Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JULAỊ 2014

‘Unu Ga-abụ Ndị Àmà M’

‘Unu Ga-abụ Ndị Àmà M’

“[Jizọs] gwara ha, sị: ‘. . . Unu ga-abụkwa ndị àmà m . . . ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.’”—ỌRỤ 1:7, 8.

1, 2. (a) Ònye kacha gbaa àmà gbasara aha Jehova? (b) Gịnị ka okwu Hibru e si nweta aha Jizọs pụtara? Olee otú Ọkpara Chineke si mee ihe aha ya pụtara?

MGBE a na-ekpe Jizọs ikpe, ọ katara obi gwa Pọntiọs Paịlet bụ́ gọvanọ ndị Judia, sị: “Ọ bụ n’ihi nke a ka e ji mụọ m, ọ bụkwa n’ihi nke a ka m ji bịa n’ụwa, ka m wee gbaara eziokwu àmà.” (Gụọ Jọn 18:33-37.) Tupu ya agwa Paịlet ihe a, o mere ka a mata na ya bụ eze. Mgbe ọtụtụ afọ gara, Pọl onyeozi kwuru na Jizọs “mere ezi nkwupụta ihu ọha n’ihu Pọntiọs Paịlet dị ka onye àmà.” (1 Tim. 6:13) Anyị bi n’ụwa Setan na-achị. Ọtụtụ ndị kpọkwara ibe ha asị. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-agba àmà banyere Jehova, anyị kwesịrị inwe ụdị obi ike ahụ Jizọs nwere. Baịbụl kpọrọ ya “ezi onye àmà nke kwesịrị ntụkwasị obi.”—Mkpu. 3:14.

2 Ebe ọ bụ na Jizọs bụ onye Juu, o si n’afọ nne ya bụrụ onye àmà Jehova. (Aịza. 43:10) O mechara bụrụ ya bụ onye kacha gbaa àmà gbasara aha Jehova. Aha Chineke nyere Jizọs nwere ihe ọ pụtara. Jizọs ejighị ya gwuo egwu. Tupu a mụọ Jizọs, mmụọ ozi gwara Josef bụ́ nna Jizọs n’ụwa na Meri dị ime n’ike mmụọ nsọ. Mmụọ ozi ahụ gwakwara ya, sị: “Ọ ga-amụ nwa nwoke, ị ga-agụ ya Jizọs, n’ihi na ọ ga-azọpụta ndị ya ná mmehie ha.” (Mat. 1:20, 21) Ọtụtụ ndị na-akọwa Baịbụl kwetara na okwu Hibru e si  nweta aha Jizọs bụ Jeshụa, nke pụtara “Jehova Bụ Nzọpụta.” N’ihi ya, Jizọs nyeere “atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel” aka ka ha chegharịa ka ha na Jehova nwee ike ịdịghachi ná mma. (Mat. 10:6; 15:24; Luk 19:10) Ọ bụ ya mere Jizọs ji jiri obi ya niile kwusaa gbasara Alaeze Chineke. Mak kwuru, sị: “Jizọs banyere Galili, na-ekwusa ozi ọma Chineke, sị: ‘Oge ahụ a kara aka eruwo, alaeze Chineke eruwokwa nso. Chegharịanụ, kwerekwanụ n’ozi ọma ahụ.’” (Mak 1:14, 15) Ọ katakwara obi gwa ndị ndú okpukpe ndị Juu na ihe ha na-eme adịghị mma. O so n’ihe mere ha ji kpọgide ya n’osisi ịta ahụhụ.—Mak 11:17, 18; 15:1-15.

“IHE NDỊ DỊ EBUBE NKE CHINEKE”

3. Mgbe e gbuchara Jizọs, gịnị mere n’ụbọchị nke atọ?

3 Mgbe a tachara Jizọs ahụhụ ma gbuo ya, ihe dị egwu mere n’ụbọchị nke atọ. Jehova kpọlitere ya n’ọnwụ. Ọ bụghịzi mmadụ, kama ọ bụzi mmụọ na-anaghị anwụ anwụ. (1 Pita 3:18) Onyenwe anyị Jizọs yiiri ahụ́ mmadụ ma mee ka ndị na-eso ụzọ ya hụ ya ka ha mata na ya esila n’ọnwụ bilie. N’ụbọchị ahụ a kpọlitere ya n’ọnwụ, ọ pụtara ma ọ́ dịghị ihe ọzọ ugboro ise n’ihu ndị na-eso ụzọ ya.—Mat. 28:8-10; Luk 24:13-16, 30-36; Jọn 20:11-18.

4. Olee nnọkọ pụrụ iche Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nwere mgbe o si n’ọnwụ bilie? Olee ihe ọ gwara ha ka ha mee?

4 Nke ugboro ise Jizọs pụtara bụ n’ihu ndịozi ya na ndị ọzọ ha na ha zukọrọ. N’oge ahụ, e nwere ike ikwu na ọ kụziiri ha Okwu Chineke. “O mepere obi ha nke ọma ka ha ghọta ihe Akwụkwọ Nsọ pụtara.” Ha si otú ahụ ghọta na Akwụkwọ Nsọ ebula ụzọ buo amụma na ndị iro Chineke ga-egbu Jizọs, Chineke akpọlite ya n’ọnwụ. Ihe ikpeazụ Jizọs mere ná nnọkọ ahụ pụrụ iche ha na ya nwere bụ na ọ gwara ha ọrụ ha ga-arụ. Ọ gwara ha na “ọ bụkwa n’aha ya ka a ga-ekwusa nchegharị nke na-eme ka a gbaghara mmehie. A ga-ekwusa ya ná mba niile malite na Jeruselem.” Ọ gwakwara ha, sị: “Unu ga-abụ ndị àmà nke ihe ndị a.”Luk 24:44-48.

5, 6. (a) Gịnị mere Jizọs ji sị ndị na-eso ụzọ ya: “Unu ga-abụkwa ndị àmà m”? (b) Gịnị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-eme ka ndị mmadụ mata?

5 N’ihi ya, na nke ikpeazụ Jizọs pụtara n’ihu ndịozi ya mgbe ụbọchị iri anọ gachara, ọ ga-abụrịrị na ha ghọtara ihe ọzọ ọ gwara ha mee. Ọ gwara ha, sị: “Unu ga-abụkwa ndị àmà m ma na Jeruselem ma na Judia dum nakwa na Sameria, ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Gịnị mere Jizọs ji gwa ha, sị: “Unu ga-abụkwa ndị àmà m,” kama ịgwa ha na ha ga-abụ ndị àmà Jehova? Ndị na-eso ụzọ ya bụ ndị Izrel. N’ihi ya, ha bụ ndị àmà Jehova. Ma ugbu a, ha ga-abụkwa ndị àmà Jizọs.

Ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị na-eme ka ndị mmadụ mata ihe Jehova bu n’obi ime n’ọdịnihu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5 na nke 6)

6 Ugbu a, ha ga-amalite ime ka a mata na Jehova sizi n’aka Jizọs na-anapụta ụmụ mmadụ. Ụzọ a Jehova sizi na-azọpụta ụmụ mmadụ karịrị ụzọ ahụ o si napụta ndị Izrel n’ohu ha na-agba n’Ijipt nakwa mgbe a dọọrọ ha n’agha laa Babịlọn. Ọnwụ Jizọs na mbilite n’ọnwụ ya mere ka e nwee ike ịnapụta ụmụ mmadụ n’aka mmehie na ọnwụ. Mgbe e ji mmụọ nsọ tee ndị na-eso ụzọ Jizọs mmanụ na Pentikọst afọ 33, ha malitere ịgba àmà banyere “ihe ndị dị ebube nke Chineke.” Ọtụtụ ndị nụrụ ya chegharịrị ma nwee okwukwe n’àjà Jizọs chụrụ. Mgbe Jizọs si n’ọnwụ bilite ma laghachi n’eluigwe, Jehova nyere ya ikike ọhụrụ, sikwa n’aka ya na-azọpụta ọtụtụ puku mmadụ n’ụwa.—Ọrụ 2:5, 11, 37-41.

 “IHE MGBAPỤTA N’ỌNỌDỤ ỌTỤTỤ MMADỤ”

7. Gịnị ka ihe ndị mere na Pentikọst nke afọ 33 gosiri?

7 Ihe ndị mere n’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33 gosiri na Jehova nabatara àjà ahụ Jizọs ji ndụ ya chụọ ka ọ bụrụ ihe a ga-eji gbapụta ndị mmadụ n’aka mmehie. (Hib. 9:11, 12, 24) Jizọs kwuru na ihe mere ya ji bịa abụghị “ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ka o nyekwa mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Mat. 20:28) Ọ̀ bụ naanị ndị Juu bụ “ọtụtụ mmadụ” àjà ahụ Jizọs chụrụ ga-abara uru? Mba. Àjà ahụ ọ chụrụ “na-ewepụ mmehie nke ụwa” n’ihi na ọ bụ uche Chineke ka “a zọpụta ụdị mmadụ niile.”—1 Tim. 2:4-6; Jọn 1:29.

8. Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs kwusaruru ozi ọma? Gịnị nyeere ha aka?

8 Ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge ochie hà ji obi ike gbaa àmà gbasara Jizọs? Ha mere otú ahụ. Ma, ha emeghị ya n’ike aka ha. Ha rịọrọ Jehova ka o nye ha mmụọ nsọ ya ka ha nwee ike iji obi ike na-ekwusa ozi ọma. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 5:30-32.) Mgbe ihe dị ka iri afọ abụọ na asaa gachara, e nwere ike ikwu na ndị Juu na ndị mba ọzọ bi “n’etiti ihe niile e kere eke dị n’okpuru eluigwe” anụla “eziokwu nke ozi ọma ahụ.”—Kọl. 1:5, 23.

9. Olee ihe e buru n’amụma nke mechara mee ọgbakọ Ndị Kraịst mbụ?

9 Ma, ọ dị mwute na ka oge na-aga, ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ malitere ịkụzi ihe na-abụghị eziokwu. Ha ji nwayọọ nwayọọ mebie ọgbakọ. (Ọrụ 20:29, 30; 2 Pita 2:2, 3; Jud 3, 4) Jizọs buru amụma na ozizi ụgha ahụ Setan bụ́ “ajọ onye ahụ” mere ka ha na-akụzi ga na-agbasa ma mee ka a ghara ịma ndị bụ́ ezi Ndị Kraịst. Ọ ga-adị otú ahụ ruo ‘n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a.’ (Mat. 13:37-43) Jehova ga-emezi ka Jizọs bụrụ Eze ga-achị ụwa niile. O mere ya Eze n’ọnwa Ọktoba n’afọ 1914. Ọ bụ mgbe ahụ ka “oge ikpeazụ” nke ụwa Setan malitere.—2 Tim. 3:1.

10. (a) Olee oge dị mkpa Ndị Kraịst e tere mmanụ kwusara gbasara ya? (b) Gịnị mere n’ọnwa Ọktoba afọ 1914? Olee otú anyị si mara?

10 Ihe karịrị afọ iri atọ tupu ọnwa Ọktoba afọ 1914, Ndị Kraịst e tere mmanụ malitere ikwusa na Alaeze  Chineke ga-amalite ịchị n’afọ ahụ dị mkpa. Ihe mere ha ji kwuo ya bụ ihe Daniel buru n’amụma gbasara otu nnukwu osisi e gbuturu, nke ga-emecha pulite ma “oge asaa” gachaa. (Dan. 4:16) N’amụma Jizọs buru banyere oge ọnụnọ ya nakwa “ọgwụgwụ usoro ihe a,” ọ kpọrọ oge ahụ “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ.” Ihe ndị na-eme kemgbe afọ 1914 gosiri na Jizọs bụ Eze. (Mat. 24:3, 7, 14; Luk 21:24) N’ihi ya, ihe so ‘n’ihe ndị dị ebube nke Chineke’ anyị na-ekwusa taa bụ na Jehova mere Jizọs Eze nke Alaeze ya n’afọ 1914.

11, 12. (a) Mgbe a lụchara Agha Ụwa Mbụ, gịnị ka Kraịst malitere ime n’afọ 1919? (b) Olee ihe bịara doo anya n’afọ 1935? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

11 Mgbe Jizọs ghọrọ Eze n’afọ 1914, ọ malitere ime ka Ndị Kraịst e tere mmanụ si na “Babịlọn Ukwu ahụ” pụta. (Mkpu. 18:2, 4) Mgbe a lụchara Agha Ụwa Mbụ, ndị e tere mmanụ ji ohere ahụ malite ikwusa ozi ọma n’ụwa niile n’afọ 1919. Ha kwusara otú àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ si eme ka a zọpụta ụmụ mmadụ, kwusaakwa ozi ọma Alaeze Chineke. N’ihi ya, ọtụtụ puku mmadụ mụtara eziokwu, e teekwa ha mmanụ ka ha soro Kraịst chịa n’eluigwe.

12 N’afọ 1935, ọ bịara doo anya na Kraịst amalitela ịkpọbata “atụrụ ọzọ” n’ọgbakọ. Taa, ha dịzi ọtụtụ nde n’ụwa niile. Ha ji obi ike soro ndị e tere mmanụ na-ezi ndị ọzọ ozi ọma otú ahụ Jizọs mere. Ha nwekwara okwukwe na ọ bụ naanị àjà Jizọs chụrụ ga-eme ka a zọpụta ha. Ha ma na ọ bụrụ na ha atachie obi na-ekwusa ozi ọma ma na-eme ihe Jehova kwuru, ha ga-alanahụ ‘oké mkpagbu ahụ,’ bụ́ mgbe a ga-ebibi ụwa Setan.—Jọn 10:16; Mkpu. 7:9, 10, 14.

JIRI NKWUWA OKWU NA-EKWUSA OZI ỌMA

13. Gịnị ka anyị bụ́ Ndịàmà Jehova kpebisiri ike ime? Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka Ndị Kraịst oge mbụ?

13 Anyị kwesịrị ịna-akọrọ ndị ọzọ gbasara “ihe ndị dị ebube” Chineke merela na ihe ndị o kwere nkwa imere anyị n’ọdịnihu. Ọ bụ ihe ùgwù na-enweghị atụ. O doro anya na ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-adị mfe. N’ebe ọtụtụ ụmụnna anyị na-ekwusa ozi ọma, a na-akpagbu ha, na-akwa ha emo, ọtụtụ ndị anaghịkwa ege ha ntị. Ma, anyị nwere ike ime ụdị ihe ahụ Pọl na ndị ibe ya mere. O kwuru, sị: ‘Anyị nwere nkwuwa okwu site n’enyemaka Chineke, anyị wee gbasie mgba ike zie unu ozi ọma Chineke mgbe anyị bu ụzọ tasịa ahụhụ.’ (1 Tesa. 2:2) N’ihi ya, ka ike ghara ịgwụ anyị. Kama, ka anyị kpebisie ike ịbụ Ndịàmà Jehova ruo mgbe a ga-ebibi ụwa Setan. Anyị ga-esi otú a gosi na anyị na-emezu nkwa anyị kwere  Chineke mgbe anyị nyefere ya onwe anyị. (Aịza. 6:11) Anyị agaghị emeli ya n’ike anyị. Ma, anyị kwesịrị ịna-eme ka Ndị Kraịst oge mbụ, ya bụ, ịna-ekpe ekpere ka Jehova jiri mmụọ nsọ ya mee ka anyị nwee “ike karịrị ike nkịtị.”—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 4:1, 7; Luk 11:13.

14, 15. (a) N’oge ndịozi Jizọs, gịnị ka e mere Ndị Kraịst? Gịnị ka Pita onyeozi kwuru gbasara Ndị Kraịst? (b) Ọ bụrụ na ndị mmadụ na-akpagbu anyị maka na anyị bụ Ndịàmà Jehova, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

14 Taa, ọtụtụ nde mmadụ na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst. Ma, “ha na-agọnahụ [Chineke] site n’ọrụ ha, n’ihi na ha rụrụ arụ, bụrụkwa ndị nnupụisi na ndị a jụrụ ajụ n’ụdị ezi ọrụ ọ bụla.” (Taị. 1:16) Anyị kwesịrị icheta na n’oge ndịozi Jizọs, ọtụtụ ndị kpọrọ ezigbo Ndị Kraịst asị. Ọ bụ ya mere Pita onyeozi ji gwa ha, sị: “Ọ bụrụ na a na-akọcha unu n’ihi aha Kraịst, unu nwere obi ụtọ, n’ihi na . . . mmụọ nke Chineke dịkwasịrị unu.”—1 Pita 4:14.

15 À ‘na-akọcha Ndịàmà Jehova taa n’ihi aha Kraịst’? Ee. Ọ bụ n’ihi na anyị na-ekwusa na Jizọs bụ Eze. N’ihi ya, ịbụ ndị a kpọrọ asị maka na anyị na-aza aha Jehova na ịbụ ndị a ‘na-akọcha n’ihi aha Kraịst’ bụ otu ihe. Jizọs gwara ndị iro ya, sị: “Abịawo m n’aha Nna m, ma unu anabataghị m.” (Jọn 5:43) N’ihi ya, mgbe ọzọ ndị mmadụ na-akpagbu gị maka na ị na-ekwusa ozi ọma, adala mbà. Ihe ahụ ha na-eme gị gosiri na ihe gị dị Chineke mma nakwa na mmụọ nsọ ya ‘dịkwasịrị gị.’

16, 17. (a) Gịnị ka a na-eme ndị Jehova n’ọtụtụ ebe n’ụwa? (b) Gịnị ka i kpebisiri ike ịna-eme?

16 Chetakwa na ọtụtụ ndị na-abata n’ọgbakọ taa n’ụwa niile. Ọ bụrụgodị na a na-ekwusakarị ozi ọma n’ókèala anyị, anyị ka na-ahụ ndị na-ege anyị ntị, ya bụ, ndị anyị nwere ike izi ozi ọma ga-eme ka a zọpụta ha. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ahụ ụdị ndị ahụ, ka anyị gbaa mbọ laghachi ma mụwara ha Baịbụl. Anyị ga-esi otú ahụ nyere ha aka ka ha mara Jehova, ha enyefee ya onwe ha, e meekwa ha baptizim. O nwere ike ịbụ na obi na-adị gị otú ọ dị otu nwanna nwaanyị bi na Saụt Afrịka. Aha ya bụ Sarie. Ọ na-ekwusa ozi ọma kemgbe ihe karịrị iri afọ isii. O kwuru, sị: “Eji m obi m niile na-ekele Jehova na àjà Jizọs chụrụ emeela ka mụ na Jehova, bụ́ Ọkaakaa eluigwe na ụwa, dị ná mma. Obi dịkwa m ụtọ na m so na-eme ka a mara aha ya dị ebube.” Ya na Martinus di ya enyerela ụmụ ha atọ na ọtụtụ ndị ọzọ aka ka ha ghọọ Ndịàmà Jehova. Sarie kwukwara, sị: “O nweghị ọrụ ọzọ ga-eme ka m nwee obi ụtọ karịrị nke m na-enwe ugbu a. Jehova jikwa mmụọ nsọ ya na-eme ka anyị niile nwee ike ịna-arụ ọrụ a ga-eme ka ndị mmadụ dị ndụ.”

17 Ma ànyị bụ Ndị Kraịst e mere baptizim ma ànyị ka na-agba mbọ ka e mee anyị baptizim, anyị kwesịrị ịna-ekele Jehova maka ihe ọma o meere anyị kpọbata anyị n’ọgbakọ ya zuru ụwa ọnụ. N’ihi ya, na-ekwusasi ozi ọma ike, na-agbakwa mbọ ka ụwa Setan ghara ime ka ị ghara ịdị nsọ n’anya Jehova. I mee otú ahụ, ị ga-eme ka e too Nna gị nke eluigwe hụrụ gị n’anya, bụ́ Onye anyị na-aza aha nsọ ya.