Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) SEPTEMBA 2013

Ịsụ Ụzọ Na-eme Ka Anyị na Chineke Dịkwuo ná Mma

Ịsụ Ụzọ Na-eme Ka Anyị na Chineke Dịkwuo ná Mma

“Ọ dị mma ịbụku Chineke anyị abụ olu ụtọ.”—ỌMA 147:1.

1, 2. (a) Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị na-eche banyere onye anyị hụrụ n’anya, na-ekwukwa banyere ya? (Lee foto dị ná mmalite isiokwu a.) (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

Ọ BỤRỤ na anyị na-eche banyere onye anyị hụrụ n’anya, na-akọkwara ndị ọzọ banyere ya, anyị na ya ga na-adịkwu ná mma. Otú ahụ ka ọ dịkwa adịm ná mma anyị na Jehova Chineke. Mgbe Devid na-azụ atụrụ, ọ na-ekirikarị kpakpando n’abalị, na-echekwa banyere otú Chineke si dị ebube. O dere, sị: “Mgbe m hụrụ eluigwe gị, bụ́ ihe mkpịsị aka gị rụrụ, ọnwa na kpakpando ndị i kere, gịnị ka mmadụ efu bụ, nke mere i ji na-echeta ya, gịnịkwa ka nwa nke mmadụ bụ, nke mere i ji na-elekọta ya?” (Ọma 8:3, 4) Mgbe Pọl dechara banyere ụzọ dị ebube Jehova si na-emezu nkwa o kwere Ndị Kraịst e tere mmanụ, o kwuru, sị: “Lee otú ngọzi na amamihe na ihe ọmụma nke Chineke si dị omimi!”—Rom 11:17-26, 33.

2 Mgbe ọ bụla anyị na-ezi ndị ọzọ ozi ọma, anyị na-eche banyere Jehova, na-ekwukwa banyere ya. Ọ na-eme ka anyị na Chineke dịkwuo ná mma. Ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ achọpụtala na ije ozi ọma mgbe niile na-eme ka ha hụkwuo Chineke n’anya. Ma ị̀ bụ ọsụ ụzọ ugbu a ma ị̀ na-achọ ịmalite ịsụ ụzọ, ajụjụ i kwesịrị ịjụ onwe gị bụ, Olee otú ịsụ ụzọ ga-esi mee ka mụ na Jehova dịkwuo ná mma? Ọ bụrụ na ị bụ ọsụ ụzọ, jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ga-enyere m aka ịnọgide n’ọrụ ịsụ ụzọ?’ Ọ bụrụ na ị malitebeghị ịsụ ụzọ, jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ihe ndị m kwesịrị ime ka m nwee ike ịmalite ịsụ ụzọ?’ Ka anyị tụlee otú ịsụ ụzọ ga-esi mee ka anyị na Chineke dịkwuo ná mma.

OTÚ ỊSỤ ỤZỌ SI EME KA ANYỊ NA CHINEKE DỊKWUO NÁ MMA

3. Olee otú ịkọrọ ndị ọzọ banyere ihe ọma Alaeze Chineke ga-emere anyị si abara anyị uru?

3 Ịgwa ndị ọzọ banyere ihe ọma Alaeze Chineke ga-emere anyị na-eme ka anyị na Jehova dịkwuo ná  mma. Olee ebe ị na-agụkarị na Baịbụl mgbe ị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma? O nwere ike ịbụ Abụ Ọma 37:10, 11; Daniel 2:44; Jọn 5:28, 29; ma ọ bụ Mkpughe 21:3, 4. Mgbe ọ bụla anyị na-akọrọ ndị ọzọ banyere nkwa ndị a, ọ na-eme ka anyịnwa cheta na “ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè” si n’aka Jehova Chineke anyị, bụ́ onye na-emesapụ aka. Ọ na-eme ka anyị na ya dịkwuo ná mma.—Jems 1:17.

4. Mgbe anyị hụrụ na ndị anyị na-ezi ozi ọma amaghị Chineke, gịnị mere obi ji adịkwu anyị ụtọ maka ihe ọma Chineke meere anyị?

4 Ka anyị na-ahụ na ọtụtụ ndị anyị na-ezi ozi ọma amaghị Chineke nakwa na obi anaghị adị ha ụtọ, ọ na-eme ka obi dịkwuo anyị ụtọ maka eziokwu Baịbụl a na-akụziri anyị. Ndị ụwa enweghị ezigbo ihe ga-eme ka ihe gaara ha nke ọma nakwa ka obi na-adị ha ụtọ. Ọtụtụ n’ime ha na-echegbu onwe ha banyere ọdịnihu. Ha enweghịkwa olileanya. Ha na-achọ ịmata uru ndụ ha dị bara. Ọtụtụ ndị sịrị na ha na-efe Chineke amachaghịdị Baịbụl. Ha yiri ndị bi n’obodo Ninive n’oge ochie. (Gụọ Jona 4:11.) Ọ bụrụ na anyị ewepụtakwuo oge na-ezi ozi ọma, ọ ga-eme ka anyị ghọta nke ọma na Jehova na-elekọta ndị ya. (Aịza. 65:13) Ma, ihe Jehova na-eme abụghị naanị ilekọta ndị ya. Ọ na-akpọ mmadụ niile ka ha bịa ka ọ kasie ha obi, meekwa ka ha nwee ezigbo olileanya. Ihe a ọ na-eme na-egosi na ọ na-emere anyị ihe ọma.—Mkpu. 22:17.

5. Olee otú ịkụziri ndị ọzọ eziokwu Baịbụl si eme ka anyị na-ele nsogbu ndị bịaara anyị anya?

5 Mgbe anyị na-akụziri ndị ọzọ eziokwu Baịbụl, ọ na-eme ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị banyere nsogbu ndị bịaara anyị. Otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ oge niile aha ya bụ Trisha chọpụtara na ihe a anyị kwuru bụ eziokwu mgbe papa ya na mama ya gbara alụkwaghịm. O kwuru, sị: “O nwetụbeghị ihe gbawara m obi otú ahụ kemgbe a mụrụ m.” Otu ụbọchị, iwe juru ya obi, ike ịga ozi ọma adịghịkwa ya. Ma, o mechara gaa mụọrọ ụmụaka atọ ihe. E nwere ọtụtụ nsogbu n’ezinụlọ ụmụaka ahụ. Papa ha hapụrụ ha. Nwanne ha nwoke nke tọrọ ha na-emesikwa ha ike. Trisha kwuru, sị: “Nsogbu bịaara m enweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere nke ha. Ka anyị na-amụ ihe, ihe ha na-amụta juru ha anya, ha achịtụ ọchị, obi atọọkwa ha ụtọ. Jehova si n’aka ụmụaka ahụ kasie m obi, nke ka nke, n’ụbọchị ahụ.”

6, 7. (a) Olee otú ịkụziri ndị ọzọ Baịbụl si eme ka okwukwe anyị sikwuo ike? (b) Olee otú obi na-adị anyị mgbe anyị hụrụ otú ihe Baịbụl kwuru si nyere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka ịgbanwe àgwà ha?

6 Ịkụziri ndị ọzọ eziokwu Baịbụl na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. Pọl onyeozi dere banyere ụfọdụ ndị Juu n’oge ya ndị na-anaghị eme ihe ha na-akụziri ndị ọzọ. Ọ jụrụ ha, sị: “Gị onye na-akụziri onye ọzọ ihe, ị́ dịghị akụziri onwe gị?” (Rom 2:21) Ndị ọsụ ụzọ anaghị eme ka ndị Juu ahụ. Ha na-aga ugboro ugboro na-ezi ndị ọzọ ozi ọma, na-amụkwara ha Baịbụl. Tupu ha akụzie ihe nke ọma, ha ga-ebu ụzọ kụziere onwe ha ihe. Ha na-ebu ụzọ amụ isiokwu ha na mmadụ ga-amụ. Ha nwekwara ike ime nchọnchọ ga-enyere ha aka ịza ajụjụ ndị a ga-ajụ ha. Otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ aha ya bụ Janeen kwuru, sị: ‘Mgbe ọ bụla m na-akụziri ndị ọzọ eziokwu Baịbụl, ọ na-eme ka ihe ndị ahụ ghara ịpụ apụ n’obi m, meekwa ka m kwetasie ike na ihe ndị ahụ bụ eziokwu.’

7 Mgbe anyị hụrụ otú ihe Baịbụl kwuru si enyere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka ịgbanwe àgwà ha, anyị na-aghọtakwu na ihe Chineke na-akụziri anyị bara ezigbo uru. (Aịza. 48:17, 18) Ọ na-eme ka anyị kpebisie ike ịna-eme ihe ndị ahụ. Nwanna nwaanyị ọzọ bụ́ ọsụ ụzọ aha ya bụ Adrianna kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ndị  mmadụ ejiri aka ha na-ekpebi ihe ha ga na-eme, ha anaghị eji ndụ ha eme ihe bara uru. Ma, ọ bụrụ na ha ekwe ka Jehova na-ekpebiri ha ihe ha ga na-eme, ọ ga-abara ha uru ozugbo.” Otu nwanna nwoke bụ́ ọsụ ụzọ aha ya bụ Phil kwuru, sị: “Ị ga-ahụ ndị gbarala mbọ elu gbaa mbọ ala ka ha gbanwee, ma o kweghị ha. Ma mgbe ha mụwara Baịbụl, Jehova na-enyere ha aka ịgbanwe.”

8. Olee otú iso ụmụnna na-aga ozi ọma si abara anyị uru?

8 Mgbe anyị na ụmụnna anyị na-arụ n’ozi ọma, ha na-agba anyị ume. (Ilu 13:20) Ndị ọsụ ụzọ na-ewepụta oge soro ụmụnna ha na-aga ozi ọma. Ọ na-eme ka ha na-enwekwu ohere ‘ịna-agbarịta ibe ha ume.’ (Rom 1:12; gụọ Ilu 27:17.) Otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ aha ya bụ Lisa kwuru, sị: “Ihe ndị mmadụ na-emekarị n’ụlọ ọrụ bụ ịmarịta aka na inwere ndị ọzọ anyaụfụ. Ihe ị ga na-anụ kwa ụbọchị bụ asịrị na okwu ọjọọ. Ihe na-akacha onye ọ bụla mkpa bụ otú ọ ga-esi ka ndị ọzọ. Mgbe ụfọdụ, e nwere ike ịkwa gị emo ma ọ bụ chịa gị ọchị n’ihi na ị naghị eso ha eme ihe ọjọọ ha na-eme. Ma, ụmụnna na-agba m ume ma anyị gaa ozi. Ọ na-abụ, m gachaa ozi ọma lọta, obi adị m ụtọ n’agbanyeghị na ike gwụchara m.”

9. Ọ bụrụ na di na nwunye ana-asụ ụzọ, olee uru ha ga-erite?

9 Ọ bụrụ na anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị ana-asụ ụzọ, anyị abụọ ga na-adịkwu ná mma. (Ekli. 4:12) E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Madeline. Ya na di ya bụ ndị ọsụ ụzọ. O kwuru, sị: “Ọ na-abụ, mụ na di m lọta ozi ọma, anyị ewepụta oge kwurịta ihe ndị mere n’ozi ọma ma ọ bụ ihe anyị gụtara na Baịbụl nke nwere ike inyere anyị aka n’ozi ọma. Ka anyị na-asụkọ ụzọ kwa afọ, anyị  na-adịkwu ná mma.” Ọsụ ụzọ ahụ aha ya bụ Trisha kwuru, sị: “Anyị kpebiri na anyị agaghị eji onye ọ bụla ụgwọ. N’ihi ya, ego anaghị esere anyị okwu. Anyị abụọ na-eso aga nletaghachi, na-esokwa aga amụrụ ndị mmadụ Baịbụl. Ọ na-eme ka anyị abụọ dịrị ná mma, meekwa ka anyị na Jehova dịrị ná mma.”

Ịnọsi ike n’ozi ịsụ ụzọ ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)

10. Ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke, hụkwa otú Chineke si na-enyere anyị aka, olee uru ọ ga-abara anyị?

10 Ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke, na-ahụ otú Jehova si na-enyere anyị aka, na-azakwa ekpere anyị, ọ ga-eme ka anyị tụkwasịkwuo Jehova obi. Ezigbo Ndị Kraịst niile na-atụkwasị Jehova obi. Ma, ndị ọsụ ụzọ ma na ọ bụ naanị ịtụkwasị Jehova obi ga-eme ka ha nọsie ike n’ọrụ ịsụ ụzọ. (Gụọ Matiu 6:30-34.) E nwere otu nwanna aha ya bụ Curt. Ya na nwunye ya bụ ndị ọsụ ụzọ. Ọ na-arụchitere onye nlekọta sekit ọrụ. O nwere mgbe o kwetara ịga leta otu ọgbakọ. Ọ ga-eji ụgbọala gbaa awa abụọ na ọkara tupu ya eruo ọgbakọ ahụ. Ha nwere mmanụ ụgbọala ga-ezuru ha ịga ọgbakọ ahụ, ma ha enweghị nke ga-ezuru ha ịlọta. Ọ fọrọ otu izu ka a kwụọ ya ụgwọ ọnwa. Nwanna ahụ kwuru, sị, “Ịga leta ọgbakọ ahụ mewere m obi abụọ.” Mgbe ha kpechara ekpere, ha kpebiri na ha ga-aga. Obi sikwara ha ike na Chineke ga-egboro ha mkpa ha. Tupu ha agawa, otu nwanna nwaanyị kpọrọ ha, gwa ha na o nwere ihe ya chọrọ inye ha. Ọ bụ ego ha ga-eji zụọ mmanụ ụgbọala ga-ezuru ha ịlọta. Curt kwuru, sị, “Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee gị ugboro ugboro, ọ gaghị esiri gị ike ịghọta na ọ bụ Jehova na-enyere gị aka.”

11. Olee ụzọ ụfọdụ Chineke si agọzi ndị ọsụ ụzọ?

11 Ndị ọsụ ụzọ na-ekwukarị na ka ha na Chineke na-adịkwu ná mma, ha ana-ewepụtakwu oge na-ejere ya ozi, ọ na-agọzikwu ha. (Diut. 28:2) Ma, ịsụ ụzọ anaghị adị mfe mgbe niile. Isi ahụ Adam nupụụrụ Chineke na-akpatara anyị niile nsogbu. Mgbe ụfọdụ, nsogbu nwere ike ime ka ndị ọsụ ụzọ kwụsịtụ ozi ha. Ma, ọsụ ụzọ nwere ike imeri nsogbu ndị bịaara ya ma ọ bụkwanụ gbaara ha ọsọ. Olee ihe nwere ike inyere ndị ọsụ ụzọ aka ịnọsi ike n’ozi ha?

OTÚ NDỊ ỌSỤ ỤZỌ GA-ESI NỌSIE IKE N’OZI HA

12, 13. (a) Ọ bụrụ na ọ na-esiri ọsụ ụzọ ike ịrụzu awa ya, gịnị ka o kwesịrị ime? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ewepụta oge na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-amụ ihe, na-echebakwara ihe ndị anyị mụtara echiche?

12 Ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ anaghị enwe ohere. Ọ naghị adị mfe imecha ihe niile anyị chọrọ ime. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-ahazi ihe ndị anyị ga-eme ahazi. (1 Kọr. 14:33, 40) Ọ bụrụ na ọ na-esiri ọsụ ụzọ ike ịrụzu awa ya, o nwere ike ịdị mkpa ka o leba anya n’ihe o ji oge ya eme. (Efe. 5:15, 16) O nwere ike ịjụ onwe ya, sị: ‘Awa ole ka m na-eji atụrụ ndụ ma ọ bụ egwuri egwu? È nwere ihe ndị na-adịghị mkpa na-eri m oge? M̀ nwere ike ịhazigharị oge m ji arụ ọrụ ego?’ O doro Onye Kraịst ọ bụla anya na ọ dị mfe imewe ihe ndị ọ na-anaghị emebu. N’ihi ya, o nwere ike ịdị mkpa ka ndị ọsụ ụzọ na-echebara ajụjụ ndị a echiche mgbe niile ka ha nwee ike ịgbanwe ihe ndị ha kwesịrị ịgbanwe.

13 Ọsụ ụzọ kwesịrị iwepụta oge na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-amụ ihe, na-echebakwara ihe ndị ọ mụtara echiche. N’ihi ya, o kwesịrị ịgbalị ka ihe ndị na-adịghị mkpa ghara ime ka ọ hapụ ime ihe ndị dị mkpa. (Fil. 1:10) Dị ka ihe atụ, ka e weregodị ya na ọsụ ụzọ gachara ozi ọma n’ụbọchị lọta. O bu n’obi iji mgbede ahụ kwado ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe. Ma, o bu ụzọ gụọ akwụkwọ ozi e ziteere ya. Ya agbanyezie kọmputa, gaa n’Ịntanet gụọ ozi e ziteere ya, zaakwa ya. N’Ịntanet ahụ, o mepere ebe e dere ihe ọ chọrọ ịzụ ka ọ mara ma è gbuola ya ná ntụ. Ka ọ na-eme  ihe ndị ahụ, ọ maghị na ihe dị ka awa abụọ agaala. Ma, o bidobeghị ịkwado ihe ahụ ọ chọrọ ịkwado ná mgbede ahụ. Gịnị mere na ọsụ ụzọ ekwesịghị ime ụdị ihe a? Ọ bụrụ na onye na-agba bọl chọrọ ịgba bọl ruo ọtụtụ afọ, o kwesịrị ịna-eri ezigbo nri. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị ọsụ ụzọ. Ọ bụrụ na ọ chọrọ ịnọsi ike n’ọrụ ịsụ ụzọ, o kwesịrị ịna-amụ ihe mgbe niile.—1 Tim 4:16.

14, 15. (a) Gịnị mere ndị ọsụ ụzọ ekwesịghị ịna-ebi ndụ okomoko? (b) Ọ bụrụ na ihe na-esiri ọsụ ụzọ ike, gịnị ka o kwesịrị ime?

14 Ndị ọsụ ụzọ ndị na-eme nke ọma n’ozi ha na-agbalịsi ike ka ha ghara ịna-ebi ndụ okomoko. Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka anya ha na-ele otu ebe. (Mat. 6:22) Otú o si bie ndụ ya mere ka o nwee ike iji obi ya niile na-eje ozi ya. O kwuru, sị: “Nkịta ọhịa nwere ọgba, anụ ufe nke eluigwe nwekwara akwụ́, ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ ga-atọgbọ isi ya.” (Mat. 8:20) Ndị ọsụ ụzọ ndị chọrọ ime ka Jizọs kwesịrị iburu n’obi na ọ bụrụ na ha enwee ọtụtụ ihe, imezi ha ma ọ bụ ịzụ ndị ọhụrụ ma ndị ochie mebie ga na-eri ha oge.

15 Ndị ọsụ ụzọ ghọtara na ọrụ ha dị mkpa. Ma, ha anaghị eche na ha ka ndị ọzọ mma. Kama iche otú ahụ, ha ma na ọ bụ obiọma Chineke mere ka ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ. N’ihi ya, ọsụ ụzọ ọ bụla nke chọrọ ịnọsi ike n’ozi ya kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi. (Fil. 4:13) A ga-enwe nsogbu na ihe isi ike. (Ọma 34:19) Mgbe nsogbu bịaara ọsụ ụzọ, o kwesịrị ịrịọ Jehova ka o nyere ya aka ịmata ihe o kwesịrị ime. O kwesịkwara inwe ndidi ka Jehova nyere ya aka, kama ịkwụsị ịsụ ụzọ ozugbo. (Gụọ Abụ Ọma 37:5.) Ka ha na-ahụ otú Chineke si na-elekọta ha, ha na ya ga na-adịkwu ná mma.—Aịza. 41:10.

Ị̀ GA-ABỤLI ỌSỤ ỤZỌ?

16. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ ọsụ ụzọ, gịnị ka i kwesịrị ime?

16 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ ọsụ ụzọ, chọọkwa ka Jehova na-agọzi gị otú o si agọzi ndị ọsụ ụzọ, kpee ekpere banyere ya. (1 Jọn 5:14, 15) Kọọrọ ya ndị ọsụ ụzọ. Kpebie ihe ndị ị ga-eme ga-enyere gị aka ịbụ ọsụ ụzọ. Ọ bụ ihe otu nwanna aha ya bụ Keith na nwunye ya bụ́ Erika mere. Ha na-ejibu oge ha niile arụ ọrụ ego. Ha zụkwara ụlọ na ụgbọala ọhụrụ ozugbo ha lụrụ. Ha kwuru, sị: “Anyị cheburu na ihe ndị ahụ ga-eme ka obi na-adị anyị ụtọ. Ma, ihe ndị ahụ emeghị ka anyị nwee obi ụtọ.” Mgbe a chụrụ Keith n’ọrụ, ọ malitere ịsụ ụzọ inyeaka. O kwuru, sị: “Ịsụ ụzọ mere ka o dokwuo m anya na ịga ozi ọma na-eme ka obi na-adị mmadụ ezigbo ụtọ.” Ha metara otu nwanna na nwunye ya bụ́ ndị ọsụ ụzọ enyi. Nwanna ahụ na nwunye ya nyeere ha aka ịghọta na ọ bụrụ na ha asụwa ụzọ ma ghara ibiwe ndụ okomoko, obi ga na-atọ ha ụtọ. Gịnị ka Keith na Erika mere? Ha kwuru, sị: “Anyị dere ihe ndị anyị kpebiri ime n’ozi Chineke, mapawa ya na friji anyị. Nke ọ bụla anyị mere, anyị akanye ya ihe.” Ka oge na-aga, ha ghọrọ ndị ọsụ ụzọ.

17. Gịnị mere o ji dị mma ka ị tụlee ma ị̀ ga-abụli ọsụ ụzọ?

17 Ị̀ ga-abụli ọsụ ụzọ? Ọ bụrụ na i chere na ị gaghị abụli ọsụ ụzọ ugbu a, gbalịsie ike ka i wepụtakwuo oge na-eje ozi ọma. Ọ ga-eme ka gị na Jehova dịkwuo ná mma. I kpechaa ekpere ma chebara otú ihe si dịrị gị echiche, i nwere ike ịghọta na ị ga-asụli ụzọ ma ị gbanwee ihe ụfọdụ ị na-eme. Ọ bụrụ na ị ga-abụli ọsụ ụzọ, ọṅụ ị ga-enweta ga-akarị ihe ọ bụla ị hapụrụ. Obi ga-adị gị ụtọ n’ihi na i bu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke, na-enyekwara ndị ọzọ aka. (Mat. 6:33) Uru ọzọ ị ga-erite bụ na ọ ga-eme ka ị na-echekwu banyere Jehova, na-akọkwara ndị ọzọ banyere ya ugboro ugboro. Ọ ga-eme ka ị hụkwuo ya n’anya, meekwa ya obi ụtọ.