Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) NỌVEMBA 2013

Olee Otú Anyị Ga-esi ‘Na-echere Chineke’?

Olee Otú Anyị Ga-esi ‘Na-echere Chineke’?

“M ga-echere Chineke.”—MAỊ. 7:7.

1. Gịnị nwere ike ime ka anyị ghara inwe ndidi?

OGE ikpeazụ nke ụwa Setan malitere n’afọ 1914 mgbe e chiri Kraịst eze n’eluigwe. N’afọ ahụ, agha dara n’eluigwe, Jizọs emechaa chụdata Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ụwa. (Gụọ Mkpughe 12:7-9.) Setan ma na ya “nwere oge dị mkpirikpi.” (Mkpu. 12:12) Ma, ọ fọrọ obere ka “oge ahụ dị mkpirikpi” ruo otu narị afọ. N’ihi ya, ụfọdụ nwere ike iche na oge ikpeazụ a anọteela aka. Ka anyị na-echere ka Jehova bibie ụwa ochie a, ọ̀ na-adị anyị ka ọ̀ na-egbu oge?

2. Olee ajụjụ ndị a ga-aza n’isiokwu a?

2 Enweghị ndidi na-akpata nsogbu n’ihi na o nwere ike ime ka anyị mee ihe n’ebughị ụzọ chee echiche. Olee otú anyị ga-esi na-echere Jehova? Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi eme ya. Ọ ga-aza ajụjụ ndị a: (1) Gịnị ka anyị ga-amụta n’otú Maịka onye amụma si jiri ndidi chere Jehova? (2) Olee ihe ndị ga-egosi na oge ahụ anyị na-eche eruola? (3) Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ na Jehova nwere ndidi?

GỊNỊ KA ANYỊ GA-AMỤTA N’OTÚ MAỊKA ONYE AMỤMA SI JIRI NDIDI CHERE JEHOVA?

3. N’oge Maịka, olee otú ihe dị n’Izrel?

3 Gụọ Maịka 7:2-6. Maịka, bụ́ onye amụma Jehova, hụrụ ka ndị Izrel ji nwayọọ nwayọọ na-akwụsị ife Jehova. N’oge Eze Ehaz na-achị, ha akwụsịla ife Jehova. Maịka ji ndị Izrel na-ekwesịghị ntụkwasị obi tụnyere “ahịhịa ogwu.” Mmadụ zọnye ụkwụ n’ahịhịa ogwu, ọ ga-emerụ ya ahụ́. Ọ bụ otú ahụ ka ndị Izrel ahụ na-anaghị erubere Chineke isi na-emegbu onye ọ bụla ha na ya mekọrọ ihe. Omume ọjọọ ha mechadịrị mee ka ndị nọ n’ezinụlọ gharazie ịhụ ibe ha n’anya. Ebe ọ bụ na Maịka ma na ya agaghị emeli ka ihe gbanwee, o ji obi ya niile kpegara Jehova ekpere, cherezie  ka o mee ka ihe dị mma. Obi siri Maịka ike na Jehova ga-eme otú ahụ mgbe oge ya ruru.

4. Olee nsogbu ndị anyị na-enwe?

4 Ndị mmadụ taa na-achọ naanị ọdịmma onwe ha otú ahụ ọ dị n’oge Maịka. Ọtụtụ ndị bụ “ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ.” (2 Tim. 3:2, 3) Ọ na-enye anyị nsogbu n’obi ma ndị ọrụ ibe anyị, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, na ndị agbata obi anyị na-achọ naanị ọdịmma onwe ha. Ma, ụfọdụ ndị ohu Chineke na-enwe nsogbu ka nke ahụ. Jizọs kwuru na otu n’ime nsogbu ndị na-eso ụzọ ya ga-enwe bụ na ndị ezinụlọ ha ga-akpagbu ha. Ihe a o kwuru yiri ihe e dere na Maịka 7:6. Jizọs kwuru, sị: “M bịara ịkpata nkewa, nwoke megide nna ya, na nwa nwaanyị megide nne ya, nakwa nwaanyị a lụrụ ọhụrụ megide nne di ya. N’ezie, ndị iro mmadụ ga-abụ ndị ezinụlọ ya.” (Mat. 10:35, 36) Ọ bụrụ na ndị ezinụlọ anyị na-anaghị efe Jehova na-akwa anyị emo ma ọ bụ na-emegide anyị, ọ naghị adị mfe idi ya. Ọ bụrụ na ụdị ọnwụnwa ahụ abịara anyị, anyị ekwesịghị ikwe ka o mee ka anyị mebie iwu Chineke. Kama ime otú ahụ, ka anyị na-erubere Jehova isi, jirikwa ndidi na-echere ka o dozie nsogbu ahụ. Ọ bụrụ na anyị ana-arịọ ya ka o nyere anyị aka, ọ ga-enye anyị ike na amamihe anyị ga-eji tachie obi.

5, 6. Olee otú Jehova si gọzie Maịka? Gịnị ka Maịka na-ahụghị mgbe o mezuru?

5 Jehova gọziri Maịka maka otú o si nwee ndidi. Maịka ji anya ya hụ mgbe ajọ Eze Ehaz nwụrụ, ọchịchị ọjọọ ya adaa. Ọ hụkwara mgbe e chiri Hezekaya nwa Ehaz eze, ya enyere ụmụ Izrel aka ka ha maliteghachi ife Jehova. Maịka hụkwara otú amụma o buru banyere Sameria si mezuo mgbe ndị Asiria gara lụso alaeze ebe ugwu Izrel ọgụ.—Maị. 1:6.

6 Ma, Maịka ahụghị mgbe amụma niile Jehova gwara ya buo mezuru. Dị ka ihe atụ, Maịka dere, sị: “N’oge ikpeazụ . . . a ga-eme ka ugwu nke ụlọ Jehova guzosie ike n’ebe dị elu karịa ugwu ukwu niile, a ga-ebulikwa ya ka ọ dị elu karịa ugwu nta niile; ndị dị iche iche ga-enubakwa n’ime ya. Ọtụtụ mba ga-ejekwa, sị: ‘Bịanụ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova.’” (Maị. 4:1, 2) Maịka nwụrụ ọtụtụ afọ tupu amụma a emezuo. Ma, o kpebisiri ike ịna-erubere Jehova isi ruo mgbe ọ nwụrụ n’agbanyeghị ihe ndị ọzọ na-eme. O dere, sị: “Ndị niile dị iche iche ga na-ejegharị, onye ọ bụla n’aha chi ya; ma anyị onwe anyị ga na-ejegharị n’aha Jehova bụ́ Chineke anyị ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.” (Maị. 4:5) Maịka ji ndidi chere Jehova mgbe ihe tara akpụ n’ihi na obi siri ya ike na Jehova ga-emezu nkwa niile o kwere. O ji obi ya niile jeere Jehova ozi ma tụkwasị ya obi.

7, 8. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị ịtụkwasị Jehova obi? (b) Gịnị ga-eme ka ọ dị anyị ka oge ọ̀ na-agba ọsọ?

7 Ànyị tụkwasịrị Jehova obi otú ahụ Maịka mere? Anyị kwesịrị ime otú ahụ. Anyị ejirila anya anyị hụ otú amụma Maịka si mezuo. ‘N’oge ikpeazụ a,’ ọtụtụ nde mmadụ si ná mba niile, ebo niile, na asụsụ niile enubatala ‘n’ugwu nke ụlọ Jehova.’ N’agbanyeghị na ha si ná mba ndị na-alụso ibe ha ọgụ, ha ‘akpụgharịala mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè.’ Ha anaghịkwa ekwe ‘amụ otú e si alụ agha.’ (Maị. 4:3) Ọ bụ ihe ùgwù na anyị so ụmụnna anyị ndị nọ n’udo na-efe Jehova.

8 O doro anya na anyị chọrọ ka Jehova bibie ụwa ochie a ngwa ngwa. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ iji ndidi na-echere, anyị kwesịrị ịna-ele ihe anya otú Jehova si ele ya. O kpebiela otu ụbọchị ọ ga-esi n’aka Jizọs Kraịst kpee ụmụ mmadụ ikpe. Ọ bụ ya bụ onye “ọ họpụtara.” (Ọrụ 17:31) Ma,  tupu ụbọchị ahụ eruo, Chineke na-enye mmadụ niile ohere inweta “ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” Ọ chọkwara ka ha mee ihe ha mụtara, ka a zọpụta ha. Ha nwere ike ịnwụ ma ọ bụrụ na anyị enyereghị ha aka. (Gụọ 1 Timoti 2:3, 4.) N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ebibi ụwa ochie a. Ọ bụrụ na anyị na-agbalịsi ike inyere ndị mmadụ aka ka ha mata Chineke, ọ ga-adị anyị ka oge ọ̀ na-agba ọsọ. Mgbe ụbọchị ahụ ga-emecha bịa, obi ga-adị anyị ụtọ na anyị emeghị anya ụra n’ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke.

OLEE IHE NDỊ GA-EGOSI NA OGE AHỤ ANYỊ NA-ECHE ERUOLA?

9-11. Amụma ahụ e buru ná 1 Ndị Tesalonaịka 5:3 ò mezuola? Kọwaa.

9 Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:1-3. N’oge na-adịghị anya, mba dị iche iche ga-asị na e nweela “Udo na obi iru ala” n’ụwa. Ọ bụrụ na anyị achọghị ka ihe a ha ga-ekwu megharịa anyị anya, anyị kwesịrị ‘ịmụrụ anya ma nwee uche ziri ezi.’ (1 Tesa. 5:6) Ka anyị tụlee ihe ndị ga-eme tupu mba dị iche iche ekwuo na e nweela “Udo na obi iru ala.” Ọ ga-enyere anyị aka ịmụrụ anya.

10 Mgbe agha ụwa nke mbụ na nke abụọ gachara, mba niile chọwara udo. Mgbe agha ụwa nke mbụ gachara, ha hiwere Njikọ Mba Niile, buru n’obi na ọ ga-eme ka e nwee udo. Mgbe agha ụwa nke abụọ biri, ndị mmadụ hiwere Òtù Mba Ụwa, na-atụ anya na ọ ga-eme ka udo dị n’ụwa. Ndị ọchịchị na ndị ndú okpukpe tụkwasịrị òtù abụọ ahụ obi, chee na ha ga-ewetara ụmụ mmadụ udo. Dị ka ihe atụ, Òtù Mba Ụwa kwusiri ike na afọ 1986 bụ Afọ Udo nke Mba Niile. N’afọ ahụ, ndị ọchịchị na ndị ndú okpukpe si ná mba dị iche iche na onyeisi ndị Katọlik zukọrọ n’Asisi, dị n’Ịtali, ka ha kpee ekpere maka udo.

11 Ma ihe ha kwuru banyere udo na obi iru ala mgbe ahụ nakwa n’oge ndị ọzọ emezughị amụma ahụ e buru ná 1 Ndị Tesalonaịka 5:3. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na “mbibi mberede” ahụ e kwuru okwu ya abịabeghị.

12. Olee ihe anyị ma banyere “Udo na obi iru ala” ahụ Baịbụl buru amụma na ndị mmadụ ga-ekwu na ha enweela?

 12 Oleezi ndị ga-emecha kwuo na e nweela “Udo na obi iru ala”? Gịnị ka ndị ndú Krisendọm na okpukpe ndị ọzọ ga-eme mgbe ahụ? Olee otú ọ ga-esi gbasa ndị ọchịchị ụwa? Baịbụl azaghị ajụjụ ndị a. Ihe doro anyị anya bụ na n’agbanyeghị otú a ga-esi kwuo na e nweela udo na obi iru ala nakwa otú ọ ga-esi yie ka ọ̀ bụ eziokwu, ọ gaghị abụ nke ezigbo ya. Ọ bụ Setan ka ga na-achị ụwa. Ụwa ochie a eretọọla. Ndị mmadụ agaghị emeziteli ya. Ọ ga-ajọgbu onwe ya ma anyị kweta ụgha ahụ Setan ga-agha ma soro ụwa ya.

13. Gịnị mere ndị mmụọ ozi ji jidesie ifufe mbibi ahụ ike?

13 Gụọ Mkpughe 7:1-4. Ka anyị na-echere ka ihe ahụ e kwuru ná 1 Ndị Tesalonaịka 5:3 mezuo, ndị mmụọ ozi ka jidesiri ifufe mbibi nke oké mkpagbu ahụ ike. Gịnị ka ha na-eche? Jọn onyeozi kwuru na a ga-ebu ụzọ kachaa ndị e tere mmanụ, bụ́ “ndị ohu nke Chineke anyị,” akara ikpeazụ. * Ozugbo a kachara ha akara ikpeazụ ahụ, ndị mmụọ ozi ahụ ga-ahapụ ifufe mbibi ahụ. Gịnị ga-eme n’oge ahụ?

14. Olee ihe na-egosi na a ga-ebibi Babịlọn Ukwu ahụ n’oge na-adịghị anya?

14 A ga-ebibi Babịlọn Ukwu ahụ, ya bụ, okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa. E kwesịrị ibibi ya. Mgbe a ga-ebibi ya, “ndị dị iche iche na ìgwè mmadụ na mba dị iche iche na asụsụ dị iche iche” agaghị enyeliri ya aka. Ihe na-eme ugbu a na-egosi na a ga-ebibi ya n’oge na-adịghị anya. (Mkpu. 16:12; 17:15-18; 18:7, 8, 21) Taa, ndị mmadụ anaghịzi akwado okpukpe otú ha na-emebu. Ọ bụrụ na anyị egee akụkọ ụwa, anyị ga-achọpụta na ọtụtụ ndị na-akatọzi okpukpe dị iche iche na ndị ndú ha. Ma, ndị ndú okpukpe chere na o nweghị ihe ga-eme ha. Ha dara ya. E kwuchaa na e nweela “Udo na obi iru ala,” ndị ọchịchị ga-ebibi okpukpe ụgha niile. A gaghị enwe Babịlọn Ukwu ahụ ọzọ. Ọ ga-abara anyị uru ma anyị jiri ndidi na-echere ka ihe ndị a mee.—Mkpu. 18:8, 10.

OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI GOSI NA OBI DỊ ANYỊ ỤTỌ NA CHINEKE NWERE NDIDI?

15. Gịnị mere Jehova ji jiri ndidi na-echere?

15 N’agbanyeghị na ndị mmadụ na-akatọ aha Jehova, o ji ndidi na-echere ka oge ruo ka o mee ihe o bu n’obi. Jehova achọghị ka e bibie ndị ọ bụla nwere ezi obi. (2 Pita 3:9, 10) Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị n’obi? Tupu ụbọchị Jehova eruo, e nwere ụzọ dị iche iche anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ na Jehova nwere ndidi.

16, 17. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị inyere ndị na-anaghị ejekwa ozi ọma aka? (b) Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa ugbu a ka ndị na-anaghị ejekwa ozi ọma laghachikwute Jehova?

16 Nyere ndị na-anaghị ejekwa ozi ọma aka. Jizọs kwuru na a na-enwe ọṅụ n’eluigwe ma a chọta otu atụrụ furu efu. (Mat. 18:14; Luk 15:3-7) O doro anya na ihe banyere ndị niile hụrụ Jehova n’anya na-emetụ ya n’obi, ọ bụrụgodị na ha akwụsịtụla ijere ya ozi ugbu a. Ọ bụrụ na anyị enyere ụdị ndị ahụ aka ka ha laghachite n’ọgbakọ, anyị ga-eme ka obi dị Jehova na ndị mmụọ ozi ya ụtọ.

17 Ì so ná ndị na-anaghịzi ejere Chineke ozi? O nwere ike ịbụ na onye nọ n’ọgbakọ mere ihe wutere gị, ya emezie ka ị kwụsị ịga ọmụmụ ihe. O nwekwara ike ịbụ na ọ dịtụla anya ihe ahụ mere. N’ihi ya, jụọ onwe gị, sị: ‘Ndụ m ọ̀ kala  mma ugbu a? Obi ọ̀ na-adịkwu m ụtọ ugbu a? Ọ̀ bụ Jehova mejọrọ m, ka ọ̀ bụ mmadụ na-ezughị okè? Ò nwetụla mgbe Jehova Chineke mere m ihe ọjọọ?’ Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ na-emere anyị ihe ọma mgbe niile. Ọ bụrụgodị na anyị anaghịzi emezu nkwa anyị kwere ya mgbe anyị nyefere ya onwe anyị, ọ ka na-emere anyị ihe ọma ndị ọ na-emere ụmụ mmadụ. (Jems 1:16, 17) N’oge na-adịghị anya, ụbọchị Jehova ga-abịa. Ọ bụ ugbu a ka anyị kwesịrị ịlaghachikwuru Nna anyị hụrụ anyị n’anya, bụ́ Jehova, laghachitekwa n’ọgbakọ ya. Ọ bụ naanị n’ọgbakọ ya ka anyị ga-anọ obi eruo anyị ala n’oge ikpeazụ a.—Diut. 33:27; Hib. 10:24, 25.

Ndị Jehova na-agbalịsi ike ka ha nyere ndị na-anaghị ejekwa ozi ọma aka ka ha laghachikwuru Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 na 17)

18. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-akwado ndị okenye?

18 Jiri obi gị niile na-akwado ndị okenye. Jehova yiri onye ọzụzụ atụrụ hụrụ atụrụ ya n’anya. Ọ na-eduzi anyị, na-echebekwa anyị. O mere ka Ọkpara ya bụrụ Onyeisi Ọzụzụ Atụrụ ya. (1 Pita 5:4) N’ihe karịrị otu narị puku ọgbakọ, ndị okenye na-ewepụta oge na-azụ atụrụ Chineke. (Ọrụ 20:28) Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-akwado ndị okenye, anyị na-egosi Jehova na Jizọs na obi dị anyị ụtọ maka ihe niile ha meere anyị.

19. Olee otú anyị ga-esi nọrọ ụmụnna anyị nso?

19 Nọrọ ụmụnna gị nso. Gịnị ka ọ pụtara? Ndị agha kwesịrị ịbịakọta ọnụ ma ndị iro lụsowe ha ọgụ. Ha mee otú ahụ, ọ ga-esiri ndị iro ha ike imeri ha. Ọgụ Setan na-alụso ndị Chineke na-aka njọ. Ugbu a abụghị oge anyị kwesịrị ịna-alụso ụmụnna anyị ọgụ. Ọ bụ ugbu a ka anyị kwesịrị ịna-anọ ụmụnna anyị nso, na-eleghara ihe ha mejọrọ anya, tụkwasịkwa Jehova obi.

Ọ bụ ugbu a ka anyị kwesịrị ịnọ ụmụnna anyị nso ma na-alụso Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya ọgụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19)

20. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ugbu a?

20 Ka anyị niile mụrụ anya ma na-echere Jehova. Ka anyị jiri ndidi na-atụ anya mgbe mba dị iche iche ga-asị na e nweela “Udo na obi iru ala” nakwa mgbe a ga-aka ndị e tere mmanụ akara ikpeazụ. Nke ahụ gachaa, ndị mmụọ ozi anọ ahụ ga-ahapụ ifufe mbibi ahụ ha jidesiri ike. A ga-ebibikwa Babịlọn Ukwu ahụ. Ugbu a anyị na-echere ka ihe ndị ahụ mee, ka anyị na-erubere ndị na-edu ndú ná nzukọ Jehova isi. Ka anyị nọrọ ụmụnna anyị nso ma na-alụso Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya ọgụ. Ọ bụ ugbu a ka anyị kwesịrị ime ihe ọbụ abụ kwuru. Ọ sịrị: “Nweenụ obi ike, ka obi siekwa unu ike, unu niile ndị na-echere Jehova.”—Ọma 31:24.

^ para. 13 Ị chọọ ịhụ ebe a kọwara ihe dị iche n’akara nke mbụ a kara ndị so ná ndị e tere mmanụ na akara ikpeazụ a ga-aka ha, gụọ Ụlọ Nche January 1, 2007, peeji nke 30-31.