Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JUN 2014

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

È Kwesịrị Ịkpọ Ozu Ndị Kraịst Ọkụ?

Baịbụl ekwughị na ịkpọ ozu ọkụ bụ ihe ọjọọ.

E nwere ebe ụfọdụ Baịbụl kọrọ na a kpọrọ ozu ndị mmadụ ma ọ bụ ọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ ọkụ. (Jọsh. 7:25; 2 Ihe 34:4, 5) O nwere ike ịbụ na ọkụ a kpọrọ ha gosiri na e kwesịghị ili ha eli. Ma, ọ bụghị mgbe niile ka ịkpọ ozu ọkụ gosiri na e kwesịghị ili ya eli.

Ihe gosiri na ọ bụ eziokwu bụ ihe e mere ozu Eze Sọl na ụmụ ya atọ. E gburu ha anọ mgbe ha na ndị Filistia na-alụ agha. Otu n’ime ha bụ Jọnatan. Ọ bụ ezigbo enyi Devid, jirikwa obi ya niile na-akwado ya. Mgbe ndị Izrel bụ́ ndị dike bi na Jebesh-gilied nụrụ ihe merenụ, ha gara buru ozu ha anọ, suo ha ọkụ, chịrịkwa ọkpụkpụ ha lie. Devid mechara too ha maka ihe a ha mere.—1 Sam. 31:2, 8-13; 2 Sam. 2:4-6.

Baịbụl kwuru banyere mbilite n’ọnwụ. Ọ pụtara na mmadụ nwụọ, ihe Chineke ga-akpọlite bụ onye ahụ nwụrụ anwụ. Ma à kpọrọ ozu ya ọkụ ma ọ bụ na a kpọghị ya, Jehova ga-akpọlite onye ahụ nwụrụ anwụ ma nye ya ahụ́ ọhụrụ. Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara ndị Hibru atọ ahụ ji obi ha niile fee Jehova. Mgbe Eze Nebukadneza nyere iwu ka a tụba ha n’oké ọkụ, ụjọ ekwesịghị ịtụ ha ma Chineke ọ̀ ga-akpọlite ha n’ọnwụ ma ọkụ ahụ regbuo ha. (Dan. 3:16-18) Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị ohu Jehova a gwara na a ga-egbu ha ma kpọọ ozu ha ọkụ n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi. E nweela ọtụtụ ndị ohu Chineke bọmbụ ma ọ bụ ihe ọzọ gburu. N’ihi ya, a hụghị ozu ha anya. Ma, Jehova ga-akpọlite ha.—Mkpu. 20:13.

Jehova chọọ ịkpọlite mmadụ, ọ pụtaghị na ọ ga-ewekọta ihe niile dịbu n’ahụ́ onye ahụ, tinyeghachi ha n’ahụ́ ya. Ihe gosiri na ọ bụ eziokwu bụ otú o si akpọlite Ndị Kraịst e tere mmanụ ka ha gaa eluigwe. Baịbụl kwuru na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ya abụrụ mmụọ. Ọ bụ otú ahụ ka a ga-akpọlite Ndị Kraịst e tere mmanụ, ha abụrụ mmụọ. Ma, ha ga-abụ otu onye ahụ. Ha anaghị eji ahụ́ ha nwere mgbe ha nọ n’ụwa aga eluigwe.—1 Pita 3:18; 1 Kọr. 15:42-53; 1 Jọn 3:2.

Ihe mere anyị ji kwere ná mbilite n’ọnwụ abụghị ma à kpọrọ ozu onye nwụrụ anwụ ọkụ ma ọ bụ na a kpọghị ya. Kama, ọ bụ n’ihi na obi siri anyị ike na o nweghị ihe ga-eme ka Chineke ghara imezu nkwa ya. Ọ chọkwara imezu ya. (Ọrụ 24:15) Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị amachaghị otú Chineke si rụọ ọrụ ebube ma kpọlite ndị nwụrụ anwụ n’oge ochie ma ọ bụkwanụ otú ọ ga-esi eme ya n’ọdịnihu. Ma, anyị tụkwasịrị Jehova obi. O ‘nyere anyị ihe ga-emesi anyị obi ike.’ Otú o si mee ya bụ ịkpọlite Jizọs n’ọnwụ.—Ọrụ 17:31; Luk 24:2, 3.

Ndị Kraịst chọọ ikpebi ma à ga-akpọ ozu mmadụ ọkụ ma ọ bụ na a gaghị akpọ ya, ha kwesịrị iche echiche banyere omenala obodo, otú ndị mmadụ si ele ya anya nakwa ihe iwu gọọmenti kwuru gbasara ya. (2 Kọr. 6:3, 4) N’ihi ya, ọ bụ mmadụ ma ọ bụ ezinụlọ ya ga-ekpebi ma à ga-akpọ ozu ya ọkụ ma ọ bụ na a gaghị akpọ ya.