Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) FEBỤWARỊ 2014

Na-eto Kraịst, Bụ́ Eze Dị Ebube

Na-eto Kraịst, Bụ́ Eze Dị Ebube

“N’ịma mma gị, nwee ihe ịga nke ọma.”—ỌMA 45:4.

1, 2. Gịnị mere anyị kwesịrị iji nwee mmasị n’Abụ Ọma nke iri anọ na ise?

ABỤ ỌMA nke iri anọ na ise kwuru ihe ụfọdụ na-eme obi ụtọ. O kwuru banyere otu Eze dị ebube nke gba ịnyịnya na-aga ka ọ lụọ agha maka eziokwu na ezi omume, meriekwa ndị iro ya. O merichaa ha, ọ ga-alụ nwaanyị mara mma. A ga na-echeta Eze a, na-etokwa ya ruo mgbe ebighị ebi.

2 Ma, uru ihe a kọrọ n’Abụ Ọma nke iri anọ na ise bara abụghị naanị na ọ bụ akụkọ na-eme obi ụtọ. Ihe a kọrọ n’ebe ahụ gbasara ndụ anyị, ma ugbu a ma n’ọdịnihu. Ka obi anyị dịrị n’ihe anyị na-amụ ka anyị na-atụle abụ ọma a.

“OKWU ỌMA AKPALIWO OBI M”

3, 4. (a) Olee “okwu ọma” ọbụ abụ dere banyere ya? Olee ihe o nwere ike ime obi anyị? (b) Olee ozi anyị na-ekwusa ‘banyere eze’? Olee otú ire anyị si dị ka mkpịsị e ji ede ihe?

3 Gụọ Abụ Ọma 45:1. “Okwu ọma” nke ruru ọbụ abụ ahụ n’obi ma ‘kpalie’ ya bụ ozi banyere eze. Okwu Hibru e si sụgharịta ‘kpaliri’ pụtara ịgbọ ka ihe e sinyere n’ọkụ, ya ana-asụ pụtụ pụtụ. Okwu ọma ahụ ọbụ abụ nụrụ mere ka obi dị ya ezigbo ụtọ, ya ana-anụ ọkụ n’obi. O mekwara ka ire ya dị ka “mkpịsị nke ọkà n’idepụta ihe.”

 4 Olee otú ihe e dere n’abụ ọma a si gbasa anyị? Ozi ọma banyere Alaeze Mesaya bụ okwu ọma ruru anyị n’obi. Mgbe ozi ọma Alaeze ghọrọ “okwu ọma” karịchaa bụ n’afọ 1914. Kemgbe ahụ, ihe a na-ekwusa abụghịzi banyere Alaeze ga-amalite ịchị n’ọdịnihu, kama ọ bụ banyere ọchịchị maliterela ịchị n’eluigwe. Ọ bụ ya bụ ‘ozi ọma alaeze Chineke’ anyị na-ekwusa “n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile.” (Mat. 24:14) Ozi ọma Alaeze Chineke ò ruru anyị n’obi, mee ka obi dị anyị ụtọ? Ànyị na-eji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ya? Otú ahụ ọbụ abụ ‘bụrụ abụ banyere eze’ ka anyịnwa na-abụ abụ banyere Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst. Anyị na-ekwusa na Jizọs bụ Eze na-achị ugbu a n’Alaeze Chineke n’eluigwe. Anyị na-agwakwa mmadụ niile, ma ndị ọchịchị ma ndị ha na-achị, ka ha nabata ọchịchị Jizọs. (Ọma 2:1, 2, 4-12) Ire anyị dịkwa ka “mkpịsị nke ọkà n’idepụta ihe” n’ihi na anyị na-eji Okwu Chineke ekwusa ozi ọma.

Anyị ji obi ụtọ na-ekwusa ozi ọma banyere Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst

‘OKWU ỌMA NA-ESI N’ỌNỤ EZE AHỤ APỤTA’

5. (a) Gịnị mere e nwere ike iji kwuo na Jizọs mara mma? (b) Olee otú ‘okwu ọma si si n’ọnụ Jizọs na-apụta,’ oleekwa otú anyị nwere ike isi na-eme ka ya?

5 Gụọ Abụ Ọma 45:2. Baịbụl ekwughị ọtụtụ ihe gbasara otú Jizọs dị. Ebe ọ bụ na o zuru okè, o doro anya na ọ mara mma. Ma, ihe kacha mee ka ọ maa mma bụ na o ji obi ya niile rubere Jehova isi, na-emekwa ihe ziri ezi. Ihe ọzọ bụ na Jizọs gwara ndị mmadụ “okwu ọma” mgbe ọ na-ekwusa banyere Alaeze Chineke. (Luk 4:22; Jọn 7:46) Ànyị na-agbasi mbọ ike ịna-eme ka Jizọs mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma?—Kọl. 4:6.

6. Olee otú Chineke si gọzie Jizọs “ruo mgbe ebighị ebi”?

6 N’ihi otú Jizọs si jiri obi ya niile jeere Jehova ozi, Jehova gọziri ozi o jere n’ụwa, kwụọkwa ya ụgwọ ọrụ mgbe o jichara ndụ ya chụọ àjà. Pọl onyeozi dere banyere Jizọs, sị: “Mgbe ọ hụrụ onwe ya n’ụdị mmadụ, o wedara onwe ya ala wee rube isi ruo ọnwụ, ee, ọnwụ n’osisi ịta ahụhụ. N’ihi nke a, Chineke buliri ya elu ka ọ nọrọ n’ọkwá ka elu, o jikwa obiọma nye ya aha dị elu karịa aha ọ bụla ọzọ, ka ikpere ọ bụla wee gbuo n’ala n’aha Jizọs, ma nke ndị nọ n’eluigwe ma nke ndị nọ n’elu ụwa ma nke ndị nọ n’okpuru ala, ka ire ọ bụla wee kwupụtakwa na Jizọs Kraịst bụ Onyenwe anyị iji wetara Chineke bụ́ Nna otuto.” (Fil. 2:8-11) Jehova gọziri Jizọs “ruo mgbe ebighị ebi.” Otú o si mee ya bụ na ọ kpọlitere ya n’ọnwụ ma mee ka ọ ghara ịnwụ anwụ.—Rom 6:9.

E MERE KA EZE AHỤ KARỊA ‘NDỊ IBE YA’

7. Olee otú Chineke si tee Jizọs mmanụ ‘karịa ndị ibe ya’?

7 Gụọ Abụ Ọma 45:6, 7. Jizọs ji obi ya niile hụ ezi omume n’anya ma kpọọ ajọ omume asị. N’ihi ya, Jehova tere ya mmanụ ka ọ bụrụ Eze ga-achị n’Alaeze Mesaya. Chineke tere ya ‘mmanụ aṅụrị karịa ndị ibe ya,’ ya bụ, ndị eze  Juda ndị sikwa n’agbụrụ Devid. Olee otú Jehova si tee ya mmanụ karịa ndị ibe ya? Nke mbụ bụ na Jehova ji aka ya tee Jizọs mmanụ. Nke abụọ abụrụ na Jehova tere ya mmanụ ka ọ bụrụ Eze na Nnukwu Onye Nchụàjà. (Ọma 2:2; Hib. 5:5, 6) Nke atọ bụ na Jehova ji mmụọ nsọ tee Jizọs mmanụ, ọ bụghị mmanụ nkịtị. Nke ikpeazụ abụrụ na Jizọs ga-esi n’eluigwe na-achị, ọ bụghị n’ụwa.

8. Gịnị mere e nwere ike iji kwuo na ‘Chineke bụ ocheeze Jizọs’? Gịnị mere obi ji sie anyị ike na ọchịchị Jizọs ga-adị mma?

8 Jehova mere ka Jizọs chịwa n’eluigwe n’afọ 1914. “Mkpanaka” ọchịchị Jizọs bụ “mkpanaka nke izi ezi.” N’ihi ya, obi siri anyị ike na ọchịchị ya ga-adị mma, bụrụkwa ọchịchị ezi omume. O kwesịrị ịbụ Eze n’ihi na ‘Chineke bụ ocheeze ya,’ ya bụ na ọ bụ Jehova mere ya Eze. Ocheeze Jizọs ga-adịru “mgbe niile ebighị ebi.” Ọ̀ bụ na obi adịghị gị ụtọ na ị na-ejere Jehova ozi, Eze ya ọ họpụtara ana-achị gị?

EZE AHỤ ‘KERE MMA AGHA YA N’ÚKWÙ’

9, 10. (a) Olee mgbe Kraịst kere mma agha ya n’úkwù? Olee ihe mbụ o ji ya mee? (b) Gịnị ka Kraịst ga-eji mma agha ya mee n’ọdịnihu?

9 Gụọ Abụ Ọma 45:3. Jehova gwara onye o mere Eze ka o ‘kee mma agha ya n’úkwù.’ Ihe a ọ gwara Jizọs pụtara na o nyela ya ikike ịlụso ndị niile na-emegide ọchịchị Chineke ọgụ ma gbuo ha. (Ọma 110:2) Ebe ọ bụ na Kraịst bụ Onye Agha na Eze a na-agaghị emeri emeri, a kpọrọ ya “onye dị ike.” O kere mma agha ya n’úkwù n’afọ 1914 ma merie Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, si n’eluigwe chụdata ha n’ụwa.—Mkpu. 12:7-9.

10 Ọ bụ ya bụ mmeri mbụ Kraịst nwere. Ọ ka ‘ga-enwezu mmeri ya.’ (Mkpu. 6:2) Jehova ekpebiela na a ga-ebibi ụwa Setan, meekwa ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya kwụsị ịkpa ike. Ihe mbụ a ga-ebibi bụ Babịlọn Ukwu ahụ, ya bụ, okpukpe ụgha niile dị n’ụwa. Jehova ga-eji ndị ọchịchị bibie “nwaanyị akwụna ahụ” obi tara mmiri. (Mkpu. 17:16, 17) E bibichaa ya, Kraịst ga-ebibi ọchịchị niile e nwere n’ụwa Setan. A kpọrọ Kraịst “mmụọ ozi nke abis.” N’ihi ya, ọ ga-atụba Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abis, si otú ahụ nwezuo mmeri ya. (Mkpu. 9:1, 11; 20:1-3) Ka anyị lee otú Abụ Ọma nke iri anọ na ise si kwuo ihe ndị a na-eme obi ụtọ ga-emenụ.

EZE AHỤ ‘NA-AGBA ỊNYỊNYA N’IHI EZIOKWU’

11. Olee otú Kraịst si ‘na-agba ịnyịnya n’ihi eziokwu’?

11 Gụọ Abụ Ọma 45:4. Ihe mere Eze ahụ ji na-alụ agha abụghị ka o merie mba dị iche iche ma mee ka ndị mmadụ gbawara ya ohu. E nwere ezigbo ihe mere o ji na-alụ agha. Ọ na-alụ agha “n’ihi eziokwu na ịdị umeala n’obi na ezi omume.” Ọ bụ naanị Jehova kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa. Ọ bụ eziokwu a bụ ihe kacha mkpa mere Jizọs ji na-alụ agha. Mgbe Setan nupụrụ isi, ihe ọ na-ekwu bụ na ọ bụghị Jehova kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa. Kemgbe ahụ, e nweela ndị mmụọ ọjọọ na ụmụ mmadụ kwadoro ihe a Setan kwuru. Oge eruola ka Eze Jehova tere mmanụ lụọ agha ga-eme ka onye ukwu na onye nta mata na ọ bụ naanị Jehova kwesịrị ịchị.

12. Olee otú Eze ahụ si na-agba ịnyịnya ‘n’ihi ịdị umeala n’obi’?

12 Eze ahụ ‘na-agbakwa ịnyịnya n’ihi ịdị umeala n’obi.’ Kemgbe ụwa, otú Jizọs si dị umeala n’obi ma na-erubere Nna ya isi enweghị atụ. (Aịza. 50:4, 5;  Jọn 5:19) Ndị ji obi ha niile na-ejere Eze ahụ ozi kwesịrị ịna-eme ka ya. Ha kwesịrị ịdị umeala n’obi ma na-erubere Jehova isi n’ihe niile ha na-eme. Ọ bụ naanị ndị na-eme otú ahụ ga-ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa.—Zek. 14:16, 17.

13. Olee otú Kraịst si agba ịnyịnya ‘n’ihi ezi omume’?

13 Kraịst na-agbakwa ịnyịnya ‘n’ihi ezi omume.’ Ezi omume Eze ahụ na-agbachitere bụ “ezi omume Chineke,” ya bụ, ihe Jehova weere na o ziri ezi na ihe o weere na o zighị ezi. (Rom 3:21; Diut. 32:4) Aịzaya buru amụma banyere Jizọs Kraịst, sị: “Otu eze ga-achị ka e wee nwee ezi omume.” (Aịza. 32:1) Ọchịchị Jizọs ga-eme ka e nwee “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” Chineke kwere ná nkwa, bụ́ ebe onye ọ bụla ga na-eme ezi omume. (2 Pita 3:13) Ọ pụtara na onye ọ bụla ga-ebi n’ụwa ọhụrụ ahụ ga na-erubere iwu Jehova isi.—Aịza. 11:1-5.

EZE AHỤ GA-EME “IHE DỊ ICHE ICHE DỊ EGWU”

14. Olee otú aka nri Jizọs ga-esi mee “ihe dị iche iche dị egwu”? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

14 Eze ahụ kere mma agha ya n’úkwù na-agba ịnyịnya. (Ọma 45:3) Ma, oge ga-eru mgbe ọ ga-eji aka nri ya mịrị mma agha ya, jiri ya lụọ agha. Ọbụ abụ ahụ buru amụma na aka nri Jizọs ga-eme “ihe dị iche iche dị egwu.” (Ọma 45:4) Mgbe Jizọs Kraịst ga-ebibi ụwa Setan n’Amagedọn, ọ ga-eme ndị iro ya “ihe dị iche iche dị egwu.” Anyị amaghị otú ọ ga-esi ebibi ụwa Setan. Ma, anyị ma na otú ọ bụla Jizọs ga-esi mee ya ga-eme ka ụjọ tụọ ndị na-egeghị ntị n’ihe Chineke gwara ha, ya bụ, ka ha rubere ọchịchị Jizọs isi. (Gụọ Abụ Ọma 2:11, 12.) N’amụma Jizọs buru banyere oge ikpeazụ a, o kwuru na ndị mmadụ ‘ga-atụbọ n’ihi egwu nakwa n’ihi ihe ndị ha na-atụ anya ga-abịakwasị elu ụwa mmadụ bi; n’ihi na a ga-eme ka ike nke eluigwe maa jijiji.’ O kwukwara, sị: “Mgbe ahụ, ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’ígwé ojii n’ike na ebube dị ukwuu.”—Luk 21:26, 27.

15, 16. Olee ndị ga-abụ “ndị agha” ga-eso Jizọs lụọ agha?

15 Akwụkwọ Mkpughe kwuru banyere mgbe Jizọs ga-abịa “n’ike na ebube dị ukwuu” ka o bibie ndị iro Chineke. O kwuru, sị: “M wee hụ ka e meghere eluigwe, ma, lee! otu ịnyịnya ọcha. A na-akpọkwa onye nọ n’elu ya Onye Kwesịrị Ntụkwasị Obi na Onye Eziokwu, ọ na-ekpekwa ikpe ma na-alụ agha n’ezi omume. Ụsụụ ndị agha nọ n’eluigwe nọkwa n’elu ịnyịnya ọcha, na-eso ya n’azụ, ha yikwa ákwà linin ọma nke na-acha ọcha, dịkwa ọcha. Ogologo mma agha dị nkọ sikwa n’ọnụ ya pụta, ka o jiri ya gbuo mba niile, ọ ga-ejikwa mkpanaka ígwè zụọ ha dị ka atụrụ. Ọ na-azọchakwa mkpụrụ dị n’ebe nzọchapụta mmanya nke iwe nke ọnụma Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.”—Mkpu. 19:11, 14, 15.

16 Olee ndị ga-abụ “ndị agha” ahụ nọ n’eluigwe ga-eso Kraịst lụọ agha? Ndị mmụọ ozi so Jizọs lụọ agha mgbe mbụ o kere mma agha n’úkwù ma chụpụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe. (Mkpu. 12:7-9) N’ihi ya, ọ dabara adaba na ndị mmụọ ozi dị nsọ ga-esokwa ya lụọ agha Amagedọn. È nwere ndị ọzọ ga-eso ya? Jizọs kwere ụmụnna ya e tere mmanụ nkwa, sị: “Onye meriri emeri, debekwa ihe m nyere n’iwu ruo ọgwụgwụ, m ga-enye ya ikike ịchị mba niile, ọ ga-ejikwa mkpanaka ígwè zụọ  ndị mmadụ dị ka atụrụ, ka e wee kụrisịa ha dị ka arịa e ji ụrọ kpụọ, dị ka m natara ikike n’aka Nna m.” (Mkpu. 2:26, 27) N’ihi ya, Ndị Kraịst e tere mmanụ ga-esokwa ná ndị agha ahụ n’ihi na mgbe ahụ, a kpọlitechaala ha n’ọnwụ, ha agaa eluigwe. Ha ga-akwado Jizọs mgbe ọ ga-eme “ihe dị iche iche dị egwu,” bibie mba niile.

MGBE EZE AHỤ GA-ENWEZU MMERI YA

17. (a) Gịnị ka ịnyịnya ọcha ahụ Kraịst nọ n’elu ya nọchiri anya ya? (b) Gịnị ka mma agha na ụta ahụ nọchiri anya ya?

17 Gụọ Abụ Ọma 45:5. Mkpughe 6:2 kwuru, sị: “M wee hụ, ma, lee! ịnyịnya ọcha; onye nọ n’elu ya ji ụta; e nyekwara ya okpueze, o wee gaa na-emeri, ka o wee nwezuo mmeri ya.” Ịnyịnya ọcha Eze ahụ nọ n’elu ya nọchiri anya agha ọ ga-alụ n’ezi omume, ya bụ, agha ziri ezi n’anya Jehova. (Mkpu. 19:11) Eze ahụ ji ma mma agha ma ụta. Ha nọchiri anya otú Kraịst ga-esi gbuo ndị iro ya.

A ga-akpọ nnụnụ ka ha rie anụ ndị e gburu egbu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)

18. Olee otú Kraịst ga-esi gosi na “akụ́” ya dị nkọ?

18 Ọbụ abụ ahụ buru amụma gbasara Eze ahụ, sị: “Akụ́ gị dị nkọ ga-abanye n’obi ndị iro eze. Ndị dị iche iche ga na-ada n’okpuru gị.” Mbibi ahụ ga-ezu ụwa niile. Jeremaya buru amụma, sị: “N’ụbọchị ahụ, ndị Jehova gburu ga-atọgbọrọ malite n’otu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ ọzọ nke ụwa.” (Jere. 25:33) Amụma ọzọ e buru banyere otu ihe ahụ sịrị: “Ahụkwara m otu mmụọ ozi ka o guzo n’anyanwụ, o wee jiri oké olu kpọọ nnụnụ niile na-efe n’etiti eluigwe, sị: ‘Bịanụ ebe a, zukọtanụ iri oké nri anyasị nke Chineke, ka unu wee rie anụ ndị eze na anụ ndị ọchịagha na anụ ndị dị ike na anụ ịnyịnya na nke ndị nọ n’elu ha, na anụ mmadụ niile, nke ndị nweere onwe ha na nke ndị ohu na nke ndị nta na ndị ukwu.’”—Mkpu. 19:17, 18.

19. Olee otú Kraịst ga-esi nwezuo mmeri ya?

19 Kraịst, bụ́ Eze dị ebube, bibichaa ụwa Setan, ihe ka ga na-agara ya nke ọma. (Ọma 45:4) Otú ọ ga-esi nwezuo mmeri ya bụ ịtụba Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abis. Ha ga-anọ ebe ahụ otu puku afọ Kraịst ga-achị. (Mkpu. 20:2, 3) Mgbe Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya ga-anọ n’abis, ọ ga-adị ka hà nwụrụ anwụ n’ihi na ha agaghịzi na-akpa ike. Ndị niile nọ n’ụwa ga-enwe obi ụtọ n’ọchịchị Jizọs. Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya agaghịzi enye ha nsogbu. Tupu ụwa niile aghọọ paradaịs, e nwere ihe ọzọ ga-eme ka anyị soro Eze ahụ na ndị ga-eso ya chịa ṅụrịa ọṅụ. Anyị ga-eleba ya anya n’isiokwu na-esonụ.