Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) DISEMBA 2013

Jehova Chebere Ha n’Ugwu

Jehova Chebere Ha n’Ugwu

OTU nwaanyị tetara ụra otu ụbọchị, hụ ngwugwu e dewere n’ọnụ ụzọ ụlọ ya. O welitere ya, legharịa anya ka ọ mara ma ọ̀ ga-ahụ onye dewere ya, ma o nweghị onye ọ hụrụ. Ọ ga-abụrịrị na onye ahụ bịara dewe ya n’abalị. O mepetụrụ ngwugwu ahụ, baghachi n’ime ụlọ ozugbo ma mechie ụzọ. Ihe mere o ji mee otú ahụ bụ na ihe ahụ bụ akwụkwọ anyị ji amụ Baịbụl, a machibidokwara ya iwu n’obodo ahụ. O weere ya, kpee ekpere n’ime obi ya, kelee Jehova maka okwu ya bara ezigbo uru e dere n’akwụkwọ ahụ.

Ụdị ihe a mere ọtụtụ ugboro na Jamanị n’oge ndị Nazi na-achị. Mgbe ndị Nazi weere ọchịchị n’afọ 1933, e mechara machibido ọrụ Ndịàmà Jehova iwu n’ọtụtụ ebe na Jamanị. E nwere otu nwanna dị ihe karịrị otu narị afọ ugbu a. Aha ya bụ Richard Rudolph. * O kwuru, sị: “O doro anyị anya na iwu mmadụ nyere enweghị ike ime ka a kwụsị ikwusa gbasara Jehova na aha ya. Ọ bụ akwụkwọ nzukọ Jehova bipụtara ka anyị na-eji amụ Baịbụl, na-ekwusakwa ozi ọma. Ma, o siziri ike inweta ya n’ihi na a machibidola ya iwu. Anyị nọ na-eche otú anyị ga-esizi na-ekwusa ozi ọma.” O teghị aka, Richard amata na ya nwere ike iso na-ebubata akwụkwọ ndị ahụ. Ma, otú a ga-esi na-eme ya ga-apụ iche. Ọ bụ n’ugwu ka a ga-esi na-ebubata ha.—Ikpe 9:36.

N’EBE A NA-ESIBU EBUBATA AHỊA IWU

E nwere nnukwu ugwu dị n’ókè Chek Ripọblik na Poland. Ọ bụrụ na i soro osimiri Elbe na-agbago, ị ga-ahụ ugwu ahụ. Ugwu ahụ adịghị oké elu. Ma, ezigbo snoo na-adị na ya ruo ọnwa isii n’afọ ọ bụla. Snoo na-ada na ya na-akadị onye toro ezigbo ogologo ogo. Ihu ígwé nwere ike ịgbanwe na mberede, urukpuru ekpuchie elu ugwu ahụ, ya emezie ka ndị na-arị ugwu ghara ịhụ ụzọ nke ọma.

Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ugwu a na-abụkarị ókè obodo na obodo, alaeze na alaeze, nakwa mba na mba. Otú ebe ahụ dị mere ka o siere ndị uwe ojii ike ịna-aga na ya. N’ihi ya, n’oge ochie, ọtụtụ ndị na-esi n’ebe ahụ ebubata ahịa iwu. N’agbata afọ 1933 na 1936, Ndịàmà Jehova obi kara malitere isi n’ebe ahụ ebubata  akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. N’oge ahụ, nnukwu ugwu ahụ bụ ókè Chekoslovakia na Jamanị. Ụmụnna ndị ahụ na-aga ebute akwụkwọ anyị n’ebe a na-amachibidoghị ya iwu. Aha otu n’ime ha bụ Young Richard.

Ụmụnna ndị jikeere ka ndị na-arị ugwu na-ebu akwụkwọ anyị gafee nnukwu ugwu a bata Jamanị

ANYỊ BIDORO ỊNA-EME KA NDỊ GARA ỊRỊ UGWU

Nwanna Richard kwuru, sị: “Ná ngwụcha izu, anyị na-adị ihe dị ka ụmụ okorobịa asaa asaa aga n’ugwu ahụ. Anyị na-ejikere ka ndị na-arị ugwu. Anyị na-eji ihe dị ka awa atọ esi ná mpaghara ugwu ahụ dị na Jamanị agaru Shpindelruv Mịlin.” Ebe ahụ bụ ebe ndị mmadụ na-aga atụrụ ndụ, ná mpaghara ugwu ahụ nke dị na Chek Ripọblik. Ụmụnna anyị na-aga ihe dị ka kilomita iri na isii na ọkara tupu ha erute ebe ahụ. Ọtụtụ ndị Jamanị bi n’ebe ahụ n’oge ahụ. Otu n’ime ha bụ otu nwoke na-arụ ọrụ ugbo. O kwetara na ya ga na-enyere ụmụnna anyị aka. Ọ na-eji ụgbọ ịnyịnya o ji ebu ndị na-aga ezumike ebute igbe ndị e tinyere akwụkwọ anyị. Ebe ọ na-esi ebute ha bụ n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè e nwere n’obodo dị nso. A na-esi n’obodo Prag ebute akwụkwọ ndị ahụ n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè ahụ. Ọ na-ebuga igbe ndị ahụ n’ugbo ya ma zoo ha n’ebe ọ na-edewe nri anụ ụlọ ya. Ha na-adị ebe ahụ ruo mgbe ụmụnna anyị ga-abịa buru ha gaa Jamanị.

Nwanna Richard kwukwara, sị: ‘Ọ na-abụ, anyị ruo n’ugbo nwoke ahụ, anyị ewere akwụkwọ ndị ahụ kwajuo n’akpa anyị na-anya n’azụ. A rụrụ akpa ndị ahụ ka e jiri ha na-ebu ihe na-anyị arọ. Onye ọ bụla na-ebu akwụkwọ na-anyị arọ ka otu akpa simenti.’ Ha na-eji abalị aga eburu akwụkwọ ndị ahụ ka a ghara ijide ha. Ha na-apụ ná mgbede ma lọta n’isi ụtụtụ. E nwere otu nwanna bụ́ onye nlekọta sekit na Jamanị n’oge ahụ. Aha ya bụ Ernst Wiesner. O kwuru ihe ha na-eme ka a ghara ijide ha. Ọ sịrị: ‘Ụmụnna abụọ na-anọ n’ihu. Ndị nke ọzọ nya akpa ndị ahụ akwụkwọ juru anọrọ n’ebe na-adịchaghị anya na-eso ha. Ozugbo ndị nke ahụ nọ n’ihu hụrụ mmadụ, ha na-eji tọọchị ha mee ka ndị ahụ nọ n’azụ mata na mmadụ na-abịa, ka ha nwee ike ịga zoo n’ọhịa. Ha na-anọ n’ebe ahụ ruo mgbe ndị nke ahụ nọ n’ihu bịara gwa ha ihe ha kwekọrịtara ha ga-eji amata na nsogbu adịghịzi. Ha na-agbanwe ihe ahụ kwa izu.’ Ma, nsogbu ụmụnna anyị na-enwe mgbe ahụ abụghị naanị ndị uwe ojii Jamanị.

Nwanna Richard kwuru, sị: “E nwere otu oge m na-emechighị ọrụ n’oge, ụmụnna mụ na ha kwesịrị iso  gaa bute akwụkwọ aghaa m. M gawaziri ná mpaghara Chek Ripọblik naanị m. Ọchịchịrị gbara ebe niile, snoo ana-adakwa. Ma, m gawara n’agbanyeghị na ezigbo oyi na-atụ m. Mgbe m rutere n’otu ebe osisi juru, efuru m ụzọ. O wekwara m awa ụfọdụ tupu mụ achọta ụzọ. Ọtụtụ ndị na-arị ugwu esila otú a nwụfuo. Ọ bụ naanị mgbe ụmụnna ndị ahụ mụ na ha na-eso aga na-alọta n’isi ụtụtụ ka mụ na ha zuru.”

Ọ bụ ihe a ka ụmụnna anyị ndị ahụ obi kara na-eme kwa izu ruo ihe dị ka afọ atọ. N’oge snoo na-ada, ha na-anya akpa ndị ahụ akwụkwọ anyị juru ma jiri ihe e ji agba n’elu snoo gafee ugwu ndị ahụ. Mgbe ụfọdụ, ụmụnna anyị na-adị iri abụọ iri abụọ ma si mpaghara Jamanị gaa mpaghara Chek Ripọblik. Ha na-aga ya n’ehihie, si n’ụzọ ha kpebiri na ha ga-esi aga. Ụfọdụ ụmụnna nwaanyị na-eso ha ka a ghara inyo ha enyo ma hà bụkwa ndị na-arị ugwu. Ụfọdụ n’ime ha na-anọ n’ihu. Ha hụ mmadụ, ha atụlie okpu ha elu ka ndị nọ n’azụ mara na agwọ nọ n’akịrịka.

Snoo juru ná nnukwu ugwu a mere ka ịrị ya na-esi ezigbo ike

Gịnị na-eme ma ụmụnna ndị ahụ gara ibute akwụkwọ lọta? A na-ekesa akwụkwọ ndị ahụ ozugbo. Olee otú a na-esi eme ya? A na-etinye ha n’obere ihe ga-eme ka ọ dị ka hà bụ ncha ma buga ha n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè dị na Heshbek. A na-esi n’ebe ahụ ziga ha n’ebe dị iche iche na Jamanị. Ụmụnna na-ejizi akọ gaa na-enye ha ụmụnna ndị ọzọ otú ahụ a kọrọ ná mmalite. Ma ụmụnna ndị na-ebubata akwụkwọ ndị ahụ ma ndị na-ekesa ha na-arụkọ ọrụ. N’ihi ya, e nwee otú ndị ọchịchị si mata ihe ha na-eme, ezigbo nsogbu ga-adị. N’eziokwu, ụdị ihe ahụ mere otu ụbọchị.

N’afọ 1936, ndị uwe ojii chọpụtara ebe anyị na-ebusa akwụkwọ n’otu ebe dị nso na Belin. Ha hụrụ ngwugwu atọ e si Heshbek zite, ma e deghị aha onye zitere ha. Ndị uwe ojii ji aka akwụkwọ onye dere ihe n’elu ngwugwu ndị ahụ mata otu onye dị ezigbo mkpa n’ime ụmụnna ndị ahụ zitere ha ma gaa nwụchie ya. Ọ dịghị anya ha anwụchiekwa ụmụnna abụọ ọzọ ha na-enyo enyo. Otu onye n’ime ha bụ Richard Rudolph. Ụmụnna ndị ahụ e jidere ekwughị na e nwere ndị ọzọ na-eso ha ebubata akwụkwọ ndị ahụ. O mere ka ndị fọrọnụ na-aga ebute akwụkwọ anyị n’agbanyeghị na ime otú ahụ esikwuola ike.

IHE ANYỊ GA-AMỤTA N’AKỤKỌ A

Akwụkwọ ndị ahụ ụmụnna anyị rịrị nnukwu ugwu gaa bute baara ụmụnna nọ na Jamanị ezigbo uru n’oge ahụ. Ọ bụ otú ahụ ka ha na-esikarị enweta akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Ma, ọ bụghị naanị ná nnukwu ugwu ahụ ka ha si bubata akwụkwọ anyị. Ụmụnna na-esikwa n’ókè Jamanị na Chekoslovakia ebubata akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl ruo mgbe ndị agha Jamanị nọchiri Chekoslovakia n’afọ 1939. Ụmụnna ndị nọ na Jamanị nakwa ná mba ndị ọzọ ha na Jamanị gbara agbata obi, ya bụ, Frans, Nedalandz, na Swizaland, nọkwa na-ebugara ụmụnna ha akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’agbanyeghị na o nwere ike ime ka hanwa na-ebuga ha baa ná nsogbu.

Taa, ọtụtụ n’ime anyị nwere akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ụdị ọ bụla anyị chọrọ ya nakwa ole anyị chọrọ ya. Ma ị̀ gara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nara akwụkwọ ọhụrụ ma ị̀ gara were ya n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet bụ́ jw.org, ọ́ gaghị adị mma ka i chebara mbọ niile a gbara wepụta ya echiche? O nwere ike ọ dịghị ka mgbe a gara n’ugwu snoo juru na-ebute akwụkwọ ndị ahụ n’abalị. Ma, o doro anya na ọtụtụ ụmụnna rụsiri ọrụ ike tupu e wepụtara gị ya.

^ para. 3 O jere ozi n’Ọgbakọ Heshbek dị n’obodo Saịlishia. Obodo Heshbek dịzi na Yelenia Gura, nke dị n’agbata ebe ndịda na ebe ọdịda anyanwụ Poland.