Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JENỤWARỊ 2014

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka

E NWERE otu nwoke aha ya bụ Pascal. Ọ bụ onye Kot Devụa. Mgbe ọ dị obere, e nwere ọtụtụ ndị ogbenye n’ebe o bi. Ma, ọ chọrọ inwe ego. Ebe ọ bụ na ọ ka na-amụ ịkụ ọkpọ amụ, ọ nọ na-eche, sị, ‘Olee ebe m ga-aga ghọọ onye a ma ama na-akụ ọkpọ, baakwa ọgaranya?’ Mgbe Pascal dị ihe dị ka iri afọ abụọ na ise, o kpebiri na ya ga-aga Yurop. Ma, o nweghị akwụkwọ ikike ọ ga-eji gaa Yurop. N’ihi ya, o kpebiri na ya ga-eji aghụghọ gaa.

N’afọ 1998, ya bụ, mgbe Pascal dị iri afọ abụọ na asaa, ọ gawara Yurop. O si obodo ya gaa Gana, si Gana gaa Togo, sizie ebe ahụ gaa Bene. O mechara rute n’obodo a na-akpọ Beni Nkọni, nke dị na Nijie Rịpọblik. Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ ga-ejikerezi ịgafe ebe nwere ike ịta isi ya. Ọ ga-aba gwongworo gawa n’ebe ugwu ma gafee Nnukwu Ọzara Sahara. Ya ruo n’Oké Osimiri Mediterenian, ọ ga-abanye n’ụgbọ mmiri ga-ebuga ya Yurop. Ọ bụ otú ahụ ka ọ chọrọ isi aga. Ma e nwere ihe abụọ mere mgbe ọ nọ na Nijie, ya ekpebie na ya agaghịzi aga.

Nke mbụ bụ na ego o ji gwụrụ. Nke abụọ abụrụ na otu ọsụ ụzọ aha ya bụ Noé malitere ịmụrụ ya Baịbụl. Ihe ọ mụtara ruru ya n’obi, ya agbanwee otú o si ele ndụ anya. Ọ kwụsịrị ichewe otú ọ ga-esi baa ọgaranya, chewezie otú ọ ga-esi na-ejere Chineke ozi. E mere Pascal baptizim n’ọnwa Disemba afọ 1999. Ọ chọrọ igosi Jehova na obi dị ya ụtọ maka ihe ndị ọ mụtara. N’ihi ya, ọ malitere ịsụ ụzọ n’afọ 2001 n’otu obodo ahụ ọ nọ mụta eziokwu na Nijie Rịpọblik. Olee otú obi dị ya maka ozi ọ na-eje? O kwuru, sị: “O nweghị ihe ka mma m gaara eji ndụ m na-eme.”

OZI HA NA-EJE N’AFRỊKA NA-EME KA HA NWEKWUO OBI ỤTỌ

Anne-Rakel

E nweela ọtụtụ ndị mere ka Pascal. Ha achọpụtala na mmadụ iji ndụ ya na-ejere Chineke ozi ga-eme ka onye ahụ nwekwuo obi ụtọ. Ọ bụ ya mere ụfọdụ ụmụnna anyị ji si Yurop kwaga n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa n’Afrịka. N’eziokwu, ihe dị ka ụmụnna iri isii na ise si Yurop gaa n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa ná mba ụfọdụ dị n’ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka, ya bụ, Bene, Bokina Faso, Nijie, na Togo. Ụmụnna ndị a dị n’agbata afọ iri na asaa na iri asaa. * Olee ihe mere ha ji hapụ Yurop gaa Afrịka? Ò nwere uru ihe a ha mere bara?

E nwere otu nwanna nwaanyị si Denmak. Aha ya bụ Anne-Rakel. O kwuru, sị: “Papa m na mama m bụbu ndị ozi ala ọzọ na Senegal. Obi na-adị ha ụtọ ma ha kwuwe banyere ozi ala ọzọ. Ọ bụ ya mere m ji chọọ ịbụ onye ozi ala ọzọ.” Ihe dị ka afọ iri na ise gara aga, Anne-Rakel kwagara Togo, na-eje ozi n’otu ọgbakọ na-eji asụsụ ndị ogbi amụ ihe. Ọ dị ihe dị ka iri afọ abụọ na atọ mgbe ahụ. Olee otú ihe ahụ o mere si gbaa ndị ọzọ ume? O kwuru, sị: “Ụmụnne m abụọ m tọrọ mechara  soro m kwaga Togo. Otu bụ nwoke, nke ọzọ abụrụ nwaanyị.”

Albert-Fayette na Aurele

E nwere otu nwanna si Frans aha ya bụ Aurele. Ọ dị iri afọ asaa. O kwuru, sị: “Mgbe m lara ezumike nká n’afọ ise gara aga, m nwere ike ikpebi ịnọ na Frans, na-ejere Chineke ozi otú ike kwere m ma na-eche ka Paradaịs bịa, ma ọ bụkwanụ kpebie ijekwuru Chineke ozi.” Aurele kpebiri ijekwuru Chineke ozi. Ihe dị ka afọ atọ gara aga, ya na nwunye ya bụ́ Albert-Fayette kwagara Bene Rịpọblik. Aurele kwuru, sị: “Ihe kacha mma anyị metụrụla bụ iwepụta onwe anyị bịa ebe a na-ejere Jehova ozi.” Ọ mụmụrụ ọnụ ọchị, kwuokwa, sị: “O mechara bụrụ na ebe so n’ebe anyị na-ekwusa ozi ọma dị n’akụkụ osimiri. Otú o si maa mma na-echetara m Paradaịs.”

Afọ iri na isii gara aga, otu nwanna aha ya bụ Clodomir na nwunye ya bụ́ Lysiane si Frans kwaga Bene. Mgbe ha kwagara Bene ọhụrụ, o siiri ha ike ịnọ n’ahụghị ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha nọ na Frans. Ha chedịrị na ha agaghị anọli na Bene. Ma, ha ekwesịghị ichewe otú ahụ. Obi tọrọ ha ezigbo ụtọ n’ebe ahụ. Clodomir kwuru, sị: “Kemgbe afọ iri na isii anyị nọwara na Bene, anyị na-enyere ihe dị ka otu onye aka kwa afọ ịnata eziokwu.”

Lysiane na Clodomir na ụfọdụ ndị ha nyeere aka ha amụta eziokwu

Johanna na Sébastien

Otu nwanna aha ya bụ Sébastien na nwunye ya bụ́ Johanna si Frans kwaga Bene n’afọ 2010. Sébastien kwuru, sị: “Ihe a ga-arụ n’ọgbakọ ebe a karịrị akarị. Ozi anyị na-eje ebe a mere ka ọ dị anyị ka nzukọ Jehova ọ̀ na-enye anyị ọzụzụ pụrụ iche.” Ndị ebe ahụ hà na-ege ntị n’ozi ọma? Johanna kwuru, sị: “Ndị mmadụ chọsiri ike ịmụta eziokwu Baịbụl. Ọ bụrụgodị na anyị anọghị n’ozi, ndị mmadụ na-akwụsị anyị n’ụzọ, jụọ anyị ajụjụ gbasara Baịbụl ma ọ bụkwanụ gwa anyị nye ha akwụkwọ e ji amụ Baịbụl.” Olee uru ebe a ya na nwunye ya bịara na-ekwusa ozi ọma baara ha? Sébastien kwuru, sị: “O meela ka mụ na nwunye m dịkwuo ná mma. Ọ na-atọ m ụtọ ma mụ na ya na-arụ n’ozi ọma, si n’ụtụtụ ruo ná mgbede.”

Nwanna ọzọ aha ya bụ Eric na nwunye ya bụ́ Katy bụ ndị ọsụ ụzọ n’ebe ugwu Bene. Ndị mmadụ ebikọtaghị ọnụ n’ebe ahụ. Mgbe ha ka bi na Frans ihe dị ka afọ iri gara aga, ha bidoro ịgụ isiokwu ndị kwuru maka ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa, ha na ndị nọ n’ozi oge niile ana-akparịtakwa gbasara ozi oge niile. O mere ka ha chọọ ịga jewe ozi ná mba ọzọ. Ha mere otú ahụ n’afọ 2005. Ha ahụla ka ọtụtụ ndị batara n’ọgbakọ. Eric kwuru, sị: “Afọ abụọ gara aga, anyị na-adị ndị nkwusa itoolu amụ ihe n’obodo Tangieta. Ma, ugbu a, anyị dị ndị nkwusa iri atọ. N’ụbọchị Sọnde, ndị na-abịa ọmụmụ ihe na-eru mmadụ iri ise. E nwere mgbe anyị na-akarị otú ahụ. Mgbe ụfọdụ, anyị na-eru mmadụ iri asatọ. Obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ na ọtụtụ ndị na-abịa ọmụmụ ihe anyị.”

Katy na Eric

 MATA NSOGBU NDỊ I NWERE IKE INWE NAKWA OTÚ Ị GA-ESI MERIE HA

Benjamin

Olee nsogbu ndị gara ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa na-enwe? Anne-Rakel nwere nwanne nwoke dị afọ iri atọ na atọ. Aha ya bụ Benjamin. Mgbe ọ nọ na Denmak n’afọ 2000, ọ hụrụ otu onye ozi ala ọzọ jeburu ozi na Togo. Benjamin kwuru, sị: “Mgbe m gwara nwanna ahụ na m chọrọ ịbụ ọsụ ụzọ, ọ sịrị m: ‘Ọ̀ kwa ị ma na ị ga-abụli ọsụ ụzọ na Togo?’” Benjamin chebaara ihe a o kwuru echiche. O kwuru, sị: “Erubeghị m iri afọ abụọ n’oge ahụ, ma ụmụnne m ndị nwaanyị abụọ nọ anọ na Togo na-eje ozi. O mere ka ịkwaga n’ebe ahụ dịrị m mfe.” N’ihi ya, ọ kwagara Togo. Ma, e nwere otu nsogbu o nwere n’ebe ahụ. O kwuru, sị: “O nweghị ihe m ma n’asụsụ French. Ọnwa isii mbụ m nọrọ ebe ahụ siiri m ike n’ihi na mụ na ndị mmadụ anaghị akparịta ụka.” Ma, o mechara mụta French. Benjamin na-eje ozi ugbu a na Betel dị na Bene. O so ná ndị na-ebugara ụmụnna akwụkwọ, na-arụkwa ọrụ na ngalaba na-ahụ maka kọmputa.

Marie-Agnès na Michel

Eric na Katy e kwuru okwu ha ná mmalite na-ejebu ozi n’ọgbakọ ji asụsụ mba ọzọ amụ ihe na Frans tupu ha akwaga Bene. Olee nsogbu ha nwere n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka? Katy kwuru, sị: “O siiri anyị ike inweta ebe dị mma anyị ga-ebi. Ruo ọtụtụ ọnwa, anyị biri n’ụlọ na-enweghị ọkụ eletrik na mmiri pọmpụ.” Eric kwuru, sị: “Ndị agbata obi anyị na-akpọgide egwú na-ada oké ụda ruo n’ime abalị. Onye bi ebe a kwesịrị ịna-edi ụdị ihe a, werekwa ya otú o si hụ ya.” Ha abụọ kwuru, sị: “Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na e kwusatụbeghị ozi ọma n’ebe a. Ụdị obi ụtọ anyị na-enwe n’ihi ozi anyị na-eje n’ebe a na-eme ka anyị chefuo nsogbu ọ bụla anyị nwere.”

Otu nwanna aha ya bụ Michel na nwunye ya bụ́ Marie-Agnès dị ihe dị ka iri afọ ise na asatọ. Ha si Frans kwaga Bene ihe dị ka afọ ise gara aga. Ná mmalite, ha chị obi n’aka. Michel kwuru na ụfọdụ ndị chere na ịkwaga Bene pụtara na ha ji ndụ ha na-egwu egwu. O kwukwara, sị: “Ụjọ gaara na-atụ anyị ma a sị na anyị amaghị na Jehova nọnyeere anyị. N’ihi ya, anyị kwagara Bene maka Jehova, ya anọnyekwara anyị.”

OTÚ Ị GA-ESI JIKERE

Ndị gara jee ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa kwuru na mmadụ kwesịrị ijikere ejikere tupu ya agawa. Otú ị ga-esi jikere bụ: ịhazi ihe ị ga-eme tupu gị emewe ya, ịmụta otú ị ga-esi na-edi nsogbu, ikpebi ego ole ị ga na-emefu n’ọnwa, hụkwa na i mefughị karịa ya, na ịtụkwasị Jehova obi.—Luk 14:28-30.

Sébastien ahụ e kwuburu okwu ya sịrị: “Tupu mụ na Johanna nwunye m agawa, anyị dokọtara ego ruo afọ abụọ. Ihe nyeere anyị aka bụ na anyị selatara aka n’ego ole anyị ji atụrụ ndụ, kwụsịkwa ịzụ ihe na-adịghị mkpa.” Kwa afọ, ha na-aga Yurop rụọ ọrụ ọnwa ole na ole. Ha  laghachi Bene, ego ha rụtara na-ezuru ha ịna-asụ ụzọ ruo mgbe afọ ga-agwụ.

Marie-Thérèse

Ihe dị ka ụmụnna nwaanyị iri abụọ na-alụbeghị di na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Otu n’ime ha bụ Marie-Thérèse. Ọ na-anya bọs na Frans. Ma, n’afọ 2006, ọ gwara onye ọ na-anyara ụgbọala ka o nye ya ezumike otu afọ. O ji oge ahụ gaa sụọ ụzọ na Nijie Rịpọblik. N’oge na-adịghị anya, ọ matara na ọ bụ ụdị ihe ahụ ka ọ chọrọ iji ndụ ya mee. Marie-Thérèse kwuru, sị: “Mgbe m laghachiri Frans, m gwara onye m na-arụrụ ọrụ ka ọ gbanwee oge m na-eji arụ ọrụ. O mere otú ahụ. Ugbu a, m na-anyara ya bọs na Frans bido n’ọnwa Mee ruo n’ọnwa Ọgọst, gazie sụọ ụzọ na Nijie malite n’ọnwa Septemba ruo n’ọnwa Eprel.”

Saphira

Ndị ‘bu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke’ kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi na ọ ga na-egboro ha mkpa ha. (Mat. 6:33) Dị ka ihe atụ, tụlee ihe mere otu nwanna nwaanyị na-alụbeghị di aha ya bụ Saphira. Ọ dị ihe dị ka afọ iri abụọ na asatọ. Ọ bụ onye Frans, ma ọ na-asụ ụzọ na Bene. N’afọ 2011, ọ laghachiri Frans ka ọ rụta ego ọ ga-eji na-egbo mkpa ya n’afọ na-eso ya, nke ga-abụ afọ nke isii o jewere ozi n’Afrịka. Saphira kwuru, sị: “Fraịdee bụ ụbọchị ikpeazụ m rụrụ ọrụ n’ebe m na-arụ ọrụ. Ma, ọ ka ga-ewe m abalị iri iji rụta ego ga-ezuru m n’afọ ọzọ. Ihe m nwere ịnọ na Frans fọrọ naanị izu abụọ. M kpere ekpere gwa Jehova ihe bụ́ nsogbu m. N’oge na-adịghị anya, onye m gwara ka ọ chọtara m ọrụ kpọrọ m n’ekwentị jụọ m ma m̀ ga-arụli ọrụ izu abụọ n’ihi na onye na-arụ ọrụ ahụ agaghị anọ ya.” Na Mọnde ya, Saphira gara n’ebe ahụ ka onye ahụ na-arụbu ọrụ ahụ kụziere ya ọrụ ahụ. O kwuru, sị: “O juru m anya mgbe m chọpụtara na onye ahụ bụ nwanna nwaanyị. Ọ chọrọ iji abalị iri ahụ gaa Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ. Onye ọ na-arụrụ ọrụ ekweghị na ọ ga-aga ọ gwụla ma à chọtara onye ga na-arụ ọrụ ya. O kpere ekpere ka Jehova nyere ya aka otú ahụ mụnwa kpere.”

IJE OZI N’EBE A CHỌKWURU NDỊ NKWUSA NA-EME KA MMADỤ NWEE EZIGBO OBI ỤTỌ

E nweela ụmụnna si ebe ọzọ gaa n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka na-eje ozi kemgbe ọtụtụ afọ. Ahụ́ rukwara ha ala n’ebe ahụ. Ụfọdụ nọrọ afọ ole na ole, laghachi n’obodo ha. Ihe ụmụnna ndị a mụtara mgbe ha na-eje ozi ná mba ọzọ ka na-abara ha uru. Ha mụtara na ọ bụ ijere Jehova ozi ga-eme ka mmadụ nwee ezigbo obi ụtọ.

^ para. 6 Ọ bụ alaka ụlọ ọrụ dị na Bene na-elekọta ozi ọma a na-ekwusa ná mba anọ a na-asụ French.

GỤKWUO GBASARA YA

Ònye Bụ Onye Ozi Ala Ọzọ?

Olee otú onye ozi ala ọzọ si eje ozi ya? Olee ụlọ akwụkwọ pụrụ iche ha na-aga?