Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌGỌST 2013

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ọ̀ dị mma ka nwatakịrị a chụrụ n’ọgbakọ na ndị mụrụ ya bụ́ Ndịàmà Jehova nọrọ ma a gaa ọmụmụ ihe?

Anyị ekwesịghị ịna-echegbu onwe anyị gbasara ebe onye a chụrụ n’ọgbakọ ga na-anọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ụlọ Nche agwala ndị nne na nna ọtụtụ mgbe na ọ bụrụ na ha na nwa ha a chụrụ n’ọgbakọ ka bi, ha kwesịrị ịgba mbọ na-akụziri ya Okwu Chineke ma ọ bụrụ na ha chere na ha kwesịrị ime otú ahụ. A gwara ndị nne na nna n’Ụlọ Nche November 15, 1988, peeji nke 19 na nke 20 na ha nwere ike ịmụrụ nwa ha a chụrụ n’ọgbakọ Baịbụl ma ọ bụrụ na ha chere na ha kwesịrị inyere ya aka. Ọ ga-enyere nwa ahụ aka ịmụta ihe ga-enyere ya aka ịkwụsị àgwà ọjọọ ahụ e kwo chụọ ya n’ọgbakọ.

A gaa ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, nwatakịrị a chụrụ n’ọgbakọ nwere ike ịnọ nwayọọ n’ebe nne na nna ya nọ. Ebe ọ bụ na ọ bụghị iwu na onye a chụrụ n’ọgbakọ ga na-anọ n’oche azụ, ọ bụghị ihe ọjọọ ma nwatakịrị a chụrụ n’ọgbakọ nọrọ n’ebe papa ya na mama ya nọ. Nne na nna nwa ahụ ga-achọ ka ọ na-ege ntị n’ọmụmụ ihe n’ihi na ha chọrọ ka ya na Jehova dị ná mma. Ọ bụrụ na ha na ya anọrọ n’oche, ọ ga-enyere ya aka ịna-ege ntị karịa mgbe naanị ya nọ.

Ọ́ bụrụkwanụ na nwatakịrị a chụrụ n’ọgbakọ na papa ya na mama ya ebighịzi? Ọ̀ pụtara na ha na ya agaghị anọ n’otu ebe ma a gaa ọmụmụ ihe? N’oge gara aga, Ụlọ Nche kwuru otú Onyeàmà Jehova kwesịrị isi na-emeso onye ikwu ya a chụrụ n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na ya na onye ahụ ebighị. * Ma, ọ bụrụ na onye a chụrụ n’ọgbakọ anọrọ ebe ndị ezinụlọ ya nọ mgbe a bịara ọmụmụ ihe, ọ pụtaghị na ha na-achọ otú ha na ya ga-esi na-emekọ ihe. Anyị ekwesịghị ichegbuwe onwe anyị ma ọ bụrụ na ndị ezinụlọ ya ndị ọzọ bụ́ Ndịàmà Jehova na-emeso ya otú Baịbụl kwuru ka e si na-emeso ya ma ghara ịna-achọ otú ha na ya ga-esi na-akpa.—1 Kọr. 5:11, 13; 2 Jọn 11.

Ma onye a chụrụ n’ọgbakọ ọ̀ nọ n’akụkụ ndị ezinụlọ ya ma ọ̀ bụ n’akụkụ onye ọzọ ma a bịa ọmụmụ ihe, anyị ekwesịghị inyewe onwe anyị nsogbu ma ọ bụrụhaala na onye ahụ nọ nwayọọ. Ọ bụrụ na e nye iwu ebe a chọrọ ka onye a chụrụ n’ọgbakọ na-anọ, o nwere ike ịkpata ọtụtụ nsogbu. Ọ bụrụ na ndị ezinụlọ onye ahụ a chụrụ n’ọgbakọ na ụmụnna ndị ọzọ na-agba mbọ na-emeso onye ahụ otú Baịbụl kwuru ka e si na-emeso ya, mmadụ ekwesịghị inyewe onwe ya nsogbu gbasara ebe ndị bịara ọmụmụ ihe ga-anọ. Mmadụ ekwesịghịkwa inye onwe ya nsogbu ma ọ bụrụ na ebe onye ahụ a chụrụ n’ọgbakọ nọ emeghị ka ụmụnna sụọ ngọngọ. *

^ para. 5 Gụọ Ụlọ Nche December 15, 1981, peeji nke 29 na 30.

^ para. 6 A ga-eji ihe e kwuru ebe a dochie ihe e kwuru n’Ụlọ Nche (Bekee) April 1, 1953, peeji nke 223.