Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) FEBỤWARỊ 2014

Jehova Bụ Ezigbo Enyi Anyị

Jehova Bụ Ezigbo Enyi Anyị

“E wee kpọọ [Ebreham] ‘enyi Jehova.’”—JEMS 2:23.

1. Ebe ọ bụ na e kere anyị n’onyinyo Chineke, olee ihe anyị ga-emeli?

Ọ BỤRỤ na a mụọ nwatakịrị, ya eyie papa ya, ndị mmadụ na-asị na ọ bụ oyiri nna ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị na-eyi mama ha na papa ha. A sị ka e kwuwe, nwatakịrị ọ bụla a mụrụ nwere àgwà papa ya na mama ya ọ na-akpa. Ọ bụ Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, nyere anyị ndụ. (Ọma 36:9) Anyị bụ́ ụmụ ya nwekwara ọtụtụ ụzọ anyị si yie ya. Ebe ọ bụ na o kere anyị “n’onyinyo” ya, anyị ga-echebaliri ihe echiche, kpebie ihe anyị ga-eme, ma meta ezigbo ndị enyi.—Jen. 1:26.

2. Gịnị mere o ji kwe omume na anyị na Jehova ga-abụ ezigbo enyi?

2 Jehova nwere ike ịbụ ezigbo Enyi anyị. Ihe mere ọ ga-eji kwe omume bụ na Chineke hụrụ anyị n’anya. Ihe ọzọ abụrụ na anyị nwere okwukwe na Chineke na n’Ọkpara ya. Jizọs kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) E nweela ọtụtụ ndị ha na Jehova dị n’ezigbo mma. Ka anyị tụlee banyere mmadụ abụọ n’ime ha.

 ‘EBREHAM BỤ ENYI M’

3, 4. Olee otú enyi Chineke na Ebreham si dị iche na nke ya na ụmụ Izrel?

3 Jehova kwuru na nna nna ụmụ Izrel aha ya bụ Ebreham bụ ‘enyi ya.’ (Aịza. 41:8) Ihe E Mere nke Abụọ 20:7 kwukwara na Chineke hụrụ Ebreham n’anya, nke gosiri na ọ bụ enyi Chineke. Gịnị mere ka Ebreham na Chineke dịrị n’ezigbo mma? Ọ bụ maka na Ebreham nwere okwukwe na Chineke.—Jen. 15:6; gụọ Jems 2:21-23.

4 E nwekwara mgbe Jehova bụ Nna na Enyi ụmụ Ebreham, ndị e mechara kpọwa mba Izrel. Ma, ha mechara mee ka ha na Chineke ghara ịdị ná mma. Gịnị kpatara ya? Ọ bụ n’ihi na ha enweghịzi okwukwe ná nkwa Jehova.

5, 6. (a) Olee ihe mere gị na Jehova ji bụrụ enyi? (b) Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

5 Ọ bụrụ na ị na-amụkwu banyere Jehova, ị ga-enwekwu okwukwe na ya, hụkwuokwa ya n’anya. Chegodị mgbe mbụ ị mụtara na e nwere Onye bụ́ Chineke, matakwa na gị na ya nwere ike ịdị n’ezigbo mma. Ị mụtara na anyị niile bụ ndị mmehie n’ihi isi Adam nupụụrụ Chineke. Ị ghọtara na ọ bụghị mmadụ niile ka ha na Chineke dị ná mma. (Kọl. 1:21) Ị ghọtakwara na Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya nakwa na ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi. Ọ bụghị onye na-achọghị ịma gbasara anyị. Mgbe anyị mụtara na Jehova ji Ọkpara ya chụọ àjà, anyị enwee okwukwe n’àjà ahụ, anyị na Chineke malitere ịbụ enyi.

6 Anyị cheta otú anyị si mara Jehova, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Mụ na Chineke ànyị na-adịkwu ná mma? M̀ tụkwasịrị Jehova obi m niile ma na-ahụkwu ya n’anya kwa ụbọchị?’ Onye ọzọ ya na Jehova dị n’ezigbo mma n’oge ochie bụ Gidiọn. Ka anyị tụlee banyere ya n’ihi na ọ ga-enyere anyị aka ime ka ya.

“JEHOVA BỤ UDO”

7-9. (a) Olee ihe pụrụ iche mere mgbe Gidiọn nọ n’ebe a na-akpọ Ọfra, oleekwa uru ọ baara ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị na Chineke bụrụ enyi?

7 Onyeikpe aha ya bụ Gidiọn jeere Jehova ozi n’oge ụmụ Izrel banyechara n’Ala Nkwa. Ihe siiri ụmụ Izrel ike n’oge ahụ n’ihi na ndị Midian na-emesi ha ike. Ha ebusola ụmụ Izrel agha ọtụtụ ugboro. N’ihi ya, Gidiọn gara na-eticha ọka wit ya n’ebe a na-anọ azọchapụta mmanya kama ịnọ n’ubi na-eticha ya. Ihe mere o ji mee otú ahụ bụ ka ọ dịrị ya mfe izo ya ma ndị Midian bịawa. Ndị Ikpe isi isii kwuru na mmụọ ozi Jehova bịakwutere Gidiọn n’ebe a na-akpọ Ọfra. O juru Gidiọn anya mgbe mmụọ ozi ahụ kpọrọ ya “dike.” N’agbanyeghị na Jehova napụtara ụmụ Izrel n’Ijipt, o siiri Gidiọn ike ikweta na Jehova ga-anapụta ha n’oge ahụ. Jehova si n’ọnụ mmụọ ozi ahụ gwa Gidiọn na ya ga-anọnyere ya.

8 Gidiọn chere otú ya ga-esi ‘zọpụta Izrel n’aka Midian.’ Ma, Jehova gwara ya hoo haa, sị: “N’ihi na m ga-anọnyere gị, ị ga-emerikwa ndị Midian dị ka à ga-asị na ha bụ otu onye.” (Ikpe 6:11-16) O nwere ike ịbụ na ọ ka gbagwojuru Gidiọn anya otú ọ ga-esi eme ya. N’ihi ya, ọ gwara Chineke ka o meere ya ihe ịrịba ama. Buru n’obi na n’ihe Gidiọn na mmụọ ozi ahụ kwuru, e nweghị ihe gosiri na obi esighị Gidiọn ike na e nwere Onye bụ́ Jehova.

9 Ihe ọzọ merenụ mere ka okwukwe Gidiọn sikwuo ike, meekwa ka ya na Chineke dịkwuo ná mma. Gidiọn siri nri butere mmụọ ozi ahụ. Mmụọ ozi ahụ weere ọnụ mkpara o ji metụ nri ahụ, ọkụ erechapụ ya. Mgbe Gidiọn matara na onye ahụ bụ mmụọ ozi Jehova n’eziokwu, ụjọ jidere ya, ya etie mkpu, sị: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, ahụwo m  mmụọ ozi Jehova ihu na ihu!” (Ikpe 6:17-22) Ihe a merenụ ò mere ka Gidiọn na Jehova gharazie ịdị ná mma? Mba. O mere ka obi ruo Gidiọn ala. Otú anyị si mata bụ na Gidiọn wuru ebe ịchụàjà n’ebe ahụ. A kpọwara ya “Jehova-shelọm,” nke pụtara “Jehova Bụ Udo.” (Gụọ Ndị Ikpe 6:23, 24.) Ọ bụrụ na anyị echebara ihe Jehova na-emere anyị kwa ụbọchị echiche, anyị ga-aghọta na ọ bụ ezigbo Enyi anyị. Ọ bụrụ na anyị na-ekpe ekpere mgbe niile, ọ ga-eme ka obi rukwuo anyị ala, anyị na Jehova adịkwuokwa ná mma.

‘ÒNYE GA-ABỤ ỌBỊA N’ỤLỌIKWUU JEHOVA’?

10. Gịnị ka Abụ Ọma 15:3, 5 kwuru na anyị ga na-eme ka anyị nwee ike ịbụ enyi Jehova?

10 Jehova nwere ihe ndị ọ chọrọ ka onye ọ bụla chọrọ ịbụ enyi ya na-eme. N’Abụ Ọma nke iri na ise, Devid kwuru ihe anyị ga-emerịrị ka anyị nwee ike ịbụ ọbịa n’ụlọikwuu Jehova, ya bụ, ka anyị nwee ike ịbụ enyi Chineke. (Ọma 15:1) Ka anyị tụlee abụọ n’ime ha. Otu bụ ịghara ịna-ekwutọ mmadụ, nke ọzọ abụrụ ịkwụwa aka ọtọ n’ihe niile anyị na-eme. Devid kwuru banyere onye ọ bụla bụ́ enyi Jehova, sị: “Ọ dịghị eji ire ya ekwutọ mmadụ . . . Ọ dịghịkwa eri ngarị iji megide onye aka ya dị ọcha.”—Ọma 15:3, 5.

11. Gịnị mere anyị ekwesịghị ịna-ekwutọ mmadụ?

11 N’abụ ọma ọzọ, Devid dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Chee ire gị nche ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ.” (Ọma 34:13) Ọ bụrụ na anyị ajụ ime ihe a Baịbụl kwuru, ọ ga-eme ka anyị na Nna anyị nke eluigwe ghara ịdị ná mma. Ihe e ji mara Setan, bụ́ onye iro kachanụ Jehova nwere, bụ nkwutọ. Ọ bụ n’okwu Grik pụtara “onye nkwutọ” ka e si sụgharịta okwu bụ́ “Ekwensu.” Ọ bụrụ na anyị na-elezi anya n’ihe anyị na-ekwu banyere ndị ọzọ, ọ ga-eme ka anyị na Jehova na-adị ná mma. Anyị kwesịrị ịkpachara anya karịchaa n’otú anyị si emeso ndị okenye ọgbakọ.—Gụọ Ndị Hibru 13:17; Jud 8.

12, 13. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ekwu eziokwu n’ihe niile? (b) Olee uru ikwu eziokwu bara?

12 Ihe e ji mara ndị na-efe Jehova bụ ịkwụwa aka ọtọ. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Na-ekpenụ ekpere maka anyị, n’ihi na anyị kwenyesịrị ike na anyị nwere akọ na uche ziri ezi, ebe anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.” (Hib. 13:18) Ebe ọ bụ na anyị kpebisiri ike ‘ịna-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile,’ anyị agaghị na-erigbu ụmụnna anyị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ụmụnna anyị na-arụrụ anyị ọrụ, anyị kwesịrị ịna-emeso ha ihe otú dị mma ma na-akwụ ha ihe anyị na ha kwekọrịtara na anyị ga na-akwụ ha. Ebe ọ bụ na anyị bụ Ndị Kraịst, o nweghị onye anyị kwesịrị ịna-erigbu. Ọ bụrụ na anyị na-arụrụ nwanna ọrụ, anyị ekwesịghị iche na iwu ji ya ịna-emenyere anyị.

13 Ọtụtụ mgbe, ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova na-aja anyị mma maka na anyị na-akwụwa aka ọtọ. Dị ka ihe atụ, otu onyeisi ná nnukwu ụlọ ọrụ chọpụtara na Ndịàmà Jehova na-eme ihe ha kwuru na ha ga-eme. Ọ sịrị, “Unu na-eme ihe unu kwetara na unu ga-eme.” (Ọma 15:4) Ikwu eziokwu n’ihe niile na-eme ka anyị na Jehova na-adị ná mma, meekwa ka e too Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya.

NYERE NDỊ ỌZỌ AKA KA HA BỤRỤ ENYI JEHOVA

Anyị na-enyere ndị ọzọ aka ka ha bụrụ ndị enyi Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 na nke 15)

14 O nwere ike ịbụ na ọtụtụ ndị anyị na-ezi ozi ọma kweere na Chineke, ma ha ewereghị ya ka ezigbo Enyi ha. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ha aka? Mgbe Jizọs na-ezipụ mmadụ iri asaa bụ́  ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa kwusaa ozi ọma, ọ gwara ha, sị: “N’ebe ọ bụla unu banyere n’ụlọ, burunụ ụzọ sị, ‘Udo dịrị ụlọ a.’ Ọ bụrụkwa na onye udo nọ n’ebe ahụ, udo unu ga-adịkwasị ya. Ma ọ bụrụ na ọ nọghị, udo unu ga-alaghachikwute unu.” (Luk 10:5, 6) Ndị mmadụ nwere ike ịchọ ka anyị zie ha ozi ọma ma ọ bụrụ na anyị na-emesara ha ihu. Ọ bụrụ na anyị ejiri obiọma na-emeso ndị na-emegide anyị ihe, o nwere ike ime ka obi ha jụrụ, ha egee anyị ntị n’oge ọzọ.

14, 15. Anyị nọrọ n’ozi ọma, olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị mmadụ aka ka ha bụrụ ndị enyi Jehova?

15 Mgbe anyị hụrụ ndị bu chọọchị n’isi ma ọ bụkwanụ ndị na-eme ihe ndị a kụziiri ha n’okpukpe ụgha, anyị kwesịrị iwetu obi gwa ha okwu, ọ bụghị ịkatọwa ha. Anyị na-eji ihu ọchị anabata ndị niile bịara ọmụmụ ihe anyị, nke ka nke, ndị ihe na-eme n’ụwa taa gwụrụ ike, ha achọọ ịmụta banyere Chineke anyị na-efe. Ị gụọ isiokwu bụ́ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ,” ị ga-ahụ ọtụtụ ebe a kọrọ gbasara ụdị ndị a.

OTÚ ANYỊ NA EZIGBO ENYI ANYỊ GA-ESI NA-ARỤKỌ ỌRỤ

16. Olee otú anyị ga-esi bụrụ ndị enyi Jehova na ndị ha na ya “na-arụkọ ọrụ”?

16 Ndị na-arụkọ ọrụ ọnụ na-aghọkarị ezigbo enyi. Ndị niile nyefere Jehova onwe ha bụ ndị enyi Jehova na ndị ha na ya “na-arụkọ ọrụ.” (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 3:9.) Ka anyị na-ezi ozi ọma ma na-eme ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị na-aghọtakwu ọtụtụ àgwà magburu onwe ha Jehova nwere. Anyị na-ahụ otú mmụọ nsọ si na-enyere anyị aka ikwusa ozi ọma.

17. Olee otú ihe ndị a na-akụzi ná mgbakọ si egosi na Jehova bụ Enyi anyị?

17 Anyị na Jehova ga-adịkwu ná mma ma anyị na-agachi ozi ọma anya. Anyị na-ahụ otú Jehova si na-eme ka ndị iro anyị ghara ịkwụsị ozi ọma anyị na-ekwusa. O doro anya na Jehova na-edu anyị kemgbe ụwa, obi dịkwa anyị ụtọ maka otú o si eji ọmụmụ ihe anyị na-aga na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl akụziri anyị ihe. Anyị gaa mgbakọ, anyị na-achọpụta na Jehova maara nsogbu anyị na mkpa anyị. Mgbe otu ezinụlọ gachara mgbakọ, ha dere, sị: “Ihe ndị e kwuru ná mgbakọ a anyị gara ruru anyị n’obi. Anyị ghọtara na Jehova hụrụ onye ọ bụla n’ime anyị n’anya nke ukwuu, chọọkwa ka ihe na-agara anyị nke ọma.” Mgbe otu di na nwunye si Jamanị gachara otu mgbakọ distrikti pụrụ iche n’Ayaland, ha degaara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ ma kwuo na obi dị ha ụtọ maka otú e si nabata ha ma lekọta ha. Ha kwukwara, sị: “Ndị anyị na-ekele karịchaa bụ Jehova na Jizọs Kraịst, onye o mere Eze. Ọ bụ ha kpọrọ anyị ka anyị soro ná ndị a dị n’otu. Ihe anyị na-eme abụghị naanị ikwu na anyị dị n’otu, anyị na-egosi n’eziokwu na anyị  dị n’otu kwa ụbọchị. Ihe ndị mere ná mgbakọ a pụrụ iche anyị gara na Dọblịn ga na-echetara anyị ihe ùgwù anyị nwere iso unu niile na-ejere Chineke anyị dị ukwuu ozi.”

NDỊ ENYI NA-EKWURỊTA OKWU

18. Olee ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị gbasara anyị na Jehova ikwurịta okwu?

18 Enyi na enyi ga-adịkwu ná mma ma ọ bụrụ na ha ana-ekwurịta okwu nke ọma. Taa, ọtụtụ ndị na-ejikarị Ịntanet na ekwentị ezirịta ozi. Olee ihe jikọrọ ya na otú anyị na ezigbo Enyi anyị, bụ́ Jehova, si ekwurịta okwu? Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere.” (Ọma 65:2) Ma, ugboro ole ka anyị na-ewepụta oge gwa ya okwu?

19. Ọ bụrụ na anyị amaghị otú anyị ga-esi agwa Jehova otú obi dị anyị, gịnị ga-enyere anyị aka?

19 Ọ na-esiri ụfọdụ ndị ohu Chineke ike ịgwa onye ọzọ ihe dị ha n’obi. Ma, Jehova chọrọ ka anyị gwa ya ihe dị anyị n’obi mgbe anyị na-ekpe ekpere. (Ọma 119:145; Ákwá 3:41) Ọ bụrụgodị na anyị amaghị otú anyị ga-esi agwa Jehova otú obi dị anyị, o nwere ihe ga-enyere anyị aka. Pọl degaara Ndị Kraịst nọ na Rom akwụkwọ, sị: “Anyị amaghị nsogbu nke anyị kwesịrị ikpe ekpere maka ya dị ka ọ dị anyị mkpa ịdị na-ekpe, ma mmụọ nsọ n’onwe ya na-arịọrọ anyị arịrịọ mgbe anyị na-asụ ude n’ekwughị okwu. Ma onye ahụ nke na-enyocha obi maara ihe bụ́ nzube nke mmụọ nsọ, n’ihi na ọ na-arịọrọ ndị nsọ arịrịọ dị ka Chineke si chọọ.” (Rom 8:26, 27) Anyị gụọ Baịbụl, dị ka akwụkwọ Job, Abụ Ọma, na Ilu, ọ ga-enyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi agwa Jehova otú obi dị anyị.

20, 21. Olee otú ihe Pọl dere ná Ndị Filipaị 4:6, 7 si agba anyị ume?

20 Mgbe anyị nwere nsogbu ndị tara akpụ, ka anyị cheta ihe Pọl gwara ndị Filipaị. Ọ sịrị ha: “Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ.” Ọ bụrụ na anyị esi otú ahụ na-ekpe ekpere, obi ga-eru anyị ala. Pọl dere, sị: “Udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche site n’aka Kraịst Jizọs.” (Fil. 4:6, 7) Anyị kwesịrị igosi mgbe niile na obi dị anyị ụtọ maka udo na-enweghị atụ Chineke na-enye anyị, nke na-eche obi anyị na uche anyị nche.

Olee otú ekpere si eme ka anyị na Chineke dịkwuo ná mma? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 21)

21 Ekpere na-eme ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma. N’ihi ya, ka anyị na-ekpe ekpere mgbe niile. (1 Tesa. 5:17) Anyị kwesịrị ịna-eme ka anyị na Chineke dịkwuo ná mma, na-emekwa ihe ọ chọrọ ka anyị na-eme. Ka anyị wepụtakwa oge na-echebara ihe ọma niile Chineke na-emere anyị echiche, bụ́ ndị gosiri n’eziokwu na Jehova bụ Nna anyị, Chineke anyị, na Enyi anyị.