Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) DISEMBA 2013

Otú Ị Ga-esi Die Ọnwụ Di Gị ma Ọ Bụ Ọnwụ Nwunye Gị

Otú Ị Ga-esi Die Ọnwụ Di Gị ma Ọ Bụ Ọnwụ Nwunye Gị

BAỊBỤL kwuru hoo haa na di kwesịrị ‘ịhụ nwunye ya n’anya dị ka ọ hụrụ onwe ya n’anya.’ Nwunye ‘kwesịkwara ịdị na-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu.’ Ebe ha abụọ bụzi “otu anụ ahụ́,” onye ọ bụla kwesịrị ịna-arụ ọrụ dịịrị ya. (Efe. 5:33; Jen. 2:23, 24) Ka oge na-aga, ha abụọ ga-adịkwu ná mma ma hụkwuo ibe ha n’anya. E nwere ike iji ha tụnyere osisi abụọ a kụrụ n’otu ebe. Mgbọrọgwụ osisi ndị ahụ na-abakwu n’ime ala, na-ahịkọtakwa ọnụ. Ọ bụrụ na di na nwunye na-ebi n’udo, ka oge na-aga, ha ga-abụ nnu na mmanụ, na-emekọkwa ihe ọnụ.

Ma, gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye anwụọ? Ọnwụ ga-ekewa ha abụọ n’agbanyeghị na ha dị n’ezigbo mma. Obi ga-agbawa onye nke dị ndụ, naanị ya ana-anọzi. Iwe nwekwara ike ịna-ewe ya ma ọ bụkwanụ obi ana-ama ya ikpe. O nwere otu nwaanyị aha ya bụ Daniella. * Ya na di ya biri afọ iri ise na asatọ tupu di ya anwụọ. Oge di ya dị ndụ, nwaanyị a ma ọtụtụ ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha nwụnahụrụ. Ma, mgbe di ya nwụrụ, o kwuru, sị: “Amaghị m na ọ bụ otú ọ na-adị. Ị gaghị aghọta otú ọ na-adị ma ọ bụrụ na o mebeghị gị.”

IHE MERE O JI EWUTE MMADỤ RUO ỌTỤTỤ AFỌ

Ụfọdụ ndị ọkachamara kwuru na o nweghị ihe na-agbawa mmadụ obi ka ọnwụ di ya ma ọ bụ ọnwụ nwunye ya. Ọtụtụ ndị di ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ kwetara na ọ bụ eziokwu. E nwere otu nwaanyị aha ya bụ Millie. Di ya nwụrụ ọtụtụ afọ gara aga.  O kwuru, sị: “Ọ na-adị m ka à gbajisịrị m ụkwụ na aka.” Ihe ọ na-ekwu bụ otú obi dị ya kemgbe di ya nwụrụ. Ha biri afọ iri abụọ na ise tupu di ya anwụọ.

Otu nwaanyị aha ya bụ Susan cheburu na ụmụ nwaanyị ndị na-eru uju di ha ruo ọtụtụ afọ na-erubiga uju ókè. Ma, di ya nwụrụ mgbe ha biri afọ iri atọ na asatọ. Ọ karịala iri afọ abụọ kemgbe di ya nwụrụ, ma o kwuru, sị, “M na-eche banyere di m kwa ụbọchị.” Ọ na-ebekarị ákwá n’ihi na di ya ọ hụrụ n’anya anọghịzi.

Ihe Baịbụl kwuru na-egosi na ọ bụrụ na di mmadụ ma ọ bụ nwunye ya anwụọ, ọ na-agbawa obi. Onye ahụ anaghịkwa echefu ya ngwa ngwa. Mgbe Sera nwụrụ, Ebreham di ya ‘kwaara ya ákwá arịrị, bekwaara ya ákwá.’ (Jen. 23:1, 2) N’agbanyeghị na Ebreham kweere na Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, o wutere ya nke ukwuu mgbe nwunye ya ọ hụrụ n’anya nwụrụ. (Hib. 11:17-19) Mgbe Rechel bụ́ nwunye Jekọb hụrụ n’anya nwụrụ, Jekọb echefughị ya ozugbo. O kwutere okwu ya mgbe ọ na-agwa ụmụ ya okwu.—Jen. 44:27; 48:7.

Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ndị a a kọrọ na Baịbụl? Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye mmadụ anwụọ, o nwere ike ịna-ewute onye ahụ ruo ọtụtụ afọ. Anyị ekwesịghị iche na ákwá ọ na-ebe ma ọ bụ otú o si ewute ya gosiri na okwukwe ya esighị ike. Kama, ọ bụ otú ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ na-emekarị. O nwere ike ịdị mkpa ka anyị na-emetere ha ebere, na-enyekwara ha aka ruo ọtụtụ afọ.

ECHEGBULA ONWE GỊ MAKA ECHI

Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye mmadụ anwụọ, ọ pụtaghị na ihe ga-adịzi otú ọ dị mgbe ọ na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye. Mgbe nwoke na nwunye ya biri ruo ọtụtụ afọ, ọ na-amụta otú ọ ga-esi na-akasi nwunye ya obi ma na-agba ya ume mgbe obi na-adịghị ya mma ma ọ bụ mgbe iwe na-ewe ya. Ọ bụrụ na nwoke ahụ anwụọ, ọ ga-akpa nwunye ya aka ọjọọ n’ihi na onye hụrụ ya n’anya ma na-akasi ya obi anọghịzi. Nke nwaanyị kwa na-amụta otú ọ ga-esi mee ka obi sie di ya ike, obi adịkwa ya ụtọ. Ọ na-adịda di ya aka, na-agwa ya okwu ọma, na-emekwara ya ihe ndị ọ chọrọ. Ihe ahụ niile na-atọgbu di ya atọgbu. Ọ bụrụ na nwaanyị ahụ anwụọ, o nwere ike ịdị di ya ka ò nwere ihe pụrụ ya n’ahụ́. N’ihi ya, ụfọdụ ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ na-achị obi n’aka ma ha chee ihe nwere ike ime echi. Olee ihe ndị e kwuru na Baịbụl nwere ike ime ka obi dị ha ụtọ ma ruo ha ala?

Chineke nwere ike inyere gị aka ịna-edi ọnwụ di gị ma ọ bụ ọnwụ nwunye gị ma ghara ịna-echegbu onwe gị maka ech

Jizọs kwuru, sị: “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi, n’ihi na echi ga-enwe nchegbu nke ya. Ihe ọjọọ nke ụbọchị nke ọ bụla ezuworo ya.” (Mat. 6:34) Ihe a o kwuru gbasara ihe ndị dị ka uwe na ihe oriri. Ma, o nyerela ọtụtụ ndị aka idi ọnwụ di ha ma ọ bụ ọnwụ nwunye ha. E nwere otu nwoke aha ya bụ Charles. Ọnwa ole na ole nwunye ya nwụchara, o kwuru, sị: “Ọnwụ Monique nwunye m ka na-ewute m nke ukwuu. Ọ dị ka obi ọ̀ na-ajọkwu m njọ mgbe ụfọdụ. Ma, ama m na ọ bụ otú ọ na-adị nakwa na ka oge na-aga, ọ gaghịzi na-ewute m otú o si ewute m ugbu a.”

Charles nọ na-edi ọnwụ nwunye ya. Olee otú o si na-edi ya? O kwuru, sị: “Jehova nyeere m aka ịna-edi ụbọchị nke ọ bụla.” Charles ekweghị ka uju ọ na-eru mee ka ọ kwụsị ịtụkwasị Jehova obi. Obi ọjọọ na-eme ya n’ihi ọnwụ nwunye ya akwụsịghị n’otu ntabi anya. Ma, ọ naghị eche banyere ya mgbe niile.  Ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị nwụrụ, echegbula onwe gị maka echi. Ị maghị ihe ọma nwere ike imere gị echi ma ọ bụkwanụ otú e nwere ike isi gbaa gị ume.

Mgbe Jehova kere mmadụ, o bughị n’obi ka ha na-anwụ anwụ. Kama, ọnwụ so ‘n’ọrụ Ekwensu.’ (1 Jọn 3:8; Rom 6:23) Setan na-eji ma ọnwụ ma ụjọ ọnwụ eme ka ọtụtụ ndị bụrụ ohu ya, meekwa ka ha ghara inwe olileanya. (Hib. 2:14, 15) Obi na-adị Setan ụtọ ma mmadụ chee na ya emekataghị nwee ezigbo obi ụtọ, ọ bụrụgodị na ya abaa n’ụwa ọhụrụ. Obi na-agbawa mmadụ ma di ya ma ọ bụ nwunye ya nwụọ. Ọ bụ isi Ekwensu nupụụrụ Chineke na mmehie Adam kpatara ma ọnwụ ma obi mgbawa ya na ya so. (Rom 5:12) Jehova ga-emezi ihe niile Setan mebiri, meekwa ka ọnwụ ghara ịdị. Ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị nwụrụ, cheta na ndị so ná ndị Jehova ga-eme ka ha kwụsị ịna-atụ ọnwụ egwu bụ ọtụtụ ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ.

O doro anya na ndị a kpọlitere n’ọnwụ n’ụwa ga-achọpụta na ọtụtụ ihe agbanweela. Chegodị banyere ndị nne na nna, ndị nna nna na ndị nne nne, na ndị ọzọ nwụrụ n’oge ochie a ga-akpọlite n’ọnwụ, ha na ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha ejiri nwayọọ nwayọọ zuo okè. Chineke ga-ewepụ ịka nká na nsogbu niile ọ na-akpata. Ndị dị ndụ ugbu a nwere ike ịgbanwe otú ha si ele ndị nna nna ha anya ugbu a. Mgbanwe ndị ahụ ga-eme ka ndị mmadụ dịkwuo ná mma.

E nwere ọtụtụ ajụjụ e nwere ike ịjụ banyere ndị a kpọlitere n’ọnwụ. Dị ka ihe atụ, gịnị ka a ga-eme ma ọ bụrụ na onye di ya ma ọ bụ nwunye ya nwụrụ alụọ onye ọzọ, onye ahụ ọ lụrụ anwụọkwa? Ndị  Sadusii jụrụ ajụjụ banyere otu nwaanyị di mbụ ya nwụrụ, ya alụọ di ọzọ, nke ahụ anwụọkwa, ya emegide otú ahụ ruo n’onye nke asaa. Nke asaa ahụ anwụọkwa. (Luk 20:27-33) Gịnị ka a ga-eme ma a kpọlite ha niile n’ọnwụ? Anyị amaghị. Ọ baghịkwanụ uru ka mmadụ chegbuwe onwe ya maka ụdị ajụjụ ahụ. Ihe anyị kwesịrị ime ugbu a bụ ịtụkwasị Chineke obi. Ihe doro anyị anya bụ na ihe ọ bụla Jehova ga-eme gbasara okwu a n’ọdịnihu ga-adị mma. Ọ ga-abụkwa ihe anyị ga na-atụsi anya ya ike, ọ bụghị ihe ga-eme ka anyị tụwa ụjọ.

OLILEANYA MBILITE N’ỌNWỤ NA-AKASI ANYỊ OBI

Otu n’ime ozizi kacha doo anya n’Okwu Chineke bụ na ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ga-esi n’ọnwụ bilie. Ihe Baịbụl kọrọ banyere ndị a kpọlitere n’ọnwụ n’oge gara aga na-eme ka obi sie anyị ike na ‘ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu Jizọs wee pụta.’ (Jọn 5:28, 29) Obi ga-adị ndị nọ ndụ mgbe ahụ ụtọ ịhụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ. Ụdị obi ụtọ ndị a kpọlitere n’ọnwụ ga-enwe ga-akarị ihe ọ bụla anyị nwere ike ichetụ n’echiche ugbu a.

Mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ụwa niile ga-abụ ọṅụ ọṅụ. Ọtụtụ ijeri ndị nwụrụ anwụ ga-esi n’ọnwụ bilie, ha na ndị dị ndụ ebirikwa. (Mak 5:39-42; Mkpu. 20:13) Ọ bụrụ na ndị niile ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ atụgharịa uche n’ọrụ ebube a Chineke ga-arụ n’ọdịnihu, ọ ga-akasi ha obi.

Ò nwere ihe kwesịrị ime ka mmadụ wewe iwe mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ? Baịbụl sịrị mba. Aịzaya 25:8 kwuru na Jehova “ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi.” Ọ pụtara na Chineke ga-ewepụ ma ọnwụ ma nsogbu niile ọ na-akpata. Amụma ahụ e buru n’Aịzaya kwukwara, sị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu niile.” Ọ bụrụ na obi adịghị gị mma ugbu a n’ihi na di gị ma ọ bụ nwunye gị nwụrụ, mara na obi ga-adị gị ezigbo ụtọ mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ.

O nweghị mmadụ ọ bụla ghọtachara ihe niile Chineke ga-eme n’ụwa ọhụrụ ya. Jehova kwuru, sị: “Dị ka eluigwe dị elu karịa ụwa, otú ahụ ka ụzọ m dị elu karịa ụzọ unu, otú ahụkwa ka echiche m dị elu karịa echiche unu.” (Aịza. 55:9) Ọ bụrụ na obi siri anyị ike na nkwa ahụ Jizọs kwere banyere mbilite n’ọnwụ ga-emezu, ọ ga-egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi otú  ahụ Ebreham mere. Ihe dị mkpa ugbu a bụ ka Onye Kraịst ọ bụla na-eme ihe Chineke chọrọ ka anyị na-eme. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-eso ná ndị ruru eru ibi n’ụwa ọhụrụ, anyị na ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ.—Luk 20:35.

IHE MERE ANYỊ GA-EJI NWEE OLILEANYA

Anyị ekwesịghị ịchị obi n’aka maka ihe nwere ike ime echi. Kama, anyị kwesịrị inwe olileanya. Ọtụtụ ndị enweghị olileanya na ihe ga-adị mma. Ọ bụ eziokwu na anyị amachaghị otú Jehova ga-esi mee ya, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-egboro anyị mkpa anyị niile, meekwara anyị ihe ndị anyị chọrọ. Pọl onyeozi dere, sị: “Olileanya nke a na-ahụ anya abụghị olileanya, n’ihi na mgbe mmadụ hụrụ ihe anya, ọ̀ na-enwe olileanya maka ya? Ma ọ bụrụ na anyị nwere olileanya maka ihe anyị na-adịghị ahụ anya, anyị na-eji ntachi obi echere ya.” (Rom 8:24, 25) Ọ bụrụ na i nwere olileanya siri ike na Chineke ga-emezu nkwa ya, ọ ga-eme ka i die ọnwụ di gị ma ọ bụ ọnwụ nwunye gị. Ọ bụrụ na ị tachie obi, ị ga-ahụ oge ahụ magburu onwe ya, mgbe Jehova ‘ga-enye gị ihe niile obi gị na-arịọ.’ Ọ ‘ga-ewere ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ.’—Ọma 37:4; 145:16; Luk 21:19.

Ka obi sie gị ike na Jehova ga-emezu nkwa o kwere na ị ga-enwe ọṅụ n’ọdịnihu

Mgbe ọ fọrọ obere ka Jizọs nwụọ, obi adịghị ndịozi ya mma. Jizọs kasiri ha obi. Ọ gwara ha, sị: “Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Nweenụ okwukwe n’ebe Chineke nọ, nweekwanụ okwukwe n’ebe mụ onwe m nọ.” Ọ gwakwara ha, sị: “Agaghị m ahapụ unu ka unu nọrọ dị ka ndị mmadụ nwụnahụrụ. M na-abịakwute unu.” (Jọn 14:1-4, 18, 27) Ihe ahụ Jizọs kwuru ga-eme ka ndị na-eso ụzọ ya niile e tere mmanụ nwee olileanya, tachiekwa obi. Ndị ọ na-agụsi agụụ ike ịhụ mgbe a ga-akpọlite ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ kwesịkwara inwe olileanya. Jehova na Ọkpara ya agaghị ahapụ gị. A ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. N’oge na-adịghị anya, ị ga-ahụ di gị ma ọ bụ nwunye gị ọnwụ ya wutere gị nke ukwuu.

^ para. 3 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.