Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌGỌST 2014

Olee Ọrụ Ụmụ Nwaanyị Na-arụ Iji Hụ na Nzube Jehova Mezuru?

Olee Ọrụ Ụmụ Nwaanyị Na-arụ Iji Hụ na Nzube Jehova Mezuru?

“Ndị inyom na-ezisa ozi ọma bụ ìgwè dị ukwuu.”—ỌMA 68:11.

1, 2. (a) Gịnị na gịnị ka Chineke nyere Adam? (b) Gịnị mere Chineke ji nye Adam nwaanyị? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

E NWERE ihe mere Jehova ji kee ụwa a. O kere ya ka ndị mmadụ “biri n’ime ya.” (Aịza. 45:18) Chineke kere mmadụ mbụ bụ́ Adam, ya abụrụ onye zuru okè. O nyere ya ebe mara ezigbo mma ọ ga-ebi, ya bụ, ogige Iden. O doro anya na obi dị Adam ụtọ ịhụ nnukwu osisi ndị dị n’ebe ahụ, mmiri ndị na-asọ na ya, na ụmụ anụmanụ ndị na-awụgharị n’ebe ahụ. Ma, e nwere ihe dị ezigbo mkpa kọrọ Adam. Jehova mere ka a mata ihe ọ bụ. O kwuru, sị: “Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọgide naanị ya. M gaje imere ya onye inyeaka, ka ọ bụrụ onye ga-eme ka o zuo ezu.” Chineke mere ka ezigbo ụra buru Adam, ya ewepụta otu ọgịrịga ya, jiri ya ‘kpụọ nwaanyị.’ Mgbe Adam tetara, obi tọrọ ya ezigbo ụtọ, ya ekwuo, sị: “Ehee! Onye a bụ ọkpụkpụ nke si n’ọkpụkpụ m na anụ ahụ́ nke si n’anụ ahụ́ m. A ga-akpọ onye a Nwaanyị, n’ihi na e si n’ahụ́ nwoke wepụta ya.”—Jen. 2:18-23.

2 Nwaanyị Chineke nyere Adam bụ onyinye pụrụ iche n’ihi na nwaanyị ahụ ga na-enyere ya aka. Ihe ọzọ bụ na ọ ga-enwe ike ịmụ ụmụ. Ọ bụ ya mere Adam ji gụọ nwunye ya Iv “n’ihi na ọ ga-aghọ nne nke onye ọ bụla dị ndụ.” (Jen. 3:20) Chineke nyere Adam na Iv onyinye magburu onwe ya. Ha ga-enwe ike ịmụ ndị ọzọ zuru okè. Ọ bụ otú ahụ ka ha ga-esi mụjuo ụwa, meekwa  ka ọ bụrụ paradaịs ma na-elekọta ihe ndị ọzọ Jehova kere.—Jen. 1:27, 28.

3. (a) Ọ bụrụ na Adam na Iv chọrọ ka Jehova gọzie ha, gịnị ka ha kwesịrị ime? Gịnị mechara mee? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

3 Ọ bụrụ na Adam na Iv chọrọ inweta ihe ọma niile Jehova kwere ha ná nkwa, ha kwesịrị irubere ya isi ma kwe ka ọ na-achị ha. (Jen. 2:15-17) Naanị ihe ga-eme ka ha nwee ike ime ihe Chineke bu n’obi kee ha bụ irubere ya isi. Ma, ọ dị mwute na “agwọ mbụ ahụ,” bụ́ Setan, duhiere ha, ha enupụrụ Chineke isi. (Mkpu. 12:9; Jen. 3:1-6) Olee nsogbu isi ahụ ha nupụrụ kpataara ụmụ nwaanyị? Gịnị ka ụmụ nwaanyị ndị ji obi ha niile fee Chineke n’oge ochie mere? Gịnị mere e nwere ike iji kwuo na ụmụ nwaanyị bụ́ Ndị Kraịst n’oge anyị a bụ “ìgwè dị ukwuu”?—Ọma 68:11.

NSOGBU NNUPỤISI KPATARA

4. Ònye ka Jehova tara ụta maka isi ahụ Adam na Iv nupụrụ?

4 Mgbe Jehova jụrụ Adam ihe mere o ji nupụ isi, o kwuru ihe na-enweghị isi na ọdụ. Ọ sịrị: “Nwaanyị ahụ i nyere m ka mụ na ya biri, ọ bụ ya nyere m mkpụrụ si n’osisi ahụ, m wee rie.” (Jen. 3:12) Ihe ahụ Adam mere ewuteghị ya, kama o kwuru na ọ bụ Iv kpatara ya. Ihe ahụ o kwuru gosiri na ọ tara Jehova ụta ebe ọ bụ ya nyere ya nwaanyị. N’agbanyeghị na ọ bụ Adam na Iv mehiere, ọ bụ Adam ka Jehova tara ụta maka mmehie ha abụọ. Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji kwuo na “mmehie si n’aka otu mmadụ [ya bụ, Adam] bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata.”—Rom 5:12.

5. Gịnị merela kemgbe ụmụ mmadụ chịwara ibe ha?

5 Setan mere ka Adam na Iv chewe na ọ bụghị Jehova kwesịrị ịchị ha. N’ihi ya, ajụjụ dị mkpa ọ kpatara bụ: Ònye kwesịrị ịchị ụmụ mmadụ? Ka Chineke nwee ike ịza ajụjụ ahụ, ọ hapụrụ ụmụ mmadụ ka ha na-achị onwe ha. Ọ ma na, ka oge na-aga, ọ ga-edo onye ukwu na onye nta anya na ọchịchị ụmụ mmadụ ga-ada. Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ọchịchị ụmụ mmadụ akpatala nsogbu dị iche iche. Dị ka ihe atụ, agha ndị a lụrụ naanị n’ime otu narị afọ gara aga tara isi ihe dị ka otu narị nde mmadụ. Ọtụtụ nde n’ime ha bụ ndị aka ha dị ọcha, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ma ụmụaka. N’ihi ya, Baịbụl kwuru eziokwu mgbe ọ sịrị na “ọ dịrịghị mmadụ nke na-eje ije ọbụna iduzi nzọụkwụ ya.” (Jere. 10:23) Ọ bụ ya mere anyị ji chọọ ka Jehova chịwa anyị.—Gụọ Ilu 3:5, 6.

6. N’ọtụtụ obodo, olee otú e si were ụmụ nwaanyị?

6 Ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ataala ahụhụ n’ụwa a Setan na-achị. (Ekli. 8:9; 1 Jọn 5:19) Ma, ọ bụ ụmụ nwaanyị ka a na-arụsakarị arụrụala ndị kacha njọ. Dị ka ihe atụ, e kee ụmụ nwaanyị nọ n’ụwa ụzọ atọ, ihe dị ka otu ụzọ bụ ndị di ha ma ọ bụ enyi ha nwoke tirila ihe ma ọ bụ dinaa n’ike. N’obodo ụfọdụ, ndị mmadụ weere na ọ bụ ụmụ nwoke na-aka aba uru. Ha chere na ọ bụrụ na ha etoo, ọ bụ ha ga na-elekọta papa ha na mama ha ma na-aza aha papa ha. E nwekwara ebe ndị a na-ewere ụmụ nwaanyị ka ndị na-abaghị uru. A chọpụta na ọ bụ nwaanyị ka a dị ime ya, e tee ya.

7. Olee ihe Chineke meere Adam na Iv mgbe o kere ha?

7 Arụrụala a na-arụsa ụmụ nwaanyị adịghị Chineke mma n’obi. Ọ na-akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù, ọ naghịkwa emegbu ha. Ihe gosiri na Jehova ji ụmụ nwaanyị kpọrọ ihe bụ na o kere Iv ka o zuo okè, meekwa ka o nwee àgwà ndị mere ka ọ bụrụ onye ga-eme ka Adam zuo ezuo, ọ bụghị ka ọ bụrụ ohu ya. O so n’ihe mere Baịbụl ji kwuo na mgbe Chineke kechara ihe n’ụbọchị nke isii, ọ “hụrụ ihe niile o mere, ma, lee! ha dị nnọọ mma.” (Jen. 1:31) N’eziokwu, “ihe niile” Jehova kere “dị nnọọ mma.” O doro anya na ihe  Chineke meere Adam na Iv mgbe o kere ha magburu onwe ya.

ỤMỤ NWAANYỊ JEHOVA KWADORO

8. (a) Olee otú ọtụtụ ndị si akpa àgwà? (b) Kemgbe ụwa, ole ndị ka Chineke na-akwado?

8 Mgbe Adam na Iv nupụchaara Jehova isi n’ogige Iden, ụmụ mmadụ akwụsịghị inupụrụ ya isi. Kemgbe ihe dị ka otu narị afọ, àgwà ndị mmadụ adịla njọ karịa otú ọ dịtụrụla. Baịbụl buru amụma na ọ ga-adị otú ahụ “n’oge ikpeazụ.” Otú ihe ọjọọ si ju ebe niile taa gosiri n’eziokwu na anyị bi ‘n’oge dị oké egwu.’ (2 Tim. 3:1-5) Ma, kemgbe ụwa, “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova” na-akwado ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị tụkwasịrị ya obi, na-erubere ya isi, kwekwa ka ọ na-achị ha.—Gụọ Abụ Ọma 71:5.

9. Mmadụ ole fọrọ mgbe Iju Mmiri gachara? Gịnị mere Chineke ji chebe ha?

9 Mgbe Chineke ji Iju Mmiri bibie ụwa n’oge Noa, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole fọrọ. Ọ bụrụ na ụmụnne Noa ka dị ndụ n’oge ahụ, ọ pụtara na ha niile nwụrụ n’Iju Mmiri ahụ. (Jen. 5:30) Ma, ụmụ nwoke fọrọnụ na ụmụ nwaanyị fọrọnụ hà. Ọ bụ Noa, nwunye ya, ụmụ ya atọ, na ndị nwunye ha fọrọ. Ihe mere Chineke ji chebe ha bụ na ha rubeere ya isi, meekwa uche ya. Mmadụ niile bi n’ụwa ugbu a si n’agbụrụ mmadụ asatọ ahụ Jehova kwadoro.—Jen. 7:7; 1 Pita 3:20.

10. Gịnị mere Jehova ji kwado ndị nwunye ndị nna nna ụmụ Izrel ji obi ha niile fee ya?

10 Mgbe ọtụtụ afọ gara, e nwere ndị nna nna ụmụ Izrel ji obi ha niile fee Chineke. Jehova nyeere ndị nwunye ha aka, chebekwa ha. Jehova agaraghị eme otú ahụ ma a sị na ha na-akwa ụwa ha. (Jud 16) Otu onye n’ime ha bụ Sera. Mgbe a gwara ya ka ọ hapụ ụlọ ya bụ́ ebe ahụ́ ruru ya ala n’obodo Ọọ ma gaa biwe n’ụlọikwuu n’ebe ọzọ, ọ tamughị ntamu. Kama, o ‘rubeere Ebreham isi, na-akpọ ya “onyenwe m.”’ (1 Pita 3:6) Onye ọzọ bụ ezigbo nwunye Aịzik, bụ́ Ribeka. Ọ bụ onyinye na-enweghị atụ Jehova nyere Aịzik. Ka a sịkwa ihe mere di ya bụ́ Aịzik ji “hụ ya n’anya, . . . wee nweta nkasi obi mgbe nne ya nwụsịrị.” (Jen. 24:67) Obi dị anyị ụtọ taa na anyị nwere ọtụtụ ụmụ nwaanyị na-atụ egwu Chineke otú ahụ Sera na Ribeka mere.

11. Olee otú ụmụ nwaanyị Hibru abụọ na-aghọ́ nwa si gosi na ha nwere obi ike?

11 Mgbe ụmụ Izrel na-agba ohu n’Ijipt, ha ghọrọ nnukwu mba. Fero nyere iwu ka e gbuo ụmụ nwoke ọ bụla ndị Izrel mụrụ. Ma, e nwere ụmụ nwaanyị Hibru abụọ na-aghọ́ nwa aha ha bụ Shifra na Pua. Ọ dị ka ọ̀ bụ ha bụ ndị isi ụmụ nwaanyị na-aghọ́ nwa. Ha katara obi jụ ime ihe ahụ Fero gwara ha n’ihi na ha tụrụ Jehova egwu karịa Fero. Chineke mechara mee ka ha nwee ezinụlọ nke ha.—Ọpụ. 1:15-21.

12. Olee ihe dị mkpa Debora na Jeel mere?

12 N’oge ndị ikpe Izrel, e nwere otu onye amụma nwaanyị a na-akpọ Debora. Chineke nọnyeere ya. Debora gbara onyeikpe aha ya bụ Berak ume, sorokwa mee ka a napụta ndị Izrel n’aka ndị iro ha. O buru amụma na ọ bụghị Berak ka a ga-enye otuto maka mmeri a ga-emeri ndị Kenan. Kama, “ọ bụ nwaanyị ka Jehova ga-ewere Sisera resị.” Ihe a o kwuru mere mgbe Jeel bụ́ nwaanyị na-abụghị onye Izrel gburu Sisera bụ́ ọchịagha ndị Kenan.—Ikpe 4:4-9, 17-22.

13. Olee ihe Baịbụl gwara anyị gbasara Abigel?

13 Nwaanyị ọzọ tụrụ egwu Jehova bụ Abigel. Ọ dịrị ndụ ihe dị ka otu puku afọ na otu narị Tupu Oge Ndị Kraịst. Ọ bụ nwaanyị nwere uche. Ma, di ya bụ́ Nebal dị aka ike, bụrụkwa onye na-abaghị uru na onye nzuzu. (1 Sam. 25:2, 3, 25) Devid na ndị na-ejere ya ozi chebere ma ndị ohu Nebal ma anụ ụlọ ya. Ma, mgbe Devid zigara ndị na-ejere ya ozi ka ha gwa ya ka o nye ha ihe ọ bụla aka ya ruru, ọ “kpọrọ ha iyi.” O kweghị enye ha ihe ọ bụla. Ezigbo  iwe were Devid, ya ekpebie ịga gbuo Nebal na ndị na-ejere ya ozi. Mgbe Abigel nụrụ ya, o buuru nri na ihe ọṅụṅụ gaa nye Devid na ndị na-ejere ya ozi. O si otú ahụ mee ka Devid ghara igbu Nebal. (1 Sam. 25:8-18) Devid mechara gwa Abigel, sị: “Ka Jehova bụ́ Chineke Izrel, bụ́ onye zitere gị taa ka ị bịakwute m, bụrụ onye a gọziri agọzi!” (1 Sam. 25:32) Mgbe Nebal nwụrụ, Devid lụrụ Abigel.—1 Sam. 25:37-42.

14. Olee ọrụ ụmụ Shalọm ndị nwaanyị so rụọ? Olee otú ụmụnna nwaanyị si arụ ụdị ọrụ ahụ taa?

14 Ọtụtụ ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, na ụmụaka nwụrụ mgbe ndị Babịlọn bibiri Jeruselem na ụlọ nsọ ya n’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst. A rụghachiri mgbidi obodo ahụ n’afọ 455 Tupu Oge Ndị Kraịst. Ọ bụ Nehemaya hụrụ maka ya. E nwere ụmụ nwaanyị ndị so rụzie mgbidi ahụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ ụmụ otu nwoke bụ́ onyeisi ọkara ógbè Jeruselem aha ya bụ Shalọm. (Nehe. 3:12) Ha ji obi ha niile rụọ ọrụ ndị mmadụ na-eledakarị anya. Taa, obi dị anyị ụtọ na e nwere ọtụtụ ụmụnna nwaanyị ndị na-enye aka ka a rụọ ụlọ ndị anyị na-anọ efe Jehova.

ỤMỤ NWAANYỊ NDỊ TỤRỤ EGWU CHINEKE N’OGE JIZỌS

15. Olee ihe ùgwù Jehova nyere Meri?

15 Mgbe ọ fọrọ obere ka Jizọs bịa n’ụwa nakwa mgbe ọ bịara, Jehova nyere ụmụ nwaanyị ụfọdụ ihe ùgwù pụrụ iche. Otu onye n’ime ha bụ Meri bụ́ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke. Mgbe ya na Josef kwekọrịtara na ha ga-alụ, Jehova ji mmụọ nsọ ya mee ka ọ dịrị ime. Gịnị mere Chineke ji họrọ ya ka ọ bụrụ nne Jizọs? O doro anya na ọ bụ maka na o nwere àgwà ọma ndị ga-enyere ya aka ịzụ nwa zuru okè ọ ga-amụta. N’eziokwu, ịbụ nne nwoke kacha ukwuu nke dịtụrụla ndụ n’ụwa bụ ihe ùgwù na-enweghị atụ.—Mat. 1:18-25.

16. Nye ihe atụ gosiri otú Jizọs si emeso ụmụ nwaanyị.

16 Jizọs na-emere ụmụ nwaanyị obiọma. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere otu nwaanyị na-arịa ọrịa oruru ọbara kemgbe afọ iri na abụọ. Mgbe Jizọs nọ n’etiti ìgwè mmadụ, nwaanyị ahụ si n’azụ metụ uwe ya aka. Jizọs abaraghị ya mba. Kama, o ji obiọma gwa ya, sị: “Nwa m nwaanyị, okwukwe gị emewo ka ahụ́ dị gị mma. Laa n’udo, gbakee n’ọrịa ọjọọ nke na-arịa gị.”—Mak 5:25-34.

17. Gịnị mere na Pentikọst afọ 33?

17 Ụfọdụ ụmụ nwaanyị na-eso ụzọ Jizọs jeere ya na ndịozi ya ozi. (Luk 8:1-3) Na Pentikọst afọ 33, Chineke wụkwasịrị ihe dị ka otu narị mmadụ na iri abụọ mmụọ nsọ ya, ya bụ, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị. Otú o si mee ya pụrụ iche. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 2:1-4.) Tupu mgbe ahụ, Jehova buru amụma, sị: “M ga-awụkwasị mmụọ m n’ahụ́ ụdị anụ ahụ́ ọ bụla, ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebukwa amụma . . . M ga-awụkwasịkwa mmụọ m ọbụna n’ahụ́ ndị ikom na-eje ozi nakwa n’ahụ́ ndị inyom na-eje ozi n’ụbọchị ndị ahụ.” (Joel 2:28, 29) Jehova ji ọrụ ebube ahụ ọ rụrụ n’ụbọchị ahụ gosi na ya ajụla mba Izrel si n’ezi ofufe dapụ nakwa na ndị ọ na-akwadozi bụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị so ‘n’Izrel nke Chineke.’ (Gal. 3:28; 6:15, 16) N’oge ndịozi Jizọs, e nwekwara ụmụ nwaanyị ndị so kwusaa ozi ọma. Anọ n’ime ha bụ ụmụ Filip onye na-ekwusa ozi ọma.—Ọrụ 21:8, 9.

ỤMỤ NWAANYỊ BỤ “ÌGWÈ DỊ UKWUU”

18, 19. (a) Olee ihe ùgwù Chineke mere ka ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị nwee? (b) Gịnị ka otu ọbụ abụ kpọrọ ụmụ nwaanyị na-ekwusa ozi ọma?

18 Malite n’ihe dị ka n’afọ 1875, ụfọdụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị nwere ezigbo mmasị n’eziokwu dị na Baịbụl. Ọ bụ ha mepeere ndị na-ekwusa ozi ọma ugbu a ụzọ ka e nwee ike imezu amụma  ahụ Jizọs buru, ya bụ: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—Mat. 24:14.

19 N’oge ahụ, e nwere naanị Ndị Mmụta Baịbụl ole na ole. Ma ugbu a, e nwere ihe dị ka nde Ndịàmà Jehova asatọ. Ihe karịrị nde mmadụ iri na otu na-eso anyị abịa Ncheta Ọnwụ Jizọs kwa afọ, si otú ahụ gosi na ihe gbasara Baịbụl na ozi ọma anyị na-ekwusa dị ha mma. N’ọtụtụ ebe, ọ bụ ụmụ nwaanyị kacha abịa ya. N’ụwa niile, e nwere ihe karịrị otu nde ụmụnna na-eje ozi oge niile. N’ọtụtụ mba, ụmụ nwaanyị kacha ná ndị ahụ na-eje ozi oge niile. Jehova emeela ka ụmụ nwaanyị nwee ezigbo ihe ùgwù, ya bụ, iso na-ekwusa gbasara ya. N’ihi ya, ihe otu ọbụ abụ kwuru emezuola. Ọ sịrị: “Ndị inyom na-ezisa ozi ọma bụ ìgwè dị ukwuu.”—Ọma 68:11.

N’eziokwu, ụmụ nwaanyị na-ezisa ozi ọma bụ “ìgwè dị ukwuu” (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18 na nke 19)

JEHOVA GA-AGỌZI ỤMỤ NWAANYỊ NA-ATỤ EGWU YA

20. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụ gbasara ha?

20 N’isiokwu a, anyị agaghị ekwucha gbasara ụmụ nwaanyị niile Baịbụl gwara anyị na ha ji obi ha niile jeere Chineke ozi. Ma, anyị niile nwere ike ịgụ gbasara ha n’Okwu Chineke nakwa n’akwụkwọ dị iche iche nzukọ Jehova na-ebipụta. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike iche echiche gbasara otú Rut si sosie Neomi ike, jirikwa obi ya niile fee Jehova. (Rut 1:16, 17) Ọ bụrụ na anyị agụọ ihe Baịbụl kọrọ gbasara Esta nwunye eze nakwa isiokwu ndị kwuru gbasara ya n’akwụkwọ anyị, o nwere ike ime ka okwukwe anyị sikwuo ike. Ọ bụrụ na anyị amụọ ụdị ihe a n’ofufe ezinụlọ anyị, ọ ga-abara anyị uru. Ọ bụrụ na anyị bi naanị anyị, anyị nwere ike ịtụle ya mgbe anyị na-amụ ihe.

21. Olee otú ụmụ nwaanyị na-atụ egwu Chineke si gosi na ha na-erubere ya isi mgbe ọnwụnwa bịaara ha?

21 O doro anya na Jehova na-agọzi ozi ọma ụmụnna nwaanyị na-ekwusa ma na-akwado ha mgbe ọnwụnwa bịaara ha. Dị ka ihe atụ, mgbe ọchịchị ndị Nazi na ndị Kọmunist na-echi ụmụnna anyị ọnụ n’ala, Jehova nyeere ụmụnna nwaanyị kwesịrị ntụkwasị obi aka ka ha na-erubere ya isi. Ọtụtụ n’ime ha tara ahụhụ, e gbuokwa ụfọdụ n’ihi na ha na-erubere Chineke isi. (Ọrụ 5:29) Taa, ụmụnna anyị ndị nwaanyị na ụmụnna ndị ọzọ na-eme ụdị ihe ahụ ụmụnna nwaanyị ahụ mere. Ha ekwela ka Jehova na-achị ha. E nwere ike ikwu na Jehova na-agwa ha ihe ahụ ọ gwara ụmụ Izrel n’oge ochie, ya bụ: “Atụla egwu. Mụ onwe m ga-enyere gị aka.”—Aịza. 41:10-13.

22. Olee ihe ùgwù ndị anyị ga-enwe n’ọdịnihu?

22 N’ọdịnihu, Jehova ga-eji ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-atụ egwu ya mee ka ụwa ghọọ paradaịs. Ha ga-enyekwara ọtụtụ nde ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ aka ka ha mụta gbasara Jehova na ihe o bu n’obi imere ụmụ mmadụ. Tupu mgbe ahụ, ma ànyị bụ nwoke ma ànyị bụ nwaanyị, ka anyị niile “jiri otu obi” na-ejere Jehova ozi. Ọ bụ ihe ùgwù anyị kwesịrị iji kpọrọ ihe.—Zef. 3:9.