Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌKTOBA 2013

Na-eme Ihe Ị Mụtara n’Ekpere Dị Mkpa Jizọs Kpere

Na-eme Ihe Ị Mụtara n’Ekpere Dị Mkpa Jizọs Kpere

“Nna, . . . mee ka ọkpara gị dị ebube, ka ọkpara gị wee mee ka ị dị ebube.”—JỌN 17:1.

1, 2. Gịnị ka Jizọs mere mgbe ya na ndịozi ya mechara Ememme Ngabiga n’afọ 33?

NÁ MGBEDE, n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan n’afọ 33, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya mere Ememme Ngabiga. Ememme a chetaara ha otú Chineke si zọpụta ndị Izrel n’Ijipt. Ma, nnapụta a ga-anapụta ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-abụ ‘nnapụta na-adịru mgbe ebighị ebi,’ nke ga-aka nke ahụ a napụtara ndị Izrel. N’echi ya, (nke ka bụ́ n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan) ndị iro Jizọs ga-egbu ya. Ma, àjà ọ ga-eji ndụ ya zuru okè chụọ ga-eme ka Chineke gbapụta ụmụ mmadụ n’aka mmehie na ọnwụ.—Hib. 9:12-14.

2 Jizọs malitere ememme ọhụrụ nke ga-anọchi Ememme Ngabiga ahụ ụmụ Izrel na-eme n’afọ ọ bụla. Ihe mere o ji mee ya bụ ka anyị ghara ichefu ihe ọma a Chineke meere anyị. O weere otu ogbe achịcha na-ekoghị eko, nyawaa ya, ma nye ya ndịozi ya iri na otu kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ gwara ha, sị: “Nke a pụtara ahụ́ m nke a gaje inye n’ihi unu. Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” O bunyekwara ha iko mmanya na-acha ọbara ọbara ma sị ha: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke dabeere n’ọbara m, bụ́ nke a gaje ịwụpụ n’ihi unu.”—Luk 22:19, 20.

3. (a) Olee mgbanwe e mere mgbe Jizọs nwụchara? (b) Olee ajụjụ anyị kwesịrị ichebara echiche ka anyị na-atụle ekpere ahụ Jizọs kpere?

3 N’oge na-adịghị anya, ọgbụgba ndụ Iwu ahụ Chineke na ndị Izrel gbara ga-akwụsị. Jehova na ndị na-eso ụzọ Jizọs e tere mmanụ ga-agba ọgbụgba ndụ ọhụrụ. Jizọs achọghị ka ndị na-eso ụzọ ya yie ụmụ Izrel n’ihi na ụmụ Izrel ejighị otu obi  na-efe Chineke. Omume ha mere ka a ghara ịna-akwanyere aha Chineke ùgwù. (Jọn 7:45-49; Ọrụ 23:6-9) Jizọs chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya jiri otu obi na-efe Chineke ka ha nwee ike ime ka e too aha Chineke. N’ihi ya, gịnị ka Jizọs mere? O kpere ekpere ka Nna ya nyere ha aka. Onye ọ bụla kwesịkwara ịgụ ekpere a magburu onwe ya o kpere. (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) E dere ekpere a na Jọn 17:1-26. Ka anyị na-atụle ya, ka anyị chebara ajụjụ ndị a echiche: “Chineke ọ̀ zala ekpere ahụ Jizọs kpere? M̀ na-eme ihe Jizọs kpere n’ekpere ahụ?”

IHE KACHA JIZỌS MKPA

4, 5. (a) Olee ihe anyị mụtara n’otú Jizọs si malite ekpere ya? (b) Olee otú Jehova si za Jizọs ekpere ahụ o kpere gbasara onwe ya?

4 Jizọs kụzigideere ndị na-eso ụzọ ya ihe ruo n’etiti abalị. Ihe ndị ọ kụziiri ha bụ ihe ndị magburu onwe ha gbasara Chineke. Mgbe ọ kụzichaara ha ihe, ya elelie anya n’eluigwe ma kpee ekpere, sị: “Nna, oge awa ahụ eruwo; mee ka ọkpara gị dị ebube, ka ọkpara gị wee mee ka ị dị ebube, ebe i nyere ya ikike n’ebe anụ ahụ́ niile dị, ka o wee nye ndị ahụ niile i nyere ya ndụ ebighị ebi. . . . Emewo m ka ị dị ebube n’ụwa, ebe ọ bụ na arụchaala m ọrụ i nyere m ka m rụọ. Ya mere, ugbu a, Nna, mee ka m nwee ebube n’akụkụ gị, bụ́ ebube m nwere n’akụkụ gị mgbe ụwa na-adịbeghị.”—Jọn 17:1-5.

5 N’ekpere a, Jizọs bu ụzọ kwuo ihe ndị kacha ya mkpa. Ihe nke mbụ bụ ka e mee ka Nna ya nke eluigwe dị ebube. Ọ bụkwa otú a ka o si malite ekpere ahụ ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya. Ọ sịrị: “Nna, ka e doo aha gị nsọ.” (Luk 11:2) Ihe nke abụọ o kwuru n’ekpere ahụ bụ gbasara mkpa ndị na-eso ụzọ ya, ya bụ, ka ya ‘nye ha ndụ ebighị ebi.’ Ihe nke atọ Jizọs kwuru bụ gbasara onwe ya. O kwuru, sị: “Nna, mee ka m nwee ebube n’akụkụ gị, bụ́ ebube m nwere n’akụkụ gị mgbe ụwa na-adịbeghị.” Jehova zara ekpere ahụ Ọkpara ya kpere ma meere ya ihe kadị ihe ahụ ọ rịọrọ ya. O nyere ya “aha mara mma karịa” nke ndị mmụọ ozi niile.—Hib. 1:4.

‘ỊMATA ONYE NAANỊ YA BỤ EZI CHINEKE’

6. Gịnị ka ndịozi Jizọs kwesịrị ime ka ha nweta ndụ ebighị ebi? Olee otú anyị si mara na ha mere ya?

6 N’ekpere ahụ Jizọs kpere, o kwukwara ihe anyị kwesịrị ime ka anyị nweta ndụ ebighị ebi. (Gụọ Jọn 17:3.) O kwuru na anyị kwesịrị ‘ịmata Chineke na Kraịst nke ọma.’ Olee otú anyị nwere ike isi mee ya? Nke mbụ bụ na anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike na-amụtakwu gbasara Jehova na Ọkpara ya. Nke abụọ abụrụ na anyị kwesịrị ịna-eme ihe anyị mụtara. Ndịozi Jizọs mere ihe abụọ a. Ọ bụ ya mere o ji kwuo, sị: “Enyewo m ha okwu i nyere m, ha anatawokwa ya.” (Jọn 17:8) Ma, ha chọọ inweta ndụ ebighị ebi, ha kwesịrị ịna-atụgharị uche n’Okwu Chineke, na-emekwa ihe ha mụtara. Ndịozi Jizọs hà mere otú ahụ oge niile ha nọ n’ụwa? À na-ajụkwa ajụ? Ihe mere anyị ji mara na ha mere ya bụ na e dere aha onye nke ọ bụla n’ime ha n’elu ‘nkume iri na abụọ e ji tọọ ntọala’ Jeruselem Ọhụrụ.—Mkpu. 21:14.

7. Gịnị ka ‘ịmata Chineke nke ọma’ pụtara? Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mata Chineke nke ọma?

7 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi, anyị kwesịrị ‘ịmata Chineke nke ọma.’ Olee ihe ọ pụtara? Otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa okwu Grik e si sụgharịta ‘ịmata nke ọma’ bụ ‘ịna-amata.’ N’ihi ya, ‘ịmata Chineke nke ọma’ pụtara na anyị ga na-amụ gbasara  ya mgbe niile. Ma, ọ pụtaghị naanị na anyị ga-ama àgwà ya na nzube ya. Anyị kwesịrị iji obi anyị niile hụ ya n’anya, anyị na ya adịrịkwa n’ezigbo mma. Ihe ọzọ bụ na anyị kwesịrị ịhụ ụmụnna anyị niile n’anya. Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-enweghị ịhụnanya amaghị Chineke.” (1 Jọn 4:8) Ịmata Chineke nke ọma pụtakwara na anyị ga na-erubere ya isi. (Gụọ 1 Jọn 2:3-5.) Ọ bụ ihe ùgwù na-enweghị atụ na anyị so ná ndị ma Jehova. Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ime ihe ga-eme ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma, otú ahụ Judas Iskarịọt mere. N’ihi ya, ka anyị gbasie mbọ ike ka anyị na Jehova na-adịkwu ná mma. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, Jehova ga-enye anyị onyinye magburu onwe ya, ya bụ, ndụ ebighị ebi.—Mat. 24:13.

“N’IHI AHA GỊ”

8, 9. Olee ihe kacha Jizọs mkpa mgbe ọ nọ n’ụwa? Olee ozizi Jizọs kpọrọ asị?

8 Ọ bụrụ na anyị agụọ ekpere ahụ Jizọs kpere, nke e dere na Jọn isi iri na asaa, anyị ga-achọpụta na Jizọs ji obi ya niile hụ ma ndị na-eso ụzọ ya ma anyịnwa n’anya. (Jọn 17:20) Ma, ihe kacha Jizọs mkpa abụghị nzọpụta anyị. Ihe kacha ya mkpa bụ ka e doo aha Nna ya nsọ ma mee ka ọ dị ebube. Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs nọ n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret kwuo ihe mere o ji bịa n’ụwa, ọ gụpụtara ihe e dere n’akwụkwọ mpịakọta Aịzaya. Ebe ahụ sịrị: “Mmụọ Jehova dị n’ahụ́ m, n’ihi na o tere m mmanụ izi ndị ogbenye ozi ọma.” O doro anya na Jizọs kpọpụtara aha Chineke nke ọma mgbe ọ na-agụ ebe ahụ.—Luk 4:16-21.

9 Ọtụtụ afọ tupu Jizọs abịa n’ụwa, ndị ndú okpukpe ndị Juu na-akụziri ndị mmadụ ka ha ghara ịna-akpọ aha Chineke. O doro anyị anya na Jizọs kpọrọ ozizi ụgha a asị. Ọ gwara ndị ndú okpukpe ahụ, sị: “Abịawo m n’aha Nna m, ma unu anabataghị m; ọ bụrụ na onye ọzọ abịa n’aha onwe ya, unu ga-anabata ya.” (Jọn 5:43) Mgbe ọ fọkwara  abalị ole na ole ka e gbuo Jizọs, o kwughachiri ihe kacha ya mkpa mgbe o kpere ekpere, sị: “Nna, mee ka aha gị dị ebube.” (Jọn 12:28) N’ekpere ahụ Jizọs kpere anyị na-atụle, o dokwara anya na ihe kacha ya mkpa bụ ka e mee ka aha Nna ya dị ebube.

10, 11. (a) Olee otú Jizọs si mee ka a mata aha Nna ya? (b) Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jizọs ji na-eme ka a mata aha Jehova?

10 Jizọs kpere ekpere, sị: “Emewo m ka aha gị pụta ìhè nye ndị i si n’ụwa nye m. Ha bụ nke gị, i nyekwara m ha, ha edebewokwa okwu gị. Anọkwaghị m n’ụwa, ma ha nọ n’ụwa, m na-abịakwutekwa gị. Nna dị nsọ, chee ha nche n’ihi aha gị nke i nyere m, ka ha wee bụrụ otu, dị ka anyị bụ otu.”—Jọn 17:6, 11.

11 Mgbe Jizọs na-eme ka ndị na-eso ụzọ ya mata aha Nna ya, ihe o mere abụghị naanị ịkpọ aha Chineke. O nyeere ha aka ịmata onye Jehova bụ. Ọ kụziiri ha àgwà ndị magburu onwe ha Jehova nwere na otú o si emeso anyị ihe. (Ọpụ. 34:5-7) Jizọs bụ Eze ugbu a n’eluigwe. Ọ ka na-enyekwara ndị na-eso ụzọ ya aka ịna-eme ka a mata aha Jehova n’ụwa niile. Gịnị mere ha ji na-eme ka ndị mmadụ mata aha Jehova? Ọ bụ ka ha nwee ike inyere ọtụtụ ndị aka ka ha mụta gbasara Jehova tupu ya ebibie ụwa ọjọọ a. N’oge ahụ, ọ ga-echebe Ndịàmà ya na-erubere ya isi. Mmadụ niile ga-amarakwa aha ukwu Jehova.—Ezik. 36:23.

“KA ỤWA WEE KWERE”

12. Olee ihe atọ anyị kwesịrị ime ka anyị nwee ike ịrụcha ọrụ ahụ Jizọs bidoro?

12 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha rụchaa ọrụ ahụ o bidoro. O kpere ekpere, sị: “Dị nnọọ ka i zitere m n’ụwa, m zipụkwara ha n’ụwa.” Ma, Jizọs ma na e kwesịrị inyere ha aka ka ha nwee ike ịrụ ọrụ a. N’ihi ya, mgbe ha na ya ka nọ, ọ gbalịsiri ike nyere ha aka ka ha nwee ike imezi ebe ndị ha na-anaghị eme nke ọma. N’ekpere ahụ o kpere, ọ rịọrọ Chineke ihe atọ dị mkpa. Nke mbụ bụ ka ndị na-eso ụzọ ya ghara ịbụ nke ụwa. Nke abụọ abụrụ ka ha na-eme ihe Okwu Chineke kwuru, dịrịkwa nsọ. Nke atọ bụ ka ha dịrị n’otu, otú ahụ ya na Nna ya dị n’otu. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘M̀ na-eme ihe atọ a Jizọs kwuru n’ekpere ahụ o kpere?’ Jizọs ma na ọ bụrụ na ndị na-eso ụzọ ya emee ihe atọ ahụ, ọtụtụ ndị ga-anabata ozi ha.—Gụọ Jọn 17:15-21.

Ọ bụ mmụọ nsọ Jehova mere ka ndị na-eso ụzọ Jizọs oge mbụ dịrị n’otu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

13. Olee otú Jehova si za ekpere ahụ Jizọs kpere maka ndị na-eso ụzọ ya?

13 Ọ bụrụ na anyị agụọ akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, anyị ga-ahụ na Jehova zara ekpere ahụ Jizọs kpere. Ụfọdụ Ndị Kraịst oge mbụ bụ ndị Juu, ụfọdụ abụrụ ndị Jentaịl. E nwekwara ndị ọgaranya, ndị ogbenye, ndị ohu, na ndị a na-agbara ohu. Ọ gaara eme ka ha ghara ịdị n’otu. Ma, ndị na-eso ụzọ Jizọs dị n’otu. Ọ bụ ya mere Pọl ji were ha tụnyere akụkụ ahụ́ dị iche iche, Jizọs abụrụ isi ha. (Efe. 4:15, 16) Ọ bụ mmụọ nsọ Jehova mere ka ndị na-eso ụzọ Jizọs dịrị n’otu n’oge ahụ n’ụwa Setan ndị mmadụ na-adịghị n’otu.—1 Kọr. 3:5-7.

Ndị Jehova n’ụwa niile dị n’otu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14. N’oge anyị a, olee otú Jehova sirila za ekpere ahụ Jizọs kpere?

14 Ọ dị mwute na ihe gbanwere mgbe ndịozi Jizọs nwụchara. Ọtụtụ ndị si n’ezi ofufe dapụ n’oge ahụ. Ụfọdụ ndị malitere izi ozizi ụgha n’ọgbakọ. Ọ bụ ya mere e ji nwee chọọchị dị iche iche nke Krisendọm. (Ọrụ 20:29, 30) Ma, n’afọ 1919, Jizọs mere ka a ghara inwe ihe jikọrọ Ndị Kraịst e tere mmanụ na okpukpe ụgha, meekwa ka ha  dịrị n’otu ‘n’ihe nkekọ zuru okè.’ (Kọl. 3:14) Olee uru otu obi ha ji na-ekwusa ozi ọma barala? O meela ka ihe karịrị nde mmadụ asaa si “ná mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile” soro ndị e tere mmanụ jiri otu obi na-efe Jehova. (Jọn 10:16; Mkpu. 7:9) Ihe a na-egosi na Jehova azala ekpere ahụ Jizọs kpere, nke bụ́ “ka ụwa wee mara na ọ bụ gị zitere m, marakwa na ị hụrụ ha n’anya dị nnọọ ka ị hụrụ m n’anya.”—Jọn 17:23.

OTÚ MARA MMA JIZỌS SI MECHIE EKPERE YA

15. Olee ihe pụrụ iche Jizọs rịọrọ Jehova ka o meere ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ?

15 Ná mgbede, n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan, Jizọs bu ụzọ nye ndị na-eso ụzọ ya “otuto,” ma ọ bụ kwanyere ha ùgwù, tupu ha emewe Ememme Ngabiga. Otú o si nye ha “otuto” bụ na ha na ya gbara ndụ na ha ga-eso ya chịa n’Alaeze ya. (Luk 22:28-30; Jọn 17:22) N’ihi ya, Jizọs kpeziri ekpere maka ndị niile ga-abụ ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ. Ọ sịrị: “Nna, banyere ihe i nyere m, ọ dị m ka ya bụrụ na ha onwe ha ga-eso m nọrọ n’ebe m nọ, ka ha wee hụ ebube i nyere m, n’ihi na ị hụrụ m n’anya tupu a tọọ ntọala ụwa.” (Jọn 17:24) Atụrụ ọzọ ahụ anaghị emere ndị e tere mmanụ anyaụfụ maka ụgwọ ọrụ Jehova ga-akwụ ha, kama, obi dị ha ụtọ. Nke a gosiri na ezigbo Ndị Kraịst niile dị n’otu taa.

16, 17. (a) Mgbe Jizọs na-emechi ekpere ya, olee ihe ọ sị na ya ga na-eme? (b) Olee ihe anyị kwesịrị ịna-eme?

16 Ọtụtụ ndị bi n’ụwa taa achọdịghị ịma na e nwere ndị maara Jehova nke ọma ma dịrị n’otu. Ihe mere na ha achọdịghị ịma bụ na ndị ndú okpukpe na-akụziri ha ihe ndị na-abụghị eziokwu banyere Chineke. Ụdị ihe a mekwara n’oge Jizọs nọ n’ụwa. N’ihi ya, otú o si mechie ekpere ahụ o kpere bụ: “Nna bụ́ onye ezi omume, n’ezie, ụwa amarabeghị gị; ma amarawo m gị, ndị a amarawokwa na ọ bụ gị zitere m. Emewokwa m ka ha mara aha gị, m ga-emekwa ka a mara ya, ka ịhụnanya i nwere n’ebe m nọ wee dịrị n’ime ha, mụ na ha adịkwa n’otu.”—Jọn 17:25, 26.

17 N’eziokwu, Jizọs mere ka a mara aha Nna ya. Ugbu a ọ bụ Onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst, ọ ka na-enyere anyị aka ịna-eme ka ndị mmadụ mara aha Nna ya na nzube ya. Ka anyị na-erubere Jizọs isi ma jiri obi anyị niile na-ekwusa ozi ọma, na-emekwa ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. (Mat. 28:19, 20; Ọrụ 10:42) Ebe ọ bụ na anyị bụ ndị Chineke, ka anyị gbasiekwa mbọ ike na-adị n’otu. Anyị mee ihe ndị a, ọ ga-egosi na anyị na-eme ihe ndị ahụ Jizọs kpere n’ekpere. Ọ ga-eme ka e nye aha Jehova otuto, meekwa ka obi na-atọ anyị ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.