Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MEE 2014

 IHE SI N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

“A Ga-arụ Nnukwu Ọrụ Ka E Nwee Ike Ịkụziri Ndị Mmadụ Eziokwu Baịbụl”

“A Ga-arụ Nnukwu Ọrụ Ka E Nwee Ike Ịkụziri Ndị Mmadụ Eziokwu Baịbụl”

Onye a bụ George Young. Ọ bịara Rio de Jenero n’ọnwa Mach, n’afọ 1923

N’AFỌ 1923, ndị mmadụ juru n’otu ebe a na-anọ akụzi otú e si akụ egwú na otú e si eme ihe nkiri na Saụ Paụlo. Ha dị narị mmadụ ise na iri asatọ na ise. Otu nwanna aha ya bụ George Young nọ na-agwa ha okwu, a na-atapịa ya n’asụsụ Pọchugiiz. Ha niile gere ntị nke ọma. Ya na-agụ Baịbụl, a na-egosi ebe ọ na-agụ na sinima n’asụsụ Pọchugiiz. Mgbe o kwuchara, e kere ndị mmadụ otu narị akwụkwọ nta bụ́ Millions Now Living Will Never Die! n’asụsụ Pọchugiiz. Ụfọdụ nwetara nke Bekee, Jaman, na Ịtalian. Okwu Nwanna Young gara nke ọma. A kọsara ya ebe niile. Ná mgbede echi ya na nwanne echi ya, ndị mmadụ jukwara n’ebe ahụ ka ha gere okwu ọzọ ọ ga-ekwu. Ma, olee otú ihe a niile si malite?

N’afọ 1867, otu nwaanyị aha ya bụ Sarah Bellona Ferguson na ezinụlọ ya si Amerịka kwaga Brazil. N’afọ 1899, ọ ghọtara na ya achọtala eziokwu. Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ gụchara akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl nwanne ya nwoke nke ọ tọrọ si Amerịka weta na Brazil. Ọ chọrọ ịgụkwu akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl. N’ihi ya, ọ tụrụ ọda Ụlọ Nche Bekee a ga na-ewetara ya kwa ọnwa. Ozi ọma si na Baịbụl tọrọ ya ụtọ. Ọ bụ ya mere o ji degara Nwanna Russell akwụkwọ, kwuo na ihe gbasara onwe ya “gosiri na onye ọ bụla ga-anụli ozi ọma n’agbanyeghị ebe ọ nọ.”

Can the Living Talk With the Dead? (n’asụsụ Pọchugiiz)

Sarah Ferguson gbara mbọ kụziere ndị ọzọ eziokwu Baịbụl. Ma, ọ na-echekarị otú a ga-esi nyekwuoro ha aka, ma yanwa ma ndị ezinụlọ ya ma ndị Brazil ndị ọzọ chọrọ ịmụta eziokwu. N’afọ 1912, e si na Betel dị na Bruklin zitere ya ozi na e nwere onye ga-abịa Saụ Paụlo, na ọ ga-eweta ọtụtụ puku traktị bụ́ Where Are the Dead? n’asụsụ Pọchugiiz. N’afọ 1915, o kwuru na ọ na-eju ya anya na ọtụtụ Ndị Mmụta Baịbụl tụrụ anya na ha ga-aga eluigwe n’oge na-adịghị anya. O dere akwụkwọ ozi, kwuo otú obi dị ya. Ọ sịrị: “Olee ihe ga-eme Brazil na mba ndị gbara ya gburugburu? . . . Mmadụ chechaa otú mpaghara ụwa ebe a si buo ezigbo ibu, ọ ga-edo ya anya na a ga-arụ nnukwu ọrụ ka e nwee ike ịkụziri ndị  mmadụ eziokwu Baịbụl.” N’eziokwu, ọrụ a ka ga-arụ ebe ahụ buru ibu.

E nwere ụmụ okorobịa asatọ na-akwọ ụgbọ mmiri e ji alụ agha. N’ihe dị ka n’afọ 1920, ụgbọ mmiri ha mebiri. Ka ha na-eche ka a rụzie ya, ha gara ọmụmụ ihe na Niu Yọk Siti. Mgbe ha laghachiri Rio de Jenero, ha kọọrọ ndị ọzọ ihe ha mụtara na Baịbụl. N’oge na-adịghị anya, ya bụ, n’ọnwa Mach afọ 1923, Nwanna George Young bịara Rio de Jenero, hụ ndị chọrọ ka a kụziere ha Baịbụl. N’oge ahụ, ọ bụ onye pilgrim, ya bụ, onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. Ọ gbara mbọ ka a sụgharịa akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ Pọchugiiz. Ọ dịghị anya, ya agaa Saụ Paụlo. N’oge ahụ, ọ bụ ihe dị ka narị puku mmadụ isii bi n’ebe ahụ. Ọ bụ n’ebe ahụ ka o kwuru okwu ahụ anyị kọrọ gbasara ya ná mmalite ma nye ndị mmadụ akwụkwọ nta bụ́ Millions Now Living Will Never Die! O kwuru, sị: “Ebe ọ na-enweghị onye ọzọ mụ na ya so, ọ bụ akwụkwọ akụkọ ka m na-eji akpọsa okwu ndị m ga-ekwu.” O kwukwara na okwu ndị ahụ bụ “okwu ihu ọha ndị mbụ a kpọsara na Brazil n’aha Ndị Mmụta Baịbụl.” *

Mgbe Nwanna Young na-ekwu okwu, a na-egosi amaokwu Baịbụl ọ na-agụ na sinima n’asụsụ Pọchugiiz

Ụlọ Nche Bekee nke December 15, 1923 kọrọ gbasara Brazil, sị: “Ọ bụrụ na anyị echeta na a malitere ikwusa ozi ọma n’ebe a n’abalị mbụ n’ọnwa Jun nakwa na e nweghị akwụkwọ ọ bụla n’asụsụ ndị Brazil n’oge ahụ, anyị ga-aghọta na otú Onyenwe anyị sirila gọzie ozi ọma a na-ekwusa na Brazil enweghị atụ.” Ụlọ Nche ahụ kwukwara na okwu ihu ọha abụọ Nwanna Young kwuru na Saụ Paụlo so n’okwu ihu ọha iri abụọ na otu e kwuru malite n’abalị mbụ n’ọnwa Jun ruo n’abalị iri atọ n’ọnwa Septemba. Ndị bịara gere okwu ihu ọha niile ahụ dị puku mmadụ atọ na narị isii. Na Rio de Jenero, ozi ọma Alaeze Chineke ji nwayọọ nwayọọ na-eru ọtụtụ ebe. Naanị ọnwa ole na ole, akwụkwọ anyị e nyere ndị mmadụ n’asụsụ Pọchugiiz karịrị puku asaa. Ụlọ Nche mbụ e bipụtara n’asụsụ Pọchugiiz bụ Ụlọ Nche November-December 1923.

Onye a bụ Sarah Bellona Ferguson. Ọ bụ onye mbụ tụrụ ọda ka a na-ewetara ya Ụlọ Nche Bekee na Brazil

Nwanna George Young gara hụ Nwanna Nwaanyị Sarah Ferguson. Ụlọ Nche kwuru, sị: “Mgbe Sarah batara na palọ, o nyeghị ya ọnụ okwu. O jidere Nwanna Young n’aka, legide ya anya n’ihu sị ya: ‘Ọ̀ bụ onye pilgrim ka mụ na ya nọ ihe a?’” N’oge na-adịghị anya, e mere ya na ụmụ ya anọ baptizim. Ọ nọ na-eche kemgbe iri afọ abụọ na ise ka e mee ya baptizim. Ụlọ Nche Bekee nke August 1, 1924, kwuru na e mere mmadụ iri ise baptizim na Brazil. Ọtụtụ n’ime ha bi na Rio de Jenero.

Ihe dị ka iri afọ itoolu agaala kemgbe ahụ. Anyị ekwesịghịzi ịjụ, sị: “Olee ihe ga-eme Brazil na mba ndị gbara ya gburugburu?” Ihe karịrị narị puku Ndịàmà Jehova asaa na iri puku isii na-ekwusa ozi ọma na Brazil. Na Brazil na mba ndị gbara ya gburugburu, a na-ekwusa ozi ọma n’asụsụ Pọchugiiz, Spanish, na ọtụtụ asụsụ ndị ọzọ. Ihe ahụ Sarah Ferguson kwuru n’afọ 1915 bụ eziokwu. Ọ sịrị, ‘A ka ga-arụ nnukwu ọrụ ka e nwee ike ịkụziri ndị mmadụ eziokwu Baịbụl.’—Ihe si n’ebe anyị na-edebe ihe ochie na Brazil.

^ para. 6 Ihe a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ bụ Ndị Mmụta Baịbụl.