Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JULAỊ 2014

 AKỤKỌ NDỤ

Papa M Nwụrụ, Mụ Enweta Papa Ọzọ

Papa M Nwụrụ, Mụ Enweta Papa Ọzọ

A MỤRỤ papa m n’afọ 1899 n’otu obodo a na-akpọ Graz, nke dị n’Ọstria. N’ihi ya, ọ ka na-eto eto mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ. Obere oge Agha Ụwa nke Abụọ malitechara n’afọ 1939, ndị agha Jamanị kpụụrụ ya ka o soro ha lụwa agha. E gburu ya n’afọ 1943 mgbe ọ na-alụ agha na Rọshịa. Ọ bụ otú ahụ ka m si ghọọ onye na-enweghị nna mgbe m dị naanị ihe dị ka afọ abụọ. Amaghị m papa m. Obi anaghị adị m mma ma m cheta ya, nke ka nke, ebe ọ bụ na ụmụ akwụkwọ ibe m nwere nna, ma enweghị m. Ma, mgbe m na-eto eto, obi malitere ịdị m mma mgbe m matara gbasara Nna anyị nke eluigwe, bụ́ onye na-anaghị anwụ anwụ.—Hab. 1:12.

IHE NDỊ MERE MGBE M NỌ NA BỌỊ SKAỤT

Mgbe m bụ obere nwa

Mgbe m dị afọ asaa, m banyere n’otu òtù a ma ama n’ụwa niile. A na-akpọ ya Bọị Skaụt. Ọ bụ ọchịagha ndị Briten aha ya bụ Robert Stephenson Smyth Baden-Powell malitere ya n’afọ 1908. N’afọ 1916, ọ malitere nke ụmụaka ma kpọọ ya Kọb Skaụt.

Ebe ndị anyị na-aga ná ngwụcha izu na-atọ m ụtọ. Anyị na-ehi n’ụlọikwuu, yiri uwe ndị Skaụt, a na-akụrụ anyị ịgbà, anyị ana-azọ ije n’ahịrị. Obi na-adị m ụtọ ma mụ na ndị Skaụt ibe m nọrọ. Anyị na-akwanye ọkụ n’ime ọhịa, gbaa ya gburugburu na-abụ abụ. Anyị mụtara ọtụtụ ihe gbasara ihe dị iche iche Jehova kere, ya emezie ka m na-enwe obi ụtọ ma m hụ ihe ndị ahụ.

A na-akụziri ndị Skaụt ka ha na-eme ihe ọma kwa ụbọchị. Ihe anyị na-eji ekele ibe anyị bụ, “Anyị Jikeere Ejikere Mgbe Niile.” Ọ na-atọ m ezigbo ụtọ. Anyị dị ihe karịrị otu narị ụmụ okoro n’òtù anyị. Ihe dị ka ọkara bụ ndị Katọlik, ọkara bụ ndị Protestant, otu onye abụrụ onye Buda.

Kemgbe afọ 1920, ọ na-abụ afọ ole na ole gaa, ndị Skaụt enwee nnọkọ. Ha na-esi mba dị iche iche abịa ya. Agara m ụfọdụ nnọkọ ndị ahụ. Eso m gaa ememme nke asaa ndị Skaụt nọ n’ụwa niile mere n’ọnwa Ọgọst n’afọ 1951, n’otu obodo a na-akpọ Bat Ishụl, nke dị n’Ọstria. Esokwa m gaa ememme nke itoolu ha mere n’ọnwa Ọgọst n’afọ 1957, n’ebe dị nso n’otu obodo a na-akpọ Beminham, nke dị n’Ingland. Ihe dị ka puku ndị Skaụt iri atọ na atọ si iri mba asatọ na ise bịa ya. E nwere ihe dị ka narị puku mmadụ asaa na puku iri ise bịara leta anyị. Otu onye n’ime ha bụ eze nwaanyị ndị Ingland aha ya bụ Elizabeth. Ịbụ onye Skaụt dị m ka iso n’ezinụlọ zuru ụwa ọnụ. Ma, amaghị m na m ga-emecha soro n’ezinụlọ ka nke ahụ mma, ya bụ, ezinụlọ ndị nọ na ya hụrụ Jehova n’anya.

MGBE MBỤ M HỤRỤ ONYEÀMÀ JEHOVA

Onye mụ na ya nọ na foto a bụ Rudi Tschiggerl. O so ná ndị na-esi nri na họtel ahụ, bụrụkwa onye mbụ ziri m ozi ọma

N’agbata ọnwa Mach na Eprel n’afọ 1958, ọ fọrọ obere ka m mụchaa ọrụ m na-amụ n’otu họtel dị na Graz, n’Ọstria. Ihe m nọ na-amụ bụ otú e si ebunye ndị mmadụ nri. N’ebe ahụ, otu nwoke aha ya bụ  Rudolf Tschiggerl ziri m ozi ọma. Mụ na ya na-arụkọ ọrụ. O so ná ndị na-esi nri na họtel ahụ. Tupu mgbe ahụ, anụtụbeghị m gbasara eziokwu Baịbụl. Ihe mbụ ọ gwara m bụ na ozizi Atọ n’Ime Otu esighị na Baịbụl. Agwara m ya na o si na Baịbụl nakwa na ihe o kwuru abụghị eziokwu. Ahụrụ m Rudolf n’anya. Agbalịkwara m ime ka ọ lọghachi na Chọọchị Katọlik.

Rudolf, bụ́ onye anyị na-akpọ Rudi, chọrọ inye m Baịbụl. Ma, agwara m ya na ihe m chọrọ bụ naanị Baịbụl ndị Katọlik. N’ihi ya, o nyere m otu. Mgbe m bidoro ịgụ ya, ahụrụ m traktị Ndịàmà Jehova bipụtara o tinyere n’ime ya. Ekweghị m agụ ya n’ihi na echere m na ihe a na-ede n’ụdị akwụkwọ ahụ nwere ike iyi ka ọ̀ bụ eziokwu, ma e mechaa, ya abụrụ na ọ bụghị eziokwu. Ma, ekwetara m ka mụ na ya na-ekwurịta ihe dị na Baịbụl. Rudi kwụsịrị inye m akwụkwọ ọ bụla ka m gụọ. Ihe a o mere gosiri na ọ ma ihe. Ruo ihe dị ka ọnwa atọ, mụ na ya kwurịtara ihe gbasara Baịbụl mgbe ụfọdụ. O nwere mgbe anyị na-ekwugide ya ruo n’ime abalị.

Mgbe a kụzichaara m otú e si ebunye ndị mmadụ nri na họtel, mama m dunyere m ụlọ akwụkwọ na-akụzi otú e si ahazi ihe na họtel. Ụlọ akwụkwọ ahụ dị n’otu obodo a na-akpọ Bat Hofgastaịn, nke dị na ndagwurugwu. E nwere ihe jikọrọ ya na otu họtel dị n’obodo Bat Họfgastaịn. N’ihi ya, m na-aga ebe ahụ arụ ọrụ mgbe ụfọdụ ka ihe a na-akụziri m n’ụlọ akwụkwọ ahụ nwee ike idokwu m anya.

MGBE ỤMỤNNA NWAANYỊ ABỤỌ BỤ́ NDỊ OZI ALA ỌZỌ BỊARA LETA M

Ndị a bụ Ilse Unterdörfer na Elfriede Löhr. Ha malitere ịmụrụ m Baịbụl n’afọ 1958

Rudi nyere alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Vienna adres m. Alaka ụlọ ọrụ ahụ enyezie ya ụmụnna nwaanyị abụọ bụ́ ndị ozi ala ọzọ ka ha bịa leta m. Aha ha bụ Ilse Unterdörfer na Elfriede Löhr. * Otu ụbọchị, onye na-anabata ndị mmadụ na họtel ahụ gwara m na e nwere ụmụ nwaanyị abụọ chọrọ ịhụ m. Ọ gwara m na ha nọ n’ụgbọala na-eche m n’èzí. O juru m anya n’ihi na amaghị m ndị ha bụ. Ma, m gara ka m hụ ha. Emechara m chọpụta na ọ bụ ha na-ebugara ụmụnna anyị nọ na Jamanị akwụkwọ mgbe ọchịchị ndị Nazi machibidoro Ndịàmà Jehova iwu tupu a lụwa Agha Ụwa nke Abụọ. Tupu agha ahụ amalite, ndị uwe ojii nzuzo ndị Jamanị jidere ha ma kpọga ha n’ogige ịta ahụhụ dị na Liktenbọg. Mgbe a na-alụ agha ahụ, e si n’ogige ịta ahụhụ ahụ kpọga ha na nke dị na Ravensbruk, bụ́ ebe dị nso na Belin.

Ụmụnna nwaanyị abụọ ahụ na mama m nwere ike ịbụ ọgbọ. N’ihi ya, m kwanyeere ha ùgwù. Achọghị m igbu oge ha. Achọghị m ka mụ na ha kwurịta ihe dị na Baịbụl, izu ole na ole ma ọ bụ ọnwa ole na ole gaa, mụ agwa ha na achọghịzi m. N’ihi ya, m gwara ha ka ha depụtara m amaokwu Baịbụl ndị kwuru gbasara ihe ndị Katọlik na-akụzi na Pita onyeozi bụ poopu mbụ nakwa na ọ bụ ya nyere poopu ndị ọzọ ikike. M gwara ha na m ga-eji ya agakwuru ụkọchukwu anyị ka mụ na ya kwurịta ya. M chere na m ga-esi otú ahụ mata nke bụ́ eziokwu.

OTÚ M SI MATA ONYE BỤ́ EZIGBO NNA DỊ NSỌ

Ndị Katọlik na-eji ihe Jizọs kwuru na Matiu 16:18, 19 akwado ihe ahụ ha na-akụzi na ọ bụ Pita bụ  poopu mbụ. Ha na-akpọ poopu Nna Dị Nsọ, na-ekwukwa na ihe ọ bụla poopu kwuru bụ eziokwu. Ọtụtụ ndị Katọlik kweere ihe a. Ha na-ejikwa ya ekpebi ihe ha ga-ekwere. N’oge ahụ, ekweere m na ọ bụ eziokwu. M chere na ọ bụrụ na poopu ekwuo na ozizi Atọ n’Ime Otu bụ eziokwu, ọ ga-abụrịrị eziokwu. Ma, ọ bụrụ na poopu nwere ike ikwu ihe na-abụghị eziokwu, ọ pụtara na ozizi Atọ n’Ime Otu nwere ike ọ gaghị abụ eziokwu.

Mgbe m gakwuuru ụkọchukwu ahụ, o nweghị ajụjụ ọ bụla m jụrụ ya ọ zaliri. Kama, o nyere m otu akwụkwọ nke kọwara na ọ bụ Pita bụ poopu mbụ. M ji ya laa, gụọ ya ma gaghachi na nke ya, jụọ ya ajụjụ ndị ọzọ. Ma o nweghị nke ọ zaliri. Ọ gwara m, sị: “Agaghị m emeli ka i kweta ihe m kwuru. Ị gaghịkwanụ emeli ka m kweta nke i kwuru. . . . Gawaziere onwe gị.” Ọ chọghịzi ka mụ na ya kwuo ihe ọ bụla gbasara Baịbụl.

Ọ bụ mgbe ahụ ka m kpebiri ka mụ na Ilse na Elfriede mụwa Baịbụl. Ha kụziiri m ọtụtụ ihe gbasara Jehova Chineke, mee ka m mata na ọ bụ ya bụ ezigbo Nna Dị Nsọ nke bi n’eluigwe. (Jọn 17:11) N’oge ahụ, e nweghị ọgbakọ n’ebe ahụ. N’ihi ya, ọ bụ ụmụnna nwaanyị abụọ ahụ na-eduzi ọmụmụ ihe n’ụlọ otu nwoke ya na ezinụlọ ya nwere mmasị n’eziokwu Baịbụl. Ọ bụ naanị mmadụ ole na ole na-abịa. Ebe ọ bụ na e nweghị nwanna nwoke e mere baptizim ga na-akụzi ihe n’ọgbakọ, ọ bụ ha abụọ na-eme ọtụtụ ihe omume a na-eme, ma ha na-eme ya ka ebe mmadụ abụọ na-akparịta ụka. Mgbe ụfọdụ, nwanna nwoke na-esi n’ebe ọzọ bịa kwuo okwu ihu ọha n’otu ebe anyị kwụrụ ụgwọ ya.

OTÚ M SI MALITE IKWUSA OZI ỌMA

Ilse na Elfriede malitere ịmụrụ m Baịbụl n’ọnwa iri n’afọ 1958. E mere m baptizim mgbe ọnwa atọ gara, ya bụ, n’ọnwa mbụ n’afọ 1959. Tupu e mee m baptizim, m jụrụ ha ma m̀ nwere ike iso ha gaa ozi ọma ụlọ n’ụlọ ka m hụ otú e si ekwusa ozi ọma. (Ọrụ 20:20) Mgbe m so ha gachaa n’ụbọchị mbụ, agwara m ha ka ha nye m ebe m ga na-ekwusa ozi ọma. Ha nyere m otu obodo. Naanị m na-aga n’ebe ahụ ekwusa ozi ọma ụlọ n’ụlọ, na-agakwa nletaghachi. Nwanna nwoke mbụ mụ na ya so gaa ozi ọma ụlọ n’ụlọ bụ onye nlekọta sekit mechara leta anyị.

N’afọ 1960, mgbe m gachara ụlọ akwụkwọ ahụ na-akụzi otú e si ahazi ihe na họtel, m laghachiri obodo anyị ka m gaa kụziere ndị ezinụlọ anyị eziokwu Baịbụl. Ka ọ dị ugbu a, o nwebeghị onye n’ime ha ghọrọ Onyeàmà Jehova. Ma, ụfọdụ na-enwe mmasị n’eziokwu Baịbụl.

OTÚ M SI MALITE OZI OGE NIILE

Mgbe m gaferela afọ iri abụọ

N’afọ 1961, alaka ụlọ ọrụ degaara ọgbakọ dị iche iche akwụkwọ ozi ma gbaa ụmụnna ume ka ha malite ịsụ ụzọ. N’oge ahụ, alụbeghị m nwaanyị, ahụ́ gbasikwara m ike. N’ihi ya, ahụghị m ihe kwesịrị ime ka m ghara ịsụ ụzọ. Ma, echere m na m kwesịrị ịzụ ụgbọala m ga-eji na-asụ ụzọ. M kọọrọ onye nlekọta sekit anyị aha ya bụ Kurt Kuhn na m chọrọ ịrụ ọrụ ọnwa ole na ole ka m nweta ego m ga-eji zụọ ụgbọala m ga-eji na-aga ozi ọma. Ọ jụrụ m, sị: “Mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya na-ekwusa ozi ọma, hà nwere ụgbọala?” Ajụjụ a ọ jụrụ m nyeere m aka ikpebi ihe m ga-eme. M bu n’obi na m ga-amalite ịsụ ụzọ ozugbo. Ma, ebe ọ bụ na m na-eji awa iri asaa na abụọ arụ ọrụ kwa izu n’ebe a na-ere nri na họtel, ekwesịrị m ibu ụzọ gbanwee ihe ụfọdụ m na-eme.

Ajụrụ m ọga m ma ọ̀ ga-ekwe ka m na-arụ ọrụ awa iri isii n’izu. O kwetara ma na-akwụ m ego ole  ọ na-akwụbu m. Obere oge, m gakwuuru ya ọzọ rịọ ya ka m rụwa ọrụ naanị awa iri anọ na asatọ n’izu. O kwetakwara ma na-akwụ m ego ole ọ na-akwụbu m. M mechakwara gaa rịọ ya ka o kwe ka m na-arụ ọrụ awa iri atọ na isii n’izu, ya ekwetakwa. Ihe ọ pụtara bụ na m ga na-arụ ọrụ awa isii kwa ụbọchị ruo ụbọchị isii n’izu ọ bụla. Ma, o juru m anya na o wepụghị ihe n’ego ọ na-akwụ m. O yiri ka ọ chọghị ka m kwụsị ịrụrụ ya ọrụ. Obere oge a m jizi arụ ọrụ mere ka m malite ịsụ ụzọ. N’oge ahụ, ndị ọsụ ụzọ na-enye otu narị awa n’ọnwa.

Mgbe ọnwa anọ gara, a họpụtara m ka m bụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche na ohu ọgbakọ n’otu obere ọgbakọ dị n’obodo Shpital an de Draụ. N’oge ahụ, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na-enye otu narị awa na iri ise. Ọ bụ naanị m bụ ọsụ ụzọ n’ọgbakọ ahụ. Ma, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Gertrude Lobner na-abịakarị ka mụ na ya gaa ozi ọma. Ọ bụ ya na-enyere ohu ọgbakọ aka. *

ỌRỤ ỌHỤRỤ NDI E NYERE M

N’afọ 1963, a gwara m ka m bụrụ onye nlekọta sekit. M na-agbakarị ụgbọ okporo ígwè ma m gaa ileta ọgbakọ. M na-ebukwa akpa m tinyere uwe m na akwụkwọ. Ọtụtụ ụmụnna enweghị ụgbọala. N’ihi ya, o nweghị onye na-abịa eburu m n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè. Anaghị m agba tagzi ma m gawa n’ebe m ga-arahụ n’ihi na achọghị m ka ụmụnna chewe na m dị mpako. Kama, m na-eji ụkwụ aga ya.

N’afọ 1965, a gwara m ka m gaa klas nke iri anọ na otu nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Alụbeghị m nwaanyị n’oge ahụ. Ọtụtụ ụmụ klas anyị alụbeghịkwa di ma ọ bụ nwaanyị. Mgbe anyị gụchara akwụkwọ, o juru m anya mgbe a gwara m ka m laghachi n’obodo m bụ́ Ọstria gaa bụrụkwa onye nlekọta sekit. Ma, tupu mụ ahapụ Amerịka, a gwara m ka m soro otu onye nlekọta sekit gaa letawa ọgbakọ ruo izu anọ. Obi dị m ụtọ na mụ na Anthony Conte rụkọrọ ọrụ. Ọ bụ nwanna nwere obiọma, onye na-anaghị eji ozi ọma egwu egwu. Ọ rụpụtakwara ọtụtụ ihe bara uru n’ozi ọma ọ na-ekwusa. Mụ na ya so gaa leta ọgbakọ ndị dị na Kọnwọl, nke dị n’ebe ugwu Niu Yọk.

Ụbọchị anyị gbara akwụkwọ

Mgbe m laghachiri Ọstria, a gwara m ka m gaa letawa otu sekit. Ọ bụ n’ebe ahụ ka m hụrụ otu nwanna nwaanyị mara mma aha ya bụ Tove Merete. Ọ dị afọ ise mgbe e mere papa ya na mama ya baptizim. Ọ na-abụ ụmụnna jụọ anyị otú anyị abụọ si mata, anyị na-eji egwuregwu gwa ha, sị, “Ọ bụ alaka ụlọ ọrụ haziri ya.” Anyị gbara akwụkwọ n’afọ na-eso ya, ya bụ, n’ọnwa anọ n’afọ 1967. A gwakwara m ka m ka bụrụ onye nlekọta sekit.

Ndị Rom 8:15 kwuru otú adịm ná mma ụfọdụ ndị na Jehova ga-esi pụọ iche, ha abụrụ ụmụ ya ndị nwere olileanya ịga eluigwe. Ha na-eti mkpu, sị: “Aba, Nna!” Ọ malitere ịdị m otú ahụ n’afọ 1968. Ọ bụ n’afọ ahụ ka m ghọtara na Jehova ejirila obiọma ya na-erughịrị mmadụ mee ka m soro n’ụmụ ya e tere mmanụ ga-aga eluigwe.

Mụ na Merete rụgidere ọrụ sekit na ọrụ distrikti ruo n’afọ 1976. Mgbe ụfọdụ n’oge oyi, ebe anyị na-arahụ na-ajụ ezigbo oyi. Ụdị oyi na-atụ n’ebe ahụ nwere ike ime ka mmiri kpụkọọ. Anyị enweghị ihe  na-eme ka ụlọ kporo ọkụ. Otu ụbọchị anyị tetara ụra, anyị chọpụtara na ebe ume anyị na-ekusa ákwà anyị ji kpuchie onwe anyị akpụkọọla. Anyị mechara kpebie na anyị ga na-ebu obere ihe na-eme ka ụlọ kporo ọkụ ka oyi ghara ịtụgbu anyị n’abalị. N’ebe ụfọdụ, anyị chọọ ịnyụ mamịrị n’abalị, anyị na-aga n’elu snoo tupu anyị eruo n’ebe anyị ga-anyụ ya. Ụdị oyi na-atụ n’ebe ahụ na-adịkwa egwu. Anyị enweghị ụlọ nke anyị. N’ihi ya, anyị gaa ileta ọgbakọ, anyị na-anọ n’ụlọ ha nyere anyị ruo ụbọchị Mọnde. O ruzie n’ụtụtụ Tuzdee, anyị agawa ọgbakọ ọzọ.

Obi dị m ụtọ na ezigbo nwunye m na-akwado m kemgbe ọtụtụ afọ. Ịga ozi ọma na-atọgbu ya atọgbu. Anaghị m agba ya ume tupu ya agaa ozi ọma. Ọ hụrụ ụmụnna n’anya. Ihe banyere ndị ọzọ na-emetụkwa ya n’obi. Àgwà ọma a ọ na-akpa abaala ezigbo uru.

N’afọ 1976, a gwara anyị ka anyị gaa jewe ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị na Viena, n’Ọstria. A họpụtara m ka m soro na Kọmitii Alaka. N’oge ahụ, ọ bụ alaka ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ maka ozi ọma a na-ekwusa n’ọtụtụ obodo ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Yurop. Ọ bụkwa ya na-ahụ na e bugaara ụmụnna nọ n’obodo ndị ahụ akwụkwọ anyị na nzuzo. Ọ bụ Nwanna Jürgen Rundel na-ahụ maka ya. Ọ rụsikwara ọrụ ike. Mụ na ya rụkọrọ ọrụ, e mechaa gwa m ka m gaa lekọtawa otú a ga-esi na-asụgharị akwụkwọ anyị n’asụsụ iri a na-asụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Yurop. Nwanna Jürgen na Gertrude nwunye ya ka bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na Jamanị. Ha anaghị eji ozi ha egwu egwu. Malite n’afọ 1978, ọ bụ alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Ọstria na-ahazi Ụlọ Nche na Teta! n’asụsụ isii ma jiri obere ígwè e ji ebi akwụkwọ bipụta ha. Anyị na-ezigakwara ndị bi n’obodo ndị ọzọ Ụlọ Nche na Teta! ha tụrụ ọda ya. Onye na-ahụ maka ihe ndị ahụ n’oge ahụ bụ Nwanna Otto Kuglitsch. Ya na Ingrid nwunye ya na-eje ozi ugbu a n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Jamanị.

N’Ọstria, esi m n’ụzọ dị iche iche zie ndị mmadụ ozi ọma. Ihe a bụ ebe m na-enye onye na-agafe n’ụzọ akwụkwọ

Ụmụnna ndị bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Yurop na-ebipụta akwụkwọ anyị n’obodo ha. Ha na-eji ígwè kọpị kọpị ma ọ bụ ụdị ígwè ọzọ ebipụta ya. Ma, ụmụnna ndị si ná mba ọzọ nyeere ha aka. Jehova ekweghị ka ihe ọ bụla kụghasịa ọrụ ha. Anyị bụ́ ndị nọ n’alaka ụlọ ọrụ hụrụ ụmụnna ndị ahụ n’anya n’ihi na ha ji obi ha niile jeere Chineke ozi ruo ọtụtụ afọ n’agbanyeghị na ndị ọchịchị machibidoro Ndịàmà Jehova iwu n’ebe ahụ.

 MGBE ANYỊ GARA LETA ỤMỤNNA NỌ NA ROMENIA

N’afọ 1989, eso m Nwanna Theodore Jaracz gaa Romenia. N’oge ahụ, o so n’Òtù Na-achị Isi. Ihe mere anyị ji gaa bụ ka anyị nyere ọtụtụ ụmụnna nọ n’ebe ahụ aka ka ha lọghachi n’ọgbakọ. Malite n’afọ 1949, ụmụnna ndị ahụ hapụrụ nzukọ Jehova hiwe ọgbakọ nke ha. Ma, ha ka na-ekwusa ozi ọma, na-emekwa ndị ọhụrụ baptizim. A tụkwara ha mkpọrọ n’ihi na ha jụrụ ịga agha, otú ahụ ụmụnna ka nọ n’ọgbakọ na-eme. N’oge ahụ, ndị ọchịchị ka machibidoro Ndịàmà Jehova iwu na Romenia. N’ihi ya, mgbe anyị ruru, anyị na ndị okenye anọ ọnụ ha na-eru n’okwu na ndị na-anọchite anya Kọmitii Na-elekọta Mba Romenia zukọrọ na nzuzo n’ụlọ Nwanna Pamfil Albu. Anyị sikwa Ọstria kpọrọ Nwanna Rolf Kellner ka ọ na-atapịara anyị okwu.

Mgbe anyị na ha na-ekwu okwu n’abalị nke abụọ, Nwanna Albu gwara ndị okenye ibe ya ahụ dị mmadụ anọ ka ha lọghachi ná nzukọ Jehova. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na anyị emeghị ya ugbu a, e nwere ike anyị agaghị enwe ohere ọzọ.” N’ihi ya, ihe dị ka puku ụmụnna ise lọghachiri ná nzukọ Jehova. Ihe ahụ merenụ gosiri na Jehova emeriela Setan.

Ná ngwụcha afọ 1989, ya bụ, tupu Ọchịchị Kọmunist adaa n’ebe Ọwụwa Anyanwụ Yurop, Òtù Na-achị Isi gwara mụ na nwunye m ka anyị bịa jewe ozi n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Niu Yọk. O juru anyị anya. Anyị malitere ije ozi na Betel dị na Bruklin n’ọnwa asaa n’afọ 1990. N’afọ 1992, a họpụtara m ka m na-enyere Kọmitii Ije Ozi nke Òtù Na-achị Isi aka. Kemgbe ọnwa asaa n’afọ 1994, eso m n’Òtù Na-achị Isi.

M NA-ECHETA AFỌ NDỊ GARA AGA, NA-ATỤKWA ANYA IHE NDỊ GA-EME N’ỌDỊNIHU

Ihe a bụ foto mụ na nwunye m sere na Bruklin dị na Niu Yọk

Oge m na-ebunye ndị mmadụ nri na họtel agaala. Ugbu a, m so na-akwadebe ihe a na-akụziri ụmụnna anyị n’ụwa niile, sorokwa na-akụzi ya. (Mat. 24:45-47) Ọ karịala iri afọ ise kemgbe m jewere ozi oge niile pụrụ iche. Ọ na-abụ m cheta ya, mụ ekelee Jehova. Obi na-adị m ezigbo ụtọ maka na m na-ahụ otú Jehova si na-agọzi nzukọ ya zuru ụwa ọnụ. Ịga mgbakọ mba niile na-atọ m ụtọ. N’ebe ahụ, anyị na-amụ gbasara Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, na eziokwu dị na Baịbụl.

Ekpere m bụ ka ọtụtụ nde ndị ọzọ mụwa Baịbụl, mụta nke bụ́ eziokwu ma jiri otu obi soro ụmụnna anyị n’ụwa niile na-efe Jehova. (1 Pita 2:17) M na-atụsikwa anya ike ịnọ n’eluigwe hụ mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ya bụ, ndị ga-ebi n’ụwa. M na-atụ anya ịhụ papa m mgbe ahụ. Enwere m olileanya na papa m, mama m, na ndị ezinụlọ anyị ndị ọzọ ga-achọ ife Jehova mgbe ụwa ga-abụ Paradaịs.

M na-atụsikwa anya ike ịnọ n’eluigwe hụ mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ya bụ, ndị ga-ebi n’ụwa. M na-atụ anya ịhụ papa m mgbe ahụ

^ para. 15 Gụọ akụkọ ndụ ha n’Ụlọ Nche May 1, 1980, peeji nke 8 ruo 14.

^ para. 27 E nweghịzi ohu ọgbakọ na onye na-enyere ohu ọgbakọ aka. Ihe e nweziri n’ọgbakọ ọ bụla bụ onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ na odeakwụkwọ.