Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌKTOBA 2013

Ihe Anyị Kwesịrị Ịmụta n’Ekpere E Chere Echiche Kpee

Ihe Anyị Kwesịrị Ịmụta n’Ekpere E Chere Echiche Kpee

‘Ka ha gọzie aha gị dị ebube.’NEHE. 9:5.

1. Olee nzukọ ndị ohu Chineke nwere, nke anyị ga-amụkwu gbasara ya? Olee ajụjụ ndị anyị ga-echebara echiche?

NDỊ Livaị kpọkọtara ụmụ Izrel ka ha kpegara Jehova ekpere. Ha gwara ha, sị: “Bilienụ gọzie Jehova bụ́ Chineke unu site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.” Ekpere a so n’ekpere ndị kacha too ogologo na Baịbụl. (Nehe. 9:4, 5) Ọ bụ na Jeruselem ka ha nọ kpee ya n’afọ 455 Tupu Oge Ndị Kraịst. Ha kpere ya n’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa Tishri, nke bụ́ ọnwa asaa ndị Juu. Ka anyị na-atụle ihe ndị mere tupu ụbọchị ahụ pụrụ iche, chebara ajụjụ ndị a echiche: Gịnị ka ndị Livaị na-emekarị nke mere ka nzukọ ahụ gaa nke ọma? Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ekpere ndị Livaị chere echiche kpee? Ka anyị buru ụzọ leba anya n’ihe ụfọdụ mere tupu ha enwee nzukọ ahụ pụrụ iche.—Ọma 141:2.

ỌNWA PỤRỤ ICHE

2. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka ndị Izrel?

2 Ndị Juu wughachiri mgbidi Jeruselem otu ọnwa tupu ha enwee nzukọ ahụ pụrụ iche. (Nehe. 6:15) Ha ji naanị abalị iri ise na abụọ rụchaa ya. N’abalị mbụ n’ọnwa na-eso ya, ya bụ, n’ọnwa Tishri, ha zukọtara n’ọnụ ụzọ ámá ka Ezra na ndị Livaị ndị ọzọ gụpụtara ha Iwu Chineke ma kọwaa ya. Ndị niile nọ n’ezinụlọ, ya bụ, “ndị niile pụrụ ige ntị wee ghọta ihe,” guzo ọtọ na-ege ntị “malite n’ụtụtụ ruo n’etiti ehihie.” Ihe ahụ ndị Izrel mere na-akụziri anyị ezigbo ihe taa. Ọ bụ eziokwu na anyị nwere ike ịna-amụ ihe n’ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze, mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịna-eche ihe ọzọ mgbe a na-amụ ihe. Ma, ndị Izrel ahụ gere ntị nke ọma, chebakwara ihe ha nụrụ echiche. Ha malitedịrị ibe ákwá mgbe ha ghọtara na ha anaghị eme ihe Iwu Chineke kwuru.—Nehe. 8:1-9.

3. Olee iwu ndị Izrel rubere isi na ya?

 3 Ma, ihe a abụghị oge ha ga-eji kwupụtawa mmehie ha. Ọ bụ ụbọchị ememme, Jehova chọkwara ka ha nwee obi ụtọ n’ụbọchị ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 29:1) N’ihi ya, Nehemaya gwara ha, sị: “Laanụ, rienụ ihe mara abụba, ṅụọkwanụ ihe na-atọ ụtọ, zigakwaranụ onye ọ na-enweghị ihe a kwadebeere ya ihe; n’ihi na taa dị nsọ n’ebe Onyenwe anyị nọ, unu enwekwala mwute, n’ihi na ọṅụ Jehova bụ ebe unu e wusiri ike.” Ndị Izrel mere ihe a a gwara ha ma “na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu” n’ụbọchị ahụ.—Nehe. 8:10-12.

4. Olee ihe ndị isi ezinụlọ ndị Izrel mere? Olee ihe ndị Livaị mere n’ụbọchị nke ọ bụla n’Ememme Ụlọ Ndò ahụ?

4 N’echi ya, ndị isi ezinụlọ niile zukọtara ka ha mụọ Iwu Chineke ka ha mata ma ndị Izrel hà na-erubekwa isi n’Iwu niile Chineke nyere ha. Ka ha na-amụ Iwu Chineke, ha ghọtara na ụmụ Izrel kwesịrị ime Ememme Ụlọ Ndò malite n’abalị iri na ise ruo n’abalị iri abụọ na abụọ n’ọnwa Tishri. Ha ga-enwekwa nzukọ ukwu a ga-eji emechi ya. N’ihi ya, ha malitere ịkwadebe maka ya ozugbo. Ememme Ụlọ Ndò a gara nke ọma karịa Ememme Ụlọ Ndò ndị ọzọ ụmụ Izrel metụrụla kemgbe oge Jọshụa, ha ‘ṅụrịkwara ọṅụ nke ukwuu.’ N’ụbọchị nke ọ bụla, ndị Livaị gụpụtaara ndị Izrel Iwu Chineke.—Nehe. 8:13-18.

ỤBỌCHỊ HA GA-EKWUPỤTA MMEHIE

5. Gịnị ka ndị Izrel mere tupu ndị Livaị amalite ekpere ahụ ha kpere?

5 Abalị abụọ ndị Izrel mechara ememme a, ya bụ, n’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa Tishri, ha kwupụtara mmehie ha. Ụbọchị ahụ abụghị ụbọchị oriri na ịṅụrị ọṅụ. Kama, ndị Chineke buru ọnụ, yirikwa ákwà iru uju iji gosi na o wutere ha na ha anaghị erube isi n’Iwu Chineke. Ndị Livaị jikwa ihe dị ka awa atọ gụpụtara ha Iwu Chineke n’ụtụtụ. N’ehihie, ụmụ Izrel ‘kwupụtara mmehie ha ma kpọọrọ Jehova bụ́ Chineke ha isiala.’ Ọ bụzi mgbe ahụ ka ndị Livaị malitere ikpe ekpere ahụ ha kpere maka ndị Izrel niile. —Nehe. 9:1-4.

6. Gịnị nyeere ndị Livaị aka ikpe ekpere ahụ ha kpere? Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka ha?

6 Ndị Livaị na-agụ Iwu Chineke mgbe niile. O nyeere ha aka ịmara otú ha ga-esi kpee ekpere ahụ ha kpere. Agba nke mbụ n’ekpere ahụ kwuru gbasara ihe Jehova meere ndị ya na àgwà ya dị iche iche. Ihe ndị ọzọ ndị Livaị kwuru n’ekpere ahụ bụ gbasara ọtụtụ mmehie ndị Izrel mere. Ha mekwara ka a ghọta ihe mere na ndị Izrel erughị eru ka Chineke gosi ha ‘ebere ya dị ukwuu.’ (Nehe. 9:19, 27, 28, 31) Gịnị ka ihe ahụ ndị Livaị mere na-akụziri anyị? Ọ na-akụziri anyị na anyị kwesịrị ịna-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị ma na-atụgharị uche na ya. Ọ bụrụ na anyị emee otú  ahụ, anyị na-ekwe ka Jehova na-agwa anyị okwu. Ọ bụrụzie na anyị ekpewe ekpere, anyị ga-enwe ọtụtụ ihe anyị ga-agwa Jehova. Ọ ga-emekwa ka ekpere anyị ka mma.—Ọma 1:1, 2.

7. Olee ihe ndị Livaị rịọrọ Chineke? Gịnị ka ihe ahụ ha mere na-akụziri anyị?

7 N’ekpere ahụ ndị Livaị kpere, ọ bụ naanị otu ihe ka ha rịọrọ Chineke. Mgbe ọ fọrọ obere ka ha kpechaa ekpere ahụ, ha rịọrọ Chineke, sị: “Ugbu a, Chineke anyị, bụ́ Chineke dị ukwuu, onye dị ike ma dị egwu, onye na-edebe ọgbụgba ndụ ma na-egosi obiọma, ekwela ka ihe isi ike niile dakwasịrị anyị na ndị eze anyị na ndị isi anyị na ndị nchụàjà anyị na ndị amụma anyị na nna nna anyị hà na ndị gị niile malite n’ụbọchị ndị eze Asiria ruo taa, yie ihe dị nta n’ihu gị.” (Nehe. 9:32) Ihe a ndị Livaị mere na-akụziri anyị ezigbo ihe taa. Mgbe anyị na-ekpe ekpere, anyị kwesịrị ito Jehova ma kelee ya tupu anyị arịọwa ya ihe ọ bụla.

HA TORO AHA CHINEKE DỊ EBUBE

8, 9. (a) Olee otú ndị Livaị si malite ekpere ha, nke gosiri na ha dị umeala n’obi? (b) N’ekpere ha ahụ, olee ihe ndị Jehova kere, bụ́ ndị na-eto ya?

8 Ọ bụ eziokwu na ndị Livaị chere echiche nke ọma kpee ekpere ha, ha dị umeala n’obi, ghọtakwa na ihe ha kwuru n’ekpere ahụ enweghị ebe o ruru eru iji nye Jehova otuto kwesịrị ya. N’ihi ya, ná mmalite ekpere ahụ ha kpere maka ndị Izrel, ha medara obi rịọ Jehova sị: ‘Ka ha gọzie aha gị dị ebube, bụ́ nke e buliri elu karịa ngọzi na otuto niile.’—Nehe. 9:5.

9 Ha kpekwara ekpere, sị: “Naanị gị bụ Jehova; ọ bụ gị kere eluigwe, ọbụna eluigwe nke eluigwe, na ìgwè ndị mmụọ ozi niile nọ n’ime ya, ụwa na ihe niile dị n’elu ya, oké osimiri na ihe niile dị n’ime ya; ị na-echebekwa ha niile ndụ; ìgwè ndị mmụọ ozi nke eluigwe na-akpọkwara gị isiala.” (Nehe. 9:6) N’ekpere a, ndị Livaị kwuru ụfọdụ ihe dị ebube Jehova kere. O kere eluigwe na ọtụtụ ụyọkọ kpakpando, keekwa ụwa anyị a mara mma na ihe niile dị n’ime ya. Ọ na-emekwa ka ihe ndị dị ndụ dị n’ime ya na-amụba. N’ekpere ahụ, ha kwukwara gbasara “ìgwè ndị mmụọ ozi nke eluigwe.” (1 Eze 22:19; Job 38:4, 7) Ndị mmụọ ozi ndị a na-ewetu onwe ha ala ma na-eme uche Chineke. Otú ha si eme ya bụ na ha na-ejere ụmụ mmadụ na-enweghị ihe ha bụ ozi. (Hib. 1:14) Taa, anyị niile jikwa otu obi na-ejere Jehova ozi. Anyị kwesịkwara iji obi umeala na-ejere Chineke ozi otú ahụ ndị mmụọ ozi si eme.—1 Kọr. 14:33, 40.

10. Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe Chineke meere Ebreham?

10 Ihe ọzọ ndị Livaị kwuru n’ekpere ha bụ ihe Chineke meere Ebram. Mgbe ọ dị iri afọ itoolu na itoolu, Jehova gbanwere aha ya ka ọ bụrụ Ebreham, nke pụtara “nna nke ìgwè mba dị iche iche,” n’agbanyeghị na o nweghị nwa n’oge ahụ.  (Jen. 17:1-6, 15, 16) Chineke gwakwara Ebreham na ya ga-enye mkpụrụ ya, ya bụ, ụmụ ya, ala Kenan. Ụmụ mmadụ na-echefukarị nkwa ha kwere, ma Jehova anaghị echefu nke ya. N’ekpere ahụ ndị Livaị kpere, ha kwuru otú Jehova si mezuo nkwa o kwere Ebreham. Ha sịrị: “Ị bụ Jehova bụ́ ezi Chineke, onye họọrọ Ebram wee kpọpụta ya n’obodo Ọọ nke ndị Kaldia ma mee ka aha ya bụrụ Ebreham. Ị chọpụtakwara na o kwesịrị ntụkwasị obi n’ebe ị nọ; gị na ya wee gbaa ndụ na ị ga-enye ya ala ndị Kenan, . . . na ị ga-enye mkpụrụ ya ala ahụ; i wee mezuo okwu gị, n’ihi na ị bụ onye ezi omume.” (Nehe. 9:7, 8) Ọ bụrụ na anyị na-agba mbọ mgbe niile na-emezu nkwa anyị kwere, anyị na-egosi na anyị na-eme ka Jehova.—Mat. 5:37.

IHE NDỊ MAGBURU ONWE HA JEHOVA MEERE NDỊ YA

11, 12. Gịnị ka aha bụ́ Jehova pụtara? Olee ihe Jehova meere ndị ya nke gosiri na ọ bụ ya ruru eru ịza Jehova?

11 Aha bụ́ Jehova pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.” Ihe ọ pụtara bụ na Chineke na-eme ihe o kwesịrị ime iji mezuo nkwa ya. Otu ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ otú o si mezuo nkwa o kwere ụmụ Ebreham, ya bụ, ndị Izrel. Mgbe ha na-agba ohu n’Ijipt, Chineke kwere ha nkwa na ya ga-anapụta ha n’aka ndị Ijipt ma mee ka ha banye n’Ala Nkwa. N’oge ahụ, nkwa a Chineke kwere ha yiri ihe na-agaghị eme eme. Ma, Chineke ezughị ike ruo mgbe o mechara mezuo nkwa a. O si otú ahụ gosi na ọ bụ ya ruru eru ịza Jehova.

12 N’ekpere ndị Livaị ahụ, ha kwuru ihe ụfọdụ Jehova meere ndị ya. Ha sịrị: “I wee hụ mmekpa ahụ́ nke nna nna anyị hà n’Ijipt, ị nụkwara mkpu ákwá ha n’Oké Osimiri Uhie. I wee mee ihe ịrịba ama ma rụọ ọrụ ebube megide Fero na ndị niile na-ejere ya ozi nakwa ndị ala ya niile, n’ihi na ị maara na ha mesoro ha omume mpako; i wee meere onwe gị aha dị ka ọ dị taa. I kewakwara oké osimiri n’ihu ha, ha wee jee ije n’ala akọrọ mgbe ha si n’etiti oké osimiri ahụ gafee; ị tụbakwara ndị na-achụ ha n’oké osimiri dị ka nkume a tụbara na mmiri dị ike.” Mgbe ha kwuchara ihe a, ha kwuru na Jehova nyeere ndị ya aka ka ha merie mba ndị bi n’Ala Nkwa ahụ. Ha sịrị: “I wee merie ndị bi n’ala ahụ n’ihu ha, ya bụ, ndị Kenan . . . Ha wee weghara obodo ndị e wusiri ike na ala na-eme nri, wegharakwa ụlọ ndị jupụtara n’ihe ọma niile, olulu mmiri e gwuru egwu, ubi vaịn na ubi oliv na osisi ndị na-emepụta ihe oriri n’ụba, ha malitekwara iri ihe na iriju afọ na ịma abụba na inwe ahụ́ ọma n’oké ịdị mma gị.”—Nehe. 9:9-11, 24, 25.

13. Olee ihe Jehova meere ndị Izrel obere oge ha hapụrụ Ijipt? Olee ihe ndị Izrel mechara mee?

13 E nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jehova mere ka o nwee ike imezu nkwa o kwere ndị ya. Dị ka ihe atụ, obere oge ụmụ Izrel hapụrụ Ijipt, Jehova nyere ha iwu, kụzikwaara ha otú ha ga-esi na-efe ya. Ndị Livaị kwuru n’ekpere ahụ ha kpere, sị: “Ọ bụkwa n’Ugwu Saịnaị ka ị gbadatara wee gwa ha okwu site n’eluigwe ma gaa n’ihu inye ha mkpebi ikpe ziri ezi na iwu eziokwu, ụkpụrụ dị mma na ntụziaka.” (Nehe. 9:13) Jehova họọrọ ndị Izrel ka ha bụrụ ndị ya, ọ chọkwara ime ka ha banye n’Ala Nkwa ahụ. N’ihi ya, ọ kụziiri ha otú ha ga-esi na-akpa àgwà ga-egosi na a kpọkwasịrị ha aha ya. Ma, obere oge, ha malitere inupụrụ ya isi.—Gụọ Nehemaya 9:16-18.

E KWESỊRỊ ỊDỌ NDỊ IZREL AKA NÁ NTỊ

14, 15. (a) Olee otú Jehova si meere ndị Izrel ebere? (b) Gịnị ka otú Jehova si mesoo ndị Izrel na-akụziri anyị?

14 N’ekpere ahụ ndị Livaị kpere, ha kwuru ihe abụọ na-adịghị mma ndị Izrel mere obere oge ha kwechara Chineke nkwa n’Ugwu Saịnaị na ha ga-erube isi n’Iwu ya. Ndị Izrel kwesịrị ịnwụ n’ala  ịkpa n’ihi ihe ọjọọ ndị ahụ ha mere. Ma, Jehova meere ha ebere, na-egbokwara ha mkpa ha. Ndị Livaị toro Jehova n’ekpere ahụ ha kpere. Ha kwuru, sị: “I nyekwara ha ihe oriri n’ala ịkpa ruo afọ iri anọ. Ọ dịghị ihe kọrọ ha. Uwe ha akaghị nká, ụkwụ ha azaghịkwa aza.” (Nehe. 9:19, 21) Jehova na-egbokwara anyị mkpa anyị taa ka anyị nwee ike iji obi anyị niile na-ejere ya ozi. Anyị ekwesịghị ịdị ka ọtụtụ puku ndị Izrel ahụ nwụrụ n’ala ịkpa n’ihi inupụrụ Chineke isi na enweghị okwukwe. Ihe mere e ji dee gbasara ha na Baịbụl bụ “ka ha bụụrụ anyị ihe ịdọ aka ná ntị, anyị ndị ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị a bịakwasịworo.”—1 Kọr. 10:1-11.

15 Ọ dị mwute na ndị Izrel mechara na-enupụrụ Jehova isi mgbe ha banyere n’Ala Nkwa. Ha bidoro fewe chi ndị Kenan, soro ha na-eme omume rụrụ arụ, jirikwa ụmụ ha na-achụ àjà. N’ihi ya, Jehova kwere ka ndị mba ọzọ mesie ndị Izrel ike. Ma, mgbe ọ bụla ndị Izrel chegharịrị, Jehova na-agbaghara ha, nyekwara ha aka imeri ndị iro ha. Ihe a mere “mgbe mgbe.” (Gụọ Nehemaya 9:26-28, 31.) Ndị Livaị kwuru, sị: “Ị nọ na-emere ha ebere ruo ọtụtụ afọ, jirikwa mmụọ gị na-agba àmà megide ha site n’ọnụ ndị amụma gị, ma ha egeghị ntị. N’ikpeazụ, i nyefere ha n’aka ndị ala ahụ.”—Nehe. 9:30.

16, 17. (a) Gịnị mere ndị Izrel mgbe ha malitekwara inupụrụ Jehova isi? (b) Gịnị ka ndị Izrel gwara Chineke? Olee ihe ha kwere nkwa na ha ga na-eme?

16 Mgbe ndị Izrel si Babịlọn lọta, ha malitekwara inupụrụ Jehova isi. Gịnị dị iche n’ọnọdụ ha na nke ndị nna nna ha? Ndị Livaị zara ajụjụ a n’ekpere ha kpere. Ha sịrị: “Lee! Anyị bụ ndị ohu taa; n’ihe banyere ala ahụ i nyere nna nna anyị hà ka ha rie mkpụrụ ya na ihe ọma ya, lee! anyị bụ ndị ohu na ya, mkpụrụ ya na-amịrị ndị eze n’ụba, bụ́ ndị i mere ka ha na-achị anyị n’ihi mmehie anyị, . . . anyị nọkwa n’oké ahụhụ.”—Nehe. 9:36, 37.

17 Ihe ndị Livaị na-ekwu ọ̀ bụ na ihe Chineke mere ha adịghị mma? Mba. Ha kwuru, sị: “Ị bụ onye ezi omume n’ihe niile dakwasịrị anyị, n’ihi na i mere ihe i mere n’ikwesị ntụkwasị obi, ma ọ bụ anyị bụ ndị mere ajọ omume.” (Nehe. 9:33) Mgbe ha na-emechi ekpere ahụ ha kpere, ha kwesiri Jehova nkwa ike na ndị Izrel ga na-erube isi n’Iwu ya. (Gụọ Nehemaya 9:38; 10:29) Ha dere nkwa a ha kwere Chineke n’akwụkwọ, mmadụ iri asatọ na anọ n’ime ndị isi ndị Juu abịanye aka na ya.—Nehe. 10:1-27.

18, 19. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbanye n’ụwa ọhụrụ Chineke? (b) Olee ihe anyị kwesịrị ịna-ekpe n’ekpere? Ọ bụ maka gịnị?

18 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ụdị ndị Jehova chọrọ ka ha biri n’ụwa ọhụrụ ya, o kwesịrị ịna-adọ anyị aka ná ntị. Pọl onyeozi jụrụ, sị: “Olee nwa nke nna ya na-adịghị adọ aka ná ntị?” (Hib. 12:7) Ọ bụrụ na anyị ekwe ka Jehova na-adọ anyị aka ná ntị ma jiri obi anyị niile na-ejere ya ozi, anyị na-egosi na anyị chọrọ ka ọ na-azụ anyị. Ọ bụrụkwa na anyị emee mmehie dị oké njọ, obi ga-esi anyị ike na Jehova ga-agbaghara anyị ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile chegharịa, jirikwa obi umeala nabata aka ná ntị ọ dọrọ anyị.

19 N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eme ihe ndị dị egwu karịdịrị ndị ahụ o mere mgbe ọ napụtara ndị Izrel n’aka ndị Ijipt. Ọ bụ mgbe ahụ ka mmadụ niile ga-amara na Chineke dị ebube n’eziokwu. (Ezik. 38:23) Mgbe ahụ Chineke ga-edo aha ya nsọ, ndị niile ji obi ha na-ejere ya ozi ga-abanye n’ụwa ọhụrụ ya, otú ahụ ndị Izrel si banye n’Ala Nkwa. (2 Pita 3:13) N’ihi ya, ka anyị na-ekpe ekpere ka e doo aha ya dị ebube nsọ. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-amụ ekpere ọzọ ga-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme ka Chineke nwee ike ịna-agọzi anyị ugbu a, gọziekwa anyị ruo mgbe ebighị ebi.