Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌGỌST 2013

‘Ewesola Jehova Oké Iwe’

‘Ewesola Jehova Oké Iwe’

“Ọ bụ nzuzu mmadụ na-agbagọ ụzọ ya, obi ya ewee na-eweso Jehova oké iwe.”ILU 19:3.

1, 2. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịta Jehova ụta maka nsogbu ndị dị n’ụwa a? Nye ihe atụ.

KA E were ya na ị lụọla nwaanyị, gị na ya na-ebikwa n’udo kemgbe ọtụtụ afọ. Ma, mgbe ị lọtara otu ụbọchị, ị hụrụ na e mebiela ihe niile dị n’ụlọ unu. A kụriela ma oche unu ma efere unu. Kapet unu gwụkwara agwụ. Ụlọ ọma unu dịzi ka ebe a gbara ọsọ agha. Ị̀ ga-ekwu ozugbo, sị, “Gịnị mere nwunye m ji mee ihe a?” Mbanụ. Ajụjụ nwere ike ịgbata gị n’obi ozugbo bụ, “Ònye mere ihe a?” N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ị ma na nwunye gị ị hụrụ n’anya agaghị emebisị ihe dị n’ụlọ unu.

2 Taa, a na-emebisị ụwa. A na-emetọ ma ala ma mmiri ma ikuku. Ọtụtụ ndị na-eme ihe ike, na-emekwa omume rụrụ arụ. Ma, Baịbụl emeela ka anyị mata na ọ bụghị Jehova kpatara nsogbu a niile. O kere ụwa a ka ọ bụrụ paradaịs mara mma anyị ga-ebi. (Jen. 2:8, 15) Jehova bụ Chineke ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) Ihe anyị mụtara na Baịbụl enyerela anyị aka ịmata onye na-akpata ọtụtụ nsogbu e nwere n’ụwa a. Ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu. Baịbụl kwuru na ọ bụ ya “na-achị ụwa.”—Jọn 14:30; 2 Kọr. 4:4.

3. Olee otú anyị nwere ike isi lewe nsogbu anyị anya otú na-ekwesịghị ekwesị?

3 Ma, anyị ekwesịghị ịta Setan ụta maka nsogbu niile anyị nwere. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe na-akpatara anyị nsogbu mgbe ụfọdụ bụ ihe anyị mejọrọ. (Gụọ Diuterọnọmi 32:4-6.) Anyị nwere ike ikwu na anyị kwetara ihe a e kwuru. Ma, ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị nwere ike ilewe nsogbu anyị anya otú na-ekwesịghị ekwesị, ya akpatara anyị nsogbu ọzọ. (Ilu 14:12) Olee otú ụdị ihe ahụ nwere ike isi eme? Anyị nwere ike ịtawa Jehova ụta maka nsogbu ndị anyị nwere, kama ịtawa onwe anyị ma ọ bụ Setan ụta. Anyị nwedịrị ike ‘ịna-eweso Jehova oké iwe.’—Ilu 19:3.

4, 5. Olee otú Onye Kraịst nwere ike isi “na-eweso Jehova oké iwe”?

4 Ọ̀ bụ eziokwu na mmadụ nwere ike ‘ịna-eweso Jehova  oké iwe’? O doro anya na onye na-eme otú ahụ enweghị ebe o ji azụ aga. (Aịza. 41:11) O nweghị uru ọ ga-abara ya. Ndị mmadụ na-ekwukarị na e nweghị onye ga-abali Chineke ọgụ. O nwere ike ịbụ na anyị agaghị ekwu na anyị na-ewesa Jehova iwe. Ma, Ilu 19:3 kwuru na “ọ bụ nzuzu mmadụ na-agbagọ ụzọ ya, obi ya ewee na-eweso Jehova oké iwe.” N’eziokwu, mmadụ nwere ike ịna-ewesa Chineke iwe n’obi ya. Ihe ụfọdụ mmadụ na-eme nwere ike igosi na ọ na-eburu Jehova iwe n’obi. Onye ahụ nwere ike lawa azụ n’ọgbakọ ma ọ bụkwanụ ọ gaghịzi eso na-eme ihe niile a na-eme n’ozi Jehova.

5 Olee ihe nwere ike ime ka anyị “na-eweso Jehova oké iwe”? Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ime otú ahụ? Anyị kwesịrị ịmata azịza ajụjụ ndị a ka anyị ghara ime ihe ọ bụla ga-eme ka anyị na Jehova Chineke ghara ịdị ná mma.

GỊNỊ NWERE IKE IME KA ANYỊ “NA-EWESO JEHOVA OKÉ IWE”?

6, 7. Gịnị mere ndị Izrel ji wesa Jehova iwe n’oge Mozis?

6 Gịnị nwere ike ime ka onye ji obi ya niile na-efe Chineke na-eweso ya iwe? Ka anyị tụlee ihe ise nwere ike ịkpata ya. Anyị ga-atụlekwa gbasara ụfọdụ ndị Baịbụl gwara anyị na ha wesoro Jehova iwe.—1 Kọr. 10:11, 12.

Ọ bụrụ na anyị egee ntị n’ihe na-adịghị mma ndị ọzọ na-ekwu, o nwere ike imebi anyị obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7 Ihe ndị ọzọ kwuru nwere ike imebi anyị obi. (Gụọ Diuterọnọmi 1:26-28.) Chegodị banyere ihe Jehova meere ndị Izrel. O tiri ndị Ijipt ihe otiti iri, gbuokwa Fero na ndị agha ya n’Oké Osimiri Uhie. O si otú a napụta ndị Izrel n’ohu ha na-agba n’Ijipt. (Ọpụ. 12:29-32, 51; 14:29-31; Ọma 136:15) Mgbe ọ fọrọ obere ka ndị Izrel banye n’Ala Nkwa ahụ, ha bidoro iwesa Jehova iwe. Gịnị kpatara ya? Ọ bụ maka na mmadụ iri n’ime ndị e dunyere ka ha gaa ledoo Ala Nkwa ahụ bịara kọọrọ ha ihe ọjọọ gbasara ebe ahụ. Ihe ha gwara ha mebiri ha obi, ụjọ abịakwa ha. (Ọnụ Ọgụ. 14:1-4) N’ihi ihe a ha mere, Jehova ekweghị ka ha banye ‘n’ezi ala ahụ.’ (Diut. 1:34, 35) Gịnị ka akụkọ a na-akụziri anyị? Ọ na-akụziri anyị na ihe ndị ọzọ kwuru nwere ike imebi anyị obi, meekwa ka anyị ghara ịtụkwasị Jehova obi. O nwekwara ike ime ka anyị wesawa Jehova iwe maka otú o si na-edu ndị ya.

8. N’oge Aịzaya, gịnị mere ndị Juda ji kwuo na ọ bụ Jehova kpatara nsogbu ha?

8 Ihe isi ike na nsogbu ndị ọzọ nwere ike ime ka obi na-ajọ anyị njọ. (Gụọ Aịzaya 8:21, 22.) Ihe siiri ndị Juda ike n’oge Aịzaya. Ndị iro gbara ha gburugburu. Agụụ na-agụ ọtụtụ n’ime ha n’ihi na nri dị ụkọ. Ma, o nwere ihe ka njọ merenụ. Ha kwụsịrị ige Jehova ntị, jirikwa nwayọọ nwayọọ na-eme ka ha na ya ghara ịdị ná mma. (Emọs 8:11) Ha arịọghị Jehova ka o nyere ha aka, kama ha malitere ‘ịkọcha’ ya na eze ha. Ha kwuru na ọ bụ Jehova kpatara nsogbu ha. Ọ bụrụ na obi ajọọ anyị njọ n’ihi ihe isi ike na nsogbu ndị ọzọ, anyị nwere ike ịtawa Jehova ụta. Anyị nwere ike ịna-ajụ onwe anyị, sị: ‘Gịnị mere Jehova enyereghị m aka mgbe m nọ ná nsogbu?’

9. N’oge Ezikiel, gịnị mere ndị Izrel ji chee na otú Jehova si eme ihe adịghị mma?

9 Anyị amaghị ihe niile. N’oge Ezikiel, ndị Izrel chere na “ụzọ Jehova ezighị ezi” n’ihi na ha amaghị ihe niile mere Jehova ji mee ihe o mere. (Ezik. 18:29) Ha mere ka à ga-asị na ọ bụ ha kwesịrị ikpe Chineke ikpe ma kpebie ma ihe o mere ò ziri ezi n’agbanyeghị na ha aghọtaghị ihe niile o mere. Olee otú anyị nwere ike isi mee ụdị ihe ahụ? Mgbe ụfọdụ, ihe Baịbụl kwuru nwere ike isiri anyị ike nghọta. O nwekwara ike ịbụ na anyị amaghị ihe mere nsogbu ji bịara anyị. O nwere ike ime ka anyị chewe na ihe Jehova mere adịghị mma nakwa na ‘ụzọ ya ezighị ezi.’—Job 35:2.

10. Olee otú mmadụ nwere ike isi tawa Chineke ụta otú ahụ Adam mere?

 10 Anyị nwere ike ịta onye ọzọ ụta maka ihe ndị anyị mejọrọ. Nwoke mbụ bụ́ Adam tara Chineke ụta maka mmehie o mere. (Jen. 3:12) Adam ma na ya kpachaara anya mebie iwu Chineke nakwa na Chineke ga-ata ya ahụhụ maka ya. Ma, ọ tara Chineke ụta maka ihe o mere, dị ka à ga-asị na ihe mere o ji mee mmehie bụ na Chineke nyere ya nwaanyị ọjọọ. Kemgbe ahụ, e nweekwala ndị mere ihe ahụ Adam mere. Ha tara Chineke ụta maka ihe ndị ha mejọrọ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị, ‘Ọ bụrụ na obi ajọwa m njọ n’ihi ihe m mejọrọ, ọ̀ ga-eme ka m chee na iwu Jehova anaghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́?’

11. Gịnị ka ihe ahụ Jona mere na-akụziri anyị?

11 Anyị nwere ike ichewe naanị banyere onwe anyị. Iwe were Jona onye amụma mgbe Jehova meere ndị Ninive ebere. (Jona 4:1-3) Gịnị mere iwe ji wee ya? O nwere ike ịbụ n’ihi na o chere na ndị mmadụ ga-ekwu na ya bụ onye amụma ụgha ebe ọ bụ na e bibighị obodo ahụ ọ sị na a ga-ebibi. Ọ dị ka ihe ka Jona mkpa bụ otú ndị mmadụ ga-esi na-ele ya anya, ọ bụghị otú a ga-esi chebe ndị bi na Ninive. Ànyị nwere ike ime ụdị ihe a Jona mere? Ọ bụrụ na anyị na-eche naanị banyere onwe anyị, anyị nwere ike ichefu na anyị kwesịrị inyere ndị mmadụ aka ka ha chegharịa. Dị ka ihe atụ, o nwere ike anyị na-ekwusa ozi ọma kemgbe ọtụtụ afọ, na-agwa ndị mmadụ na ụbọchị Jehova dị nso. Ma, ọ bụrụ na ndị mmadụ na-akparị anyị maka na ụbọchị ahụ abịabeghị, ọ̀ ga-eme ka anyị chewe na Jehova na-egbu oge?—2 Pita 3:3, 4, 9.

GỊNỊ KA ANYỊ GA-EME KA ANYỊ GHARA ‘ỊNA-EWESO JEHOVA OKÉ IWE’

12, 13. Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị echee na ihe Jehova mere ma ọ bụ ihe o kwere ka o mee ezighị ezi?

12 Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị echee na ihe Jehova mere ma ọ bụ ihe o kwere ka o mee ezighị ezi? Anyị kwesịrị icheta na anyị ekwesịghị iche otú ahụ. Ilu 19:3 kwuru, sị: “Mmadụ pụrụ imebi ohere o nwere site na nzuzu  ya, ma mesịa taa Jehova ụta.” (Baịbụl Nsọ nke International Bible Society) N’ihi ya, ka anyị tụlee ihe ise ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ikwe ka nsogbu ndị bịaara anyị mee ka anyị tawa Jehova ụta.

13 Mee ka gị na Jehova na-adịkwu ná mma. Ọ bụrụ na anyị na Chineke dị ná mma, anyị agaghị ewesa ya iwe. (Gụọ Ilu 3:5, 6.) Anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi. Anyị ekwesịghịkwa iche na anyị ma ihe karịa ya ma ọ bụ na-eche naanị banyere onwe anyị. (Ilu 3:7; Ekli. 7:16) Ọ bụrụ na anyị eburu ihe a n’obi, ọ ga-eme ka anyị ghara ịta Jehova ụta mgbe ihe ọjọọ mere.

14, 15. Gịnị ga-enyere anyị aka ka ihe ndị ọzọ kwuru ghara imebi anyị obi?

14 Ekwela ka ihe ndị ọzọ kwuru mebie gị obi. N’oge Mozis, e nwere ọtụtụ ihe kwesịrị ime ka obi sie ndị Izrel ike na Jehova ga-eduba ha n’Ala Nkwa ahụ. (Ọma 78:43-53) Ma, mgbe ndị nledo iri ahụ kọrọ akụkọ ọjọọ banyere obodo Kenan, Baịbụl kwuru na ndị Izrel ‘echetaghị aka Jehova,’ ya bụ na ha chefuru ihe Jehova meere ha. (Ọma 78:42) Anyị na Jehova ga-adịkwu ná mma ma ọ bụrụ na anyị na-echebara ihe ọma niile o meere anyị echiche. Anyị mee otú ahụ, ọ ga-eme ka anyị ghara ikwe ka ihe ndị ọzọ kwuru mee ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma.—Ọma 77:11, 12.

15 Olee ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị kpọrọ ụmụnna anyị asị? O nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma. (1 Jọn 4:20) Mgbe a họpụtara Erọn ka ọ bụrụ nnukwu onye nchụàjà, ụmụ Izrel tamuru ntamu megide ya. Ma, Jehova weere na ọ bụ ya ka ha gwara okwu ọjọọ ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 17:10) Ọ bụrụ na anyị na-ekwu ihe na-adịghị mma gbasara ndị Jehova ji na-eduzi ọrụ ya n’ụwa, anyị nwere ike isi otú ahụ na-agwa Jehova okwu ọjọọ.—Hib. 13:7, 17.

16, 17. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ma nsogbu bịara anyị?

16 Cheta na ọ bụghị Jehova na-akpata nsogbu anyị. N’oge Aịzaya, ndị Izrel kwụsịrị ife Jehova, ma Jehova ka chọrọ inyere ha aka. (Aịza. 1:16-19) Nsogbu ọ sọkwara ya bịara anyị taa, obi kwesịrị isi anyị ike ma anyị cheta na ihe banyere anyị na-emetụ Jehova n’obi nakwa na ọ chọrọ inyere anyị aka. (1 Pita 5:7) Jehova kwedịrị anyị nkwa na ya ga-enye anyị ike anyị ga-eji na-edi ya.—1 Kọr. 10:13.

17 Job tara ahụhụ n’agbanyeghị na o ji obi ya niile fee Jehova. Mgbe ọ bụla anyị na-ata ahụhụ, anyị kwesịrị icheta na ọ bụghị Jehova kpatara ya. Baịbụl kwuru na Jehova hụrụ ezi omume n’anya ma kpọọ ikpe na-ezighị ezi asị. (Ọma 33:5) Anyị kwesịrị ikwu ụdị ihe a Elaịhu bụ́ enyi Job kwuru. Ọ sịrị: “Ya bụrụ Chineke ihe arụ ime ihe ọjọọ, ya bụrụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ihe arụ ime ihe n’ụzọ na-ezighị ezi!” (Job 34:10) Ọ bụghị Jehova na-akpata nsogbu anyị, kama ọ bụ ya na-enye anyị “ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè.”—Jems 1:13, 17.

18, 19. Gịnị mere anyị kwesịrị iji tụkwasị Jehova obi? Nye ihe atụ.

18 Tụkwasị Jehova obi. Chineke zuru okè, echiche ya dịkwa elu karịa echiche anyị. (Aịza. 55:8, 9) Anyị dịrị umeala n’obi, anyị ga-aghọta na anyị amaghị ihe niile. (Rom 9:20) Ọtụtụ mgbe, anyị anaghị ama ihe niile mere Jehova ji mee ihe o mere. E nwere ike ị chọpụtala na ihe a akwụkwọ Ilu kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Onye bu ụzọ n’okwu ikpe ya bụ onye ezi omume; onye nke ọzọ na-abata ma mee ka a chọpụta ihe bụ́ eziokwu banyere onye ahụ.”—Ilu 18:17.

19 Dị ka ihe atụ, ezigbo enyi anyị nwere ike ime ihe anyị na-aghọtaghị ma ọ bụ ihe anyị chere na ọ bụghị otú e kwesịrị isi mee ya. Ànyị ga-eche ozugbo na ihe o mere adịghị mma? Mbanụ. Kama  iche otú ahụ, anyị nwere ike icheta na anyị amaghị ihe mere o ji mee ihe ahụ. Ọ bụrụ na anyị ga-ejili obiọma meso enyi anyị na-ezughị okè ihe, anyị kwesịkwara ịtụkwasị Nna anyị nke eluigwe obi n’ihi na ụzọ ya na echiche ya dị elu karịa nke anyị.

20, 21. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ikwu na ọ bụ Jehova kpatara nsogbu anyị?

20 Mara onye e kwesịrị ịta ụta. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịkpatara onwe anyị nsogbu. (Gal. 6:7) Anyị ekwesịghị ikwu na ọ bụ Jehova kpatara ya. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ka anyị were ụgbọala dị ka ihe atụ. Anyị ma na ụgbọala na-agba ezigbo ọsọ. Ọ bụrụ na onye na-anya ụgbọala ana-agba ọnwụ ọnwụ n’ebe ụzọ gbagọrọ agbagọ, ụgbọala ahụ nwere ike ịkpọka. Ì chere na onye ahụ kwesịrị ịtawa ndị rụrụ ụgbọala ahụ ụta? Mbanụ. Ọ bụ otú ahụ ka anyị na-ekwesịghị ịta Jehova ụta. O kere anyị ka anyị jiri aka anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme. Ma, ọ kụziiri anyị otú anyị ga-esi na-eme mkpebi dị mma. N’ihi ya, anyị mejọọ ihe, anyị ekwesịghị ikwu na ọ bụ ya kpatara ya.

21 Ma, ọ bụghị mgbe niile ka anyị na-akpata nsogbu anyị. Ihe na-akpata nsogbu anyị mgbe ụfọdụ bụ “oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya.” (Ekli. 9:11) Anyị ekwesịghịkwa ichefu na ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu kacha akpata ihe ọjọọ na-eme n’ụwa taa. (1 Jọn 5:19; Mkpu. 12:9) Ọ bụ ya bụ onye iro anyị, ọ bụghị Jehova.—1 Pita 5:8.

EKWELA KA IHE Ọ BỤLA MEE KA GỊ NA JEHOVA GHARA ỊDỊ NÁ MMA

Jehova gọziri Jọshụa na Keleb n’ihi na ha tụkwasịrị ya obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 22)

22, 23. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ma ọ bụrụ na obi adịghị anyị mma n’ihi nsogbu ndị bịaara anyị?

22 Mgbe ọ bụla nsogbu tara akpụ bịaara gị, cheta ihe Jọshụa na Keleb mere. Mmadụ iri n’ime ndị ahụ gara ledoo Ala Nkwa ahụ kọrọ akụkọ ọjọọ gbasara ya. Ma, Jọshụa na Keleb kọrọ akụkọ ọma banyere ya. (Ọnụ Ọgụ. 14:6-9) Ha nwere okwukwe na Jehova. Ma, ha so ndị Izrel ndị ọzọ wagharịa afọ iri anọ n’ala ịkpa. Jọshụa na Keleb hà tamuru ntamu ma ọ bụ wesa Jehova iwe na ihe o mere adịghị mma? Mba. Ha tụkwasịrị Jehova obi. Jehova ọ̀ gọziri ha? Eenụ! Ọtụtụ n’ime ndị Izrel ahụ nwụrụ n’ala ịkpa, ma Jọshụa na Keleb mechara baa n’Ala Nkwa ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 14:30) Jehova ga-agọzikwa anyị ma ọ bụrụ na “ike agwụghị anyị” ime uche ya.—Gal. 6:9; Hib. 6:10.

23 Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na obi adịghị gị mma n’ihi nsogbu ndị bịaara gị, n’ihi ihe ndị ọzọ mejọrọ, ma ọ bụ n’ihi ihe ndị i mejọrọ? Na-echeta àgwà ndị magburu onwe ha Jehova nwere. Echefula ihe ọma Jehova kwere gị ná nkwa. Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee otú ndụ m gaara adị ma a sị na mụ na Jehova adịghị ná mma?’ Gbalịa ka gị na ya na-adị ná mma mgbe niile, ewesokwala ya oké iwe.