Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) EPREL 2014

Ṅomie Okwukwe Mozis

Ṅomie Okwukwe Mozis

“Mgbe Mozis tolitere, ọ bụ okwukwe ka o ji jụ ka a kpọọ ya nwa ada Fero.”HIB. 11:24.

1, 2. (a) Mgbe Mozis dị afọ iri anọ, gịnị ka o kpebiri ime? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị mere Mozis ji họrọ ka e megbukọta ya ndị Chineke?

MOZIS ma otú ihe ga-adịrị ya ma ọ nọrọ n’Ijipt. Ọ hụrụ nnukwute ụlọ ndị mara mma ndị ọgaranya rụrụ. E weere ya ka nwa adaeze. ‘A kụziiri ya ihe n’amamihe niile nke ndị Ijipt.’ O nwere ike ịbụ na a kụziiri ya ihe ndị gbasara nkà, asụsụ, ihe ndị dị na mbara igwe, mgbakọ na mwepụ, na ihe ndị ọzọ gbasara sayensị. (Ọrụ 7:22) Ọ garaghị esiri ya ike inwe ego, ikike, na ihe ùgwù ọtụtụ ndị Ijipt na-agaghị enwe.

2 N’agbanyeghị ihe a niile, mgbe Mozis dị afọ iri anọ, o kpebiri ime ihe nwere ike ịgba Fero na ndị ezinụlọ ya gharịị. Ọ jụrụ ihe ndị ahụ o nwere ike inweta n’Ijipt. Ma ọ̀ họọrọ ibi ndụ ka onye Ijipt na-esighị n’ezinụlọ eze? Mba. Ọ họọrọ iso ndị Izrel bụrụ ohu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na o nwere okwukwe. (Gụọ Ndị Hibru 11:24-26.) Okwukwe Mozis nwere mere ka ọ dị ka ọ̀ na-ahụ Jehova. O nwere okwukwe na Jehova, bụ́ “Onye a na-apụghị ịhụ anya,” nweekwa okwukwe na nkwa ya ga-emezu.—Hib. 11:27.

3. Olee ajụjụ atọ anyị ga-aza n’isiokwu a?

3 Anyị ekwesịghị ịna-ahụ naanị ihe a na-ahụ anya. Anyị kwesịrị ịbụ “ndị nwere okwukwe.” (Hib. 10:38, 39) Ka anyị tụlee ihe e dere gbasara Mozis ná Ndị Hibru 11:24-26 n’ihi na ọ ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. Ka anyị na-atụle ya, gbalịa zaa ajụjụ  ndị a: Olee otú okwukwe si mee ka Mozis ghara ime ihe anụ ahụ́ ya chọrọ? Mgbe e megidewere Mozis, olee otú okwukwe si nyere ya aka iji ozi Jehova kpọrọ ihe? Gịnị mere Mozis ji ‘legide anya n’ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ya’?

MOZIS JỤRỤ IME IHE ANỤ AHỤ́ YA CHỌRỌ

4. Gịnị ka Mozis ghọtara banyere “ụtọ mmehie”?

4 Okwukwe Mozis nwere mere ka ọ ghọta na “ụtọ mmehie” anaghị adịte aka. O nwere ike ịbụ na ndị ọzọ aghọtaghị ya otú ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ha ahụla na ọ bụ ndị Ijipt na-achị ụwa n’agbanyeghị na e ji ime mgbaasị na ife arụsị mara ha. Ma ndị ohu Jehova na-ata ahụhụ, na-agbakwa ohu. Mozis ma na Chineke nwere ike ime ka ihe gbanweere ndị ya. N’agbanyeghị na o yiri ka ihe ọ̀ na-agaziri ndị na-eme ihe anụ ahụ́ ha chọrọ, Mozis nwere okwukwe na a ga-ebibi ndị ajọ omume. Ọ bụ ya mere na o kweghị ka e jiri “ụtọ mmehie” rata ya, n’ihi na ọ na-adịru nwa oge.

5. Gịnị ka ị ga-eme ka a ghara iji “ụtọ mmehie” rata gị?

5 Gịnị ka ị ga-eme ka a ghara iji “ụtọ mmehie” rata gị? Echefula na ụtọ mmehie anaghị adịte aka. Okwukwe ga-eme ka ị ghọta na ‘ụwa na ọchịchọ ya na-agabiga.’ (1 Jọn 2:15-17) Cheta ihe ga-eme ndị mmehie na-ekweghị echegharị. Ha nọ “n’ala na-amị amị,” a ga-ebibikwa ha. (Ọma 73:18, 19) Ọ bụrụ na a nwaa gị ọnwụnwa, jụọ onwe gị, sị, ‘Olee otú m chọrọ ka ihe dịrị m?’

6. (a) Gịnị mere Mozis “ji jụ ka a kpọọ ya nwa ada Fero”? (b) Gịnị mere i ji chee na ihe ahụ Mozis mere dị mma?

6 Okwukwe Mozis nwere nyekwaara ya aka ikpebi ihe ọ ga-eji ndụ ya mee. “Mgbe Mozis tolitere, ọ bụ okwukwe ka o ji jụ ka a kpọọ ya nwa ada Fero.” (Hib. 11:24) Mozis echeghị na ya nwere ike ịnọ n’obí eze na-efe Chineke ma jiri ego ya na ikike ya nyere ụmụ Izrel ibe ya aka. Mozis kpebisiri ike na ya ga-eji obi ya dum, mkpụrụ obi ya dum, na ike ya dum hụ Jehova n’anya. (Diut. 6:5) Ihe a Mozis kpebiri ime mere ka ọ ghara ịta ahụhụ n’ọdịnihu. Ụmụ Izrel mechara nara ndị Ijipt ọtụtụ ihe ha nwere. (Ọpụ. 12:35, 36) E menyere Fero ihere, gbuokwa ya. (Ọma 136:15) Ma, o nweghị ihe mere Mozis. Chineke si n’aka ya duga ụmụ Izrel n’ebe ọkọ na-agaghị akọ ha. N’eziokwu, ndụ Mozis bara uru.

7. (a) Olee ihe e kwuru na Matiu 6:19-21 mere anyị ji kwesị ime ihe ga-abara anyị uru ruo mgbe ebighị ebi? (b) Olee otú ihe otu nwa agbọghọ mere si gosi na ime ihe ga-aba uru naanị ugbu a dị iche n’ime ihe ga-aba uru ruo mgbe ebighị ebi?

7 Ọ bụrụ na ị ka na-eto eto ma na-efe Jehova, olee otú okwukwe ga-esi nyere gị aka ịma ihe ị ga-eji ndụ gị mee? Ọ ga-adị mma ka i kpebie ihe ị ga-eme n’ọdịnihu. Nwee okwukwe ná nkwa Chineke. Kpatara onwe gị akụ̀ ga-adịru mgbe ebighị ebi, ọ bụghị akụ̀ ga-adịru nwa oge. (Gụọ Matiu 6:19-21.) Ọ bụ ya ka otu nwa agbọghọ aha ya bụ Sophie kpebiri ime. Ọ na-agba egwú nke ọma. N’ihi ya, òtù dị iche iche na-agba egwú n’Amerịka kwere nkwa na ha ga-azụ ya n’ụlọ akwụkwọ nakwa na ha ga-enye ya ọkwá a na-achọ achọ n’òtù egwú ha. Sophie kwuru, sị: “Otuto a na-enye m na-atọ m ụtọ. M chedịrị na m ka ndị ibe m mma. Ma, obi anaghị adị m mma.” O mechara lee vidio Bekee bụ́, Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị—Gịnị Ka M Ga-eji Ndụ M Mee? Mgbe o lechara ya, ọ sịrị: “M ghọtara na ụwa emeela ka a na-anụ aha m, ndị mmadụ ana-etokwa m. Ma, o mere ka m ghara iji obi m niile na-efe Jehova. M kpekusiri Jehova ekpere ike ma kwụsị ọrụ ịgba egwú.” Olee otú obi dị ya maka ihe a o mere? Ọ sịrị: “M naghị akwa mmakwaara. Obi dị m ezigbo ụtọ ugbu a. Mụ na di m na-asụ ụzọ. Anyị abụghị ndị a ma ama, anyị abụghịkwa ndị aka ji akụ̀. Ma anyị nwere Jehova, nwee ndị anyị na-amụrụ Baịbụl, nweekwa  ihe ndị anyị kpebiri imekwu n’ozi Jehova. M naghị akwa ụta.”

8. Olee ihe Baịbụl kwuru nke ga-enyere onye na-eto eto aka ikpebi ihe ọ ga-eji ndụ ya mee?

8 Jehova ma ihe ga-akacha baara gị uru. Mozis sịrị: “Gịnị ka Jehova bụ́ Chineke gị na-achọ n’aka gị ma ọ́ bụghị ịtụ egwu Jehova bụ́ Chineke gị, ka i wee jee ije n’ụzọ ya niile nakwa ka ị hụ ya n’anya ma jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na-ejere Jehova bụ́ Chineke gị ozi; ka i debe iwu Jehova na ụkpụrụ ya ndị m na-enye gị taa, maka ọdịmma gị?” (Diut. 10:12, 13) Ugbu a ị ka na-eto eto, họrọ ọrụ ga-ekwe ka i jiri “obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum” hụ Jehova n’anya ma na-ejere ya ozi. I mee otú ahụ, obi kwesịrị isi gị ike na ọ ga-abara gị uru.

MOZIS JI OZI Ọ NA-EJERE JEHOVA KPỌRỌ IHE

9. Gịnị mere ozi Jehova dunyere Mozis nwere ike iji siere ya ike?

9 Ndị Hibru 11:26 kwuru na Mozis “weere nkọcha nke Kraịst dị ka akụ̀ dị ukwuu karịa akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa nke Ijipt.” N’amaokwu a, a kpọrọ Mozis “Kraịst,” ya bụ, “Onye E Tere Mmanụ.” Ihe ọ pụtara bụ na Jehova họpụtara ya ka ọ kpọpụta ụmụ Izrel n’Ijipt. Mozis ma na ime ihe a Jehova chọrọ ka o mee ga-esiri ya ike. Ọ ga-emedị ka a ‘kọchaa’ ya. O nwedịrị mgbe onye Izrel kwara ya emo ma jụọ ya, sị: “Ònye mere gị onye na-achị anyị na onyeikpe anyị?” (Ọpụ. 2:13, 14) Mozis mechara jụọ Jehova, sị: “Olee otú Fero ga-esi getụdị m ntị?” (Ọpụ. 6:12) Mozis gwara Jehova ihe bụ́ ụjọ ya na ihe na-enye ya nsogbu n’obi. O si otú a jikere maka mmegide a ga-emegide ya. Olee otú Jehova si nyere Mozis aka, ya ejee ozi siri ike o dunyere ya?

10. Gịnị ka Jehova mere ka Mozis nwee ike ije ozi o dunyere ya?

10 Ihe mbụ Jehova mere bụ ịgwa Mozis na ya ‘ga-anọnyere ya.’ (Ọpụ. 3:12) Nke abụọ abụrụ na o mere ka obi sie Mozis ike. Otú o si mee ya bụ na ọ gwara ya otu n’ime ihe aha ya pụtara, ya bụ, “M Ga-abụ Ihe M Chọrọ Ịbụ.” * (Ọpụ. 3:14) Nke atọ, Jehova nyere Mozis ike ọ ga-eji rụọ ọrụ ebube ga-egosi na ọ bụ ya dunyere ya. (Ọpụ. 4:2-5) Ihe nke anọ Jehova mere bụ na ọ gwara Mozis na Erọn ga na-ekwuchite ọnụ ya ma nyere ya aka ije ozi ya. (Ọpụ. 4:14-16) Mgbe ọ fọrọ obere ka Mozis nwụọ, obi siri ya ike na Jehova na-enyere ndị na-efe ya aka ije ozi ọ bụla o dunyere ha. Ọ bụ ya mere o ji gwa Jọshụa, bụ́ onye nọchiri ya, sị: “Ọ bụ Jehova na-eje ije n’ihu gị. Ya onwe ya ga-anọnyere gị. Ọ gaghị agbahapụ gị, ọ gaghịkwa ahapụ gị ma ọlị. Atụla egwu, atụkwala ụjọ.”—Diut. 31:8.

11. Olee ihe mere Mozis ji jiri ozi ya kpọrọ ihe?

11 Jehova nyeere Mozis aka, ya ejiri ọrụ tara akpụ e nyere ya kpọrọ ihe. O weere ya ka ihe bara uru “karịa akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa nke Ijipt.” Ijere Fero ozi enweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere ijere Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile ozi. O nweghịkwa otú a ga-esi jiri ịbụ nwa eze Ijipt tụnyere ịbụ onye Jehova họọrọ idu ụmụ Izrel. Jehova gọziri Mozis maka ijere ya ozi. Ya na Jehova dị n’ezigbo mma. Jehova nyekwaara ya aka, ya arụọ ‘ọrụ dị ike’ ka o nwee ike iduru ụmụ Izrel gawa n’Ala Nkwa ahụ.—Diut. 34:10-12.

12. Olee ihe ùgwù ụfọdụ Jehova nyere anyị?

12 Jehova dunyekwara anyị ozi. O si n’aka Ọkpara ya kenye anyị ozi anyị ga-eje, otú ahụ o kenyere Pọl onyeozi na ndị ọzọ. (Gụọ 1 Timoti 1:12-14.) Ikwusa ozi ọma bụ ihe ùgwù e nyere anyị niile. (Mat. 24:14; 28:19, 20) E nwere ndị ozi oge niile. A họpụtakwara ụmụnna ruru eru ka ha bụrụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi n’ọgbakọ. Ma, ndị ezinụlọ gị na-abụghị Ndịàmà Jehova nwere ike ikwu na ihe ùgwù ndị a  abaghị uru ma ọ bụkwanụ na-akatọ gị maka na i wepụtara onwe gị na-ejere Jehova ozi. (Mat. 10:34-37) Ọ bụrụ na ha emee ka ị daa mbà, i nwere ike malite iche na mbọ ị na-agba n’ozi Jehova enweghị isi ma ọ bụkwanụ na ị gaghị ejeli ozi ahụ. Ọ bụrụ na ihe dị otú a emee gị, olee otú okwukwe ga-esi nyere gị aka ịnọsi ike n’ozi Jehova?

13. Olee ụzọ dị iche iche Jehova si enyere anyị aka ịrụ ọrụ ndị o nyere anyị?

13 Rịọ Jehova ka o nyere gị aka. Nweekwa okwukwe na ọ ga-aza ekpere gị. Gwa ya ihe bụ́ ụjọ gị na ihe na-enye gị nsogbu n’obi. A sị ka e kwuwe, ọ bụ Jehova nyere gị ọrụ ahụ, ọ ga-enyekwara gị aka ka ị rụọ ya nke ọma. Olee otú ọ ga-esi eme ya? Ọ bụ otú ahụ o si nyere Mozis aka. Nke mbụ, Jehova kwere gị nkwa, sị: “M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyere gị aka. M ga-eji aka nri m nke ezi omume jidesie gị ike.” (Aịza. 41:10) Nke abụọ, ọ na-echetara gị na i kwesịrị ịtụkwasị ya obi na ọ ga-emezu nkwa ya. Ọ sịrị: “Ekwuwo m ya; m ga-emekwa ka o mezuo. Akpụwo m ya, m ga-emekwa ya.” (Aịza. 46:11) Nke atọ, Jehova na-enye gị “ike karịrị ike nkịtị” ka i nwee ike na-ejere ya ozi. (2 Kọr. 4:7) Nke anọ, Jehova mere ka i nwee ụmụnna n’ụwa niile, bụ́ ndị ‘na-akasirịta ibe ha obi ma na-ewulirịta ibe ha elu.’ Jehova si otú a na-enyere gị aka ka ị ghara ịkwụsị ijere ya ozi. (1 Tesa. 5:11) Mgbe ọ bụla Jehova nyeere gị aka ịna-ejere ya ozi, okwukwe i nwere na ya na-esikwu ike. Ọ ga-emekwa ka ị ghọta na ihe ùgwù ndị o nyere gị karịrị ihe ọ bụla i nwere ike inweta n’ụwa.

MOZIS “LEGIDERE ANYA N’ỤGWỌ ỌRỤ A GA-AKWỤ YA”

14. Gịnị mere obi ji sie Mozis ike na Jehova ga-akwụ ya ụgwọ ọrụ?

14 Mozis “legidere anya n’ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ya.” (Hib. 11:26) Ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ ihe Mozis na-amachaghị otú ha ga-esi mezuo, o ji obere ihe ọ ma kpebie ihe ndị ọ ga-eme. Obi siri Mozis ike otú ahụ o siri nna nna ya Ebreham na Jehova ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Luk 20:37, 38; Hib. 11:17-19) Ebe ọ bụ na Mozis ma na Jehova ga-emezu nkwa ndị o kwere, o wereghị afọ iri anọ o ji gbaa ọsọ ndụ na afọ iri anọ ọ nọrọ n’ala ịkpa ka ihe lara n’iyi. N’agbanyeghị na ọ machaghị otú Jehova ga-esi emezu nkwa niile o kwere, o kwetasiri ike na Jehova ga-emezu ha. Otú okwukwe ya si sie ike mere ka ọ dị ya ka ọ̀ na-ahụ ụgwọ ọrụ ya.

15, 16. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị ime ka uche anyị dịrị n’ụgwọ ọrụ a ga-akwụ anyị? (b) Olee ihe ọma ndị ị na-atụsi anya ike inweta n’ụwa ọhụrụ?

 15 Ị̀ ‘na-elegide anya n’ụgwọ ọrụ a ga-akwụ gị’? Otú ahụ Mozis na-amaghị otú Chineke ga-esi emezu ihe niile o kwere ná nkwa bụkwa otú anyị na-amaghị. Dị ka ihe atụ, anyị “amaghị mgbe” oké mkpagbu ga-amalite. (Mak 13:32, 33) Ma, ihe anyị ma banyere Paradaịs na-abịanụ karịrị ihe Mozis ma. N’agbanyeghị na Chineke agwaghị anyị ihe niile, nkwa o kwere anyị banyere otú ụwa ga-adị mgbe Alaeze ya ga na-achị kwesịrị ime ka anyị ‘legide’ anya na ya. Ọ bụrụ na uche anyị adịrị n’ụwa ọhụrụ, ọ ga-eme ka anyị buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. N’ihi gịnị? Chegodị echiche: Ị̀ ga-azụ ụlọ ma ọ bụrụ na o nweghị ezigbo ihe ị ma gbasara ya? Mba. Otú ahụ ka ọ dị anyị. Anyị agaghị eji ndụ anyị na-achụ ihe na-edoghị anyị anya. Okwukwe anyị kwesịrị ime ka anyị ghọta otú ndụ anyị ga-adị mgbe Alaeze Chineke ga na-achị ụwa.

Obi ga-atọ anyị ezigbo ụtọ ma anyị na Mozis na ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi kwurịta okwu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

16 Ka i nwee ike ịhụ otú ụwa ọhụrụ ga-adị nke ọma, i kwesịrị iche otú ndụ gị ga-adị na Paradaịs. Dị ka ihe atụ, mgbe ị mụrụ banyere ndị Baịbụl kọrọ akụkọ ha dịrị ndụ tupu Jizọs abịa n’ụwa, chee banyere ajụjụ i nwere ike ịjụ ha mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ. Chegodị ajụjụ ha nwere ike ịjụ gị banyere otú i si bie ndụ gị n’oge ikpeazụ. Chee otú obi ga-esi tọọ gị ụtọ mgbe ị ga-ahụ nna nna gị hà nwụrụ kemgbe ma kụziere ha ihe niile Chineke meere ha. N’oge a ga-enwe udo n’ụwa, chegodị ụdị obi ụtọ ị ga-enwe mgbe ị ga na-ahụ anụ ọhịa dị iche iche ma na-amụ banyere ha. Cheekwa otú gị na Jehova ga-esi na-adịkwu ná mma ka i ji nwayọọ nwayọọ na-ezu okè.

17. Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị buru ụgwọ ọrụ Chineke ga-enye anyị n’obi?

17 Ọ bụrụ na anyị eburu ụgwọ ọrụ Chineke ga-enye anyị n’obi, ọ ga-eme ka anyị na-atachi obi, na-enwe ọṅụ ma na-eme ihe gosiri na anyị na-atụ anya ịdị ndụ ebighị ebi. Pọl degaara Ndị Kraịst e tere mmanụ akwụkwọ, sị: “Ọ bụrụ na anyị nwere olileanya maka ihe anyị na-adịghị ahụ anya, anyị na-eji ntachi obi echere ya.” (Rom 8:25) Ma, ọ bụghị naanị ndị e tere mmanụ ka ihe a Pọl kwuru gbasara. Ọ gbasara Ndị Kraịst niile nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Ọ bụ eziokwu na anyị enwetabeghị ụgwọ ọrụ anyị, okwukwe anyị siri ezigbo ike. Ọ bụ ya mere anyị ji nwee ndidi ma na-echere ‘ụgwọ ọrụ a ga-akwụ anyị.’ Anyị na-eme ka Mozis. Anyị anaghị ewere afọ ndị anyị ji jeere Jehova ozi ka ihe lara n’iyi. Obi siri anyị ike na “ihe a na-ahụ anya na-adịru nwa oge, ma ihe a na-adịghị ahụ anya na-adịru mgbe ebighị ebi.”—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 4:16-18.

18, 19. (a) Gịnị mere anyị kwesịrị iji gbasie mbọ ike ka okwukwe anyị ghara ịnyụ ka ọkụ? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

18 Okwukwe na-eme ka anyị hụ “ihe àmà doro anya na ihe ndị a na-adịghị ahụ anya dị adị n’ezie.” (Hib. 11:1) Onye anụ ahụ́ na-achị enweghị okwukwe. N’ihi ya, ọ maghị na ijere Jehova ozi bara ezigbo uru. Ọ na-ewere ya ka “ihe nzuzu.” (1 Kọr. 2:14) Ma, anyị na-atụ anya ịdị ndụ ebighị ebi na ịhụ mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ndị ụwa anadịghị eche ihe ndị a n’echiche. Ụfọdụ ndị kpọrọ Pọl “onye ekwurekwu.” Ọ bụkwa otú ahụ ka ọtụtụ ndị taa si chee na ihe anyị na-ekwusa bụ ihe nzuzu.—Ọrụ 17:18.

19 Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị enweghị okwukwe, anyị kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike ka okwukwe anyị ghara ịnyụ ka ọkụ. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ‘ka okwukwe gị ghara ịda mbà.’ (Luk 22:32) Na-echeta nsogbu ime mmehie ga-akpatara gị, ihe ùgwù i nwere ijere Jehova ozi, na olileanya i nwere ịdị ndụ ebighị ebi. Ọ̀ gwụla ihe ndị a ka anyị mụtara n’aka Mozis? Mba. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle otú okwukwe Mozis si nyere ya aka ịhụ “Onye a na-apụghị ịhụ anya.”—Hib. 11:27.

^ para. 10 Otu onye na-akọwa Baịbụl dere gbasara Ọpụpụ 3:14, sị: ‘O nweghị ihe ga-eme ka Jehova ghara imezu uche ya. Aha ya bụụrụ ụmụ Izrel ebe e wusiri ike.’ Ọ ga-eme ka ha nwee olileanya, kasiekwa ha obi.