Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) EPREL 2014

E Nweghị Onye Ga-abụli Ohu Nna Ukwu Abụọ

E Nweghị Onye Ga-abụli Ohu Nna Ukwu Abụọ

“Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ . . . Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.”—MAT. 6:24.

1-3. (a) Olee nsogbu ọtụtụ ezinụlọ na-enwe taa gbasara ego? Gịnị ka ụfọdụ ezinụlọ na-eme gbasara ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye echewe echiche ịhapụ ezinụlọ ya gaa biri ná mba ọzọ, olee ihe nwere ike ịna-echu ya ụra gbasara ịzụ ụmụ ha?

OTU nwanna nwaanyị aha ya bụ Jane kwuru, sị: “Ụbọchị ọ bụla James di m lọtara ọrụ, ike na-agwụru ya n’ọkpụkpụ. Ma, ego a na-akwụ ya ehighị nne. Ọ bụ naanị nri ọnụ ka ọ na-ezuru anyị. * Achọrọ m ime ka ihe dịtụrụ di m mfe, chọọkwa ka nwa anyị nwoke aha ya bụ Frank nweta ihe ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ibe ya nwere.” Jane chọkwara inyere ndị ikwu ya ndị ọzọ aka, dewekwa ego buru ibu maka echi. Ọtụtụ ndị enyi ya agaala mba ọzọ ka ha kpatakwuo ego. Ma, o chechaala otú ọ ga-esi kwaga mba ọzọ, ya ana-eme ya obi abụọ. N’ihi gịnị?

2 Ụjọ na-atụ Jane ma o cheta ihe nwere ike ime ma ya hapụ di ya na nwa ha gaa mba ọzọ. Ezinụlọ ha na-efekọ Jehova. Olee otú ha ga-esi na-eme ya ma ọ gaa biri ná mba ọzọ? O chetakwara ndị o yiri ka hà ka na-efe Jehova n’agbanyeghị na di ha ma ọ bụ nwunye ha gara biri ná mba ọzọ. Ma, ọ nọ na-eche otú ọ ga-esi nọrọ ná mba ọzọ na-azụ Frank nwa ha. Ọ̀ ga-esili n’Ịntanet na-azụ ya ma na-akụziri ya ka ọ na-efe Jehova?—Efe. 6:4.

3 Jane jụrụ ndị ọzọ ihe ọ ga-eme. Di ya achọghị ka ọ gaa biri ná mba ọzọ. Ma, ọ gwara ya na ọ bụrụ na ọ chọrọ ịga na ya agaghị  asị ya agala. Ndị okenye na ụfọdụ ụmụnna nọ n’ọgbakọ ha gwara ya agala, ma ụfọdụ ụmụnna nwaanyị gwara ya na o kwesịrị ịga. Ha gwara ya, sị: “I kwesịrị ịga ma ọ bụrụ na ị hụrụ ezinụlọ gị n’anya. Ị ka nwere ike ịnọ n’ebe ahụ na-efe Jehova.” N’agbanyeghị na ọ na-eme ya obi abụọ, ọ gwara di ya na nwa ha nwoke ka ha nọrọ nke ọma ma gawa ịchọ ọrụ ná mba ọzọ. Ọ gwara ha, sị: “Agaghị m anọte aka.”

ỌRỤ EZINỤLỌ NA IHE BAỊBỤL KWURU

4. Gịnị mere ọtụtụ ndị ji ahapụ ezinụlọ ha gaa mba ọzọ? Ọ bụrụ na mmadụ ahapụ ezinụlọ ya gaa mba ọzọ, olee ndị na-azụkarị ụmụ ya?

4 Jehova achọghị ka agụụ na-agụgbu ndị ohu ya. (Ọma 37:25; Ilu 30:8) Kemgbe ụwa, e nweela ndị ohu Chineke gara biri ná mba ọzọ ka ha hụ ihe ha ga-eri. Jekọb zigara ụmụ ya Ijipt ka ha gaa zụta nri n’ihi na ọ chọghị ka agụụ gụgbuo ezinụlọ ya. * (Jen. 42:1, 2) Ma, ihe mere ọtụtụ ndị ji aga mba ọzọ taa abụghị ka agụụ ghara ịgụgbu ha. Gịnịzi mere ha ji aga? Ọtụtụ n’ime ha ji nnukwu ụgwọ. E nwekwara ndị nke bi n’ebe ihe siri ezigbo ike. Ha nwere ike ịhapụ ezinụlọ ha gaa biri n’ebe ịkpata ego ga-adịrị ha mfe n’ihi na ha chọrọ ịzụ ihe ndị ọgbara ọhụrụ ma na-ebi ndụ okomoko. Ọ na-abụkarị ndị ọzọ na-azụ ụmụ nne ha ma ọ bụ nna ha hapụrụ gaa mba ọzọ. O nwere ike ịbụ nwanne ha nke okenye, nne nne ha na nna nna ha, ndị ikwu ha ndị ọzọ, ma ọ bụ ndị enyi mama ha ma ọ bụ papa ha. Ọ bụ eziokwu na ọ na-ewute onye hapụrụ di ya, nwunye ya, ma ọ bụ ụmụ ya gaa na-arụ ọrụ ná mba ọzọ, ọ na-adị ọtụtụ ndị mere ụdị ihe a ka o nweghị ihe ọzọ ha ga-eme.

5, 6. (a) Gịnị ka Jizọs kwuru na ọ bụ ya ga-eme ka anyị nwee ezigbo obi ụtọ, ahụ́ eruokwa anyị ala? (b) Olee ihe Jizọs gwara anyị ka anyị na-ekpe ekpere ka Chineke meere anyị? (ch) Olee otú Jehova si agọzi anyị?

5 N’oge Jizọs, e nwere ọtụtụ ndị ogbenye. O nwere ike ịbụ na ha chere na ọ bụrụ na ha akpatakwuo ego, ọ ga-eme ka ha nwekwuo obi ụtọ, ahụ́ eruokwa ha ala. (Mak 14:7) Ma, Jizọs achọghị ka obi ha dịrị n’ihe ndị na-agaghị adịte aka. Ọ chọrọ ka ha tụkwasị Jehova obi n’ihi na ngọzi ya na-adịru mgbe ebighị ebi. N’ihe Jizọs kụziri mgbe ọ nọ n’elu ugwu, o kwuru na ihe ga-eme ka anyị nwee ezigbo obi ụtọ, ahụ́ eruokwa anyị ala, bụ anyị na Jehova ịdị ná mma, ọ bụghị ihe ndị anyị nwere ma ọ bụ mbọ anyị na-agba ka ihe dịrị anyị ná mma.

6 N’Ekpere Onyenwe Anyị, Jizọs akụzirighị anyị ka anyị na-ekpe ekpere ka anyị baa ọgaranya. Kama, ọ kụziiri anyị ka anyị na-ekpe ekpere ka Chineke nye anyị nri “maka ụbọchị taa.” Ọ gwara ndị na-ege ya ntị, sị: “Kwụsịnụ ịkpakọbara onwe unu akụ̀ n’ụwa . . . Kama nke ahụ, na-akpakọbaranụ onwe unu akụ̀ n’eluigwe.” (Mat. 6:9, 11, 19, 20) Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-agọzi anyị otú ahụ o kwuru. Ihe ọ pụtara abụghị naanị na anyị na ya ga-adị ná mma. Ọ pụtakwara na ọ ga-enye anyị ihe niile dị anyị mkpa. Naanị ihe ga-eme ka anyị nwee ezigbo obi ụtọ, ahụ́ eruokwa anyị ala, bụ ịtụkwasị Jehova, Nna anyị hụrụ anyị n’anya, obi, kama ịtụkwasị ego obi.—Gụọ Matiu 6:24, 25, 31-34.

7. (a) Ole ndị ka Jehova nyere ọrụ ịzụ ụmụ? (b) Gịnị mere nne na nna kwesịrị iji gbakọọ aka na-azụ ụmụ ha?

7 ‘Ibu ụzọ na-achọ ezi omume Chineke’ pụtara na anyị ga-ewere ọrụ anyị n’ezinụlọ otú Jehova si were ya. Dị ka ihe atụ, n’Iwu Mozis, a gwara ndị nne na nna ka ha na-akụziri ụmụ ha okwu Chineke. Ndị Kraịst kwesịkwara ime otú ahụ ka obi dị Jehova mma. (Gụọ Diuterọnọmi 6:6, 7.) Ọ bụ nne na nna ka Chineke nyere ọrụ a, ọ bụghị ndị nne nne na ndị nna nna ma ọ bụkwanụ onye ọzọ. Eze Sọlọmọn kwuru, sị: “Nwa m, ṅaa ntị n’ịdọ aka ná ntị nna gị, ahapụkwala iwu nne gị.” (Ilu 1:8) Jehova chọrọ ka ezinụlọ bikọta ọnụ ka nne na nna nwee ike ịna-akụziri ụmụ ha okwu ya ma na-eduzi ha. (Ilu 31: 10, 27, 28) Ọ bụrụ na ụmụ ana-anụ ka papa ha na mama ha na-ekwu gbasara Jehova, na-ahụkwa ka ha na-ejere ya ozi kwa ụbọchị, ha nwere ike ịmụta ịna-eme otú ahụ.

NSOGBU O NWERE IKE ỊKPATA

8, 9. (a) Gịnị na-emekarị ma ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna ahapụ ụmụ ya gaa biri ná mba ọzọ? (b) Ọ bụrụ na nne na nna na ụmụ ha ebighị, olee nsogbu ọ na-akpata n’ezinụlọ?

8 Tupu ọtụtụ ndị agawa mba ọzọ, ha na-ebu ụzọ chee uru na ọghọm dị na ya. Ma ọ bụ mmadụ ole na ole n’ime ha na-ahụ nsogbu niile o nwere ike ịkpatara ezinụlọ ha. (Ilu 22:3) * Ozugbo Jane gawara mba ọzọ, obi malitere ịjọ ya njọ na ya na di ya na nwa ha ebighịzi. Obi adịghịkwa di ya na nwa ha mma. Frank nwa ya na-ajụkarị ya, sị, “Gịnị mere i ji hapụ m?” Jane chọrọ ịnọ naanị ọnwa ole na ole n’ebe ahụ. Ma, mgbe ọ nọrọ afọ ole na ole, ọ chọpụtara na ihe agbanweela n’ezinụlọ ha, ya emee ka obi jọkwuo ya njọ. Frank nwa ya na-emezi isi ike. Ọ naghịzi agwa mama ya ihe o bu n’obi. Jane kwuru, sị, “Ọ hụghịzi m n’anya.”

9 Ọ bụrụ na nne na nna na ụmụ ha ebighị, obi nwere ike ịna-ajọ ha njọ. Obi ha agaghị abụ otu n’ihe bụ́ ihe ọma na ihe bụ́ ihe ọjọọ. * Ọ na-akacha njọ ma ọ bụrụ na nne na nna hapụrụ ụmụ ha mgbe ha ka dị obere ma nọọ ọtụtụ afọ tupu ha alọta. Jane gwara Frank na ihe mere ya ji gaa mba ọzọ bụ na ya chọrọ ka ihe dịrị ya ná mma. Ma, ọ dị Frank ka mama ya ahụghịzi ya n’anya. Ná mmalite, obi adịghị ya mma na mama ya hapụrụ ya. Ma, mgbe mama ya bịara leta ya, iwe were ya na mama ya bịara. O chere na ya ekwesịghị ịhụ mama ya n’anya ma na-erubere ya isi. Ọ bụ otú ọtụtụ ụmụaka papa ha ma ọ bụ mama ha hapụrụ gaa mba ọzọ na-echekarị.—Gụọ Ilu 29:15.

Ị gaghị esili n’Ịntanet makụọ nwa gị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

10. (a) Gịnị ga-eme ụmụaka ma ọ bụrụ na nne ha na nna ha na-enye ha onyinye kama iwepụta oge ka ha na ha na-anọ? (b) Ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna hapụrụ ezinụlọ ya gaa biri ná mba ọzọ, gịnị ka ọ na-agaghị emeliri nwa ya?

10 Jane gbara mbọ na-ezigara Frank nwa ya ego na ihe ndị ọzọ. Ọ chọrọ isi otú ahụ mee ka ọ ghara ịna-ewute Frank na ya na ya ebighị. Ma, Jane chọpụtara na ihe a ọ na-eme mere ka nwa ya na-agbara ya ọsọ, chọpụtakwa na ọ na-akụziri ya ka ọ na-ahụ ego n’anya karịa ndị ezinụlọ ya na Jehova. (Ilu 22:6) Frank na-agwakarị ya, sị, “Alọtala. Naanị ihe ị ga-eme bụ ịna-ezitere m ihe.” Jane mechara ghọta na otú ya ga-esi zụọ nwa ya abụghị ịna-edetara ya akwụkwọ ozi, ịna-akpọ ya na fon, ma ọ bụkwanụ ya na ya ịna-akparịta ụka n’Ịntanet. O kwuru, sị, “Ị gaghị  esili n’Ịntanet makụọ nwa gị ma ọ bụkwanụ susuo ya ọnụ, sị ya ka chi bọọ.”

Olee nsogbu i nwere ike inwe ma ọ bụrụ na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ebighị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11. (a) Olee nsogbu di na nwunye ga-enwe ma ọ bụrụ na otu onye n’ime ha agaa rụwa ọrụ ná mba ọzọ? (b) Olee mgbe Jane ghọtara na ya kwesịrị ịlakwuru di ya na nwa ha?

11 Jane na Jehova adịghịzi ná mma otú ha dịbu. Ọ na-aga ọmụmụ ihe na ozi ọma naanị otu ugboro n’izu. E nwedịrị izu ndị ọ na-anaghị aga. Ya na di ya adịghịkwa ná mma otú ha dịbu. Onye ọ na-arụrụ ọrụ nọ na-enye ya nsogbu ka ha nwee mmekọahụ. Ebe ọ bụ na ya na di ya ebighị, ha nwee nsogbu, ha na-akọrọ ya ndị ọzọ kama ịkọrọ ya ibe ha. Ọ fọdịrị obere ka onye nke ọ bụla kwaa iko. N’agbanyeghị na o nweghị onye n’ime ha kwara iko, ọ ghọtara na agwọ nọ n’akịrịka. Baịbụl kwuru na di na nwunye kwesịrị ịna-eme ka obi dị ibe ha mma, na-enwekwa mmekọahụ. Ha abụọ nwere ike ikwurịta okwu mgbe ọ bụla, chịrịta ọchị, bitụ ibe ha aka, gwusa ibe ha egwu, makụọ ibe ha, ‘gosi ibe ha ịhụnanya,’ nyekwa ibe ha “ihe ruuru ya.” Ma, o nweghị otú Jane na di ya ga-esi eme ihe ndị a ebe ọ bụ na ha abụọ ebighị otu ebe. (Abụ Sọlọ. 1:2; 1 Kọr. 7:3, 5) O nweghịkwa otú ha na nwa ha ga-esi na-efekọ Jehova. Jane kwuru, sị: “Mgbe m mụtara ná mgbakọ na ezinụlọ kwesịrị ịna-enwe ofufe ezinụlọ ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịlafere oké ụbọchị Jehova, m ghọtara na m kwesịrị ịla.” O kwesịrị ịga mee ka ya na di ya na nwa ha dị ná mma otú ha dịbu, meekwa ka ya na Jehova dị ná mma.

NDỤMỌDỤ DỊ MMA NA NKE NA-ADỊGHỊ MMA

12. Ọ bụrụ na e nwere onye hapụrụ ezinụlọ ya gaa biri ná mba ọzọ, olee ihe Baịbụl kwuru e nwere ike ịgwa ya?

12 Mgbe Jane kpebiri na ya ga-ala, o nweghị ụdị ndụmọdụ a na-enyeghị ya, ma nke ọma ma nke ọjọọ. Ndị okenye ọgbakọ ha n’ebe ahụ o bi gwara ya na ihe o kpebiri ime dị mma, na o gosiri na o nwere okwukwe na obi ike. Ma, ụmụnna ndị ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha na-ebighị gwara ya na ihe ọ chọrọ ime adịghị mma. Kama ime ka Jane, ha nọ na-asị ya, “Ị laa, ị ga-alaghachite n’oge na-adịghị anya. Oleekwanụ otú ị ga-esi na-akpata ego ga-ezuru unu?” Ụmụnna ekwesịghị ikwu ụdị okwu ahụ na-anaghị agba ume. Ha kwesịrị ịna-agwa ‘ndị inyom na-akatabeghị ahụ́ ka ha hụ di ha n’anya, hụ ụmụ ha n’anya, na-arụkwa ọrụ n’ụlọ,’ ya bụ, ịna-elekọta ezinụlọ ha, “ka e wee ghara ịkatọ okwu Chineke.”—Gụọ Taịtọs 2:3-5.

13, 14. Gịnị mere anyị ji kwesị inwe okwukwe ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe Jehova kwuru kama ime ihe ndị ezinụlọ anyị kwuru? Nye ihe atụ.

13 N’obodo ụfọdụ, ndị mmadụ anaghị eji omenala ha na ihe papa ha na mama ha kwuru egwu egwu. Ha na-eji ha akpọrọ ihe karịa ihe ọ bụla ọzọ. Ọtụtụ ndị hapụrụ ezinụlọ ha gaa na-arụ ọrụ ná mba ọzọ toro n’ụdị ebe ahụ. Ọ bụrụ na Onye Kraịst akata  obi mee ihe na-abụghị obi ndị ezinụlọ ya n’ihi na ọ chọrọ ime ihe Jehova kwuru, o gosiri na okwukwe onye ahụ siri ike.

14 Ka anyị were ihe mere Angela dị ka ihe atụ. O kwuru, sị: “Mụ na di m bi ná mba ọzọ mgbe m mụrụ Ben nwa m. N’oge ahụ, ọ dịbeghị anya mụ na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. Mmadụ niile nọ n’ezinụlọ anyị chọrọ ka m kpọgara papa m na mama m Ben ruo mgbe mụ na di m kpatakwuru ego.” Mgbe Angela gwara ha na ya ga-eji aka ya zụọ nwa ya, ma ndị ezinụlọ ha ma di ya kwara ya emo, kpọọkwa ya onye umengwụ. Angela kwuru, sị: “Nke bụ́ eziokwu bụ na n’oge ahụ, amachaghị m ihe mere na ịkpọgara papa m na mama m Ben ka ha na ya bie afọ ole na ole adịghị mma. Ma, m ma na ọ bụ mụ na di m ka Jehova nyere ọrụ ịzụ ya n’ihi na ọ bụ anyị mụrụ ya.” Mgbe Angela dị ime ọzọ, di ya na-abụghị Onyeàmà Jehova gwara ya ka o tee ya. Otú ahụ Angela si mee ihe dị mma na nke mbụ mere ka obi sie ya ike imekwa ihe dị Jehova mma na nke ugbu a. Obi dịzi ya na di ya na ụmụ ha ụtọ na ha ebighị iche iche. A sị na Angela kpọlaara ndị ọzọ ụmụ ya ka ha zụọ, obi agaraghị adị ha ụtọ otú ahụ.

15, 16. (a) Olee otú e si zụọ Felicia? (b) Gịnị mere o ji kpebie na ya agaghị esi otú ahụ zụọ nwa ya nwaanyị?

15 Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Felicia kwuru, sị: “Mụ na nne nne m biri afọ ole na ole. N’oge ahụ, ọ bụ papa m na mama m na nwanne m nwaanyị nke m tọrọ bi. Mgbe m mechara lakwuru ha, ahụchaghị m ha n’anya. Nwanne m nwaanyị na-akọrọ ha obi ya, na-amakụ ha, ha na ya dịkwa n’ezigbo mma. Ma, anaghị m akpacha ha nso. Mgbe m toro, o sikwaara m ike ime ka ha mata ihe m bu n’obi. Mụ na nwanne m nwaanyị kwere ha nkwa na anyị ga-elekọta ha ma ha mee agadi. Ma, ihe mere m ga-eji elekọta ha bụ na ọ bụ ihe m kwesịrị ime. Ma, ihe mere nwanne m nwaanyị ga-eji mee ya bụ na ọ hụrụ ha n’anya.

16 “Mama m chọrọ ka m kpọtara ya nwa m nwaanyị ka ọ zụọ, otú ahụ o si kpọgara m mama nke ya.” Ma, Felicia jụrụ. O kwuru, sị: “Mụ na di m chọrọ ịzụ nwa anyị ka ọ na-efe Jehova. Achọghịkwa m ime ihe ga-emecha mee ka mụ na nwa m ghara ịdị ná mma.” Felicia achọpụtala na naanị ihe mmadụ ga-eme ka ihe gaziere ya bụ ịhụ Jehova na iwu ya n’anya karịa ego na ndị ezinụlọ ya. Jizọs kwuru hoo haa, sị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ,” ya bụ, Chineke na Akụnụba.—Mat. 6:24; Ọpụ. 23:2.

JEHOVA GA-EME KA IHE NDỊ ANYỊ NA-EME “NA-AGA NKE ỌMA”

17, 18. (a) Gịnị mere ezigbo Ndị Kraịst kwesịrị iji na-eme ihe ziri ezi mgbe niile? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu na-esonụ?

17 Jehova bụ Nna anyị. O kwere anyị nkwa na ya ga-enye anyị ihe niile dị anyị mkpa ma ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ na-achọ Alaeze ya na ezi omume ya. (Mat. 6:33) N’ihi ya, ezigbo Ndị Kraịst kwesịrị ime ihe ziri ezi mgbe niile. Ọ bụrụgodị na nsogbu tara akpụ abịara anyị, Jehova kwere anyị nkwa na ya ga-emere anyị “ụzọ mgbapụ” ka anyị nwee ike ime ihe ziri ezi. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:13.) Anyị kwesịrị ‘icheresi Jehova ike’ ma tụkwasị ya obi. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-ekpe ekpere ka o nye anyị amamihe ma na-eduzi anyị, anyị ana-emekwa ihe o nyere n’iwu. Anyị mee otú ahụ, Jehova ga-enyere anyị aka. (Ọma 37:5, 7) Ọ ga-agọzi mbọ niile anyị na-agba ịna-efe naanị ya. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị ya obi, ọ ga-eme ka ihe niile anyị na-eme “na-aga nke ọma.”—Tụlee Jenesis 39:3.

18 Ọ bụrụ na nsogbu dị n’ezinụlọ n’ihi na di ma ọ bụ nwunye gara biri ná mba ọzọ, gịnị ka e kwesịrị ime? Olee ihe ndị anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịna-akpata ihe ezinụlọ anyị ga-eri ma ghara ịga biri ná mba ọzọ? Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka ka ha ghara ịhapụ ezinụlọ ha gaa biri ná mba ọzọ? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

^ para. 1 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ para. 4 Mgbe ọ bụla ụmụ Jekọb gawara Ijipt, ha na-anọ ihe dị ka izu atọ. Mgbe Jekọb na ụmụ ya mechara gaa biri n’Ijipt, ha kpọọrọ ma nwunye ha ma ụmụ ha gaa.—Jen. 46:6, 7.

^ para. 9 Ihe ndị na-eme n’ọtụtụ mba gosiri na ọ bụrụ na mmadụ ahapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya na ụmụ ya gaa biri ná mba ọzọ, ọ na-akpata ezigbo nsogbu. O nwere ike ime ka di ma ọ bụ nwunye kwaa iko, ma ọ bụdị dinaa nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya. O nwekwara ike ime ka mmadụ dinaa nwa ya, nwanne ya, ma ọ bụ onye ikwu ya. Ụmụaka nwekwara ike ha agaghị na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Iwe nwere ike ịna-ewe ha, ha ana-echegbu onwe ha, obi ana-ajọ ha njọ, ma ọ bụkwanụ ha achọwa igbu onwe ha.