Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) NỌVEMBA 2013

Na-erubere Ndị Na-azụ Atụrụ Jehova Isi

Na-erubere Ndị Na-azụ Atụrụ Jehova Isi

“Na-eruberenụ ndị na-edu ndú n’etiti unu isi, na-anọkwanụ n’okpuru ha, n’ihi na ha na-eche mkpụrụ obi unu nche.”—HIB. 13:17.

1, 2. Gịnị mere Jehova ji jiri onwe ya tụnyere onye na-azụ atụrụ?

JEHOVA ji onwe ya tụnyere onye na-azụ atụrụ. (Ezik. 34:11-14) Ihe a o mere na-enyere anyị aka ịghọta ụdị onye ọ bụ. Onye na-azụ atụrụ nke hụrụ atụrụ ya n’anya ghọtara na ndụ atụrụ ya dị ya n’aka nakwa na ya kwesịrị ịna-elekọta ha. Ọ na-eduga ha n’ebe ha ga-ata nri na ebe ha ga-aṅụ mmiri. (Ọma 23:1, 2) Ọ na-eche ha nche ehihie na abalị. (Luk 2:8) Ọ na-agba mbọ ka anụ ọhịa ghara ịdọgbu ha. (1 Sam. 17:34, 35) Ọ na-ekuru ndị nke a mụrụ ọhụrụ. (Aịza. 40:11) Ọ na-achọ ndị nke furu efu, na-elekọtakwa ndị merụrụ ahụ́.—Ezik. 34:16.

2 Ọtụtụ ndị Izrel oge ochie bụ ndị ọzụzụ atụrụ na ndị ọrụ ugbo. N’ihi ya, ha ghọtara ihe mere Jehova ji jiri onwe ya tụnyere onye ọzụzụ atụrụ. Ha ma na e kwesịrị ịna-elekọta atụrụ mgbe niile n’ihi na ọ ga-eme ka ahụ́ na-adị ya mma. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị ụmụ mmadụ. Jehova kwesịrị ịna-elekọta ha ma na-eduzi ha. (Mak 6:34) Ụmụ mmadụ ga-ata ahụhụ ma ọ bụrụ na Jehova anaghị elekọta ha ma na-eduzi ha. Ha agaghị ama ihe ọma na ihe ọjọọ. O nweghịkwa onye ga-echebe ha, ha adịzie “ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (1 Eze 22:17) Ma, Jehova na-egboro ndị na-efe ya mkpa ha.

3. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 Anyịnwa ghọtakwara ihe mere Jehova ji jiri onwe ya tụnyere onye na-azụ atụrụ. Ọ na-elekọta ndị niile na-efe ya. Ka anyị tụlee otú o si na-eduzi anyị ma na-elekọta anyị. Anyị ga-atụlekwa ihe anyị ga-eme ka otú Jehova si na-eduzi anyị ma na-elekọta anyị baara anyị uru.

ONYE ỌZỤZỤ ATỤRỤ ỌMA HỌPỤTARA NDỊ GA NA-ENYERE YA AKA

4. Olee otú Jizọs si elekọta atụrụ Jehova?

4 Jehova ahọpụtala Jizọs ka ọ bụrụ Onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst. (Efe. 1:22, 23) Jizọs bụ “onye ọzụzụ atụrụ  ọma.” Ọ hụrụ atụrụ ya n’anya, na-elekọtakwa ha otú ahụ Nna ya na-eme. Ọ tọgbọdịrị “mkpụrụ obi ya n’ihi atụrụ ya.” (Jọn 10:11, 15) Àjà ahụ ọ chụrụ baara ndị mmadụ ezigbo uru. (Mat. 20:28) Nzube Jehova bụ ka a ghara ‘ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na Jizọs, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.’—Jọn 3:16.

5, 6. (a) Ole ndị ka Jizọs họọrọ ka ha na-elekọta atụrụ ya? Gịnị ka anyị ga-eme ka ndokwa a Jizọs mere baara anyị uru? (b) Olee ihe kacha mkpa mere anyị ji kwesị ịna-erubere ndị okenye isi?

5 Olee otú anyị ga-esi gosi na ọ bụ Jizọs Kraịst na-azụ anyị dị ka atụrụ? Jizọs kwuru, sị: “Atụrụ m na-ege ntị n’olu m, amakwaara m ha, ha na-esokwa m.” (Jọn 10:27) Otú anyị si ege ntị n’olu Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma bụ ịna-eme ihe o kwuru mgbe niile. Ọ pụtara na anyị ga na-erubere ndị ọ họpụtara ka ha nyere ya aka na-azụ atụrụ ya isi. Jizọs kwuru na ndịozi ya na ndị na-eso ụzọ ya ga na-arụ ọrụ ahụ ọ malitere. Ha ga “na-ezi” ụmụ atụrụ ya ihe, ‘na-azụkwa’ ha. (Mat. 28:20; gụọ Jọn 21:15-17.) Ka ha na-ekwusa ozi ọma, ọtụtụ ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Ọ bụ ya mere Jizọs ji mee ka e nwee ndị ọzụzụ atụrụ aka kara ga na-elekọta ọgbakọ ya.—Efe. 4:11, 12.

6 Mgbe Pọl onyeozi na-agwa ndị okenye nọ n’ọgbakọ Efesọs okwu, ọ gwara ha na ọ bụ mmụọ nsọ họpụtara ha ka ha bụrụ ndị nlekọta ga “na-azụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ.” (Ọrụ 20:28) Ọ bụ mmụọ nsọ họpụtakwara ndị okenye taa. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’Akwụkwọ Nsọ e dere n’ike mmụọ nsọ ka e kwuru ihe ụmụnna nwoke ga-eme ka ha nwee ike iru eru ịbụ ndị okenye. Ha mere ihe ndị ahụ tupu a họpụta ha. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ana-erubere ndị okenye isi, anyị na-egosi na anyị na-akwanyere Jehova na Jizọs ùgwù. Ọ bụ ha bụ Ndị Ọzụzụ Atụrụ kachanụ. (Luk 10:16) Ọ bụ ya bụ ihe kacha mkpa mere anyị ji erubere ndị okenye isi. Ma, e nwere ihe ndị ọzọ mere anyị ji kwesị ịna-erubere ha isi.

7. Olee otú ndị okenye si enyere gị aka ka gị na Jehova dịkwuo ná mma?

7 Ndị okenye chọọ ịgba ụmụnna ha ume ma ọ bụ nye ha ndụmọdụ, ha na-agwa ha ihe si na Baịbụl. Ihe mere ha ji eme otú ahụ abụghị ka ha na-atụrụ ụmụnna ha ihe ha ga-eme. (2 Kọr. 1:24) Kama, ọ bụ ka ha na-enyere ha aka iji ihe Baịbụl kwuru ekpebi ihe ha na-eme. Ndị okenye na-esi otú ahụ eme ka udo dịrị n’ọgbakọ, ụmụnna adịrịkwa n’otu. (1 Kọr. 14:33, 40) Baịbụl kwuru na ndị okenye ‘na-eche mkpụrụ obi anyị nche.’ Ihe ọ pụtara bụ na ha chọrọ inyere onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ aka ka ya na Jehova dịrị ná mma. Ọ bụ ya mere na mgbe ọ bụla ha chọpụtara na e nwere nwanna chọrọ ‘ịzọhie ụkwụ,’ ma ọ bụdị na ọ zọhiela ụkwụ azọhie, ha na-enyere ya aka ozugbo. (Gal. 6:1, 2; Jud 22) Ọ̀ bụ na ihe ndị a ekwesịghị ime ka anyị ‘na-erubere ndị na-edu ndú isi’?—Gụọ Ndị Hibru 13:17.

8. Olee otú ndị okenye si echebe atụrụ Chineke?

8 Pọl onyeozi bụ ezigbo onye ọzụzụ atụrụ. Ọ gwara ụmụnna nọ na Kọlọsi, sị: “Nọrọnụ na nche: ma eleghị anya, a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu, dị ka ọdịnala mmadụ si dị, dị ka ihe ndị mbụ nke ụwa si dị, ọ bụghị dị ka Kraịst si dị.” (Kọl. 2:8) Ihe a Pọl kwuru bụ ihe ọzọ mere anyị kwesịrị iji na-erubere ndị okenye isi. Ha na-echebe anyị ka ndị ọjọọ ghara  iduhie anyị. Pita onyeozi dọrọ Ndị Kraịst ibe ya aka ná ntị na “ndị amụma ụgha” na “ndị ozizi ụgha” ga-achọ otú ha ga-esi mee ka “mkpụrụ obi ndị na-akwụsighị ike” nupụrụ Jehova isi. (2 Pita 2:1, 14) Taa, ndị okenye kwesịkwara ịna-adọ ụmụnna ha aka ná ntị. Ebe ndị okenye bụ Ndị Kraịst tozuru okè, ha ahụla ọtụtụ ihe ná ndụ. Tupu e mee ha okenye, ha egosila na ha ghọtara Akwụkwọ Nsọ nke ọma nakwa na ha ruru eru ịkụzi eziokwu si na Baịbụl. (1 Tim. 3:2; Taị. 1:9) Ha tozuru okè, na-echekwa echiche nke ọma. Ihe ha mụtara na Baịbụl mekwara ka ha mara ihe. Ihe a niile na-enyere ha aka inye ụmụnna ha ndụmọdụ ga-abara ha uru.

Ndị okenye na-echebe atụrụ Chineke nyere ha ka ha na-elekọta, otú ahụ onye ọzụzụ atụrụ si echebe atụrụ ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)

ONYE ỌZỤZỤ ATỤRỤ ỌMA NA-AZỤ ATỤRỤ YA, NA-ECHEBEKWA HA

9. Olee otú Jizọs si eduzi ọgbakọ Ndị Kraịst taa ma na-azụ ha?

9 Jehova ji nzukọ ya na-akụziri ndị ya ihe n’ụwa niile, na-eduzikwa ha. Ọ na-esi n’akwụkwọ a na-ebipụtara anyị enye anyị ndụmọdụ si na Baịbụl. Mgbe ụfọdụ, nzukọ Jehova na-enye ndị okenye ọgbakọ ntụziaka. Ha nwere ike ide ya n’akwụkwọ ozi ma ọ bụ si n’aka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị gwa ha ihe ha ga-eme. Ọ bụ otú ahụ ka e si akụziri atụrụ Chineke ihe doro anya.

10. Gịnị ka ndị okenye ga-eme ma e nwee atụrụ hapụrụ ìgwè atụrụ Chineke kpafuo?

10 N’ọgbakọ, ndị okenye na-echebe  atụrụ Chineke ma na-elekọta ha, karịchaa, ndị okwukwe ha na-esighịzi ike ma ọ bụ ndị mere mmehie. (Gụọ Jems 5:14, 15.) Mgbe ụfọdụ, a na-enwe atụrụ ndị si n’ọgbakọ kpafuo ma kwụsị ijere Chineke ozi. Ụdị ihe ahụ mee, ọ̀ bụ na okenye anya ruru ala agaghị eme ihe niile o nwere ike ime ka ọ chọta nke ọ bụla furu efu ma gbaa ya ume ka ọ laghachite n’ọgbakọ? Ọ ga-eme otú ahụ. Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghị Nna m nke bi n’eluigwe mma ka otu n’ime ndị a dị nta laa n’iyi.”—Mat. 18:12-14.

OLEE OTÚ ANYỊ KWESỊRỊ ISI NA-ELE IHE NDỊ OKENYE MEJỌRỌ ANYA?

11. Olee ihe nwere ike ime ka o siere ụfọdụ ndị ike ịna-erubere ndị okenye isi?

11 Jehova na Jizọs bụ Ndị Ọzụzụ Atụrụ zuru okè. Ma, ndị ọzụzụ atụrụ ha nyere ọrụ ilekọta ọgbakọ bụ ndị na-ezughị okè. O nwere ike ime ka o siere ụfọdụ ndị ike ịna-erubere ndị okenye isi. Ụfọdụ ndị nwere ike iche, sị: ‘Ndị okenye bụ ndị na-ezughị okè otú ahụ anyịnwa na-ezughị okè. Gịnị mere m ga-eji na-erubere ha isi?’ N’eziokwu, ndị okenye ezughị okè. Ma, anyị ekwesịghị ịna-eche naanị banyere ezughị okè ha na ihe ndị ha mejọrọ.

12, 13. (a) N’oge ochie, gịnị ka ụfọdụ ndị Jehova nyere ọrụ mejọrọ? (b) Gịnị mere Jehova ji mee ka ndị dere Baịbụl dee ihe ụfọdụ ndị o nyere ọrụ mejọrọ?

12 N’oge ochie, e nwere ndị Jehova si n’aka ha na-eduzi ndị ya. Baịbụl kwuru hoo haa ihe ndị ha mejọrọ. Dị ka ihe atụ, e tere Devid mmanụ ka ọ bụrụ ma eze Izrel ma onye ndú ha. Ma, o mechara kwaa iko, gbuokwa ọchụ. (2 Sam. 12:7-9) Onye ọzọ bụ Pita onyeozi. N’agbanyeghị na e nyere ya nnukwu ọrụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ndịozi, e nwere ihe ndị o mejọrọ. (Mat. 16:18, 19; Jọn 13:38; 18:27; Gal. 2:11-14) E wezụga Jizọs, o nweghị mmadụ zuru okè kemgbe Adam na Iv mehiechara.

13 Gịnị mere Jehova ji mee ka ndị dere Baịbụl dee ihe ụfọdụ ndị o nyere ọrụ mejọrọ? Otu n’ime ihe mere o ji mee ya bụ ka o gosi na o nwere ike iji ndị na-ezughị okè na-eduzi ndị ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ na-eme otú ahụ kemgbe ụwa. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịna-akatọ ndị okenye ma ọ bụ na-eleda ha anya n’ihi ihe ha na-emejọ. Jehova chọrọ ka anyị na-akwanyere ha ùgwù, na-erubekwara ha isi.—Gụọ Ọpụpụ 16:2, 8.

14, 15. Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’otú Jehova si gwa ndị ya ihe ha ga-eme n’oge ochie?

14 Taa, ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na-erubere ndị okenye ọgbakọ isi. Chegodị otú Jehova si gwa ndị ya ihe ha kwesịrị ime mgbe ihe siiri ha ike n’oge ochie. Mgbe ndị Izrel si n’Ijipt pụọ, Chineke si n’aka Mozis na Erọn na-enye ha iwu. Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na ndị Izrel achọghị ka ihe otiti nke iri gbuo ụmụ ha, ha kwesịrị ime ihe a gwara ha. A gwara ha ka ha rie nri pụrụ iche, gbuo atụrụ, fesakwa ọbara ya n’awara ụzọ ha nakwa n’elu ọnụ ụzọ ụlọ ha. Chineke esighị n’eluigwe gwa ndị Izrel ihe ahụ. Kama, ọ gwara Mozis ihe a ga-eme. Mozis agwazie ya ndị okenye Izrel. N’ihi ya, ndị Izrel kwesịrị ige ndị okenye ahụ ntị. (Ọpụ. 12:1-7, 21-23, 29) N’oge ahụ, Jehova si n’ọnụ Mozis na ndị okenye Izrel gwa ndị ya ihe ọ chọrọ ka ha mee. Ndị okenye ọgbakọ na-arụkwa ụdị ọrụ ahụ taa.

15 I nwere ike icheta ọtụtụ oge ndị ọzọ Baịbụl kwuru na Jehova si n’ọnụ ndị mmadụ ma ọ bụ ndị mmụọ ozi gwa ndị ya ihe ha ga-eme. N’oge ndị ahụ, ihe ọ gwara ha mere ka ha ghara ịnwụ. N’oge niile ahụ, Chineke kpebiri inye ndị ọzọ ikike ịnọchite anya ya na ịgwa  ndị ya ihe ha kwesịrị ime mgbe ihe tara akpụ. Anyị kwesịrị ịtụ anya na Jehova ga-emere ndị ya otú ahụ n’Amagedọn. Taa, ndị okenye e nyere ọrụ ịnọchite anya Jehova ma ọ bụ nzukọ ya kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara iji ikike e nyere ha na-eme ihe na-adịghị mma.

‘OTU ÌGWÈ ATỤRỤ NA OTU ONYE ỌZỤZỤ ATỤRỤ’

16. Olee “okwu” anyị kwesịrị ịna-ege ntị na ya?

16 Ndị Jehova bụ “otu ìgwè atụrụ.” Onye na-edu ha bụ “otu onye ọzụzụ atụrụ,” ya bụ, Jizọs Kraịst. (Jọn 10:16) Jizọs kwuru na ya ga-anọnyere ndị na-eso ụzọ ya “ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.” (Mat. 28:20) Ebe ọ bụ Eze n’eluigwe ugbu a, o nwere ikike ọ ga-eji hazie ihe ndị ga-eme tupu ya ebibie ụwa Setan. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịdị n’otu nakwa ka e chebe anyị ná nzukọ Chineke? Baịbụl zara ajụjụ a. O kwuru, sị: “Ntị gị ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị: ‘Lekwa ụzọ. Jeenụ ije na ya.’” “Okwu” ahụ ntị anyị ga-anụ bụ ihe Jehova ji mmụọ nsọ ya na-akụziri anyị na Baịbụl nakwa ihe ya na Jizọs si n’ọnụ ndị ọzụzụ atụrụ ha họpụtara na-agwa anyị.—Gụọ Aịzaya 30:21; Mkpughe 3:22.

Ndị okenye na-enyere ụmụaka nọ n’ezinụlọ nwere naanị nne ma ọ bụ nna aka ka ha na ndị ọjọọ ghara ịna-akpa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17 na 18)

17, 18. (a) Gịnị nwere ike ime ìgwè atụrụ Chineke ma e leghara ha anya? Olee ihe kwesịrị ime ka obi sie anyị ike? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

17 Baịbụl kwuru na Setan “na-ejegharị dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.” (1 Pita 5:8) Ọ na-eme ka anụ ọhịa agụụ ji. Ọ na-edè atụrụ Chineke, na-achọ otú ọ ga-esi pụta na mberede jide atụrụ na-esighị ike ma ọ bụ nke kpafuru akpafu. Ọ bụ ya bụ ihe ọzọ mere anyị ji kwesị ịnọ ụmụnna anyị nso mgbe niile. Anyị kwesịkwara ịnọ Jehova nso n’ihi na ọ bụ ya bụ “onye ọzụzụ atụrụ na onye nlekọta nke mkpụrụ obi” anyị. (1 Pita 2:25) Mkpughe 7:17 kwuru banyere ndị ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta, sị: “Nwa Atụrụ ahụ, [ya bụ, Jizọs] . . . ga-azụ ha dị ka atụrụ, ọ ga-edugakwa ha n’isi iyi nke mmiri nke ndụ. Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha.” È nwere nkwa ndị mmadụ ga-ekwe anyị ga-aka nke a mma?

18 Ugbu a anyị tụlechara ọrụ dị ezigbo mkpa ndị okenye ọgbakọ na-arụ n’ịzụ atụrụ Chineke, ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ bụ, Olee otú ndị okenye ga-esi mata ma hà na-elekọta atụrụ Jizọs nke ọma? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.