Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) NỌVEMBA 2013

Ole Ndị Taa Bụ Ndị Ọzụzụ Atụrụ Asaa na Ndị Isi Asatọ?

Ole Ndị Taa Bụ Ndị Ọzụzụ Atụrụ Asaa na Ndị Isi Asatọ?

“Anyị ga-eme ka ndị ọzụzụ atụrụ asaa, ee, ndị isi asatọ n’etiti ụmụ mmadụ, bilie imegide ya.”—MAỊ. 5:5.

1. Gịnị mere nkata eze Siria na eze Izrel kpara ga-eji kụọ afọ n’ala?

N’IHE dị ka narị afọ asaa na iri ise Tupu Oge Ndị Kraịst, eze Izrel na eze Siria malitere ịlụso alaeze Juda agha. Gịnị ka ha bu n’obi? Ha bu n’obi ịlụso Jeruselem agha, napụ Eze Ehaz ọchịchị ma were onye ọzọ dochie ya. Onye ahụ nwere ike ọ gaghị esi n’ezinụlọ Eze Devid. (Aịza. 7:5, 6) Eze Izrel kwesịrị ịma na ihe ahụ ha bu n’obi agaghị enwe isi. Jehova kwere nkwa na onye a ga-ahọpụta ka ọ bụrụ eze na Juda ga-esirịrị n’agbụrụ Devid. Ihe ọ bụla Jehova kwuru ga-emezurịrị.—Jọsh. 23:14; 2 Sam. 7:16.

2-4. Olee otú Aịzaya 7:14, 16 si mezuo (a) n’oge Aịzaya? (b) n’oge Jizọs?

2 Ná mmalite, ọ dị ka eze Siria na eze Izrel hà ga-emeri n’agha ahụ. Naanị n’otu agha ha lụrụ, ndị agha Ehaz e gburu dị otu narị puku na iri puku abụọ. E gburu Measaya, bụ́ “nwa eze.” (2 Ihe 28:6, 7) Ma Jehova hụrụ ihe na-emenụ. O chetara nkwa o kwere Devid. Ọ bụ ya mere o ji gwa Aịzaya onye amụma ka ọ gaa gbaa Eze Ehaz ume.

3 Aịzaya kwuru, sị: “Lee! Nwa agbọghọ ahụ ga-atụrụ ime, ọ ga-amụkwa nwa nwoke, ọ ga-agụ ya Ịmanuel. . . . Tupu nwa okoro ahụ amụta ịjụ ihe ọjọọ na ịhọrọ ihe ọma, a ga-agbahapụ ala nke ndị eze abụọ ahụ kpamkpam, [ya bụ, eze Siria na eze Izrel] bụ́ ndị ị na-atụ ụjọ nke ukwuu.” (Aịza. 7:14, 16) Ihe mbụ e kwuru n’amụma ahụ gbasara otú a ga-esi amụ Mesaya. (Mat. 1:23) Ma, ebe ọ bụ na “ndị eze abụọ ahụ,” ya bụ, eze Siria na eze Izrel, alụsoghị Juda agha n’oge Jizọs, ọ ga-abụrịrị na mgbe mbụ amụma ahụ Aịzaya buru banyere Ịmanuel mezuru bụ n’oge Aịzaya.

4 Obere oge ka Aịzaya buchara amụma ahụ dị  mkpa, nwunye ya tụụrụ ime, mụọ nwa nwoke, a gụọ ya Meha-shalal-hash-baz. O nwere ike ịbụ ya bụ “Ịmanuel” ahụ Aịzaya kwuru gbasara ya. * N’oge Baịbụl, e nwere ike ịgụ nwatakịrị aha mgbe a mụrụ ya, ka e nwee ike iji ya cheta ihe dị mkpa merenụ. Ma, e mechaa, papa ya na mama ya na ndị ikwu ya ana-akpọ ya aha ọzọ. (2 Sam. 12:24, 25) E nweghị ihe gosiri na ndị mmadụ kpọrọ Jizọs Ịmanuel.—Gụọ Aịzaya 7:14; 8:3, 4.

5. Olee nzuzu Eze Ehaz zuzuru?

5 Ka ndị Izrel na ndị Siria nọ na-achọ otú ha ga-esi alụso Juda agha, ndị Asiria nọkwa na-eche otú ha ga-esi eweghara Juda. Ndị Asiria anaghị eme ebere. Ha nọ na-esikwu ike kwa ụbọchị. Aịzaya 8:3, 4 kwuru na ndị Asiria ga-eburu “akụ̀ Damaskọs” na “ihe a kwatara na Sameria” tupu ha alụso Juda agha. Ehaz kwesịrị ịtụkwasị ihe Chineke si n’ọnụ Aịzaya kwuo obi. Kama ime otú ahụ, ya na ndị Asiria gbara ndụ. Ọ bụ ya mere ndị Asiria ji mechaa chiwe ndị Juda ọnụ n’ala. (2 Eze 16:7-10) Ebe Ehaz bụ onye ọzụzụ atụrụ, ya bụ, eze Juda, o kwesịrị ichebe ndị ọ na-achị. Ma o meghị otú ahụ. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘E nwee ihe dị mkpa m chọrọ ikpebi, m̀ na-atụkwasị Chineke obi, ka m̀ na-atụkwasị ndị mmadụ obi?’—Ilu 3:5, 6.

ONYE ỌZỤZỤ ATỤRỤ ỌZỌ EMEGHỊ KA EHAZ

6. Gịnị dị iche n’ọchịchị Ehaz na nke Hezekaya?

6 Ehaz nwụrụ n’afọ 746 Tupu Oge Ndị Kraịst, nwa ya bụ́ Hezekaya aghọọ eze nọchiri ya. Ma, n’oge ahụ, ndị Juda adaala ogbenye. Ha akwụsịkwala ife Jehova. Mgbe Hezekaya ghọrọ eze, olee ihe mbụ o mere? Ọ̀ bụ ịchọta otú ọ ga-esi mee ka ndị Juda baa ọgaranya ọzọ? Mba. Hezekaya hụrụ Jehova n’anya, bụrụkwa ezigbo onye ọzụzụ atụrụ. N’ihi ya, ihe mbụ o mere bụ inyere ndị Juda aka ka ha maliteghachi ife Jehova. Mgbe Hezekaya ghọtara ihe Chineke chọrọ ka o mee, o mere ya ozugbo. Ihe ahụ o mere na-akụziri anyị ezigbo ihe taa.—2 Ihe 29:1-19.

7. Gịnị mere o ji dị mkpa ka eze ọhụrụ mee ka obi sie ndị Livaị ike na ya ga na-akwado ha?

7 Ndị Livaị kwesịrị inyere ndị Juda aka ka ha maliteghachi ife Jehova. Ọ bụ ya mere Hezekaya ji kpọọ ha, mee ka obi sie ha ike na ya ga-akwado ha. Weregodị ya na ị na-ahụ ndị Livaị n’ebe ahụ ha na Hezekaya nọ. Obi dị ha ezigbo ụtọ mgbe eze gwara ha, sị: “Ọ bụ unu ka Jehova họọrọ ka unu na-eguzo n’ihu ya ijere ya ozi.” (2 Ihe 29:11) E nyere ndị Livaị iwu ka ha nyere ndị Juda aka ka ha fewekwa Chineke.

8. Olee ihe ndị ọzọ Hezekaya mere iji nyere ndị Juda aka ịmaliteghachi ife Jehova? Olee uru ọ baara ha?

8 Hezekaya kpọrọ ndị Juda niile na ndị Izrel ka ha bịa mee Ememme Ngabiga. Mgbe e mechara ememme ahụ, ha mere Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko a na-eme abalị asaa. Otú ememme ahụ si tọọ ha ezigbo ụtọ mere ka ha mee ya abalị asaa ọzọ. Baịbụl kwuru, sị: “E wee ṅụrịa oké ọṅụ na Jeruselem, n’ihi na e nwetụbeghị nke dị ka nke a na Jeruselem malite n’ụbọchị Sọlọmọn nwa Devid eze Izrel.” (2 Ihe 30:25, 26) Ọ ga-abụrịrị na ememme ahụ gbara ha niile ezigbo ume. Ihe E Mere nke Abụọ isi iri atọ na otu, amaokwu nke mbụ, kwuru, sị: “Ozugbo ha mechara ihe a dum, . . . ha wee kụrisịa ogidi nsọ dị iche iche, gbutusịakwa ogwe osisi ndị dị nsọ ma kwatuo ebe ndị dị elu na ebe ịchụàjà.” Ndị Juda si otú ahụ  malitekwa ife Jehova. Ihe ahụ ha mere nyeere ha aka ijikere ejikere maka nsogbu ga-abịara ha n’oge na-adịghị anya.

OTÚ HEZEKAYA SI JIKERE MAKA NSOGBU

9. (a) Olee otú e si kụghasịa nkata ndị Izrel kpara? (b) Obodo ole ka Senakerib meriri na Juda?

9 Ihe Aịzaya kwuru mezuru. Ndị Asiria meriri alaeze ebe ugwu nke Izrel, dọrọkwa ndị bi na ya n’agha laa n’obodo ha. E si otú ahụ kụghasịa nkata ahụ ndị Izrel kpara ime ka onye na-esighị n’agbụrụ Devid bụrụ eze Juda. Gịnịzi ka ndị Asiria bu n’obi ime? Ha bịara ka ha merie Juda. Baịbụl kwuru, sị: “N’afọ nke iri na anọ nke ọchịchị Eze Hezekaya, Senakerib eze Asiria gbagotere buso obodo niile e wusiri ike ndị dị na Juda agha, wee weghara ha.” Senakerib meriri iri obodo anọ na isii dị na Juda. Chegodị otú obi gaara adị gị ma a sị na i bi na Jeruselem n’oge ahụ. Ndị agha Asiria nọ na-emeri obodo ndị dị na Juda n’ike n’ike, ya afọ obere ka ha rute Jeruselem.—2 Eze 18:13.

10. Gịnị mere e nwere ike iji kwuo na amụma ahụ e buru na Maịka 5:5, 6 gbara Hezekaya ume?

10 Hezekaya ma na agwọ nọ n’akịrịka, ma ọ tụghị ụjọ. Ọ gakwurughị ndị mba ọzọ na-ekpere arụsị ka ha gbatara ya ọsọ enyemaka otú ahụ Ehaz nna ya mere. Kama ime otú ahụ, ọ tụkwasịrị Jehova obi. (2 Ihe 28:20, 21) O nwere ike ịbụ na ọ ma ihe Jehova si n’ọnụ Maịka onye amụma kwuo banyere Asiria. Maịka kwuru, sị: “Ma mgbe onye Asiria batara n’ala anyị, . . . anyị ga-eme ka ndị ọzụzụ atụrụ asaa, ee, ndị isi asatọ n’etiti ụmụ mmadụ, bilie imegide ya. Ha ga-ejikwa mma agha zụọ ala Asiria dị ka atụrụ.” (Maị. 5:5, 6) Ọ ga-abụrịrị na ihe ahụ Jehova kwuru gbara Hezekaya ume n’ihi na o gosiri na ọ ga-eji ndị agha pụrụ iche lụso ndị Asiria ahụ bụ́ ndị iro ha agha, meriekwa ha.

11. Olee mgbe amụma ahụ e buru banyere ndị ọzụzụ atụrụ asaa na ndị isi asatọ ga-akacha mezuo?

11 Mgbe amụma ahụ e buru banyere ndị ọzụzụ atụrụ asaa na ndị isi asatọ ga-akacha emezu bụ mgbe a mụchara Jizọs, bụ́ ‘onye ọchịchị n’Izrel, onye malitere n’oge ochie.’ (Gụọ Maịka 5:1, 2.) Nke bụ́ eziokwu bụ na amụma a ga-emezu n’ọdịnihu mgbe onye iro ga-alụso  ndị ohu Jehova ọgụ otú ahụ ndị Asiria mere n’oge ochie. Jehova ga-eji ndị agha Ọkpara ya na-edu merie onye iro ahụ. Ole ndị bụ ndị agha ahụ? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu a. Ma, ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe Hezekaya mere mgbe ndị Asiria bịara ịlụso ha agha.

HEZEKAYA MERE IHE O KWESỊRỊ IME

12. Gịnị ka Hezekaya na ndị o mere ndị isi na ndị dike ya mere, ka ha nwee ike ichebe ndị Chineke?

12 Jehova dị njikere mgbe niile imere anyị ihe anyị na-agaghị emeliri onwe anyị. Ma, ọ na-atụ anya ka anyị mee ihe niile anyị nwere ike ime. Hezekaya mere ihe o nwere ike ime. Ọ kpọrọ “ndị o mere ndị isi na ndị dike ya,” ya na ha ekpebie “ikpochi iyi ha ndị dị ná mpụga obodo ahụ . . . O nwekwara obi ike wee wuzie mgbidi dum a kwaturu akwatu ma wuo ụlọ nche n’elu ya. O wukwara mgbidi ọzọ n’ihu nke ochie, . . . ọ rụkwara ọtụtụ ube na ọta.” (2 Ihe 32:3-5) Jehova si n’aka Hezekaya, ndị isi, na ndị amụma kwesịrị ntụkwasị obi chebe ndị ya ma zụọ ha n’oge ahụ ha nọ ná nsogbu.

13. Olee ihe kacha mkpa Hezekaya mere iji mee ka ndị obodo ya jikere ejikere maka ọgụ ndị Asiria ga-abịa ịlụso ha? Olee otú ihe Hezekaya gwara ha si nyere ha aka?

13 Ihe ọzọ Hezekaya mere kadị ikpochi iyi na ịrụzi mgbidi obodo ahụ mkpa. Ebe ọ bụ ezigbo onye ọzụzụ atụrụ, ọ kpọkọtara ndị Izrel ma gwa ha okwu gbara ha ume. Ọ sịrị ha: “Unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ n’ihi eze Asiria nakwa n’ihi ìgwè mmadụ so ya; n’ihi na ndị nọnyeere anyị karịrị ndị nọnyeere ya. Ogwe aka nke nọnyeere ya bụ anụ ahụ́, ma, ọ bụ Jehova bụ́ Chineke anyị nọnyeere anyị inyere anyị aka na iburu anyị agha.” Hezekaya chetaara ndị Izrel na Jehova ga-alụrụ ha agha. Mgbe ha nụrụ ihe a ọ gwara ha, “ha wee malite inwe obi ike n’ihi ihe Hezekaya eze Juda kwuru.” Cheta na ọ bụ ihe a Hezekaya gwara ha mere ka obi sie ha ike. Hezekaya na ndị o mere ndị isi na ndị dike ya nakwa Maịka onye amụma na Aịzaya onye amụma gosiri na ha bụ ezigbo ndị ọzụzụ atụrụ, otú ahụ Jehova si n’ọnụ onye amụma ya kwuo.—2 Ihe 32:7, 8; gụọ Maịka 5:5, 6.

Ihe Hezekaya gwara ndị Chineke mere ka obi sie ha ike (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 na 13)

14. Gịnị ka Rabshake mere? Gịnị ka ndị Juu mere?

14 Eze Asiria na ndị agha ya mara ụlọikwuu ha na Lekish, n’agbata ebe ndịda na ebe ọdịda anyanwụ Jeruselem. O si ebe ahụ dunye mmadụ atọ ka ha gaa gwa ndị bi na Jeruselem ka ha chịlie aka elu. Onyeisi ndị ozi ahụ bụ otu nwoke a na-akpọ Rabshake. O ji asụsụ Hibru gwa ndị bi na Jeruselem ka ha ghara ige Eze Hezekaya ntị, kama ka ha rubere ndị Asiria isi. O kwere ha nkwa na eze Asiria ga-akpọga ha n’ala ọzọ ebe ha ga na-ekpori ndụ. Ma, ihe ahụ o kwuru bụ ụgha. (Gụọ 2 Ndị Eze 18:31, 32.) Rabshake kwukwara na ebe ọ bụ na chi mba ndị ọzọ ha meriri echebeghị ndị na-efe ha, na Jehova agaghị anapụtali ndị Juu n’aka ndị Asiria. N’agbanyeghị ụgha ahụ niile ọ ghara, ndị Juu ahụ atụpụrụghị ya ọnụ. Ndị na-efe Jehova na-emekarị otú ahụ taa.—Gụọ 2 Ndị Eze 18:35, 36.

15. Gịnị ka ndị bi na Jeruselem kwesịrị ime? Olee otú Jehova si chebe obodo ahụ?

15 O doro anya na obi erughị Hezekaya ala. Ma, kama ịgakwuru mba ọzọ ka ha nyere ha aka, o si n’aka Aịzaya onye amụma rịọ ka Jehova nyere ha aka. Aịzaya gwara Hezekaya banyere eze Asiria, sị: “Ọ gaghị abata n’obodo a, ọ gaghịkwa agba otu akụ́ n’ime ya.” (2 Eze 19:32) Naanị ihe ndị bi na Jeruselem ga-eme bụ inwe obi ike ma ghara ịda mbà. Jehova ga-alụrụ ha ọgụ. O mekwara otú ahụ.  Baịbụl kwuru, sị: “O wee ruo n’abalị ahụ na mmụọ ozi Jehova gara gbuo otu narị puku na iri puku mmadụ asatọ na puku ise n’ebe ndị Asiria mara ụlọikwuu.” (2 Eze 19:35) Ihe mere ka e chebe ndị Juda abụghị na Hezekaya kpochiri iyi ndị dị n’obodo ahụ, rụziekwa mgbidi ya, kama ọ bụ n’ihi na Jehova nyeere ha aka.

IHE ANYỊ KWESỊRỊ ỊMỤTA

16. Ole ndị taa bụ (a) ndị Jeruselem (b) “onye Asiria” (ch) ndị ọzụzụ atụrụ asaa na ndị isi asatọ?

16 Amụma ahụ e buru banyere ndị ọzụzụ atụrụ asaa na ndị isi asatọ kacha emezu n’oge anyị a. N’oge ochie, ndị Asiria lụsoro ndị bi na Jeruselem ọgụ. N’oge na-adịghị anya, onye iro ga-alụso ndị ohu Jehova ọgụ otú ahụ ndị Asiria mere n’oge ochie. Ihe mere ọ ga-eji alụso ha ọgụ bụ ka o kpochapụ ha. Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara ọgụ a onye iro ga-alụso ndị Chineke. O kwukwara na “Gọg nke ala Megọg,” “eze ugwu,” na “ndị eze nke ụwa” ga-alụso ndị Chineke ọgụ. (Ezik. 38:2, 10-13; Dan. 11:40, 44, 45; Mkpu. 17:14; 19:19) Ọ̀ bụ n’oge dị iche iche ka a ga-alụso ha ọgụ a? Anyị amaghị. O nwere ike ịbụ na Baịbụl ji aha dị iche iche na-akọwa ọgụ ahụ a ga-alụso ndị Chineke. Ole ndị bụ ndị agha ahụ Jehova ga-eji lụso onye iro a obi fere azụ ọgụ? Ha ga-abụ ndị agha pụrụ iche. Baịbụl kwuru na ha ga-abụ “ndị ọzụzụ atụrụ asaa,” na “ndị isi asatọ.” (Maị. 5:5) Ole ndị ka ha bụ? Ha bụ ndị okenye. (1 Pita 5:2) Taa, Jehova na-eji ọtụtụ ndị okenye kwesịrị ntụkwasị obi azụ ndị ya. O jikwa ha na-enyere ha aka ijikere nke ọma maka ọgụ onye iro ga-alụso ha n’ọdịnihu. * Maịka buru amụma na ‘ha ga-eji mma agha zụọ ala Asiria dị ka atụrụ.’ (Maị. 5:6) Otu n’ime ngwá agha ha ga-eji merie onye iro ahụ bụ “mma agha nke mmụọ nsọ,” ya bụ, Okwu Chineke.—2 Kọr. 10:4; Efe. 6:17.

17. Olee ihe anọ ndị okenye nwere ike ịmụta n’ihe anyị tụlere n’isiokwu a?

17 Ndị okenye, o nwere ihe anọ unu kwesịrị ịmụta n’ihe anyị tụlerela n’isiokwu a. Nke mbụ bụ na unu kwesịrị ijikere ejikere maka ọgụ onye iro ga-alụso anyị n’ọdịnihu. Otú unu ga-esi eme ya bụ ịna-eme ka okwukwe unu sikwuo ike na ịna-enyere ụmụnna ndị ọzọ aka ime otú ahụ. Ihe nke abụọ bụ na obi kwesịrị isi unu ezigbo ike na Jehova ga-azọpụta anyị mgbe onye iro ga-alụso anyị ọgụ. Nke atọ bụ na mgbe ahụ a ga-alụso anyị ọgụ, nzukọ Jehova nwere ike ịgwa anyị mee ihe anyị na-emetụbeghị ma ọ bụ ihe anyị chere na anyị agaghị emeli. Ma, anyị niile kwesịrị ịgba mbọ mee ihe ọ bụla a gwara anyị, ọ bụrụgodị na anyị chere na ihe ahụ adịghị mkpa. Ihe mere anyị ji kwesị ime ihe ndị ahụ bụ na ha ga-eme ka anyị dị ndụ. Nke anọ abụrụ na onye ọ bụla obi ya niile dị n’agụmakwụkwọ ụwa, n’akụnụba, ma ọ bụ n’òtù dị iche iche e nwere n’ụwa taa kwesịrị ịgbanwe obi ya ugbu a. Unu kwesịrị ịmụrụ anya ka unu nwee ike inyere ndị okwukwe ha na-esichaghị ike aka.

18. Olee otú icheta ihe anyị tụlere n’isiokwu a ga-esi nyere anyị aka n’ọdịnihu?

18 Oge ga-eru mgbe ọ ga-adị ka e nweghị onye ga-enyere ndị na-efe Chineke aka otú ahụ ọ dị ndị bi na Jeruselem n’oge Hezekaya. N’oge ahụ, ihe Hezekaya kwuru nwere ike ime ka okwukwe anyị sie ike. Ka anyị cheta na ‘ogwe aka nke nọnyeere ndị iro anyị bụ anụ ahụ́, ma, ọ bụ Jehova bụ́ Chineke anyị nọnyeere anyị inyere anyị aka na iburu anyị agha.’—2 Ihe 32:8.

^ para. 4 Okwu Hibru e si sụgharịta “nwa agbọghọ” n’Aịzaya 7:14 nwere ike ịpụta ma nwaanyị lụrụla di ma nwa agbọghọ na-amaghị nwoke. N’ihi ya, e nwere ike ịkpọ ma nwunye Aịzaya ma onye Juu ahụ na-amaghị nwoke bụ́ Meri “nwa agbọghọ.”

^ para. 16 Mgbe ọ bụla Baịbụl kwuru na ihe dị asaa, ọ pụtara na ihe ahụ zuru ezu. O kwuo mgbe ụfọdụ na ihe dị asatọ, ọ pụtara na ihe ahụ hiri ezigbo nne.