Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) EPREL 2014

 AKỤKỌ NDỤ

Ebe Ozi Oge Niile Mere Ka M Ruo

Ebe Ozi Oge Niile Mere Ka M Ruo

M cheta afọ iri isii na ise m jerela ozi oge niile, m na-aghọta na ọtụtụ ihe ọma emeerela m. Ọ pụtaghị na enwetụbeghị m nsogbu ma ọ bụ mgbe obi na-adịghị m mma. (Ọma 34:12; 94:19) N’agbanyeghị ihe niile merenụ, ndụ m abaala ezigbo uru. Chineke agọziekwala m.

N’ABALỊ asaa n’ọnwa itoolu n’afọ 1950, m malitere ije ozi na Betel dị na Bruklin. N’oge ahụ, ọ bụ naanị narị ụmụnna atọ na iri ise na ise na-eje ozi n’ebe ahụ. Ha si ná mba dị iche iche, dịrịkwa n’agbata afọ iri na itoolu na iri asatọ. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị e tere mmanụ.

OTÚ M SI MALITE IJERE JEHOVA OZI

Mgbe e mere m baptizim n’oge m dị afọ iri

Ọ bụ n’aka mama m ka m mụtara ijere “Chineke bụ́ onye obi ụtọ” ozi. (1 Tim. 1:11) O bidoro ife Jehova mgbe m dị obere. N’abalị mbụ n’ọnwa asaa n’afọ 1939, e mere m baptizim ná mgbakọ zoonu, nke a na-akpọzi mgbakọ sekit. E nwere ya na Kolọmbọs, Nebraska, dị n’Amerịka. M dị afọ iri n’oge ahụ. Anyị dị ihe dị ka otu narị mmadụ zukọta n’otu ebe anyị kwụrụ ụgwọ ya. Anyị nọ n’ebe ahụ na-ege okwu Nwanna Joseph Rutherford e tinyere na teepụ. Isiokwu ya bụ “Ọchịchị Aka Ike Ka Ọ̀ Bụ Nnwere Onwe?” Mgbe anyị geruru okwu ahụ ọkara, ìgwè mmadụ iwe ji gbakọtara n’èzí. Ha batara n’ime ụlọ, mee ka anyị kwụsị mgbakọ ahụ, chụpụkwa anyị n’obodo ahụ. Anyị zukọrọ n’ụlọ otu nwanna ma nọrọ na ya mechaa mgbakọ ahụ. Ebe ahụ dị nso n’obodo ahụ. Ihe ahụ merenụ emeela ka m ghara ichefu ụbọchị e mere m baptizim.

Mama m gbara ezigbo mbọ kụziere m eziokwu Baịbụl malite mgbe m dị obere. N’agbanyeghị na papa m bụ ezigbo mmadụ na ezigbo nna, o nwechaghị mmasị n’okpukpe ma ọ bụkwanụ n’ịkụziri m Okwu Chineke. Ọ bụ mama m na ụmụnna nọ n’Ọgbakọ Ọmaha gbara m ume ka m nọsie ike n’ọgbakọ.

OTÚ M SI KPEBIE IHE M GA-EJI NDỤ M MEE

Mgbe ọ fọrọ obere ka m pụta ụlọ akwụkwọ sekọndrị, m chọpụtara na m kwesịrị ikpebi ihe m ga-eji ndụ m mee. Mgbe ọ bụla anyị mechiri akwụkwọ n’oge ọkọchị, mụ na ụmụaka ibe m na-eje ozi ịsụ ụzọ oge ozuzu ike, nke a na-akpọzi ịsụ ụzọ inyeaka.

N’oge ahụ, e nwere ụmụnna nwoke abụọ ka gụchara akwụkwọ na klas nke asaa n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Aha ha bụ John Chimiklis na Ted Jaracz. A họpụtara ha ka ha bụrụ ndị nlekọta sekit n’ebe anyị bi. O juru m anya mgbe m matara na ha erubeghị afọ iri abụọ na ise. Adị m afọ iri na asatọ n’oge ahụ. M ga-apụta ụlọ akwụkwọ sekọndrị n’oge na-adịghị anya. M ka na-echeta otu ụbọchị Nwanna Chimiklis jụrụ m ihe m ga-eji  ndụ m mee. Mgbe m gwara ya, ọ sịrị m: “Ọ dị mma. Banye n’ozi oge niile. Ị maghị ebe o nwere ike ime ka i ruo.” Ihe ahụ ọ gwara m na àgwà ọma ha abụọ na-akpa masịrị m. N’ihi ya, mgbe m gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị, amalitere m ịsụ ụzọ n’afọ 1948.

OTÚ M SI BỊA BETEL

N’ọnwa asaa n’afọ 1950, mụ na papa m na mama m gara mgbakọ mba niile e mere n’Ámá Egwuregwu Yanki dị na Niu Yọk Siti. Ná mgbakọ ahụ, m gara nzukọ e nwere maka ndị chọrọ ịga Betel. Edere m akwụkwọ ozi kwuo na m chọrọ ije ozi na Betel.

Ọ bụ eziokwu na papa m anaghị ewe iwe na m bi n’ụlọ anyị na-asụ ụzọ, o chere na m kwesịrị ịna-ewetatụ ma ego a ga-eji na-akwụ ụgwọ ụlọ ma nke a ga-eji na-eri nri. N’ihi ya, n’ọnwa Ọgọst, e nwere otu ụbọchị m gawara ịchọ ọrụ. Ma, ebu m ụzọ gaa n’ebe anyị si enweta akwụkwọ ozi. Ahụrụ m akwụkwọ ozi e si Bruklin zitere m. Ọ bụ Nwanna Nathan H. Knorr bịanyere aka na ya. O dere, sị: “Anatala m akwụkwọ ozi i dere, nke gosiri na ị chọrọ ije ozi na Betel. Ama m na i kwetara na ị ga-eji ndụ gị niile jee ozi Betel. M chọrọ ka ị bịa Betel n’abalị asaa n’ọnwa Septemba afọ 1950. Ọ dị na nọmba 124 Kolọmbịa Haịts, Bruklin dị na Niu Yọk.”

Mgbe papa m lọtara ọrụ n’ụbọchị ahụ, agwara m ya na enwetala m ọrụ. Ọ sịrị m, “Ị gbalịala. Olee ebe ọ bụ?” Agwara m ya na ọ bụ na Betel dị na Bruklin, gwakwa ya na a ga na-enye m dọla iri n’ọnwa, (ya bụ, ihe dị ka otu puku naịra na narị naịra isii). O nyeghị ya ọnụ okwu. Ma, ọ gwara m na ọ bụrụ na ọ bụ ihe m kpebiri ịrụ, na m gbalịa rụọ ya nke ọma. Ọ dịghị anya, e mee ya baptizim ná mgbakọ e mere n’Ámá Egwuregwu Yanki n’afọ 1953.

Mụ na Alfred Nussrallah, onye mụ na ya sụkọrọ ụzọ

Onye mụ na ya sụkọrọ ụzọ bụ Alfred Nussrallah. Obi dị m ụtọ na a kpọkọrọ mụ na ya ka anyị bịa jewe ozi na Betel. Mụ na ya sokwa gaa. O mechara lụọ otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Joan, ha abụọ agaa Ụlọ Akwụkwọ Gilied, ghọọkwa ndị ozi ala ọzọ na Lebanọn. O mechakwara ghọọ onye nlekọta sekit n’Amerịka.

EBE NDỊ M RỤRỤ ỌRỤ NA BETEL

Mgbe m ruru Betel, ebe mbụ m rụrụ ọrụ bụ n’ebe a na-ekwe akwụkwọ. Akwụkwọ mbụ m so kwee bụ otu akwụkwọ kwuru gbasara ihe okpukpe meerela ndị mmadụ. Arụrụ m ọrụ ebe ahụ ọnwa asatọ, a gwazie m ka m gaa rụwa na Ngalaba Ije Ozi. N’oge ahụ, ọ bụ Nwanna Thomas J. Sullivan na-elekọta ngalaba ahụ. Ozi ọ na-ejere Jehova kemgbe ọtụtụ afọ mere ka o nwee amamihe na nghọta. Otú mụ na ya si rụkọọ ọrụ tọrọ m ụtọ, meekwa ka m mụta ọtụtụ ihe n’aka ya.

N’oge ahụ, ọ bụ Nwanna Max Larson na-elekọta ebe a na-ebi akwụkwọ. Mgbe ọ fọrọ obere ka m rụọ ọrụ afọ atọ na Ngalaba Ije Ozi, ọ gwara m na Nwanna Knorr chọrọ ịhụ m. M nọ na-eche ma ò nweela ihe ọjọọ m mere. Obi ruru m ala mgbe Nwanna Knorr gwara m na ya chọrọ ịma ma m̀ bu n’obi ịla Betel n’oge na-adịghị anya. Ọ na-achọ onye ya na ya ga na-arụ n’ọfis ya ruo obere oge. Ọ chọkwara ịma ma m̀ ga-emeli ya. Agwara m ya na ịla Betel abatabeghị m n’obi. O mechara bụrụ m ka ya na ya ga na-arụ n’ọfis ya. M rụrụ ọrụ ebe ahụ afọ iri abụọ.

Amụtara m ọtụtụ ihe n’aka ụmụnna mụ na ha rụkọrọ ọrụ na Betel, ma Nwanna Sullivan ma Nwanna Knorr, Milton Henschel, Klaus Jensen, Max Larson, Hugo Riemer, na Grant Suiter. * M na-agwakarị  ndị mmadụ na agaghị m akwụli ụgwọ ihe m mụtara n’aka ha.

Ụmụnna mụ na ha rụkọrọ ọrụ anaghị eme ghaa ghaa ghaa n’ọrụ ha na-arụrụ nzukọ Jehova. Ike anaghị agwụ Nwanna Knorr agwụ. Mkpa ya na-abụ ka ọrụ Alaeze Chineke na-aga aga. Obi na-eru ndị ha na ya na-arụ n’ọfis ala ma ha na ya na-ekwu okwu. Ọ bụrụgodị na otú anyị si lee ihe anya dị iche n’otú o si lee ya, anyị na-ekwu otú ọ dị anyị n’obi. Ọ naghị enyo anyị enyo.

E nwere mgbe Nwanna Knorr gwara m gbasara ihe ụfọdụ yiri ka ha abụghị oké ihe. Dị ka ihe atụ, ọ gwara m na mgbe ya na-elekọta ebe a na-ebi akwụkwọ, Nwanna Rutherford na-agwa ya na fon, sị: “Nwanna Knorr, wetara m nchicha ma ị bịawa iri nri ehihie. M chọrọ ndị nke m ga-eji na-arụ ọrụ.” Nwanna Knorr kwuru na ihe mbụ ya na-eme bụ ịga were ha n’ebe a na-edewe ha ma tinye ha n’akpa uwe ya. O ruzie n’ehihie, ya ewega ha n’ọfis Nwanna Rutherford. Ihe ahụ abụghị oké ihe, ma ọ dị Nwanna Rutherford ezigbo mkpa. Nwanna Knorr gwaziri m, sị: “M na-achọkarị ka pensụl a pịrị ọnụ ya apị na-adị na tebụl m. N’ihi ya, n’ụtụtụ ọ bụla, biko hụ na a pịrị ọnụ pensụl ndị dị n’ọfis m apị.” M mere otú ahụ ruo ọtụtụ afọ.

Nwanna Knorr na-agwakarị anyị ka anyị na-ege ntị nke ọma mgbe a na-agwa anyị ihe anyị ga-eme. O nwere otu ụbọchị ọ kọwachaara m ihe m ga-eme, ma egechaghị m ntị mgbe ọ na-akọwa ya. N’ihi ya, m mechara mee ihe mechuru ya ihu. O wutere m, mụ edeere ya obere akwụkwọ ozi gwa ya na ihe m mere wutere m nakwa na ọ ga-akara m mma ịga rụwa ọrụ n’ebe ọzọ. Nwanna Knorr mechara bịakwute m n’ụtụtụ ahụ, sị m: “Nwanna Robert, ahụla m akwụkwọ ozi i dere. I mejọrọ ihe, mụ agwa gị gbasara ya. M ma na ị ga-elezi anya mgbe ọzọ. Ka anyị gaa rụwa ọrụ.” Otú o si gbaghara m mere ka obi dị m ezigbo ụtọ.

MGBE M CHỌRỌ ỊLỤ NWAANYỊ

Mgbe m nọrọ afọ asatọ na Betel, o nweghị ihe m na-eche ma ọ́ bụghị ozi m na-eje na Betel. Ma, ihe mechara gbanwee. Mgbe e mere mgbakọ mba niile n’Ámá Egwuregwu Yanki nakwa na Polo Graụnds n’afọ 1958, ahụrụ m otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Lorraine Brookes. Mgbe mbụ mụ na ya hụrụ bụ n’afọ 1955, mgbe ọ na-asụ ụzọ na Mọntrịyọl dị na Kanada. Ihe ya masịrị m n’ihi na ọ naghị eji ozi oge niile egwu egwu. Ọ dịkwa njikere ịga ebe ọ bụla nzukọ Jehova nwere ike ịsị ya gaa. O bu n’obi ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilied. N’afọ 1956, mgbe ọ dị afọ iri abụọ na abụọ, a kpọrọ ya ka ọ gaa klas nke iri abụọ na asaa. Mgbe ọ gụchara, e zigara ya Brazil ka ọ gaa jewe ozi ala ọzọ. Mụ na ya malitere ịkpa n’afọ 1958, ya ekwetakwa ka anyị lụọ. Anyị bu n’obi na anyị ga-agba akwụkwọ n’afọ 1959 ma jewe ozi ala ọzọ.

Mgbe m kọọrọ ya Nwanna Knorr, ọ tụụrụ anyị  aro ka anyị chere afọ atọ. Anyị lụọ mgbe ahụ, anyị ejewe ozi na Betel dị na Bruklin. N’oge ahụ, ọ bụrụ na mmadụ abụọ chọrọ ịnọ na Betel ma ha lụchaa, otu n’ime ha ga-ejeru ozi afọ iri na Betel, onye nke ọzọ ejee ozi afọ atọ ma ọ dịkarịa ala. N’ihi ya, Lorraine kwetara na tupu anyị alụọ, ọ ga-eje ozi afọ abụọ na Betel dị na Brazil, jeekwa ozi otu afọ na Betel dị na Bruklin.

Mgbe mụ na ya kpebiri na anyị ga-alụ, ọ bụ naanị akwụkwọ ozi ka mụ na ya ji zirịta ozi afọ abụọ. N’oge ahụ, ịkpọ fon bụ aka eru ogbenye, ozi iimel apụtabeghịkwa. Anyị gbara akwụkwọ n’abalị iri na isii n’ọnwa itoolu, n’afọ 1961. Ọ bụ Nwanna Knorr kwuru okwu agbamakwụkwọ anyị. Nke bụ́ eziokwu bụ na afọ ole na ole ahụ anyị cheere dị anyị ka hà dị ezigbo anya. Ma ugbu a, anyị cheta obi ụtọ anyị na-enwe kemgbe ihe karịrị iri afọ ise anyị lụrụ, anyị na-ekweta na afọ ole ahụ anyị cheere efughị ọhịa.

Ihe a bụ ụbọchị anyị gbara akwụkwọ. Si n’aka ekpe: Nathan H. Knorr, Patricia Brookes (ọ bụ nwanne Lorraine), Lorraine na mụnwa, Curtis Johnson, Faye Wallen na Roy Wallen (ha bụ mama m na papa m)

ỌRỤ NDỊ M RỤRỤ NÁ NZUKỌ JEHOVA

N’afọ 1964, aghọrọ m onye nlekọta zoonu ma na-aga mba dị iche iche. N’oge ahụ, a naghị ekwe ka nwaanyị soro di ya gaa. Ihe gbanwere n’afọ 1977. Ọ na-abụzi onye gawa, ya na nwunye ya esoro. N’afọ ahụ, mụ na nwunye m so Nwanna Grant Suiter na Edith nwunye ya gaa leta alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Jamanị, Ọstria, Gris, Saịprọs, Tọki, na Izrel. Mba niile m garala dị ihe dị ka iri asaa.

E nwere nke anyị gara na Brazil n’afọ 1980. Otu n’ime ebe ndị anyị gara bụ otu obodo a na-akpọ Belém. Nwunye m bụbu onye ozi ala ọzọ n’ebe ahụ. Anyị gakwara leta ụmụnna bi na Manaụs. Anyị na ha nwere nnọkọ n’otu ámá egwuregwu. Oge a na-ekwu okwu, anyị hụrụ ụfọdụ ụmụnna ndị nọpụrụ iche. Na Brazil, otú ụmụ nwaanyị na-esi ekele ibe ha bụ isusu ha ọnụ na ntì, ụmụ nwoke na-ekwe ibe ha n’aka. Ma ụmụnna ndị ahụ emeghị otú ahụ. Gịnị kpatara ya?

Ha bụ ụmụnna anyị hụrụ n’anya. Ha si n’ebe ndị ekpenta bi n’ime ime oké ọhịa Amazọn bịa nnọkọ ahụ. Ha emeghị ihe ndị ọzọ mere n’ihi na ha achọghị ibunye ha ọrịa ahụ. Ma, ihe ha mere metụrụ anyị n’obi. Anyị agaghịkwa echefu otú ihu si bụrụ ha ọchị ọchị. Ihe ahụ Jehova si n’ọnụ Aịzaya kwuo bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Ndị ohu m ga-eti mkpu ọṅụ n’ihi na obi dị ha mma.”—Aịza. 65:14.

OTÚ NDỤ M SI BAA EZIGBO URU, CHINEKE AGỌZIEKWA M

Mụ na nwunye m na-echetakarị ihe karịrị iri afọ isii anyị jirila jeere Jehova ozi. Obi na-adị anyị ụtọ ma anyị cheta otú Jehova sirila gọzie anyị n’ihi na anyị kwere ka o jiri nzukọ ya na-eduzi anyị. Anaghị m aga eleta mba dị iche iche otú ahụ m na-emebu. Ma, m ka na-arụ ọrụ m kwa ụbọchị. Eso m ná ndị na-enyere Òtù Na-achị Isi aka. Ọ bụ ma Kọmitii Na-ahaziri Òtù Na-achị Isi Ọrụ ma Kọmitii Ije Ozi ka m na-enyere aka. Obi dị m ezigbo ụtọ maka obere ọrụ a m na-arụ. Esi m otú ahụ na-akwado ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile. Ọ bụ ezigbo ihe ùgwù. Kwa ụbọchị, ọ na-atụ anyị n’anya na ọtụtụ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa na-abanye n’ozi oge niile. Ha na-ekwu ihe ahụ Aịzaya kwuru. Ọ sịrị: “Lee m! Ziga m!” (Aịza. 6:8) Ihe a ụmụnna ndị a na-eme na-egosi na ihe ahụ onye nlekọta sekit gwara m kemgbe ọtụtụ afọ bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Banye n’ozi oge niile. Ị maghị ebe o nwere ike ime ka i ruo.”

^ para. 20 A kọrọ akụkọ ndụ ụfọdụ n’ime ha n’Ụlọ Nche: Thomas J. Sullivan (Ụlọ Nche Bekee, August 15, 1965); Klaus Jensen (Ụlọ Nche Bekee, October 15, 1969); Max Larson (Ụlọ Nche Igbo, September 1, 1989); Hugo Riemer (Ụlọ Nche Bekee, September 15, 1964); na Grant Suiter (Ụlọ Nche Igbo, March 1, 1984).