Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) SEPTEMBA 2013

Anyị Kwesịrị Ịtụkwasị Ihe Jehova Na-echetara Anyị Obi

Anyị Kwesịrị Ịtụkwasị Ihe Jehova Na-echetara Anyị Obi

“Ihe ncheta Jehova bụ ihe a pụrụ ịtụkwasị obi, na-eme ka onye na-amaghị ihe mara ihe.”—ỌMA 19:7.

1. Olee isiokwu ndị anyị na-amụkarị n’ọmụmụ ihe? Olee otú ịmụ ha ugboro ugboro si abara anyị uru?

Ò NWETỤLA mgbe ị na-amụ isiokwu a ga-amụ n’ọmụmụ ihe Ụlọ Nche, gị ekwuo, sị, ‘Ọ dị ka à mụọla isiokwu a mbụ.’ Ọ bụrụ na ọ dịla anya ị bịawara ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, o nwere ike ị chọpụtala na e nweela isiokwu ndị anyị mụrụla ọtụtụ ugboro. Anyị na-amụkarị gbasara Alaeze Chineke, ihe mgbapụta, ikwusa ozi ọma, ịhụnanya, na okwukwe. Ịmụ ihe ndị a ugboro ugboro na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike, na-emekwa ka anyị ‘bụrụ ndị na-eme okwu Chineke, ọ bụghị ndị na-anụ naanị ọnụnụ.’—Jems 1:22.

2. (a) Gịnị ka “ihe ncheta” e kwuru okwu ya na Baịbụl na-apụtakarị? (b) Olee otú iwu Jehova si dị iche n’iwu ụmụ mmadụ?

2 Okwu Hibru a sụgharịrị “ihe ncheta” na-apụtakarị iwu ma ọ bụ ụkpụrụ Chineke na-enye ndị na-efe ya. Iwu Jehova adịghị ka iwu ụmụ mmadụ. Iwu ụmụ mmadụ ezughị okè, ọ na-agbanwekwa agbanwe. Ma iwu Chineke zuru okè. Obi kwesịkwara isi anyị ike na ọ ga-abara anyị uru ma ọ bụrụ na anyị ana-edebe ya. O nwere iwu ụfọdụ Chineke nyere ndị fere ya n’oge ochie ndị anyị na-anaghịzi edebe taa. Ma, ihe mere na anyị anaghịzi edebe iwu ndị ahụ abụghị na ha adịghị mma. Otu ọbụ abụ kwuru, sị: “Ihe ncheta gị ziri ezi ruo mgbe ebighị ebi.”—Ọma 119:144.

3, 4. (a) Olee otú Jehova si echetara ndị ya ihe mgbe ụfọdụ? (b) Olee uru ndị Izrel ga-erite ma ha mee ihe Chineke chetaara ha?

3 Mgbe ụfọdụ, otú Jehova si echetara ndị ya ihe bụ ịdọ ha aka ná ntị. Jehova si n’ọnụ ndị amụma ya dọọ ndị Izrel aka ná ntị ọtụtụ ugboro. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ fọrọ obere ka ndị Izrel banye n’Ala Nkwa, Mozis dọrọ ha aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya ka a ghara ịrata obi unu, unu ewee gaa fee chi ọzọ ma kpọọrọ ha isiala,  Jehova ewee weso unu iwe dị ọkụ.” (Diut. 11:16, 17) Anyị gụọ Baịbụl, anyị ga-ahụ ọtụtụ ihe ndị ọzọ bara uru Chineke chetaara ndị ya.

4 Ọtụtụ mgbe, Jehova gwara ndị Izrel ka ha na-atụ egwu ya, na-erubere ya isi ma na-edo aha ya nsọ. (Diut. 4:29-31; 5:28, 29) Chineke kwere ha nkwa na ya ga-agọzi ha ma ọ bụrụ na ha emee ihe ndị a.—Lev. 26:3-6; Diut. 28:1-4.

IHE NDỊ IZREL MERE MGBE CHINEKE CHETAARA HA IHE HA GA-EME

5. Gịnị mere Jehova ji lụọrọ Eze Hezekaya agha?

5 N’oge ochie, Chineke meere ndị Izrel ihe ọ bụla o kwere ha ná nkwa. Dị ka ihe atụ, mgbe eze ndị Asiria aha ya bụ Senakerib bịara ịlụso Juda agha ma yie Eze Hezekaya egwu, Jehova dunyere mmụọ ozi ya ka ọ gaa nyere ndị ya aka. N’otu abalị naanị, mmụọ ozi Chineke gburu otu narị puku na iri puku mmadụ asatọ na puku ise n’ime ndị agha Asiria. Ihe a merenụ mere ka Senakerib jiri ihere laghachi Asiria. (2 Eze 19:35; 2 Ihe 32:21) Gịnị mere Chineke ji lụọrọ Eze Hezekaya agha? Ọ bụ n’ihi na Hezekaya ‘rapaara Jehova n’ahụ́. Ọ kwụsịghị iso ya, kama ọ nọ na-edebe ihe o nyere n’iwu.’—2 Eze 18:1, 5, 6.

Ihe Jehova chetaara Josaya mere ka o nyere ndị Izrel aka ịmaliteghachi ife Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)

6. Olee otú Eze Josaya si gosi na ya tụkwasịrị Jehova obi?

6 Onye ọzọ rubeere Jehova isi bụ Eze Josaya. Malite mgbe ọ dị afọ asatọ, ‘o mere ihe ziri ezi n’anya Jehova. Ọ hapụghị ya gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe.’ (2 Ihe 34:1, 2) Josaya mere ihe gosiri na ọ tụkwasịrị Jehova obi. Otú o si mee ya bụ na o bibiri arụsị niile dị n’Izrel, ma mee ka ndị Izrel maliteghachi ife Jehova. N’ihi ihe a o mere, Jehova gọziri ya, gọziekwa ndị Izrel niile.—Gụọ 2 Ihe E Mere 34:31-33.

7. Gịnị mere ndị Izrel mgbe ha na-erubereghị Jehova isi?

7 Ma, ọ dị mwute na ọ bụghị mgbe niile ka ndị Izrel mere ihe Jehova chetaara ha. Ruo ọtụtụ narị afọ, ha nupụụrụ Jehova isi ọtụtụ ugboro. Mgbe okwukwe ha na-esighị ike, ndị ọzọ mere ka ha fee arụsị. Ha yiri ndị ahụ Pọl onyeozi kwuru na “ifufe ozizi ọ bụla na-ebugharị.” (Efe. 4:13, 14) Chineke gwara ha na ha ga-ata ahụhụ mgbe ọ bụla ha na-atụkwasịghị ya obi. Ha tara ahụhụ otú ahụ Chineke kwuru.—Lev. 26:23-25; Jere. 5:23-25.

8. Olee otú anyị ga-esi rite uru n’akụkọ gbasara ndị Izrel?

8 Olee otú anyị ga-esi rite uru n’akụkọ gbasara ndị Izrel? Chineke na-adụ anyị ọdụ, na-adọkwa anyị aka ná ntị, otú ahụ o mere ndị Izrel. (2 Pita 1:12) Jehova na-echetara  anyị iwu ya mgbe ọ bụla anyị gụrụ Baịbụl. Jehova hapụkwara anyị ka anyị jiri aka anyị na-ekpebi ma ànyị ga-erube isi n’iwu ya, ka ànyị ga-eme ihe dị anyị mma. (Ilu 14:12) Ka anyị tụlee ihe mere anyị kwesịrị iji mee ihe Jehova na-echetara anyị nakwa ihe mere ime otú ahụ ga-eji baara anyị uru.

RUBERE CHINEKE ISI MA DỊ NDỤ

9. Mgbe ahụ ndị Izrel nọ n’ala ịkpa, olee otú Jehova si chetara ha na ya na-enyere ha aka?

9 Mgbe ndị Izrel malitere ije ahụ ha gara afọ iri anọ ‘n’ala ịkpa ahụ dị egwu,’ Jehova agwaghị ha otú ọ ga-esi edu ha, otú ọ ga-esi echebe ha, na otú ọ ga-esi elekọta ha. Ma, e nwere ọtụtụ ụzọ o si mee ka ha mata na ihe ga-adịrị ha mma ma ọ bụrụ na ha atụkwasị ya obi, na-erubekwara ya isi. Jehova ji ogidi ígwé ojii na-edu ha n’ehihie, jirikwa ogidi ọkụ na-edu ha n’abalị. O ji ihe a o mere chetara ha na ya na-enyere ha aka n’ije ahụ tara akpụ ha na-aga. (Diut. 1:19; Ọpụ. 40:36-38) O nyekwara ha ihe niile dị ha mkpa. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ dịghị ihe kọrọ ha. Uwe ha akaghị nká, ụkwụ ha azaghịkwa aza.”—Nehe. 9:19-21.

10. Olee otú Jehova si na-edu anyị taa?

10 N’oge na-adịghị anya, anyị ga-abanye n’ụwa ọhụrụ Chineke kwere anyị ná nkwa, bụ́ ebe ezi omume ga-ebi. Obi ò siri anyị ike na Jehova na-enye anyị ihe niile ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịnwụ ‘n’oké mkpagbu’ na-abịanụ? (Mat. 24:21, 22; Ọma 119:40, 41) Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova anaghị eji ogidi ígwé ojii ma ọ bụ ogidi ọkụ edu anyị ka anyị banye n’ụwa ọhụrụ. Ma, o ji nzukọ ya na-echetara anyị ihe ndị anyị kwesịrị ịna-eme. Dị ka ihe atụ, a na-agba anyị ume ka anyị na-agụ Baịbụl, na-enwe Ofufe Ezinụlọ, na-agachi ọmụmụ ihe na ozi ọma anya n’ihi na ime ihe ndị a ga-eme ka anyị na Chineke dịkwuo ná mma. Ànyị agbanweela ihe ụfọdụ anyị na-eme ka anyị nwee ike ịna-eme ihe ndị a? Anyị mee otú ahụ, anyị ga-enwe ụdị okwukwe ga-eme ka anyị banye n’ụwa ọhụrụ.

Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe Jehova na-echetara anyị, anyị ga na-edewe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11. Olee otú Chineke si gosi na ya chọrọ ka anyị na-enwe obi ụtọ?

11 Nzukọ Chineke na-agwakwa anyị ihe ndị na-enyere anyị aka ịna-eme mkpebi ziri ezi kwa ụbọchị. Dị ka ihe atụ, a gwala anyị ka anyị ghara ịna-achụ ego ọnwụ ọnwụ, gwakwa anyị ka anyị ghara ịna-ebi ndụ okomoko. Anyị mee ihe a a gwara anyị, ọ ga-eme ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị. A gwakwala anyị ihe ga-enyere anyị aka ikpebi ụdị ejiji anyị kwesịrị ịna-eji, ụdị ihe ndị anyị kwesịrị iji na-atụrụ ndụ, nakwa ikpebi ebe anyị kwesịrị ịgụru akwụkwọ. Anyị amatakwala ihe ndị anyị ga na-eme ma n’ụlọ anyị ma n’ụgbọala anyị ma n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ka anyị ghara imerụ ahụ́, nakwa otú anyị ga-esi jikere ejikere tupu ihe gbata gbata emee. Ihe a niile a na-agwa anyị gosiri na Chineke achọghị ka ihe ọ bụla mee anyị, gosikwa na ọ chọrọ ka anyị na-enwe obi ụtọ.

IHE NDỊ E CHETAARA NDỊ KRAỊST OGE MBỤ MERE KA OKWUKWE HA SIE IKE

12. (a) Olee otu ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ ugboro ka ha mee? (b) Olee ihe Jizọs kụziri gbasara ịdị umeala n’obi, nke Pita na-echefughị? Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ahụ Jizọs mere?

12 N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ ugboro ihe ndị ha ga-eme. Ọtụtụ mgbe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya na ha kwesịrị ịdị umeala n’obi. Ma, ihe o mere abụghị naanị ịgwa ha na ha kwesịrị ịdị umeala n’obi. Kama, o gosiri ha otú ha ga-esi dịrị umeala n’obi. N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, ya na ndịozi ya zukọrọ ka ha mee Ememme Ngabiga. Mgbe ndịozi ya ka na-eri nri, o biliri ọtọ malite ịsa ụkwụ ha. Ihe a o mere bụ ọrụ ohu na-arụ. (Jọn 13:1-17) O ji ihe ahụ  kụziere ndịozi ya ihe dị mkpa. O nweghịkwa mgbe ha chefuru ya. Pita so ná ndị ahụ Jizọs sara ụkwụ. Mgbe ihe dị ka iri afọ atọ gachara, Pita onyeozi gwara Ndị Kraịst ibe ya na ha kwesịrị ịdị umeala n’obi. (1 Pita 5:5) Ihe ahụ Jizọs mere kwesịrị ime ka anyị dịrị umeala n’obi mgbe anyị na Ndị Kraịst ibe anyị na-emekọ ihe.—Fil. 2:5-8.

13. Olee ihe dị ezigbo mkpa Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha nwee?

13 Ihe ọzọ Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ ugboro bụ na ha kwesịrị inwe okwukwe siri ike. O nwere oge ndị na-eso ụzọ ya chọrọ ịchụpụ mmụọ ọjọọ na-enye otu nwata nwoke nsogbu, ma ha achụpụlighị ya. Ha jụrụ Jizọs, sị: “Gịnị mere na anyị achụpụlighị ya?” Ọ sịrị ha: ‘Ọ bụ n’ihi okwukwe nta unu. N’ihi na n’ezie, ana m asị unu, ọ bụrụ na unu enwee okwukwe há ka mkpụrụ osisi mọstad, ọ dịghị ihe na-agaghị ekwe unu omume.’ (Mat. 17:14-20) Mgbe Jizọs na-eje ozi ya n’ụwa, ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya na mmadụ inwe okwukwe dị ezigbo mkpa. (Gụọ Matiu 21:18-22.) Ànyị na-aga mgbakọ niile na ọmụmụ ihe niile ka okwukwe anyị nwee ike isikwu ike? Ihe mere anyị ji aga ha abụghị naanị ka obi na-adị anyị ụtọ. Anyị na-agakwa ha ka anyị gosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi.

14. Gịnị mere anyị kwesịrị iji hụ ndị ọzọ n’anya, na-emekwa ihe ndị ga-abara ha uru?

14 E nwere ọtụtụ ebe a gwara anyị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ka anyị na-ahụ ibe anyị n’anya. Jizọs sịrị na iwu nke abụọ kachanụ bụ: “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Mat. 22:39) Jems nwanne Jizọs kwuru na ịhụnanya bụ “iwu nke eze nyere.” (Jems 2:8) Jọn onyeozi kwuru, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ihe m na-edetara unu abụghị iwu ọhụrụ, kama ọ bụ iwu ochie nke unu nụrụ site ná mmalite.” (1 Jọn 2:7, 8) Gịnị ka Jọn bu n’obi mgbe o kwuru gbasara “iwu ochie”? Ọ na-ekwu gbasara iwu ahụ e nyere anyị ka anyị na-ahụ ibe anyị n’anya. Ihe mere o ji kpọọ ya iwu “ochie” bụ na Jizọs enyela iwu ahụ enye ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, ya bụ, “ná mmalite.” Ma, ihe mere e ji kwuo na ọ bụ iwu “ọhụrụ” bụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-emecha gosi ibe ha ụdị ịhụnanya ga-eme ka ha dị njikere ịnwụchitere ibe ha ọnwụ. Obi dị anyị ụtọ na a na-akụziri anyị ka anyị ghara ịna-eme ihe ndị ga-abara naanị onwe anyị uru otú ahụ ọtụtụ ndị na-eme n’ụwa taa. Anyị na-eme ihe ga-abara ndị ọzọ uru n’ihi na anyị hụrụ ha n’anya.

15. Olee ihe mere Jizọs ji bịa n’ụwa?

15 Jizọs hụrụ ndị mmadụ n’anya. Ihe gosiri na ọ hụrụ ha n’anya bụ na ọ gwọrọ ndị ọrịa, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ. Ma, ihe mere Jizọs ji bịa n’ụwa abụghị ka  ọ gwọọ ndị mmadụ ọrịa. Ọ bụ ozi ọma o ziri ndị mmadụ na ihe ọ kụziiri ha kacha baara ha uru. Gịnị mere anyị ji kwuo otú a? Ọ bụ n’ihi na ndị ahụ Jizọs gwọrọ ọrịa na ndị ahụ ọ kpọlitere n’ọnwụ mechara kaa nká ma nwụọ. Ma ndị mere ihe ọ kụziiri ha nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.—Jọn 11:25, 26.

16. Olee otú Ndịàmà Jehova si na-erube isi n’iwu Jizọs nyere, nke bụ́ ka ha na-eme ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya?

16 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” (Mat. 28:19) Mgbe Jizọs nwụrụ, ndị na-eso ụzọ ya kwusara ozi ọma ahụ ọ malitere. Ma taa, ndị anyị na-ekwusara ozi ọma ka ndị ha kwusaara ozi ọma. Ebe anyị na-ekwusa ya kakwa ebe ha kwusara ya. Ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova asaa ji obi ha niile na-akụziri ndị ọzọ gbasara Alaeze Chineke n’ihe karịrị narị mba abụọ na iri atọ. Anyị na ọtụtụ nde mmadụ na-amụkwa Baịbụl n’ọnwa ọ bụla. Ozi ọma a anyị na-ekwusa gosiri na anyị bi n’oge ikpeazụ.

TỤKWASỊ JEHOVA OBI TAA

17. Gịnị ka Pọl na Pita gwara Ndị Kraịst oge mbụ?

17 Ihe ndị e chetaara Ndị Kraịst mbụ mere ka okwukwe ha sikwuo ike. Dị ka ihe atụ, mgbe a tụrụ Pọl onyeozi mkpọrọ na Rom, ọ gwara Timoti, sị: “Jidesie ụkpụrụ nke okwu na-enye ezi ndụ ike bụ́ nke ị nụrụ n’ọnụ m.” (2 Tim. 1:13) O doro anya na ihe a o kwuru gbara Timoti ume. Pita gwara Ndị Kraịst ka ha gbalịa na-atachi obi, hụ ụmụnna ha n’anya, na-ejidekwa onwe ha. Mgbe ọ gwachara ha ihe ndị a, ọ gwara ha, sị: “M ga-achọ ichetara unu ihe ndị a mgbe niile, ọ bụ ezie na unu maara ha ma bụrụ ndị nọsiri ike n’eziokwu ahụ.”—2 Pita 1:5-8, 12.

18. Olee otú obi dị Ndị Kraịst oge mbụ mgbe a gwara ha ihe ha ga-eme?

18 Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe ndị ahụ Pọl na Pita gwara ọgbakọ dị iche iche bụ “okwu ndị e kwuru na mbụ site n’ọnụ ndị amụma dị nsọ.” (2 Pita 3:2) Ma, ụmụnna ndị ahụ hà were iwe mgbe Pọl na Pita gwara ha ihe ndị ahụ? Mba. Ha ma na ihe mere ha ji na-agwa ha ihe ahụ bụ na Chineke hụrụ ha n’anya. O nyekwaara ha aka ‘ịna-eto eto n’obiọma na-erughịrị mmadụ nakwa n’ihe ọmụma banyere Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị bụ́ Jizọs Kraịst.’—2 Pita 3:18.

19, 20. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na ọ bụrụ na anyị emee ihe Jehova na-agwa anyị, ọ ga-abara anyị uru? Olee uru ọ ga-abara anyị?

19 Taa, e nwere ọtụtụ ihe mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na ọ bụrụ na anyị emee ihe Jehova gwara anyị n’Okwu ya, ọ ga-abara anyị ezigbo uru. Ihe ọ bụla o kwuru na Baịbụl na-emezu. (Gụọ Jọshụa 23:14.) Baịbụl gwara anyị otú Chineke si na-emeso ndị mmadụ ihe ruo ọtụtụ puku afọ. Ihe mere e ji dee ya na Baịbụl bụ ka anyị mụta ihe na ya. (Rom 15:4; 1 Kọr. 10:11) Anyị ahụkwala otú amụma ụfọdụ e buru na Baịbụl si na-emezu n’oge anyị. E nwere ike iji amụma tụnyere ihe Jehova chetaara anyị ọtụtụ afọ tupu ya emee. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ nde mmadụ na-efe Jehova ugbu a otú ahụ e buru n’amụma na ndị mmadụ ga-eme “n’oge ikpeazụ.” (Aịzaya 2:2, 3) Ihe ọjọọ na-arị ibe ya elu n’ụwa taa. Ọ na-egosi na amụma Baịbụl na-emezu. Anyị ebula ụzọ kwuo na anyị na-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile. Ozi ọma a anyị na-ekwusa na-egosi na ihe Jizọs kwuru na-emezu taa.—Mat. 24:14.

20 Kemgbe ụwa, Jehova na-eme ihe gosiri na anyị kwesịrị ịtụkwasị ya obi. Ihe ndị ọ na-echetara anyị hà na-abara anyị uru? À na-ajụkwa ajụ? Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Rosellen kwuru, sị: “Mgbe m malitere ịtụkwasị Jehova obi, o dokwuru m anya na Jehova hụrụ m n’anya, na-akwado m ma na-enyere m aka.” Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe Jehova na-echetara anyị, ọ ga-abara anyị ezigbo uru.