Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JENỤWARỊ 2014

Ijere Jehova Ozi Tupu Oge Ọdachi Erute

Ijere Jehova Ozi Tupu Oge Ọdachi Erute

“Cheta Onye Okike Ukwu gị.”—EKLI. 12:1.

1, 2. (a) Gịnị ka Sọlọmọn si n’ike mmụọ nsọ gwa ndị na-eto eto? (b) Gịnị mere ihe ahụ Sọlọmọn kwuru ji gbasa Ndị Kraịst gaferela iri afọ ise?

EZE SỌLỌMỌN si n’ike mmụọ nsọ gwa ndị na-eto eto, sị: “Cheta Onye Okike Ukwu gị n’oge ị bụ okorobịa, tupu oge ọdachi erute.” Gịnị bụ “oge ọdachi” o kwuru okwu ya? Ọ bụ oge mmadụ kara nká. Sọlọmọn ji ihe ahụ o kwuru kọwaa nsogbu ndị agadi na-enwe. Dị ka ihe atụ, aka na ụkwụ na-ama ha jijiji, ezé ha ana-adapụsị. Ha anaghịzi ahụ ụzọ nke ọma ma ọ bụ anụ ihe nke ọma. Isi na-acha ha awọ́. Ha na-ehuzi ehu. Mmadụ ekwesịghị ichere ka ụdị ihe ahụ mewe ya tupu ya amalite ife Jehova.—Gụọ Ekliziastis 12:1-5.

2 E nwere ọtụtụ Ndị Kraịst gaferela iri afọ ise, ma ha ka siri ezigbo ike. Isi ha nwere ike ịna-acha awọ́ awọ́, ma, o nwere ike ha agaghị enwe ụfọdụ nsogbu Sọlọmọn kwuru okwu ha. Ndị Kraịst ndị a hà nwere ike ime ihe Sọlọmọn gwara ndị na-eto eto, ya bụ, “Cheta Onye Okike Ukwu gị”? Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?

3. Gịnị ka icheta Onye Okike Ukwu anyị pụtara?

 3 O nwere ike ịbụ na ị na-efe Jehova kemgbe ọtụtụ afọ. Ma, i kwesịrị ịna-eme, ị nọtụ, gị echebara otú Chineke anyị si dị ukwuu echiche. Ndụ anyị dị bụ onyinye na-enweghị atụ Chineke nyere anyị. Mmadụ agaghị aghọtacha otú ihe Chineke kere eke si arụ ọrụ. Ihe dị iche iche magburu onwe ha Jehova kere mere ka ndụ na-atọ anyị ụtọ. Anyị chebara ihe Jehova kere echiche, ọ ga-eme ka anyị cheta na Jehova hụrụ anyị n’anya, na o nwere amamihe, nakwa na ọ dị ike. (Ọma 143:5) Ma, icheta Onye Okike Ukwu anyị pụtakwara na anyị ga-echeta ihe ọ chọrọ ka anyị na-eme. Ọ bụrụ na anyị echebara ihe ndị a echiche, ọ ga-eme ka anyị kpebie iji ike anyị niile na-ejere ya ozi n’oge niile anyị dị ndụ. Anyị mee otú ahụ, ọ ga-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe ndị ọ na-emere anyị.—Ekli. 12:13.

OHERE PỤRỤ ICHE NDỊ AGADI NWERE

4. Olee ajụjụ Ndị Kraịst gbarala ọtụtụ afọ kwesịrị ịjụ onwe ha, n’ihi gịnịkwa?

4 Ọ bụrụ na ị gbaala ọtụtụ afọ, ajụjụ dị mkpa i kwesịrị ịjụ onwe gị bụ, ‘Gịnị ka m ga-eji ndụ m mee ugbu a m ka gbasitụrụ ike?’ Ebe ị bụ Onye Kraịst kemgbe ọtụtụ afọ, e nwere ihe ndị i nwere ike ime ndị ọzọ na-agaghị emeli. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịkụziri ndị ị tọrọ ihe Jehova kụziiri gị. I nwekwara ike ịkọrọ ndị ọzọ ihe ndị magburu onwe ha merela n’ozi gị. Eze Devid kpere ekpere ka ya nwee ike ime otú ahụ. O dere, sị: “Chineke, ị nọwo na-ezi m ihe malite n’oge m bụ nwata . . . Chineke, biko, ahapụla m ruo ọbụna mgbe m mere agadi na mgbe isi chara m awọ́, ruo mgbe m kọọrọ ọgbọ ọzọ banyere ogwe aka gị, kọọkwara ndị niile a ka ga-amụ banyere ịdị ike gị.”—Ọma 71:17, 18.

5. Olee otú Ndị Kraịst katarala ahụ́ ga-esi akụziri ndị ọzọ ihe ha mụtara?

5 Gịnị ka ị ga-eme ka ihe ndị ị mụtara kemgbe ọtụtụ afọ baara ndị ọzọ uru? I nwere ike ịgwa ndị na-eto eto ka ha bịa na nke gị ka gị na ha nọrịa. I nwekwara ike ịgwa ha ka gị na ha rụọ n’ozi ọma ka ha hụ otú ijere Jehova ozi si atọ gị ụtọ. Elaịhu kwuru, sị: “Ka ọtụtụ ụbọchị kwuo okwu, ọ bụkwa ọtụtụ afọ ndụ kwesịrị ime ka a mara ihe bụ́ amamihe.” (Job 32:7) Pọl onyeozi gwara ụmụnna nwaanyị bụ́ ndị agadi ka ha jiri ma okwu ọnụ ha ma omume ha na-akụziri ndị ọzọ ihe. O kwuru, sị: “Ka ndị agadi nwaanyị bụrụ ndị . . . na-akụzi ihe dị mma.”—Taị. 2:3.

OTÚ I NWERE IKE ISI NYERE NDỊ ỌZỌ AKA

6. Olee uru Ndị Kraịst mere okenye baara anyị?

6 Ọ bụrụ na ị nọteela aka n’ọgbakọ, e nwere ọtụtụ ụzọ i nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka. Chetụgodị echiche banyere ihe ị ma ugbu a ị na-amaghị afọ iri atọ ma ọ bụ iri anọ gara aga. Ị mụtala otú ị ga-esi na-eme ihe Baịbụl kwuru. Ị mụtakwala otú ị ga-esi kụziere mmadụ eziokwu dị na Baịbụl, ya eruo ya n’obi. Ọ bụrụ na ị bụ okenye n’ọgbakọ, ị ma otú ị ga-esi enyere ụmụnna ndị mere ihe na-adịghị mma aka. (Gal. 6:1) O nwere ike ịbụ na ị mụtala otú ị ga-esi na-elekọta ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ, ngalaba ndị e nwere ná mgbakọ, ma ọ bụ ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. O nwekwara ike ịbụ na ị ma ihe ị ga-agwa ndị dọkịta, ha ekweta gwọọ mmadụ n’amịnyeghị ya ọbara. Ọ bụrụgodị na o tebeghị e mere gị baptizim, o nweela ihe ndị bara uru ị mụtara. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị zụọla ụmụ, ị mụtala nkà ndị bara ezigbo uru. Ndị Kraịst mere okenye ga-akụziliri ụmụnna ha ihe, duzie ha, ma gbaa ha ume.—Gụọ Job 12:12.

7. Olee ihe bara uru Ndị Kraịst mere agadi nwere ike ịkụziri ndị ọzọ?

7 Olee ụzọ ndị ọzọ i nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka? I nwere ike kụziere ndị ọzọ otú e si ebido ọmụmụ Baịbụl na  otú e si eduzi ya. Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwaanyị, i nwere ike ịkụziri ndị nne na-akatabeghị ahụ́ otú ha ga-esi na-ejere Jehova ozi ma na-elekọta ụmụ ha. Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke, i nwere ike ịkụziri ụmụnna nwoke na-eto eto otú ha ga-esi eji ịnụ ọkụ n’obi na-eme ihe omume na otú ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma nke ọma. I nwere ike igosi ha otú i si agba ụmụnna ndị mere agadi ume ma ị gaa ileta ha. Ọ bụrụgodị na ị gbasichaghị ike, ị ka nwere ike ịkụziri ndị ọzọ ihe. Baịbụl kwuru, sị: “Ịma mma nke ụmụ okorobịa bụ ike ha, ịma mma nke ndị agadi bụkwa isi awọ́ ha.”—Ilu 20:29.

IJE OZI N’EBE A CHỌKWURU NDỊ NA-EKWUSA OZI ỌMA

8. Gịnị ka Pọl onyeozi mere mgbe ọ katawara ahụ́?

8 Pọl onyeozi jesiri ozi Chineke ike ruo mgbe ọ katawara ahụ́. Ihe dị ka n’afọ 61 mgbe o si na mkpọrọ a tụrụ ya na Rom pụta, o jeela ozi ala ọzọ ọtụtụ afọ, meriekwa ọtụtụ ọnwụnwa. A sị na ọ chọrọ, ọ gaara ebi na Rom kwusawa ozi ọma otú ike kwere ya. (2 Kọr. 11:23-27) O doro anya na obi gaara atọ ụmụnna nọ na Rom ụtọ ka ha na Pọl nọwazie ka ọ na-enyere ha aka. Ma, Pọl matara na a ka nwere ọtụtụ ndị kwesịrị ịnụ ozi ọma ná mba ndị ọzọ. Ọ bụ ya mere o ji gawakwa ozi ala ọzọ ọ na-agabu. Ya na Timoti na Taịtọs so gaa Efesọs, si ya gaa Krit. O nwekwara ike ịbụ na ha gara Masedonia. (1 Tim. 1:3; Taị. 1:5) Anyị amaghị ma ò mechara gaa Spen. Ma, o bu n’obi ịga ebe ahụ.—Rom 15:24, 28.

9. Olee mgbe ọ ga-abụ na Pita gara jewe ozi n’ebe a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

9 O nwere ike ịbụ na Pita onyeozi akarịala iri afọ ise mgbe ọ gara jewe ozi n’ebe a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma. Olee otú anyị si mara? Ọ bụrụ na ya na Jizọs bụ ọgbọ ma ọ bụkwanụ na o ji obere ihe tọọ Jizọs, ọ pụtara na ọ dị ihe dị ka iri afọ ise mgbe ya na ndịozi ndị ọzọ nwere nzukọ na Jeruselem n’afọ 49. (Ọrụ 15:7) Mgbe ha nwechara nzukọ ahụ, o mechara gaa biri na Babịlọn. E nwere ike ihe mere o ji gaa bụ ka o kwusaara ọtụtụ ndị Juu bi n’ebe ahụ ozi ọma. (Gal. 2:9) Ọ bụ ebe ahụ ka o bi mgbe o dere Pita nke Mbụ n’ihe dị ka afọ 62. (1 Pita 5:13) Ọ dịghị mfe mmadụ ịga biri n’obodo ọzọ. Ma, Pita ekweghị ka afọ ole ọ dị mgbe ahụ mee ka ọ ghara ijekwuru Jehova ozi.

10, 11. Gịnị ka Robert na nwunye ya mere mgbe ha katawara ahụ́?

10 Taa, ọtụtụ Ndị Kraịst karịrịla afọ iri ise achọpụtala na ihe ụfọdụ agbanweela ná ndụ ha nakwa na ha nweziri ike ijekwuru Jehova ozi. Ụfọdụ akwagala n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. Ọ bụ ihe a ka otu nwanna nwoke aha ya bụ Robert na nwunye ya mere. Ha dị ihe dị ka iri afọ ise na ise mgbe ha chọpụtara na e nwere ụzọ ndị ọzọ ha nwere ike isi jekwuoro Jehova ozi. Otu nwa nwoke ha mụtara ebirila nke ya. Ha enweghịzi nne na nna kara nká ha na-elekọta. E nwekwara obere ego ndị mụrụ ha hapụụrụ ha nwụọ. Ha ghọtara na ọ bụrụ na ha eree ụlọ ha, ha nwere ike iji ego ha retara ya kwụchaa ụgwọ niile ha ji, nweekwa ego ha ga-eji na-eri nri ruo mgbe a ga-akwụ Robert ụgwọ ezumike nká. Ha nụrụ na ọtụtụ ndị nọ na Bolivia na-ekwe ka a mụwara ha Baịbụl nakwa na ihe adịghị oké ọnụ n’ebe ahụ. N’ihi ya, ha kpebiri na ha ga-akwaga ebe ahụ. Robert kwuru, sị: “O were oge tupu ebe ahụ amara anyị ahụ́. Otú ihe dị n’Amerịka anyị bibu dị iche n’otú ọ dị na Bolivia ebe a. Ma, Jehova gọziri ozi anyị.”

11 Robert kwukwara, sị: “Ihe anyị jizi oge anyị na-eme bụ ịrụ ọrụ gbasara ọgbakọ. Ụfọdụ ndị anyị mụụrụ Baịbụl emeela baptizim. O nwere otu ezinụlọ anyị mụụrụ ihe n’otu obodo dịtụ anya n’ebe anyị  bi. O nweghị ka ọ hà ha. Ma kwa izu, ha na-abịa ọmụmụ ihe n’ebe anyị bi n’agbanyeghị na ọ dịrịghị ha mfe. Chegodị ụdị obi ụtọ anyị nwere mgbe anyị hụrụ na ezinụlọ ahụ na-eme nke ọma n’ọgbakọ, hụkwa ka ọkpara ha malitere ịsụ ụzọ.”

MKPA E NWERE N’EBE NDỊ E JI ASỤSỤ MBA ỌZỌ EKWUSA OZI ỌMA

12, 13. Mgbe Nwanna Brian lara ezumike nká, gịnị ka ya na nwunye ya mere?

12 Ọgbakọ ndị na-amụ ihe n’asụsụ mba ọzọ nwere ike irite uru n’aka ụmụnna ndị katarala ahụ́. Ije ozi n’ụdị ebe ahụ na-atọ ezigbo ụtọ. Dị ka ihe atụ, otu nwanna aha ya bụ Brian dere, sị: “Ndụ gbụrụ mụ na nwunye m mgbe m ruru iri afọ isii na ise e ji ala ezumike nká na Briten. Ụmụ anyị agaala biri nke ha. Ọ na-esikwara anyị ike inweta ndị nwere mmasị anyị ga na-amụrụ Baịbụl. Ahụrụ m otu nwa okorobịa bụ́ onye Chaịna na-arụ ọrụ na mahadum n’obodo anyị. M gwara ya ka ọ bịa ọmụmụ ihe, ya abịa. M malitekwara ịmụrụ ya Baịbụl. Mgbe izu ole na ole gachara, o bidoro ịkpọ onye Chaịna ibe ya ya na ya na-arụ ọrụ abịa ka a mụọrọ ha ihe. Mgbe izu abụọ gara, ọ kpọtara onye mere ha atọ, mechaakwa kpọta onye mere ha anọ.

13 “Mgbe onye nke ise kwetara ka anyị mụwara ya Baịbụl, m gwara onwe m, sị, ‘Iri afọ isii na ise m dị apụtaghị na m kwesịrị ịla ezumike nká n’ozi Jehova.’ N’ihi ya, m jụrụ nwunye m ma ọ̀ ga-achọ ịmụ asụsụ Chaịniiz. (Eji m afọ abụọ tọọ ya.) Anyị ji kaseet a na-eji amụ asụsụ Chaịniiz mụọ ya afọ iri gara aga. Ikwusa ozi ọma n’ebe a na-asụ asụsụ ọzọ mere ka ọ dị anyị ka ànyị ka bụ okoro na agbọghọ. Kemgbe ahụ, ndị Chaịna anyị mụụrụ ihe eruola otu narị na iri na abụọ. Ọtụtụ n’ime ha abịatụla ọmụmụ ihe. Otu n’ime ha bụ ọsụ ụzọ ugbu a n’ọgbakọ anyị.”

O nwere ike ịbụ na i tofebeghị ijekwuru Jehova ozi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 na nke 13)

JIRI OBI ỤTỌ NA-EJERE JEHOVA OZI OTÚ I NWERE IKE

14. Gịnị ka Ndị Kraịst katarala ahụ́ na-ekwesịghị ichefu? Olee otú ihe Pọl mere nwere ike isi gbaa ha ume?

14 Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ Ndị Kraịst gaferela afọ iri ise nwere ike ijekwuru  Jehova ozi, ọ bụghị ha niile ga-emeli ya. Ụfọdụ n’ime ha na-arịa ọrịa. E nwekwara ndị nke ka na-azụ ụmụ ma ọ bụkwanụ na-elekọta papa ha na mama ha merela agadi. Ma, echefula na Jehova agaghị echefu ozi ọ bụla i ji obi gị niile na-ejere ya. N’ihi ya, ọ bụrụgodị na obi na-ajọ gị njọ n’ihi ihe ndị ị na-anaghị emeli, obi kwesịrị ịna-atọ gị ụtọ maka ndị nke ị na-emeli. Were Pọl onyeozi dị ka ihe atụ. O nwere mgbe a tụrụ ya mkpọrọ ruo afọ abụọ, ya emezie ka ọ ghara ịna-aga ozi ala ọzọ ọ na-aga. Ma, mgbe ọ bụla ndị mmadụ bịara ileta ya, ọ na-agwa ha gbasara Akwụkwọ Nsọ, meekwa ka okwukwe ha sie ike.—Ọrụ 28:16, 30, 31.

15. Gịnị mere e ji jiri Ndị Kraịst merela agadi kpọrọ ihe?

15 Obi na-adị Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na Ndị Kraịst merela agadi ejiri obi ha niile na-ejere ya ozi. Ihe Sọlọmọn kwuru gosiri na oge agadi anaghị adị mfe. Ma, Baịbụl gwara anyị na Jehova ji ozi Ndị Kraịst merela agadi na-ejere ya kpọrọ ihe. (Luk 21:2-4) Ọgbakọ anaghị eji ụmụnna ndị a egwu egwu n’ihi okwukwe ha na ntachi obi ha n’ozi Jehova kemgbe ọtụtụ afọ.

16. Olee ihe ọ ga-abụ na Ana anọghị ndụ mee? Ma, olee otú o si fee Chineke?

16 Baịbụl kwuru na otu nwaanyị aha ya bụ Ana ji obi ya niile na-eto Jehova ruo mgbe o mere agadi. Ọ dị afọ iri asatọ na anọ mgbe a mụrụ Jizọs. Di ya anwụọkwala mgbe ahụ. Ebe ọ bụ na ọ kaala nká, ọ ga-abụ na ọ nọghị ndụ ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs, e jiri mmụọ nsọ tee ya mmanụ, ya esorokwa kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke. Ma, Ana fere Jehova otú ike kwere ya. Baịbụl kwuru na ‘ọ dịghị akọ ụkọ n’ụlọ nsọ’ nakwa na “ọ na-eje ozi dị nsọ abalị na ehihie.” (Luk 2:36, 37) Ka onye nchụàjà na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ kwa ụtụtụ na mgbede, Ana na-eso ìgwè mmadụ bịaranụ nọrọ n’ogige ụlọ nsọ ahụ na-ekpe ekpere n’obi ya ruo ihe dị ka nkeji iri atọ. Mgbe Jizọs bụ nwa ọhụrụ, e ku ya bịa n’ụlọ nsọ. Otu ụbọchị Ana gara n’ụlọ nsọ, ọ hụrụ Jizọs ma malite ịgwa onye ọ bụla na Jizọs ga-abụ Mesaya nakwa na ọ ga-anapụta Jeruselem.—Luk 2:38.

17. Olee otú anyị nwere ike isi nyere Ndị Kraịst mere agadi na ndị nke na-arịa ọrịa aka ịna-efe Jehova?

17 Taa, anyị kwesịrị ịgbalị na-enyere ụmụnna anyị aka, ma ndị nke mere agadi ma ndị nke na-arịa ọrịa. E nwere ọtụtụ ụmụnna mere agadi chọrọ ịna-abịa ọmụmụ ihe ma ọ bụ mgbakọ, ma ha anaghị agali. Ọgbakọ ụfọdụ na-eme ndokwa ka ndị agadi si na telefon na-egere ihe a na-ekwu n’ọmụmụ ihe. O nwere ebe ụdị ihe ahụ na-agaghị ekwe omume. Ọ bụrụgodị na ndị agadi agaghị agali ọmụmụ ihe, ha ka nwere ike ịna-akwado ofufe Jehova. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịna-ekpe ekpere ka ọgbakọ na-eme nke ọma.—Gụọ Abụ Ọma 92:13, 14.

18, 19. (a) Olee otú Ndị Kraịst mere agadi nwere ike isi gbaa ndị ọzọ ume? (b) Olee ndị nwere ike ‘icheta Onye Okike Ukwu ha’?

18 O nwere ike Ndị Kraịst mere agadi agaghị ama na ha na-agba ndị ọzọ ume. Dị ka ihe atụ, ọ bụ eziokwu na Ana anaghị akọ ụkọ n’ụlọ nsọ ruo ọtụtụ afọ, o nwere ike ọ maghị na a ga-emecha dee ihe ahụ o mere na otú o si hụ Jehova n’anya na Baịbụl, ya agbaa anyị ume. O doro anya na ụmụnna gị agaghịkwa echefu otú i si hụ Jehova n’anya. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na “isi awọ́ bụ okpueze mara mma mgbe e nwere ya n’ụzọ ezi omume.”—Ilu 16:31.

19 E nwere ihe onye ọ bụla n’ime anyị na-agaghị emeli n’ozi Jehova. Ma, ugbu a ị ka gbasitụrụ ike, kpebisie ike ime ihe a Baịbụl kwuru, ya bụ, “Cheta Onye Okike Ukwu gị . . . tupu oge ọdachi erute.”—Ekli. 12:1.