Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MEE 2014

Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi “Azaghachi Onye Ọ Bụla”?

Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi “Azaghachi Onye Ọ Bụla”?

“Ka okwu unu dịrị n’amara mgbe niile, . . . ka unu wee mara otú unu kwesịrị isi azaghachi onye ọ bụla.”—KỌL. 4:6.

1, 2. (a) Kọọ ihe gosiri na ịjụ ajụjụ dabara adaba na-aba uru. (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị mere na ụjọ ekwesịghị ịtụ anyị ikwu banyere isiokwu siri ike?

E NWERE otu nwanna nwaanyị di ya na-abụghị Onyeàmà Jehova. Otu ụbọchị ha na-ekwurịta ihe dị na Baịbụl, di ya gwara ya na ya kweere n’Atọ n’Ime Otu. Ma, ọ chọpụtara na ọ dị ka di ya amaghị ihe chọọchị ha na-akụzi banyere Atọ n’Ime Otu. N’ihi ya, o ji akọ jụọ ya, sị, “Ì kweere na Chineke bụ Chineke, Jizọs abụrụ Chineke, mmụọ nsọ abụrụkwa Chineke; ma, ya abụrụ na ha abụghị Chineke atọ, kama ha atọ bụ otu Chineke?” O juru di ya anya, ya asị ya, “Mba, ekwetaghị m.” N’ihi ya, ha kwurịtaziri gbasara onye Chineke bụ.

2 Olee ihe akụkọ a na-akụziri anyị? Ọ na-akụziri anyị na iji akọ jụọ ajụjụ dabara adaba na-aba ezigbo uru. Ihe ọzọ ọ na-akụziri anyị bụ na ụjọ ekwesịghị ịtụ anyị ikwu gbasara Atọ n’Ime Otu, ọkụ ala mmụọ, ihe gosiri na Chineke dị, ma ọ bụ isiokwu ndị ọzọ siri ike. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, na-emekwa ihe ndị ọ na-akụziri anyị, anyị ga-akụziliri mmadụ ihe, ya eruo ya n’obi. (Kọl. 4:6) Ka anyị tụlee ihe atọ ga-enyere gị aka ịna-akụzikwu ihe nke ọma. Nke mbụ, jụọ ajụjụ ga-eme ka mmadụ kwuo ihe o bu n’obi. Nke abụọ, jiri  ihe Baịbụl kwuru mee ka mmadụ tụgharịa uche. Nke atọ, jiri ihe atụ mee ka ihe ị na-ekwu doo anya.

JỤỌ AJỤJỤ GA-EME KA MMADỤ KWUO IHE O BU N’OBI

3, 4. Gịnị mere o ji dị mma ịjụ mmadụ ajụjụ ka anyị mata ihe o kweere? Nye ihe atụ.

3 Ịjụ mmadụ ajụjụ nwere ike ime ka anyị mata ihe o kweere. Gịnị mere ịjụ mmadụ ajụjụ ji dị mkpa? Ilu 18:13 sịrị: “Mgbe onye ọ bụla na-aza okwu tupu ya anụ ya, ọ bụụrụ ya nzuzu na mmechuihu.” N’ihi ya, anyị kwesịrị ibu ụzọ chọpụta ihe onye anyị na-agwa okwu kweere. Ma ọ́ bụghị ya, anyị nwere ike iji ọtụtụ awa na-agbalị ka mmadụ mata nke bụ́ eziokwu gbasara ozizi ụgha, ma e mechaa anyị achọpụta na onye ahụ ekwetadịghị n’ozizi ahụ.—1 Kọr. 9:26.

4 Dị ka ihe atụ, anyị na mmadụ nwere ike ịna-ekwurịta banyere ọkụ ala mmụọ. Ọ bụghị onye ọ bụla kweere na ọkụ ala mmụọ bụ ebe ọkụ ga na-ere ndị mmehie. N’ihi ya, anyị nwere ike ịjụ onye ahụ, sị: “Ebe ọ bụ na e nwere ọtụtụ ihe ndị mmadụ kweere banyere ọkụ ala mmụọ, olee ihe gịnwa chere banyere ya?” Anyị kwesịrị ige ya ntị mara ihe o kweere, n’ihi na ọ ga-eme ka anyị mara otú anyị ga-esi nyere ya aka, ya amata ihe Baịbụl na-akụzi.

5. Olee otú ịjụ mmadụ ajụjụ nwere ike isi mee ka anyị mata ihe mere o ji kwere ihe o kweere?

5 Iji akọ ajụ ajụjụ nwere ike ime ka anyị mata ihe mere mmadụ ji kwere ihe o kweere. Dị ka ihe atụ, gịnị ka anyị ga-eme ma onye anyị hụrụ n’ozi ọma kwuo na ya ekweghị na Chineke? Anyị nwere ike iche na onye ahụ ekwetaghị na e kere mmadụ eke. (Ọma 10:4) Ma, ihe mere na ụfọdụ ekweghị na Chineke bụ ahụhụ ha na-ata ma ọ bụ nke ndị ọzọ na-ata. O siiri ha ike ikweta na e nwere Chineke hụrụ ndị mmadụ n’anya, ya agbachie nkịtị ha ana-ata ahụhụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na onye anyị bịara izi ozi ọma ekwuo na ya ekweghị na Chineke, anyị nwere ike ịjụ ya, sị, “Ọ̀ bụ kemgbe ụwa ka ị na-ekweghị na Chineke?” Ọ bụrụ na ọ sị mba, anyị nwere ike ịjụ ya ma ò nwere ihe mere o ji chewezie na Chineke adịghị. Ihe ọ zara ga-eme ka anyị mara otú anyị nwere ike isi jiri Baịbụl nyere ya aka.—Gụọ Ilu 20:5.

6. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị jụọ mmadụ ajụjụ?

6 Anyị jụọ mmadụ ajụjụ, anyị kwesịrị ige ntị mgbe ọ na-aza ya. Ya zachaa, anyị ekelee ya maka na o kwuru obi ya. Dị ka ihe atụ, mmadụ nwere ike ikwu na e nwere otu ihe merenụ nke mere ka o chewe na Chineke adịghị. Anyị kwesịrị ibu ụzọ mee ka ọ ghọta na o nweghị ihe o mere ma mmadụ jụọ ihe mere anyị ji ata ahụhụ. Anyị ga-akọwaziri ya ihe mere anyị ji kwere na Chineke dị. (Hab. 1:2, 3) Ọ bụrụ na anyị enwee ndidi na obiọma, onye ahụ nwere ike ịchọ ka anyị na-abịa akụzikwuru ya ihe. *

JIRI IHE BAỊBỤL KWURU MEE KA MMADỤ TỤGHARỊA UCHE

Gịnị ga-eme ka ihe anyị na-ekwu ruo mmadụ n’obi? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7. Olee ihe ga-eme ka ihe anyị na-ekwu ruo mmadụ n’obi?

7 Ka anyị tụlezie otú anyị nwere ike isi jiri ihe Baịbụl kwuru mee ka mmadụ tụgharịa uche. Ọ bụ Baịbụl bụ ihe kacha mkpa anyị ji ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ọ na-eme ka anyị ‘ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ ndị a kwadebere n’ụzọ zuru ezu ịrụ ezi ọrụ niile.’ (2 Tim. 3:16, 17) Ọ bụghị ịgụ ọtụtụ ebe na Baịbụl ga-eme ka ihe anyị na-ekwu ruo mmadụ n’obi. Kama, ọ bụ otú anyị si kọwaa ebe anyị gụrụ ma mee ka onye ahụ chebara ya echiche. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 17:2, 3.) Ka anyị tụlee ihe atụ atọ.

8, 9. (a) Anyị hụ onye kweere na Jizọs na Chineke hà, olee otu ụzọ anyị nwere ike isi mee ka o chebara ihe o kweere echiche? (b) Olee otú gịnwa sirila mee ka ụdị onye ahụ chebara ihe o kweere echiche?

 8 Ihe atụ nke mbụ: Ka e were ya na anyị gara ozi ọma hụ onye kweere na Jizọs na Chineke hà. Olee amaokwu Baịbụl anyị nwere ike iji mee ka ọ tụgharịa uche? Anyị nwere ike ịgwa ya ka ọ gụọ Jọn 6:38. Jizọs kwuru n’ebe ahụ, sị: “Esi m n’eluigwe bịa ime, ọ bụghị uche m, kama uche onye zitere m.” Ọ gụchaa ya, anyị nwere ike ịjụ ya, sị: “Ọ bụrụ na Jizọs bụ Chineke, ònye dunyere ya ka o si n’eluigwe bịa n’ụwa? Í cheghị na Onye dunyere ya ka ya? Onye dunyere onye ọzọ ozi ka onye ahụ o dunyere ozi.”

9 Anyị nwekwara ike ịgụ Ndị Filipaị 2:9. N’ebe ahụ, Pọl onyeozi kwuru ihe Chineke mere mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ. Ọ sịrị: “Chineke buliri ya elu ka ọ nọrọ n’ọkwá ka elu, o jikwa obiọma nye ya aha dị elu karịa aha ọ bụla ọzọ.” Otú anyị nwere ike isi nyere onye ahụ aka ichebara amaokwu Baịbụl ahụ echiche bụ ịjụ ya, sị: “Ọ bụrụ na Jizọs na Chineke hà tupu Jizọs anwụọ, Chineke emechaa nye ya ọkwá ka nke ọ nọbu, ọ̀ bụ na Jizọs agaghịzi aka Chineke? Ma, ò nwere onye ga-aka Chineke?” Ọ bụrụ na onye ahụ weere Baịbụl ka o kwuchaa o bie, chọọkwa ịmata nke bụ́ eziokwu, ajụjụ ndị a nwere ike ime ka ọ chọọ ka a kọwakwuoro ya ihe Baịbụl kwuru.—Ọrụ 17:11.

10. (a) Olee otú anyị nwere ike isi mee ka onye kweere n’ọkụ ala mmụọ chee echiche? (b) Olee otú gịnwa sirila mee ka ụdị onye ahụ chebara ihe o kweere echiche?

10 Ihe atụ nke abụọ: Ka e were ya na anyị gara ozi ọma hụ onye o siiri ike ikweta na Chineke agaghị ata ndị mmehie ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ ruo mgbe ebighị ebi. O nwere ike ịbụ na ihe mere o ji kwere n’ọkụ ala mmụọ bụ na ọ chọrọ ka a taa ndị mmehie ahụhụ maka ihe ọjọọ niile ha mere. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ya aka, ya atụgharịa uche? Ihe mbụ anyị nwere ike ime bụ ime ka ọ mata na a ga-ata ndị mmehie ahụhụ. (2 Tesa. 1:9) Anyị nweziri ike ịgwa ya ka ọ gụọ Jenesis 2:16, 17. Ebe ahụ gosiri na ahụhụ a ga-ata onye mere mmehie bụ na ọ ga-anwụ. Anyị nwere ike kọwaara ya na mmadụ niile bụ ndị mmehie n’ihi mmehie Adam mere. (Rom 5:12) Ma, anyị nwere ike ịgwa ya na Chineke ekwughị ihe ọ bụla gbasara ịga ọkụ ala mmụọ. Anyị nweziri ike ịjụ ya, sị, “Ọ bụrụ na a ga-ata Adam na Iv ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi, ọ̀ bụ na e kwesịghị ịgwa ha agwa?” Anyị nwere ike ịgụ Jenesis 3:19. N’ebe ahụ, Chineke gwara  Adam na ọ ga-alaghachi n’ájá maka inupụrụ ya isi. Anyị nwere ike jụọ onye ahụ, sị, “Ì chere na Chineke mere ihe dị mma ma ọ bụrụ na ọ gwara Adam na ọ ga-alaghachi n’ájá ma ya abụrụ n’ọkụ ala mmụọ ka ọ ga-atụba ya?” Ọ bụrụ na onye ahụ chọrọ ịmata nke bụ́ eziokwu, ụdị ajụjụ a nwere ike ime ka o chee echiche.

11. (a) Olee otu ụzọ anyị nwere ike isi mee ka onye kweere na ndị ezi omume niile ga-aga eluigwe tụgharịa uche? (b) Olee otú gịnwa sirila mee ka ụdị onye ahụ chebara ihe o kweere echiche?

11 Ihe atụ nke atọ: Ka e were ya na anyị gara ozi ọma hụ onye kweere na ndị ezi omume niile ga-aga eluigwe. Ihe a onye ahụ kweere nwere ike ime, Baịbụl kwuo otu ihe, ya aghọta ihe ọzọ. Were ya na anyị gụụrụ ya Mkpughe 21:4. (Gụọ ya.) O nwere ike iche na ihe ọma ndị e kwuru n’ebe ahụ ga-eme n’eluigwe. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ọ tụgharịa uche? Kama ịchọwa ebe ọzọ anyị ga-agụ na Baịbụl, anyị nwere ike ịkọwa ihe ụfọdụ dị na nke anyị gụrụ agụ. Ebe ahụ sịrị na “ọnwụ agaghị adị ọzọ.” Anyị nwere ike ịjụ ya, sị: “Ì kwetara na tupu a sị na ihe agaghị adị ọzọ na ihe ahụ dịbu adị?” O nwere ike ịsị na ya kwetara. Anyị nweziri ike ịgwa ya na ọnwụ adịghị n’eluigwe. Naanị n’ụwa a ka a na-anwụ anwụ. N’ihi ya, Mkpughe 21:4 na-ekwu banyere ihe ọma Chineke ga-eme n’ụwa.—Ọma 37:29.

JIRI IHE ATỤ MEE KA IHE Ị NA-EKWU DOO ANYA

12. Gịnị mere Jizọs ji jiri ihe atụ kụzie ihe?

12 Ọ bụghị naanị ajụjụ ka Jizọs ji akụziri ndị mmadụ ihe. Ọ na-ejikwa ihe atụ akụziri ha ihe. (Gụọ Matiu 13:34, 35.) Ihe atụ ndị ahụ mere ka a mata ma ndị ọ na-agwa okwu hà chọrọ ịmụta eziokwu ma chọọ ife Jehova. (Mat. 13:10-15) Jizọs ji ihe atụ kụzie ihe ka ndị mmadụ nwee ike icheta ihe ọ na-akụziri ha ma na-ege ya ntị. Olee otú anyị ga-esi jiri ihe atụ kụzie ihe?

13. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na Chineke ka Jizọs?

13 Ihe atụ anyị kwesịrị ịdị mfe nghọta. Ọ bụ ya bụ ụdị ihe atụ kacha mma. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ka mmadụ ghọta na Chineke ka Jizọs, anyị nwere ike ịgwa ya na Chineke kpọrọ Jizọs Ọkpara ya, Jizọs ekwuokwa na Chineke bụ Nna ya. (Luk 3:21, 22; Jọn 14:28) Anyị nweziri ike ịjụ ya, sị: “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgwa m na mmadụ abụọ hà, olee ihe atụ i nwere ike imere m?” Onye ahụ nwere ike ikwu na ya ga-eji ụmụnne, ma ọ bụkwanụ ejima meere gị ihe atụ. O kwuo otú ahụ, anyị nwere ike ịgwa ya na ọ dabara adaba. Anyị nwere ike ịjụ ya, sị: “Ọ bụrụ na mụ na gị ga-emeli ụdị ihe atụ a n’egbughị oge, í cheghị na Jizọs bụ́ Onye Ozizi Ukwu ga-emeli ya? Kama ime ụdị ihe atụ a, o kwuru na Chineke bụ Nna ya, ọ bụghị na ọ bụ nwanne ya ma ọ bụ ejima ya. Jizọs chọrọ isi otú ahụ mee ka anyị mata na Chineke tọrọ ya, kakwa ya ike.”

14. Olee ihe atụ gosiri na mmadụ ekwesịghị iche na Chineke ga-agwa Ekwensu taa ndị mmadụ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ?

14 Ka anyị tụlee ihe atụ ọzọ. Ụfọdụ kweere na ọ bụ Setan ka e nyere ọrụ ịna-elekọta ọkụ ala mmụọ. Ọ bụrụ na onye kweere n’ụdị ihe ahụ bụ nne ma ọ bụ nna, olee otú anyị nwere ike isi nyere ya aka ịghọta na iche otú ahụ adabaghị adaba? Anyị nwere ike ịgwa ya, sị: “Ka e were ya na nwa gị dị isi ike, na-emekwa ihe ọjọọ ndị ọzọ. Gịnị ka ị ga-eme?” Onye ahụ nwere ike ikwu na ya ga-adọ nwa ya aka ná ntị, na-agbalị inyere ya aka ka ọ kwụsị ihe na-adịghị mma ọ na-eme. (Ilu 22:15) Anyị nweziri ike ịjụ ya ihe ọ ga-eme ma ọ bụrụ na nwa ahụ ekweghị  ege ya ntị. Ọtụtụ nne na nna ga-ekwu na o nweghị ihe ọzọ ha ma ha ga-eme ma ọ́ bụghị ịta nwa ahụ ahụhụ. Anyị nwere ike ịjụ ya, sị: “Ị́ chọpụtakwanụ na e nwere onye ọjọọ na-eduhie nwa gị?” O doro anya na nne ma ọ bụ nna ahụ ga-ewesa onye ahụ iwe. Iji mee ka ihe atụ gị doo anya, i nwere ike ịjụ nne ma ọ bụ nna ahụ, sị, “Ebe ọ bụ na ị matala onye na-eduhie nwa gị, ị̀ ga-agwa ya ka ọ taara gị nwa gị ahụ ahụhụ?” Ọ ga-asị mba. N’ihi ya, Setan agaghị eduhiecha ndị mmadụ, Chineke agwa ya taa ndị ahụ o duhiere ahụhụ.

ATỤLA ANYA NA MMADỤ NIILE GA-EGE NTỊ

15, 16. (a) Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịtụ anya na mmadụ niile ga-ege anyị ntị? (b) Ànyị ga-abụrịrị aka ochie tupu anyị akụzie ihe ga-eru ndị mmadụ n’obi? Kọwaa. (Kwuo ihe dị n’igbe bụ́ “ Ihe Ga-enyere Anyị Aka Ịma Ihe Anyị Ga-aza.”)

15 Anyị ma na ọ bụghị onye ọ bụla anyị ziri ozi ọma ga-anabata ya. (Mat. 10:11-14) Ụfọdụ agaghị ege ntị ọ bụrụgodị na anyị jụrụ ajụjụ dabara adaba, kwuo ihe kwesịrị ime ka ha chee echiche, meekwara ha ihe atụ dabara adaba. N’agbanyeghị na Jizọs bụ Onye Ozizi kachanụ e nwetụrụla n’ụwa, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole nabatara ihe ọ kụziri.—Jọn 6:66; 7:45-48.

16 Ọ bụrụgodị na anyị chere na anyị amachaghị otú e si akụzi ihe, anyị ka nwere ike ịna-akụzi ihe otú ọ ga-eru mmadụ n’obi. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 4:13.) Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na “ndị niile nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi” ga-anabata ozi ọma anyị. (Ọrụ 13:48) N’ihi ya, ka anyị ghara ịtụ anya na mmadụ niile ga-ege anyị ntị. Anyị kwesịrị ịna-agba mbọ ka anyị mụtakwuo otú anyị ga-esi na-akụziri ndị ọzọ Okwu Chineke. Ma, ike ekwesịghị ịgwụ anyị ma ọ bụrụ na ndị anyị chọrọ izi ozi ọma ekweghị ege anyị ntị. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, na-emekwa ihe ndị ọ na-akụziri anyị, anyị ga na-akụzikwu ihe nke ọma. Ọ ga-abakwara ma anyị ma ndị gere anyị ntị uru. (1 Tim. 4:16) Jehova ga-enyere anyị aka ịma otú anyị “kwesịrị isi azaghachi onye ọ bụla.” N’isiokwu na-esonu, anyị ga-ahụ na otu ụzọ anyị nwere ike isi na-eme nke ọma n’ozi anyị bụ ịna-eme ihe Jizọs kwuru banyere otú anyị ga-esi na-emeso ndị ọzọ.

^ para. 6 Gụọ isiokwu bụ́ “Mmadụ Ò Nwere Ike Ịmalite Inwe Okwukwe n’Onye Okike?” Ọ gbara n’Ụlọ Nche October 1, 2009.