Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) FEBỤWARỊ 2014

Jehova Na-egboro Anyị Mkpa ma Na-echebe Anyị

Jehova Na-egboro Anyị Mkpa ma Na-echebe Anyị

“N’ihi na ọ hụrụ m n’anya nke ukwuu, m ga-emekwara ya ụzọ mgbapụ. M ga-echebe ya n’ihi na ọ matawo aha m.”—Ọma 91:14.

1, 2. Olee otú ndị a mụrụ n’otu ezinụlọ si dị iche n’ibe ha? Olee ụzọ dị iche iche anyị si mụta eziokwu?

Ọ BỤ Jehova malitere ezinụlọ. (Efe. 3:14, 15) Ọ bụrụgodị na anyị si n’otu ezinụlọ, àgwà anyị ga-adị iche iche. Otú ihe si dịrị anyị ga-adịkwa iche n’otú o si dịrị ndị ọzọ si n’ezinụlọ anyị. E nwere ndị ha na ndị mụrụ ha biri malite mgbe a mụrụ ha ruo mgbe ha toro. E nwekwara ndị nne ha na nna ha nwụrụ n’ihi ọrịa, ihe mberede, ma ọ bụ ọdachi ọzọ. Ndị ọzọ nwedịrị ike ha amaghị ndị mụrụ ha.

2 Anyị niile nọ n’ezinụlọ Jehova ma na-efe ya. Otú anyị si mụta eziokwu dị iche iche. O nwere ike ịbụ na papa gị na mama gị bụ Ndịàmà Jehova, ha akụziere gị ịna-eme ihe Baịbụl kwuru. (Diut. 6:6, 7) Ma ọ bụkwanụ, ya abụrụ na i so n’ọtụtụ puku ndị Ndịàmà Jehova ziri ozi ọma, ha amụta eziokwu banyere Jehova.—Rom 10:13-15; 1 Tim. 2:3, 4.

3. Olee ihe anyị niile nwere?

3 N’agbanyeghị na otú e si zụọ anyị na otú anyị si mụta eziokwu dị iche iche, e nwere ihe ụfọdụ anyị niile nwere. N’ihi isi Adam nupụụrụ Chineke, anyị niile ketara ezughị okè, mmehie, na ọnwụ. (Rom 5:12) Ma, ebe ọ bụ na anyị na-efe Jehova, anyị nwere ike ịkpọ ya “Nna anyị.” Aịzaya 64:8 kwuru  banyere ndị Chineke n’oge ochie, sị: “Jehova, ị bụ Nna anyị.” Ihe mbụ Jizọs kwuru n’ekpere Onyenwe anyị bụ: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.”—Mat. 6:9.

4, 5. Olee ihe anyị ga-atụle ka anyị nwee ike hụkwuo Jehova, bụ́ Nna anyị nke eluigwe, n’anya?

4 Nna anyị nke eluigwe na-elekọta ndị niile na-efe ya ma na-echebe ha. Otu ọbụ abụ sịrị na Jehova kwuru banyere onye na-efe ya, sị: “N’ihi na ọ hụrụ m n’anya nke ukwuu, m ga-emekwara ya ụzọ mgbapụ. M ga-echebe ya n’ihi na ọ matawo aha m.” (Ọma 91:14) Ebe Jehova Chineke hụrụ ndị ya n’anya, ọ na-anapụta ha n’aka ndị iro ha ma na-echebe ha ka a ghara ikpochapụ ha.

5 Ka anyị tụlee otú Jehova si bụrụ (1) Onye na-egboro anyị mkpa, (2) Onye na-echebe anyị, na (3) ezigbo Enyi anyị. Ịtụle ihe ndị a ga-eme ka anyị hụkwuo Jehova n’anya. Ka anyị na-atụle ihe ndị a, ọ ga-adị mma ka onye ọ bụla n’ime anyị chebara otú ya na Jehova dị echiche ma mara ma ò nwere otú o nwere ike isi na-asọpụrụ ya ebe ọ bụ ya bụ Nna anyị. Ọ ga-abakwara anyị uru ma anyị chee echiche banyere ihe ọma Jehova kwere nkwa imere ndị enyi ya.—Jems 4:8.

JEHOVA BỤ ONYE UKWU NA-EGBORO ANYỊ MKPA

6. Olee otu ụzọ Jehova si egosi na ọ bụ ya na-enye “ezi onyinye ọ bụla”?

6 Jems onye na-eso ụzọ Jizọs dere, sị: “Ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè si n’elu bịa, n’ihi na ọ na-esi n’aka Nna nke ìhè eluigwe abịa.” (Jems 1:17) Ndụ a anyị dị bụ ezigbo onyinye Jehova nyere anyị. (Ọma 36:9) Ọ bụrụ na anyị ejiri ndụ anyị mee uche Jehova, ọ ga-agọzi anyị ugbu a, anyị ga-adịkwa ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ. (Ilu 10:22; 2 Pita 3:13) Ma, olee otú ọ ga-esi eme ebe ọ bụ na anyị niile ketara ezughị okè, mmehie, na ọnwụ n’aka Adam?

7. Gịnị ka Chineke mere ka anyị na ya nwee ike ịdị n’ezigbo mma?

7 E nwere ọtụtụ ụzọ Jehova si gosi na ya bụ Onye Ukwu na-egboro anyị mkpa. Dị ka ihe atụ, ọ bụ obiọma ya na-erughịrị anyị mere o ji napụta anyị. Anyị niile bụ ndị mmehie, anyị ketakwara ezughị okè n’aka Adam. (Rom 3:23) Ma, ebe ọ bụ na Jehova hụrụ anyị n’anya, o mere ihe ga-eme ka anyị na ya dị n’ezigbo mma. Jọn onyeozi dere, sị: “Ọ bụ site n’ihe a ka e mere ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè n’ebe anyị nọ, n’ihi na Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya n’ụwa ka anyị nwee ike inweta ndụ site n’aka ya. Ịhụnanya ahụ si otú a dịrị, ọ bụghị na ọ bụ anyị hụrụ Chineke n’anya, kama na ọ bụ ya hụrụ anyị n’anya wee zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ àjà ime udo maka mmehie anyị.”—1 Jọn 4:9, 10.

8, 9. N’oge Ebreham na Aịzik, olee otú Jehova si gosi na ya bụ Onye Ukwu na-egbo mkpa? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

8 N’ihe dị ka afọ 1893 Tupu Oge Ndị Kraịst, e nwere ihe mere ná ndụ Ebreham nke gosiri otú Jehova ga-esi jiri obiọma nye ndị niile na-erubere ya isi ndụ ebighị ebi. Ndị Hibru 11:17-19 kwuru, sị: “Mgbe e lere Ebreham ule, ọ bụ okwukwe ka o ji chọọ ịchụ Aịzik n’àjà, nwoke ahụ nke jikwa ọṅụ nata nkwa ndị ahụ nwara ịchụ ọkpara ọ mụrụ naanị ya n’àjà, ọ bụ ezie na a gwara ya, sị: ‘Ihe a ga-akpọ “mkpụrụ gị” ga-esi n’Aịzik.’ Ma o weere ya na Chineke nwere ike ịkpọlite ya ọbụna site ná ndị nwụrụ anwụ; sitekwa n’ebe ahụ ọ natakwara ya n’ụzọ ihe atụ.” Otú ahụ Ebreham si kweta iji Aịzik chụọ àjà bụ otú Jehova si jiri Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, chụọ àjà ka e nwee ike ịnapụta ụmụ mmadụ.—Gụọ Jọn 3:16, 36.

9 Ọ ga-abụrịrị na obi tọrọ Aịzik ezigbo  ụtọ mgbe ọ matara na a gazighị eji ya chụọ àjà. O doro anya na o kelere Chineke maka iweta ihe a ga-eji chụọ àjà, ya bụ, ebule dị n’akụkụ ebe ahụ. (Jen. 22:10-13) Ka a sịkwa ihe mere Ebreham ji kpọọ ebe ahụ Jehova-jaịre, nke pụtara “Jehova Ga-egbo Mkpa.”—Jen. 22:14.

IHE JEHOVA MERE KA ANYỊ NA YA NWEE IKE ỊDỊ NÁ MMA

10, 11. Ole ndị taa na-ahụ na e kwusara ‘ozi na-eme ka ndị mmadụ na Chineke dị ná mma,’ oleekwa otú ha si eme ya?

10 Ọ bụrụ na anyị echebara ihe niile Jehova meere anyị echiche, anyị ga-aghọta na e wepụ àjà Jizọs chụrụ, anyị na Chineke agaraghị adị ná mma. Pọl dere, sị: “Ihe anyị kwubiri bụ na otu onye nwụrụ maka mmadụ niile; n’ihi ya, mmadụ niile nwụrụ; ọ nwụkwara maka mmadụ niile, ka ndị dị ndụ wee ghara ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama ka ha dịrị onye ahụ ndụ, bụ́ onye nwụrụ n’ihi ha, e wee kpọlite ya.”—2 Kọr. 5:14, 15.

11 Ndị Kraịst oge mbụ hụrụ Chineke n’anya, obi dịkwa ha ụtọ maka ihe ùgwù ha nwere ịna-efe ya. Ọ bụ ya mere ha ji jiri obi ụtọ na-ejere ya ‘ozi nke na-eme ka ya na ndị mmadụ dị ná mma.’ Ozi ọma ha na-ekwusa mere ka Chineke na ndị mmadụ dị ná mma, ha abụrụ enyi ya, ma mechaa ghọọ ụmụ ya n’eluigwe. Taa, Ndị Kraịst e tere mmanụ na-ejekwa otu ozi ahụ. Ha bụ ndị nnọchiteanya Chineke na Kraịst. Otu uru ozi ọma ha na-ekwusa bara bụ na ọ bụ otú Jehova si na-eme ka ndị dị umeala n’obi na ndị chọrọ ịma nke bụ́ eziokwu bịa fewe ya.—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 5:18-20; Jọn 6:44; Ọrụ 13:48.

12, 13. Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe niile Jehova nyere anyị?

12 Ebe ọ bụ na obi dị atụrụ ọzọ ụtọ na Jehova bụ Onye Ukwu na-egboro ha mkpa, ha na-eso ndị e tere mmanụ ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ bụ Baịbụl ka anyị na-eji ekwusa ya n’ihi na ọ bụ ihe ọzọ bara ezigbo uru Chineke nyere anyị. (2 Tim. 3:16, 17) Ọ bụrụ na anyị ejiri Baịbụl na-akụziri ndị mmadụ ihe nke ọma n’ozi ọma, anyị na-eme ka ha mata otú ha ga-esi adị ndụ ebighị ebi. Jehova na-enyekwa anyị mmụọ nsọ ya n’ihi na ọ bụ mmụọ nsọ na-enyere onye ọ bụla n’ime anyị aka ikwusa ozi ọma. (Zek. 4:6; Luk 11:13) Ihe ndị a na-akọ n’Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova na-egosi na anyị na-arụpụta ọtụtụ ihe n’ozi ọma anyị na-ekwusa. O nweghị ihe ùgwù ka iso na-arụ ọrụ a e ji na-eto Nna anyị na Onye na-egboro anyị mkpa.

13 N’ihi ihe niile Chineke nyere anyị, onye ọ bụla kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ na-eji ike m niile ekwusa ozi ọma ka m gosi Jehova na obi dị m ụtọ n’ihi ihe niile o nyere m? Olee otú m ga-esi na-emekwu nke ọma n’ozi ọma?’ Ọ bụrụ na obi dị anyị ụtọ n’ihi ihe niile Jehova nyere anyị, anyị ga-ebu ụzọ na-achọ Alaeze ya. Anyị mee otú ahụ, Jehova ga na-egboro anyị mkpa anyị niile. (Mat. 6:25-33) Ebe ọ bụ na Chineke hụrụ anyị n’anya, anyị kwesịrị ime ihe niile anyị nwere ike ime ka obi ya ṅụrịa.—Ilu 27:11.

14. Olee otú Jehova si anapụta ndị ya?

14 Devid bụrụ abụ, sị: “Anọ m n’ahụhụ, adakwara m ogbenye. Jehova na-echeta m. Ị bụ onye na-enyere m aka na Onye na-emere m ụzọ mgbapụ.” (Ọma 40:17) E nweela ọtụtụ mgbe Jehova napụtara ndị na-efe ya, nke ka nke, mgbe ndị iro ha na-akpagbu ha ma na-achụgharị ha. Obi dị anyị ụtọ na Jehova na-enyere anyị aka n’oge a na-akpagbu anyị nakwa na ọ na-enye anyị ihe dị anyị mkpa ka anyị ghara ịkwụsị ife ya.

JEHOVA NA-ECHEBE ANYỊ

15. Kọọ otú otu nna hụrụ nwa ya n’anya si chebe ya.

15 Nna hụrụ ụmụ ya n’anya na-egboro  ha mkpa ha ma na-echebe ha. Ihe chọọ ime ha, ọ na-agba mbọ ozugbo napụta ha. Otu nwanna chetara otú papa ya si napụta ya mgbe ọ dị obere. Ya na papa ya si ozi ọma na-alọta, rute n’ebe e nwere mmiri. Mmiri ahụ tojuru ebe niile n’ihi na ezigbo mmiri zoro n’ụtụtụ ụbọchị ahụ. E nwere nnukwu okwute ndị dị na mmiri ahụ. Naanị otú ha ga-esi agafe bụ isi n’otu okwute wụfee n’ọzọ. Nwatakịrị ahụ nọ papa ya n’ihu. Mgbe ọ chọrọ ịwụfe, ụkwụ ya chịpụrụ, ya adaba n’ime mmiri ahụ. Ozugbo mmiri ahụ tụlitere ya nke ugboro abụọ, papa ya jidere ya n’ubu ma dọpụta ya ka mmiri ahụ ghara iri ya. Obi dị nwatakịrị ahụ ụtọ maka ihe a papa ya meere ya. Jehova na-emere anyị ụdị ihe a nwoke a meere nwa ya. Ọ na-echebe anyị ka anyị ghara ịba ná nsogbu n’ụwa ọjọọ a nakwa ka Setan bụ́ onye na-achị ụwa ghara inweta anyị. Otú Jehova si na-echebe anyị enweghị atụ.—Mat. 6:13; 1 Jọn 5:19.

16, 17. Olee otú Jehova si nyere ụmụ Izrel aka ma chebe ha n’oge ha na ndị Amalek lụrụ agha?

16 Jehova hụrụ ụmụ Izrel n’anya. O chebere ha n’afọ 1513 Tupu Oge Ndị Kraịst. Tupu mgbe ahụ, ọ napụtara ụmụ Izrel n’ohu ha na-agba n’Ijipt, chebekwa ha mgbe ha na-agafe Oké Osimiri Uhie. Mgbe ha si n’ala ịkpa na-aga n’Ugwu Saịnaị, ha rutere n’ebe a na-akpọ Refidim.

17 N’ihi amụma ahụ e buru na Jenesis 3:15, o nwere ike ịbụ na Setan nọ na-achọsi ike otú ọ ga-esi alụso ndị Izrel ọgụ n’ihi na ha dị ka ndị na-enweghị onye ga-echebe ha. O ji ndị Amalek, bụ́ ndị iro ha, lụso ha ọgụ. (Ọnụ Ọgụ. 24:20) Olee otú Jehova si jiri Jọshụa, Mozis, Erọn, na Họọ chebe ndị ya? Mgbe Jọshụa na ndị agha ya na-alụso ndị Amalek ọgụ, Mozis, Erọn, na Họọ nọ n’ugwu  dị nso. Mozis welie aka ya elu, ndị Izrel emeriwe. Mgbe aka nyịwara Mozis arọ, Erọn na Họọ jidere aka ya abụọ. Jehova chebere ụmụ Izrel ma nyere ha aka. Ọ bụ ya mere Jọshụa ji mechaa “merie ndị Amalek na ndị so ha.” (Ọpụ. 17:8-13) Mozis rụrụ ebe ịchụàjà n’ebe ahụ, kpọọ ya “Jehova-nisaị,” nke pụtara “Jehova Bụ Ebe Mgbaba M.”—Gụọ Ọpụpụ 17:14, 15.

JEHOVA NA-ECHEBE ANYỊ KA SETAN GHARA INWETA ANYỊ

18 Jehova na-echebe ndị hụrụ ya n’anya ma na-erubere ya isi. Anyị kwesịrị ime ihe ahụ ndị Izrel mere mgbe ha nọ na Refidim, ya bụ, ịtụkwasị Jehova obi ka ndị iro anyị ghara imeri anyị. Jehova na-echebekarị anyị ka a ghara igbuchapụ anyị. Ọ na-enyekwara anyị aka ka Setan ghara inweta anyị. Dị ka ihe atụ, e nweela ọtụtụ mgbe Chineke chebere ụmụnna anyị a na-akpagbu n’ihi na ha achọghị itinye aka n’ọchịchị ma ọ bụ n’agha. Jehova mere otú ahụ n’oge ndị Nazi na-achị Jamanị nakwa ná mba ndị ọzọ n’ihe dị ka n’agbata afọ 1933 na 1944. E nwere akụkọ ndụ ụmụnna anyị na ihe ndị a kọrọ n’Akwụkwọ Mgbaafọ ndị gosiri otú Chineke si chebe ụmụnna anyị n’oge a na-akpagbu ha. Ọ bụrụ na anyị agụọ ha ma chebara ihe anyị gụrụ echiche, ọ ga-eme ka anyị tụkwasịkwuo Jehova obi.—Ọma 91:2.

Jehova nwere ike iji ụmụnna anyị nyere anyị aka ịnọsi ike n’ozi ya n’oge a na-akpagbu anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18-20)

18, 19. Olee otú Chineke sirila chebe ndị na-efe ya taa?

19 Jehova na-eji nzukọ ya na akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl echetara anyị ihe ndị anyị ga-eme. Ọ bụ otú a ka o si echebe anyị. Chegodị otú ihe ndị a Jehova na-echetara anyị sirila chebe anyị n’oge na-adịbeghị anya. Taa, ihe e ji mara ọtụtụ ndị bụ ịkwa iko, ịṅụ oké mmanya, na ikiri ndị gba ọtọ. Ma, Jehova enyela anyị ndụmọdụ banyere ihe ndị a ka anyị ghara ime ihe ga-eme ka anyị na ya ghara ịdị ná mma. Dị ka ihe atụ, n’oge na-adịbeghị anya, Nna anyị nke eluigwe nyere anyị ndụmọdụ ka anyị na ndị ọjọọ ghara ịna-akpa n’Ịntanet. *1 Kọr. 15:33.

20. Olee otú Jehova si na-echebe anyị ma na-eduzi anyị n’ọgbakọ?

20 Olee otú anyị ga-esi gosi na ọ bụ ‘Jehova na-akụziri anyị ihe’? Ọ bụ ịna-eme ihe ọ gwara anyị. (Aịza. 54:13) Ọ bụ n’ọgbakọ ka anyị ga-anọ ahụ́ eruo anyị ala, Chineke ana-echebe anyị ma na-eduzi anyị. Ndị okenye na-eji Baịbụl enyere anyị aka, na-adụkwa anyị ọdụ. (Gal. 6:1) Ha bụ “onyinye n’ụdị mmadụ.” Jehova na-eji ha elekọta anyị. (Efe. 4:7, 8) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ndị okenye dụọ anyị ọdụ? Anyị kwesịrị ime ihe ha gwara anyị. Jehova ga-agọzi anyị ma anyị mee otú ahụ.—Hib. 13:17.

21. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike na anyị ga-eme? (b) Olee ajụjụ anyị ga-aza n’isiokwu na-esonụ?

21 N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike na anyị ga-ekwe ka mmụọ nsọ na-enyere anyị aka. Anyị ga-esi otú ahụ gosi na anyị na-eme ihe Nna anyị nke eluigwe gwara anyị. Anyị kwesịkwara ichebara otú Jizọs si bie ndụ echiche ma na-agba mbọ na-eme ka ya. Jehova gọziri Jizọs maka na o rubeere ya isi ruo ọnwụ. (Fil. 2:5-11) Jehova ga-agọzikwa anyị ma anyị tụkwasị ya obi anyị niile. (Ilu 3:5, 6) N’ihi ya, ka anyị tụkwasị Jehova obi mgbe niile. Otú o si egboro anyị mkpa anyị ma na-echebe anyị enweghị atụ. Ijere ya ozi bụụrụ anyị ihe ùgwù. Ọ na-emekwa anyị obi ụtọ. Ma, olee otú Jehova si bụrụ ezigbo Enyi anyị? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ. Ọ ga-eme ka anyị hụkwuo Jehova n’anya.

^ para. 19 E nwere ụdị ndụmọdụ ahụ n’isiokwu bụ́ “Jiri Ịntanet Na-eme Ihe Otú Kwesịrị Ekwesị,” nke dị n’Ụlọ Nche Ọgọst 15, 2011, peeji nke 3-5 na isiokwu bụ́ “Kpachara Anya Maka Ọnyà Ekwensu!” na “Guzosie Ike ma Zere Ọnyà Setan!” n’Ụlọ Nche Ọgọst 15, 2012, peeji nke 20-29.