Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MACH 2014

Na-asọpụrụ Ndị Agadi Nọ n’Ọgbakọ

Na-asọpụrụ Ndị Agadi Nọ n’Ọgbakọ

‘Sọpụrụ onye mere agadi.’—LEV. 19:32.

1. Olee nsogbu ndị mmadụ nọ na ya?

O NWEGHỊ mgbe Jehova bu n’obi na ndị mmadụ ga na-ata ahụhụ, ike ana-agwụ ha, ha ana-aka nká. O zubere ka ndị mmadụ biri na paradaịs n’arịaghị ọrịa ọ bụla. Ma ugbu a, “ihe niile e kere eke na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu.” (Rom 8:22) Olee otú i chere obi na-adị Chineke ma ọ na-ahụ nsogbu mmehie kpataara ndị mmadụ? A na-eleghakwara ọtụtụ ndị agadi anya n’agbanyeghị na ọ bụ mgbe mmadụ mere agadi ka e kwesịrị ịna-elekọta ya karịchaa.—Ọma 39:5; 2 Tim. 3:3.

2. Gịnị mere obi ji dị Ndị Kraịst ụtọ na e nwere ndị agadi n’ọgbakọ?

2 Obi dị ndị na-efe Jehova ụtọ na e nwere ndị agadi n’ọgbakọ. Amamihe ha na-abara anyị uru. Anyị chọkwara inwe ụdị okwukwe ha nwere. Ọtụtụ n’ime anyị nwere ndị agadi n’ezinụlọ anyị. Anyị niile kwesịrị ịna-elekọta ndị agadi nọ n’ọgbakọ, ma hà bụ ndị ezinụlọ anyị ma ọ bụ na ha abụghị. (Gal. 6:10; 1 Pita 1:22) Ọ bụrụ na anyị atụlee otú Chineke si were ndị agadi, ọ ga-abara anyị niile uru. Anyị ga-atụlekwa ihe ezinụlọ na ọgbakọ ga-eme ka e nwee ike ịna-elekọta ndị agadi a anyị hụrụ n’anya.

 “AJỤLA M”

3, 4. (a) Olee ihe onye dere Abụ Ọma nke iri asaa na otu ji obi ya niile rịọ Jehova? (b) Gịnị ka ndị agadi nọ n’ọgbakọ nwere ike ịrịọ Chineke?

3 Abụ Ọma 71:9 kwuru, sị: “Ajụla m mgbe m mere agadi; mgbe ike na-adịkwaghị m, ahapụla m.” O nwere ike ịbụ Devid dere abụ ọma a. O fere Chineke ná ndụ ya niile, Jehova ejirikwa ya mee ihe ndị dị ịtụnanya. (1 Sam. 17:33-37, 50; 1 Eze 2:1-3, 10) N’agbanyeghị ozi niile Devid jeere Jehova, mgbe o mere agadi, ọ rịọrọ ya ka o lekọta ya.—Gụọ Abụ Ọma 71:17, 18.

4 E nwere ọtụtụ ndị dị ka Devid taa. Ọ bụ eziokwu na ha na-akakwu nká ma na-enwe nsogbu ndị ha na nká na-eso, ha na-eji obi ha niile eto Chineke. (Ekli. 12:1-7) Ọtụtụ n’ime ha nwere ike ha agaghị emeli otú ha na-emebu ma n’ozi ọma ma n’ihe ndị ọzọ. Ma, ha nwere ike ịrịọ Jehova ka ọ na-agọzi ha ma na-elekọta ha. Obi kwesịrị isi ndị agadi a kwesịrị ntụkwasị obi ike na Chineke ga-aza ekpere ha. Otú anyị si mara bụ na Chineke nyere Devid mmụọ nsọ, ya arịọ ya ụdị arịrịọ ahụ.

5. Olee otú Jehova si were ndị agadi kwesịrị ntụkwasị obi?

5 Akwụkwọ Nsọ mere ka o doo anya na Jehova ji ndị agadi kwesịrị ntụkwasị obi kpọrọ ihe, chọọkwa ka ndị ohu ya na-asọpụrụ ha. (Ọma 22:24-26; Ilu 16:31; 20:29) Levitikọs 19:32 kwuru, sị: “Ị ga-ebiliri onye isi awọ́, sọpụkwara onye mere agadi, tụọkwa egwu Chineke gị. Abụ m Jehova.” Mgbe e dere ihe a, ndị ohu Chineke anaghị eji ịsọpụrụ ndị agadi egwu egwu. Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Ma, ònye kwesịrị ịna-elekọta ndị agadi?

IHE EZINỤLỌ KWESỊRỊ IME

6. Olee otú Jizọs si gosi na ya na-elekọta nne ya?

6 Baịbụl sịrị: “Sọpụrụ nna gị na nne gị.” (Ọpụ. 20:12; Efe. 6:2) Jizọs gosiri na iwu a dị mkpa. Ọ bụ ya mere o ji katọọ ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ na-ekweghị egboro ndị mụrụ ha mkpa ha. (Mak 7:5, 10-13) Jizọs mere ihe anyị kwesịrị ịmụta. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ nọ n’elu osisi ịta ahụhụ, ọ gwara Jọn, bụ́ onye na-eso ụzọ ya ọ hụrụ n’anya, ka o lekọtawa nne ya bụ́ Meri. O nwere ike ịbụ na di Meri anwụọla mgbe ahụ.—Jọn 19:26, 27.

7. (a) Olee ihe Pọl kwuru gbasara igboro ndị nne na nna mkpa ha? (b) Olee ihe ọzọ Pọl kwuru?

7 N’akwụkwọ ozi Pọl degaara Timoti, o kwuru na Ndị Kraịst kwesịrị ịna-elekọta ndị ezinụlọ ha. (Gụọ 1 Timoti 5:4, 8, 16.) Pọl kwuru ihe a mgbe ọ na-akọwa ndị ọgbakọ nwere ike iwepụta ego nyere aka. Pọl kwuru na ọ bụrụ na e nwere nwanna nwaanyị di ya nwụrụ nke mere agadi, ọ bụ ụmụ ya, ụmụ ụmụ ya, na ndị ikwu ya ndị ọzọ bụ́ Ndị Kraịst bụ ndị mbụ kwesịrị ịna-elekọta ya. E mee ya otú ahụ, ọ ga-eme ka ọgbakọ ghara ibu ibu arọ. Taa, otu ụzọ anyị nwere ike isi gosi na anyị ‘na-asọpụrụ Chineke’ bụ ịna-egboro ndị ezinụlọ anyị mkpa ha.

8. Gịnị mere na Baịbụl ekwughị hoo haa otú a ga-esi na-elekọta ndị agadi?

8 Ọ bụrụ na mmadụ nwere ụmụ toro eto na-efe Chineke, ha kwesịrị ịhụ na a na-elekọta ya. Ihe Pọl na-ekwu bụ inyere ndị ikwu anyị bụ́ Ndịàmà Jehova aka, ma ọ pụtaghị na anyị ga-eleghara nne na nna anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova anya. Otú ihe si dịrị ezinụlọ dị iche iche. N’ihi ya, ezinụlọ nke ọ bụla ga-ekpebi otú ha ga-esi na-elekọta onye ezinụlọ ha. Onye  ọ bụla nwere àgwà nke ya, ihe ndị dị ya mkpa, na ihe na-arịa ya. E nwere ndị agadi mụrụ ọtụtụ ụmụ, nwee ndị nke mụrụ naanị otu nwa. Ụfọdụ nwere ike inweta enyemaka ndị ọchịchị, ebe ndị ọzọ na-agaghị enwetali. Ihe onye agadi chọrọ dị iche n’ihe ibe ya chọrọ. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịkatọ otú mmadụ si elekọta ndị ezinụlọ ya mere agadi. Ọ bụrụ na anyị ejiri Baịbụl kpebie ihe anyị ga-eme, Jehova nwere ike ịgọzi ya otú ahụ o si emere ndị ya kemgbe oge Mozis.—Ọnụ Ọgụ. 11:23.

9-11. (a) Olee ihe nwere ike isiri ụfọdụ ndị ike ikpebi? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Ọ bụrụ na mmadụ nwere nne na nna mere agadi, gịnị mere o kwesịghị ịkwụsị ozi oge niile ọ na-eje ozugbo ihe mere? Nye ihe atụ.

9 Ọ bụrụ na ebe ndị agadi bi dị anya n’ebe ụmụ ha bi, o nwere ike isiri ụmụ ha ike inyere ha aka. E nwere ike ịkpọ ụmụ ha mgbe ọ bụla ka ha gbara bịa lee papa ha ma ọ bụ mama ha n’ihi na ọ dara ada, gbajie ụkwụ ma ọ bụ aka, ma ọ bụkwanụ n’ihi nsogbu ọzọ tara akpụ. Ndị mụrụ ha nwere ike chọọ ka e nyere ha aka obere oge ma ọ bụ ogologo oge. *

10 Ihe ụfọdụ nwere ike isiri ụmụ ike ikpebi ma ọ bụrụ na ha na-eje ozi oge niile n’ebe dị anya n’ebe ndị mụrụ ha bi. Ndị na-eje ozi na Betel, ndị ozi ala ọzọ, na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ma na ozi ha na-eje bụ ezigbo ihe ùgwù Jehova nyere ha. Ma, ọ bụrụ na papa ha ma ọ bụ mama ha na-arịa ọrịa, ihe mbụ nwere ike ịgbata ha n’obi bụ ịkwụsị ozi ha ka ha nwee ike ịga lekọta ya. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee, ha kwesịrị ikpe ekpere ma chọpụta ihe dị papa ha ma ọ bụ mama ha mkpa ma ọ bụkwanụ ihe ọ chọrọ. Mmadụ ekwesịghị ịkwụsị ozi oge niile ọ na-eje ozugbo ihe mere. Mgbe ụfọdụ, ọ gadịghị adị mkpa ka mmadụ mee otú ahụ. Onye nne ya ma ọ bụ nna ya na-arịa ọrịa kwesịrị ibu ụzọ chọpụta ma ọrịa ahụ ò nwere ike ịla ngwa ngwa nakwa ma ò nwere ndị ọgbakọ mama ya ma ọ bụ papa ya obi ga-adị ụtọ inyere ya aka.—Ilu 21:5.

11 Dị ka ihe atụ, na Japan, e nwere otu di na nwunye mere agadi. Ụmụ nwoke abụọ ha mụrụ na-eje ozi n’ebe dị anya. Otu bụ onye ozi ala ọzọ na Paragụwaị. Onye nke ọzọ ana-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Bruklin, Niu Yọk. Mgbe ndị mụrụ ha chọrọ enyemaka, ha abụọ na nwunye ha gara ka ha mara ihe e nwere ike imere ha. Ka oge na-aga, onye nke ya na nwunye ya na-eje ozi ala ọzọ bidoro iche ma hà ga-akwụsị ozi ha gaa na-elekọta ndị mụrụ ha. Onye na-ahaziri òtù ndị okenye ọrụ n’ọgbakọ papa ha na mama ha kpọrọ ha n’ekwentị. Ndị okenye elebachaala anya ná nsogbu ahụ ma chọọ ka ndị ozi ala ọzọ ahụ na-eje ozi ha. Obi dị ndị okenye ụtọ maka ozi ha na-eje. Ha kpebiri inyere ha aka na-elekọta ndị mụrụ ha ka ha nwee ike ịna-eje ozi ha. Obi dị ndị ezinụlọ ahụ ụtọ maka ihe a ndị okenye meere ha.

12. Gịnị kwesịrị ịkacha ezinụlọ Ndị Kraịst mkpa mgbe ha na-ekpebi otú ha ga-esi na-elekọta ndị mụrụ ha mere agadi?

12 Ndị Kraịst kwesịrị ịgba mbọ ka otú ha kpebiri isi na-elekọta ndị mụrụ ha mere agadi wetara Jehova otuto. Anyị ekwesịghị ime ka ndị ndú okpukpe n’oge Jizọs. (Mat. 15:3-6) Anyị chọrọ ịsọpụrụ Jehova na ọgbakọ ya.—2 Kọr. 6:3.

IHE ỌGBAKỌ KWESỊRỊ IME

13, 14. Olee ihe Baịbụl kwuru nke gosiri na ọgbakọ kwesịrị ịna-egboro ndị agadi mkpa ha?

13 Ọ bụghị ọgbakọ niile ga-enyeliri  ndị nọ n’ozi oge niile ụdị aka ahụ ọgbakọ ahụ anyị kwuru okwu ya nyeere ha. Ma, ihe Baịbụl kwuru gosiri na ọgbakọ kwesịrị ịgbalịsi ike na-enyere ndị agadi na-eme nke ọma n’ọgbakọ aka. Ọrụ Ndịozi kwuru na ‘ọ dịghị onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ dị na Jeruselem ihe kọrọ.’ Ọ pụtaghị na ndị niile nọ n’ọgbakọ ahụ bara ọgaranya. E nwere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha, ma a na-enye onye ọ bụla ihe ‘dị ka mkpa o nwere si dị.’ (Ọrụ 4:34, 35) E mechara nwee nsogbu n’ọgbakọ ahụ. E bidoro ileghara ụfọdụ ‘ndị inyom di ha nwụrụ anya n’ihe ndị a na-ekesa kwa ụbọchị.’ Gịnị ka ndịozi mere? Ha họpụtara ụmụ nwoke ruru eru ka ha hụ na e nyere ndị inyom ahụ di ha nwụrụ nri e kwesịrị inye ha. (Ọrụ 6:1-5) Ihe mere e ji mee otú ahụ bụ na, na Pentikọst afọ 33, ọtụtụ ndị si ebe dị iche iche bịa Jeruselem ma ghọọ Ndị Kraịst. Ha nọtụkwuru ka e mee ka okwukwe ha sikwuo ike. N’ihi ya, n’agbanyeghị na e kesaraghị ha nri ahụ ruo ogologo oge, ihe a ndịozi mere gosiri na ọgbakọ nwere ike igboro ụmụnna mere agadi na-eme nke ọma mkpa ha.

14 Pọl gwara Timoti mgbe ọgbakọ kwesịrị igboro Ndị Kraịst di ha nwụrụ mkpa ha. (1 Tim. 5:3-16) Jems si n’ike mmụọ nsọ dee na Ndị Kraịst kwesịrị ịna-elekọta ụmụ mgbei, ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, na ndị ọzọ ihe na-esiri ike. (Jems 1:27; 2:15-17) Jọn onyeozi kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke nwere ihe ụwa a nke e ji ebi ndụ ma hụ nwanna ya ka ọ nọ ná mkpa, ma o nweghị ọmịiko n’ebe ọ nọ, olee otú ịhụnanya maka Chineke si dịrị n’ime ya?” (1 Jọn 3:17) Ọ bụrụ na a gwara Onye Kraịst ọ bụla ka ọ na-egboro ndị ihe na-esiri ike mkpa ha, ọ̀ bụ na ọgbakọ ekwesịghị ịna-eme otú ahụ?

Ọ bụrụ na onye agadi enwee ihe mberede, olee otú ọgbakọ nwere ike isi nye aka? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 na nke 16)

15. Olee ihe a ga-eji ama ụdị aka e kwesịrị inyere ụmụnna mere agadi?

15 N’obodo ụfọdụ, ndị ọchịchị na-enyere ndị mere agadi aka. Ha na-akwụ ha ụgwọ ezumike nká ma na-emere ha ihe ndị ọzọ. (Rom 13:6) Ma, e nwere ebe ndị a na-anaghị emere ha otú ahụ. N’ihi ya, ọ bụ otú ihe si dị n’obodo ka ndị ikwu na ọgbakọ ga-eji ama ụdị aka ha ga-enyere ndị agadi. Ọ bụrụ na ebe ndị agadi bi dị anya n’ebe ụmụ ha bụ́ Ndị Kraịst bi, o nwere ike isiri ụmụ ha ike ịna-emere ha ihe niile. Ha na ndị okenye  ọgbakọ mama ha na papa ha kwesịrị ịkparịta ya, ka mmadụ niile mara otú ihe si dịrị ezinụlọ ha. Dị ka ihe atụ, ndị okenye nwere ike inyere mama ha na papa ha aka ịmata ihe ndị ọchịchị na-emere ndị agadi ma nyere ha aka ka ha nweta ihe ndị ahụ. Ha nwekwara ike ịchọpụta ihe ụfọdụ ụmụ ha kwesịrị ịma, dị ka akwụkwọ ozi ndị mụrụ ha na-emepebeghị, ma ọ bụkwanụ ọgwụ ha na-aṅụbeghị. Ọ bụrụ na ụmụ ha na ndị okenye ana-ekwurịta okwu nke ọma, o nwere ike ime ka ihe ghara ịka njọ, meekwa ka a mara ihe e kwesịrị ime. Ọ bụrụ na e nwere onye nọ nso nke ga na-elekọta ndị agadi ma na-agwa ụmụ ha bi n’ebe dị anya otú ihe si aga, o nwere ike ime ka ụmụ ha ghara ịna-echegbu onwe ha.

16. Olee otú ụmụnna ụfọdụ si enyere ndị agadi nọ n’ọgbakọ aka?

16 Ụmụnna hụrụ ndị agadi n’anya. N’ihi ya, ụfọdụ Ndị Kraịst ewepụtala onwe ha na-emere ha ihe ọ bụla ha nwere ike imere ha. Ha weere ndị agadi ahụ ka nne ha na nna ha. Ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ na-eke otú a ga-esi elekọta ha eke. Ọ bụ eziokwu na ụmụnna a nwere obiọma agaghị anọli n’ozi oge niile, ha na-enyere ụmụnna mere agadi aka ka ụmụ ha nwee ike ịna-eje ozi oge niile ha na-eje. Ihe a ụmụnna a na-eme magburu onwe ya. N’agbanyeghị na ha na-enyere ụmụnna ndị ahụ mere agadi aka, ụmụ ha ka kwesịrị ịgbalịsi ike na-emere ha ihe niile ha nwere ike imere ha.

NA-AGWA NDỊ AGADI IHE GA-AGBA HA UME

17, 18. Olee ihe ndị agadi na ndị na-elekọta ha ga-eme ka ilekọta ndị agadi dị mfe?

17 Ọ bụrụ na obi na-adị ndị agadi na ndị na-elekọta ha ụtọ, ọ ga-eme ka ihe dịtụ mfe. Mgbe ụfọdụ, nká nwere ike ime ka obi na-ajọ mmadụ njọ. N’ihi ya, mmadụ ga-agba ezigbo mbọ tupu ya agbaa ndị agadi ume ma sọpụrụ ha. Olee otú i nwere ike isi mee ya? Na-agwa ha ihe ndị ga-eme ka obi dị ha mma. Ndị agadi a na-ejere Jehova ozi kemgbe ọtụtụ afọ. N’ihi ya, e kwesịrị ịna-aja ha mma. Jehova anaghị echefu ihe niile ha mere n’ozi ya. Otú ahụkwa ka ọ dị anyị.—Gụọ Malakaị 3:16; Ndị Hibru 6:10.

18 Ime ihe ndị a na-eme kwa ụbọchị ga-adị mfe ma ọ bụrụ na ndị agadi na ndị na-elekọta ha ana-achịtụ ọchị. (Ekli. 3:1, 4) Ọtụtụ ndị agadi na-agbalị ka ha ghara ịbụ emeta emeta. Ha ghọtara na ọ bụrụ na ha adịghị obiọma, ndị mmadụ nwere ike ịna-agbara ha ọsọ. Ọtụtụ mgbe, ndị gara leta ndị agadi na-ekwu, sị: “M gara ịgba enyi m katarala ahụ́ ume, ma ọ bụzi m ka ọ gbara ume.”—Ilu 15:13; 17:22.

19. Gịnị ga-enyere anyị niile aka ka anyị ghara ịda mbà mgbe nsogbu bịaara anyị?

19 Anyị na-atụsi anya ike mgbe nká, ahụhụ, na ezughị okè na-agazighị adị. Ka ọ dị ugbu a, ndị ohu Chineke kwesịrị ime ka olileanya ha dịrị n’ihe Chineke ga-emere ha nke ga-adịru mgbe ebighị ebi. Anyị ma na ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe ná nkwa Chineke, ọ ga-eme ka anyị ghara ịda mbà mgbe nsogbu bịaara anyị. N’ihi okwukwe anyị nwere, “anyị adịghị ada mbà, kama ọ bụrụgodị na mmadụ anyị bụ n’elu ahụ́ na-ala n’iyi, n’ezie, a na-eme ka mmadụ anyị bụ n’ime dị ọhụrụ kwa ụbọchị.” (2 Kọr. 4:16-18; Hib. 6:18, 19) Olee ihe ndị ọzọ nwere ike inyere anyị aka ịna-elekọta ndị agadi? A ga-atụle ha n’isiokwu na-esonụ.

^ para. 9 N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle otú ụmụ nwere ike isi na-elekọta nne ha na nna ha mere agadi.