Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JENỤWARỊ 2014

Olee Uru Otu Narị Afọ Jizọs Chịrịla Baara Gị?

Olee Uru Otu Narị Afọ Jizọs Chịrịla Baara Gị?

“Ọrụ gị dị ukwuu ma dị ebube, Jehova Chineke, . . . Eze mgbe ebighị ebi.”—MKPU. 15:3.

1, 2. Gịnị ka Alaeze Chineke ga-eme? Gịnị mere obi ji sie anyị ike na Alaeze Chineke ga-abịa?

N’OGE Jizọs Kraịst nọ n’ugwu dị nso na Kapaniọm n’afọ 31, ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa.” (Mat. 6:10) Taa, obi esighị ọtụtụ ndị ike na Alaeze Chineke ga-abịa. Ma, obi siri anyị ike na Chineke ga-aza ekpere anyị na-ekpe ka Alaeze ya bịa.

2 Jehova ga-eji Alaeze ya mee ka ndị ezinụlọ ya dị n’otu, ma ndị nke nọ n’eluigwe ma ndị nke nọ n’ụwa. Ihe a Jehova zubere ga-emezurịrị. (Aịza. 55:10, 11) Ihe ndị merela kemgbe otu narị afọ gosiri na Jehova aghọọla Eze nakwa na ọ na-emere ndị ohu ya ruru ọtụtụ nde ihe ndị dị ebube. (Zek. 14:9; Mkpu. 15:3) Ma, na Jehova abụrụla Eze apụtaghị na Alaeze Chineke Jizọs kụziiri anyị ka anyị na-ekpe ekpere ya abịala. Olee ihe dị iche na Jehova ịbụ Eze na Alaeze Chineke ịbịa? Oleekwa uru ha abụọ baara anyị?

ONYE JEHOVA MERE EZE BIDORO ỌRỤ

3 Ihe dị ka n’afọ 1879, ndị ohu Chineke bidoro ịghọta amụma Daniel buru ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ ise gara aga. Daniel buru amụma, sị: “N’ụbọchị ndị eze ahụ, Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi  malite ịchị.” (Dan. 2:44) Ndị Mmụta Baịbụl ji ọtụtụ afọ kwusaa na afọ 1914 ga-apụ iche. N’oge ahụ, ọtụtụ ndị tụrụ anya na ihe ga-adị mma. Otu onye edemede kwuru gbasara ndị oge ahụ, sị: “Otú ụwa dị na 1914 mere ka ndị mmadụ nwee olileanya na ihe ga-adị mma.” Ma, Agha Ụwa Mbụ mechara malite n’afọ ahụ, amụma Baịbụl emezuo. Amụma Baịbụl buru banyere ụnwụ nri, ala ọma jijiji, ọrịa, na ihe ndị ọzọ bidoro imezu. O gosiri na Jizọs Kraịst malitere ịchị n’eluigwe n’afọ 1914. * Jehova mere ka Ọkpara ya bụ́ Mesaya ghọọ Eze. Ọ bụ otú ọzọ Jehova si ghọọ Eze.

4. Gịnị ka Jizọs mere ozugbo ọ ghọrọ Eze? Olee ihe ọzọ o mechara mee?

4 Ihe mbụ Eze ọhụrụ Chineke mere bụ ịlụso Setan, bụ́ onyeisi ndị iro Nna ya, ọgụ. Jizọs na ndị mmụọ ozi ya chụpụrụ Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe. N’ihi ya, ndị nọ n’eluigwe ṅụrịrị ezigbo ọṅụ. Ma, ọ kpataara ndị bi n’ụwa nsogbu na-enweghị atụ. (Gụọ Mkpughe 12:7-9, 12.) Mgbe ihe a mechara, Eze ahụ malitere ime ka ndị ohu ya nọ n’ụwa dị ọcha, na-akụziri ha ihe, haziekwa ha ka ha nwee ike ime uche Chineke. Ka anyị leba anya n’otú ha si rubere Jizọs isi na ihe anyị ga-amụta na ya.

EZE BỤ́ MESAYA MERE KA NDỊ Ọ NA-ACHỊ DỊ ỌCHA

5. Olee ihe Jizọs mere n’afọ 1914 ruo ná mmalite afọ 1919?

5 Mgbe Jizọs chụpụchara Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe, Jehova dunyere Jizọs ka o nyochaa ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ụwa ma nụchaa ha. Ihe Malakaị onye amụma kwuru gosiri na Jizọs mere ka ndị na-eso ụzọ ya dị ọcha. (Mal. 3:1-3) Ihe ndị mere eme gosiri na ọ bụ n’afọ 1914 ruo ná mmalite afọ 1919 ka o mere ka ndị na-eso ụzọ ya dị ọcha. * Ọ bụrụ na anyị chọrọ iso n’ezinụlọ Chineke, anyị ga-adịrịrị ọcha, ya bụ, dị nsọ. (1 Pita 1:15, 16) Anyị agaghị etinye aka n’ofufe ụgha ma ọ bụkwanụ n’ọchịchị.

6. Olee otú e si akụziri anyị Okwu Chineke? Gịnị mere ihe a na-akụziri anyị ji dị mkpa?

6 Ebe Jizọs bụ Eze, o ji ikike o nwere họpụta “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche.” Ohu a ga na-akụziri ndị niile so ‘n’otu ìgwè atụrụ’ Jizọs Okwu Chineke. (Mat. 24:45-47; Jọn 10:16) Kemgbe afọ 1919, ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-akụziri ndị so ‘n’ezinụlọ’ Kraịst Okwu Chineke n’agbanyeghị na ọ bụghị obere ọrụ. Ihe ohu ahụ na-akụziri anyị na-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike. Ọ na-eme ka anyị kpebisie ike na anyị ga na-adị ọcha n’anya Chineke nakwa na anyị agaghị ekwe ka ihe ọ bụla merụọ ofufe anyị, àgwà anyị, echiche anyị, na ahụ́ anyị. Ọ na-emekwa ka anyị mara otú anyị ga-esi jiri ike anyị niile na-ekwusa ozi ọma, bụ́ ọrụ kacha mkpa a na-arụ n’ụwa ugbu a. Ì ji ihe ndị a a na-akụziri anyị kpọrọ ihe?

EZE AHỤ NA-AKỤZIRI NDỊ NA-ESO ỤZỌ YA IHE KA HA NWEE IKE IKWUSA OZI ỌMA N’ỤWA NIILE

7. Olee ọrụ dị mkpa Jizọs malitere mgbe ọ nọ n’ụwa? Oleekwa mgbe a ga-ekwusaru ya?

7 Mgbe Jizọs malitere ozi ya n’ụwa, o kwuru, sị: “Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.” (Luk 4:43) Ozi Jizọs bụ ihe kacha mkpa ná ndụ ya. O ji afọ atọ na ọkara jee ya. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mgbe unu na-aga, na-ekwusanụ, sị, ‘Alaeze eluigwe eruwo nso.’” (Mat. 10:7) Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, o kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ga-ekwusa ozi ọma ‘ruo n’ebe kasị  anya n’ụwa.’ (Ọrụ 1:8) O kwere ha nkwa na ya ga-anọnyere ha n’ọrụ a dị mkpa ha na-arụ ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.—Mat. 28:19, 20.

8. Olee otú Eze ahụ si mee ka ndị na-eso ụzọ ya jiri ịnụ ọkụ n’obi kwusawa ozi ọma?

8 Malite n’afọ 1919, a ghọtakwuru ‘ozi ọma alaeze Chineke’ a ga-ekwusa. (Mat. 24:14) N’oge ahụ, Eze ahụ amalitela ịchị n’eluigwe, meekwa ka ndị na-eso ụzọ ya dị mmadụ ole na ole dị ọcha. Ha rubere isi n’iwu Jizọs nyere ha ka ha gaa kwusaa ozi ọma n’ụwa niile na ọchịchị Chineke amalitela n’eluigwe. (Ọrụ 10:42) Dị ka ihe atụ, n’ọnwa Septemba n’afọ 1922, ihe fọrọ obere ka o ruo iri puku mmadụ abụọ na-akwado Alaeze Chineke gara mgbakọ mba niile e nwere na Sida Pọịnt, Ohayo, dị n’Amerịka. Obi tọrọ ha ezigbo ụtọ mgbe Nwanna Rutherford kwuru okwu isiokwu ya bụ “Alaeze Ahụ” ma gwa ha, sị: “Lee, Eze ahụ na-achị achị! Unu bụ ndị na-ekwusa ozi ya. N’ihi ya, kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ Eze ahụ na alaeze ya.” N’echi ya, puku mmadụ abụọ n’ime ha gawara ozi ọma. Ụfọdụ sidị n’ebe ahụ a na-eme mgbakọ gaa ihe ruru kilomita iri asaa na abụọ kwusaa ozi ọma. Otu nwanna nwoke kwuru, sị: “E nweghị mgbe m ga-echefu ihe ahụ a gwara anyị, ya bụ, ka anyị kpọsaa Alaeze Chineke, nakwa otú ndị bịara mgbakọ ahụ si jiri ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma.” Ọ dị ọtụtụ ndị otú ahụ ọ dị ya.

9, 10. (a) Olee ụlọ akwụkwọ ndị e ji azụ anyị ikwusa ozi ọma? (b) Olee uru i riterela n’ụlọ akwụkwọ e ji na-akụziri anyị Baịbụl?

9 N’afọ 1922, ihe karịrị puku ndị nkwusa iri na asaa na-ekwusa ozi ọma ná mba iri ise na asatọ. Ma, e kwesịrị ịkụziri ha otú ha ga-esi na-ekwusa ya. N’oge ndịozi Jizọs, Eze ahụ Chineke họpụtara gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe ha ga-ekwusa, ebe ha ga-ekwusa ya, na otú ha ga-esi ekwusa ya. (Mat. 10:5-7; Luk 9:1-6; 10:1-11) Jizọs ka na-eme otú ahụ. Ọ na-eme ka ndị niile na-ekwusa ozi ọma mata otú ha ga-esi ekwusa ya, nwetakwa ihe ndị ga-enyere ha aka ịna-akụzi ihe nke ọma. (2 Tim. 3:17) Jizọs ji ọgbakọ Ndị Kraịst na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma. Otu ụzọ o si eme ya bụ ịna-akụziri ha ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. A na-enwe ụlọ akwụkwọ a n’ihe karịrị otu narị puku ọgbakọ na puku iri na otu e nwere n’ụwa niile. E ji ya na-akụziri ihe karịrị nde ndị nkwusa asaa otú ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma ma na-akụzi ihe otú ọ ga-eru “ụdị mmadụ niile” n’obi—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 9:20-23.

10 E nwekwara ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ e ji azụ ndị okenye, ndị ọsụ ụzọ, ụmụnna nwoke na-alụbeghị nwaanyị, Ndị Kraịst lụrụ di na nwunye, ndị so na Kọmitii  Alaka na ndị nwunye ha, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị nwunye ha, na ndị ozi ala ọzọ. * Mgbe e nwechara otu Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Lụrụ Di na Nwunye, ndị gụrụ akwụkwọ na ya ji obi ụtọ kwuo, sị: “Ihe pụrụ iche a kụziiri anyị emeela ka anyị hụkwuo Jehova n’anya, meekwa ka anyị dịkwuo njikere inyere ndị ọzọ aka.”

11. Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ji na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na Setan na-emegide ha?

11 Setan bụ́ onye iro anyị na-ahụ mbọ niile anyị na-agba ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl. Ọ chọrọ ịkwụsị ozi ọma anyị na-ekwusa. N’ihi ya, o ji ike ya niile na-emegide ma ozi ọma anyị na-ekwusa ma anyịnwa na-ekwusa ya. Ma, mbọ a niile ọ na-agba ga-akụ afọ n’ala. Jehova emeela ka Ọkpara ya nọrọ “n’ebe dị elu karịa ọchịchị na ikike na ike na ịbụisi ọ bụla.” (Efe. 1:20-22) Ebe Jizọs bụ Eze, ọ na-eji ikike o nwere echebe ndị na-eso ụzọ ya ma na-edu ha ka uche Nna ya nwee ike mee. * A ka na-ekwusa ozi ọma, na-akụzikwara ọtụtụ nde ndị chọrọ ịma nke bụ́ eziokwu ihe Jehova chọrọ ka ha na-eme. Iso na-arụ ọrụ a bụ ihe ùgwù na-enweghị atụ.

EZE AHỤ HAZIRI NDỊ NA-ESO ỤZỌ YA KA HA NA-EJEKWU OZI

12. Kọwaa ihe ụfọdụ a gbanwerela n’ọgbakọ kemgbe afọ 1914.

12 Kemgbe Jizọs malitere ịchị n’afọ 1914, o meziela ihe ụfọdụ n’otú e si hazie anyị ime uche Nna ya. (Gụọ Aịzaya 60:17.) N’afọ 1919, a họpụtara onye nduzi ije ozi n’ọgbakọ ọ bụla ka ọ na-ahụ maka ikwusa ozi ọma. N’afọ 1927, a malitere iji ụbọchị Sọnde niile na-aga ozi ụlọ n’ụlọ. N’afọ 1931, ndị ohu Jehova bidoro ịza Ndịàmà Jehova. Aha a mere ka ha jiri ikwusa ozi ọma kpọrọkwuo ihe. (Aịza. 43:10-12) Malite n’afọ 1938, a kwụsịrị ime ntụliaka ma a họpụtawa ndị okenye ọgbakọ. Kama, tupu a họpụta ha, ha ga na-eme ihe Baịbụl kwuru onye bụ́ okenye kwesịrị ịna-eme. Malite n’afọ 1972, ilekọta ọgbakọ abụghịzi ọrụ otu onye ga na-arụ, kama ọ bụ ọrụ ndị okenye niile nọ n’ọgbakọ. A gwara ndị niile ruru eru ịbụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ka ha wepụta onwe ha ka a họpụta ha ịna-enye aka ‘na-azụ ìgwè atụrụ Chineke.’ (1 Pita 5:2) N’afọ 1976, a haziri Òtù Na-achị Isi ka ha nwee kọmitii isii ga na-elekọta ozi ọma a na-ekwusa n’ụwa niile. Kemgbe ahụ, Jizọs ji nwayọọ nwayọọ  na-ahazi ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-eme ihe otú Chineke chọrọ.

13. Olee uru ihe ndị Jizọs merela kemgbe otu narị afọ ọ chịwara baara gị?

13 Chegodị ihe Eze bụ́ Mesaya merela kemgbe otu narị afọ ọ chịwara. O meela ka anyị dị ọcha ka anyị nwee ike ịna-ejere Jehova ozi. O nyerela anyị aka ịna-ekwusa ozi ọma na narị ala abụọ na iri atọ na itoolu, kụziekwara ọtụtụ nde mmadụ ihe Jehova chọrọ ka ha na-eme. O meela ka ihe karịrị nde mmadụ asaa na-eso ụzọ ya dịrị n’otu, ha ewepụtakwa onwe ha ịna-eme uche Nna ya. (Ọma 110:3) N’eziokwu, Jehova ejirila ọchịchị Mesaya mee ihe ndị dị ebube. A ka nwekwara ihe ndị dị ebube ọ ga-eme.

IHE ỌMA ALAEZE MESAYA KA GA-EMERE ANYỊ

14 Ọ bụ eziokwu na Jehova mere ka Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst bụrụ Eze n’afọ 1914, ọ pụtaghị na a zachaala ekpere ahụ anyị na-ekpe ‘ka alaeze Chineke bịa.’ (Mat. 6:10) Baịbụl buru amụma na Jizọs ga ‘na-enwe mmeri n’etiti ndị iro ya.’ (Ọma 110:2) Ọchịchị ụmụ mmadụ nke dị n’aka Setan ka na-emegide Alaeze Chineke. Mgbe anyị na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa, ihe anyị na-arịọ Chineke bụ ka Jizọs na ndị ha na ya ga-achị bịa wepụ ọchịchị ụmụ mmadụ na ndị niile na-emegide Alaeze Chineke n’ụwa. Ọ bụ otú ahụ ka amụma ahụ e buru na Daniel 2:44 ga-esi emezu. Ebe ahụ kwuru na Alaeze Chineke “ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa.” Ọ ga-ebibi ọchịchị ndị na-emegide Alaeze Chineke. (Mkpu. 6:1, 2; 13:1-18; 19:11-21) Ebe ọ bụ na ihe a ga-eme n’oge na-adịghị anya, ọ dabara adaba na isiokwu afọ 2014 bụ: “Ka alaeze gị bịa.” O si na Matiu 6:10. Ihe a bụ otu narị afọ Jizọs chịwara n’eluigwe.

Isiokwu afọ 2014 bụ: “Ka alaeze gị bịa.”—Matiu 6:10

15, 16. (a) Olee ihe ọma ndị ga-eme n’otu puku afọ Kraịst ga-achị? (b) Olee ihe Jizọs ga-eme ma ọ chịchaa otu puku afọ? Oleekwa otú o si gbasa nzube Chineke?

15 Jizọs bibichaa ndị iro Chineke, ọ ga-atụba Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ime abis. Ha ga-anọ ebe ahụ otu puku afọ. (Mkpu. 20:1-3) Ebe ọ bụ na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya agaghịzi na-akpa ike, Alaeze Chineke ga-eme ka ụmụ mmadụ rite uru n’àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ. Ọ ga-ewepụkwa nsogbu niile mmehie Adam kpatara. Eze ahụ ga-akpọlite ọtụtụ nde ndị nwụrụ anwụ, meekwa ka a kụziere ha banyere Jehova n’ụwa niile. (Mkpu. 20:12, 13) Ụwa niile ga-aghọ paradaịs ma dịrị ka ogige Iden. Ndị niile na-erubere Jehova isi ga-ezukwa okè.

16 Kraịst chịchaa otu puku afọ, ọ ga-edo anya na ihe Jehova bu n’obi kee ụwa emezuola. Jizọs ga-enyefezi Nna ya Alaeze ahụ. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:24-28.) Ọ gaghịzi adị mkpa ka e nwee onye ga na-anọchite anya anyị n’ihu Jehova. Jehova na ụmụ ya niile ga-adị n’otu, ma ndị nke nọ n’eluigwe ma ndị nke nọ n’ụwa. Ha niile ga-adị ka otu ezinụlọ.

17. Gịnị ka i kpebisiri ike ịna-eme banyere Alaeze Chineke?

17 Ihe ọma ndị merela kemgbe otu narị afọ Jizọs chịwara gosiri na Jehova ka bụ Ọkaakaa nakwa na ihe o bu n’obi kee ụwa ga-emezu. Ka anyị kpebisie ike iji obi anyị niile na-ejere ya ozi ma na-akpọsa Eze ahụ na Alaeze ya. Obi siri anyị ike na ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, ọ gaghị adị anya Jehova aza ekpere ahụ anyị na-ekpe ‘ka alaeze ya bịa.’

^ para. 10 Gụọ isiokwu bụ́ “Ụlọ Akwụkwọ Ndị E Nwere ná Nzukọ Chineke Na-egosi na Jehova Hụrụ Anyị n’Anya.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Septemba 15, 2012, peeji nke 13-17.

^ para. 11 Gụọ Ụlọ Nche December 1, 1998, peeji nke 19-22, ka ị hụ mmeri ụfọdụ anyị nwere n’ụlọikpe ná mba dị iche iche.