Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) DISEMBA 2013

“Na-emenụ nke A Ka Unu Wee Na-echeta M”

“Na-emenụ nke A Ka Unu Wee Na-echeta M”

“Mgbe o kelesịrị Chineke, ọ nyawara [achịcha ahụ] wee sị: ‘Nke a pụtara ahụ́ m nke bụ́ n’ihi ọdịmma unu. Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.’”—1 KỌR. 11:24.

1, 2. Tupu Jizọs agawa Jeruselem ikpeazụ ọ gara, gịnị ka ndịozi ya nwere ike ịna-eche?

TUPU Jizọs na ndịozi ya agawa Jeruselem ikpeazụ ọ gara, ụfọdụ n’ime ndịozi ya nwere ike ịna-eche, sị: ‘Eluigwe agbachapụla. Anyị ahụwala ọnwa ọhụrụ. Ọ ga-abụ na ndị nche nọ na Jeruselem hụkwara ya n’abalị ụnyaahụ. Ndị Sanhedrin anụla ya, maakwa ọkwa ozugbo na a banyela n’ọnwa Naịsan. Anwụrụ ọkụ ma ọ bụ ndị ozi e zipụrụ emeela ka a mata ya ngwa ngwa. Ndị bi ebe a anụdịla ya. Jizọs ga-achọrịrị ịgawa Jeruselem ka o nwee ike ruo ebe ahụ tupu e bido Ememme Ngabiga.’

2 N’oge ahụ, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ na Peria. Obodo ahụ dị n’ofe Osimiri Jọdan. (Mat. 19:1; 20:17, 29; Mak 10:1, 32, 46) Ozugbo ndị Juu matara ụbọchị mbụ n’ọnwa Naịsan, ha na-echere ka abalị iri na atọ gafee, ha emezie Ememme Ngabiga mgbe anyanwụ dachara n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan.

3. Gịnị mere ezi Ndị Kraịst ji nwee mmasị n’ụbọchị Ememme Ngabiga?

3 Ọ bụ n’abalị iri na anọ n’ọnwa Eprel afọ 2014 ka a ga-eri Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Ọ ga-abụ mgbe anyanwụ dachara. Ọ bụkwa n’ụbọchị ahụ ka ndị Juu oge ochie ji eme Ememme Ngabiga. Ọ ga-abụrụ ezi Ndị Kraịst na ndị nwere mmasị ụbọchị pụrụ iche. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi ihe Pọl onyeozi kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 11:23-25. Ọ sịrị: “Jizọs weere otu ogbe achịcha n’abalị ahụ a ga-arara ya nye. Mgbe o kelesịrị Chineke, ọ nyawara ya wee sị: ‘Nke a pụtara ahụ́ m nke bụ́ n’ihi ọdịmma unu. Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.’ Otú ahụ ka o mekwara iko ahụ.”

4. (a) Olee ajụjụ ndị i nwere ike ịjụ onwe gị banyere Ncheta Ọnwụ Jizọs? (b) Kwa afọ, olee otú anyị si amata ụbọchị a ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs? (Gụọ ihe e dere n’igbe bụ́  “Ncheta Ọnwụ Jizọs nke Afọ 2014.”)

4 Naanị ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-echeta kwa afọ bụ ọnwụ ya. Anyị makwa na ị ga-achọ ịnọ mgbe a ga-eme ya. Tupu oge ahụ eruo, jụọ onwe gị, sị:  ‘Olee otú m ga-esi jikere maka Ncheta Ọnwụ Jizọs? Gịnị na gịnị ka a ga-eji eme ya? Olee otú a ga-esi eme ya? Olee uru ihe ahụ a ga-eme na ihe ndị a ga-eji eme ya baara m?’

IHE NDỊ E JI ECHETA ỌNWỤ JIZỌS

5. Gịnị ka Jizọs gwara ndịozi ya ka ha mee iji jikere maka Ememme Ngabiga?

5 Mgbe Jizọs gwara ndịozi ya ka ha gaa dozie ụlọ ha ga-anọ rie nri Ememme Ngabiga, ọ gwaghị ha gaa chọwa ụlọ ahụ oké mma. O nwere ike ịbụ na naanị ihe ọ chọrọ bụ ebe ga-adị mma, dị ọcha, baakwa ya na ndịozi ya. (Gụọ Mak 14:12-16.) E nwere ihe ndị ha ga-eweta maka ememme ahụ, ya bụ, achịcha na-ekoghị eko na mmanya na-acha ọbara ọbara. Mgbe ya na ndịozi ya mechara ememme ahụ, ọ gwara ha gbasara achịcha na mmanya ahụ. Ọ bụ ihe abụọ a ka ha ga-eji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs.

6. (a) Mgbe Jizọs na ndị ndịozi ya richara nri Ememme Ngabiga, gịnị ka o kwuru gbasara achịcha ha ji mee Ncheta Ọnwụ ya? (b) Olee ụdị achịcha e ji eme Ncheta Ọnwụ ya?

6 Matiu onyeozi nọ mgbe e mere Ememme Ngabiga ahụ. O mechara dee, sị: “Jizọs weere otu ogbe achịcha. Mgbe ọ gọzichara ya, ọ nyawara ya, nye ya ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Naranụ, taa.’” (Mat. 26:26) “Achịcha” ahụ bụ achịcha na-ekoghị eko a na-eji eme Ememme Ngabiga. (Ọpụ. 12:8; Diut. 16:3) Ihe e ji mee ya bụ ntụ ọka wit na mmiri. E tinyeghị ya ihe na-eko achịcha. E tinyeghịkwa ya nnu ma ọ bụ ihe ọzọ ga-eme ka ọ tọọ ụtọ. Ebe ọ bụ na e tinyeghị ya ihe na-eko achịcha, ọ gaghị eko eko. Ọ ga-adị mbadamba, kpọọ akpọọ, dịkwa mfe mgbari. Tupu ụbọchị a ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs eruo, ndị okenye nwere ike ịgwa mmadụ ka o were ntụ ọka wit na mmiri mee achịcha a ga-eji eme ya. Onye ahụ nwere ike itinye obere mmanụ n’ite ọ ga-eji mee achịcha ahụ. Ọ bụrụ na a gaghị enwetali ntụ ọka wit, e nwere ike iji nke ọka bali, nke ọka nkịtị ma ọ bụ nke ụdị ọka ọzọ mee ya. E nwedịrị ike iji nke osikapa mee ya. E nwekwara ike iji achịcha ndị Juu a na-etinyeghị mọlt, àkwá, ma ọ bụ yabaasị.

7. Gịnị dị n’iko ahụ Jizọs bunyere ndịozi ya mgbe ha na-eri Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị? Olee ụdị mmanya e nwere ike iji mee Ncheta Ọnwụ Jizọs?

7 Matiu kwuru ihe ọzọ merenụ. Ọ sịrị: “[Jizọs] bukwaara iko. Mgbe o kelesịrị Chineke, o bunyekwara ha ya, sị: ‘Ṅụọnụ, unu niile.’” (Mat. 26:27, 28) Ihe dị n’iko ahụ bụ mmanya na-acha ọbara ọbara. Olee otú  anyị si mara na ọ bụghị mmanya vaịn ọhụrụ? Ọ bụ n’ihi na ọ dịla anya a ghọchara mkpụrụ vaịn. Mmanya esoghị n’ihe ndị Izrel ji mee Ememme Ngabiga n’Ijipt. Ma, Jizọs ekwughị na ịṅụ mmanya n’Ememme Ngabiga bụ ihe ọjọọ. Ya na ndịozi ya ṅụrụ mmanya ná Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. N’ihi ya, Ndị Kraịst taa na-eji mmanya eme Ncheta Ọnwụ Jizọs. Olee ụdị mmanya e kwesịrị iji mee Ncheta Ọnwụ Jizọs? Ebe ọ bụ na o nweghị ihe e tinyere n’ọbara Jizọs iji mee ka ọ bakwuo uru, a gaghị eji mmanya e tinyere ihe ọ bụla mee Ncheta Ọnwụ Jizọs, ma ọ̀ bụ ihe ga-eme ka ọ tọkwuo ụtọ ma ọ bụ ihe ga-eme ka ọ na-egbukwu egbu. O kwesịrị ịbụ mmanya na-acha ọbara ọbara. E nwere ike iji mmanya vaịn mmadụ ji aka ya mepụta ma ọ bụ nke a zụtara n’ahịa dị ka Beaujolais, Burgundy, ma ọ bụ Chianti.

IHE ACHỊCHA NA MMANYA AHỤ PỤTARA

8. Gịnị mere na Ndị Kraịst anaghị eji ihe achịcha na mmanya ahụ pụtara egwu egwu?

8 Ihe Pọl onyeozi kwuru gosiri na ndịozi Jizọs na Ndị Kraịst ndị ọzọ ga na-eme Ncheta Ọnwụ Kraịst. N’akwụkwọ ozi o degaara ụmụnna nọ na Kọrịnt, o kwuru, sị: “Ọ bụ n’aka Onyenwe anyị ka m natara ihe ahụ m nyefere unu, na Onyenwe anyị Jizọs weere otu ogbe achịcha . . . Mgbe o kelesịrị Chineke, ọ nyawara ya wee sị: ‘Nke a pụtara ahụ́ m nke bụ́ n’ihi ọdịmma unu. Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.’” (1 Kọr. 11:23, 24) N’ihi ya, Ndị Kraịst na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs otu ugboro n’afọ, ha anaghịkwa eji ihe achịcha na mmanya ahụ pụtara egwu egwu.

9. Olee ihe na-abụghị eziokwu ụfọdụ ndị na-ekwu banyere achịcha ahụ Jizọs nyere ndịozi ya?

9 Ụfọdụ ndị na-aga chọọchị na-ekwu na ihe Jizọs kwuru bụ: ‘Ihe a bụ ahụ́ m.’ N’ihi ya, ha kweere na Jizọs rụrụ ọrụ ebube mee ka achịcha ahụ ghọọ ahụ́ ya. Ma, ọ bụghị eziokwu. * Ndịozi Jizọs na-ahụ ma ahụ́ Jizọs  ma achịcha ahụ na-ekoghị eko ha ga-ata. O doro anya na ihe Jizọs na-ekwu bụ na achịcha ahụ pụtara ahụ́ ya. Jizọs na-ejikarị ụdị ihe atụ a akụzi ihe.—Jọn 2:19-21; 4:13, 14; 10:7; 15:1.

10. Gịnị ka achịcha ahụ a na-eji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs pụtara?

10 Achịcha ahụ ndịozi Jizọs na-ahụ, nke ha ga-ata n’oge na-adịghị anya pụtara ahụ́ Jizọs. Olee ahụ́ ya nke ọ bụ? E nwere mgbe ezigbo Ndị Kraịst chere na achịcha ahụ Jizọs nyere ndịozi ya pụtara Ndị Kraịst niile e tere mmanụ, ndị Baịbụl kpọrọ ‘ahụ́ Kraịst.’ Ihe mere ha ji chee otú ahụ bụ na Jizọs nyawasịrị achịcha ahụ anyawasị ma o nweghị ọkpụkpụ ya a gbajiri agbaji. (Efe. 4:12; Rom 12:4, 5; 1 Kọr. 10:16, 17; 12:27) Ma, ka oge na-aga, ha ghọtara na achịcha ahụ pụtara ahụ́ Jizọs nwere. E nwere ọtụtụ ebe Baịbụl kwuru na Jizọs “tara ahụhụ n’anụ ahụ́,” a kpọgbuokwa ya n’osisi ịta ahụhụ. N’ihi ya, achịcha ahụ a na-eji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs pụtara ahụ́ ahụ Jizọs ji chụọ àjà maka mmehie anyị.—1 Pita 2:21-24; 4:1; Jọn 19:33-36; Hib. 10:5-7.

11, 12. (a) Gịnị ka Jizọs kwuru gbasara mmanya ahụ o nyere ndịozi ya? (b) Gịnị ka mmanya ahụ a na-eji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs pụtara?

11 Ebe ọ bụ na anyị aghọtala ihe achịcha ahụ pụtara, ọ ga-adịziri anyị mfe ịghọta ihe Jizọs kwuru gbasara mmanya ahụ. Baịbụl kwuru, sị: “Otú ahụ ka o mekwara iko ahụ, mgbe o risịrị nri anyasị, o wee sị: ‘Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke dabeere n’ọbara m.’” (1 Kọr. 11:25) N’ọtụtụ Baịbụl, a sụgharịrị ya otú e si sụgharịa ya na Bible Nsọ nke Union Version, ya bụ, ‘Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ n’ime ọbara m.’ Iko ahụ Jizọs bu n’aka ọ̀ bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ? Mba. Ihe Jizọs na-ekwu banyere ya bụ mmanya ahụ dị n’ime iko ahụ. Olee ihe Jizọs kwuru na mmanya ahụ pụtara? Ọ sịrị na ọ pụtara ọbara ya ọ ga-eji chụọ àjà.

12 N’Oziọma Mak, Jizọs kwuru, sị: “Nke a pụtara ‘ọbara m nke ọgbụgba ndụ ahụ,’ nke a ga-awụpụ n’ihi ọtụtụ mmadụ.” (Mak 14:24) Matiu dere na ‘a ga-awụpụ ọbara Jizọs n’ihi ọtụtụ mmadụ maka mgbaghara mmehie.’ (Mat. 26:28) N’ihi ya, mmanya ahụ na-acha ọbara ọbara pụtara ọbara Jizọs. Ọ bụ ọbara Jizọs ka e ji gbapụta anyị ka e nwee ike ịgbaghara anyị mmehie anyị.—Gụọ Ndị Efesọs 1:7.

Ndịozi Jizọs ṅụrụ mmanya ahụ nọchiri anya ọbara Jizọs nke ha na ya ji gbaa ndụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 12)

OLEE OTÚ E SI EME NCHETA ỌNWỤ JIZỌS?

13. Olee otú e si eme Ncheta Ọnwụ Jizọs?

13 Ọ bụrụ na nke a ị ga-aga bụ nke mbụ ị ga-eso Ndịàmà Jehova mee Ncheta Ọnwụ Jizọs, gịnị ka ị ga-atụ anya ya? Ebe a ga-anọ eme ya ga-aba ndị niile bịaranụ. Ọ ga-adị mma n’anya, dịkwa ọcha. E nwere ike iji okooko osisi chọọ ya mma, ma a gaghị achọ ya oké mma. Ọ gaghị adị ka ebe a bịara oriri na nkwari. Okenye ruru eru ga-ekwu ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Ọ ga-ewetu obi kwuo ya otú ndị bịaranụ ga-aghọta ihe ọ na-ekwu. Ọ ga-akọwa na ihe mere Kraịst ji nwụọ bụ ka ọ gbapụta anyị ka anyị nwee ike ịdị ndụ. (Gụọ Ndị Rom 5:8-10.) Nwanna ga-ekwu okwu n’ụbọchị ahụ ga-ekwukwa ụzọ olileanya abụọ Baịbụl kwuru na Ndị Kraịst nwere.

14. Olee olileanya abụọ a ga-akọwa n’ụbọchị a na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs?

14 Otu n’ime olileanya Ndị Kraịst nwere bụ iso Kraịst chịa n’eluigwe. Ọ bụ Ndị Kraịst ole na ole nwere olileanya a. Ndịozi Jizọs so na ha. (Luk 12:32; 22:19, 20; Mkpu. 14:1) Ndị nwere olileanya nke abụọ ka ndị nwere nke mbụ ahụ. Ha nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe a ga-eme ka ọ ghọọ paradaịs. Ọ bụ mgbe ahụ ka ụwa ga-adị otú Chineke chọrọ ka ọ dịrị, bụ́kwanụ ihe Ndị Kraịst na-ekpe ekpere ya kemgbe. (Mat. 6:10) Akwụkwọ Nsọ kwuru ihe ọma Chineke ga-emere ndị mmadụ, kwuokwa na ha ga-adị ndụ ebighị ebi.—Aịza. 11:6-9; 35:5, 6; 65:21-23.

15, 16. Mgbe a na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs, gịnị ka a na-eme achịcha ahụ na-ekoghị eko?

15 Ọ bụrụ na nwanna ahụ akọwachaa  ụdị olileanya abụọ ahụ, ọ ga-ekwu na oge eruola ka e mee ihe ahụ Jizọs mere mgbe ya na ndịozi ya na-eri Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. A ga-edewe achịcha na-ekoghị eko na mmanya na-acha ọbara ọbara n’elu tebụl. Tebụl ahụ ga-adị nso n’ebe nwanna ahụ nọ na-ekwu okwu. Ọ ga-agụ amaokwu Baịbụl kwuru ihe Jizọs mere mgbe o weere ogbe achịcha ahụ. O nwere ike ịgụ ebe Matiu kwuru, sị: “Jizọs weere otu ogbe achịcha. Mgbe ọ gọzichara ya, ọ nyawara ya, nye ya ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Naranụ, taa. Nke a pụtara ahụ́ m.’” (Mat. 26:26) Jizọs nyawasịrị ogbe achịcha ahụ ka o nwee ike ibunye ha ndịozi ya nọ ya n’aka nri na n’aka ekpe. Mgbe a ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs n’abalị iri na anọ n’ọnwa Eprel, ị ga-ahụ achịcha na-ekoghị eko a nyawara tinye n’efere.

16 A ga-ekpe ekpere dị nkenke tupu e bugharịa achịcha ahụ. A gaghị etinye ya naanị n’otu efere ka e nwee ike ibugharị ya ngwa ngwa nakwa n’usoro. O nweghị ihe pụrụ iche a ga-emere ya. A ga-ebugharị ya otú ọgbakọ si hazie ya. N’ọtụtụ ọgbakọ, o nweghị onye ga-ata ya. Ma n’ọgbakọ ụfọdụ, mmadụ ole na ole ga-ata ya. Ọ bụ otú o si mee na nke afọ 2013.

17. Mgbe a na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs, olee otú e si eme ihe Jizọs kwuru gbasara mmanya?

17 Nwanna na-ekwu okwu ga-agụpụtazi ihe Jizọs mere mmanya ahụ. Baịbụl kwuru, sị: “[Jizọs] bukwaara iko. Mgbe o kelesịrị Chineke, o bunyekwara ha ya, sị: ‘Ṅụọnụ, unu niile; n’ihi na nke a pụtara “ọbara m nke ọgbụgba ndụ ahụ,” nke a ga-awụpụ n’ihi ọtụtụ mmadụ maka mgbaghara mmehie.’” (Mat. 26:27, 28) A ga-ekpe ekpere ọzọ otú ahụ Jizọs mere. E kpechaa, e bugharịa mmanya ahụ na-acha ọbara ọbara.

18. Ọ bụrụgodị na o nweghị onye ga-ata achịcha ahụ ma ṅụọ mmanya ahụ, ma ọ bụkwanụ na ọ bụ naanị mmadụ ole na ole, gịnị mere ọ ka ji dị mkpa ka anyị gaa Ncheta Ọnwụ Jizọs?

18 Ọ bụ naanị ndị ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe ga-ata achịcha ahụ, ṅụọkwa mmanya ahụ. Ọtụtụ ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs agaghị ata achịcha ahụ mgbe a na-ebugharị ya, ha agaghịkwa aṅụ mmanya ahụ. (Gụọ Luk 22:28-30; 2 Tim. 4:18) N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị agaghị ata achịcha ahụ ma ọ bụkwanụ ṅụọ mmanya ahụ, ha kwesịrị ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ọ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ịga ya na-egosi na ha ji àjà Jizọs chụrụ kpọrọ ihe. N’oge ahụ a na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs, ha ga-echebara ihe ọma niile ha ga-enweta n’ihi àjà mgbapụta ahụ echiche. Ha nwere olileanya na ha ga-eso ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ahụ ga-esi “n’oké mkpagbu ahụ pụta.” Okwukwe ha nwere n’àjà Jizọs chụrụ ga-eme ka ha bụrụ ndị ezi omume n’anya Chineke. E nwere ike ikwu na ‘ha sara uwe mwụda ha, meekwa ka ọ na-acha ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ.’—Mkpu. 7:9, 14-17.

19. Olee otú anyị nwere ike isi kwadebe maka Ncheta Ọnwụ Jizọs ma rite uru na ya?

19 Olee otú Ndịàmà Jehova n’ụwa niile si akwadebe maka Ncheta Ọnwụ Jizọs? Mgbe ọ fọrọ izu ole na ole ka e mee Ncheta Ọnwụ Jizọs, anyị ga-ebido ịkpọ ndị mmadụ ka ha bịa soro anyị mee ya. Mgbe ọ fọrọ ụbọchị ole na ole, anyị ga-amalite ịgụ amaokwu Baịbụl ndị kọrọ ihe Jizọs mere na ihe ndị mere tupu ya na ndịozi ya erie Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’afọ 33. Anyị na-ahazi ihe ndị anyị na-eme ka anyị nwee ike ịga. Anyị na-aga n’oge ka anyị nwee ike ịnabata ndị bịaranụ ma nọrọ mgbe a ga-eme ihe niile a ga-eme. Ọ bụrụ na onye na-ekwu okwu akpọọ amaokwu Akwụkwọ Nsọ ọ chọrọ ịgụ, anyị kwesịrị ịsata amaokwu ahụ na Baịbụl nke anyị, na-egekwa ntị mgbe ọ na-akọwa ya. Ọ ga-eme ka anyị na ndị anyị kpọrọ rite ezigbo uru. Ihe kacha mkpa mere anyị ji kwesị ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ na ọ na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka àjà Jizọs chụrụ nakwa na anyị na-erube isi n’iwu o nyere anyị, ya bụ: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.”—1 Kọr. 11:24.

^ para. 9 Otu ọkà mmụta bụ́ onye Jamanị aha ya bụ Heinrich Meyer kwuru na ndịozi Jizọs agaghị eche na ọ bụ ahụ́ Jizọs ka ha na-ata nakwa na ọ bụ ọbara ya ka ha na-aṅụ n’ihi na “o nwebeghị ihe mere ahụ́ Jizọs, (ya bụ, Jizọs ka dị ndụ).” O kwukwara na Jizọs ji “okwu dị mfe” kọwaa ihe achịcha na mmanya ahụ pụtara nakwa na Jizọs agaghị achọ ka ndịozi ya ghọtahie ihe o kwuru.