Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MACH 2014

Otú A Ga-esi Na-elekọta Ndị Agadi

Otú A Ga-esi Na-elekọta Ndị Agadi

“Ụmụntakịrị, ka anyị hụ ụmụnna anyị n’anya, ọ bụghị n’ọnụ ma ọ bụ n’ire, kama n’omume nakwa n’eziokwu.”—1 JỌN 3:18.

1, 2. (a) Olee nsogbu ọtụtụ ezinụlọ nwere, oleekwa ajụjụ ndị ha ga-echebara echiche? (b) Olee otú ndị nne na nna na ụmụ ha ga-esi jikere maka nsogbu ndị ha na nká na-eso?

O NWERE mgbe ahụ́ na-agbasi ndị nne na nna ike, ha ejiri aka ha na-emere onwe ha ihe niile. Ọ na-agbawa obi ma mmadụ hụ ka ndị mụrụ ya na-enwezighị ike ime otú ahụ. I nwere ike ịnụ na mama gị ma ọ bụ papa gị dara ada gbajie úkwù. I nwekwara ike ịnụ na isi akpakọzighị ya ọnụ, na ọ kpafuola, ma ọ bụkwanụ na ọ na-arịa ọrịa. Ma, o nwere ike isiri ndị agadi ike ikweta na ihe agbanweela nakwa na ha agaghịzi emeli ihe ndị ha na-emebu. (Job 14:1) Gịnị ka a ga-eme ma ụdị ihe a mee? Olee otú a ga-esi na-elekọta ha?

2 Otu akwụkwọ nke kọrọ banyere ilekọta ndị agadi kwuru na ọ naghị adị mfe ikwuwe maka nsogbu mmadụ na-enwe ma ọ kaa nká. Ma, ọ bụrụ na ezinụlọ eburu ụzọ kwurịta ya, ọ ga-eme ka ha mara ihe ha ga-eme ma e nwee nsogbu. Anyị kwesịrị icheta na o nweghị otú mmadụ ga-esi gbaara nsogbu ya na nká na-eso ọsọ. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka ezinụlọ jikere ejikere. Ka anyị tụlee otú ezinụlọ ga-esi jiri otu obi kpebie ihe a ga-eme n’agbanyeghị na ọ dịghị mfe.

IJIKERE MAKA NSOGBU NDỊ HA NA NKÁ NA-ESO

3. Gịnị ka ezinụlọ kwesịrị ime ma onye agadi chọkwuo enyemaka? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

3 O nwere mgbe ọ na-eru, ọtụtụ ndị agadi agaghịzi elekọtali  onwe ha, ya adị mkpa ka e nwee onye ga na-elekọta ha. (Gụọ Ekliziastis 12:1-7.) Ụdị ihe a mee, ha na ụmụ ha kwesịrị ikpebi otú kacha mma a ga-esi na-elekọta ha na ihe ha ga-emeli. Ọ ka mma ka ezinụlọ nọkọta ọnụ kpebie ụdị aka a ga-enyere onye agadi, otú a ga-esi enye ya, na ihe onye ọ bụla kwesịrị ime. Mmadụ niile kwesịrị ikwu ihe ga-ekwe omume, onye ọ bụla ekwuokwa otú ọ dị ya n’obi. Ha ga-ekwurịta ma papa ha na mama ha hà ga-ebili naanị ha ma e nwee onye ga na-enyere ha aka. * Ha ga-ekwurịtakwa ihe onye ọ bụla n’ime ha ga na-eme ka ha nwee ike ịna-elekọta papa ha na mama ha. (Ilu 24:6) Dị ka ihe atụ, ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịna-enyere ha aka kwa ụbọchị, ndị ọzọ ana-eweta ego a ga-eji na-elekọta ha. Onye ọ bụla kwesịrị ịma ọrụ ya. Ma, ka oge na-aga, e nwere ike ịgbanwe ihe otu onye na-arụ ka onye ọzọ rụtụ ya.

4. Olee ebe ndị ezinụlọ nwere ike inweta enyemaka?

4 I lekọtawa onye agadi, gbalịa mụta ihe niile i nwere ike ịmụta gbasara ọrịa ya. Ọ bụrụ na ihe ọ na-arịa ga na-aka njọ, mụta ihe ọrịa ahụ nwere ike ime ya n’ọdịnihu. (Ilu 1:5) Ọ bụrụ na e nwere ụlọ ọrụ gọọmenti na-enyere ndị agadi aka n’obodo unu, i nwere ike gakwuru ha. Chọpụta ma è nwere ihe obodo na-emere ndị agadi, nke ga-eme ka ilekọta ha dịkwuo mfe ma ka mma. I cheta ihe niile dị n’ilekọta ndị agadi, obi nwere ike ịwụnye gị n’afọ, obi ana-ajọ gị njọ, ma ọ bụkwanụ ị gaghị ama ihe ị ga-eme eme. Ọ́ dị otú ahụ, kọọrọ ya enyi gị ị tụkwasịrị obi. Nke ka nke, gwa Jehova otú obi dị gị. Ọ ga-eme ka obi ruo gị ala ka i nwee ike idi ihe bịaara gị.—Ọma 55:22; Ilu 24:10; Fil. 4:6, 7.

5. Gịnị mere o ji dị mma ibu ụzọ mata otú a ga-esi lekọta onye agadi tupu nsogbu abịa?

5 Ọ dị mma ka onye agadi na ndị ezinụlọ ya kparịta ụzọ dị iche iche e nwere ike isi lekọta ya tupu nsogbu abịa. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ikpebi ma ọ̀ ga-ebi na nke nwa ya, ma à ga-akpọga ya n’ebe a na-elekọta ndị agadi, ma ọ bụkwanụ kpọtara ya onye ga na-elekọta ya. Ezinụlọ ga-esi otú ahụ jikere maka “nsogbu na ihe ọjọọ” nwere ike ịbịara onye agadi. (Ọma 90:10) Ọ bụrụ na ezinụlọ ebughị ụzọ kpebie ihe ha ga-eme, o nwere ike ime ka ha mee mkpebi ọkụ ọkụ mgbe nsogbu mechara bịa. Otu ọkachamara kwuru na “ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ oge kacha njọ mmadụ ga-eji kpebie ụdị ihe ahụ.” Ọ bụrụ na ihe gbata gbata emee, ndị ezinụlọ nwere ike ịchị obi n’aka, ha nwekwara ike inwe nghọtahie. Ma, ọ bụrụ na e bula ụzọ kpebie ihe a ga-eme, ọ ga-adị mfe ime ya eme.—Ilu 20:18.

Ezinụlọ nwere ike izukọta kwurịta otú ha ga-esi enyere papa ha ma ọ bụ mama ha mere agadi aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6 ruo 8)

6. Gịnị mere o ji dị mma ka ezinụlọ kwurịta ebe onye agadi ga-ebi na otú a ga-esi na-elekọta ya ma o mechaa dị mkpa?

6 O nwere ike isiri gị ike ịgwa ndị mụrụ gị banyere ịgbanwe ihe ụfọdụ n’ụlọ ha ma ọ bụkwanụ na ha nwere ike ịkwapụ otu ụbọchị. Ma, ọtụtụ ndị ekwuola na ibu ụzọ kparịta ụdị ihe ahụ mechara baara ha uru. N’ihi gịnị? N’ihi na obi ruru onye ọ bụla ala, mmadụ niile akparịta ihe a ga-eme tupu e nwee nsogbu. Ọ bụrụ na ezinụlọ ezukọta mgbe ahụ́ ruru ha ala, onye ọ bụla ekwuo ihe o chere, ọ ga-eme ka ha hụkwuo ibe ha n’anya, meekwa ka ha ghọta na ha bụ ụmụnne. Ọ bụrụgodị na ndị agadi chọrọ ka naanị ha biri ma jiri aka ha na-emere onwe ha ihe, ọ ga-aba ezigbo uru ma ọ bụrụ na ha na ụmụ ha ekwurịta otú ha chọrọ ka e si na-elekọta ha ma ha nwee nsogbu.

7, 8. Gịnị ka ezinụlọ kwesịrị ikwurịta, ọ̀ bụ n’ihi gịnị?

7 Ndị nne na nna, mgbe unu na ụmụ unu na-ekwurịta ihe ndị ahụ, gwanụ ha  ihe unu bu n’obi, otú akpa unu hà, na ihe unu chọrọ ka e meere unu. Ọ ga-eme ka ha kpebie ihe ga-adị unu mma mgbe unu na-agaghị emeli mkpebi n’onwe unu. Ha nwere ike imere unu ihe unu chọrọ ma hapụ unu ka unu jiri aka unu na-emere onwe unu ihe ndị unu ga-emeli. (Efe. 6:2-4) Dị ka ihe atụ, ị̀ chọrọ ka nwa gị kpọrọ gị, ka ò nwere ihe ọzọ ị chọrọ ka e meere gị? Atụla anya ihe na-agaghị ekwe omume. Cheta na ihe i bu n’obi nwere ike ịdị iche n’ihe ndị ezinụlọ gị bu n’obi. Ọ na-ewe oge tupu mmadụ agbanwee obi ya kweta ka e mee ihe ndị ọzọ kwuru.

8 E nwere ike ịgbara ọtụtụ nsogbu ọsọ ma ọ bụrụ na e buru ụzọ hazie ihe a ga-eme ma kwurịta ya nke ọma. (Ilu 15:22) Gị na ezinụlọ gị kwurịta ụzọ dị iche iche e si agwọ ọrịa na otú ị chọrọ ka e si gwọọ gị. Unu kwesịrị iji ihe ndị e dere na kaadị DPA kwurịta ya. E nwee ụzọ ọ bụla a chọrọ isi agwọ onye ọrịa, e kwesịrị ịgwa ya ka o nwee ike ikpebi ma ọ̀ ga-ekweta ma ọ̀ ga-ajụ. Mmadụ kwesịrị ide otú ọ chọrọ ka e si gwọọ ya na kaadị DPA ya. Ọ bụrụ na onye ahụ edee onye ga-ekwuchite ọnụ ya na kaadị ahụ, ọ ga-eme ka ọ bụrụ onye ọ tụkwasịrị obi ga-ekpebiri ya ihe ụfọdụ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. E dejupụtachaa kaadị DPA ahụ, e kwesịrị iji ígwè kọpị kọpị mee ka ọ dị ọtụtụ. Onye agadi ga-ejide otu, onye na-elekọta ya ejide otu, onye ga-ekwuchite ọnụ ya n’ụlọ ọgwụ ejide otu a dịghị ama ama. Ụfọdụ ndị agadi na-edewe kaadị DPA ha n’ebe ha dewere akwụkwọ ha ji kee ékpé nakwa akwụkwọ ndị ọzọ dị mkpa, dị ka akwụkwọ ịnshọransị, akwụkwọ ụlọ akụ̀, na akwụkwọ ha na ndị gọọmenti ji mekọọ ihe.

IHE A GA-EME MA IHE GBANWEE

9, 10. Olee mgbe ụmụ kwesịrị inyekwuru ndị mụrụ ha aka?

9 Ọtụtụ mgbe, mmadụ niile nọ n’ezinụlọ na-ahapụ ndị agadi ka ha na-emere onwe ha ihe ndị ha ga-emeli. Ọ bụrụhaala na onye agadi ga-ejili aka ya sie nri, zaa ụlọ, ṅụọ ọgwụ, ya abụrụkwa na ọ na-ekwu okwu nke ọma, o nwere ike ọ gaghị adị mkpa ka ụmụ ya mewere ya ihe niile. Ma, ka oge na-aga, ọ bụrụ na ịga ije esiwere ya ike, ma ọ bụ na ọ naghị agali ahịa, ma ọ bụkwanụ na ọ na-echefukarị ihe, ụmụ ya nwere ike ịchọ otú ha ga-esi nyere ya aka.

10 Ihe nwere ike ịna-agba onye agadi gharịị ma ọ bụkwanụ ike ụwa ana-agwụ ya. O nwere ike ịna-aba onwe ya mamịrị. O nwekwara ike ọ gaghị na-anụcha ihe, na-ahụcha ụzọ, ma ọ bụ na-echeta ihe. Ụdị ihe a bido ime ya, e kwesịrị ịkpọ ya gaa ụlọ ọgwụ. Ụmụ ya nwere ike ikpebi mgbe ọ ga-aga ụlọ ọgwụ nakwa ihe ndị ọzọ ọ gaara eji aka ya ekpebi. Ha nwere ike iji aka ha na-akpọ ya aga ụlọ ọgwụ, jiri aka ha gwa dọkịta okwu, deekwa ihe ndị o kwesịrị ide. Ha mee otú ahụ, ọ ga-eme ka e lekọta ya nke ọma.—Ilu 3:27.

11. Olee otú e nwere ike isi mee ka mgbanwe a ga-eme mara onye agadi ahụ́?

11 Ọ bụrụ na ihe na-eme onye agadi  agaghị ala ala, e nwere ike ịgbanwe otú e si elekọta ya ma ọ bụ gbanwee ihe ụfọdụ n’ebe o bi. Ọ bụrụ na a gbanwee ihe ole na ole, o nwere ike ọ gaghị esi ike ya amara onye agadi ahụ́. Ọ bụrụ na ebe i bi dị anya n’ebe ndị mụrụ gị bi, o nwere ike naanị ihe ị ga-eme bụ ịgwa otu nwanna ma ọ bụ onye agbata obi ha ka ọ na-aga eleta ha ma na-agwa gị otú ihe si aga. Naanị ihe ha chọrọ ọ̀ bụ ka a na-esiri ha nri ma na-azara ha ụlọ? A gbanwee ihe ụfọdụ n’ụlọ ha, ọ̀ ga-eme ka ọ dịrị ha mfe ịgagharị, saa ahụ́, ma mee ihe ndị ọzọ n’emerụghị onwe ha ahụ́? O nwere ike, naanị ihe a ga-emere onye agadi ka naanị ya biri bụ inwe onye ga na-abịa enyere ya aka. Ma, ọ bụrụ na ihe nwere ike imebi ma o biri naanị ya, e nwere ike ịchọ otú a ga-esi na-enyere ya aka mgbe niile. Otú ọ bụla ihe si dị, chọpụta ihe a na-emere ndị agadi n’ebe ha bi. *Gụọ Ilu 21:5.

IHE ỤFỌDỤ NDỊ MEERE NDỊ MỤRỤ HA MERE AGADI

12, 13. Gịnị ka ụfọdụ ndị merela iji gosi na ha na-asọpụrụ ndị nne na nna ha bi n’ebe dị anya ma na-elekọta ha?

12 Anyị hụrụ ndị mụrụ anyị n’anya. N’ihi ya, anyị chọrọ ka ahụ́ ruo ha ala nakwa ka ihe ghara ime ha. Ọ bụrụ na a na-elekọta ha nke ọma, ọ ga-eme ka obi ruo anyị ala. Ma, ọtụtụ ndị bi ebe dị anya n’ebe ndị mụrụ ha bi. Ụfọdụ n’ime ha na-eji oge ezumike ha aga eleta ndị mụrụ ha ma meere ha ihe ndị ha na-anazighị emeli n’onwe ha. Ha nwere ike ịna-akpọ ndị mụrụ ha n’ekwentị mgbe niile ma ọ bụ kwa ụbọchị, na-edegara ha akwụkwọ ozi, ma ọ bụ na-ezigara ha ozi iimel. Ha mee otú ahụ, ọ ga-egosi na ha hụrụ ha n’anya.—Ilu 23:24, 25.

13 Ọ bụrụgodị na gị na ezinụlọ gị bi ebe dị anya, ị ka kwesịrị ikpebi ihe a ga na-emere ndị mụrụ gị kwa ụbọchị ka e nwee ike ịna-elekọta ha. Ọ bụrụ na gị na ha ebighị nso, ma ya abụrụ na ha bụ Ndịàmà Jehova, i nwere ike ịjụ ndị okenye ọgbakọ ha ihe e nwere ike ime. Echefukwala itinye ndị mụrụ gị n’ekpere. (Gụọ Ilu 11:14.) Ị ka kwesịrị ịsọpụrụ “nna gị na nne gị,” ọ bụrụgodị na ha abụghị Ndịàmà Jehova. (Ọpụ. 20:12; Ilu 23:22) Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe otu ezinụlọ kpebiri ime nwere ike ịdị iche n’ihe ezinụlọ ọzọ kpebiri. Ụfọdụ na-akpọrọ nne ha ma ọ bụ nna ha mere agadi ka ha na ya biri ma ọ bụkwanụ ka o biri n’ebe ga-adị ha nso. Ma, o nwere mgbe ọ na-agaghị ekwe omume. Ụfọdụ anaghị achọ ka ha na ụmụ ha na ndị ezinụlọ ha biri. Ọ na-akara ha mma ibi naanị ha n’ihi na ha achọghị ịbụrụ ụmụ ha ibu arọ. Ụfọdụ ndị agadi nwere ego. N’ihi ya, ha nwere ike kpebie ibi na nke ha ma na-akwụ onye ga na-elekọta ha ụgwọ.—Ekli. 7:12.

14. Ọ bụrụ na a hapụ otu onye ka ọ na-elekọta nne ya ma ọ bụ nna ya mere agadi, olee nsogbu o nwere ike ịkpata?

14 N’ọtụtụ ezinụlọ, ọ na-adị ka à hapụụrụ otu onye ọrụ ilekọta nne ya ma ọ bụ nna ya mere agadi. Ọ na-abụkarị onye nke kacha biri ya nso. Ma, ọ bụrụ na mmadụ na-elekọta nne ya na nna ya mere agadi, o kwesịghị ime ka o leghara ezinụlọ nke ya anya. O nwere ihe ụfọdụ mmadụ na-agaghị emeli, o nweghịkwa onye nwere oge niile dị n’ụwa. Ọ bụrụ na ọnọdụ onye na-elekọta ha agbanwee, o nwere ike ịdị mkpa ka e lebagharịa anya n’otú e si elekọta ha. Ihe ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ hapụụrụ otu onye ka ọ na-eme ọ̀ karịrị akarị? Hà nwere ike nyekwuo aka, ma ọ bụkwanụ e mee ya onye lekọtatụ, ibe ya elekọtatụ?

15. Gịnị ka e nwere ike ime ka ike ghara ịgwụ onye na-elekọta papa ya ma ọ bụ mama ya mere agadi?

15 Ọ bụrụ na o nweghị ihe onye agadi na-emeli n’onwe ya, o nwere ike ime ka ike na-agwụ onye na-elekọta ya. (Ekli. 4:6) Ndị  hụrụ nne ha na nna ha n’anya kwesịrị ime ihe niile ha nwere ike ime ka e lekọta ha. Ma ilekọta ha nwere ike ịna-ebu ha aka. Ndị na-elekọta ndị agadi mgbe niile kwesịrị ịma ihe ha ga-emeli na ihe ha na-agaghị emeli. Ha nwere ike ịrịọ ka e nyere ha aka. Ọ bụrụ na ọ na-abụ a gụrụ gụrụ, a gaa nyere ha aka, o nwere ike ọ gaghị adị mkpa ka a kpọga ha n’ebe a na-elekọta ndị agadi.

16, 17. Olee otú obi nwere ike ịdị mmadụ mgbe ọ na-elekọta ndị mụrụ ya mere agadi? Gịnị ga-enyere ya aka ịmata ihe o kwesịrị ime, obi ajụrụkwa ya? (Kwuo ihe dị n’igbe bụ́ “Onye Ji Obi Ụtọ Na-elekọta Nne Ya na Nna Ya Mere Agadi.”)

16 Ọ na-ewute anyị ma anyị hụ ihe nká mere ndị mụrụ anyị anyị hụrụ n’anya. Mgbe ụfọdụ, obi na-ajọ onye na-elekọta ndị agadi njọ, ya ana-echegbu onwe ya, obi ana-amapụ ya, iwe ana-ewe ya, obi ana-ama ya ikpe, ọsụkọsụ ana-asụ ya. Mgbe ụfọdụ, onye agadi nwere ike ikwu okwu ọjọọ ma ọ bụ mee ka obi adịghị ya ụtọ maka ihe a na-emere ya. Mgbe ọ bụla o mere otú ahụ, ewesala ya iwe. Otu dọkịta kwuru na mgbe ọ bụla obi na-adịghị anyị mma, anyị ekwesịghị ime ka nsogbu adịghị. Anyị kwesịrị ịgba mbọ ka ọ ghara ime ka anyị wesawa onwe anyị iwe. Gwa di gị ma ọ bụ nwunye gị otú obi dị gị. I nwekwara ike ịgwa ya onye ọzọ nọ n’ezinụlọ unu ma ọ bụ enyi gị ị tụkwasịrị obi. I mee otú ahụ, o nwere ike ime ka ị mara ihe i kwesịrị ime, obi ajụrụkwa gị.

17 E nwere ike inwe mgbe ezinụlọ na-agaghịzi enwe ego ha ga-eji na-elekọta onye agadi n’ụlọ, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha amaghịzi otú ha ga-esi na-elekọta ya n’ụlọ. Ụdị ihe a mee, o nwere ike ịdị mkpa ka a chọọ otú a ga-esi na-elekọtakwu ya ehihie na abalị. E nwere otu nwanna nwaanyị a kpọgara mama ya n’ebe a na-elekọta ndị agadi. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ọ na-aga eleta ya kwa ụbọchị. O kwuru, sị: “Anyị enweghị ike ịna-elekọta ya ehihie na abalị. Ọ dịrịghị anyị mfe ikweta ka a kpọga ya n’ebe a na-elekọta ndị agadi. O nyere anyị nsogbu n’obi. Ma, ọ bụ ihe kacha mma anyị meere ya ọnwa ole na ole tupu ya anwụọ. O kwetara ka anyị kpọga ya ebe ahụ.”

18. Ọ bụrụ na mmadụ na-elekọta nne ya na nna ya mere agadi, olee uru ọ ga-erite?

18 Ilekọta ndị nne na nna mere agadi anaghị adị mfe. O nwere ike ime ka obi na-ajọ mmadụ njọ. E nweghị naanị otu ụzọ e kwesịrị isi na-elekọta ndị agadi. Ma, ọ bụrụ na ezinụlọ ejikere ejikere, kwurịta ihe a ga-eme, na-emekọ ihe ọnụ, nke ka nke, na-ekpe ekpere, ọ ga-enyere ha aka ilekọta papa ha na mama ha mere agadi. Ha ga-esi otú ahụ gosi na ha na-asọpụrụ ha. Ha mee otú ahụ, obi ga na-adị ha ụtọ n’ihi na ha na-elekọta ndị mụrụ ha nke ọma. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 13:4-8.) Ihe kacha mkpa bụ na obi ga-eru ha ala, Jehova ga-agọzikwa ha.—Fil. 4:7.

^ para. 3 Otú e si eme n’obodo nwere ike inyere ndị agadi na ụmụ ha aka ikpebi ihe ha ga-eme. N’obodo ụfọdụ, ndị agadi na ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha nwere ike ibi n’otu èzí.

^ para. 11 Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị bi naanị ha ma nwee onye ị tụkwasịrị obi na-elekọta ha, hụ na onye ahụ nwere nwa kii ọ ga-eji atụpe ụlọ ha ma ihe gbata gbata mee.