Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) DISEMBA 2013

“Ụbọchị A Ga-abụrụ Unu Ihe Ncheta”

“Ụbọchị A Ga-abụrụ Unu Ihe Ncheta”

“Ụbọchị a ga-abụrụ unu ihe ncheta, unu ga-eme ya dị ka ememme a ga na-emere Jehova.”—ỌPỤ. 12:14.

1, 2. Olee ụbọchị kwesịrị ịdị Ndị Kraịst niile mkpa? Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?

ỤFỌDỤ ndị nwere ụbọchị ha na-echeta kwa afọ. O nwere ike ịbụ ụbọchị ha gbara akwụkwọ. Ndị ọzọ nwere ike cheta ụbọchị ihe dị mkpa mere n’obodo ha, dị ka ụbọchị obodo ha nweere onwe ya. Ma, ị̀ ma na e nwere ụbọchị otu mba chetarala ruo ihe karịrị puku afọ atọ na narị afọ ise?

2 Ọ bụ ụbọchị Ememme Ngabiga. Ọ bụ ụbọchị ahụ ka ndị Izrel ji echeta otú Chineke si napụta ha n’ohu ha nọ na-agba n’Ijipt. I kwesịrị iji Ememme Ngabiga ahụ kpọrọ ihe. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na e nwere ihe ụfọdụ dị mkpa mere o ji gbasa ndụ gị. I nwere ike iche, sị, ‘Ọ bụ ndị Juu na-eme Ememme Ngabiga. Mụnwa bụ Onye Kraịst. Gịnị mere ememme ahụ ga-eji gbasa m?’ A zara ajụjụ a n’ihe Pọl kwuru. Ọ sịrị: “A chụwo nwa atụrụ ememme ngabiga anyị n’àjà, ya bụ, Kraịst.” (1 Kọr. 5:7) Ihe ga-enyere anyị aka ịghọta ihe a o kwuru bụ ịmatakwu gbasara Ememme Ngabiga ahụ ndị Juu na-eme nakwa otú o si gbasa iwu e nyere Ndị Kraịst niile.

GỊNỊ MERE NDỊ IZREL JI NA-EME EMEMME NGABIGA?

3, 4. Olee ihe ndị merenụ tupu ndị Izrel emee Ememme Ngabiga mbụ ha mere?

3 N’ụwa niile, ọtụtụ nde ndị na-abụghị ndị Juu ma ihe mere tupu ndị Izrel emee Ememme Ngabiga mbụ ha mere. O nwere ike ịbụ na ha agụọla gbasara ya na Baịbụl n’akwụkwọ Ọpụpụ ma ọ bụ nụ ka ndị ọzọ na-akọ akụkọ ahụ, ma ọ bụkwanụ lee ya na fim.

4 Mgbe ndị Izrel gbara ohu n’Ijipt ọtụtụ afọ, Jehova gwara Mozis na nwanne ya Erọn ka ha gaa gwa Fero ka ọ hapụ ndị Izrel ka ha laa. Ma Fero dị mpako. N’ihi ya, o kweghị ahapụ ha. Ọ bụ ya mere Jehova ji tie ndị Ijipt ihe otiti iri. N’ihe otiti nke iri, e gburu nwa ọ bụla  e bu ụzọ mụọ n’ala Ijipt, malite na mmadụ ruo n’anụmanụ. Mgbe Chineke tichara ha ihe otiti nke iri ahụ, Fero hapụrụ ndị Izrel ka ha laa.—Ọpụ. 1:11; 3:9, 10; 5:1, 2; 11:1, 5.

5. Olee ihe Chineke gwara ndị Izrel ka ha mee tupu ya anapụta ha n’Ijipt? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

5 Ma, tupu Chineke anapụta ha, ọ gwara ha ihe ha ga-eme. Ihe ahụ mere n’oge opupu ihe ubi n’afọ 1513 Tupu Oge Ndị Kraịst, n’ọnwa ndị Hibru a na-akpọ Ebib. E mechara kpọwa ya ọnwa Naịsan. * Chineke kwuru na ndị Izrel ga-amalite n’abalị iri n’ọnwa ahụ jikerewe maka ihe ha ga-eme mgbe anyanwụ dachara n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan. Gịnị mere ọ ga-eji bụrụ mgbe anyanwụ dachara? Ọ bụ n’ihi na ụbọchị ndị Hibru na-amalite mgbe anyanwụ dara, kwụsịkwa mgbe anyanwụ dara. N’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan, ezinụlọ ọ bụla ga-egbu ebule ma ọ bụ mkpi, fesakwa ọbara ya n’awara ụzọ ha nakwa n’elu ọnụ ụzọ ụlọ ha. (Ọpụ. 12:3-7, 22, 23) Ezinụlọ ọ bụla ga-ahụ ebule ahụ n’ọkụ, rie ya na achịcha na-ekoghị eko na akwụkwọ nri na-elu ilu. Mmụọ ozi Chineke ga-agagharị n’ala Ijipt, gbuo nwa ọ bụla ndị Ijipt bu ụzọ mụọ. Ma, ọ bụrụ na ndị Izrel erube isi, o nweghị ihe ga-eme ụmụ ha bu ụzọ mụọ. E mechaa, Fero ga-ahapụ ha ka ha lawa.—Ọpụ. 12:8-13, 29-32.

6. Gịnị mere ndị Izrel ga-eji na-eme Ememme Ngabiga kwa afọ?

6 Chineke gwara ndị Izrel ka ha na-echeta ụbọchị ahụ ọ napụtara ha n’Ijipt. Ọ gwara ha, sị: “Ụbọchị a ga-abụrụ unu ihe ncheta, unu ga-eme ya dị ka ememme a ga na-emere Jehova n’ọgbọ unu niile. Unu ga-eme ya ka ọ bụrụ ụkpụrụ na-adịru mgbe a na-akaghị aka.” Ndị Izrel mechaa Ememme Ngabiga n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan, ha ga-emekwa ememme a na-akpọ Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko. A na-eme ememme ahụ abalị asaa. E nwere ike ịkpọ ihe niile e mere n’abalị asatọ ahụ Ememme Ngabiga. (Ọpụ. 12:14-17; Luk 22:1; Jọn 18:28; 19:14) Ememme Ngabiga so n’ememme ndị Izrel na-eme kwa afọ.—2 Ihe 8:13.

7. Olee ihe ọhụrụ Jizọs malitere mgbe ya na ndịozi ya mechara Ememme Ngabiga ikpeazụ?

7 Jizọs na ndịozi ya bụ ndị Juu. Ha rubeere Iwu Mozis isi. Ọ bụ ya mere ha ji mee Ememme Ngabiga ahụ a na-eme kwa afọ. (Mat. 26:17-19) Na nke ikpeazụ ha mere, Jizọs malitere ihe ọhụrụ ndị na-eso ụzọ ya ga na-eme kwa afọ. Ọ bụ Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Olee ụbọchị ha ga na-eme ya?

OLEE ỤBỌCHỊ JIZỌS NA NDỊOZI YA RIRI NRI ANYASỊ NKE ONYENWE ANYỊ?

8. Olee ajụjụ ụfọdụ ndị nwere ike ịjụ gbasara Ememme Ngabiga na Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?

8 Ebe ọ bụ na Jizọs malitere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị ozugbo ha mechara Ememme Ngabiga ikpeazụ ha mere, ọ pụtara na a ga na-eri Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’ụbọchị ahụ a na-eme Ememme Ngabiga. Ma, o nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na anyị mechaa Ncheta Ọnwụ Jizọs, otu ụbọchị ma ọ bụ karịa nwere ike ịgacha tupu ndị Juu nke oge a emee Ememme Ngabiga ha. Gịnị kpatara ya? Ihe so kpata ya bụ iwu Chineke nyere ndị Izrel. Mgbe Mozis kwuchara na “ọgbakọ dum nke nzukọ Izrel ga-egbu” ebule, o kwuru mgbe ha ga-egbu ya n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan.—Gụọ Ọpụpụ 12:5, 6.

9. Olee mgbe Ọpụpụ 12:6 kwuru na a ga-egbu ebule e ji eme Ememme Ngabiga? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ  “Olee Mgbe Ọ Ga-abụ ná Mgbede?”)

9 Ọpụpụ 12:6 kwuru na a ga-egbu ebule ahụ “ná mgbede.” Otú e si sụgharịa ya n’ụfọdụ Baịbụl nakwa na Baịbụl ndị Juu a kpọrọ Tanakh bụ “n’anyasị.” N’ihi ya, a ga-egbu ebule ahụ mgbe abalị  iri na anọ n’ọnwa Naịsan malitere, ya bụ, mgbe anyanwụ dachara, ma tupu chi ejie.

10. Olee mgbe ụfọdụ ndị chere a na-egbu ebule e ji eme Ememme Ngabiga? Olee ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ?

10 Ka oge na-aga, ndị Juu malitere ịkpụ ebule ndị ahụ aga n’ụlọ nsọ ka e gbuo ha. N’ihi ya, igbu anụ niile a ga-eji chụọ àjà na-ewe ọtụtụ awa. Ọ bụ ya mere na mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, ụfọdụ ndị Juu chere na Ọpụpụ 12:6 na-ekwu banyere ngwụcha abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan, ya bụ, n’agbata mgbe anyanwụ malitere ịda na mgbe anyanwụ dara. Ma, ọ bụrụ na ọ bụ ná ngwụcha abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan ka e gburu anụ ndị ahụ, oleezi mgbe ndị Izrel na-eri ha? E nwere otu prọfesọ bụ́ ọkachamara n’ihe gbasara ndị Juu oge ochie. Aha ya bụ Jonathan Klawans. Ọ sịrị na ọ bụ n’abalị iri na ise n’ọnwa Naịsan ka ndị Juu na-eri anụ ndị ahụ. Ma, o kwuru na Baịbụl ekwughị otú ahụ n’akwụkwọ Ọpụpụ. O kwukwara na ihe ndị rabaị dere akọwaghị otú ndị Juu si na-eme Ememme Ngabiga tupu afọ iri asaa nke Oge Ndị Kraịst, ya bụ, n’afọ ahụ e bibiri ụlọ nsọ dị na Jeruselem.

11. (a) Gịnị mere Jizọs n’ụbọchị Ememme Ngabiga nke afọ 33? (b) Gịnị mere Baịbụl ji kwuo na abalị iri na ise n’ọnwa Naịsan nke afọ 33 bụ ‘Ụbọchị Izu Ike nke ukwu’? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.)

11 N’ihi ya, anyị kwesịrị ịjụ, sị, Olee ụbọchị Jizọs na ndịozi ya mere Ememme Ngabiga nke afọ 33? N’abalị iri na atọ n’ọnwa Naịsan, Jizọs gwara Pita na Jọn, sị: “Gaanụ kwadebere anyị nri ememme ngabiga ka anyị rie.” (Luk 22:7, 8) N’echi ya, ya bụ, n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan, Jizọs na ndịozi ya riri nri Ememme Ngabiga. Ha riri ya mgbe anyanwụ dachara na Tọzdee. Mgbe ha richara, o gosiri ha otú a ga-esi na-eri Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. (Luk 22:14, 15) Ọ bụ n’abalị ahụ ka e jidere ya, kpeekwa ya ikpe. A kpọgidere Jizọs n’osisi ịta ahụhụ n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan, n’ihe dị ka n’elekere iri na abụọ nke ehihie. Ọ nwụrụ n’ehihie ụbọchị ahụ. (Jọn 19:14) N’ihi ya, Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà n’otu ụbọchị ahụ a na-egbu nwa atụrụ e ji eme Ememme Ngabiga. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na Kraịst bụ “nwa atụrụ ememme ngabiga anyị.” (1 Kọr. 5:7; 11:23; Mat. 26:2) Mgbe ọ fọrọ obere ka abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan gafee, e liri Jizọs, tupu a banye n’abalị iri na ise n’ọnwa Naịsan. *Lev. 23:5-7; Luk 23:54.

 I NWERE IKE ỊMỤTA IHE N’EMEMME NGABIGA

12, 13. Olee otú Ememme Ngabiga si gbasa ụmụaka ndị Izrel?

12 Ka anyị gaghachi n’ihe ahụ mere n’Ijipt. Mozis kwuru na ndị Izrel ga na-eme Ememme Ngabiga kwa afọ ruo “mgbe a na-akaghị aka.” E mewe ya, ụmụaka ga-ajụ ndị mụrụ ha ihe mere ha ji na-eme ya. (Gụọ Ọpụpụ 12:24-27; Diut. 6:20-23) N’ihi ya, ụmụaka nwere ike ịmụta ihe n’Ememme Ngabiga ahụ.—Ọpụ. 12:14.

13 Mgbe ụmụaka ahụ toro, ha ga-akọkwara ụmụ nke ha ihe ndị dị mkpa ha kwesịrị ịmụta n’Ememme Ngabiga ahụ. Otu n’ime ihe ha nwere ike ịmụta bụ na Jehova ga-echebeli ndị na-efe ya. Ụmụaka mụtara na Jehova bụ Chineke dị ndụ, nke na-echebe ndị ya, nakwa na ihe banyere ha na-emetụ ya n’obi. Jehova mere otú ahụ mgbe o tiri ndị Ijipt ihe otiti nke iri ma chebe ụmụ Izrel niile e bu ụzọ mụọ.

14. Gịnị ka Ndị Kraịst nwere ike iji ihe Baịbụl kọrọ banyere Ememme Ngabiga kụziere ụmụ ha?

14 Chineke enyeghị Ndị Kraịst iwu ka ha na-akọrọ ụmụ ha gbasara Ememme Ngabiga kwa afọ. Ma, ị̀ na-akụziri ha ihe Ememme Ngabiga kụziiri ụmụ Izrel, ya bụ na Chineke na-echebe ndị na-efe ya? Ị̀ na-eme ka ha ghọta na obi siri gị ike na Jehova ka na-echebe ndị ya taa? (Ọma 27:11; Aịza. 12:2) Ị̀ na-akụziri ha ya mgbe gị na ha weturu obi na-akparịta ụka, kama ịna-ekwu oké okwu? Gbalịsie ike ịna-akụziri ha ya ka ndị ezinụlọ gị nwee ike ịtụkwasịkwu Jehova obi.

Mgbe ị na-akọrọ ụmụ gị gbasara Ememme Ngabiga, olee ihe ndị ị ga-enyere ha aka ịmụta na ya? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

15, 16. Gịnị ka Ememme Ngabiga na ihe ndị a kọrọ n’akwụkwọ Ọpụpụ na-akụziri anyị banyere Jehova?

15 Ihe anyị nwere ike ịmụta n’Ememme Ngabiga abụghị naanị na Jehova ga-echebeli ndị na-efe ya. Ọ napụtakwara ndị Izrel, ‘kpọpụta ha n’ala Ijipt.’ Chegodị otú Jehova si mee ya. O ji ogidi igwe ojii na ogidi ọkụ na-edu ha. O kewara Oké Osimiri Uhie, ya adị ka nnukwu mgbidi abụọ, ha esi n’etiti ya gafee. Ozugbo ha gafechara, ha hụrụ ka mmiri ahụ kpuchiri ndị agha Ijipt. Ndị Izrel toro Jehova maka ịnapụta ha. Ha bụrụ abụ, sị: “Ka m bụkuo Jehova abụ . . . Ịnyịnya na onye na-agba ya ka ọ tụbaworo n’oké osimiri. Ike m na ume m ka Jaa bụ, ebe ọ bụụrụ m nzọpụta.”—Ọpụ. 13:14, 21, 22; 15:1, 2; Ọma 136:11-15.

16 Ọ bụrụ na i nwere ụmụ, ị̀ na-enyere ha aka ka ha tụkwasị Jehova obi na ọ ga-anapụta ndị na-efe ya? Ihe ndị ị na-agwa ha na mkpebi ndị ị na-eme hà na-eme ka ha ghọta na obi siri gị ike na Jehova ga-anapụta ndị na-efe ya? Mgbe unu na-enwe ofufe ezinụlọ, unu nwere ike ikwurịta ihe a kọrọ n’Ọpụpụ 12-15 na Ọrụ Ndịozi 7:30-36 ma ọ bụ Daniel 3:16-18, 26-28. Amaokwu ndị ahụ kọrọ otú Jehova si napụta ndị ya. Obi kwesịrị isi anyị niile ike na Jehova ga-anapụta anyị n’ọdịnihu otú ahụ o si napụta ndị Izrel n’oge ochie.—Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 1:9, 10.

 IHE ANYỊ GA NA-ECHETA

17, 18. Gịnị mere ọbara Jizọs ji baa uru karịa ọbara ebule ndị Izrel ji na-eme Ememme Ngabiga?

17 Ezigbo Ndị Kraịst anaghị eme Ememme Ngabiga ndị Juu na-eme. O so n’ihe Iwu Mozis kwuru ka a na-eme. Ma, anyị anaghịzi edebe Iwu ahụ. (Rom 10:4; Kọl. 2:13-16) Kama, ihe anyị na-echeta ugbu a bụ ọnwụ Ọkpara Chineke. Ma, anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe n’Ememme Ngabiga ahụ ndị Izrel malitere n’oge ha nọ n’Ijipt.

18 Ọbara ebule ahụ ụmụ Izrel fesara n’awara ụzọ ha nakwa n’elu ọnụ ụzọ ụlọ ha mere ka a ghara igbu ụmụ ha e bu ụzọ mụọ. Taa, anyị anaghị eji anụmanụ achụrụ Chineke àjà ma n’ụbọchị Ememme Ngabiga ma n’oge ọzọ. Ma, e nwere àjà ka mma nwere ike ime ka anyị dị ndụ ebighị ebi. Pọl onyeozi kwuru na ọ bụ ọbara Jizọs nke “a na-efesa efesa” ga-eme ka Ndị Kraịst e tere mmanụ dị ndụ ebighị ebi n’eluigwe. Ha bụ “ndị e bu ụzọ mụọ, bụ́ ndị e dere aha ha n’akwụkwọ n’eluigwe.” (Hib. 12:23, 24) Ọ bụkwa ọbara Jizọs mere ka atụrụ ọzọ nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Anyị niile kwesịrị ịna-echeta nkwa Chineke kwere anyị. Ọ sịrị: “E si n’aka ya jiri ihe mgbapụta tọhapụ anyị, site n’ọbara nke onye ahụ, ee, mgbaghara nke njehie anyị, dị ka obiọma ya dị ukwuu nke na-erughịrị mmadụ si dị.”—Efe. 1:7.

19. Gịnị ka ihe mere mgbe Jizọs nwụrụ na-akụziri anyị banyere amụma ọ bụla e buru na Baịbụl?

19 Mgbe ndị Izrel gburu ebule ha ji mee Ememme Ngabiga, a gwara ha agbajila ọkpụkpụ ya ọ bụla. (Ọpụ. 12:46; Ọnụ Ọgụ. 9:11, 12) Ma, à gbajiri ọkpụkpụ “Nwa Atụrụ Chineke,” bụ́ onye ji ndụ ya chụọ àjà ka ọ bụrụ ihe mgbapụta? (Jọn 1:29) A kpọgidere ya n’osisi ịta ahụhụ, kpọgidekwa ndị omekome abụọ, otu n’aka nri ya, otu n’aka ekpe ya. Ndị Juu rịọrọ Paịlet ka a kụjisịa ha ụkwụ ka ha nwụọ ngwa ngwa. Ọ ga-eme ka ha ghara ịnọ n’elu osisi ahụ a banye n’abalị iri na ise n’ọnwa Naịsan, nke bụ́ Ụbọchị Izu Ike nke ukwu. Ndị agha kụjisịrị ndị omekome abụọ ahụ ụkwụ. “Ma mgbe ha rutere n’ebe Jizọs nọ, ha akụjisịghị ya ụkwụ n’ihi na ha hụrụ na ọ nwụọla.” (Jọn 19:31-34) Otú ahụ a na-agbajighị ọkpụkpụ ebule ahụ e ji eme Ememme Ngabiga bụkwa otú a na-agbajighị ọkpụkpụ Jizọs. N’ihi ya, ebule ahụ e ji mee Ememme Ngabiga nọchiri anya àjà Jizọs chụrụ n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan nke afọ 33. (Hib. 10:1) Ihe a merenụ mezuru ihe e kwuru n’Abụ Ọma 34:20. O kwesịrị ime ka obi sie anyị ike na amụma ọ bụla e buru na Baịbụl ga-emezu.

20. Olee otú Ememme Ngabiga si dị iche ná Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?

20 Ma, e nwere ihe dị iche n’otú ndị Juu si eme Ememme Ngabiga na otú Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha si na-eri Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Dị ka ihe atụ, ndị Izrel ga-eri naanị anụ ebule ahụ. Ma, ha agaghị aṅụ ọbara ya. Ọ dị iche n’ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya. O kwuru na ọ bụ ndị ga-eso ya chịa “n’alaeze Chineke” ga-ata achịcha Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, ṅụọkwa mmanya ya na ya so. Achịcha ahụ nọchiri anya ahụ́ Jizọs, ebe mmanya ahụ nọchiri anya ọbara ya. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-amụkwu banyere Ncheta Ọnwụ Kraịst.—Mak 14:22-25.

21. Gịnị mere anyị ji kwesị ịma banyere Ememme Ngabiga?

21 Ndị ohu Jehova n’oge ochie anaghị eji Ememme Ngabiga egwu egwu. E nwekwara ọtụtụ ihe onye ọ bụla n’ime anyị ga-amụta na ya. Ọ bụ eziokwu na ọ bụ ndị Juu ‘na-echeta’ Ememme Ngabiga, anyịnwa bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịma banyere ya ma mụta ihe bara ezigbo uru na ya n’ihi na “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke.”—2 Tim. 3:16.

^ para. 5 A na-akpọbu ọnwa mbụ ndị Juu ahụ Ebib. Ma, ha mechara kpọwa ya Naịsan mgbe ha si Babịlọn lọta. N’isiokwu a, anyị ga-akpọ ya Naịsan.

^ para. 11 E mechaa Ememme Ngabiga, echi ya na-abụ abalị iri na ise n’ọnwa Naịsan. Ọ bụ ya bụ ụbọchị mbụ nke Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko. Ọ na-abụ ụbọchị izu ike. Ma ọ dabara na n’afọ 33, abalị iri na ise n’ọnwa Naịsan bụ Satọdee, nke pụtara na ọ bụ ụbọchị izu ike. Ma, ebe ọ bụkwa ya bụ ụbọchị mbụ nke Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko, ọ pụtara na Ụbọchị Izu Ike abụọ dabara n’otu ụbọchị. Ọ bụ ya mere abalị iri na ise n’ọnwa Naịsan ji bụrụ ‘Ụbọchị Izu Ike nke ukwu.’—Gụọ Jọn 19:31, 42.