Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) EPREL 2014

Obi Ọ̀ Dị Gị Ụtọ na Jehova Na-eleru Gị Anya?

Obi Ọ̀ Dị Gị Ụtọ na Jehova Na-eleru Gị Anya?

“Anya Jehova dị n’ebe niile, na-elegide ndị ọjọọ na ndị ọma.”—ILU 15:3.

1, 2. Olee ihe dị iche n’onyokomita na otú Jehova si eleru anyị anya?

N’ỌTỤTỤ mba, a na-etinye onyokomita n’okporo ụzọ ka e jiri ya na-enyota ụgbọala ndị na-agbafe. Ihe mberede mee, a na-eji ya amata otú o si mee. E nwee ọkwọ ụgbọala kụturu mmadụ gbaa ọsọ, onyokomita ahụ na-enyota ya. Ọ na-enyere ndị uwe ojii aka ịmata ọkwọ ụgbọala ahụ ma nwụchie ya. Onyokomita e tinyechara aghara aghara na-eme ka ọ dị mfe ijide ndị mere ihe ọjọọ, taa ha ahụhụ.

2 Baịbụl kwuru na “anya Jehova dị n’ebe niile.” (Ilu 15:3) Ma, ọ̀ pụtara na ihe mere Jehova ji na-ele anyị bụ naanị ka ọ mara ma ànyị adaala iwu ya? Jehova ò chebiiri anyị ka ọ taa anyị ahụhụ ozugbo anyị mejọrọ ihe? Mba. (Jere. 16:17; Hib. 4:13) Ihe mere Jehova ji eleru anyị anya bụ na ọ hụrụ anyị n’anya, chọọkwa ka ihe gaara anyị nke ọma.—1 Pita 3:12.

3. Olee ụzọ ise Jehova si eleru anyị anya?

3 Olee otú anyị ga-esi ghọtakwuo na Chineke hụrụ anyị n’anya? Ka anyị tụlee ụzọ ise Jehova si eleru anyị anya. (1) Ọ na-adọ anyị aka ná ntị tupu anyị emee ihe ọjọọ. (2) Ọ na-abara anyị mba ma anyị mee ihe na-adịghị mma.  (3) Ọ na-eji ihe Baịbụl kwuru eduzi anyị. (4) Ọ na-enyere anyị aka ma ọnwụnwa bịara anyị. (5) Ọ na-agọzi anyị ma anyị mee ihe dị mma.

JEHOVA NA-EBU ỤZỌ ADỌ ANYỊ AKA NÁ NTỊ

4. Gịnị mere Chineke ji dọọ Ken aka ná ntị tupu ya emehie?

4 Ka anyị buru ụzọ tụlee otú Jehova si adọ anyị aka ná ntị tupu anyị emee ihe ọjọọ. (1 Ihe 28:9) Dị ka ihe atụ, Ken were “iwe dị ọkụ” mgbe Jehova na-anabataghị onyinye ya. (Gụọ Jenesis 4:3-7.) Jehova gwara Ken ka ọ “gbanwee mewe ezi ihe.” Jehova gwara ya na ọ bụrụ na ọ gbanweghị, “mmehie makpu n’ọnụ ụzọ” na-achọ inweta ya. Chineke jụrụ ya, sị: “Ị̀ ga-emeri ya?” Jehova chọrọ ka Ken nabata ndụmọdụ o nyere ya ka e nwee ike ‘bulie ya elu.’ A sị na Ken gere Chineke ntị, ya na ya ga na-adị ná mma.

5. Olee ụzọ dị iche iche Jehova si adọ anyị aka ná ntị?

5 Anyịnwa kwanụ? Jehova na-enyocha obi anyị. Ọ maara ihe ndị anyị na-eche na ihe ndị na-agụ anyị. O nweghị ihe anyị ga-ezoliri ya. Ọ hụrụ anyị n’anya, chọọkwa ka anyị mee ihe dị mma. Ma, ọ naghị amanye anyị amanye ime ya. Ọ hụ ihe na-adịghị mma anyị chọrọ ime, ọ na-adọ anyị aka ná ntị. Olee otú o si eme ya? Ọ bụrụ na anyị ana-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, anyị na-agụtakarị ebe ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ime ihe na-adịghị mma anyị chọrọ ime. Akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl nwekwara ike ikwu gbasara nsogbu anyị na ya na-alụ ma gwa anyị otú anyị nwere ike isi merie ya. Anyị gaa ọmụmụ ihe, a na-enye anyị ndụmọdụ ga-abara anyị uru.

6, 7. (a) Olee ihe gosiri na Jehova hụrụ onye nke ọ bụla na-efe ya n’anya? (b) Olee ihe anyị ga-eme ka aka ná ntị Jehova na-adọ anyị baara anyị uru?

6 Ndụmọdụ niile dị na Baịbụl gosiri na Jehova hụrụ onye ọ bụla n’ime anyị n’anya. E dere Baịbụl ọtụtụ narị afọ gara aga. E dekwara akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl maka ọtụtụ nde mmadụ. Ọ bụkwa mmadụ niile nọ n’ọgbakọ ka e bu n’obi na-enye ndụmọdụ ndị a na-enye n’ọmụmụ ihe. Ma, Jehova chọrọ ka gịnwa gee ntị n’Okwu ya ka i nwee ike ime ihe ziri ezi. Jehova si otú a na-egosi na ya hụrụ gị n’anya.

Ọ bụrụ na anyị ejiri Baịbụl zụọ akọnuche anyị, ọ ga-eme ka anyị gbaara nsogbu ọsọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6 na nke 7)

7 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka aka ná ntị Chineke na-adọ anyị baara anyị uru, ihe mbụ anyị ga-eme bụ ịghọta na ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi. Ihe ọzọ anyị ga-eme abụrụ ime ihe Baịbụl kwuru, gbasie mbọ ike kwụsị iche ihe na-adịghị Chineke mma. (Gụọ Aịzaya 55:6, 7.) Ọ bụrụ na anyị emee ihe Chineke gwara anyị, anyị agaghị eme ihe ga-agbawa anyị obi. Ọ́ bụrụkwanụ na anyị egeghị Chineke ntị? Olee otú Jehova ga-esi gosi na ya ka hụrụ anyị n’anya?

JEHOVA NA-ABARA ANYỊ MBA N’IHI NA Ọ HỤRỤ ANYỊ N’ANYA

8, 9. Ọ bụrụ na mmadụ ejiri Baịbụl nye anyị ndụmọdụ, olee otú o si gosi na Jehova hụrụ anyị n’anya? Nye ihe atụ.

8 Ọ bụrụ na Jehova abaara anyị mba, ọ pụtara na ọ hụrụ anyị n’anya. (Gụọ Ndị Hibru 12:5, 6.) Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ naghị atọ anyị ụtọ ma a baara anyị mba ma ọ bụ dọọ anyị aka ná ntị. (Hib. 12:11) Ma, ọ bụrụ na mmadụ ejiri Baịbụl nye anyị ndụmọdụ, ọ dị ezigbo mkpa ka anyị ghọta ihe mere o ji nye anyị ya. Ọ bụghị ka ọ kpasuo anyị iwe, kama ọ bụ ka anyị ghara ime ihe ga-eme ka anyị na Jehova  ghara ịdị ná mma. Onye ahụ wepụtara oge ya ma gbalịa iji Baịbụl gosi anyị otú anyị ga-esi mee ihe dị Jehova mma. Anyị kwesịrị iji ndụmọdụ ahụ kpọrọ ihe n’ihi na o si n’aka Jehova.

9 Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna nwoke na-ele ndị gba ọtọ tupu ya abata n’ọgbakọ. Mgbe ọ batara n’ọgbakọ, ọ kwụsịrị ile ya. Ka oge na-aga, ọ zụrụ ekwentị, jiri ya na-aga n’Ịntanet ele ndị gba ọtọ. (Jems 1:14, 15) Ihe a gosiri na àgwà ọjọọ ahụ ka dị ya n’obi, na-ere ka icheku ọkụ. Otu ụbọchị, o nyere otu okenye ekwentị ya, ebe a na-egosi ndị gba ọtọ apụta na ya. Ihe a nwanna ahụ na-ele ga-eme ka ya na Jehova ghara ịdị ná mma. N’ihi ya, okenye ahụ nyere ya ndụmọdụ ozugbo, ya egee ntị ma kwụsị ile ndị gba ọtọ. Jehova na-ahụ mmehie anyị na-eme na nzuzo. O nwekwara ike ịbara anyị mba tupu ihe emebichaa. Obi dị anyị ụtọ na Jehova na-eleru anyị anya.

IME IHE BAỊBỤL KWURU NA-ABARA ANYỊ URU

10, 11. (a) Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị ma Jehova? (b) Olee otú otu ezinụlọ si ghọta na ime ihe Jehova kwuru na-aba uru?

10 Otu ọbụ abụ gwara Jehova, sị: “Ị ga-eji ndụmọdụ gị na-edu m.” (Ọma 73:24) Mgbe ọ bụla anyị chọrọ onye ga-enye anyị ndụmọdụ, anyị kwesịrị ịga na Baịbụl mata ihe Jehova chọrọ ka anyị mee. Anyị ga-esi otú ahụ gosi na anyị ma Jehova. Ime ihe Baịbụl kwuru ga-eme ka anyị na Jehova dị ná mma. Mgbe ụfọdụ, ọ na-enyere anyị aka igbo mkpa anyị na ezinụlọ anyị.—Ilu 3:6.

11 Dị ka ihe atụ, na Filipinz, e nwere otu nwanna nwere ezinụlọ buru ibu. Ha niile bi n’ebe e nyere ha ka ha na-akọ ugbo. Ọ na-akwụkwa onye nwe ebe ahụ ụgwọ. Nwanna a na nwunye ya bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Otu ụbọchị, onye nwe ebe ahụ ha bi nyere ha akwụkwọ ka ha kwapụ. Ihe a merenụ juru ha anya. Ha mechara chọpụta na e nwere onye boro ha ebubo na ha anaghị akwụwa aka ọtọ. Nwanna ahụ malitere iche ebe ọ ga-akpọ ezinụlọ ya gaa. Ma ọ tụkwasịrị Jehova obi. Ọ sịrị: “Jehova ga-eme ka anyị nweta ebe anyị ga-ebi. Ọ na-egboro anyị mkpa anyị mgbe niile n’agbanyeghị ihe merenụ.” Nwanna a na ndị ezinụlọ ya mere  ihe Baịbụl kwuru. N’agbanyeghị na e boro ha ebubo ụgha, o nweghị onye ha kparịrị ma ọ bụ sesa okwu. Mgbe ụbọchị ole na ole gachara, onye nwe ebe ahụ ha bi gwara ha akwapụzila. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na obi dị ya ụtọ maka otú ha si kpaa àgwà mgbe e boro ha ebubo. O nyekwudịrị ha ala ebe ha ga na-arụ ọrụ ubi. (Gụọ 1 Pita 2:12.) N’eziokwu, anyị mee ihe Baịbụl kwuru, Jehova ga-enyere anyị aka imeri nsogbu anyị nwere.

JEHOVA BỤ ENYI NA-ENYERE ANYỊ AKA MA ỌNWỤNWA BỊARA ANYỊ

12, 13. Olee ihe ndị nwere ike ime ka ụfọdụ ndị chee na Chineke anaghị ahụ ahụhụ ha na-ata?

12 Ebe ọ bụ na anyị na-efe Jehova, ọtụtụ ọnwụnwa na-abịara anyị. Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịnọte aka. O nwere ike ịbụ ọrịa, mkpagbu, ma ọ bụ na ndị ezinụlọ anyị na-emegide anyị. Anyị na nwanna nwekwara ike nwee ezigbo nghọtahie n’ihi na otú o si eme ihe dị iche n’otú anyị si eme.

13 Dị ka ihe atụ, nwanna nwere ike ikwu ihe were gị ezigbo iwe. I nwere ike ikwu, sị: ‘Ụdị ihe a ekwesịghị ime ná nzukọ Jehova.’ Ka a na-eme ka a na-eme, e nyekwuo nwanna ahụ ihe ùgwù, ndị nọ n’ọgbakọ wekwaara ya ka ezigbo mmadụ. I nwere ike ịna-ajụ, sị: ‘Olee otú ụdị ihe a ga-esi eme? Jehova ọ̀ na-ahụkwa ihe a na-emenụ? Ọ̀ ga-agba nkịtị?’—Ọma 13:1, 2; Hab. 1:2, 3.

14. Gịnị nwere ike ime ka Jehova gba nkịtị ka ụmụnna anyị nye anyị ndụmọdụ nwere ike iwe anyị iwe?

14 O nwere ike ịbụ na Jehova nwere ezigbo ihe mere o ji gba nkịtị. Dị ka ihe atụ, mmadụ nwere ike inye anyị ndụmọdụ, anyị echee na o nweghị ihe anyị mere, ezigbo iwe ewee anyị. Ma, o nwere ike ịbụ na Chineke ewereghị ya otú ahụ. Ndụmọdụ ahụ e nyere anyị nwere ike ịbụ ihe e kwesịrị inye anyị, nke anyị kwesịkwara ichebara echiche. E nwere otu nwanna sobu n’Òtù Na-achị Isi. Aha ya bụ Karl Klein. N’akụkọ ndụ ya, o kwuru na e nwere mgbe Nwanna Rutherford nyere ya ndụmọdụ n’ezoghị ọnụ. N’oge ọzọ, Nwanna Rutherford hụrụ ya, jiri obi ụtọ kelee ya, ma o nyeghị ya ihu. Nwanna Rutherford chọpụtara na ndụmọdụ ahụ o nyere ya ka na-ewe ya iwe, ya agwa ya, sị: “Kpachara anya. Ekwensu na-achọ inweta gị.” Ihe a ọ gwara Nwanna Klein baara ya uru. Nwanna Klein mechara kwuo na ya mụtara na ụmụnna anyị kwesịrị inye anyị ndụmọdụ nakwa na ọ bụrụ na anyị akpọ ha asị maka ndụmọdụ ha nyere anyị, Ekwensu ga-enweta anyị. *

15. Olee ihe anyị kwesịrị icheta ma ọnwụnwa bịara anyị?

15 Ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara anyị, anyị na-achọ ka o bie ngwa ngwa. Ma, anyị kwesịrị ịmụta inwe ndidi. Ka e were ya na ị gara ịkwọ ọka, ya abụrụ na ndị bịara ịkwọ ọka karịrị akarị. Ị makwanụghị oge ọ ga-eruru gị. Ọ bụrụ na i wee iwe buru ọka gị gaa ebe ọzọ, i nwere ike ịchọpụta na ndị bịara ịkwọ ọka n’ebe ahụ ka ndị nọ n’ebe mbụ ahụ ị gara. O nwere ike iwe ezigbo oge tupu a kwọọrọ gị nke gị. Ma, ọ bụrụ na i nwere ndidi nọrọ n’ebe mbụ ahụ ị gara, e nwere ike ịkwọrọ gị ya ngwa ngwa karịa ebe ọzọ ahụ i bu ya gaa. Otú ahụ ka ọ dị anyị. Ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara anyị, anyị enwee ndidi ma mee ihe Baịbụl kwuru, Jehova ga-enyere anyị aka idi ya.

16. Gịnị mere Jehova nwere ike iji kwe ka ọnwụnwa bịara anyị?

 16 Jehova nwere ike ikwe ka ọnwụnwa bịara anyị n’ihi na ọ chọrọ ka anyị si na ya mụta ihe. (Gụọ 1 Pita 5:6-10.) Ma, ọ bụghị Chineke na-eme ka ọnwụnwa bịara anyị. (Jems 1:13) Ọ bụ ‘Onye mmegide anyị, bụ́ Ekwensu,’ na-akpata ọtụtụ nsogbu anyị nwere. Ma, anyị kwesịrị ịghọta na Jehova na-ahụ ahụhụ niile anyị na-ata, ọ hụkwara anyị n’anya. Ọ gaghị ekwe ka nsogbu ndị anyị nwere dịruo mgbe ebighị ebi. Ha ga-adịru “nwa oge.” Ka obi sie gị ike na ihe banyere gị na-emetụ Jehova n’obi nakwa na ọ ga-enye gị ike ị ga-eji tachie obi ruo ọgwụgwụ.—2 Kọr. 4:7-9.

JEHOVA GA-AGỌZI GỊ

17. Gịnị mere Jehova ji enyocha obi mmadụ niile?

17 Jehova na-enyocha obi mmadụ niile ka ọ mara ndị hụrụ ya n’anya. Hanenaị onye amụma gwara Eze Esa, sị: “Anya Jehova na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.” (2 Ihe 16:9) Esa atụkwasịghị Chineke obi ya niile. Ma, Chineke ‘ga-egosi ike ya’ n’ebe ị nọ ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe ziri ezi.

18. Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na Jehova ga-agọzi anyị ma anyị na-eme ezi ihe? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

18 Chineke chọrọ ka anyị ‘chọọ ezi ihe,’ ‘hụ ezi ihe n’anya’ ma ‘mee ezi ihe.’ Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, ọ ‘ga-emere anyị amara.’ (Emọs 5:14, 15; 1 Pita 3:11, 12) Jehova na-ahụ ndị ezi omume, ọ na-agọzikwa ha. (Ọma 34:15) Dị ka ihe atụ, e nwere ụmụ nwaanyị Hibru abụọ na-aghọ́ nwa. Aha ha bụ Shifra na Pua. Fero nyere ha iwu ka ha gbuo nwa nwoke ọ bụla nwaanyị Hibru mụrụ ozugbo a mụrụ ya. Ụmụ nwaanyị abụọ a mere ihe Chineke chọrọ, ọ bụghị ihe Fero kwuru. Ha ekweghị egbu ụmụ ndị Hibru. Jehova hụrụ ihe ọma Shifra na Pua mere ma mee ka ha nwee ụmụ nke ha. (Ọpụ. 1:15-17, 20, 21) Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị anyị ka o nweghị onye na-ahụ ihe ọma anyị na-eme. Ma, Jehova na-ahụ ha niile. Ọ ga-agọzikwa anyị.—Mat. 6:4, 6; 1 Tim. 5:25; Hib. 6:10.

19. Olee otú otu nwanna nwaanyị si mata na Jehova na-ahụ ihe ọma ọ na-eme?

19 E nwere otu nwanna nwaanyị bi n’Ọstria. Ma, ọ bụ onye Họngeri. Ọ chọpụtara na Jehova na-ahụ mbọ ọ na-agba n’ikwusa ozi ọma. Ebe ọ ma asụ Họngerian, ọ natara nọmba ụlọ otu nwaanyị na-asụ Họngerian. Nwanna nwaanyị a gara na nke ya ozugbo. Ma, o nweghị onye ọ hụrụ. Ọ gagidere na nke ya ruo otu afọ na ọnwa isii. N’oge ndị ahụ, o doweere ya akwụkwọ anyị, akwụkwọ ozi, na nọmba ekwentị ya. Ọ gaa mgbe ụfọdụ, ọ na-adị ya ka mmadụ ọ̀ nọ n’ụlọ. Ma, o nweghị onye na-emepere ya ụzọ. Otu ụbọchị ọ gara, otu nwaanyị si n’ụlọ ahụ pụta. Nwaanyị ahụ mesaara ya ihu ma sị ya: “Batawa. M gụrụ ihe niile i wetaara m. M na-eche gị kemgbe.” A na-enye nwaanyị ahụ ọgwụ n’ihi ọrịa kansa ọ na-arịa. N’ihi ya, ọ chọghị ka ya na ndị mmadụ kparịtawa ụka. E bidoro ịmụrụ ya Baịbụl. Chineke si otú ahụ gọzie nwanna ahụ maka otú o si gbaa mbọ.

20. Olee otú obi dị gị na Jehova na-eleru gị anya?

20 Jehova na-ahụ ihe niile ị na-eme, ọ ga-akwụkwa gị ụgwọ ihe i mere. Ọ bụrụ na ị mata na Chineke na-ahụ gị, o kwesịghị ịdị gị ka è ji onyokomita na-enyo ihe ọ bụla ị na-eme. Kama, o kwesịrị ime ka ị ghọta na Chineke hụrụ gị n’anya nakwa na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.

^ para. 14 Akụkọ ndụ Nwanna Klein gbara n’Ụlọ Nche April 15, 1985.