Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JUN 2014

Nyere Ndị Ọzọ Aka Ka Ha Nwee Ike Ịna-emekwu nke Ọma n’Ọgbakọ

Nyere Ndị Ọzọ Aka Ka Ha Nwee Ike Ịna-emekwu nke Ọma n’Ọgbakọ

“M ga-enye gị ndụmọdụ, anya m ga-adị n’ebe ị nọ.”—ỌMA 32:8.

1, 2. Olee otú Jehova si were onye ọ bụla na-ejere ya ozi?

Ọ BỤRỤ na nne na nna ana-ele ụmụ ha ebe ha na-egwu egwu, ọ na-ejukarị ha anya ma ha hụ nkà dị iche iche ha nwere. O nwere ike ịbụ na gịnwa achọpụtala ụdị ihe ahụ. Nwatakịrị nwere ike inwe mmasị n’ịgba bọl ma ọ bụ n’ịgba ọsọ, ma ihe na-atọ nwanne ya ụtọ abụrụ ise ihe ma ọ bụ ịrụpụta ihe. Ọ bụrụ na nne na nna ahụ nkà nwa ha nwere, ha na-eji obi ụtọ enyere nwa ahụ aka ka o mewe ihe ahụ nke ọma, ya bụ, ka o jiri obi ya niile na-eme ya.

2 Jehova anaghị eji ndị na-ejere ya ozi egwu egwu. O weere ha ka “ihe a na-achọsi ike nke mba niile.” (Hag. 2:7) Ihe kpatara ya bụ na ha nwere okwukwe, jirikwa obi ha niile na-ejere ya ozi. Ma, o nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na ụmụnna anyị nwere nkà dị iche iche. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ụmụnna na-ekwu okwu nke ọma, ndị ọzọ amara otú e si ahazi ihe. Ọtụtụ ụmụnna nwaanyị na-eme nke ọma ma a bịa n’ịmụ asụsụ ndị obodo ọzọ. Ha na-eji ya ezi ndị mmadụ ozi ọma. E nwekwara ndị nke ma otú e si elekọta ndị na-arịa ọrịa ma ọ bụ otú e si agba mmadụ ume. (Rom 16:1, 12) Ọ̀ bụ na obi adịghị anyị ụtọ na anyị na ụdị ụmụnna a niile nọ n’ọgbakọ?

3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

 3 E nwere ike inwe ụmụnna ụkwụ na-esibeghị ike n’ọgbakọ, nke ka nke, ụmụnna nwoke ka na-eto eto ma ọ bụ ndị nke a ka mere baptizim ọhụrụ. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ha aka ka ha na-emekwu nke ọma n’ọgbakọ? Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-eme ka Jehova ma na-achọpụta àgwà ọma ha nwere?

JEHOVA NA-AHỤ EBE NDỊ OHU YA NA-EME NKE ỌMA

4, 5. Olee otú ihe e kwuru ná Ndị Ikpe 6:11-16 si gosi na Jehova na-ahụ ihe ndị ohu ya ga-emeli?

4 Ọtụtụ ihe a kọrọ na Baịbụl gosiri na Jehova na-ahụ ma ebe ndị ohu ya na-eme nke ọma ma ihe ndị ha ga-emeli. Dị ka ihe atụ, Chineke họọrọ Gidiọn ka ọ napụta ndị Izrel n’aka ndị Midian na-emegbu ha. Gidiọn chere na ya erughị eru. N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na o juru ya anya mgbe mmụọ ozi gwara ya, sị: “Jehova nọnyeere gị, gị nwoke dị ike, nke bụkwa dike.” N’oge ahụ, Gidiọn echeghị na ya bụ “dike.” O chere na ya agaghị anapụtali ndị Chineke. Ma, ụka Gidiọn na mmụọ ozi kparịtara mere ka o doo anya na Jehova weere Gidiọn ka onye bara uru karịa otú Gidiọn chere.—Gụọ Ndị Ikpe 6:11-16.

5 Jehova ma ihe Gidiọn ga-emeli. Ọ bụ ya mere obi ji sie ya ike na Gidiọn ga-anapụta ndị Izrel. Dị ka ihe atụ, mmụọ ozi Jehova hụrụ otú Gidiọn si jiri ike ya niile na-eticha ọka wit. E nwere ihe ọzọ mmụọ ozi ahụ hụrụ. N’oge ahụ, ndị ọrụ ugbo na-anọ n’èzí eticha ọka wit, n’ebe ikuku ga na-eburu igbogbo ya. Ma, Gidiọn anọghị n’èzí otú ahụ ndị ọzọ si eme. Kama, ọ banyere n’ebe a na-anọ azọchapụta mmanya na-eticha nke ya ka ndị Midian ghara ịhụ ọka ya ma zuru ya. Jehova hụrụ na ọ na-arụsi ọrụ ike. Ọ kpara àgwà onye ma ihe. Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji were ya ka onye nwere uche, ọ bụghị naanị ka onye na-arụsi ọrụ ike. Jehova hụrụ ihe Gidiọn ga-emeli ma zụọ ya.

6, 7. (a) Gịnị dị iche n’otú Jehova si were Emọs onye amụma na otú ụfọdụ ndị Izrel si were ya? (b) Olee ihe gosiri na Emọs ma ihe?

6 Onye ọzọ Jehova hụrụ ihe ọ ga-emeli bụ Emọs onye amụma. O nwere ike ịbụ na ọtụtụ ndị lere Emọs anya ka onye na-adịghị mkpa ma ọ bụ onye na-abaghị uru. Emọs kwuru na ya bụ onye na-azụ anụ na onye na-arụpusị mkpụrụ fig nke osisi sịkamọ. Ndị mmadụ na-ewerekarị ụdị mkpụrụ osisi ahụ ka nri ndị ogbenye. Mgbe alaeze ebo iri nke Izrel malitere ikpere arụsị, Jehova dunyere Emọs ka ọ gaa gwa ha na ihe ha na-eme adịghị mma. N’oge ahụ, o nwere ike ịbụ na ụfọdụ ndị Izrel chere na Emọs erughị eru.—Gụọ Emọs 7:14, 15.

7 Emọs si n’ime ime obodo. Ma, a gaghị asị na ọ maghị ihe n’ihi na ọ ma ọtụtụ ihe gbasara omenala obodo ndị dị ha nso na ndị ọchịchị ha. O nwere ike ịbụ na ọ ma otú ihe si dịrị ndị mmadụ n’Izrel. O nwekwara ike ịbụ na ahịa ya na ndị si mba ndị gbara ha gburugburu zụkọrọ mere ka ọ mara ihe na-eme ná mba ndị ahụ. (Emọs 1:6, 9, 11, 13; 2:8; 6:4-6) Taa, ụfọdụ ndị ọkà mmụta Baịbụl kwuru na otú Emọs si dee ihe magburu onwe ya. Ihe ndị o dere na-adị mfe nghọta ma na-eru onye na-agụ ya n’obi. Ọ na-ejikwa ihe atụ eme ka a ghọta ihe ọ na-ekwu. Ụjọ atụghị ya mgbe ọ na-agwa Amazaya bụ́ onye nchụàjà ọjọọ ihe Jehova ga-eme ya. Ihe a gosiri na Emọs ruru eru ịga ozi Jehova dunyere ya. Jehova hụrụ nkà Emọs nwere, nke nwere ike isiri ndị ọzọ ike ịhụ.—Emọs 7:12, 13, 16, 17.

8. (a) Olee nkwa Jehova kwere Devid? (b) Ọ bụrụ na obi akaghị anyị ime ihe ụfọdụ, olee otú ihe e kwuru n’Abụ Ọma 32:8 ga-esi nyere anyị aka?

8 Jehova ma ihe onye ọ bụla na-ejere ya ozi ga-emeli. Ọ gwara Eze Devid na ya ga na-eduzi ya, ‘anya ya adịrịkwa n’ebe ọ nọ.’ (Gụọ Abụ Ọma 32:8.) Gịnị mere ihe a o kwuru kwesịrị iji gbaa anyị ume? Ọ bụ eziokwu na obi agaghị aka anyị ime ihe ụfọdụ, Jehova nwere ike inyere anyị aka  ime ihe ndị ahụ karịa otú anyị tụrụ anya na anyị ga-eme. Ọ bụrụ na nwatakịrị na-amụ ịga ije, papa ya ma ọ bụ mama ya ga na-enyere ya aka. Ọ bụ otú ahụ ka Jehova si enyere anyị aka ka anyị nwee ike ịna-eme nke ọma n’ọgbakọ. Jehova nwekwara ike iji ụmụnna anyị nyere anyị aka ka anyị mee otú ahụ. Olee otú o nwere ike isi mee ya?

NA-AHỤ EBE NDỊ ỌZỌ NA-EME NKE ỌMA

9. Olee otú anyị ga-esi “na-elekwasị anya” n’ọdịmma Ndị Kraịst ibe anyị otú ahụ Pọl kwuru?

9 Pọl gwara Ndị Kraịst niile ka ha “na-elekwasị anya” n’ọdịmma Ndị Kraịst ibe ha. (Gụọ Ndị Filipaị 2:3, 4.) Ihe a Pọl kwuru pụtara na anyị kwesịrị ịna-ahụ ebe ụmụnna anyị na-eme nke ọma ma gwa ha ya. Olee otú obi na-adị anyị ma mmadụ gwa anyị ebe anyị na-eme nke ọma? Obi na-adị anyị ụtọ, anyị agbaa mbọ na-emekwu nke ọma. Otú ahụ ka ọ dị ụmụnna anyị. Ọ bụrụ na anyị na-agwa ụmụnna anyị ebe ha na-eme nke ọma, ọ ga-eme ka ha na-emekwu nke ọma n’ozi Jehova.

10. Ònye ka anyị kwesịrị ịkacha nyere aka?

10 Ònye ka anyị kwesịrị ịkacha nyere aka? O doro anya na o nweghị onye a na-ekwesịghị inyere aka mgbe ụfọdụ. Ma, e kwesịrị ịkacha nyere ụmụnna nwoke ka na-eto eto ma ọ bụ ndị nke a ka mere baptizim ọhụrụ aka ka ha soro na-eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ. Ọ ga-eme ka ha ghọta na ha bara uru n’ọgbakọ. Ma, ọ bụrụ na anyị anaghị aja ha mma maka ọrụ ha na-arụ n’ọgbakọ, o nwere ike ime ka ha ghara ime ihe Baịbụl gwara ha mee, ya bụ, ka ha gbaa mbọ na-ejekwuru Jehova ozi.—1 Tim. 3:1.

11. (a) Olee otú otu okenye si nyere otu nwanna nwoke ka na-eto eto aka ka ọ kwụsị ime ihere? (b) Gịnị ka ị mụtara n’ihe anyị kọrọ gbasara nwanna nwoke ahụ e nyeere aka?

11 E nwere otu okenye aha ya bụ Ludovic. O kwuru na ọ bụrụ na e mee ka nwanna nwoke ghọta na a hụrụ ya n’anya, ọ ga na-eme nke ọma. Otu onye n’ime ndị o nyeere aka bụ Julien. Ọ chọpụtara na Julien bụ onye ihere, na ụjọ na-atụ ya ma ọ chọọ ijekwu ozi n’ọgbakọ nakwa na ọ na-adị ya ka ọ naghị emeta ya. Ludovic kwuru, sị: “Ma, achọpụtara m na o nwere obiọma, chọọkwa ịna-enyere ndị ọzọ aka n’ọgbakọ.” N’ihi ya, Ludovic gbara mbọ chọpụta ebe ọ na-eme nke ọma ma gbaa ya ume kama ịkatọ ya. Otú ahụ o si mesoo ya mere ka o mechaa ghọọ ohu na-eje ozi, mechaakwa ghọọ ọsụ ụzọ oge niile.

NYERE HA AKA KA HA MEKWUO NKE ỌMA N’ỌGBAKỌ

12. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme ka anyị nwee ike inyere ụmụnna anyị aka ka ha mekwuo nke ọma n’ọgbakọ? Nye ihe atụ.

12 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-enyere ụmụnna anyị aka ka ha na-eme nke ọma n’ọgbakọ, anya kwesịrị ịna-eru anyị ala. Ihe ahụ a kọrọ gbasara Julien gosiri na ọ bụrụ na anyị chọrọ ịhụ àgwà ọma mmadụ na ihe ndị ọ ga-emeli n’ozi Jehova, anyị kwesịrị ịna-ele ebe ọ na-eme nke ọma. Ọ bụ otú ahụ ka Jizọs si mee Pita onyeozi. Mgbe ụfọdụ, Pita kpara àgwà ka onye a na-ekwesịghị ịtụkwasị obi. Ma, Jizọs gụrụ ya Sifas ma ọ bụ Pita, nke pụtara nkume. Aha a Jizọs gụrụ ya gosiri na okwukwe ya ga-esi ike ka nkume.—Jọn 1:42.

13, 14. (a) Olee otú Banabas si gosi na ya ghọtara na Mak nwere àgwà ọma ndị ga-aba uru n’ọdịnihu? (b) Olee otú otu nwanna nwoke na-eto eto si rite uru n’aka otu okenye nyeere ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

13 Banabas gosiri na ya ghọtara na Jọn nwere àgwà ọma ndị ga-aba uru n’ọdịnihu. Ihe e ji mara Jọn bụ aha ndị Rom ya bụ́ Mak. (Ọrụ 12:25) Mgbe Pọl na Banabas na-aga ozi ala ọzọ mbụ ha gara, ọ bụ Mak “na-ejere ha ozi.” O nwere ike ịbụ na e nwere mkpa ndị ọ na-egboro ha. Ma, mgbe ha ruru Pamfilia, Mak hapụrụ ha na mberede lawa. Naanị ha abụọ sizi ebe ahụ gawa ebe ugwu. Ndị ohi na-anọkarị n’ebe ahụ. (Ọrụ 13:5, 13) Gịnị ka Banabas mere? Ọ dị ka ọ̀ hụrụ àgwà ọma Mak nwere, ọ bụghị  naanị ihe ndị o mejọrọ. O wereghị Mak ka onye a na-agaghị atụkwasịli obi. Kama ime otú ahụ, Banabas mechara zụọ Mak ma nyere ya aka ka ọ ghọọ Onye Kraịst ma nke a na-akọ. (Ọrụ 15:37-39) Mgbe e mechara tụọ Pọl mkpọrọ na Rom, Mak gara na-enyere ya aka. Mgbe Pọl na-edegara ọgbakọ Ndị Kraịst dị na Kọlọsi akwụkwọ ozi, ọ gwara ha na Mak kelere ha. Pọl kwukwara okwu ọma banyere ya n’akwụkwọ ozi ahụ. (Kọl. 4:10) Chegodị ụdị obi ụtọ Banabas nwere mgbe Pọl kwuru ka Mak bịa nyere ya aka.—2 Tim. 4:11.

14 E nwere otu nwanna e mere okenye ọhụrụ. Aha ya bụ Alexandre. O kwuru otú otu nwanna nwoke si nyere ya aka. Ọ sịrị: “Mgbe m ka na-eto eto, ọ na-esiri m ike idu ọgbakọ n’ekpere. Otu okenye gwara m ihe ndị m ga-eme ka obi nwee ike iru m ala mgbe m na-edu ndị ọzọ n’ekpere. Ọ kwụsịghị ịkpọ m ka m duo ụmụnna n’ekpere. E mechaa nzukọ ozi ubi, ọ na-akpọkarị m ka m duo ụmụnna n’ekpere. M ji nwayọọ nwayọọ kwụsị ịtụ ụjọ.”

15. Olee otú Pọl si gosi na ya hụrụ ụmụnna ya n’anya?

15 Ànyị na-aja nwanna anyị mma ma anyị hụ àgwà ọma o nwere? Ná Ndị Rom isi iri na isii, Pọl kpọrọ aha ihe karịrị ụmụnna iri abụọ ma kwuo àgwà ọma ndị ha nwere. (Rom 16:3-7, 13) Dị ka ihe atụ, Pọl kwuru na Andrọnaịkọs na Junias esoola ụzọ Kraịst ọtụtụ afọ karịa yanwa. Ihe ahụ o kwuru gosiri na ha nwere ntachi obi. Pọl kwukwara okwu ọma gbasara nne Rufọs. O nwere ike ịbụ n’ihi otú o si jiri obiọma lekọta Pọl.

Aha nwanna nke nọ n’aka ekpe bụ Frédéric. Ọ gbara nwanna nke ọzọ aha ya bụ Rico ume ka ọ nọsie ike n’ozi Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

16. Olee uru ịja ndị na-eto eto mma nwere ike ịba?

16 Ọ bụrụ na anyị ana-aja ndị ọzọ mma, o nwere ike ịba ezigbo uru. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwata nwoke bi na Frans. Aha ya bụ Rico. Papa ya abụghị Onyeàmà Jehova. Mgbe ọ na-ekweghị ka e mee Rico baptizim, obi jọrọ nwatakịrị ahụ njọ. O chere na ya ga-echere ruo mgbe ya toruru ikpebiri onwe ya ihe tupu e mee ya baptizim. Obi adịghịkwa ya mma na ụmụ akwụkwọ ibe ya na-akparị ya n’ụlọ akwụkwọ n’ihi ihe ndị o kweere. N’oge ahụ, ọ bụ otu okenye aha ya bụ Frédéric na-amụrụ ya ihe. Nwanna ahụ kwuru na ya jara Rico mma ma gwa ya na ihe ndị ahụ a na-eme ya gosiri na ọ katara obi na-agwa ndị ọzọ ihe o kweere. Ihe a ọ gwara Rico gbara ya ume, meekwa ka o kpebisie ike ịna-akpa àgwà ọma. O nyekwaara ya aka ka ya na papa ya dịkwuo ná mma. E mere Rico baptizim mgbe ọ dị afọ iri na abụọ.

Aha nwanna nke nọ n’aka nri bụ Jérôme. O nyeere nwanna nke ọzọ aha ya bụ Ryan aka ka ọ bụrụ onye ozi ala ọzọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

17. (a) Olee otú anyị nwere ike isi nyere ụmụnna nwoke aka ka ha na-emekwu nke ọma n’ozi Jehova? (b) Olee otú otu onye ozi ala ọzọ si nyere ụmụnna nwoke na-eto eto aka? Olee uru aka o nyeere ha bara?

17 Mgbe ọ bụla anyị jara nwanna mma n’ihi na o metere ihe omume ya ma ọ bụkwanụ na ọ gbara ezigbo mbọ, obi ga-adị ya ụtọ iji obi ya niile na-ejekwuru Jehova ozi. E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Sylvie. * Kemgbe ọtụtụ afọ, ọ na-eje ozi na Betel dị na Frans. O kwuru  na ụmụnna nwaanyị nwekwara ike ịna-aja ụmụnna nwoke mma. Ọ sịrị na ụmụnna nwaanyị nwere ike ịhụ ihe ụfọdụ nwanna nwoke mere, nke ụmụnna nwoke na-ahụghị. Ha kwesịrị ịja nwanna ahụ mma maka ya. Ọ bụrụ na ha emee otú ahụ, ‘ọ ga-agba nwanna ahụ ume. Mgbe ndị okenye ga-agba ya ume, obi adịkwuo ya ụtọ.’ Nwanna nwaanyị ahụ kwukwara, sị: “Eweere m ịja ndị ọzọ mma ka ọrụ dịịrị m.” (Ilu 3:27) Otu nwanna nwoke aha ya bụ Jérôme na-eje ozi ala ọzọ na French Gịyana. O nyerela ọtụtụ ụmụ okorobịa aka ka ha bụrụ ndị ozi ala ọzọ. Ọ sịrị: “Achọpụtala m na obi na-akakwu ụmụnna nwoke na-eto eto mgbe ọ bụla m jara ha mma maka ihe ha mere n’ozi ọma ma ọ bụkwanụ maka otú ha si zaa ajụjụ nke ọma n’ọmụmụ ihe. Ọ na-eme ka ha na-emekwu nke ọma n’ozi Jehova.”

18. Ọ bụrụ na ndị okenye na ụmụnna nwoke ka na-eto eto ana-arụkọ ọrụ, olee uru ọ na-aba?

18 Ọ bụrụ na anyị na ụmụnna anyị ana-arụkọ ọrụ, o nwere ike ịgba ha ume ka ha mekwuo nke ọma n’ozi Jehova. Dị ka ihe atụ, okenye nwere ike ịgwa nwanna nwoke na-eto eto kọmputa doro anya ka ọ gaa na jw.org bipụta ihe ụfọdụ nwere ike ịbara ndị katarala ahụ́ na-enweghị kọmputa uru. I nwekwara ike ịgwa nwanna nwoke ka na-eto eto ka ọ bịa nyere gị aka ka unu dowe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha ma ọ bụ rụzie ihe ụfọdụ mebiri na ya. Ọ bụrụ na gị na ndị na-eto eto ana-arụkọ ọrụ, ọ ga-eme ka ị hụ nkà ndị ha nwere, na-aja ha mma ma hụ ka ha na-eme nke ọma.—Ilu 15:23.

NA-ENYERE HA AKA MAKA ỌDỊNIHU

19, 20. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-enyere ndị ọzọ aka ka ha mekwuo nke ọma n’ọgbakọ?

19 Mgbe Jehova họpụtara Jọshụa ka o duo ụmụ Izrel, ọ gwara Mozis ka ọ ‘gbaa Jọshụa ume ma mee ka ọ dị ike.’ (Gụọ Diuterọnọmi 3:28.) Taa, ọtụtụ ndị na-abata n’ọgbakọ Jehova. A chọkwuru ụmụnna nwoke ruru eru ga-eso na-ahazi ihe a na-eme n’ọgbakọ. N’ihi ya, mmadụ niile nọ n’ọgbakọ kwesịrị ịna-enyere ụmụnna nwoke ka na-eto eto ma ọ bụkwanụ ndị nke a ka mere baptizim ọhụrụ aka ka ha mekwuo nke ọma n’ọgbakọ. Ọ ga-eme ka ọtụtụ ndị jewe ozi oge niile, meekwa ka ọtụtụ ụmụnna nwoke ‘ruo eruo ịkụziri ndị ọzọ ihe.’—2 Tim. 2:2.

20 Ma ọgbakọ anyị ò buru ibu ma ànyị na-amụ ihe n’ebe e nwere ndị nkwusa ole na ole na-aghọbeghị ọgbakọ, anyị kwesịrị ịna-enyere ụmụnna nwoke aka ka ha baara nzukọ Jehova uru n’ọdịnihu. Ihe ga-enyere anyị aka ime otú ahụ bụ ịna-eme ka Jehova na ịna-ahụ ebe ụmụnna anyị na-eme nke ọma.

^ para. 17 Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.