Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) SEPTEMBA 2013

Ị̀ Gbanweela?

Ị̀ Gbanweela?

“Gbanweenụ site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ.”—ROM 12:2.

1, 2. Olee otú otú e si zụọ anyị na ebe anyị bi si gbasa ihe anyị na-eme?

ANYỊ niile nwere otú anyị si eji ejiji, ụdị nri anyị na-eri, na ụdị àgwà anyị na-akpa. Ihe na-akpatakarị ya bụ otú e si zụọ anyị, ebe anyị bi, na ndị anyị na ha na-akpa.

2 Ma, e nwere ihe ndị dị mkpa karịa ụdị nri anyị na-eri na ụdị ejiji anyị na-eji. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-eto, a na-akụziri anyị na e nwere ihe ndị dị mma na ihe ndị na-adịghị mma. Ma, ihe otu onye kpọrọ ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ nwere ike ịdị iche n’ihe onye ọzọ kpọrọ ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. Akọnuche anyị nwekwara ike ime ka anyị na-eme ihe ụfọdụ otú anyị si eme ha. Baịbụl kwuru na ọtụtụ mgbe, “ndị mba ọzọ, ndị na-enweghị iwu, . . . na-eme ihe ndị dị n’iwu.” (Rom 2:14) Ma, e nwee ihe Chineke na-enyeghị iwu ọ bụla banyere ya, ọ̀ pụtara na anyị nwere ike ime ya otú ndị ezinụlọ anyị ma ọ bụ ndị obodo anyị si eme ya?

3. Olee ihe abụọ mere na Ndị Kraịst anaghị akpa àgwà otú ndị ụwa si akpa?

3 Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, e nwere ihe abụọ dị mkpa mere na Ndị Kraịst ekwesịghị ime otú ahụ. Nke mbụ bụ na Baịbụl gwara anyị, sị: “E nwere ụzọ nke ziri ezi n’anya mmadụ, ma ụzọ ọnwụ ka nsọtụ ya ga-emecha bụrụ.” (Ilu 16:25) Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị enweghị ike ikpebi ihe ga-abara anyị uru mgbe niile. (Ilu 28:26; Jere. 10:23) Nke abụọ bụ na Baịbụl kwuru na ọ bụ Setan bụ “chi nke usoro ihe a.” Ọ bụ ya na-ekpebi ihe a na-eme n’ụwa, ma ihe ndị ụwa na-ewere ka ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ ma ihe ndị na-ewu ewu. (2 Kọr. 4:4; 1 Jọn 5:19) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova gọzie anyị ma na-ele anyị anya ọma, anyị kwesịrị ime ihe e kwuru ná Ndị Rom 12:2.Gụọ ya.

4. Olee ihe ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

4 E nwere ihe atọ dị mkpa e kwuru ná Ndị Rom 12:2 anyị ga-atụle n’isiokwu a. Nke mbụ bụ, Gịnị mere anyị ji kwesị ‘ịgbanwe’? Nke abụọ abụrụ, Olee  ihe anyị kwesịrị ịgbanwe? Nke atọ abụrụ, Olee otú anyị nwere ike isi gbanwee? Ka anyị zaa ajụjụ atọ a.

GỊNỊ MERE ANYỊ JI KWESỊ ỊGBANWE?

5. Ole ndị ka Pọl gwara ihe ahụ o dere ná Ndị Rom 12:2?

5 N’akwụkwọ ozi ahụ Pọl onyeozi degaara ndị Rom n’ihe dị ka n’afọ 56, ọ bụghị ndị niile bi na Rom ka o degaara ya. Ndị o degaara ya bụ Ndị Kraịst ibe ya e tere mmanụ bi ebe ahụ. (Rom 1:7) Ọ gbara ha ume ka ha gbanwee ma ‘kwụsị ime omume dị ka usoro ihe nke a si dị.’ Ihe ndị e nwere ‘n’usoro ihe’ dị mgbe ahụ bụ ihe ndị Rom weere ka ihe ọma na ihe ọjọọ, omenala ha, àgwà ha, na otú ha si eji ejiji. Ihe mere Pọl ji gwa Ndị Kraịst ka ha kwụsị ime ka usoro ihe dị mgbe ahụ bụ na e nwere ụmụnna ndị ka na-akpa àgwà otú ndị Rom si akpa, na-echekwa echiche otú ha si eche. Olee nsogbu ọ kpataara ha?

6, 7. N’oge Pọl, gịnị mere ihe ji na-esiri Ndị Kraịst bi na Rom ike?

6 Taa, ndị na-aga Rom na-ahụ ụlọ nsọ ndị dakasịrị adakasị, ili na ámá egwuregwu ndị merela ochie, na ihe ndị a kpụrụ n’oge ochie. A rụrụ ihe ahụ niile ọtụtụ puku afọ gara aga. Ihe ndị ahụ na-enyere anyị aka ịmata otú ndị Rom oge ochie si bie ndụ nakwa ụdị chi ndị ha fere. E nwekwara akwụkwọ ndị kọrọ banyere egwuregwu ebe anụ ọhịa na-adọgbu mmadụ, ọsọ e ji ụgbọ ịnyịnya agba, na egwuregwu na egwú ndị ụfọdụ n’ime ha rụrụ arụ. Rom bụ obodo bara ọgaranya. E nwekwara ọtụtụ ihe ndị mmadụ ji akpa ego na ya.—Rom 6:21; 1 Pita 4:3, 4.

7 N’oge ochie, ndị Rom nwere ọtụtụ ụlọ nsọ, na-efekwa ọtụtụ chi. Ma, ọtụtụ ndị anaghị agbalị ka ha na chi ndị ahụ ha na-efe dị ná mma. Ihe ka ha mkpa bụ ime ememme ndị ha na-eme n’okpukpe ha, ma nke ọmụmụ ma nke ịlụ di na nwunye ma nke ili ozu. Ha na-eme ememme ndị ahụ kwa ụbọchị. O doro anya na ihe ndị ahụ mere ka ihe na-esiri Ndị Kraịst bi na Rom ike n’oge ahụ. Ọtụtụ n’ime ha na-efebu chi ụgha ndị ahụ. N’ihi ya, mgbe ha chọrọ ịghọ Ndị Kraịst, ha gbanwere. Mgbe e mechara ha baptizim, a ka nwere ihe ndị ha kwesịrị ịgbanwe n’àgwà ha.

8. Gịnị mere ihe ji esiri Ndị Kraịst ike n’ụwa taa?

8 Ihe ụfọdụ a na-eme n’ụwa taa na-eme ka ihe na-esiri Ndị Kraịst ike otú ahụ o siiri Ndị Kraịst bi na Rom n’oge ochie. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na mmụọ nke ụwa juru ebe niile. (Gụọ Ndị Efesọs 2:2, 3; 1 Jọn 2:16.) Ndị ụwa na-agbalị ka anyị na-achọ ihe ndị ha na-achọ, na-eche echiche ka ha, na-akpakwa àgwà ka ha. Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike imewe ka ha. N’ihi ya, anyị kwesịrị ime ihe ahụ Pọl gwara Ndị Kraịst bi na Rom. Ọ gwara ha ka ha ‘kwụsị ime omume dị ka usoro ihe nke a si dị,’ kama ka ha ‘gbanwee.’ Gịnị ka anyị kwesịrị ịgbanwe?

 OLEE IHE ANYỊ KWESỊRỊ ỊGBANWE?

9. Gịnị na gịnị ka mmadụ kwesịrị ime tupu e mee ya baptizim?

9 Mmadụ malite ịmụ Baịbụl ma na-eme ihe ọ na-amụta, onye ahụ na Jehova ga na-adị ná mma. Ọ ga-ahapụ okpukpe ụgha ma gbanwee àgwà ụfọdụ ọ na-akpa. Ọ ga-agbakwu mbọ ka o yiri mmadụ ọhụrụ, na-akpakwa àgwà ka Jizọs. (Efe. 4:22-24) Obi dị anyị ụtọ na ọtụtụ puku mmadụ na-agbanwe otú ahụ kwa afọ, nyefee Jehova Chineke onwe ha, e meekwa ha baptizim. O doro anya na ọ na-eme Jehova obi ụtọ. (Ilu 27:11) Ma, ọ̀ bụ naanị ihe ndị ahụ ka mmadụ kwesịrị ịgbanwe?

Ọtụtụ ndị kwesịrị ịhapụ ụwa Setan ma gbanwee (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)

10. Gịnị mere o ji bụrụ na ihe anyị kwesịrị ịgbanwe abụghị naanị àgwà anyị?

10 Ihe anyị kwesịrị ime abụghị naanị ịgbanwe àgwà anyị. Dị ka ihe atụ, ndị na-arụpụta ihe nwere ike ịrụpụta ihe taa, echi, ha arụpụta nke ọhụrụ ma kwuo na ọ ka nke ochie mma. Ma, i leruo nke ọhụrụ ahụ anya, o nwere ike o nwechaghị ihe dị iche na ya na nke ochie ahụ. Naanị ihe dị iche nwere ike ịbụ akwụkwọ e ji fụchie nke ọhụrụ ahụ ma ọ bụ otu ihe e tinyere na ya. Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl kwuru na ‘ịgbanwe’ e kwuru okwu ya ná Ndị Rom 12:2 pụtara mmadụ ikwe ka mmụọ nsọ nyere ya aka ịgbanwe otú o si eche echiche. N’ihi ya, otú Onye Kraịst si agbanwe abụghị naanị ịkwụsị àgwà ọjọọ, okwu ọjọọ, na omume rụrụ arụ. A sị ka e kwuwe, e nwere ụfọdụ na-amaghị ihe Baịbụl kwuru, ma ha na-agba mbọ ka ha ghara ime ihe ndị ahụ. Oleezi ihe Ndị Kraịst ga-eme, ya abụrụ na ha agbanweela?

11. Gịnị ka Pọl kwuru na mmadụ kwesịrị ime ka o nwee ike ịgbanwe?

11 Pọl onyeozi dere, sị: “Gbanweenụ site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ.” “Uche” Pọl kwuru okwu ya bụ ọgụgụ isi anyị. Ma, na Baịbụl, ihe ọ pụtakwara bụ ihe anyị na-echekarị n’echiche, otú anyị si ele ihe anya, na otú anyị si echebara ihe echiche. N’akwụkwọ ozi ahụ Pọl degaara ndị Rom, o bula ụzọ kwuo banyere ndị nwere “uche a jụrụ ajụ” n’ihi ‘omume na-ezighị ezi, ajọ omume, anyaukwu, na ihe ọjọọ.’ Ha ‘jupụtara n’anyaụfụ, igbu ọchụ, esemokwu, aghụghọ,’ na àgwà ọjọọ ndị ọzọ. (Rom 1:28-31) Ka a sịkwa ihe mere Pọl ji gbaa Ndị Kraịst bi n’ụdị ebe ahụ ume ka ha ‘gbanwee’ ma ‘mee ka uche ha dị ọhụrụ.’

Wepụnụ iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị n’etiti unu.’—Efe. 4:31

12. Gịnị ka ọtụtụ ndị chere taa? Gịnị mere na Ndị Kraịst ekwesịghị ịna-eche echiche otú ahụ?

12 Ọ dị mwute na ọtụtụ ndị n’ụwa na-eche echiche otú ahụ Pọl kọwara. Ha chere na irubere iwu isi bụ ihe ndị mgbe ochie nakwa na e kwesịghị ịgwa mmadụ ka o rubere iwu ọ bụla isi. Ọtụtụ ndị nkụzi na ọtụtụ ndị nne na nna na-ahapụ ụmụaka ka ha na-eme ihe masịrị ha. Ha na-akụzidịrị ha na onye ọ bụla nwere ike ikpebiri onwe ya ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ha na-ekwu na o nweghị otú  mmadụ ga-esi mata ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. E nwere ọtụtụ ndị na-ekwu na ha kweere na Chineke. Ma ha echeghị na ha kwesịrị ịna-erubere ya isi. (Ọma 14:1) Onye Kraịst nwere ike ịmụta ụdị àgwà ahụ. Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike ịkwụsị ime ihe nzukọ Chineke na-agwa anyị ma malite ịkatọ ihe ọ bụla e mere na-adịghị anyị mma. Ọ bụrụ na e jiri Baịbụl dụọ anyị ọdụ gbasara ntụrụndụ, Ịntanet, ma ọ bụ ịga mahadum, o nwere ike anyị agaghị eji obi anyị niile kweta ihe ahụ a gwara anyị.

13. Gịnị mere anyị kwesịrị iji chebara ụdị mmadụ anyị bụ echiche?

13 Ọ bụrụ na anyị achọghị ‘ịna-eme omume dị ka usoro ihe nke a si dị,’ ya bụ, ọ bụrụ na anyị achọghị ka ndị ụwa mee ka anyị chewe echiche ka ha, anyị kwesịrị ichebara ụdị mmadụ anyị bụ echiche. Anyị kwesịrị iche echiche nke ọma banyere àgwà anyị na ihe anyị bu n’obi, ihe anyị chọrọ ime, na ihe anyị weere ka ihe ọma na ihe ọjọọ. O nwere ike ndị ọzọ agaghị ama ihe dị anyị n’obi. Ha nwere ike ịna-agwa anyị na anyị na-eme nke ọma. Ma, ọ bụ naanị anyị maara ma ihe anyị mụtara na Baịbụl ò meela ka àgwà anyị gbanwee n’eziokwu. Ọ bụkwa anyị maara ma ànyị ka na-ekwe ka ihe anyị na-amụta na-agbanwe àgwà anyị.—Gụọ Jems 1:23-25.

OTÚ ANYỊ NWERE IKE ISI GBANWEE

14. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịmata àgwà ndị anyị kwesịrị ịgbanwe?

14 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịgbanwe, anyị kwesịrị ịgbanwe ihe dị anyị n’obi, ya bụ, ụdị mmadụ anyị bụ. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịgbanwe? Mgbe ọ bụla anyị mụrụ Baịbụl, anyị na-ahụ ụdị mmadụ Jehova chọrọ ka anyị bụrụ. Ihe anyị na-eme ma anyị gụta ihe na Baịbụl ga-enyere anyị aka ịmata ihe dị anyị n’obi n’eziokwu. Ọ ga-enyere anyị aka ịmata ihe ndị anyị kwesịrị ịgbanwe ka anyị nwee ike ime ‘uche Chineke nke zuru okè.’—Rom 12:2; Hib. 4:12.

15. Olee mgbanwe anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka Jehova kpụzie anyị?

15 Gụọ Aịzaya 64:8. Ihe Aịzaya onye amụma ji mee ihe atụ na-akụziri anyị ihe dị mkpa. Anyị dị ka ụrọ. Jehova dị ka ọkpụite. Mgbe ọ na-akpụzi anyị otú ahụ ọkpụite si eji ụrọ akpụ ihe, ọ naghị agbanwe otú anyị dị. Ihe ọ na-agbanwe bụ ụdị mmadụ anyị bụ, ya bụ, àgwà anyị. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka ọ na-akpụzi anyị, ọ ga-agbanwe ihe dị anyị n’obi nakwa otú anyị si eche echiche. Ọ bụ ihe ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịna-akpa àgwà ka ndị ụwa. Olee otú Jehova si akpụzi anyị?

16, 17. (a) Kọwaa ihe ọkpụite na-eme ụrọ ọ chọrọ iji akpụ ite mara mma. (b) Olee otú Okwu Chineke si enyere anyị aka ịgbanwe ka Jehova jiri anyị rụọ ọrụ?

16 Ọ na-abụ, ọkpụite chọọ ịkpụ ite mara ezigbo mma, ọ na-eji ezigbo ụrọ akpụ ya. Ma, e nwere ihe abụọ o kwesịrị ibu ụzọ mee ụrọ ahụ. Nke mbụ bụ na ọ ga-asa ya mmiri, sachapụ ihe ọ bụla na-adịghị mma. Ihe ọzọ ọ ga-eme bụ ịna-awụnye ya mmiri ka ọ na-akpụ ya ka o nwee ike ịdị otú ọ chọrọ ka ọ dịrị ma ọ kpụchaa ya.

17 Ihe mere ọkpụite ji awụnye ụrọ ahụ mmiri abụghị naanị ka ọ sachapụ ihe na-adịghị mma, kama mmiri ahụ na-emekwa ka ọ dịrị ya mfe iji ụrọ ahụ akpụ ihe ọ chọrọ ịkpụ. Ọ ga-enwezi ike iji ya kpụọ ụdị ite ọ bụla ọ chọrọ ịkpụ, ọ bụrụgodị nke na-adịghị mfe ọkpụkpụ. Okwu Chineke na-agbanwe anyị otú ahụ mmiri si agbanwe ụrọ a chọrọ iji akpụ ite. Mgbe anyị bidoro ịmụ gbasara Chineke, Baịbụl nyeere anyị aka ịkwụsị iche echiche ka ndị ụwa ma malite iche echiche otú Chineke si eche. Ọ bụ  mgbe ahụ ka ọ ga-akpụzi anyị ka anyị ghọọ arịa bara uru ọ ga-eji na-arụ ọrụ. (Efe. 5:26) Chegodị ugboro ole a gwarala anyị ka anyị na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-agachikwa ọmụmụ ihe anya, bụ́ ebe a na-amụ Okwu Chineke. Gịnị mere e ji agba anyị ume ka anyị na-eme ihe ndị a? Ọ bụ n’ihi na ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, ọ na-egosi na anyị na-ekwe ka Jehova na-akpụzi anyị.—Ọma 1:2; Ọrụ 17:11; Hib. 10:24, 25.

Ọ bụrụ na ị gbanwee, ọ ga-eme ka i nwee ike idozi nsogbu nke ọma karịa ka ị na-emebu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)

18. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị ichebara ihe anyị mụtara na Baịbụl echiche ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka o mee ka anyị gbanwee? (b) Olee ajụjụ ndị ga-enyere anyị aka ime otú ahụ?

18 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Okwu Chineke gbanwee anyị, ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịna-agụ ya ma na-amụ ya. Ọtụtụ ndị na-agụ Baịbụl, marakwa ọtụtụ ihe e kwuru na ya. O nwere ike ịbụ na ị hụtụla ụdị ndị ahụ n’ozi ọma. Ụfọdụ n’ime ha na-ebudị ihe e kwuru na Baịbụl n’isi. * Ma, ha anaghị ekwe ka ọ gbanwee otú ha si eche echiche na otú ha si akpa àgwà. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ndị Okwu Chineke na-agbanwe ndụ ha bụ naanị ndị kwere ka ihe e kwuru na ya ruo ha n’obi. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-atụgharị uche n’ihe anyị na-amụ na Baịbụl. Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ kwetara na ihe m na-amụ na Baịbụl bụ eziokwu? Àhụla m ihe ndị gosiri na ọ bụ eziokwu? Ọ̀ na-abụ, m mụta ihe na Baịbụl, mụ emee ya, ka ihe m na-eme ọ̀ bụ naanị ịkụziri ya ndị ọzọ? M̀ kwetara na ọ bụ Jehova na-akụziri m ihe ahụ?’ Ọ bụrụ na anyị echebara ụdị ajụjụ ndị ahụ echiche, ọ ga-eme ka anyị hụkwuo Jehova n’anya. Ọ bụrụ na ihe anyị mụtara eruo anyị n’obi, ọ ga-eme ka anyị gbanwee otú anyị si ebi ndụ ma mee Chineke obi ụtọ.—Ilu 4:23; Luk 6:45.

19, 20. Olee uru anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe anyị na-amụta na Baịbụl?

19 Ọ bụrụ na anyị na-agụ Baịbụl mgbe niile ma na-echebara ihe anyị gụrụ echiche, ọ ga-enyere anyị aka ịna-eme ihe Pọl gwara Ndị Kraịst nọ na Kọlọsi. Ọ gwara ha, sị: “Yipụnụ mmadụ ochie ahụ na omume ya, ma yirinụ mmadụ ọhụrụ ahụ, nke a na-esite n’ezi ihe ọmụma na-eme ka ọ dị ọhụrụ dị ka onyinyo nke Onye ahụ kere ya si dị.” (Kọl. 3:9, 10) Ọ bụrụ na anyị aghọta ihe Baịbụl na-akụzi ma na-eme ya eme, ọ ga-enyere anyị aka iyiri mmadụ ọhụrụ e kwuru okwu ya na Baịbụl. Ọ ga-eme ka ọnyà Setan ghara ịmata anyị.

20 Pita onyeozi gwara anyị, sị: ‘Dị ka ụmụ na-erube isi, kwụsịnụ ịbụ ndị na-eme omume dị ka ọchịchọ unu nwere n’oge gara aga si dị, kama, bụrụnụ ndị dị nsọ n’omume unu niile.’ (1 Pita 1:14, 15) Isiokwu na-esonụ ga-akọwa otú Jehova ga-esi gọzie anyị ma ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ gbanwee àgwà anyị na otú anyị si eche echiche.

^ para. 18 Gụọ ihe a kọrọ n’Ụlọ Nche February 1, 1994, peeji nke 9, paragraf nke 7.