Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) FEBỤWARỊ 2014

Ṅụrịa Ọṅụ n’Ihi Ọlụlụ Nwunye nke Nwa Atụrụ Ahụ

Ṅụrịa Ọṅụ n’Ihi Ọlụlụ Nwunye nke Nwa Atụrụ Ahụ

“Ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nke ukwuu . . . n’ihi na ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ eruwo.”—MKPU. 19:7.

1, 2. (a) Olee onye agbamakwụkwọ ya ga-eme ka ndị nọ n’eluigwe ṅụrịa ọṅụ? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

ỊKWADEBE maka agbamakwụkwọ na-ewe oge. Ma, anyị ga-eleba anya n’otu agbamakwụkwọ a na-akwadebe kemgbe ihe dị ka puku afọ abụọ. Ọ bụ Eze ga-agba akwụkwọ ahụ. Oge eruwela ka a kpọnye nwoke ahụ na-alụ nwunye nwunye ya. Ọ gaghị adị anya a nụwa ụda egwú n’obí eze, ndị nọ n’eluigwe abụwakwa abụ, sị: “Toonụ Jaa, n’ihi na Jehova Chineke anyị, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, amalitewo ịchị achị dị ka eze. Ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nke ukwuu, ka anyị nyekwa ya otuto, n’ihi na ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ eruwo, nwunye ya ejikerewokwa.”—Mkpu. 19:6, 7.

2 “Nwa Atụrụ ahụ” e kwuru okwu ya bụ Jizọs Kraịst. (Jọn 1:29) Agbamakwụkwọ ya ga-eme ka ndị nọ n’eluigwe ṅụrịa ọṅụ. Olee ụdị uwe ọ ga-eyi agba akwụkwọ? Ònye bụ nwunye ya? Olee otú e si kwadebe nwunye ya maka agbamakwụkwọ ha? Olee mgbe ha ga-agba akwụkwọ? Ọ̀ bụ naanị ndị nọ n’eluigwe ka agbamakwụkwọ ha ga-eme ka ha ṅụrịa ọṅụ, ka ndị ga-ebi n’ụwa hà ga-esokwa ṅụrịa ọṅụ? Anyị na-atụsi anya ike ka a zaa  ajụjụ ndị a. N’ihi ya, ka anyị lebakwuo anya n’Abụ Ọma nke iri anọ na ise.

‘UWE YA NIILE NA-ESI ÍSÌ ỤTỌ’

3, 4. (a) Gịnị ka ọbụ abụ kwuru gbasara uwe Nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ ga-eyi gbaa akwụkwọ? Gịnị mere o ji na-enwekwu obi ụtọ? (b) Ole ndị bụ “ndị inyom ndị eze mụrụ” na “nwunye eze” so Nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ na-aṅụrị ọṅụ?

3 Gụọ Ọma 45:8, 9. Onye ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ, ya bụ, Jizọs Kraịst, yiiri uwe ndị eze na-eyi ma ha chọọ ịgba akwụkwọ. Uwe o yi na-esi ísì ọma dị ka nke “ihe na-esi ísì ụtọ kasị mma,” ya bụ, ihe ndị dị ka mea na kashịa. Ihe abụọ a so n’ihe e ji eme mmanụ dị nsọ e ji ete mmadụ mmanụ n’Izrel.—Ọpụ. 30:23-25.

4 Ka oge agbamakwụkwọ ahụ na-eru nso, obi na-adịkwu nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ụtọ n’ihi egwú dị ụtọ nke na-ada n’eluigwe, ya bụ, n’obí eze. “Nwunye eze,” ya bụ, ndị ohu Chineke nọ n’eluigwe, so ya na-aṅụrị ọṅụ. Ndị so ná ndị ohu Chineke ahụ bụ “ndị inyom ndị eze mụrụ,” ya bụ, ndị mmụọ ozi dị nsọ. Chegodị ụdị obi ụtọ ị ga-enwe ma ị nụ ka ndị nọ n’eluigwe na-ekwu, sị: “Ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nke ukwuu . . . n’ihi na ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ eruwo.”

NWAANYỊ AHỤ A NA-ALỤ ỌHỤRỤ EJIKERELA MAKA AGBAMAKWỤKWỌ YA

5. Ònye bụ “nwunye Nwa Atụrụ ahụ”?

5 Gụọ Abụ Ọma 45:10, 11. Anyị amatala onye bụ́ nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ. Ma, ònye bụ nwunye ya? Ọ bụghị nwaanyị nkịtị. Kama, ọ nọchiri anya Ndị Kraịst niile e tere mmanụ. Ọ bụ Jizọs Kraịst bụ onyeisi ha. (Gụọ Ndị Efesọs 5:23, 24.) Ha ga-eso Kraịst chịa n’Alaeze Mesaya n’eluigwe. (Luk 12:32) Ndị Kraịst a e tere mmanụ dị otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ. Ha “na-eso Nwa Atụrụ ahụ n’agbanyeghị ebe ọ na-eje.” (Mkpu. 14:1-4) Ha ga-aghọ “nwunye Nwa Atụrụ ahụ,” ha na ya ebiri n’eluigwe.—Mkpu. 21:9; Jọn 14:2, 3.

6. Gịnị mere e ji kpọọ ndị e tere mmanụ “ada eze,” gịnịkwa mere e ji gwa ha ka ha ‘chefuo ndị ha’?

6 A kpọrọ nwaanyị a a na-alụ ọhụrụ “ada,” kpọọkwa ya “ada eze.” (Ọma 45:13) Ònye bụ “eze” a? Ọ bụ Jehova. O mere ka Ndị Kraịst e tere mmanụ bụrụ “ụmụ” ya. (Rom 8:15-17) A gwara ndị e tere mmanụ ka ha chefuo ndị ha nakwa ụlọ nna ha. Ebe ọ bụ na ha ga-eso di ha gaa eluigwe, ha kwesịrị ‘ịna-atụkwasị uche n’ihe ndị dị n’elu, ọ bụghị n’ihe ndị dị n’elu ụwa.’—Kọl. 3:1-4.

7. (a) Olee otú Kraịst si na-akwadebe nwaanyị ọ ga-alụ? (b) Olee otú nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ si were di ga-alụ ya?

7 Kemgbe ọtụtụ narị afọ, Kraịst na-akwadebe nwunye ya maka agbamakwụkwọ ha n’eluigwe. Pọl onyeozi kwuru na Kraịst “hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya ma nyefee onwe ya maka ya, ka o wee doo ya nsọ, jirikwa mmiri saa ya wee mee ka ọ dị ọcha site n’okwu Chineke, ka o wee chee ọgbakọ ahụ n’ihu onwe ya n’ịma mma ya, n’enweghị ntụpọ ma ọ bụ ahụ́ ndọlị ma ọ bụ ihe ọ bụla dị otú ahụ, kama ka o wee dị nsọ, gharakwa inwe mmerụ.” (Efe. 5:25-27) Pọl gwara Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ na Kọrịnt oge ochie, sị: “Ana m ekworo unu ekworo yiri ekworo Chineke, n’ihi na mụ onwe m kwere unu nkwa na otu di ga-alụ unu ka m wee chee unu n’ihu Kraịst dị ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke a na-emerụghị emerụ.” (2 Kọr. 11:2) Nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ mara mma n’anya Eze ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst, n’ihi na e merụghị ofufe ọ na-efe Chineke emerụ. Ọ ‘na-egburu di ya ikpere n’ala’ ma na-akpọ ya ‘onyenwe ya.’

 A KPỌỌRỌ NWAANYỊ AHỤ A NA-ALỤ ỌHỤRỤ “BỊAKWUTE EZE”

8. Gịnị mere Abụ Ọma ji kwuo na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ bụ “sọ mma”?

8 Gụọ Abụ Ọma 45:13, 14a. ‘A chọrọ nwaanyị a mma maka di ya.’ Ọ bụzi “sọ mma” maka agbamakwụkwọ ya na eze. Ná Mkpughe 21:2, e ji nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ tụnyere obodo. A kpọrọ ya Jeruselem Ọhụrụ. Obodo a dị n’eluigwe. “O nwekwara ebube Chineke. Ọ na-egbuke egbuke dị ka nkume dị nnọọ oké ọnụ ahịa, dị ka nkume jaspa nke na-egbuke nke ọma.” (Mkpu. 21:10, 11) Akwụkwọ Mkpughe kọwara otú Jeruselem Ọhụrụ a si na-egbu maramara. (Mkpu. 21:18-21) Ka a sịkwa ihe mere ọbụ abụ ji kwuo na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ bụ “sọ mma.” A sị ka e kwuwe, ọ bụ n’eluigwe ka ha ga-anọ agba akwụkwọ.

9. Ònye ka a kpọọrọ nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ bịakwute? Olee ụdị uwe o yi?

9 A kpọọrọ nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ bịakwute di ya, ya bụ, Eze bụ́ Mesaya. Ọ kwadebela ya, jiri okwu Chineke “mee ka ọ dị ọcha.” Ọ bụ ya mere o ji “dị nsọ, gharakwa inwe mmerụ.” (Efe. 5:26, 27) Uwe nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ ga-eyi maka agbamakwụkwọ ha kwesịkwara ịma ezigbo mma. Ọ mara mma n’eziokwu. “E ji ọlaedo chọọ uwe ya mma.” ‘Ọ ga-eyikwa uwe a kpara akpa mgbe a ga-akpọrọ ya bịakwute eze.’ Ihe e nyere ya ka o yiri maka agbamakwụkwọ ya na Nwa Atụrụ ahụ bụ “ákwà linin ọma nke na-enwu gbaa, nke dịkwa ọcha, n’ihi na ákwà linin ọma ahụ nọchiri anya ezi omume nke ndị nsọ na-eme.”—Mkpu. 19:8.

“ỌLỤLỤ NWUNYE NKE NWA ATỤRỤ AHỤ ERUWO”

10. Olee mgbe Nwa Atụrụ ahụ ga-agba akwụkwọ?

10 Gụọ Mkpughe 19:7. Olee mgbe Nwa Atụrụ ahụ ga-agba akwụkwọ? Mkpughe 19:7 kwuru na ‘nwunye Nwa Atụrụ ahụ ejikerela’ maka agbamakwụkwọ ha. Ma, amaokwu ndị na-eso ya ekwughị banyere agbamakwụkwọ ahụ. Amaokwu ndị ahụ kwuru banyere ihe ikpeazụ ga-eme n’oké mkpagbu. (Mkpu. 19:11-21) Ọ̀ pụtara na Eze ahụ ga-agba akwụkwọ tupu ya emerichaa ndị iro ya? Mba. E deghị ihe ndị dị n’akwụkwọ Mkpughe n’usoro ha ga-esi mee. N’Abụ Ọma nke iri anọ na ise, Eze ahụ bụ́ Jizọs Kraịst bu ụzọ kee mma agha ya n’úkwù ma merie ndị iro ya tupu ya agbaa akwụkwọ.—Ọma 45:3, 4.

11. Gịnị na gịnị ka Kraịst ga-eme tupu ya agbaa akwụkwọ?

11 N’ihi ya, ihe anyị mụtara na Baịbụl gosiri na a ga-ebu ụzọ bibie “oké nwaanyị akwụna ahụ,” bụ́ Babịlọn Ukwu, ya bụ, okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa. (Mkpu. 17:1, 5, 16, 17; 19:1, 2) E bibichaa ya, Kraịst ga-ebibi ihe ndị fọdụrụ n’ụwa Setan a n’agha Amagedọn, ya bụ, “agha nke oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” (Mkpu. 16:14-16; 19:19-21) Ihe ikpeazụ ga-emenụ bụ na Eze ahụ ga-atụba Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abis, si otú ahụ nwezuo mmeri ya. Mgbe ha ga-anọ n’abis, ọ ga-adị ka hà nwụrụ anwụ n’ihi na ha agaghịzi na-akpa ike.—Mkpu. 20:1-3.

12, 13. (a) Olee mgbe Nwa Atụrụ ahụ ga-agba akwụkwọ? (b) Olee ndị ga-aṅụrị ọṅụ n’eluigwe n’ihi ọlụlụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ?

12 N’oge ikpeazụ a, Onye Kraịst ọ bụla e tere mmanụ kwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, a na-akpọlite ya ozugbo, ya agaa eluigwe. E bibichaa Babịlọn Ukwu ahụ, Kraịst ga-akpọrọ Ndị Kraịst e tere mmanụ fọrọ n’ụwa gaa eluigwe tupu a lụọ agha Amagedọn. (1 Tesa. 4:16, 17) N’ihi ya, ọ bụ mgbe a lụchara agha Amagedọn ka Nwa Atụrụ ahụ ga-agba akwụkwọ n’eluigwe. Ọ ga-abụ oge obi ụtọ. Mkpughe 19:9 kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị a kpọrọ òkù ịbịa nri anyasị ọlụlụ nwunye  nke Nwa Atụrụ ahụ.” Ndị so na nwunye Nwa Atụrụ ahụ ga-enwe ezigbo obi ụtọ. Obi ga-adịkwa Eze ahụ ụtọ na ndị na-eso ụzọ ya niile e tere mmanụ esorola ya nọrọ n’eluigwe. (Luk 22:18, 28-30) Ma, ọ bụghị naanị Nwa Atụrụ ahụ na nwunye ya ga na-aṅụrị ọṅụ n’ihi agbamakwụkwọ ha.

13 Dị ka anyị kwuru na mbụ, ndị niile nọ n’eluigwe ga-abụ abụ, sị: “Ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nke ukwuu, ka anyị nyekwa [Jehova] otuto, n’ihi na ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ eruwo, nwunye ya ejikerewokwa.” (Mkpu. 19:6, 7) Ndị ohu Jehova nọ n’ụwa hà ga-eso ndị nọ n’eluigwe ṅụrịa ọṅụ?

“A GA-EJI OBI ỤTỌ NA ỌṄỤ KPỌBATA HA”

14. Abụ Ọma nke iri anọ na ise kwuru banyere ‘ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke’ so nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ. Ole ndị ka ha bụ?

14 Gụọ Abụ Ọma 45:12, 14b, 15. Zekaraya onye amụma kwuru na n’oge ikpeazụ, ndị si ná mba dị iche iche ga-eji obi ụtọ soro ndị e tere mmanụ na-efe Jehova. O dere, sị: “Ndị ikom iri ndị si n’asụsụ niile nke mba dị iche iche ga-ejide, ee, ha ga-ejide uwe mwụda nke nwoke bụ́ onye Juu, sị, ‘Anyị ga-eso unu, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.’” (Zek. 8:23) N’Abụ Ọma 45:12, a kpọrọ “ndị ikom iri” a “ada bụ́ Taya” na “ndị bụ́ ọgaranya.” Ha wetaara ndị e tere mmanụ ka nọ n’ụwa onyinye ka ha na ha dị ná mma nakwa ka ndị e tere mmanụ nyere ha aka ife Jehova. Kemgbe afọ 1935, ndị e tere mmanụ emeela ka ọtụtụ nde mmadụ “bụrụ ndị ezi omume.” (Dan. 12:3) “Ndị ikom iri” a ji obi ha niile na-akwado Ndị Kraịst e tere mmanụ. Ha esepụla aka n’okpukpe ụgha. Ọ bụ ya mere e ji kpọọ ha ‘ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke’ so nwaanyị ahụ a na-alụ  ọhụrụ. Ha enyefeela Jehova ndụ ha, gosikwa na ha ji obi ha niile na-ejere Eze ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst, ozi.

15. Olee otú atụrụ ọzọ na Ndị Kraịst e tere mmanụ ka nọ n’ụwa si na-arụkọ ọrụ?

15 Ndị e tere mmanụ ka nọ n’ụwa nwere obi ụtọ na ndị a so ha na-enyere ha aka n’ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke “n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mat. 24:14) Ọ bụghị naanị “mmụọ nsọ na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asị: ‘Bịa!’” ndị nụrụ ya na-asịkwa: “Bịa!” (Mkpu. 22:17) Ọ pụtara na “atụrụ ọzọ” anụla ka ndị e tere mmanụ sịrị: “Bịa!” ha esorokwa ha na-asị ndị niile nọ n’ụwa: “Bịa!”—Jọn 10:16.

16. Olee ihe ùgwù Jehova nyere atụrụ ọzọ ahụ?

16 Ndị e tere mmanụ ka nọ n’ụwa hụrụ atụrụ ọzọ ahụ n’anya. Obi dị ha ụtọ na Jehova, bụ́ Nna Nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ, ga-eme ka atụrụ ọzọ soro ṅụrịa ọṅụ n’ihi agbamakwụkwọ Nwa Atụrụ ahụ. E buru amụma na ‘a ga-eji obi ụtọ na ọṅụ kpọbata ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke so nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ.’ N’eziokwu, atụrụ ọzọ ahụ, bụ́ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa, ga-eso ndị niile nọ n’eluigwe ṅụrịa ọṅụ mgbe Nwa Atụrụ ahụ ga-agba akwụkwọ n’eluigwe. Ọ dabara adaba na akwụkwọ Mkpughe kwuru na “oké ìgwè mmadụ” “guzo n’ihu ocheeze ahụ nakwa n’ihu Nwa Atụrụ ahụ.” Ha nọ n’ogige nnukwu ụlọ nsọ Jehova dị n’ụwa na-ejere ya ozi.—Mkpu. 7:9, 15.

Agbamakwụkwọ Nwa Atụrụ ahụ ga-eme ka ‘ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke’ so nwaanyị ahụ Kraịst na-alụ ọhụrụ ṅụrịa ọṅụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

“ỤMỤ GỊ NDỊ IKOM GA-ANỌCHI NNA NNA GỊ HÀ”

17, 18. Olee uru agbamakwụkwọ Nwa Atụrụ ahụ ga-aba n’ụwa ọhụrụ? Olee ndị Kraịst ga-aghọrọ nna n’otu puku afọ ahụ ọ ga-achị?

17 Gụọ Abụ Ọma 45:16. ‘Ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke’ so nwaanyị ahụ Kraịst na-alụ ọhụrụ ga-aṅụrịkwu ọṅụ mgbe ha ga-ahụ uru agbamakwụkwọ Nwa Atụrụ ahụ bara n’ụwa ọhụrụ. Jizọs Kraịst ga-akpọlite ‘nna nna ya hà’ n’ọnwụ. N’ihi ya, ndị nna nna ya ga-aghọzi ‘ụmụ ya ndị ikom.’ (Jọn 5:25-29; Hib. 11:35) Kraịst ga-eme ụfọdụ n’ime ‘ụmụ ya ndị ikom’ “ndị isi n’ụwa dum.” Ọ ga-esikwa ná ndị okenye kwesịrị ntụkwasị obi e nwere taa họpụta ndị ga-eso ha bụrụ “ndị isi” n’ụwa ọhụrụ.—Aịza. 32:1.

18 N’otu puku afọ ahụ Kraịst ga-achị, e nwere ndị ọzọ ọ ga-aghọrọ nna. Ihe mere ndị niile bi n’ụwa mgbe ahụ ga-eji dị ndụ ebighị ebi bụ na ha nwere okwukwe n’àjà Kraịst chụrụ. (Jọn 3:16) Ọ ga-esi otú ahụ ghọọrọ ha “Nna Mgbe Ebighị Ebi.”—Aịza. 9:6, 7.

ANYỊ KWESỊRỊ IME KA A MARA AHA EZE AHỤ

19, 20. Olee uru ihe ndị e kwuru n’Abụ Ọma nke iri anọ na ise baara ezigbo Ndị Kraịst niile?

19 Gụọ Abụ Ọma 45:1, 17. Ihe ndị e kwuru n’Abụ Ọma nke iri anọ na ise gbasara Ndị Kraịst niile. Obi dị ndị e tere mmanụ ka nọ n’ụwa ụtọ na n’oge na-adịghị anya, ha ga-eso ụmụnna ha gaa eluigwe ka ha na di ha, bụ́ Jizọs Kraịst, nọrọ. Ihe e kwuru n’Abụ Ọma ahụ emeekwala ka atụrụ ọzọ na-erubekwuru Eze ha dị ebube isi. Obi dịkwa ha ụtọ na ha so ndị e tere mmanụ ka nọ n’ụwa na-ejere Jehova ozi. Kraịst na nwaanyị ahụ ọ na-alụ ọhụrụ gbachaa akwụkwọ, ha ga-ewetara ndị niile bi n’ụwa ngọzi na-enweghị atụ.—Mkpu. 7:17; 21:1-4.

20 Ka anyị na-atụ anya ka e mezuo amụma ndị e buru banyere Eze bụ́ Mesaya, ọ na-eme ka anyị na-akọrọ ndị ọzọ gbasara aha ya. Ka anyị soro ná ndị ga-eto Eze ahụ “ruo mgbe niile ebighị ebi.”