Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) EPREL 2014

Nwee Obi Ike, Jehova Bụ Onye Na-enyere Gị Aka

Nwee Obi Ike, Jehova Bụ Onye Na-enyere Gị Aka

“Nwee obi ike wee sị: ‘Jehova bụ onye na-enyere m aka.’”—HIB. 13:6.

1, 2. Olee nsogbu ndị hapụrụ ezinụlọ ha gaa biri ná mba ọzọ na-enwe ma ha lọta? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

OTU nwoke aha ya bụ Andy kwuru, sị: “Mgbe m hapụrụ ezinụlọ m gaa biri ná mba ọzọ, m na-arụ ezigbo ọrụ, na-akpatakwa ezigbo ego. * Ma, mgbe mụ na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl, m ghọtara na e nwere ọrụ ka mkpa m kwesịrị ịrụ. Ọ bụ inyere ezinụlọ m aka ka ha na Jehova dị ná mma, ọ bụghị naanị ịna-egboro ha mkpa ha. N’ihi ya, m lọtara.”—Efe. 6:4.

2 Andy ma na Jehova chọrọ ka ọ lakwuru nwunye ya na ụmụ ya. Ma, ọ gaghị adịrị ya mfe. Ọ ga-eme ka ya na nwunye ya na ụmụ ya dị ná mma otú ha dịbu. Ọ ga na-arụtakwa ego ọ ga-eji na-elekọta ha. Olee otú ọ ga-esi eme ya? Ụmụnna hà ga-enyere ya aka?

IME KA EZINỤLỌ DỊ N’OTU, HA NA JEHOVA ADỊKWA NÁ MMA

3. Olee otú obi na-adị ụmụaka ma papa ha ma ọ bụ mama ha hapụ ha gaa biri ná mba ọzọ?

3 Andy kwuru, sị: “Ama m na ahapụrụ m ụmụ m mgbe m kwesịrị ịna-eduzi ha, na-emekwa ka ha mata na m hụrụ ha n’anya. Mụ  na ha anọghị n’oge ahụ ka m nwee ike ịna-agụrụ ha akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl, na-amakụ ha, anyị ana-ekpekọ ekpere, na-egwukwa egwu.” (Diut. 6:7) Ada ya aha ya bụ Anna kwuru, sị: “Mgbe ahụ papa m na-anọghị ya, obi anaghị eru m ala. Mgbe ọ lọtara, ihe anyị ji mata ya bụ ihu ya na olu ya. O nwechara otú ọ dị m mgbe ọ makụrụ m.”

4. Ọ bụrụ na nna hapụrụ ezinụlọ ya gaa biri n’ebe ọzọ, gịnị mere ọ ga-eji esiri ya ike ịbụ ezigbo onyeisi ezinụlọ?

4 Ọ bụrụ na nwoke ebiri ebe ọzọ, nwunye ya na ụmụ ha ebiri ebe ọzọ, ọ ga-esiri ya ike ịna-arụ ọrụ onyeisi ezinụlọ kwesịrị ịrụ. Nwunye Andy aha ya bụ Ruth kwuru, sị: “Tupu di m alọta, ọ bụ m bụ nne, bụrụkwa nna. Ọ bụ m na-ekpebikarị ihe a ga-eme n’ụlọ anyị. Mgbe di m lọtara, amalitere m ịmụ otú Onye Kraịst kwesịrị isi na-erubere di ya isi. O nwedịrị mgbe ụfọdụ ọ na-abụ ihe mee, ya adị ka m̀ chefuru na di m alọtala.” (Efe. 5:22, 23) Andy kwuru, sị: “Ụmụ anyị chọọ ime ihe, ọ bụ mama ha ka ha na-aga anara ike. Mụ na nwunye m ghọtara na anyị kwesịrị ime ka ụmụ anyị mata na anyị na-agbakọ aka ekpebi ihe ọ bụla a ga-eme. M kwesịrị ịmụta ịna-elekọta ezinụlọ m otú Onye Kraịst kwesịrị ịna-eme.”

5. Mgbe Andy lọtara, olee otú o si mee ka ezinụlọ ya dị n’otu? Gịnị mechara mee?

5 Andy mere ihe niile o nwere ike ime ka ya na ezinụlọ ya dị ná mma, ha na Jehova adịkwa ná mma. O kwuru, sị, “Achọrọ m iji ma okwu ọnụ m ma omume m kụziere ụmụ m eziokwu dị na Baịbụl. Achọghị m ịna-ekwu naanị n’ọnụ na m hụrụ Jehova n’anya. M chọrọ ịna-egosi ya n’omume.” (1 Jọn 3:18) Jehova ọ̀ gọziri mbọ a niile Andy gbara? Anna kwuru, sị: “Ihe malitere ịdị mma mgbe anyị hụrụ otú o si na-agba mbọ ka ọ bụrụ ezigbo nna nakwa ka anyị na ya dịrị ná mma. Obi dị anyị ezigbo ụtọ mgbe anyị hụrụ otú o si na-agba mbọ n’ọgbakọ. Ụwa Setan nọ na-agbalị ime ka anyị kwụsị ife Jehova. Ma, anyị chọpụtara na ụkwụ siri papa anyị na mama anyị ike n’ọgbakọ. N’ihi ya, anyị gbara mbọ ka anyị mee ka ha. Papa anyị kwere anyị nkwa na ya agaghị ahapụ anyị ọzọ. O nweghịkwa mgbe ọ hapụrụ anyị. A sị na o mere otú ahụ, e nwere ike agaraghị m anọ ná nzukọ Jehova taa.”

GHỌTA NA I SO KPATA NSOGBU E NWERE

6. Gịnị ka ụfọdụ nne na nna mụtara mgbe a na-alụ agha?

6 Ụmụaka na-achọ ka ha na papa ha na mama ha na-anọ. Dị ka ihe atụ, mgbe a na-alụ agha ná mba ụfọdụ dị na Yurop, ọtụtụ ụmụnna anyị anaghị agali ọrụ. N’ihi ya, ha na ụmụ ha na-eji oge ahụ anọ. Ha na ha na-ekwurịta okwu, na-egwu egwu, ha ana-amụkwara ha Baịbụl. O mere ka obi dị ụmụ ha ụtọ n’agbanyeghị na ihe siiri ha ike. Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Ụmụaka chọrọ ka ha na papa ha na mama ha na-anọ. Ọ na-atọ ha ụtọ karịa inye ha ego ma ọ bụ ihe ọzọ. Ihe Baịbụl kwuru gosiri na ọ bụrụ na nne na nna ewepụta oge ka ha na ụmụ ha na-anọ, ha ana-akụziri ha ihe, ọ ga-abara ụmụaka ahụ uru.—Ilu 22:6.

7, 8. (a) Ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna esi ná mba ọzọ lọta, olee ihe nwere ike iju ya anya? (b) Olee otú o nwere ike isi mee ka ya na ụmụ ya dịwakwa ná mma?

7 Ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna esi ná mba ọzọ lọta, ihe ọ ga-ahụ nwere ike iju ya anya. Ụmụ ya nwere ike ịna-eme ka ha achọdịghị ịma na ọ lọtala ma ọ bụkwanụ na ha atụkwasịzighị ya obi. O nwere ike ịgwa nwa ya, sị: “Olee otú m si tachaara gị ahụhụ, gị ana-eme ka obi adịghị gị ụtọ?” Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na obi adịghị nwa ahụ ụtọ na papa ya ma ọ bụ mama ya hapụrụ ya. Olee otú nne ma ọ bụ nna nwere ike isi dozie nsogbu ahụ?

8 Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ị ghọta otú obi dị ndị ezinụlọ gị. Meekwa ka ha ghọta na ị hụrụ ha n’anya. Mgbe gị na ha na-ekwurịta okwu, mee ka ha ghọta na i so  kpata nsogbu ahụ. Ọ bụrụ na i jiri obi gị niile rịọ ha mgbaghara, o nwere ike inye aka. Ọ bụrụ na ndị ezinụlọ gị achọpụta na ị na-agba mbọ ka ihe dị mma, ha ga-ama na ihe ị na-eme si gị n’obi. I nwee ndidi ma ghara ịda mbà, ndị ezinụlọ gị nwere ike iji nwayọọ nwayọọ hụwa gị n’anya, na-akwanyekwara gị ùgwù.

OTÚ Ị GA-ESI NA-EGBORO NDỊ EZINỤLỌ GỊ MKPA HA

9. Gịnị mere na mmadụ ‘igboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha’ apụtaghị na ọ ga-aghọ ọgaranya?

9 Pọl onyeozi kwuru na ọ bụrụ na Ndị Kraịst mere agadi agaghị elekọtali onwe ha, ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha kwesịrị ịna-enyere ha aka. Ma, Pọl gwakwara Ndị Kraịst niile na afọ kwesịrị iju ha ma ọ bụrụ na ha nwere ihe oriri, uwe, na ebe obibi. Anyị ekwesịghị ịna-agba mbọ ka anyị biwe ndụ okomoko ma ọ bụ siwe ọnwụ na anyị ga-abụrịrị ndị aka ji akụ̀. (Gụọ 1 Timoti 5:4, 8; 6:6-10.) Onye Kraịst ‘igboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha’ apụtaghị na ọ ga-aghọ ọgaranya n’ụwa a a ga-ebibi n’oge na-adịghị anya. (1 Jọn 2:15-17) Anyị ekwesịghị ikwe ka “ike dị aghụghọ nke akụnụba” ma ọ bụ “nchegbu nke ndụ” mee ka ezinụlọ anyị ghara ‘ijidesi aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,’ ya bụ, ndụ a ga-adị n’ụwa ọhụrụ Chineke.—Mak 4:19; Luk 21:34-36; 1 Tim. 6:19.

10. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịga koro ụgwọ?

10 Jehova ma na ego dị anyị mkpa. Ma, ego agaghị echebeli anyị ma ọ bụ baara anyị uru ka amamihe Jehova. (Ekli. 7:12; Luk 12:15) Ọtụtụ mgbe, ndị mmadụ anaghị ama ihe niile ịga biri ná mba ọzọ ga-efu ha. Mmadụ gaa biri ná mba ọzọ, ọ pụtaghị na onye ahụ ga-akpatarịrị ego. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere nsogbu ndị ya na ya so. Ọ na-abụ, ọtụtụ ndị hapụrụ ezinụlọ ha lọta, ụgwọ ha ji akarịa nke ha jibu. Kama inwe ohere jekwuoro Chineke ozi, ha ga na-agbara ndị ha ji ụgwọ ohu. (Gụọ Ilu 22:7.) Ọ kacha mma ka mmadụ ghara ịga koro ụgwọ.

11. Ọ bụrụ na ezinụlọ eburu ụzọ kpebie otú ha ga-esi na-emefu ego, olee uru ọ ga-abara ha?

11 Mgbe Andy si mba ọzọ lọta, ọ ma na ya kwesịrị ịkpachara anya n’otú ezinụlọ ya si emefu ego ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịna-elekọta ha nke ọma. Ya na nwunye ya bu ụzọ mata ihe ndị dị ha mkpa, jirizie ya kpebie ego ole ha ga na-emefu. Ihe ahụ ha kpebiri mere ka ha ghara ịna-azụ ihe otú ha na-azụbu. Ma, obi ha niile bu otu. Ha anaghị emefu ego n’ihe na-adịghị mkpa. * Andy kwuru, sị: “Dị ka ihe atụ, m kpọpụtara ụmụ m n’ụlọ akwụkwọ ndị mmadụ nwe ma kpọga ha n’ụlọ akwụkwọ dị mma gọọmenti nwe.” Ya na ndị ezinụlọ ya kpere ekpere ka o nweta ọrụ na-agaghị eme ka ha na-ala azụ n’ofufe Chineke. Olee otú Jehova si zaa ekpere ha?

12, 13. Gịnị ka Andy mere ka o nwee ike ịna-egboro ezinụlọ ya mkpa ha? Olee otú Jehova si gọzie ihe ahụ o mere?

12 Ruo ihe dị ka afọ abụọ, o siiri Andy ike ịkpata ihe ga-ezuru ya na ezinụlọ ya. Ego ha dewere n’ụlọ akụ̀ nọ na-agbada. Ọ rụchaa ọrụ lọta, ike na-agwụru ya n’ọkpụkpụ. Ma, o kwuru, sị: “Anyị na-aga ọmụmụ ihe niile, na-agakọkwa ozi ọma ọnụ.” O kpebiri na ya agaghị arụ ọrụ ga-eme ka ọ hapụ ezinụlọ ya ruo ọtụtụ ọnwa ma ọ bụ ọtụtụ afọ. O kwuru, sị: “Kama ime otú ahụ, m mụtara ịrụ ụdị ọrụ dị iche iche. Ọ bụrụ na nke m na-arụ enweghịzi isi, mụ arụwa ọzọ.”

Ì nwere ike ịmụta ịrụ ụdị ọrụ dị iche iche ka i nwee ike ịna-egboro ndị ezinụlọ gị mkpa ha? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

13 Andy ji nwayọọ nwayọọ na-akwụ ụgwọ o ji. N’ihi ya, ọmụrụ nwa ọ kwụrụ maka ego ọ gbaziiri abụghị obere ihe. Ma, o weere ya na ihe ahụ niile enweghị ihe ọ bụ, ebe ọ bụ na ya na ezinụlọ ya bi, ha ejiri otu obi na-efe Jehova. Andy kwuru, sị: “E kee ego m na-akpata mgbe m bi ná mba ọzọ ụzọ iri, ego m na-akpata ugbu a erudịghị otu ụzọ. Ma, anyị anaghị anọ agụụ. ‘Aka Jehova adịghị mkpụmkpụ.’ Anyị kpebiri na anyị ga-abụ ndị ọsụ ụzọ.” Ọ dịghị anya, ihe adịtụ mma n’obodo ha, ya adịtụrụ ya mfe ịna-egboro ezinụlọ ya mkpa ha.—Aịza. 59:1.

 IHE Ị GA-EME MA NDỊ IKWU GỊ NYEWE GỊ NSOGBU

14, 15. Gịnị ka ezinụlọ nwere ike ime ma ọ bụrụ na ndị ikwu ha chọrọ ka ịchụ ego mee ka ha leghara ofufe Jehova anya? Olee ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe?

14 N’ọtụtụ obodo, ụfọdụ ndị chere na ọ bụ iwu na ha ga na-enye ndị ikwu na ibe ha ego ma ọ bụ ihe ọzọ. Andy kwuru, sị: “Ọ bụ otú ndị obodo anyị na-eme. Ime otú ahụ na-atọkwa anyị ụtọ.” O kwukwara, sị: “Ọ bụghị mgbe niile ka mmadụ ga-emeli ya. M na-ewetu obi gwa ndị ikwu m na m ga-enye ha ihe otú ike kwere m, ma agaghị m eleghara mkpa ndị ezinụlọ m anya ma ọ bụ ghara inyere ha aka ka ha nọsie ike n’ofufe Chineke.”

15 Ọ bụrụ na mmadụ ekweghị ahapụ ezinụlọ ya gaa biri ná mba ọzọ, ụfọdụ ndị ikwu na ibe ya nwere ike ịna-akwa ya emo ma ọ bụ na-ewesa ya iwe. Ha nwekwara ike ime otú ahụ ma mmadụ si mba ọzọ lọta ka ya na ezinụlọ ya biri. Ha nwere ike ịna-ekwu na ọ hụghị ha n’anya ma ọ bụ na ọ naghị enyere mmadụ aka. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha tụrụ anya na ọ ga na-ezitere ha ego ma ọ gaa rụwa ọrụ ná mba ọzọ. (Ilu 19:6, 7) Anna, bụ́ ada Andy, kwuru, sị: “Ọ bụrụ na anyị ekweghị ka ịchụ ego mee ka anyị leghara ofufe Jehova anya, o nwere ike ime ka ụfọdụ ndị ikwu anyị ghọta na ozi anyị na-ejere Chineke dị ezigbo mkpa. Ma, olee otú ha ga-esi aghọta ya ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ọ bụla ha chọrọ ka anyị mee?”—Tụlee 1 Pita 3:1, 2.

NWEE OKWUKWE NA CHINEKE

16. (a) Olee ihe na-ezighị ezi mmadụ nwere ike ịna-eche? (Jems 1:22) (b) Olee ụdị ihe anyị ga-eme ka Jehova gọzie anyị?

16 Otu nwanna nwaanyị nke hapụrụ di ya na ụmụ ya gaa ịkpata ego ná mba ọzọ gwara ndị okenye ebe ahụ, sị: “Ịbịa ebe a furu anyị nnukwu ihe. Ọ bụdị ya mere di m ji kwụsị ịbụ okenye. N’ihi ya, enwere m olileanya na Jehova ga-agọzi ọbịbịa m bịara ebe a.” Ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe ma mee ihe Jehova chọrọ, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-agọzi anyị. Ma, ọ gaghị agọzi anyị ma anyị mee ihe na-abụghị uche ya. Obi agaghịkwa adị ya mma ma ọ bụrụ na anyị kwo ihe na-enweghị isi hapụ ihe ùgwù ije ozi o nyere anyị.—Gụọ Ndị Hibru 11:6; 1 Jọn 5:13-15.

17. Gịnị mere anyị kwesịrị iji rịọ Jehova ka o duzie anyị tupu anyị ekpebie ihe anyị ga-eme? Olee otú anyị ga-esi eme ya?

17 Tupu gị ekpebie ihe ị ga-eme, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ị ghara imecha kwaa  mmakwaara. Kpee ekpere ka o nye gị mmụọ nsọ na amamihe, duziekwa gị. (2 Tim. 1:7) Jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ ga-erubere Jehova isi n’agbanyeghị ihe o nwere ike ifu m? M̀ ga-ege Jehova ntị, mụ na ezinụlọ m anọrọ, ọ bụrụgodị na ọ pụtara na ihe ga-esitụrụ anyị ike?’ (Luk 14:33) Jụọ ndị okenye ihe Baịbụl kwuru banyere ihe ị chọrọ ime. Ha gwa gị ya, gbalịa mee ya. I mee otú ahụ, ọ pụtara na obi siri gị ike na Jehova ga-emezu nkwa o kwere na ya ga-enyere gị aka. Ndị okenye agaghị ekpebiri gị ihe ị ga-eme. Ma, ha ga-enyere gị aka ka i mee ihe ga-emecha mee ka obi dị gị ụtọ.—2 Kọr. 1:24.

18. Ònye kwesịrị ịna-elekọta ezinụlọ? Olee otú ndị ọzọ nwere ike isi nyere ya aka?

18 Jehova chọrọ ka onyeisi ezinụlọ na-elekọta ezinụlọ ya mgbe niile. E nwere ọtụtụ ndị ọ na-adị ka ha hapụ ezinụlọ ha gaa biri ná mba ọzọ. Ndị ọzọ nwedịrị ike ịna-agwa ha mee otú ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ha na-ekpebi ka ha na ezinụlọ ha nọrọ. Anyị kwesịrị ịna-aja ha mma, na-etinyekwa ha n’ekpere. Ọ bụrụ na ihe gbata gbata emee, ma ọ̀ bụ ọdachi ma ọ̀ bụ ọrịa, anyị kwesịrị igosi na anyị hụrụ ha n’anya nakwa na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi. (Gal. 6:2, 5; 1 Pita 3:8) Ì nwere ike inyere ha aka chọta ọrụ n’ebe na-adịghị anya ma ọ bụ nye ha ego, ihe oriri, ma ọ bụ ihe ọzọ dị ha mkpa? I mee otú ahụ, ihe nwere ike ịdịtụrụ ha mfe. O nwekwara ike ime ka ha ghara ịhapụ ezinụlọ ha gaa chọwa ọrụ n’obodo ọzọ.—Ilu 3:27, 28; 1 Jọn 3:17.

CHETA NA Ọ BỤ JEHOVA NA-ENYERE GỊ AKA

19, 20. Gịnị mere obi kwesịrị iji sie Ndị Kraịst ike na Jehova ga na-enyere ha aka?

19 Baịbụl gwara anyị, sị: “Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya, ka unu nọ na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a. N’ihi na [Chineke ekwuwo], sị: ‘M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.’ Ka anyị nwee obi ike wee sị: ‘Jehova bụ onye na-enyere m aka; agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?’” (Hib. 13:5, 6) Olee otú anyị ga-esi eme ihe a Baịbụl kwuru?

20 N’otu mba ebe ihe na-esiri ọtụtụ ndị ike, otu okenye kwuru, sị: “Ndị mmadụ na-ekwukarị na obi na-adị Ndịàmà Jehova ụtọ. Ha na-achọpụtakwa na ụmụnna ndị dara ogbenye na-eji ejiji dị mma mgbe niile, ya adị ka ihe ọ̀ dịịrị ha mma karịa ndị ọzọ.” Ọ bụ otú Chineke si emezu nkwa ahụ Jizọs kwere ndị bu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. (Mat. 6:28-30, 33) O doro anya na Jehova, bụ́ Nna gị nke eluigwe, hụrụ gị n’anya, chọọkwa ka ihe dịrị gị na ụmụ gị ná mma. Baịbụl kwuru, sị: “Anya Jehova na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.” (2 Ihe 16:9) O nyere anyị iwu gbasara otú a ga-esi na-ebi n’ezinụlọ nakwa otú anyị ga-esi na-egbo mkpa anyị. Ihe mere o ji nye anyị iwu ndị ahụ bụ ka ihe dịrị anyị ná mma. Ọ bụrụ na anyị na-erubere iwu ndị ahụ isi, anyị na-egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya ma tụkwasị ya obi. Baịbụl kwuru, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu; ma ihe o nyere n’iwu adịghị arọ.”—1 Jọn 5:3.

21, 22. Gịnị mere i ji kpebisie ike na ị ga na-atụkwasị Jehova obi?

21 Andy kwuru, sị: “Ama m na o nweghị otú m ga-esi weghachite oge ahụ m hapụrụ nwunye m na ụmụ m. Ma, anaghị m eche naanị banyere ihe ahụ m mejọrọ. Ọtụtụ ndị mụ na ha rụkọrọ ọrụ abaala ọgaranya. Ma, obi anaghị adị ha ụtọ. Ezinụlọ ha nwekwara ezigbo nsogbu. Ma, obi dị ezinụlọ anyị ụtọ. Obi na-adịkwa m ụtọ ịhụ otú ụmụnna ndị ọzọ bi n’obodo a si tụkwasị Jehova obi n’agbanyeghị na ha dara ogbenye. Ihe na-emenụ mere ka obi sie anyị ike na nkwa ahụ Jizọs kwere bụ eziokwu.”—Gụọ Matiu 6:33.

22 Nwee obi ike. Na-erubere Jehova isi, tụkwasịkwa ya obi. Na-elekọta ezinụlọ gị nke ọma. Ị ga-abụ ezigbo onyeisi ezinụlọ ma ọ bụrụ na ị hụ Jehova n’anya, hụkwa nwunye gị na ụmụ gị n’anya. I mee otú ahụ, ị ga-amata na ‘Jehova bụ onye na-enyere gị aka.’

^ para. 1 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ para. 11 Gụọ isiokwu bụ́ “Otú Ị Ga-esi Jiri Ego Gị Na-eme Ihe Bara Uru,” na Teta! Jenụwarị–Mach 2012.