Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JENỤWARỊ 2014

Fee Jehova, Bụ́ Eze Mgbe Ebighị Ebi

Fee Jehova, Bụ́ Eze Mgbe Ebighị Ebi

“Ka Eze mgbe ebighị ebi . . . bụrụ onye nsọpụrụ na otuto dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi.”—1 TIM. 1:17.

1, 2. (a) Ònye bụ “Eze mgbe ebighị ebi,” gịnịkwa mere ihe a a kpọrọ ya ji kwesị ekwesị? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị mere anyị ji kpebie ịna-efe Jehova?

EZE SOBHUZA nke Abụọ chịrị Swaziland ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ iri afọ isii na otu. Taa, o siri ike ịhụ onye chịrị ọtụtụ afọ otú ahụ. Ma, e nwere eze na-anaghị adị ndụ afọ ole na ole ka ụmụ mmadụ. Baịbụl kpọrọ ya “Eze mgbe ebighị ebi.” (1 Tim. 1:17) A kpọrọ aha Eze a n’Abụ Ọma. Ebe ahụ sịrị: “Jehova bụ Eze ruo mgbe ebighị ebi.”—Ọma 10:16.

2 N’ihi ogologo oge Chineke bụrụla Eze, ọchịchị ya adịghị ka ọchịchị mmadụ. Ma, ọ bụ otú Jehova si achị mere ka anyị kpebie ịna-efe ya. Otu eze chịrị Izrel iri afọ anọ toro Chineke. O kwuru, sị: “Jehova dị ebere, na-emekwa amara, ọ naghị ewe iwe ọsọ ọsọ, o nwere obiọma dị ukwuu. Jehova emewo ka ocheeze ya guzosie ike n’eluigwe; alaeze ya na-achịkwa ihe niile.” (Ọma 103:8, 19) Ọ bụghị naanị na Jehova bụ Eze anyị, ọ bụ Nna anyị nke eluigwe. Ọ hụkwara anyị n’anya. N’ihi ya, ajụjụ abụọ e kwesịrị ịjụ bụ: Olee otú Jehova si bụrụ Nna anyị? Olee otú Jehova si gosi na ya ka bụ Eze kemgbe ahụ e nupụchara isi n’Iden? Anyị mata azịza ajụjụ ndị a, ọ ga-enyere anyị aka ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma, anyị ejirikwa obi anyị niile na-efe ya.

 EZE MGBE EBIGHỊ EBI KERE NDỊ SO N’EZINỤLỌ YA

3. Olee onye mbụ so n’ezinụlọ Jehova? Olee ndị ọzọ Chineke kere ka ha bụrụ “ụmụ” ya?

3 O doro anya na obi tọrọ Jehova ezigbo ụtọ mgbe o kere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya. Chineke emeghị ya ka ọ̀ bụ onye na-abaghị uru. Kama, ọ hụrụ ya n’anya, gwakwa ya ka o soro ya rụọ ọrụ na-eme obi ụtọ, ya bụ, iso ya kee ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi zuru okè. (Kọl. 1:15-17) Baịbụl kwuru na ndị mmụọ ozi ji obi ụtọ na-ejere Jehova ozi nakwa na ha “na-eme ihe o kwuru.” Jehova kpọrọ ha “ụmụ” ya. O si otú ahụ gosi na ọ na-akwanyere ha ùgwù. Ha so n’ezinụlọ Jehova.—Ọma 103:20-22; Job 38:7.

4. Olee otú ụmụ mmadụ si soro n’ezinụlọ Chineke?

4 Mgbe Jehova kechara eluigwe na ụwa, o kere ndị ọzọ so n’ezinụlọ ya. Mgbe o kechara ụwa ka ọ bụrụ ebe mara mma ndị mmadụ ga-ebi, o kere nwoke mbụ bụ́ Adam n’oyiyi ya. (Jen. 1:26-28) Jehova chọrọ ka Adam na-erubere ya isi n’ihi na ọ bụ ya kere ya. Ebe ọ bụ na Jehova bụ Nna, o ji obiọma na ịhụnanya gwa Adam ihe niile ọ chọrọ ka o mee. Iwu ndị ahụ Jehova nyere Adam apụtaghị na o kere ya agbụ.—Gụọ Jenesis 2:15-17.

5. Olee otú Chineke kpebiri isi mee ka ụmụ mmadụ jupụta ụwa?

5 Jehova anaghị eme ka ọtụtụ ndị ọchịchị. Ọ naghị asị ka naanị ya rụchaa ihe niile. Kama, obi na-adị ya ụtọ inye ndị ọ na-achị ihe ha ga-arụ n’ihi na ha bụ ndị ezinụlọ ya ọ tụkwasịrị obi. Dị ka ihe atụ, o mere ka ihe ndị ọzọ dị ndụ o kere n’ụwa nọrọ n’okpuru Adam. O nyekwara ya ọrụ na-eme obi ụtọ, ya bụ, ịgụ ụmụ anụmanụ aha. Ọrụ ahụ abụghị obere ọrụ. (Jen. 1:26; 2:19, 20) Chineke ekeghị ọtụtụ nde mmadụ zuru okè ka ha jupụta n’ụwa. Kama, o kpebiri ike otu nwaanyị zuru okè ka ọ bụrụ nwunye Adam. (Jen. 2:21, 22) Ọ gwaziri ha mụjuo ụwa. N’oge ahụ, Adam na Iv bi n’ebe mara ezigbo mma. Ha ga-ejizi nwayọọ nwayọọ mee ka ụwa niile bụrụ Paradaịs. Ha na ndị mmụọ ozi ga na-efe Jehova ruo mgbe ebighị ebi ebe ọ bụ na ha niile so n’ezinụlọ Chineke. Jehova si otú ahụ mee ka Adam na Iv nwee olileanya magburu onwe ya, gosikwa na ya bụ Nna hụrụ ha n’anya.

ỤMỤ ISI IKE JỤRỤ ỌCHỊCHỊ CHINEKE

6. (a) Olee otú ụfọdụ ndị so n’ezinụlọ Chineke si malite inupụ isi? (b) Olee otú anyị si mara na Jehova ka bụ Ọkaakaa n’agbanyeghị na e nupụụrụ ya isi?

6 Ọ dị mwute na Adam na Iv achọghị ka Jehova na-achị ha. Kama, ha kpebiri iso Setan, bụ́ mmụọ ozi nupụụrụ Chineke isi. (Jen. 3:1-6) Isi ahụ ha nupụụrụ Chineke kpataara ha na ụmụ ha ahụhụ na ọnwụ. (Jen. 3:16-19; Rom 5:12) N’oge ahụ, Chineke enwezighị ndị na-erubere ya isi n’ụwa. Ma, ọ̀ pụtara na ọchịchị ya adaala, nakwa na ọ bụghịzi Ọkaakaa n’ụwa? Mbanụ. Ọ chụpụrụ Adam na Iv n’ogige Iden, meekwa ka ndị cherọb nọchie ụzọ e si abanye n’ogige ahụ ka ha ghara ịbata na ya. (Jen. 3:23, 24) Ma, Chineke gosiri na ya bụ Nna hụrụ ụmụ ya n’anya. O kwuru na nzube ya ga-emezurịrị, ya bụ na ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi ka ga-eso n’ezinụlọ ya. O kwukwara na otu n’ime ụmụ Adam ga-ebibi Setan, wepụkwa nsogbu niile mmehie Adam kpatara.—Gụọ Jenesis 3:15.

7, 8. (a) Olee otú ụwa jọruru ná njọ n’oge Noa? (b) Olee otú Jehova si bibie ndị ọjọọ n’ụwa ma chebe ụfọdụ ndị?

 7 Ọtụtụ narị afọ ka Adam nupụchara isi, Ebel, Inọk, na ndị ọzọ kpebiri ịna-erubere Jehova isi. Ma, ọtụtụ ndị ekweghị ka Jehova bụrụ Nna ha na Eze ha. N’oge Noa, ụwa ‘jupụtara n’ime ihe ike.’ (Jen. 6:11) Ọ̀ pụtara na ihe na-eme n’ụwa anyịla Jehova? Gịnị ka Baịbụl kwuru?

8 Ka anyị tụlee ihe Baịbụl kwuru banyere Noa. Jehova gwara ya otú ọ ga-esi arụ nnukwu ụgbọ a ga-eji zọpụta ya na ezinụlọ ya. Chineke gosiri na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya. Ọ bụ ya mere o ji gwa Noa ka ọ gaa “na-ekwusa ezi omume.” (2 Pita 2:5) Ọ ga-abụ na Noa gwara ndị mmadụ ka ha chegharịa, dọọkwa ha aka ná ntị na Chineke ga-ebibi ndị ọjọọ. Ma, ha egeghị ya ntị. N’oge ahụ, ọtụtụ ndị na-eme ihe ike na omume rụrụ arụ. Noa na ezinụlọ ya biri n’etiti ha ruo ọtụtụ afọ. Ebe ọ bụ na Jehova bụ Nna hụrụ ụmụ ya n’anya, o chebere mmadụ asatọ ahụ rubeere ya isi, gọziekwa ha. Mgbe o ji Iju Mmiri bibie ụwa, o gosiri na ya ka ndị ahụ nupụrụ isi ike, ma ụmụ mmadụ ma ndị mmụọ ozi. O si otú ahụ gosi na ọ ka bụ Ọkaakaa.—Jen. 7:17-24.

Kemgbe ụwa, Jehova na-egosi na ya bụ Ọkaakaa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6, 8, 10, 12, 17)

OTÚ JEHOVA SI NA-ACHỊ MGBE IJU MMIRI GACHARA

9. Olee ohere Jehova nyere ụmụ mmadụ mgbe Iju Mmiri ahụ gachara?

9 Mgbe Noa na ezinụlọ ya si n’ụgbọ ahụ pụta, ọ ga-abụrịrị na obi dị ha ụtọ maka otú Jehova si chebe ha ma lekọta ha. Noa rụrụ ebe ịchụàjà ozugbo ahụ ma chụọrọ Jehova àjà. Chineke gọziri Noa na ezinụlọ ya ma gwa ha ka ha ‘mụọ ọmụmụ, baa ụba, jupụta ụwa.’ (Jen. 8:20–9:1) Ihe ahụ bụ ohere ọzọ ụmụ mmadụ nwere ịna-efe naanị Jehova na ịmụju ụwa.

10. (a) Ebee ka ndị mmadụ bidoro inupụrụ Jehova isi mgbe Iju Mmiri gachara, oleekwa otú ha si mee ya? (b) Gịnị ka Jehova mere iji mezuo nzube ya?

10 Ma, Iju Mmiri ahụ emeghị ka ndị mmadụ zuo okè. Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ka ga na-enye ndị mmadụ nsogbu. O teghị aka, ndị mmadụ ebidokwa inupụrụ ọchịchị ọma Jehova isi. Dị ka ihe atụ, Nimrọd malitere imegide Jehova. Ọ bụ nwa nwa Noa mụrụ ya. Baịbụl kpọrọ Nimrọd “dinta dị ike nke na-emegide Jehova.” Ọ rụrụ obodo ukwu dị iche iche, dị ka Bebel, meekwa onwe ya eze “n’ala Shaịna.” (Jen. 10:8-12) Gịnị ka Jehova ga-eme eze nnupụisi a na mbọ ọ na-agba ka a ghara ‘ijupụta ụwa’ otú Chineke kwuru? Chineke ghagburu asụsụ ndị mmadụ, mee ka ndị Nimrọd na-achị gbasaa “n’elu ụwa dum.” N’ebe ọ bụla ha gara, ha bidokwara kpewe okpukpe ụgha ha na-ekpebu, na-achịkwa ibe ha otú e sibu na-achị ha.—Jen. 11:1-9.

11. Olee otú Jehova si gosi na ya achọghị ịhapụ enyi ya Ebreham?

11 N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị fere chi ụgha mgbe Iju Mmiri gachara, e nwere ndị ji obi ha niile na-efe Jehova. Otu n’ime ha bụ Ebreham. O nwere ezigbo ụlọ n’obodo Ọọ. Ma, o gere Jehova ntị hapụ ebe ahụ́ ruru ya ala ha bi, gaa na-ebi n’ụlọikwuu ruo ọtụtụ afọ. (Jen. 11:31; Hib. 11:8, 9) N’oge Ebreham na-akwagharị, e nwere ọtụtụ ndị eze n’obodo ndị dị gburugburu ebe ọ mara ụlọikwuu. Ọtụtụ n’ime obodo ndị ahụ nwere mgbidi. Ma, Jehova chebere Ebreham na ezinụlọ ya. Ihe otu ọbụ abụ kwuru gosiri na Jehova chebere ha otú nna si echebe ụmụ ya. O kwuru, sị: ‘Chineke ekweghị ka mmadụ ọ bụla rigbuo ha, kama ọ baara  ndị eze mba n’ihi ha.’ (Ọma 105:13, 14) Jehova achọghị ịhapụ Ebreham, bụ́ enyi ya tụkwasịrị ya obi. Ọ bụ ya mere o ji kwe ya nkwa, sị: “Ndị eze ga-esikwa n’ahụ́ gị pụta.”—Jen. 17:6; Jems 2:23.

12. Olee otú Jehova si gosi na ike ya karịrị nke Fero eze Ijipt, oleekwa otú ihe o mere si baara ndị Izrel uru?

12 Chineke kwere Aịzik nwa Ebreham na nwa Aịzik aha ya bụ Jekọb nkwa na ya ga-agọzi ha. Ọ gwakwara ha na ha ga-amụta ndị eze. (Jen. 26:3-5; 35:11) Ma, tupu ihe a Jehova kwuru emee, ụmụ Jekọb gbara ohu n’Ijipt. Ọ̀ pụtara na Jehova agaghị emezu nkwa ya ma ọ bụ na ọ bụghịzi Ọkaakaa n’ụwa niile? Mba. Mgbe oge ruru, Jehova gosiri ike ya, gosikwa na ike ya karịrị nke Fero, bụ́ eze onye agwala m. Ụmụ Izrel nwere okwukwe na Jehova, Jehova napụtakwara ha, mee ka ha gafee Oké Osimiri Uhie. N’eziokwu, Jehova ka bụ Ọkaakaa. Ọ na-elekọta ndị na-efe ya otú ahụ nna si elekọta ụmụ ya. Ọ bụ ya mere o ji echebe ha.—Gụọ Ọpụpụ 14:13, 14.

JEHOVA GHỌRỌ EZE IZREL

13, 14. (a) N’abụ ụmụ Izrel bụrụ, gịnị ka ha kwuru banyere ọchịchị Jehova? (b) Olee nkwa Chineke kwere Devid?

13 Ozugbo Jehova napụtachara ndị Izrel n’aka ndị Ijipt, ha bụrụ abụ ha ji too ya. E dere abụ ahụ n’akwụkwọ Ọpụpụ isi iri na ise. N’amaokwu nke iri na asatọ, ha kwuru na “Jehova ga-achị dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi.” N’eziokwu, Jehova ghọrọ Eze mba ọhụrụ a a na-akpọ Izrel. (Diut. 33:5) Ma, ụmụ Izrel achọghị ka ọ bụrụ naanị Eze a na-anaghị ahụ anya ga na-achị ha. Mgbe ụmụ Izrel pụtachara n’Ijipt ma nọọ ihe dị ka narị afọ anọ, ha gwara Chineke ka ọ họpụtara ha mmadụ ka ọ bụrụ eze ha, otú ahụ ọ dị ná mba ndị na-ekpere arụsị gbara ha gburugburu. (1 Sam. 8:5) Ma, ihe mere n’oge Devid na-achị gosiri na Jehova ka bụ Eze.

14 Devid butere igbe ọgbụgba ndụ Jehova na Jeruselem. Obi dị ndị Izrel ụtọ n’ụbọchị ahụ, ndị Livaị abụọkwa abụ ha ji too Jehova. Ha kwuru ihe dị mkpa e dere n’Ihe E Mere nke Mbụ isi iri na isii, amaokwu iri atọ na otu. Ebe  ahụ sịrị: “Ka ha kwuokwa n’etiti mba niile, sị, ‘Jehova aghọwo eze!’” Ma, ebe ọ bụ na Jehova bụ Eze mgbe ebighị ebi, olee otú o si bụrụ na ọ ghọrọ Eze n’oge ahụ? Jehova na-aghọ Eze mgbe o mere ihe gosiri na ọ bụ Ọkaakaa ma ọ bụkwanụ gwa onye ọzọ ka ọ nọchite anya ya ma ọ bụ ka o mee otu ihe dị mkpa. Ọ dị mkpa ka anyị mata otú Jehova si aghọ Eze. Tupu Devid anwụọ, Jehova kwere ya nkwa na ọchịchị ya ga-adịru mgbe ebighị ebi. Ọ gwara ya, sị: “M ga-eme ka mkpụrụ gị, nke ga-esi n’ahụ́ gị pụta, bilie mgbe ị nwụsịrị; m ga-emekwa ka alaeze ya guzosie ike.” (2 Sam. 7:12, 13) Ihe a Jehova kwuru mezuru mgbe ihe karịrị otu puku afọ gachara. Ọ bụ mgbe ahụ ka a matara onye bụ́ “mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa. Ònye ka ọ bụ, oleekwa mgbe ọ ghọrọ Eze?

JEHOVA HỌPỤTARA EZE ỌHỤRỤ

15, 16. Olee mgbe e tere Jizọs mmanụ na ọ ga-abụ Eze? Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, gịnị ka o mere iji kwadebe maka Alaeze ya?

15 N’afọ 29, Jọn Onye Na-eme Baptizim bidoro ikwusa na “alaeze eluigwe eruwo nso.” (Mat. 3:2) Mgbe Jọn mere Jizọs baptizim, Jehova tere Jizọs mmanụ ka ọ bụrụ Mesaya na onye ga-abụ Eze n’Alaeze ya. Jehova gosiri na ya hụrụ Jizọs n’anya. O kwuru, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.”—Mat. 3:17.

16 Mgbe Jizọs na-eje ozi ya, o toro Nna ya. (Jọn 17:4) Otú o si mee ya bụ na o kwusara banyere Alaeze Chineke. (Luk 4:43) Ọ kụzidịịrị ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa. (Mat. 6:10) Ebe ọ bụ na Jizọs ga-abụ Eze n’Alaeze Chineke, ọ gwara ndị na-emegide ya, sị: “Alaeze Chineke dị n’etiti unu.” (Luk 17:21) N’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya gbara ndụ, ya ekwe ha nkwa na ha ga-eso ya chịa n’Alaeze ya. Ọ pụtara na ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi ga-eso ya chịa n’Alaeze Chineke.—Gụọ Luk 22:28-30.

17. Olee otú Jizọs si malite ịchị n’afọ 33, ma gịnị ka ọ ka ga-echere?

17 Olee mgbe Jizọs ga-amalite ịchị n’Alaeze Chineke? Ọ maliteghị ozugbo. E gburu ya n’ehihie echi ya, ndị na-eso ụzọ ya agbaakwa ọsọ. (Jọn 16:32) Ma, Jehova gosiri ọzọ na ya bụ Ọkaakaa, otú ahụ o mere n’oge gara aga. N’ụbọchị nke atọ, Jehova kpọlitere ya n’ọnwụ. Na Pentikọst afọ 33, Jizọs malitere ịchị ọgbakọ Ndị Kraịst. (Kọl. 1:13) Ma, ebe Jizọs bụ mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa, ọ ka ga-echere tupu ya achịwa ụwa. Jehova gwara Ọkpara ya, sị: “Nọdụ ala n’aka nri m ruo mgbe m debere ndị iro gị ka ha bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ gị.”—Ọma 110:1.

NA-EFE EZE MGBE EBIGHỊ EBI

18, 19. Gịnị ka anyị kwesịrị ime? Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu na-esonụ?

18 Kemgbe ọtụtụ puku afọ, e nweela ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ nupụụrụ ọchịchị Jehova isi. Ma, Jehova ka bụ Ọkaakaa na Eze. Ebe ọ bụ Nna hụrụ ụmụ ya n’anya, o chebere ndị na-efe ya, gbookwara ha mkpa ha. Ụfọdụ n’ime ha bụ Noa, Ebreham, na Devid. Ọ̀ bụ na nke a ekwesịghị ime ka anyị na-erubere Jehova bụ́ Eze anyị isi ma gbalịa ka anyị na ya dịkwuo ná mma?

19 Ma anyị nwere ike ịjụ, sị: Olee otú Jehova si ghọọ Eze n’oge anyị a? Olee otú anyị ga-esi jiri obi anyị niile na-akwado Alaeze Jehova ma bụrụ ụmụ ya ga-emecha zuo okè n’ezinụlọ ya? Gịnị ka ekpere ahụ anyị na-ekpe ka Alaeze Chineke bịa pụtara? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.