Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌKTOBA 2013

Ihe Ndị E Kere Eke Na-eme Ka Anyị Mata Onye Chineke Dị Ndụ Bụ

Ihe Ndị E Kere Eke Na-eme Ka Anyị Mata Onye Chineke Dị Ndụ Bụ

“I kwesịrị ekwesị, Jehova, bụ́ Chineke anyị, ịnata otuto . . . n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile.”—MKPU. 4:11.

1. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka okwukwe anyị sikwuo ike?

ỌTỤTỤ ndị na-ekwu na ihe ha na-ekweta bụ naanị ihe ha ji anya ha hụ. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị dị otú ahụ aka inwe okwukwe na Jehova? A sị ka e kwuwe, Baịbụl kwuru na “ọ dịghị mmadụ hụtụrụla Chineke mgbe ọ bụla.” (Jọn 1:18) Ajụjụ ọzọ dị mkpa bụ, Olee otú anyị nwere ike isi mee ka okwukwe anyị nwere na Jehova, bụ́ Chineke a na-anaghị ahụ anya, sikwuo ike? (Kọl. 1:15) Ihe mbụ anyị ga-eme bụ ịmata ozizi ndị na-eme ka ndị mmadụ ghara ịmata eziokwu banyere Jehova. Ihe ọzọ abụrụ ịmụta otú kacha mma anyị ga-esi jiri Baịbụl gosi ndị mmadụ na ozizi ndị ahụ na-eme ka a ghara ịmata Chineke nke ọma.—2 Kọr. 10:4, 5.

2, 3. Olee ozizi ndị na-eme ka ndị mmadụ ghara ịma nke bụ́ eziokwu banyere Chineke?

2 Otu ozizi ụgha nke na-eme ka ndị mmadụ ghara ịma eziokwu gbasara Chineke bụ na mmadụ na ihe ndị ọzọ dị ndụ nọkatara pụta. Ozizi ahụ ndị mmadụ chepụtara na-emegide ihe Baịbụl na-akụzi, na-emekwa ka ndị mmadụ ghara inwe olileanya. Ọ bụrụ na ozizi ahụ bụ eziokwu, ọ pụtara na ndụ anyị dị n’ụwa a enweghị isi na ọdụ.

3 Ihe ọzọ bụ na ụfọdụ ndị na Krisendọm nwere ike ịna-akwanyere ihe Baịbụl kwuru ùgwù, ma ha na-ekwusi ike na Chineke ji ụbọchị isii nkịtị kee ihe niile dị n’eluigwe na n’ụwa puku afọ ole na ole gara aga. Ndị na-ezi ụdị ozizi ahụ na-ajụ ihe ọ bụla ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtara nke na-emegide ihe ha kweere. Ha nwere ike ikwu na ha kwetara ihe Baịbụl na-akụzi banyere okike, ma ozizi ha na-eme ka o siere ndị ọzọ ike ịtụkwasị Okwu Chineke obi. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ozizi ahụ na-eme ka ọ dị ka ihe Baịbụl kwuru abụghị eziokwu. Ndị na-ezi ozizi ahụ na-eme ka anyị cheta ụfọdụ ndị dịrị ndụ n’oge ndịozi Jizọs, bụ́ ndị Baịbụl kwuru na ha na-anụ ọkụ n’obi n’ofufe  Chineke, ma ha anaghị efe ya “dị ka ezi ihe ọmụma si dị.” (Rom 10:2) Olee otú anyị nwere ike isi jiri Okwu Chineke ‘kụghasịa ozizi ụgha ndị ahụ gbanyesiri mgbọrọgwụ ike’ n’obi ndị mmadụ? * Naanị ihe ga-enyere anyị aka ime otú ahụ bụ ịgbalịsi ike mụta eziokwu ndị Baịbụl na-akụzi.

IHE ÀMÀ DORO ANYA NA ICHE ECHICHE NKE ỌMA GA-ENYERE ANYỊ AKA INWE OKWUKWE

4. Gịnị kwesịrị ime ka anyị nwee okwukwe na Chineke?

4 Baịbụl na-akụzi na anyị kwesịrị iji ihe ọmụma kpọrọ ihe. (Ilu 10:14) Jehova chọrọ ka ihe mere anyị ji kwetasie ike na ọ dị bụrụ n’ihi na e nwere ihe àmà doro anya nakwa na anyị chere echiche nke ọma, ọ bụghị n’ihi amamihe ndị mmadụ ma ọ bụ omenala okpukpe. (Gụọ Ndị Hibru 11:1.) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka okwukwe anyị nwere na Chineke sie ezigbo ike, ihe mbụ anyị ga-eme bụ ikweta na Jehova dị. (Gụọ Ndị Hibru 11:6.) Ihe mere anyị ga-eji kweta na Chineke dị abụghị ka a sịkwa na anyị kweere na Chineke, kama ọ bụ n’ihi na anyị enyochaala ihe niile, cheekwa echiche nke ọma.—Rom 12:1.

5. Olee otu ihe mere anyị ji kweta na Chineke dị?

5 Pọl onyeozi kwuru otu ihe mere anyị ga-eji kweta na Chineke dị n’agbanyeghị na anyị enweghị ike ịhụ ya anya. O dere banyere Jehova, sị: “Àgwà ya ndị a na-apụghị ịhụ anya ka a na-ahụ nke ọma malite mgbe e kere ụwa gaa n’ihu, n’ihi na a na-aghọta ha site n’ihe ndị e kere eke, ya bụ, ike ebighị ebi ya na ịbụ Chineke ya.” (Rom 1:20) E nwee onye ọ na-eme obi abụọ na Chineke dị, olee otú anyị nwere ike isi nyere ya aka ka o kweta ihe a Pọl kwuru? I nwere ike iji ihe ụfọdụ a kọwara n’isiokwu a banyere ihe ndị e kere eke mee ka onye ahụ mata na Chineke nwere ike na amamihe.

IHE NDỊ CHINEKE KERE NA-EGOSI NA O NWERE IKE

6, 7. Olee ihe abụọ na-egosi na Jehova nwere ike dị ukwuu?

6 E nwere ihe abụọ Jehova kere nke na-echebe ụwa. Ha abụọ na-egosi na Chineke nwere ike dị ukwuu. Nke mbụ na-eme ka anyị na-enweta ikuku anyị na-ekuru, na-echebekwa anyị. Olee otú o si echebe anyị? E nwere nnukwu okwute ndị na-aga ngwa ngwa n’ime ime mbara igwe. Ha nwere ike imebi ihe n’ụwa ma ọ bụrụ na ha abata n’ụwa. Ma, ha anaghị abata n’ihi na ihe nke mbụ ahụ na-echebe ụwa na-agbaze ha na mbara igwe. Ha gbazee, ha na-eyi ọmarịcha kpakpando, na-agbakwa oké ọsọ n’abalị.

7 Ihe nke abụọ ahụ nke na-echebe ụwa dị n’ime ime ala. Ihe dị na ya yiri ígwè dị ọkụ, nke gbazere agbaze. O nwere ihe na-esi na ya apụta nke na-echebe ụwa, mee ka anwụ ghara ịchagbu anyị, meekwa ka ihe ụfọdụ na-esi n’anwụ apụta ghara imerụ anyị ahụ́. Ihe nke abụọ ahụ nke na-echebe ụwa na-eme ka oké okpomọkụ si n’anyanwụ ghara irute n’ụwa. Ihe ndị yiri ọkụ a na-ahụ na mbara igwe n’abalị n’ebe ụfọdụ n’ụwa gosiri na ihe ahụ nke na-echebe ụwa na-arụ ọrụ ya nke ọma. O doro anya na Jehova nwere ‘ike dị ukwuu.’—Gụọ Aịzaya 40:26.

IHE NDỊ CHINEKE KERE NA-EGOSI NA O NWERE AMAMIHE

8, 9. Gịnị na-eme ka ihe ndị dị ndụ n’ụwa na-adị ndụ? Olee ihe ọ na-akụziri anyị banyere amamihe Jehova?

8 E nwere ihe ndị Jehova kere eke, ndị na-eme ka anyị na-adị ndụ n’ụwa. Ihe ndị ahụ na-akụziri anyị na Chineke nwere amamihe. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na e nwere otu obodo nke ọtụtụ nde mmadụ bi na ya, a gbaakwa ya ogige. O nweghị ebe e nwere ike isi webata ezigbo mmiri. O nweghịkwa ebe e si ekpofu ihe ndị ruru unyi. N’oge na-adịghị anya, obodo ahụ ga-eru ezigbo unyi. Ọ gaghịkwa ekwe obibi. E nwere ụzọ ụfọdụ ụwa anyị a si yie obodo ahụ. Ezigbo mmiri e nwere na ya anaghị  amụba amụba. Anyị enweghịkwa ike iwepụcha ihe niile ruru unyi na ya. Ma, ụwa nwere ike ime ka ihe ndị dị ndụ na-enweta ihe ga-eme ka ha dịrị ndụ si n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Chineke mere ka ụwa na-emepụta ihe ndị na-eme ka ihe ndị dị ndụ ghara ịnwụ.

9 Dị ka ihe atụ, ka anyị tụlee otú ụwa si eme ka e nwee ezigbo ikuku ihe ndị dị ndụ ga na-ekuru. Ọtụtụ nde ihe ndị dị ndụ na-ekuru ezigbo ikuku ma na-ekupụ ikuku ọjọọ. Ma, ezigbo ikuku a anaghị akọ ụkọ n’ụwa. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na osisi na-eji ma ikuku ahụ ndị mmadụ na-ekupụ ma mmiri ma anwụ ma ihe ndị o nwetara n’ala emepụta nri na ikuku ndụ. Ọ bụ ya ka ndị Bekee na-akpọ fotosintesis. Mgbe anyị kuuru ezigbo ikuku ahụ ma kupụ ikuku ọjọọ, anyị na-eme ka ihe ahụ Chineke kere na-aga nke ọma. Jehova na-esi otú ahụ eji osisi o kere eke ‘enye mmadụ niile ndụ na ume.’ (Ọrụ 17:25) Ihe ndị ahụ gosiri na amamihe Jehova enweghị atụ.

10, 11. Olee otú otu urukurubụba tụrụ àgwà na oji ọdụ aṅụ mmiri si eme ka anyị mata na Jehova nwere amamihe?

10 Ihe ọzọ na-eme ka anyị mata na Jehova nwere amamihe bụ otú o si kee ọtụtụ ihe ndị dị ndụ n’ụwa. Ihe ndị ọkachamara chọpụtara na-egosi na ụdị ihe dị iche iche dị ndụ n’ụwa dị n’agbata nde abụọ na otu narị nde. (Gụọ Abụ Ọma 104:24.) Ọ bụrụ na anyị eleruo ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ Chineke kere anya, anyị ga-aghọta na o nwere amamihe.

Otú Chineke si kee anya oji ọdụ aṅụ mmiri gosiri na Chineke nwere amamihe; e mere ka foto a bukwuo ibu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11 Dị ka ihe atụ, e nwere otu urukurubụba tụrụ àgwà. Ụbụrụ ya hà ka kpọm e suru n’akwụkwọ. Ma, urukurubụba ahụ na-esi na Kanada fega n’ọhịa dị na Meksiko, ya bụ, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku kilomita atọ. Ọ bụ anyanwụ na-enyere ya aka ịmata ụzọ. Oleekwanụ otú o si amata ụzọ ma anyanwụ daa? Otú Jehova si kee obere ụbụrụ urukurubụba ahụ na-enyere ya aka ịmata ebe ọ na-aga ọ bụrụgodị na anyanwụ adaa. Ihe atụ ọzọ anyị ga-atụle bụ oji ọdụ aṅụ mmiri. O nwere anya abụọ, nweekwa obere ụbụrụ. Anya nke ọ bụla nwere ihe ndị yiri enyo. Ihe ndị ahụ ruru ihe dị ka puku iri atọ. Ma, obere ụbụrụ ya ahụ na-enwe ike ịghọta ihe ọ bụla o ji ihe ndị ahụ yiri enyo lee. Ọ na-ahụkwa ihe ọ bụla gaferenụ, ọ bụrụgodị ihe dị ezigbo obere.

12, 13. Olee ihe masịrị gị n’otú Jehova si kee mkpụrụ ndụ ndị dị n’ahụ́ mmadụ?

12 Otú Jehova si kee mkpụrụ ndụ ndị dị n’ahụ́ ihe niile dị ndụ dị egwu. Dị ka ihe atụ, mkpụrụ ndụ dị n’ahụ́ gị dị ihe dị ka otu narị puku ijeri. N’ime mkpụrụ ndụ nke ọ bụla, e nwere ihe a na-akpọ DNA. Ọ bụ n’ime ya ka a ga-ahụ ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ihe niile banyere otú ahụ́ gị dum dị.

13 Olee otú ihe dị na DNA hà? Anyị nwere ike iji DNA juru obere ngaji tụnyere ihe dị n’otu siidi. E nwere ike itinye ihe niile dị n’otu akwụkwọ ọkọwa okwu n’otu siidi. O nwere ike iju mmadụ anya ebe ọ bụ na siidi na-adị obere. Ma, ihe niile e tinyere n’otu puku ijeri siidi ga-aba na DNA juru obere ngaji. Ihe ọ pụtara bụ na e nwere ike iji DNA juru obere ngaji kee  mmadụ niile bi n’ụwa taa. E nwedịrị ike iji ya kee ha niile okpukpu narị atọ na iri ise.

14. Olee otú obi na-adị gị banyere Jehova n’ihi ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtara?

14 Eze Devid kwuru na ọ dị ka Jehova ò dere ihe niile e ji kee ahụ́ mmadụ n’akwụkwọ. Ọ gwara Jehova Chineke, sị: “Anya gị hụrụ m ọbụna mgbe m bụ nwa e bu n’afọ, e dekwara akụkụ ahụ́ m niile n’akwụkwọ gị, bụ́ ụbọchị a kpụrụ ha, mgbe a na-enwebeghị ọbụna otu n’ime ha.” (Ọma 139:16) Anyị ghọtara ihe mere Devid ji too Jehova mgbe o chechara otú e si kee ahụ́ ya. Ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtala ọtụtụ ihe na-eju anya banyere ahụ́ mmadụ. Ihe ndị ahụ ha chọpụtara emeela ka anyị na-asọpụkwuru Jehova ma anyị cheta otú o si kee anyị. Ihe ndị ahụ emeekwala ka anyị kwetasie ike na ihe Devid kwuru banyere Jehova bụ eziokwu. Devid kwuru, sị: “M ga-eto gị n’ihi na i kere m n’ụzọ dị egwu, dịkwa ebube. Ọrụ gị dị ebube, dị ka mkpụrụ obi m maara nke ọma.” (Ọma 139:14) Oleekwanụ otú mmadụ ga-esi hụchaa ihe a niile, ya aghara ịghọta na ihe e kere eke na-eme ka anyị mata na e nwere Chineke dị ndụ?

NYERE NDỊ ỌZỌ AKA KA HA NA-ENYE CHINEKE DỊ NDỤ OTUTO

15, 16. (a) Olee otú akwụkwọ anyị sirila nyere ndị mmadụ aka ịghọta na ọ bụ Jehova kere ihe niile? (b) N’ime isiokwu Teta! ndị ahụ a kpọrọ “È Kere Ya Eke?” olee nke ị gụrụ tọrọ gị ụtọ?

15 Kemgbe ọtụtụ afọ, Teta! enyerela ọtụtụ nde mmadụ aka ịghọta na ihe ndị e kere eke na-eme ka anyị mata na e nwere Chineke dị ndụ. Dị ka ihe atụ, isiokwu gbara na Teta! Bekee nke Septemba afọ 2006 bụ “È Nwere Onye Kere Ihe Niile?” * Ihe mere e ji bipụta Teta! ahụ bụ ka e jiri ya meghee anya ndị kweere n’ozizi evolushọn na ozizi ụgha ndị ọzọ. Otu nwanna nwaanyị degaara alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Amerịka akwụkwọ banyere Teta! ahụ pụrụ iche, sị: “Otú anyị si kesaa Teta! a pụrụ iche gara nnọọ nke ọma. Otu nwaanyị nke na-akụzi ihe ọmụmụ bayọlọji kwuru ka e wetara ya mkpụrụ iri abụọ. Ọ chọrọ inye nwa akwụkwọ ya ọ bụla otu.” Otu nwanna nwoke dere, sị: “Ana m eje ozi ọma kemgbe ihe dị ka afọ 1947. Ọ fọrọ ntakịrị ka m dị afọ iri asaa na ise ugbu a. Ma, o nwetụbeghị mgbe ozi ọma tọrọ m ụtọ otú ọ tọrọ m n’ọnwa a a na-ekesa Teta! a pụrụ iche.”

16 N’afọ ndị na-adịbeghị anya, isiokwu bụ́ “È Kere Ya Eke?” * agbaala n’ọtụtụ Teta! Bekee e bipụtarala. Isiokwu ahụ na-adị nkenke. Ma, a na-eji ya akọwa otú ihe Chineke kere si dị egwu nakwa otú ndị mmadụ si agba mbọ imepụta ihe yiri ihe ndị ahụ. Broshọ Bekee ahụ bụ́ È Kere Ihe Ndị Dị Ndụ Eke? ga-eme ka a na-eto Jehova. E wepụtaara anyị ya n’afọ 2010. Ọmarịcha foto na chaatị ndị dị na ya ga-enyere anyị aka ịna-ekelekwu Jehova maka ihe ndị o kere. Ajụjụ ndị a jụrụ ná ngwụcha nkebi nke ọ bụla na-enyere mmadụ aka ichebara ihe ndị ọ gụrụ na ya echiche. Broshọ a mara mma iji gaa ozi ọma, ma n’ụlọ n’ụlọ ma n’ebe ọhaneze na-anọkarị ma n’ebe ndị ọzọ.

17, 18. (a) Ndị nne na nna, olee otú unu ga-esi mee ka obi kaa ụmụ unu mgbe ha na-akọrọ ndị ọzọ ihe ha kweere? (b) Olee otú unu sirila jiri broshọ abụọ ahụ ma ọ bụ akwụkwọ anyị ndị ọzọ kwuru na e kere ihe niile eke nyere ụmụ unu aka n’ofufe ezinụlọ unu?

17 Ndị nne na nna, unu na ụmụ unu ùnu amụọla broshọ ahụ n’ofufe ezinụlọ unu? Ọ bụrụ na unu emee otú ahụ, ọ ga-eme ka ụmụ unu nwekwuo okwukwe na Jehova bụ Chineke dị ndụ. O nwere ike ịbụ na unu nwere ụmụaka nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ndị na-akụzi ozizi evolushọn na-agbalịsi ike ime ka ụmụ unu kweta na o nweghị onye kere ihe niile. Ndị ọkà mmụta sayensị, ndị nkụzi, ndị na-eme fim, na ihe ụfọdụ a na-egosi na tiivi na-akụziri ndị mmadụ na ozizi evolushọn bụ  eziokwu. Unu nwere ike iji broshọ nke abụọ ahụ e bipụtara n’afọ 2010 nyere ụmụ unu aka ịmata nke bụ́ eziokwu. Aha broshọ ahụ bụ The Origin of Life—Five Questions Worth Asking, (ya bụ, Otú Ndụ Si Malite, Ajụjụ Ise E Kwesịrị Ịjụ). Broshọ a mekwara ihe broshọ nke mbụ ahụ mere. Ọ na-agba ndị na-eto eto ume ịmụta ichebara ihe echiche. (Ilu 2:10, 11) Ọ na-akụziri ha otú ha ga-esi mata ma ihe a na-akụziri ha n’ụlọ akwụkwọ ọ̀ bụ eziokwu. *

Ndị nne na nna, nyerenụ ụmụ unu aka ka ha nwee ike ịna-akọrọ ndị ọzọ ihe ha kweere (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

18 Mgbe ụfọdụ, a na-anụ n’akụkọ ụwa na ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtala ihe ọhụrụ ndị gosiri na e keghị mmadụ eke. E nwekwara ike ịkọ na ndị ọkà mmụta sayensị ekepụtala ihe ndị dị ndụ n’ebe ha na-anọ achọpụta ihe. Otú e si dee broshọ nke abụọ ahụ ga-enyere ụmụ akwụkwọ aka iji aka ha chọpụta ma ihe ndị ahụ a na-akọ na e keghị mmadụ eke hà bụ eziokwu. Ndị nne na nna, jirinụ akwụkwọ anyị ndị a na-enyere ụmụ unu aka ka obi kaa ha mgbe ha na-akọwara mmadụ ihe mere ha ji kwere na ọ bụ Chineke kere ihe niile.—Gụọ 1 Pita 3:15.

19. Olee ihe ùgwù anyị niile nwere?

19 Nzukọ Jehova na-eme ezigbo nchọnchọ ma wepụtara anyị akwụkwọ ndị na-akọ banyere ihe ndị Chineke kere. Akwụkwọ ndị a na-enyere anyị aka ịmụta ọtụtụ ihe banyere àgwà ndị magburu onwe ha Jehova nwere. Ihe ndị a bụ ezigbo ihe mere anyị ji kwesị iji obi anyị niile na-eto Jehova, bụ́ Chineke anyị. (Ọma 19:1, 2) Ọ bụụrụ anyị ihe ùgwù ịna-asọpụrụ Jehova, bụ́ Onye kere ihe niile, na-enyekwa ya otuto kwesịrị ya.—1 Tim. 1:17.

^ para. 3 Ị chọọ ịma otú ị ga-esi nyere ndị na-akụzi ụdị ozizi ndị ahụ aka, gụọ broshọ bụ́ Was Life Created? (ya bụ, È Kere Ihe Ndị Dị Ndụ Eke?), peeji nke 24 ruo na nke 28.

^ para. 15 Isiokwu atọ ndị si na Teta! Bekee ahụ gbara na Teta! Igbo nke October-December 2006, ya bụ, “Ihe Ndị Ọkà Mmụta Sayensị Chọpụtarala Ọ̀ Na-emegide Ihe E Dere na Jenesis?”, “Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ka Ndị Ọzọ Ghọta Ihe Mere M Ji Kwere n’Okike?”, na “Ihe I Kweere Ọ̀ Dị Ihe O Mere?”

^ para. 16 E biri nke mbụ ya na Teta! Igbo nke Jenụwarị–Febụwarị 2013. A na-ebipụta Teta! Igbo ọnwa abụọ abụọ.

^ para. 17 Ị chọọ ịgụkwu akwụkwọ anyị ndị e dere n’Igbo, ndị kwuru na ọ bụ Chineke kere ihe niile, gụọ Bịaruo Chineke Nso, isi nke 5, nakwa paragraf nke 9 ruo na nke 14 n’isi nke 17. Gụọkwa broshọ bụ́ Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, akụkụ nke 3.