Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MEE 2014

 AKỤKỌ NDỤ

Jehova Enyerela M Aka

Jehova Enyerela M Aka

Obere oge mụ na ezigbo nwunye m Evelyn gbachara akwụkwọ, anyị gawara n’otu obere obodo a na-akpọ Họnpen. Ọ dị n’ime ime ebe ugwu Ọnterio dị na Kanada. Anyị rutere n’isi ụtụtụ ezigbo oyi na-atụ. Otu nwanna nwoke abịa kpọrọ anyị n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè. Mgbe anyị na ya na nwunye ya na nwa ha richara nri, anyị gara na-ekwusa ozi ọma ụlọ n’ụlọ n’agbanyeghị na snoo nọ na-ada. N’ehihie, m gara kwuo okwu ihu ọha. Ọ bụ ya bụ okwu ihu ọha mbụ m kwuru mgbe m ghọrọ onye nlekọta sekit. Ma, ọ bụ naanị anyị mmadụ ise mụrụ ihe n’ụbọchị ahụ. O nweghị onye ọzọ bịaranụ.

NKE bụ́ eziokwu bụ na o wuteghị m na ọ bụ mmadụ ole na ole bịara gee okwu ihu ọha ahụ. M bụ onye ihere kemgbe ụwa. Mgbe m dị obere, ọ na-abụ, mmadụ bịa n’ụlọ anyị, mụ agaa zoo, ọ bụrụgodị na m ma onye ahụ.

N’ihi ya, o nwere ike iju gị anya ma ị mata na kemgbe m jewere ozi n’ọgbakọ Jehova, mụ na ọtụtụ ndị emekọọla ihe, ma ndị enyi m ma ndị m na-ahụtụbeghị. Ma, mụ na ihere na ụjọ ka na-alụ. N’ihi ya, ọ bụghị ike m ka m ji na-arụ ọrụ ndị e nyere m. Jehova na-enyere m aka. O mezuola nkwa ahụ o kwere n’Aịzaya 41:10. Ọ sịrị: “M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyere gị aka. M ga-eji aka nri m nke ezi omume jidesie gị ike.” Jehova na-esikarị n’aka ụmụnna anyị enyere m aka. Ka m kọtụrụ gị gbasara ụfọdụ n’ime ha. M ga-ebido mgbe m dị obere.

Ọ NA-EJI BAỊBỤL NA AKWỤKWỌ MKPO YA NA-EJI OJI

Ebe m nọ see foto a bụ n’ụlọ anyị, nke dị n’ebe anyị na-akọ ugbo, n’ebe ndịda Ọnterio

Otu ụbọchị anwụ na-acha n’afọ 1940, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Elsie Huntingford bịara n’ụlọ anyị, nke dị n’ebe anyị na-akọ ugbo, n’ebe ndịda Ọnterio. Mgbe ọ kụrụ aka n’ụzọ, mama m gara ka ọ mara onye na-akụ. Ma, mụ na papa m nọ n’ime ụlọ na-ege  ihe ọ na-ekwu n’ihi na papa m bụkwa onye ihere. Papa m chere na Nwanna Nwaanyị Huntingford bịara ire ahịa. Obi ezughị ya ike n’ihi na o chere na mama m ga-azụ ihe na-adịghị anyị mkpa. N’ihi ya, ọ gara n’ọnụ ụzọ ka o kwuo na anyị achọghị ya. Nwanna nwaanyị ahụ jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ na unu achọghị ịmụ Baịbụl?” Papa m sịrị ya: “Anyị chọrọ.”

Ọ dị mma na ọ bịara n’ụlọ anyị mgbe ahụ. Papa m na mama m bu chọọchị ha n’isi. (A na-akpọ ya United Church of Canada.) Ma, ha mechara kpebie na ha agaghịzi na-ekpe chọọchị ahụ. Maka gịnị? Ọ bụ maka na onye na-akụziri anyị ihe na-ede aha ndị niile nyere ego na chọọchị ma dowe ya n’ebe onye ọ bụla ga na-ahụ ya. Ọ na-ebu ụzọ ede aha ndị ego nke ha kacha. Papa m na mama m abaghị ọgaranya. N’ihi ya, aha ha na-adị n’ala ala. Ndị isi na chọọchị na-agwasi ha ike ka ha nyekwuo ego. Ihe ọzọ bụ na onye ọzọ na-akụzi ihe na chọọchị anyị kwuru na a ga-achụ ya n’ọrụ ma ọ bụrụ na ọ kụziere ndị mmadụ eziokwu o kweere. N’ihi ya, anyị kwụsịrị ịga chọọchị. Ma, anyị ka chọrọ ife Chineke, chọọkwa ịmụ gbasara ya.

N’oge ahụ, ndị ọchịchị anaghị eji anya ahụ akwụkwọ Ndịàmà Jehova na Kanada. N’ihi ya, mgbe Nwanna Nwaanyị Huntingford bidoro ịmụrụ anyị ihe, ọ na-eji naanị Baịbụl na ihe ndị o dere n’otu obere akwụkwọ mkpo ya na-eji oji abịa. Mgbe o mechara mata na anyị agaghị agbabọ ya, o nyere anyị akwụkwọ ndị ọzọ e ji amụ Baịbụl. Ọ na-abụ, anyị mụchaa ihe, anyị ezoo akwụkwọ ndị ahụ nke ọma. *

Papa m na mama m gere ntị n’ozi ọma e ziri ha n’ụlọ anyị, e meekwa ha baptizim n’afọ 1948

Nwanna Nwaanyị Huntingford ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị mmegide na nsogbu ndị ọzọ. Otú o si jiri obi ya niile na-ekwusa ozi ọma masịrị m. Ọ bụ ya mere m ji kpebie ife Jehova. E mere papa m na mama m baptizim n’afọ 1948, e mee mụnwa n’afọ na-eso ya, n’abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa abụọ n’afọ 1949. Ebe e mere m baptizim bụ n’otu ihe yiri drọn ndị na-akpa anụ ji enye anụ ha mmiri. Adị m afọ iri na asaa mgbe ahụ. Mgbe e mechara m baptizim, m kpebisiri ike na m ga-abanye n’ozi oge niile.

JEHOVA MERE KA M NWEE OBI IKE

O juru m anya mgbe a kpọrọ m ka m bịa jewe ozi na Betel n’afọ 1952

Obi akaghị m ịmalite ịsụ ụzọ ozugbo e mechara m baptizim n’ihi na ebu m n’obi na m kwesịrị  ibu ụzọ kpatatụ ego m ga-eji na-egbo mkpa m ma m sụwa ụzọ. N’ihi ya, m gara nweta ọrụ abụọ, otu n’ụlọ akụ̀, nke ọzọ n’ọfis. Ma, ebe ọ bụ na m ka bụ nwata, amabeghịkwa m nke a na-akọ, m na-emefu ego ọ bụla batara m n’aka. Otu nwanna aha ya bụ Ted Sargent gwara m ka m nwee obi ike ma tụkwasị Jehova obi. (1 Ihe 28:10) Ihe ahụ ọ gwara m mere ka m malite ịsụ ụzọ n’ọnwa iri na otu n’afọ 1951. Ihe m nwere mgbe ahụ bụ naanị dọla iri anọ, otu ígwè mere ochie, na otu akpa ọhụrụ. Ma, Jehova na-egboro m mkpa m mgbe niile. Obi dị m ụtọ na Nwanna Ted gbara m ume ka m banye n’ozi oge niile. Ozi ịsụ ụzọ emeela ka m nweta ọtụtụ ngọzi.

Ná ngwụcha ọnwa asatọ, n’afọ 1952, e si na Betel dị na Toronto, Kanada, kpọọ m na fon ná mgbede. A gwara m ka m bịa n’ọnwa itoolu jewe ozi n’ebe ahụ. Ọ bụ eziokwu na m bụ onye ihere, agatụbeghịkwa m Betel, m tụsiwere anya ike ịga n’ihi na ndị ọsụ ụzọ ndị ọzọ akọọrọla m ọtụtụ ihe ọma gbasara Betel. Ahụ́ ruru m ala ozugbo m ruru ebe ahụ.

“GOSI ỤMỤNNA NA Ị HỤRỤ HA N’ANYA”

Afọ abụọ m bịara Betel, aghọrọ m ohu ọgbakọ n’otu ọgbakọ dị na Toronto. * Ọ bụ m nọchiri Nwanna Bill Yacos. Ọ tọrọ m, kakwa m mara otú e si arụ ọrụ ahụ. N’oge ahụ, adị m naanị afọ iri abụọ na atọ. Ọ dịkwa m ka o nweghị ihe ọ bụla m ma. Nwanna Yacos ji obiọma gosi m ihe m ga-eme. Jehova nyeere m aka n’eziokwu.

Nwanna Yacos dọnyere adọnye n’ala. Ihu na-abụkwa ya ọchị ọchị. Ọ hụrụ ụmụnna n’anya, ụmụnna ahụkwa ya n’anya. Ọ na-aga eleta ha n’ụlọ ha, ma ọ bụghị naanị mgbe nsogbu bịaara ha. Nwanna Yacos gbara m ume ka m na-eme otú ahụ nakwa ka m soro ụmụnna niile na-aga ozi ọma. Ọ sịrị m: “Nwanna Ken, gosi ụmụnna na ị hụrụ ha n’anya. Ọ ga-eme ka ha na-eleghara ọtụtụ ihe i mejọrọ anya.”

NWUNYE M JI OBI YA NIILE NA-AKWADO MA JEHOVA MA MỤNWA

Jehova si n’ụzọ pụrụ iche na-enyere m aka kemgbe ọnwa mbụ n’afọ 1957. Ọ bụ n’ọnwa ahụ ka m lụrụ Evelyn. Ọ gara klas nke iri na anọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Tupu mụ na ya alụọ, ọ na-eje ozi n’ebe a na-asụ French n’obodo Kwebek. N’oge ahụ, ọ bụ Chọọchị Roman Katọlik na-atụ ihe a na-eme n’obodo ahụ. N’ihi ya, izi ozi ọma ebe ahụ adịrịghị Evelyn mfe. Ma, ọ kwụsịghị ozi ọma ọ na-ekwusa. O ji obi ya niile na-akwado Jehova.

Ụbọchị mụ na Evelyn nwunye m gbara akwụkwọ n’afọ 1957

Evelyn jikwa obi ya niile na-akwado m. (Efe. 5:31) Ma, ọ naghị adịrị ya mfe mgbe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị gbachara akwụkwọ, alaka ụlọ ọrụ gwara m n’echi ya ka m gaa nnọkọ ga-ewe otu izu, nke a ga-enwe na Betel dị na Kanada. Mụ na nwunye m Evelyn kwuburu na anyị ga-aga kporie ndụ na Flọrịda dị n’Amerịka ma anyị gbachaa akwụkwọ. Ma, anyị gawaziri Kanada n’ihi na anyị chọrọ ime ihe ọ bụla Jehova gwara anyị mee. N’izu ahụ anyị nọ na Kanada, nwunye m kwusara ozi ọma n’ebe dị nso n’alaka ụlọ ọrụ. Ọ gbalịrị ike ya n’agbanyeghị na ókèala ahụ adịghị ka Kwebek, bụ́ ebe ọ na-ejebu ozi.

 Ná ngwụcha izu ahụ, ihe m na-atụghị anya ya mere. E mere m onye nlekọta sekit ma ziga m n’ebe ugwu Ọnterio. M ka lụrụ nwaanyị ọhụrụ, dịrị naanị afọ iri abụọ na ise, amachaghịkwa m nke a na-akọ. Ma, anyị gawara n’ihi na obi siri anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka. Ezigbo oyi na-atụ na Kanada n’oge ahụ. Anyị banyere n’ụgbọ okporo ígwè ga-agba n’abalị. Ndị anyị na ha so banye n’ụgbọ ahụ bụ ndị ọzọ bụ́ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-alaghachi n’ebe ha na-eje ozi. Ha gbara anyị ezigbo ume. Otu n’ime ha achọghị ka anyị nọgide n’oche chi abọọ. O nyere anyị ebe ọ kwụrụ ụgwọ ya o bu n’obi ihi n’abalị ahụ. Ihe ndina dị na ya. N’ụtụtụ echi ya, ya bụ, ụbọchị iri na ise anyị gbachara akwụkwọ, anyị rutere Họnpen ahụ m kwuru okwu ya ná mmalite ma leta ụmụnna ole na ole nọ n’ebe ahụ.

Mgbe afọ ole na ole gachara, ihe ọzọ anyị na-atụghị anya ya mere. Ná ngwụcha afọ 1960, ya bụ, mgbe m bụ onye nlekọta distrikti, a kpọrọ m ka m bịa na Bruklin dị na Niu Yọk gụọ akwụkwọ na klas nke iri atọ na isii n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ụlọ akwụkwọ a ga-ewe ọnwa iri. Ọ ga-amalite n’ọnwa Febụwarị afọ 1961. Obi dị m ụtọ na a kpọrọ m ka m bịa ụlọ akwụkwọ a. Ma, o wutere m na Evelyn agaghị eso m aga. N’oge ahụ, nwaanyị anaghị eso di ya aga ụlọ akwụkwọ ahụ. A gwara Evelyn ka o dee akwụkwọ ozi gosiri na o kwetara ịnọ na Kanada ka m gaa ụlọ akwụkwọ ahụ naanị m. Evelyn bere ákwá na mụ na ya agaghị anọ n’oge ahụ m ga-aga Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ma, o kwetara ka m gaa. Obi dị ya ụtọ na a na-aga ịkụziri m ihe ga-abara m uru.

N’oge ahụ m gara Bruklin, Evelyn jere ozi na Betel dị na Kanada. Onye ya na ya bi mgbe ahụ bụ otu nwanna nwaanyị e tere mmanụ. Aha ya bụ Margaret Lovell. O doro anya na ọ gụsiri mụ na Evelyn ike ịhụ ibe anyị. Ma, Jehova nyeere anyị aka n’oge ahụ, anyị ejiri obi ụtọ na-ejere ya ozi. Ọ bụ oge mụ na nwunye m gaara eji na-anọ. Ma, o kwetara ka m jiri ya gaa nweta ọzụzụ ga-eme ka Jehova na nzukọ ya jiri anyị rụkwuo ọrụ. Ihe a o mere metụrụ m n’obi.

N’oge ahụ, ọ bụ Nwanna Nathan Knorr na-eduzi ọrụ ikwusa ozi ọma anyị na-arụ n’ụwa niile. Mgbe m nọrọ naanị ọnwa atọ na Gilied, ọ gwara m ihe m na-atụghị anya ya. Ọ jụrụ m ma m̀ ga-achọ ịlaghachi na Betel dị na Kanada gaa kụzie ihe obere oge n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze. O kwuru na ọ bụghị iwu na m ga-aga, na m chọọ, mụ anọrọ gụchaa akwụkwọ m na-agụ, nakwa na e nwere ike izipụ m ka m gaa jewe ozi ala ọzọ. Ọ gwakwara m na ọ bụrụ na mụ ekpebie ịlaghachi Kanada, e nwere ike a gaghị akpọ m ọzọ ka m bịa Ụlọ Akwụkwọ Gilied nakwa na e nwere ike ịgwa m ka m bụrụkwa onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. O kwuru ka mụ na nwunye m kpaa ya tupu mụ ekpebie ihe m ga-eme.

Ebe ọ bụ na Evelyn agwabuola m otú o si were ọrụ ọ bụla Jehova nyere anyị, m gwara Nwanna Knorr ozugbo, sị, “Ihe ọ bụla nzukọ Jehova chọrọ ka anyị mee, anyị ga-eji obi ụtọ mee ya.”  Anyị kpebiri na anyị ga-aga ebe ọ bụla nzukọ Jehova gwara anyị gaa, ọ bụrụgodị na ọ bụghị ebe anyị chọrọ ịga.

N’ihi ya, n’ọnwa Eprel 1961, m laghachiri Kanada ka m kụzie ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze. Mụ na Evelyn mechara jewe ozi na Betel dị na Kanada. O juru m anya mgbe m natara akwụkwọ ozi ka m gaa klas nke iri anọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied, nke ga-ebido n’afọ 1965. A gwakwara Evelyn dee akwụkwọ ozi gosiri na ya ga-ekwe ka naanị m gaa ụlọ akwụkwọ ahụ. Ma, mgbe izu ole na ole gachara, ọ natara akwụkwọ ozi e ji kpọọ ya ka o soro m gaa ụlọ akwụkwọ ahụ. Obi tọrọ anyị ezigbo ụtọ.

Mgbe anyị ruru n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied, Nwanna Knorr kwuru na anyị gụchaa, a ga-eziga anyị Afrịka, anyị na ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ na-aga amụ French. Ma, mgbe anyị gụchara, o juru anyị anya na a sịrị anyị laghachi Kanada. E mere m onye na-elekọta alaka ụlọ ọrụ. (Ihe a na-akpọ ya ugbu a bụ Onye Na-ahaziri Kọmitii Alaka Ọrụ.) M dị naanị afọ iri atọ na anọ mgbe ahụ. N’ihi ya, m gwara Nwanna Knorr, sị, “Etorubeghị m ịrụ ọrụ a.” Ma, ọ gbara m ume. Malite mgbe m rụwara ya, ọ na-abụ e nwee ihe dị mkpa m chọrọ ikpebi, m na-ebu ụzọ agwa ụmụnna ndị nọterela aka na Betel ka ha tụọrọ m aro.

BETEL BỤ EBE MMADỤ GA-ANỌ MỤTA IHE MA KỤZIERE NDỊ ỌZỌ IHE

M mụtala ọtụtụ ihe n’aka ndị ọzọ kemgbe m jewere ozi na Betel. Ejighị m ndị mụ na ha nọ na Kọmitii Alaka egwu egwu. M na-akwanyere ha ùgwù. M mụtakwala ihe n’aka ọtụtụ narị ụmụnna mụ na ha mekọrọ ihe n’alaka ụlọ ọrụ na n’ọgbakọ dị iche iche m jerela ozi, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi.

Ebe m na-eduziri ezinụlọ Betel dị na Kanada ihe mmụta dịịrị ụbọchị

M kụziekwarala ọtụtụ ndị ihe na Betel ma nyere ha aka ka okwukwe ha sie ike. Pọl onyeozi gwara Timoti, sị: “Nọgide n’ihe ndị ị mụtara.” Ọ gwakwara ya, sị: “Ihe ị nụrụ n’ọnụ m, nke ọtụtụ ndị gbara àmà ya, nyefee ya n’aka ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ndị ga-erukwa eru nke ọma ịkụziri ya ndị ọzọ.” (2 Tim. 2:2; 3:14) Mgbe ụfọdụ, ụmụnna na-ajụ m ihe m mụtarala kemgbe afọ iri ise na asaa m jewere ozi na Betel. Ihe m na-agwa ha bụ: “Na-eme ihe nzukọ Jehova gwara gị mee. Tụkwasịkwa Jehova obi na ọ ga-enyere gị aka.”

Ọ dị m ka o tebeghị m bịara Betel. Mgbe m bịara Betel ọhụrụ, abụ m onye ihere. Amachaghịkwa m nke a na-akọ. Kemgbe ahụ, Jehova na-enyere m aka. Ọ na-eji ụmụnna enyere m aka mgbe ọ bụla m chọrọ enyemaka. O si otú a na-agwa m, sị: “Atụla egwu. Mụ onwe m ga-enyere gị aka.”—Aịza. 41:13.

^ para. 10 N’abalị iri abụọ na abụọ n’ọnwa ise n’afọ 1945, ndị ọchịchị Kanada wepụrụ iwu ahụ ha machibidoro akwụkwọ anyị.

^ para. 16 N’oge ahụ, ihe a na-akpọ onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ bụ ohu ọgbakọ.