Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MEE 2014

‘Ihe Oriri M Bụ Ka M Mee Uche Chineke’

‘Ihe Oriri M Bụ Ka M Mee Uche Chineke’

Gịnị na-eme ka obi dị gị ezigbo ụtọ? Ọ̀ bụ ihe gbasara ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ịmụ ụmụ, ka ọ̀ bụ ime ka gị na ndị enyi gị na-adịkwu ná mma? O nwere ike ịbụ na obi na-adị gị ụtọ ma gị na ndị ị hụrụ n’anya rikọọ nri. Ebe ị na-efe Jehova, ọ̀ bụ na obi anaghị adị gị ụtọ ime uche Chineke, ịmụ Okwu ya, na ikwusa ozi ọma?

N’otu abụ Eze Devid ji too Chineke, ọ sịrị: “Chineke m, ime uche gị na-atọ m ụtọ, iwu gị dịkwa n’ime obi m.” (Ọma 40:8) Ime uche Chineke tọrọ Devid ụtọ n’agbanyeghị na e nwere mgbe ihe siiri ya ike, e nweekwa nsogbu ndị bịaara ya. Ma, e wezụga Devid, e nwere ndị ọzọ ife Jehova tọrọ ụtọ.

Ihe Pọl onyeozi kwuru gosiri na ihe ahụ e dere n’Abụ Ọma 40:8 gbasara Mesaya, ya bụ, Kraịst. Pọl dere, sị: “Mgbe [Jizọs] bịara n’ụwa, o kwuru, sị: ‘“Ị chọghị àjà na onyinye, kama ị kwadebeere m ahụ́. Ị kwadoghị onyinye a na-esurecha n’ọkụ na àjà mmehie.” M wee sị, “Lee! Abịawo m ime uche gị, Chineke, (e dere ihe banyere m n’akwụkwọ mpịakọta).”’”—Hib. 10:5-7.

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o wepụtara oge kirie ihe ndị e kere eke, ya na ndị enyi ya anọrịa, ya na ndị ọzọ erikọọkwa nri. Ụdị ihe a na-atọ ya ụtọ. (Mat. 6:26-29; Jọn 2:1, 2; 12:1, 2) Ma, ihe kacha amasị Jizọs ma na-eme ya obi ụtọ bụ ịna-eme uche Nna ya nke bi n’eluigwe. Jizọs kwuru, sị: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche onye zitere m, ka m rụchaa ọrụ ya.” (Jọn 4:34; 6:38) Ndị na-eso ụzọ Jizọs si n’aka ya mụta ihe ga-eme ka mmadụ nwee ezigbo obi ụtọ. Ha ji obi ụtọ wepụta onwe ha ma jiri ịnụ ọkụ n’obi kwusaara ndị ọzọ ozi ọma Alaeze Chineke.—Luk 10:1, 8, 9, 17.

“GAANỤ MEE NDỊ MBA NIILE KA HA BỤRỤ NDỊ NA-ESO ỤZỌ M”

Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu, sị: “Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ. Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu. Ma, lee! m nọnyeere unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.” (Mat. 28:19, 20) Otú anyị ga-esi eme ihe a Jizọs kwuru bụ ịgakwuru ndị mmadụ n’ebe ọ bụla ha nọ, ịga nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, na ịmụrụ ha Baịbụl. Ịrụ ọrụ a na-atọ ezigbo ụtọ.

Ọ bụ ịhụnanya mere anyị ji ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na ụfọdụ ndị anaghị ege anyị ntị

 Ihe ga-akacha eme ka ozi ọma anyị na-ekwusa na-atọ anyị ụtọ bụ otú anyị si were ya, ọ bụghị ma ndị mmadụ hà gere anyị ntị. Gịnị mere anyị ji ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na ụfọdụ ndị anaghị ege anyị ntị? Ọ bụ n’ihi na anyị ghọtara na ikwusa ozi ọma na ime ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs bụ otu ụzọ anyị si egosi na anyị hụrụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya. Ma anyị amaghị ihe anyị mere, a ga-ebibi ma anyị ma ndị agbata obi anyị. (Ezik. 3:17-21; 1 Tim. 4:16) Ka anyị tụlee ihe nyeerela ọtụtụ ụmụnna anyị aka iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na ndị bi n’ókèala ha anaghị egecha ntị.

NA-EKWUSA OZI ỌMA MGBE Ọ BỤLA

Ọ bụrụ na anyị ana-ajụ ajụjụ ndị dabara adaba mgbe anyị na-ezi mmadụ ozi ọma, ọ na-abakarị uru. N’ụtụtụ otu ụbọchị, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Amalia hụrụ ka otu nwoke na-agụ akwụkwọ akụkọ n’ebe ndị mmadụ na-anọ elepụ anya. Ọ bịakwutere nwoke ahụ jụọ ya ma ò nweela akụkọ ọma ọ gụtara. Mgbe nwoke ahụ sịrị mba, Amalia sịrị ya, “M wetaara gị ozi ọma Alaeze Chineke.” Otú a Amalia si malite mere ka nwoke ahụ nwee mmasị, kwetakwa ka a mụwara ya Baịbụl. Amalia malitere ịmụrụ mmadụ atọ Baịbụl n’ebe ahụ.

Nwanna nwaanyị ọzọ aha ya bụ Janice ji ebe ọ na-arụ ọrụ mere ebe ọ na-ekwusa ozi ọma. Mgbe ihe e dere n’otu Ụlọ Nche masịrị otu onye na-eche nche n’ụlọ ọrụ ahụ nakwa onye ya na ya na-arụkọ ọrụ, Janice gwara ha na ọ ga na-ewetara ha magazin anyị ọ bụla e bipụtara. Ọ bụkwa otú ahụ ka o meere onye ọzọ ya na ya na-arụkọ ọrụ. Ihe masịrị onye nke ahụ bụ isiokwu dị iche iche a na-ebipụta n’Ụlọ Nche nakwa na Teta! Mgbe onye ọzọ ya na ya na-arụkọ ọrụ hụrụ magazin ndị ahụ, o kwuru ka a na-ewetara ya ha. Janice sịrị: “Ihe a bụ ngọzi Jehova.” O mechara nwee mmadụ iri na otu ọ na-ewetara magazin anyị n’ụlọ ọrụ ha.

IKE AGWỤLA GỊ

Otu onye nlekọta sekit kwuru na ọ bụrụ na onye nkwusa ezichaa mmadụ ozi ọma n’ozi ụlọ n’ụlọ, o kwesịghị ịgwa ya naanị na ọ ga-abịa ụbọchị ọzọ. Kama, o nwere ike ịjụ onye ahụ, sị: “Ị̀ chọrọ ka m gosi gị otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl?” ma ọ bụkwanụ, “Olee ụbọchị ị chọrọ ka m bịaghachi? Olee mgbe ọ ga-abụ?” Onye nlekọta sekit ahụ kwuru na n’otu ọgbakọ o letara, ụmụnna si otú ahụ malitere mmadụ iri anọ na anọ ọmụmụ Baịbụl n’otu izu.

Ịga nletaghachi n’egbughị oge na-aba ezigbo uru. Ọ na-akacha mma ka a ghara iche ka ọtụtụ ụbọchị gafee. N’ihi gịnị? N’ihi na ịgaghachi n’egbughị oge gosiri na anyị chọrọ inyere ndị chọrọ ịmụta eziokwu aka ka ha mụta ihe Baịbụl na-akụzi. Mgbe a jụrụ otu nwaanyị ihe mere o ji kwe ka Ndịàmà Jehova mụwara ya Baịbụl, ọ sịrị, “Ọ bụ n’ihi na ha mere ihe gosiri na ihe gbasara  m na-emetụ ha n’obi nakwa na ha hụrụ m n’anya.”

I nwere ike ịjụ onye ị bịara izi ozi ọma, sị, “Ị̀ chọrọ ka m gosi gị otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl?”

Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Madaí si Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ lọta. Ọ dịghị anya ọ lọtara, ndị ọ na-amụrụ Baịbụl eruo mmadụ iri na ise. O nyere ndị ọzọ mmadụ ise ha ga na-amụrụ Baịbụl. Ụfọdụ ndị ọ na-amụrụ Baịbụl bidoro ịbịachi ọmụmụ ihe anya. Gịnị nyeere Madaí aka inweta ọtụtụ ndị ọ na-amụrụ Baịbụl? Ụlọ akwụkwọ ahụ ọ gara mere ka ọ ghọta na ọ dị ezigbo mkpa ịna-agaghachi na nke ndị nwere mmasị ruo mgbe ọ ga-ahụ ha. E nwere nwanna ọzọ nyeerela ọtụtụ ndị aka, ha amụta eziokwu Baịbụl. Ọ sịrị: “Achọpụtala m na mmadụ chọọ inyere ndị mmadụ aka ịmata onye Jehova bụ, ike ekwesịghị ịgwụ ya ịna-agara ha nletaghachi.”

Ịga nletaghachi n’egbughị oge gosiri na anyị chọrọ inyere ndị chọrọ ịmụta eziokwu aka ka ha mụta ihe Baịbụl na-akụzi

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịna-aga nletaghachi, na-amụkwara ndị mmadụ Baịbụl, i kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike. Ma, uru ị ga-erite karịrị ihe ọ bụla ọ ga-efu gị. Ọ bụrụ na i jiri ike gị niile na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, i nwere ike inyere ndị ọzọ aka, ha enweta “ezi ihe ọmụma nke eziokwu,” nke nwere ike ime ka a zọpụta ha. (1 Tim. 2:3, 4) Obi ga-adịkwa gị ezigbo ụtọ.