Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JULAỊ 2014

“Jehova Maara Ndị Bụ́ Ndị Ya”

“Jehova Maara Ndị Bụ́ Ndị Ya”

“Ọ bụrụ na onye ọ bụla hụrụ Chineke n’anya, onye a bụ onye Ọ maara.”—1 KỌR. 8:3.

1. Kọọ ihe gosiri otú ụfọdụ ndị Chineke si ghọgbuo onwe ha. (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

N’ỤTỤTỤ otu ụbọchị, Erọn bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà ji ihe ịgụ ọkụ e ji esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ guzoro n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu Jehova. Kora na narị ndị ikom abụọ na iri ise nọkwa n’ebe dị nso. Ha jicha ihe ịgụ ọkụ ha chọrọ iji sureere Jehova ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. (Ọnụ Ọgụ. 16:16-18) Onye hụrụ ha nwere ike iche na ha niile na-erubere Jehova isi. Ma, Kora na ndị òtù ya dị mpako, dịkwa isi ike. Ha chọrọ iweghara ọrụ ịchụàjà Erọn na-arụ. (Ọnụ Ọgụ. 16:1-11) Ha na-aghọgbu onwe ha, na-eche na Chineke ga-anabata ofufe ha. Ma, ihe ahụ ha mere bụ ịkparị Jehova. Jehova ma ihe dị ha n’obi, ghọtakwa na ha bụ ndị ihu abụọ.—Jere. 17:10.

2. Gịnị ka Mozis kwuru ga-emenụ? Olee otú ihe ahụ o kwuru si mee?

2 N’ụbọchị bọtara ụbọchị ihe ahụ mere, Mozis kwuru, sị: “N’ụtụtụ, Jehova ga-eme ka a mara onye bụ́ nke ya.” (Ọnụ Ọgụ. 16:5) Olee otú Jehova si mee ka a mata ndị na-efe ya n’eziokwu na ndị bụ́ ndị ihu abụọ? Jehova mere ka ọkụ si n’eluigwe regbuo Kora na ndị òtù ya dị narị mmadụ abụọ na iri ise. (Ọnụ Ọgụ. 16:35; 26:10) Ọ bụ naanị Erọn  fọrọ. Jehova ji ihe ahụ o mere gosi na ọ bụ Erọn bụ ezigbo onye nchụàjà ya na onye na-efe ya n’eziokwu.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 8:3.

3. (a) Gịnị mere n’ọgbakọ n’oge Pọl onyeozi? (b) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Jehova mere ndị nupụụrụ ya isi n’oge Mozis?

3 Ụdị ihe ahụ mere mgbe ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ ise gara, ya bụ, n’oge Pọl onyeozi. N’oge ahụ, ụfọdụ ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst malitere izi ozizi ụgha. Ma, ha ka nọ n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na mmadụ elerughị anya, o nwere ike iche na o nweghị ihe dị iche ná ndị ahụ na-ezi ozizi ụgha na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ. Ma, ihe ahụ ha na-akụzi nwere ike ịkpa okwukwe Ndị Kraịst aka ọjọọ. Ha dị ka anụ ọhịa wolf nke nwere oyiyi atụrụ. Ha “na-ekpukwa okwukwe nke ụfọdụ ndị ihu.” (2 Tim. 2:16-18) Ma, Jehova na-ahụ ihe na-emenụ. Obi siri Pọl ike na ọ gaghị agbachi nkịtị. Ihe nyeere ya aka bụ na ọ ma ihe Jehova mere Kora na ndị òtù ya mgbe ha nupụụrụ ya isi. N’ihi ya, ka anyị leba anya n’ihe Pọl gwara Timoti ma hụ ihe anyị nwere ike ịmụta na ya.

“ABỤ M JEHOVA; ADỊGHỊ M AGBANWE AGBANWE”

4. Olee ihe obi siri Pọl ike na Jehova ma? Gịnị ka Pọl gwara Timoti?

4 Obi siri Pọl ike na Jehova ma ndị bụ́ ndị ihu abụọ na ndị na-efe ya n’eziokwu. Ihe Pọl kwuru n’akwụkwọ ozi o si n’ike mmụọ nsọ degara Timoti gosiri na obi siri ya ike. Mgbe o kwuchara otú ndị na-ezi ozizi ụgha si na-akpa okwukwe ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ aka ọjọọ, o kwuru, sị: “N’agbanyeghị nke ahụ, ntọala siri ike nke Chineke tọrọ na-eguzosi ike, ebe o nwere akara nke bụ́: ‘Jehova maara ndị bụ́ ndị ya,’ nakwa: ‘Ka onye ọ bụla nke na-akpọ aha Jehova jụ ajọ omume.’”—2 Tim. 2:18, 19.

5, 6. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi banyere ihe Pọl kwuru gbasara “ntọala siri ike nke Chineke”? Olee uru ihe ahụ o kwuru baara Timoti?

5 Baịbụl na-eji okwu ahụ bụ́ “ntọala” akọwa ihe dị iche iche. Dị ka ihe atụ, o ji ya kọwaa Jeruselem bụ́ isi obodo Izrel oge ochie nakwa ọrụ Jizọs na-arụ iji mezuo nzube Chineke. (Ọma 87:1, 2; 1 Kọr. 3:11; 1 Pita 2:6) Ma, ọ bụ naanị otu ugboro ka Baịbụl kwuru gbasara “ntọala siri ike nke Chineke.” Gịnị ka Pọl bu n’obi kwuo ya?

6 Pọl kwutere okwu “ntọala siri ike nke Chineke” mgbe o kwuru ihe yiri ihe ahụ Mozis gwara Kora na ndị òtù ya n’Ọnụ Ọgụgụ 16:5. O doro anya na ihe mere Pọl ji kwuo ya bụ ka ọ gbaa Timoti ume ma mee ka o cheta na Jehova na-ahụ ndị na-enupụrụ ya isi n’ọgbakọ nakwa na ọ gaghị agbachi ha nkịtị. N’oge Mozis, Kora emeghị ka uche Jehova ghara imezu. O nweghịkwa otú ndị na-akụzi ozizi ụgha n’ọgbakọ ga-esi kụghasịa nzube Jehova. Pọl akọwachaghị ihe “ntọala siri ike nke Chineke” o kwuru okwu ya pụtara. Ma, ihe o kwuru mere ka obi sie Timoti ike, meekwa ka ọ tụkwasị Jehova obi.

7. Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na Jehova ga na-eme ihe ziri ezi?

7 Ụkpụrụ Jehova anaghị agbanwe agbanwe. Abụ Ọma 33:11 kwuru, sị: “Nzube Jehova ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi; echiche obi ya na-adị site n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ.” Baịbụl kwukwara na ọchịchị Jehova, ịhụnanya ya, obiọma ya, ikwesị ntụkwasị obi ya, na ezi omume ya na-adịru mgbe ebighị ebi. (Ọpụ. 15:18; Ọma 100:5; 112:9) Jehova kwuru na Malakaị 3:6, sị: “Abụ m Jehova; adịghị m agbanwe agbanwe.” E kwukwara na Jems 1:17 na Jehova ‘adịghị agbanwe agbanwe, ọ dịghịkwa ka onyinyo nke na-atụgharị atụgharị.’

 “AKARA” NKE NA-EME KA OKWUKWE ANYỊ NWERE NA JEHOVA SIE IKE

8, 9. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe ahụ e dere na “ntọala siri ike nke Chineke”?

8 N’oge ochie, ọ na-abụ ndị mmadụ rụchaa ụlọ, ha edee ihe na ntọala ya ma ọ bụ kanye ihe na ya ka e jiri ya mata onye rụrụ ya ma ọ bụ onye nwe ya. Ná ndị niile so dee Baịbụl, ọ bụ Pọl bụ onye mbụ ji ụdị ihe ahụ mee ihe atụ. * E nwere ihe abụọ e dere na ‘ntọala ahụ siri ike’ Pọl kwuru okwu ya na 2 Timoti 2:19. Nke mbụ bụ, “Jehova maara ndị bụ́ ndị ya.” Nke abụọ abụrụ, “Ka onye ọ bụla nke na-akpọ aha Jehova jụ ajọ omume.” Ihe abụọ a e dere na ya na-echetara anyị ihe e kwuru n’Ọnụ Ọgụgụ 16:5.Gụọ ya.

9 Gịnị ka anyị bụ́ ndị Jehova nwere ike ịmụta n’ihe ahụ e dere na “ntọala siri ike nke Chineke”? Ihe anyị nwere ike ịmụta bụ na e nwere ihe abụọ dị mkpa gbasara iwu Jehova na ụkpụrụ ya. Nke mbụ bụ na Jehova hụrụ ndị na-erubere ya isi n’anya. Nke abụọ abụrụ na Jehova kpọrọ ajọ omume asị. Olee otú ihe abụọ a si gbasa ndị na-ezi ozizi ụgha n’ọgbakọ?

10. N’oge Pọl, olee otú obi dị ndị kwesịrị ntụkwasị obi mgbe ha na-ahụ ihe ndị na-ezi ozizi ụgha na-eme?

10 Ihe ndị na-ezi ozizi ụgha na-eme nyere Timoti na ndị ọzọ ji obi ha niile na-efe Jehova nsogbu n’obi. Ụfọdụ Ndị Kraịst nwere ike ịna-ajụ ihe mere e ji hapụ ụdị ndị ahụ ka ha ka nọrọ n’ọgbakọ. Ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ahụ nwekwara ike ịna-eche ma Jehova ọ̀ na-ahụ otú ha si jiri obi ha niile na-efe ya nakwa omume ihu abụọ ndị ahụ na-ezi ozizi ụgha na-eme.—Ọrụ 20:29, 30.

Timoti ekweghị ka ihe ndị na-ezi ozizi ụgha na-eme megharịa ya anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 ruo nke 12)

11, 12. Olee otú akwụkwọ ozi ahụ Pọl degaara Timoti si mee ka okwukwe ya sikwuo ike?

11 O doro anya na akwụkwọ ozi ahụ Pọl degaara Timoti mere ka okwukwe ya sikwuo ike. O chetaara Timoti na Jehova mere ka o doo anya na Kora na ndị òtù ya bụ ndị ihu abụọ. Jehova jụrụ ha, bibie ha ma mee ka a mata na ọ bụ Erọn ka ọ kwadoro. N’agbanyeghị na ụfọdụ ndị n’oge Pọl sị na ha bụ ezigbo Ndị Kraịst, Jehova ga-eme ka a mata ndị na-efe ya n’eziokwu otú ahụ o mere n’oge Mozis.

12 Jehova anaghị agbanwe agbanwe. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịtụkwasị ya obi. Ọ kpọrọ ajọ omume asị. Mgbe oge  ya ruru, ọ ga-ekpe ndị ajọ omume ikpe ma ọ bụrụ na ha echegharịghị. Ebe ọ bụ na Timoti so ná ndị na-akpọ aha Jehova, Pọl chetaara ya ka ọ jụ omume ọjọọ ndị ahụ sị na ha bụ Ndị Kraịst na-eme. *

JEHOVA NA-AGỌZI NDỊ JI OBI HA NIILE NA-EFE YA

13. Gịnị kwesịrị ime ka obi sie anyị ike?

13 Ihe ahụ Pọl gwara Timoti nwere ike ime ka okwukwe anyị sikwuo ike. Ọ na-emesi anyị obi ike na Jehova ma na anyị ji obi anyị niile na-ejere ya ozi. Ma, ọ bụghị naanị na ọ ma ndị ji obi ha niile na-ejere ya ozi, kama ihe banyere ha na-emetụ ya n’obi. Baịbụl kwuru, sị: “Anya Jehova na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.” (2 Ihe 16:9) N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova agaghị echefu ozi anyị ji ‘obi dị ọcha’ na-ejere ya.—1 Tim. 1:5; 1 Kọr. 15:58.

14. Olee ụdị ofufe Jehova na-anaghị anabata?

14 Jehova anaghị anabata ofufe ndị ihu abụọ na-efe ya. Ọ kpọrọ ya asị. Ebe ọ bụ na anya Jehova “na-ahụzu ụwa dum,” ọ na-ahụ ndị na-ejighị obi ha niile na-efe ya. Ilu 3:32 kwuru, sị: “Onye aghụghọ bụ ihe arụ n’anya Jehova.” Ụdị onye ahụ bụ onye ihu abụọ, ya bụ, onye na-eme ka ọ̀ na-erubere Chineke isi ma na-eme mmehie na nzuzo. Onye ihu abụọ nwere ike imegharị ndị mmadụ anya. Ma, ọ gaghị emegharịli Jehova anya. Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-ezochi ajọ omume ya agaghị enwe ihe ịga nke ọma.” Ihe kpatara ya bụ na ike Jehova enweghị atụ. Ọ bụkwa onye ezi omume.—Ilu 28:13; gụọ 1 Timoti 5:24; Ndị Hibru 4:13.

15. Gịnị ka anyị na-ekwesịghị ime? Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?

15 Ọtụtụ ndị Jehova ji obi ha niile na-efe ya. A bịa n’ọgbakọ, ọ na-esi ike ịhụ onye kpachaara anya na-eme omume ihu abụọ ka o megharịa Jehova anya. Ma, ebe ọ bụ na ụdị ihe a mere n’oge Mozis na n’oge ndịozi Jizọs, o nwere ike ime taa. (2 Tim. 3:1, 5) Ma, ọ̀ pụtara na anyị kwesịrị ịna-enyo ụmụnna anyị enyo ma hà jikwa obi ha niile na-efe Jehova? Mbanụ. Anyị ekwesịghị ịna-eme otú ahụ ma ọ bụrụ na o nweghị ihe anyị ji n’aka na ha mere. (Gụọ Ndị Rom 14:10-12; 1 Ndị Kọrịnt 13:7.) Ọ bụrụ na anyị na-enyo ụmụnna anyị enyo, o nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma.

16. (a) Gịnị ka onye ọ bụla n’ime anyị ga-eme ka ọ ghara ịna-eme ihu abụọ n’ozi ọ na-ejere Jehova? (b) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe e kwuru n’igbe bụ́ “ Na-anwalenụ . . . Na-anwapụtanụ . . . ”?

16 Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịna-eleru àgwà ya anya. (Gal. 6:4) Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị nwere ike ibu ihe ọjọọ n’obi na-efe Jehova, ma anyị agaghị ama. (Hib. 3:12, 13) N’ihi ya, ọ ga-adị mma anyị nọtụ, anyị echee echiche gbasara ihe anyị bu n’obi na-ejere Jehova ozi. Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Gịnị mere m ji na-efe Jehova? Ọ̀ bụ n’ihi na m hụrụ ya n’anya, chọọkwa ka ọ bụrụ ya na-achị m? Ka ihe dị m mkpa ọ̀ bụ ihe ọma ndị ọ ga-emere m na Paradaịs?’ (Mkpu. 4:11) Ọ bụrụ na anyị ajụọ onwe anyị ụdị ajụjụ ndị a, o nwere ike ime ka anyị ghara ịna-eme ihu abụọ n’ozi anyị na-ejere Jehova.

IRUBERE JEHOVA ISI GA-EME KA ANYỊ NWEE OBI ỤTỌ

17, 18. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịghọ aghụghọ n’ozi anyị na-ejere Jehova?

17 Jehova ga-agọzi anyị ma ọ bụrụ na anyị ewepụ aghụghọ n’obi anyị. Otu  ọbụ abụ kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye Jehova na-adịghị agụkọrọ njehie, onye aghụghọ na-adịghịkwa na mmụọ ya.” (Ọma 32:2) Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-efe Jehova, anyị ga-enwe obi ụtọ ugbu a, nweekwa obi ụtọ na-enweghị atụ n’ọdịnihu.

18 N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eme ka a mata ndị bụ́ ndị ọjọọ na-ekweghị echegharị ma ọ bụ ndị na-eme mmehie na nzuzo. Ọ ga-eme ka a hụ “ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye ajọ omume, n’etiti onye na-ejere Chineke ozi na onye na-adịghị ejere ya ozi.” (Mal. 3:18) Ka ọ dị ugbu a, obi kwesịrị isi anyị ike na “anya Jehova na-elekwasị ndị ezi omume, ntị ya dịkwa n’arịrịọ ha na-arịọsi ike.”—1 Pita 3:12.

^ para. 8 E mechara kwuo ụdị ihe ahụ ná Mkpughe 21:14. Ebe ahụ kwuru na e dere aha ndịozi iri na abụọ na “nkume ntọala iri na abụọ.”

^ para. 12 N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’otú anyị nwere ike isi jụ ajọ omume otú ahụ Jehova si eme.