ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla” chọrọ ịma banyere ya nọ. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 17:26, 27; Abụ Ọma 145:18.) Chineke chọrọ ka anyị bụrụ ezigbo ndị enyi ya n’agbanyeghị na anyị ezughị okè. (Aịza. 41:8; 55:6) Otú Jehova si mesoo otu ọbụ abụ mere ka o kwuo gbasara Jehova, sị: “Gị Onye na-anụ ekpere, ọ bụ gị  ka anụ ahụ́ niile bụ́ mmadụ ga-abịakwute. Obi ụtọ na-adịrị onye ị họọrọ, nke i mekwara ka ọ bịaruo nso.” (Ọma 65:2, 4) Ka anyị leba anya n’ihe Baịbụl kọrọ gbasara otú eze Juda aha ya bụ Esa si bịaruo Chineke nso nakwa otú Chineke si bịaruo ya nso. *

IHE ANYỊ NWERE IKE ỊMỤTA N’AKA ESA

4. Gịnị ka Eze Esa mere nke kwesịrị ịkụziri ndị Juda ihe?

4 Eze Esa ejighị ofufe Jehova gwuo egwu. Mgbe ọ ghọrọ eze Juda, ọ chụpụrụ ndị na-agba akwụna n’ụlọ arụsị n’obodo ahụ, wepụkwa arụsị juru na ya. (1 Eze 15:9-13) Esa na Jehova dị ná mma. Ọ bụ ya mere ọnụ ji kaa ya ịgwa ndị Juda “ka ha chọọ Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha nakwa ka ha debe iwu ya na ntụziaka ya.” N’ihi ya, mgbe Esa malitere ịchị, Jehova mere ka udo dịrị na Juda ruo afọ iri. Esa ma na ọ bụ Jehova mere ka ha nwee udo. Ọ bụ ya mere o ji gwa ndị Juda, sị: “Ala a ka bụ nke anyị, n’ihi na anyị achọwo Jehova bụ́ Chineke anyị. Anyị achọwo ya, o wee nye anyị ezumike gbaa gburugburu.” (2 Ihe 14:1-7) Gịnị meziri?

5. Olee nsogbu bịaara Esa, ma ya egosi na ya tụkwasịrị Jehova obi? Gịnị mechara mee?

5 Weregodị ya na ị bụ Esa. Onye Itiopia aha ya bụ Zira chị otu nde ndị agha na narị ụgbọ ịnyịnya atọ na-abịa ibuso ndị obodo gị agha. (2 Ihe 14:8-10) Ndị agha gị dị naanị narị puku mmadụ ise na puku iri asatọ. Ọ pụtara na e kee ndị agha ya ụzọ abụọ, ọ bụ obere ihe ka ndị agha gị ji karịa ọkara ndị agha ya. Gịnị ka ị ga-eme? Ị̀ ga-anọ na-eche ihe mere Chineke ji kwe ka ha bịa ibuso gị agha? Ị̀ ga-eme ihe obi gị gwara gị, ka ị̀ ga-atụkwasị Jehova obi na ọ ga-echebe unu? Esa mere ihe gosiri na ya na Jehova dị n’ezigbo mma nakwa na ya tụkwasịrị ya obi. Esa ji obi ya niile kpee ekpere, sị: “Jehova bụ́ Chineke anyị, biko, nyere anyị aka n’ihi na anyị dabeere n’ebe ị nọ, anyị jikwa aha gị na-ebuso ìgwè mmadụ a agha. Jehova, ọ bụ gị bụ Chineke anyị. Ekwela ka mmadụ efu kara gị ike.” Olee otú Chineke si zaa ekpere Esa? ‘Jehova meriri ndị Itiopia.’ O nweghị onye n’ime ha fọdụrụ ndụ.—2 Ihe 14:11-13.

6. Olee ihe Esa mere nke anyị kwesịkwara ime?

6 Gịnị mere obi ji sie Esa ike na Chineke ga-echebe ya ma duzie ya? Baịbụl kwuru na ‘Esa mere ihe ziri ezi n’anya Jehova’ nakwa na ‘obi ya zuru ezu n’ụbọchị ya niile.’ (2 Ihe 14:2; 15:17) Anyị kwesịkwara iji obi anyị niile na-ejere Chineke ozi n’ihi na ọ ga-eme ka anyị na ya dịrị n’ezigbo mma ma ugbu a ma n’ọdịnihu. Obi dị anyị ụtọ na Jehova ebula ụzọ mee ihe gosiri na ọ chọrọ ka anyị na ya dịrị ná mma nakwa ka anyị bịaruo ya nso. Ka anyị tụlee ụzọ abụọ Jehova si mee ya.

JEHOVA JI ÀJÀ KRAỊST CHỤRỤ MEE KA ANYỊ BỊARUO YA NSO

7. (a) Olee ihe Jehova mere ka anyị nwee ike ịbịaru ya nso? (b) Olee ihe kachanụ Chineke ji eme ka anyị bịaruo ya nso?

7 Jehova hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. Ọ bụ ya mere o ji kee ụwa a mara mma ka anyị biri na ya. Otú ọzọ o si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya bụ na ọ na-enye anyị ihe ndị ga-eme ka anyị na-adị ndụ. (Ọrụ 17:28; Mkpu. 4:11) Ihe kadị mkpa ọ na-emere anyị bụ ịkụziri anyị Okwu ya. (Luk 12:42) O mekwara ka obi sie anyị ike na ya na-ege anyị ntị mgbe ọ bụla anyị kpegaara ya ekpere. (1 Jọn 5:14) Ma, ihe kachanụ Jehova ji eme ka anyị bịaruo ya nso bụ àjà Kraịst chụrụ.  O gosiri na Jehova hụrụ anyị n’anya. (Gụọ 1 Jọn 4:9, 10, 19.) Jehova zitere “Ọkpara ọ mụrụ naanị ya” ka ọ bịa n’ụwa gbapụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ.—Jọn 3:16.

8, 9. Olee ọrụ Jizọs na-arụ ka nzube Jehova nwee ike imezu?

8 Jehova bu n’obi ka àjà Jizọs chụrụ baara mmadụ niile uru, ma ndị dịrị ndụ tupu ya achụọ ya. Ozugbo Jehova buru amụma banyere onye ga-azọpụta ụmụ mmadụ, o weere ya na a chụọla àjà ahụ n’ihi na ọ ma na o nweghị ihe ga-eme ka uche ya ghara ime. (Jen. 3:15) Mgbe ọtụtụ narị afọ gara, Pọl onyeozi kelere Chineke maka “ntọhapụ nke si n’ihe mgbapụta ahụ Kraịst Jizọs kwụrụ.” O kwukwara na Chineke ‘na-agbaghara mmehie ndị e mere n’oge gara aga mgbe ọ nọ na-enwe ndidi.’ (Rom 3:21-26) N’ihi ya, anyị agaghị abịaruli Chineke nso ma e wepụ Jizọs.

9 Ọ bụ naanị Jizọs ka ndị dị umeala n’obi ga-esi n’aka ya mara Jehova, ha na ya adịkwa n’ezigbo mma. Olee otú Baịbụl si gosi na ọ bụ eziokwu? Pọl dere, sị: “Chineke mere ka anyị mata ịhụnanya ya, n’ihi na, mgbe anyị ka bụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.” (Rom 5:6-8) Ihe mere Jizọs ji chụọ àjà ahụ bụ na ya na Jehova hụrụ anyị n’anya, ọ bụghị maka na anyị ruru eru ka e meere anyị ya. Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m, bụ́ onye zitere m, adọtaghị ya.” O kwukwara, sị: “Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” (Jọn 6:44; 14:6) Jehova na-eji mmụọ nsọ ya esi n’aka Jizọs adọta ndị mmadụ ma na-enyere ha aka ka ha na ya dịrị ná mma ka ha nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi. (Gụọ Jud 20, 21.) Ka anyị tụlee ụzọ ọzọ Jehova si eme ka anyị bịaruo ya nso.

JEHOVA NA-EJI BAỊBỤL EME KA ANYỊ BỊARUO YA NSO

10. Olee otú Baịbụl si enyere anyị aka ịbịarukwu Chineke nso?

10 Amaokwu Baịbụl ndị anyị hụrụla n’isiokwu a si n’akwụkwọ Baịbụl iri na anọ. A sị na Baịbụl adịghị, olee otú anyị gaara esi ama na anyị nwere ike ịbịaru Onye kere anyị nso? Olee otú anyị gaara esi ama gbasara àjà Jizọs chụrụ nakwa otú Jizọs si enyere anyị aka ka anyị bịaruo Jehova nso? Jehova ji mmụọ nsọ ya mee ka e dee Baịbụl, ka anyị mata àgwà ọma ya na ihe o bu n’obi imere anyị. Dị ka ihe atụ, n’Ọpụpụ 34:6, 7, Jehova gwara Mozis na ya bụ “Chineke nke na-eme ebere, na-emekwa amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye obiọma ya na eziokwu ya dị ukwuu, onye na-eme ka obiọma ya ruoro ọtụtụ puku ọgbọ, na-agbaghara njehie na mmebi iwu na mmehie.” Ò nwere onye na-agaghị achọ ịkpa ụdị onye a nso? Jehova ma na ọ bụrụ na anyị ana-amụkwu gbasara ya, anyị ga-aghọtakwu na ọ bụ onye dị adị, anyị na ya adịkwuo ná mma.

11. Gịnị mere anyị kwesịrị iji mụọ gbasara Jehova? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

11 Ihe e dere ná mmalite akwụkwọ Bịaruo Jehova Nso kwuru na ihe ga-eme ka anyị na mmadụ bụrụ ezigbo enyi bụ ịmata onye ahụ, inwe mmasị n’àgwà ya, na iji àgwà ya kpọrọ ihe. O kwukwara na anyị kwesịrị ịmụ ihe Baịbụl kọwara gbasara àgwà Jehova na otú o si eme ihe. N’ihi ya, obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ na Jehova mere ka e dee Baịbụl otú ọ ga-adịrị anyị mfe ịghọta ya.

12. Gịnị mere Jehova ji jiri ndị mmadụ dee Baịbụl?

12 A sị na Jehova chọrọ, ọ gaara eji ndị mmụọ ozi dee Baịbụl. A sị ka e kwuwe, ha chọsiri ike ịma gbasara anyị na ihe anyị na-eme. (1 Pita 1:12)  O doro anya na ha gaara edeta ihe Chineke chọrọ ka ndị mmadụ mara. Ma, ndị mmụọ ozi adịghị ka anyị. Otú obi na-adị ha dị iche n’otú ọ na-adị anyị. Ha enweghị mkpa ndị anyị nwere. Ha anaghịkwa emejọ ihe. Jehova ma na ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ abụghị otu. Ọ bụ ya mere o ji họrọ ụmụ mmadụ ka ha dee Baịbụl. E nwere mgbe ihe na-agaghị otú ndị dere Baịbụl na ndị ọzọ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl si chee. E nwere mgbe obi na-esichaghị ha ike ime ihe ha chọrọ ime, mgbe ha chị obi n’aka, na mgbe ha mejọrọ ihe. E nwekwara mgbe ihe ọma meere ha. Ọ bụrụ na anyị agụọ gbasara ihe ndị a, anyị ga-aghọta otú obi dị ha n’oge ndị ahụ. Baịbụl kwuru na Ịlaịja “nwere ụdị mmetụta anyị na-enwe.” Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị niile so dee Baịbụl.—Jems 5:17.

Ọ bụrụ na i cheta otú Jehova si mesoo Jona na Pita, olee otú ọ ga-esi mee ka ị bịarukwuo ya nso? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 na nke 15)

13. Ị gụọ ekpere ahụ Jona kpere, olee otú obi na-adị gị?

13 Dị ka ihe atụ, Jehova nyere Jona onye amụma ọrụ dị mkpa ọ ga-arụ, Jona ahapụ ya gbaa ọsọ. A sị na ọ bụ mmụọ ozi dere akụkọ ahụ, ì chere na ọ gaara akọcha otú obi dị Jona? Ọ ka mma na ọ bụ Jona ka Jehova gwara ka o dee gbasara ihe a mere ya nakwa ekpere o kpere mgbe ọ nọ n’oké osimiri. Jona kwuru, sị: “Mgbe mkpụrụ obi m tụbọrọ, ọ bụ Jehova ka m chetara.”—Jona 1:3, 10; 2:1-9.

14. Gịnị mere ị ga-eji aghọta ihe Aịzaya dere banyere onwe ya?

14 Ihe atụ ọzọ bụ mgbe Jehova gwara Aịzaya onye amụma ka o dee banyere onwe ya. Mgbe ọ hụrụ ebube Chineke n’ọhụụ, ọ ghọtara na ya bụ onye mmehie ma kwuo, sị: “Efuola m! N’ihi na ọ fọrọ nke nta ka m nwụọ, n’ihi na abụ m onye egbugbere ọnụ ya na-adịghị ọcha, ọ bụkwa n’etiti ndị egbugbere ọnụ ha na-adịghị ọcha ka m bi; n’ihi na anya m ahụwo Eze bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha!” (Aịza. 6:5) Ì chere na mmụọ  ozi ga-ekwuli ụdị ihe a banyere onwe ya? Ma, Aịzaya kwuru ya. Ebe ọ bụ na anyị bụ ndị na-ezughị okè, anyị ga-aghọtali otú obi dị ya n’oge ahụ.

15, 16. (a) Gịnị mere anyị nwere ike iji ghọta otú obi dị ndị mmadụ ibe anyị? Nye ihe atụ. (b) Gịnị ga-enyere anyị aka ịbịarukwu Jehova nso?

15 Jekọb kwuru na ya ‘erughị eru.’ Pita ekwuo na ya bụ “onye mmehie.” Ì chere na ndị mmụọ ozi ga-ekwuli ụdị ihe ahụ? (Jen. 32:10; Luk 5:8) Egwu ọ̀ gaara atụ ha otú ahụ ọ tụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs mgbe ụfọdụ? Baịbụl kwuru na Pọl na ndị ọzọ gbara mbọ tupu ha enwee ike iji “nkwuwa okwu” kwusaa ozi ọma mgbe a na-akpagbu ha. Ì chere na ndị mmụọ ozi gaara agba ụdị mbọ ahụ tupu ha ekwusaa ozi ọma? (Jọn 6:19; 1 Tesa. 2:2) Mba. Ndị mmụọ ozi zuru okè. Ha sikwara ike karịa ụmụ mmadụ. Ndị Jehova ji dee Baịbụl ezughị okè. N’ihi ya, anyị na-aghọta otú obi dị ha ebe ọ bụ na anyịnwa ezughịkwa okè. Mgbe anyị na-agụ ihe ha dere, anyị nwere ike ‘iso ha ṅụrịa ọṅụ mgbe ha na-aṅụrị ọṅụ, sorokwa ha kwaa ákwá mgbe ha na-akwa ákwá.’—Rom 12:15.

16 Ọ bụrụ na anyị echee echiche banyere otú Jehova si mesoo ndị ji obi ha niile jeere ya ozi n’oge ochie, anyị ga-amụta ọtụtụ ihe magburu onwe ha banyere Jehova. Anyị ga-ahụ otú o si jiri ndidi na obiọma bịaruo ha nso n’agbanyeghị na ha ezughị okè. Ọ bụrụ na anyị ana-amụkwu gbasara Jehova ma jiri obi anyị niile hụ ya n’anya, anyị ga-abịarukwu ya nso.—Gụọ Abụ Ọma 25:14.

MEE KA GỊ NA CHINEKE DỊ N’EZIGBO MMA

17. (a) Olee ezigbo ndụmọdụ Azaraya nyere Esa? (b) Olee otú Esa si jụ ndụmọdụ ahụ? Gịnị ka ọ kpataara ya?

17 Mgbe Eze Esa merichara ndị agha Itiopia, Azaraya onye amụma gwara ya ihe ga-abara ya na ndị Juda uru. O kwuru, sị: “Jehova ga-anọnyere unu ma ọ bụrụhaala na unu adịnyere ya; ọ bụrụ na unu achọọ ya, ọ ga-ekwe ka unu chọta ya, ma ọ bụrụ na unu ahapụ ya, ọ ga-ahapụ unu.” (2 Ihe 15:1, 2) Ma, ka oge na-aga, Esa emeghị ihe a Azaraya gwara ya. Mgbe alaeze ebe ugwu nke Izrel bịara ịlụso ndị Juda agha, ụjọ bịara Esa. Kama ọ ga-arịọ Jehova ka o nyere ya aka, ọ gakwuuru ndị Siria na-ekpere arụsị. Jehova gwara ya, sị: “I zuzuru nzuzu n’ihe a i mere, n’ihi ya, malite ugbu a gaa n’ihu, a ga na-ebuso gị agha.” Ihe a Jehova kwuru mere. Ọ lụgidere agha ruo mgbe ọ nwụrụ. (2 Ihe 16:1-9) Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta na ya?

18, 19. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị chọpụta na anyị ahapụwala Chineke? (b) Olee otú anyị nwere ike isi bịarukwuo Jehova nso?

18 Anyị ekwesịghị ịhapụ Jehova. Ọ bụrụ na anyị achọpụta na anyị ahapụwala ya, anyị kwesịrị ime ihe Hosia 12:6 kwuru ozugbo. Ọ sịrị: “Gị onwe gị kwesịrị ịlọghachikwute Chineke gị, bụ́ onye nwere obiọma, na-ekpe ikpe ziri ezi; nweekwa olileanya mgbe niile n’ebe Chineke gị nọ.” N’ihi ya, ka anyị gbaa mbọ na-abịarukwu Jehova nso. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-echebara àjà Jizọs chụrụ echiche na ịna-amụsi Baịbụl ike.—Gụọ Diuterọnọmi 13:4.

19 Otu ọbụ abụ kwuru, sị: “Ịbịaru Chineke nso dị m mma.” (Ọma 73:28) Ka anyị niile gbaa mbọ na-amụkwu gbasara Jehova. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-ahụkwu ya n’anya. Ọ bụrụ na anyị abịaruo Jehova nso, ọ ga-abịaru anyị nso ugbu a. Anyị na ya ga-adịkwa ná mma ruo mgbe ebighị ebi.

^ para. 3 Gụọ gbasara Esa n’isiokwu bụ́ “Unu Ga-enweta Ụgwọ Ọrụ Maka Ọrụ Unu.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Ọgọst 15, 2012.