Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) SEPTEMBA 2013

Mee Ka Ihe Jehova Na-echetara Anyị Na-eme Gị Obi Ụtọ

Mee Ka Ihe Jehova Na-echetara Anyị Na-eme Gị Obi Ụtọ

“Ewerewo m ihe ncheta gị ka ọ bụrụ ihe onwunwe m ruo mgbe ebighị ebi.”—ỌMA 119:111.

1. (a) Olee ihe ndị mmadụ na-eme ma a gwa ha ihe ha ga-eme, gịnịkwa kpatara ya? (b) Gịnị ka onye dị mpako na-eme ma a dụọ ya ọdụ?

Ọ NA-ABỤ, a gwa ndị mmadụ ihe ha ga-eme, ihe otu onye ga-eme na-adị iche n’ihe onye ọzọ ga-eme. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị nwere ike ime ihe onye isi ha gwara ha, ma ha agaghị eme ihe onye ọgbọ ha ma ọ bụ onye na-anọghị n’isi gwara ha. Ọ na-abụkwa, a dụọ ndị ụfọdụ ọdụ ma ọ bụ dọọ ha aka ná ntị, ha ewewe iwe, obi ajọwa ha njọ, ma ọ bụkwanụ ihere emewe ha. Ma, a dọọ ndị ọzọ aka ná ntị ma ọ bụ dụọ ha ọdụ, obi na-adị ha mma, ha achọọkwa otú ha ga-esi na-emekwu nke ọma. Gịnị kpatara ya? Otu ihe na-akpata ya bụ mpako. A dụọ onye dị mpako ọdụ, ọ na-eche na ihe ahụ a gwara ya agbasaghị ya. Ya emee ka ọ ghara ime ihe ahụ a gwara ya, meekwa ka ihe ahụ ghara ịbara ya uru.—Ilu 16:18.

2. Gịnị mere na ezigbo Ndị Kraịst anaghị eji ihe a gwara ha n’Okwu Chineke egwu egwu?

2 Ezigbo Ndị Kraịst anaghị eme otú ahụ. Anyị anaghị eji ezigbo ndụmọdụ egwu egwu, nke ka nke, ma ọ bụrụ na o si n’Okwu Chineke. Ihe Jehova na-akụziri anyị na-eme ka anyị mata nsogbu ịkpa àgwà ọjọọ ga-akpata. Dị ka ihe atụ, ọ na-eme ka anyị ghara ime ihe ndị nwere ike ịkpatara anyị nsogbu. Ụfọdụ n’ime ha bụ, ịchụ ego ọnwụ ọnwụ, ịkwa iko, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, na ịṅụ oké mmanya. (Ilu 20:1; 2 Kọr. 7:1; 1 Tesa. 4:3-5; 1 Tim. 6:6-11) Ihe ọzọ bụ na ‘obi na-adị anyị mma’ n’ihi na anyị na-erubere Chineke isi.—Aịza. 65:14.

3. Olee ihe otu ọbụ abụ mere, nke anyị kwesịkwara ime?

3 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Chineke na-adị ná mma, anyị ga na-eme ihe ọ gwara anyị mgbe niile. Anyị kwesịrị ịna-eme ka otu ọbụ abụ. O dere, sị: “Ewerewo m ihe ncheta gị ka ọ bụrụ ihe onwunwe m ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na ọ bụ ihe na-enye obi m aṅụrị.” (Ọma 119:111) Obi ọ̀ na-adị gị ụtọ irubere Jehova  isi otú ahụ ọ dị ọbụ abụ a? Ka ị̀ na-eche mgbe ụfọdụ na ị gaghị edebeli iwu Chineke? Ọ bụrụgodị na ime ihe Jehova gwara gị na-esiri gị ike mgbe ụfọdụ, ike agwụla gị. E nwere ihe ụfọdụ ga-enyere gị aka ịtụkwasịkwu Chineke obi na ihe ndị ọ na-agwa gị mee ga-abara gị uru. Ka anyị tụlee atọ n’ime ha.

NA-EKPE EKPERE KA I NWEE IKE ỊTỤKWASỊKWU CHINEKE OBI

4. Gịnị ka Devid mere oge niile ọ dị ndụ?

4 Mgbe Devid dị ndụ, e nwere oge ihe dịịrị ya mma, nweekwa oge ihe siiri ya ike. Ma, e nwere ihe Devid mere n’oge ahụ niile. Ọ tụkwasịrị Jehova obi ya niile. O kwuru, sị: “Jehova, ọ bụ gị ka m na-enye mkpụrụ obi m. Chineke m, ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi.” (Ọma 25:1, 2) Gịnị nyeere Devid aka ịtụkwasị Nna ya nke eluigwe obi ya niile?

5, 6. Gịnị ka ekpere Devid kpegaara Jehova na-egosi?

5 Mgbe ọtụtụ ndị na-echeta ikpegara Chineke ekpere bụ mgbe ha nọ ná nnukwu nsogbu. Ha na-eme ka enyi nke na-agwa enyi ya okwu naanị mgbe ọ chọrọ ka o nye ya ego, ma ọ bụkwanụ mgbe ọ chọrọ ka enyi ya meere ya ihe. Ka oge na-aga, enyi ya ahụ nwere ike ichewe ma ọ̀ hụkwara ya n’anya n’eziokwu. Ma, Devid na Jehova abụghị ụdị ndị enyi ahụ. Ma mgbe ihe dịịrị Devid mma ma mgbe ihe siiri ya ike, ekpere ya gosiri na o ji obi ya niile hụ Jehova n’anya ma tụkwasị ya obi.—Ọma 40:8.

6 Devid toro Jehova ma kelee ya. Ọ sịrị: “Jehova bụ́ Onyenwe anyị, lee ka aha gị si dị ebube n’ụwa dum, gị onye a na-akọ akụkọ ịdị ebube ya n’eluigwe!” (Ọma 8:1) Í cheghị na ihe a Devid kwuru gosiri na ya na Nna ya nke eluigwe dị n’ezigbo mma? Mgbe Devid chọpụtara otú Chineke si dị ukwuu, dịkwa ebube, obi tọrọ ya ezigbo ụtọ, ya emezie ka o too Jehova “ogologo ụbọchị dum.”—Ọma 35:28.

7. Olee uru ikpegara Chineke ekpere mgbe niile na-abara anyị?

7 Anyị kwesịrị ikpegara Jehova ekpere mgbe niile otú ahụ Devid mere. Ọ ga-eme ka anyị tụkwasịkwuo ya obi. Baịbụl kwuru, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) Ikpegara Chineke ekpere na-eme ka anyị bịarukwuo ya nso. O sokwa n’ihe dị mkpa anyị ga-eme ka Chineke nye anyị mmụọ nsọ ya.—Gụọ 1 Jọn 3:22.

8. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịna-ekwu otu ihe mgbe ọ bụla anyị na-ekpe ekpere?

8 Ọ̀ bụ otu ihe ka ị na-ekwukarị mgbe ọ bụla ị na-ekpe ekpere? Ya bụrụ otú ahụ, gbalịa jiri nkeji ole na ole chebara ihe ị ga-ekwu echiche tupu gị ekpewe ekpere. Dị ka ihe atụ, olee otú obi ga-adị enyi gị ma ọ bụrụ na ọ bụ otu ihe ka ị na-agwa ya mgbe ọ bụla ị hụrụ ya? E nwere ike ọ gaghị achọzi ige gị ntị ma ị na-agwa ya okwu. O nweghị mgbe Jehova na-agaghị ege anyị ntị ma anyị jiri obi anyị niile kpegara ya ekpere. Ma, anyị kwesịrị ịgba mbọ ka anyị ghara ịna-ekwu otu ihe mgbe ọ bụla anyị na-ekpe ekpere.

9, 10. (a) Olee ihe ndị anyị kwesịrị ịgwa Chineke mgbe anyị na-ekpe ekpere? (b) Gịnị ga-enyere anyị aka isi n’ala ala obi anyị na-ekpe ekpere?

9 O doro anya na anyị chọọ ka anyị na Chineke dịkwuo ná mma, anyị kwesịrị isi n’ala ala obi anyị na-agwa ya okwu. Ọ bụrụ na anyị na-agwa ya okwu otú ọ dị anyị n’obi, ọ ga-eme ka anyị tụkwasịkwuo ya obi. Oleezi ihe ndị anyị kwesịrị ịgwa Chineke mgbe anyị na-ekpe ekpere? Okwu Chineke zara ajụjụ a. Ọ sịrị: “N’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ.” (Fil. 4:6) Ihe anyị kwesịrị ịna-ekpe n’ekpere bụ ihe ọ bụla bụ́ mkpa anyị nakwa ihe ọ bụla ga-eme ka anyị na Chineke dịkwuo ná mma.

10 Anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe ma ọ bụrụ na anyị agụọ ekpere ndị fere  Chineke n’oge gara aga kpere. (1 Sam. 1:10, 11; Ọrụ 4:24-31) Dị ka ihe atụ, ị gụọ akwụkwọ Abụ Ọma, ị ga-ahụ ọtụtụ ekpere ndị ohu Chineke si n’ala ala obi ha kpegara Jehova na abụ ndị ha ji obi ha niile bụkuo ya. Ekpere ndị ahụ na abụ ndị ahụ gosiri na e nwere mgbe obi na-adịghị ha mma, nweekwa mgbe obi dị ha mma. Ọ bụrụ na anyị amụọ ekpere ndị ahụ ha kpere, ọ ga-eme ka anyị na-esi n’ala ala obi anyị na-ekpe ekpere.

NA-ECHEBARA IHE CHINEKE NA-ECHETARA ANYỊ ECHICHE

11. Olee ihe mere anyị kwesịrị iji na-echebara ihe Baịbụl gwara anyị mee echiche?

11 Devid kwuru, sị: “Ihe ncheta Jehova bụ ihe a pụrụ ịtụkwasị obi, na-eme ka onye na-amaghị ihe mara ihe.” (Ọma 19:7) Ọ bụrụgodị na anyị amaghị nke a na-akọ, anyị ga-ama ihe ma ọ bụrụ na anyị na-erube isi n’iwu Chineke. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-eme uche Chineke, e nwere ihe ụfọdụ e kwuru na Baịbụl anyị kwesịrị ịna-echebara echiche. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị echebara ndụmọdụ ndị e nyere anyị na Baịbụl echiche, ọ ga-eme ka anyị rubere Chineke isi ma ọnwụnwa bịara anyị n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ebe anyị na-arụ ọrụ. Ọ ga-emekwa ka anyị ghara ikwe ka a mịnye anyị ọbara, meekwa ka anyị ghara itinye aka n’ihe gbasara ọchịchị ma ọ bụ agha. Ọ ga-emekwa ka anyị mee ihe Baịbụl kwuru mgbe anyị na-ahọrọ ụdị uwe anyị ga-eyi. Ichebara ihe Chineke gwara anyị mee echiche ga-eme ka anyị jikere ejikere tupu e jiri ihe ndị a nwaa anyị ọnwụnwa. Ọ bụrụ na anyị ejikere ejikere, ọ ga-eme ka anyị kpebie ihe anyị ga-eme tupu ọnwụnwa abịara anyị. Anyị mee otú ahụ, anyị agaghị eme ihe anyị ga-emecha kwaa mmakwaara.—Ilu 15:28.

12. Olee ajụjụ ndị ga-enyere anyị aka ịna-echebara ihe Chineke na-echetara anyị echiche?

12 Ka anyị na-eche ka Chineke mezuo ihe ndị o kwere anyị ná nkwa, ànyị na-eme ihe gosiri na anyị kwetasiri ike na ọ ga-emere anyị ihe ndị ahụ nakwa na ime uche ya ka bụ ihe kacha anyị mkpa? Dị ka ihe atụ, ànyị kwetasiri ike na Chineke ga-ebibi Babịlọn Ukwu ahụ n’oge na-adịghị anya? Anyị cheta ihe ndị ahụ Chineke kwere nkwa imere anyị, dị ka ime ka ụwa ghọọ paradaịs na ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ, obi ọ̀ ka siri anyị ike na ọ ga-eme ihe ndị ahụ otú ahụ o siri anyị mgbe mbụ a kụziiri anyị ha? Ànyị ka na-ejechi ozi ọma anya, ka ihe na-echu anyị ụra ọ̀ bụ mkpa nke anyị? Ihe anyị na-eme ò gosiri na ido aha Jehova nsọ na igosi na ọ bụ ya kwesịrị ịchị ihe niile o kere ka dị anyị mkpa? Ọ bụrụ na anyị na-echebara ụdị ajụjụ ndị a echiche, ọ ga-eme ka anyị mee ka ‘ihe ncheta Chineke bụrụ ihe onwunwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.’—Ọma 119:111.

13. Gịnị mere na ndịozi Jizọs aghọtachaghị ihe ụfọdụ e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ? Nye ihe atụ.

13 E nwere ihe ụfọdụ dị na Baịbụl anyị na-anaghị aghọtacha n’ihi na oge erubeghị ka Jehova kọwaara anyị ha. Jizọs gwara ndịozi ya ugboro ugboro na ya ga-ata ahụhụ, e gbuokwa ya. (Gụọ Matiu 12:40; 16:21.) Ma, ndịozi ya aghọtaghị ihe a ọ gwara ha. Mgbe ha ghọtara ya bụ mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ya apụta n’ihu ndị na-eso ụzọ ya, ma “mepee obi ha nke ọma ka ha ghọta ihe Akwụkwọ Nsọ pụtara.” (Luk 24:44-46; Ọrụ 1:3) Ọ bụkwa mgbe e nyechara ndị na-eso ụzọ Jizọs mmụọ nsọ na Pentikọst afọ 33 ka ha ghọtara na Alaeze Chineke ga-esi n’eluigwe na-achị.—Ọrụ 1:6-8.

14. N’oge anyị a, gịnị ka ọtụtụ ụmụnna anyị mere n’agbanyeghị na ihe ụfọdụ ha chere ga-eme n’oge ikpeazụ emeghị?

14 N’oge anyị a, e nwere ihe ezigbo Ndị Kraịst chere ga-eme “n’oge ikpeazụ,” ma ihe ahụ emeghị. (2 Tim. 3:1) Dị ka ihe atụ, n’afọ 1914, ụfọdụ ndị chere na a ga-akpọga ha eluigwe n’oge na-adịghị anya,  ma o meghị. Nke ahụ emeghị ka ha kwụsị ịmụ Baịbụl. Ka ha na-amụ Baịbụl, ha ghọtara na e kwesịrị ibu ụzọ kwusaa ozi ọma n’ụwa niile tupu ha agawa eluigwe. (Mak 13:10) N’ihi ya, n’afọ 1922, J. F. Rutherford gwara ndị bịara mgbakọ mba niile e nwere na Sida Pọịnt, Ohayo, dị n’Amerịka, sị: “Lee, Eze ahụ na-achị achị! Unu bụ ndị na-ekwusa ozi ya. N’ihi ya, kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ Eze ahụ na alaeze ya.” Kemgbe ahụ, ‘ikwusa ozi ọma alaeze Chineke’ bụ ihe e ji mara Ndịàmà Jehova.—Mat. 4:23; 24:14.

15. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-echebara ihe Jehova meere ndị ya echiche?

15 Anyị kwesịrị ịna-atụgharị uche n’otú Jehova si mezuo nkwa ndị o kwere ndị ya, ma n’oge ochie ma n’oge anyị a. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, ọ ga-eme ka anyị tụkwasịkwuo Jehova obi na ọ ga-emezu nzube ya n’ọdịnihu. Ichebara nkwa ndị Chineke kwere anyị echiche na-eme ka obi na-atọ anyị ụtọ, na-emekwa ka obi sikwuo anyị ike na ha ga-emezu.

KA Ị NA-EFE CHINEKE, NA-ATỤKWASỊKWU YA OBI

16. Olee uru anyị ga-erite ma anyị jiri ozi Chineke kpọrọ ihe?

16 Jehova nwere ike na-enweghị atụ, ọ na-arụsikwa ọrụ ike. Otu ọbụ abụ kwuru, sị: “Ònye dị ike ka gị, Jaa?” O kwukwara, sị: “Aka gị dị ike, aka nri gị dị elu.” (Ọma 89:8, 13) Ebe ọ bụ na Jehova na-arụsi ọrụ ike, obi na-atọ ya ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-ejere ya ozi, ọ na-agọzikwa anyị. Ọ na-eme ka ndị ohu ya niile, ma onye ukwu ma onye nta, ghara iri “nri umengwụ.” (Ilu 31:27) Ọ bụrụ na anyị ji ozi Jehova kpọrọ ihe, anyị ga na-arụsi ọrụ ike ka ya. Obi na-atọ ma anyịnwa ma Jehova ụtọ ma anyị jiri obi anyị niile na-ejere ya ozi.—Gụọ Abụ Ọma 62:12.

17, 18. Olee otú ime ihe Jehova kwuru si eme ka anyị tụkwasịkwuo ya obi? Nye ihe atụ.

 17 Olee otú ife Jehova si eme ka anyị na-atụkwasịkwu ya obi? Ka anyị tụlee ihe mere mgbe ọ fọrọ obere ka ndị Izrel banye n’Ala Nkwa. Jehova gwara ndị nchụàjà bu igbe ọgbụgba ndụ ya ka ha banye n’Osimiri Jọdan. Ma, mgbe ndị Izrel rutere n’osimiri ahụ, ha chọpụtara na o tojuola ma na-asọsi ike n’ihi mmiri ozuzo. Gịnịzi ka ha ga-eme? Ebe ọ bụ na ha amaghị izu ole ọ ga-ewe tupu mmiri ahụ atalata, hà ga-ama ụlọikwuu n’akụkụ osimiri ahụ, na-eche ka ọ talata? Ha emeghị otú ahụ. Kama, ha tụkwasịrị Jehova obi ha niile, meekwa ihe ọ gwara ha. Gịnị meziri? Baịbụl kwuru, sị: ‘Ozugbo ụkwụ ndị nchụàjà bụ́ ndị bu Igbe ahụ zọnyere n’ọnụ ọnụ mmiri, mmiri nke na-esi n’ebe mgbago asọdata wee guzoro otu ebe. Ụmụ Izrel wee si n’ihu Jeriko gafee. Ka ọ dị mgbe ahụ, ndị nchụàjà bụ́ ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Jehova kwụụrụ n’ala akọrọ n’etiti Jọdan, ka Izrel dum nọ na-agafere n’ala akọrọ.’ (Jọsh. 3:12-17) Obi tọrọ ụmụ Izrel ezigbo ụtọ mgbe ha hụrụ na mmiri ahụ na-asọsi ike akwụsịla ịsọ. Ndị Izrel mere ihe Jehova kwuru, ya emezie ka okwukwe ha sikwuo ike.

Ị̀ ga-egosi na ị tụkwasịrị Jehova obi otú ahụ ndị Izrel tụkwasịrị ya n’oge Jọshụa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17 na 18)

18 Jehova anaghị arụrụ ndị ohu ya ụdị ọrụ ebube ahụ taa. Ma, ọ na-agọzi anyị ma anyị tụkwasị ya obi, mee ihe ọ gwara anyị. Mmụọ nsọ Chineke na-eme ka anyị jiri obi ike na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile. Jizọs Kraịst kwekwara ndị na-eso ụzọ ya nkwa na ya ga-anọnyere ha n’ọrụ a dị mkpa ha na-arụ. Ọ bụ ya bụ onye kacha gbaa àmà gbasara Jehova. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m . . . M nọnyeere unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.” (Mat. 28:19, 20) E nwere ọtụtụ ụmụnna anyị ihere izi ndị ọzọ ozi ọma na-eme, nweekwa ndị nke na-atụ ụjọ. Ma ha kwuru na ọ bụ mmụọ nsọ Chineke nyeere ha aka ịkata obi na-ezi ndị ha na-amaghị ozi ọma.—Gụọ Abụ Ọma 119:46; 2 Ndị Kọrịnt 4:7.

19. Ọ bụrụgodị na ọrịa ma ọ bụ nká anaghị ekwe anyị jee ozi otú anyị chọrọ, gịnị ka anyị kwesịrị icheta?

19 Ọrịa ma ọ bụ nká emeela ka ụfọdụ ụmụnna anyị ghara ịna-ejechara Jehova ozi otú ha chọrọ. Ma, obi kwesịrị isi ha ike na “Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi niile” ma ihe ha na ya na-alụ. (2 Kọr. 1:3) Ọ naghị eji ozi anyị ji obi anyị niile na-ejere ya egwu egwu. Ọ bụ eziokwu na anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-ejere Jehova ozi, anyị niile kwesịrị icheta na ọ bụ okwukwe anyị nwere n’àjà Jizọs chụrụ iji gbapụta anyị ga-eme ka a zọpụta anyị.—Hib. 10:39.

20, 21. Olee ụzọ ụfọdụ anyị si egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi?

20 Anyị kwesịrị iji oge anyị, ike anyị, na ihe ndị ọzọ anyị nwere na-ejere Jehova ozi otú anyị nwere ike. Anyị kwesịkwara iji obi anyị niile ‘na-arụ ọrụ izisa ozi ọma.’ (2 Tim. 4:5) Nke bụ́ eziokwu bụ na obi na-atọ anyị ụtọ na anyị na-enyere ndị ọzọ aka ka ‘ha nweta ezi ihe ọmụma nke eziokwu.’ (1 Tim. 2:4) O doro anya na ịsọpụrụ Jehova na inye ya otuto na-eme anyị ọgaranya. (Ilu 10:22) Ọ na-emekwa ka anyị na-atụkwasị Jehova obi mgbe niile, ihe ọ sọkwara ya mee.—Rom 8:35-39.

21 N’isiokwu a, anyị achọpụtala na ọ bụrụ na anyị chọrọ ịtụkwasị Jehova obi, anyị kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike. N’ihi ya, gbalịa na-ekpe ekpere ka i nwee ike ịtụkwasịkwu ya obi. Chebara otú Jehova si mezuo nkwa o kwere ndị ya n’oge ochie echiche nakwa otú ọ ga-esi emezu nkwa ndị o kwere anyị. Ka ị na-efe Jehova, gbalịa na-eme ihe ndị ga-eme ka ị tụkwasịkwuo ya obi. Cheta na ihe Jehova na-echetara anyị ga-adịru mgbe ebighị ebi. Ọ bụrụkwa na i mee ihe ndị ahụ, ị ga-adị ndụ ebighị ebi.