Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JENỤWARỊ 2014

Mee Mkpebi Ziri Ezi Ugbu A Ị Na-eto Eto

Mee Mkpebi Ziri Ezi Ugbu A Ị Na-eto Eto

‘Unu ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ, toonụ aha Jehova.’—ỌMA 148:12, 13.

1. Olee ihe na-eme obi ụtọ ọtụtụ Ndị Kraịst na-eto eto na-eme?

ANYỊ bi n’oge dị oké mkpa. Ọtụtụ nde ndị si ná mba niile na-abịa efe Jehova. O nwebeghị mgbe e nwere ọtụtụ ndị na-efe Jehova otú a. (Mkpu. 7:9, 10) Obi dị ọtụtụ ndị na-eto eto ụtọ iso na-enyere ndị ọzọ aka ịmụta eziokwu ga-eme ka ha dị ndụ ebighị ebi. (Mkpu. 22:17) Ụfọdụ n’ime ha na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl, na-enyere ha aka ka àgwà ha ka mma. E nwekwara ndị nke na-aga ekwusa ozi ọma n’ebe a na-anaghị asụ asụsụ ha. (Ọma 110:3; Aịza. 52:7) Olee ihe ị ga-eme ka i nwee ike na-ejekwuru Jehova ozi?

2. Olee otú ihe Baịbụl kọrọ gbasara Timoti si gosi na Jehova chọrọ ka ndị na-eto eto nwee ọrụ n’ọgbakọ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

2 Ugbu a ị ka na-eto eto, i nwere ike ime mkpebi ndị ga-emecha mee ka i nwee ohere ijekwuru Jehova ozi. Dị ka ihe atụ, Timoti mere mkpebi ndị dị mma. Ọ bụ ya mere na mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri abụọ, o ruru eru ịga na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ. (Ọrụ 16:1-3) O nwere ike ịbụ mgbe ọnwa ole na ole gachara ka Pọl gwara Timoti ka ọ gaa nyere ọgbakọ e hiwere ọhụrụ na Tesalonaịka aka. Mkpagbu mere ka Pọl si n’ebe ahụ pụọ. Ma, obi siri ya ike na Timoti ga-agba ụmụnna nọ n’ebe ahụ ume. (Ọrụ 17:5-15; 1 Tesa. 3:1, 2, 6) Chegodị ụdị obi ụtọ Timoti nwere n’ihi ọrụ ahụ e nyere ya.

 MKPEBI KACHA MKPA Ị GA-EME

3. Olee mkpebi kacha mkpa i nwere ike ime? Olee mgbe i kwesịrị ime ya?

3 Ọ bụ ugbu a ị na-eto eto ka ị ga-eme mkpebi ndị dị mkpa. Olee mkpebi kacha mkpa ị ga-eme? Ọ bụ ijere Jehova ozi. Olee mgbe ọ kacha mma ka i kpebie ijere Jehova ozi? Jehova kwuru, sị: “Cheta Onye Okike Ukwu gị n’oge ị bụ okorobịa.” (Ekli. 12:1) Naanị otú ị ga-esi cheta Jehova bụ iji obi gị niile na-ejere ya ozi. (Diut. 10:12) Ọ bụ mkpebi kacha mkpa ị ga-eme. Ọ ga-agbasa ihe niile ọzọ ị ga-eme.—Ọma 71:5.

4. Olee mkpebi ndị ọzọ dị mkpa ga-agbasa otú ị ga-esi na-ejere Chineke ozi?

4 Ọ bụghị naanị ijere Jehova ozi bụ mkpebi dị mkpa ị ga-eme. I kwesịkwara ikpebi ma ị̀ ga-alụ di ma ọ bụ nwunye, onye ị ga-alụ, na ụdị ọrụ ị ga-arụ. Mkpebi ndị a dịcha mkpa n’ihi na ha nwere ike ịbara gị uru. Ma, ọ ka mma ka i buru ụzọ kpebie iji obi gị niile jeere Jehova ozi. (Diut. 30:19, 20) Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na e nwere ihe jikọrọ ha niile. Ihe i kpebiri ime n’okwu gbasara ịlụ di ma ọ bụ nwunye na ụdị ọrụ ị ga-arụ ga-agbasa otú ị ga-esi na-ejere Chineke ozi. Otú i sikwa kpebie ịna-ejere Chineke ozi ga-agbasa mkpebi i mere banyere ịlụ di ma ọ bụ nwunye na ụdị ọrụ ị ga-arụ. (Tụlee Luk 14:16-20.) N’ihi ya, buru ụzọ kpebie ihe kacha mkpa.—Fil. 1:10.

GỊNỊ KA Ị GA-EME UGBU A Ị NA-ETO ETO?

5, 6. Kọọ ihe gosiri na ọ bụrụ na mmadụ emee mkpebi dị mma, o nwere ike ime ka onye ahụ jekwuoro Jehova ozi. (Gụọ isiokwu bụ́ “Mkpebi M Mere Mgbe M Bụ Nwatakịrị,” nke dị n’Ụlọ Nche a.)

5 Kpebie ijere Jehova ozi. Mata ihe ọ chọrọ ka i mee, kpebiekwa otú ị ga-esi ejere ya ozi. Otu nwanna nwoke bụ́ onye Japan dere, sị: “Mgbe mụ na otu okenye nọ n’ozi n’oge m dị afọ iri na anọ, ọ chọpụtara na ozi ọma anaghị atọ m ụtọ. O weturu obi sị m: ‘Yuichiro, lawa. Ị laruo, nọrọ ọdụ chebara ihe Jehova meere gị echiche.’ M mere ihe o kwuru. M chebaara ihe Jehova meere m echiche ruo ụbọchị ụfọdụ, na-ekpekwa ekpere. M ji nwayọọ nwayọọ gbanwee. Ọ dịghị anya mụ achọpụta na ife Jehova atọwala m ụtọ. M bidoro na-agụ gbasara ndị ozi ala ọzọ, na-echekwa otú m ga-esi jekwuoro Jehova ozi.”

6 Yuichiro kwukwara, sị: “M kpebiri na m ga-emewe ihe ndị ga-enyere m aka ijere Jehova ozi ná mba ọzọ. Dị ka ihe atụ, m bidoro ịmụ asụsụ Bekee. Mgbe m gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị, m kpebiri iji ụbọchị ole na ole na-akụzi asụsụ Bekee ka m nwee ohere ịna-asụ ụzọ. Mgbe m dị afọ iri abụọ, m bidoro ịmụ asụsụ Mọngolịan. M gakwara hụ ndị nkwusa ole na ole na-eji Mọngolịan amụ ihe. Mgbe afọ abụọ gachara, ya bụ n’afọ 2007, m gara Mọngolịa. Mgbe m sooro ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ gaa ozi ọma ma chọpụta na ọtụtụ ndị chọrọ ka a kụziere ha eziokwu Baịbụl, ọ gụwara m agụụ ịkwaga ebe ahụ na-ekwusa ozi ọma. M laghachiri Japan ka m gaa jikere ejikere. M nọ na Mọngolịa na-asụ ụzọ kemgbe ọnwa Eprel afọ 2008. Ihe siri ike n’ebe a. Ma, ndị mmadụ na-ege ntị n’ozi ọma. M na-enyere ha aka ka ha na Jehova dị ná mma. Ihe a m na-eme bụ ihe kacha mma mmadụ ga-eji ndụ ya na-eme.”

7. Olee ihe ụfọdụ mmadụ ga-eji aka ya kpebie? Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Mozis mere?

7 Ọ bụ gị ga-ekpebi otú ị ga-esi jiri ndụ gị jeere Jehova ozi. (Jọsh. 24:15) Ọ bụghị anyị ga-agwa gị ma ị̀ ga-alụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụkwanụ onye ị ga-alụ na ụdị ọrụ ị ga-arụ. Ọrụ ị ga-arụ ọ̀ bụ ọrụ ị ga-amụta ngwa ngwa? Ụfọdụ n’ime unu bi n’ime obodo. E nwekwara ndị nke bi n’obodo mepere emepe. Onye ọ bụla  n’ime unu nwere àgwà nke ya, ihe ndị ọ ma eme, ihe ndị na-amasị ya, na ihe ndị o kpebiri ime n’ozi Jehova. O nwere ike ịbụ na onye ọ bụla n’ime unu dị iche n’ibe ya otú ahụ Mozis si dị iche ná ndị Hibru ndị ọzọ na-eto eto nọ n’Ijipt. Ebe ọ bụ na e weere Mozis ka nwa ada eze, ọ bara ọgaranya. Ma, ndị Hibru ndị ọzọ bụ ndị ohu. (Ọpụ. 1:13, 14; Ọrụ 7:21, 22) Ha biri n’oge dị oké mkpa otú gịnwa bi. (Ọpụ. 19:4-6) Ma, onye ọ bụla n’ime ha ji aka ya kpebie ihe ọ ga-eji ndụ ya mee. Mozis mere mkpebi dị mma na ya ga-eme uche Jehova.—Gụọ Ndị Hibru 11:24-27.

8. Gịnị ga-enyere ndị na-eto eto aka ime mkpebi dị mma?

8 Jehova na-agwa gị ihe ndị ga-enyere gị aka ime mkpebi dị mma ugbu a ị na-eto eto. Olee otú o si na-eme ya? Ọ na-akụziri gị ihe Baịbụl kwuru i nwere ike iji kpebie ihe ị ga-eme. (Ọma 32:8) Ọ bụrụ na ị maghị otú ị ga-esi eme ihe ndị ahụ, i nwere ike ịgakwuru papa gị na mama gị ma ọ bụkwanụ ndị okenye ka ha nyere gị aka. (Ilu 1:8, 9) Ka anyị leba anya n’ihe atọ Baịbụl kwuru nwere ike inyere gị aka ime mkpebi ga-abara gị uru.

IHE ATỌ BAỊBỤL KWURU GA-ENYERE GỊ AKA

9. (a) Olee otú Jehova si kwanyere anyị ùgwù ma hapụ anyị ka anyị jiri aka anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme? (b) Olee uru ‘ibu ụzọ na-achọ alaeze Chineke’ ga-abara gị?

9 Buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke na ezi omume ya. (Gụọ Matiu 6:19-21, 24-26, 31-34.) Otu ụzọ Jehova si kwanyere gị ùgwù bụ na ọ hapụrụ gị ka i jiri aka gị na-ekpebi ihe ị ga-eme. Ọ gwaghị gị na ị ga-ejirịrị oge gị niile na-aga ozi ọma. Ma, Jizọs kụziiri anyị na anyị kwesịrị ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. Ọ bụrụ na i buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke, ọ ga-eme ka i nwee ike ijekwuru Jehova ozi. Dị ka ihe atụ, ị ga-enwe ike igosi na ị hụrụ Jehova na ndị agbata obi gị n’anya nakwa na obi dị gị ụtọ maka ndụ ebighị ebi Jehova kwere anyị ná nkwa. Ka ị na-eche ihe ndị gbasara ịlụ di ma ọ bụ nwunye na ụdị ọrụ ị ga-arụ, mkpebi gị ọ̀ ga-egosi na ịchụ akụnụba dị gị mkpa karịa ‘ịchọ alaeze Chineke na ezi omume ya’?

10. Gịnị mere ka Jizọs nwee obi ụtọ? Gịnị ka ị ga-eme ka obi dị gị ụtọ?

10 Na-ejere ndị ọzọ ozi ka i nwee ike na-enwe obi ụtọ. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 20:20, 21, 24, 35.) Ihe a Jizọs kụziiri anyị dị ezigbo mkpa. Jizọs nwere ezigbo obi ụtọ n’ihi na ọ na-eme uche Nna ya kama ime uche nke ya. Obi na-adị ya ụtọ ma ndị dị umeala n’obi nabata ozi ọma o ziri ha. (Luk 10:21; Jọn 4:34) O nwere ike ịbụ na i nwetụla ụdị obi ụtọ ahụ mgbe i nyeere ndị ọzọ aka. Ọ bụrụ na i jiri ihe Jizọs kụziri na-ekpebi ihe ị na-eme, obi ga-adị gị ụtọ, dịkwa Jehova ụtọ.—Ilu 27:11.

11. Gịnị mere ka Barọk gharazie inwe obi ụtọ? Gịnị ka Jehova gwara ya?

11 Ihe kacha eme anyị obi ụtọ bụ ijere Jehova ozi. (Ilu 16:20) Ọ dị ka Barọk bụ́ odeakwụkwọ Jeremaya ò chefuru ihe a. O nwere mgbe ijere Jehova ozi na-anaghịzi atọ ya ụtọ. Jehova gwara ya, sị: “Ị na-achọrọ onwe gị ihe ukwu. Kwụsị ịchọ ya. N’ihi na, lee, m ga-eme ka ọdachi dakwasị anụ ahụ́ niile, . . . ma m ga-enye gị mkpụrụ obi gị ka ọ bụụrụ gị ihe nkwata n’ebe niile ị ga-aga.” (Jere. 45:3, 5) Gịnị ka i chere gaara eme ka Barọk nwee obi ụtọ? Ọ̀ bụ ime ihe ọ chọrọ ma mechaa nwụọ, ka ọ̀ bụ ime ihe Jehova chọrọ ma ghara ịnwụ mgbe a ga-ebibi Jeruselem?—Jems 1:12.

12. Olee mkpebi mere ka Ramiro na-enwe obi ụtọ?

12 Ramiro bụ otu n’ime ụmụnna ndị obi na-atọ ụtọ n’ihi ijere ndị ọzọ ozi. O kwuru,  sị: “Anyị bi n’otu ime obodo dị n’Ugwu Andiz. Nwanne m nwoke nke tọrọ m kwuru na ya ga-edunye m mahadum. Ebe ọ bụ na ezinụlọ anyị dara ogbenye, ihe a ọ chọrọ imere m abụghị obere ihe. Ma, o tebeghị e mere m baptizim, mụ aghọọ Onyeàmà Jehova. N’oge ahụkwa, otu ọsụ ụzọ gwara m ka m soro ya gaa kwusaa ozi ọma n’otu obere obodo. Eso m ya gaa, nọrọ ebe ahụ mụọ otú e si akpụ isi, mepeekwa ebe a na-akpụ isi ka m nwee ike na-enweta ego m ga-eji na-egbo mkpa m.” Ọtụtụ ndị bi ebe ahụ kwetara ka ha na ya mụwa Baịbụl. E mechara hiwe ọgbakọ na-eji asụsụ ndị ebe ahụ amụ ihe. Ramiro gafeziri n’ọgbakọ ahụ. Ọ bụ ọsụ ụzọ oge niile n’ọgbakọ ahụ kemgbe afọ iri. Ọ sịrị na o nweghị ọrụ ọzọ ga-eme ka o nwee ụdị obi ụtọ ọ na-enwe ugbu a ọ na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl n’asụsụ nke ha.

Ramiro ji obi ụtọ na-ejere Jehova ozi kemgbe ọ bụ onye na-eto eto (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

13. Gịnị mere o ji dị mma ka i jiri obi gị niile na-ejere Jehova ozi ugbu a ị na-eto eto?

13 Ka ijere Jehova ozi n’oge ị na-eto eto na-eme gị obi ụtọ. (Gụọ Ekliziastis 12:1.) Echela na i kwesịrị ibu ụzọ nweta ezigbo ọrụ tupu gị amalite ịsụ ụzọ. Ọ bụ ugbu a ị na-eto eto ka i kwesịrị ịmalite iji obi gị niile na-ejere Jehova ozi tupu gị enwee ezinụlọ ị ga na-elekọta. Ahụ́ gbasiri gị ike. Ị ga-arụlikwa ọrụ ndị tara akpụ. Gịnị ka ị ga-achọ imere Jehova ugbu a ị na-eto eto? O nwere ike i bu n’obi na ị ga-asụ ụzọ, ma ọ bụkwanụ gaa na-ekwusa ozi ọma n’ebe a na-asụ asụsụ ọzọ. Ma ọ bụkwanụ i nwere ike ikpebi ịnọ n’ọgbakọ gị na-ejekwuru Jehova ozi. N’agbanyeghị otú i kpebiri isi jekwuoro Jehova ozi, i kwesịrị inwe ihe ị ga na-arụ ka i nwee ike na-egbo mkpa gị. Jụọ onwe gị, sị: “Olee ụdị ọrụ m ga-arụ? Oleekwa oge ọ ga-ewe m tupu mụ amụta ya?”

 JIRI IHE BAỊBỤL KWURU MEE MKPEBI NDỊ DỊ MMA

14. Gịnị mere i kwesịrị iji lezie anya mgbe ị na-achọ ọrụ?

14 Ihe atọ ahụ Baịbụl kwuru anyị tụlere ga-enyere gị aka ikpebi ụdị ọrụ ị ga-arụ. Ndị nkụzi gị nwere ike ịma ihe ị ga-agụ n’ụlọ akwụkwọ gị enweta ọrụ. Ndị na-enyere mmadụ aka ịchọta ọrụ nwere ike ịgwa gị ụdị ọrụ a na-achọ ndị ga-arụ ya n’ebe i bi ma ọ bụ n’ebe i bu n’obi ịga biri. Ihe ha gwara gị nwere ike ịbara gị uru, ma i kwesịrị ilezi anya. Ndị na-ahụghị Jehova n’anya nwere ike ime ka ị hụwa ụwa n’anya. (1 Jọn 2:15-17) Echefula na i lewe ihe ndị dị n’ụwa, ọ gaghị ara ahụ́ obi gị eduhie gị.—Gụọ Ilu 14:15; Jere. 17:9.

15, 16. Olee onye nwere ike inye gị ndụmọdụ ga-abara gị uru gbasara ụdị ọrụ ị ga-arụ?

15 Ị matachaa ọrụ i nwere ike ịrụ, e kwesịrị inye gị ndụmọdụ ga-abara gị uru. (Ilu 1:5) Ònye nwere ike iji Baịbụl nyere gị aka ikpebi ụdị ọrụ ị ga-arụ? Ndị i kwesịrị ige ntị bụ ndị hụrụ Jehova n’anya, ndị hụrụ gị n’anya, na ndị ma gị nke ọma. Ha ga-enyere gị aka ichebara onwe gị echiche ma mata ihe ị ga-emeli na ihe ị chọrọ ime. Ihe ha gwara gị ga-enyere gị aka ịmata ma ihe i kpebiri ime ọ̀ dịkwa mma. Ndị mụrụ gị nwere ike inyere gị ezigbo aka ma ọ bụrụ na ha hụrụ Jehova n’anya. Ndị okenye ọgbakọ gị nwekwara ike inye gị ndụmọdụ ga-abara gị uru. Jụọkwa ndị ọsụ ụzọ na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ihe mere ha ji banye n’ozi oge niile. Olee otú ha si malite ịsụ ụzọ? Olee otú ha si enweta ihe ha ji egbo mkpa ha? Olee otú Jehova sirila gọzie ha n’ozi ha?—Ilu 15:22.

16 Ndị ma gị nke ọma nwere ike inye gị ndụmọdụ ga-abara gị uru. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ị chọrọ ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ sekọndrị malite ịsụ ụzọ n’ihi na ike ịga ụlọ akwụkwọ agwụla gị. Onye hụrụ gị n’anya nwere ike ịmata ihe mere i ji chọọ ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ. N’ihi ya, o nwere ike inyere gị aka ịghọta na ijisi ike gachaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị ga-eme ka ị mụta ịna-atachi obi. Ntachi obi ga-enyere gị aka ijere Jehova ozi ruo mgbe ebighị ebi.—Ọma 141:5; Ilu 6:6-10.

17. Olee ụdị ọrụ ị na-ekwesịghị ịrụ?

17 Ọnwụnwa ga-abịara onye ọ bụla na-efe Jehova. O nwere ike ime ka onye ahụ kwụsị ife Jehova. (1 Kọr. 15:33; Kọl. 2:8) Ma, e nwere ụdị ọrụ ọ ga-abụ ị na-arụ, ọnwụnwa ga-abịara gị akarịa nke gaara abịara gị ma a sị na ọ bụ ụdị ọrụ ọzọ. O nwere ike ịbụ na ị hụla ndị kwụsịrị ife Jehova n’ihi ụdị ọrụ ha na-arụ. (1 Tim. 1:19) I kwesịghị ịrụ ụdị ọrụ nwere ike ime ka gị na Chineke ghara ịdị ná mma.—Ilu 22:3.

KA OBI NA-ATỌ GỊ ỤTỌ NA Ị BỤ ONYE KRAỊST NA-ETO ETO

18, 19. Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ọ naghị agụ gị agụụ ijere Jehova ozi?

18 Ọ bụrụ na i ji obi gị niile chọọ ịna-ejere Jehova ozi, jiri ohere dị iche iche Jehova mere ka i nwee ugbu a jewere ya ozi. Mee mkpebi ndị ga-eme ka i nwee ike iji obi ụtọ na-ejere Jehova ozi n’oge a dị ezigbo mkpa.—Ọma 148:12, 13.

19 Gịnịkwanụ ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ naghị agụ gị agụụ ife Jehova? Gbalịa na-eme ka okwukwe gị sikwuo ike. Mgbe Pọl onyeozi kwuchara ihe ndị o mere ka Jehova gọzie ya, o dere, sị: “Ọ bụrụ na unu nwere echiche dị iche n’ụzọ ọ bụla, Chineke ga-ekpughere unu echiche ahụ ziri ezi. Ka o sina dị, ruo n’otú anyị nweruru ọganihu, ka anyị na-eje ije n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’otu ụkpụrụ a.” (Fil. 3:15, 16) Na-echeta mgbe niile na Jehova hụrụ gị n’anya nakwa na ndụmọdụ ya ga-akacha baara gị uru. Ọ bụ Jehova ga-akacha enyere gị aka ime mkpebi ndị dị mma ugbu a ị na-eto eto.